Ọgbakọ Zuru ọha
Ozi ọma nke Jizọs Kraịst Gbadoro Ụkwu nʻEzinaụlọ
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


17:23

Ozi ọma nke Jizọs Kraịst Dabeere na Ezi na ụlọ

Ozizi anyị na nkwenye anyị niime ezi na ụlọ ebighị ebi na-agba anyị ume ma na-ejikọ anyị.

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị m hụrụ naanya, unu emeela maka ekpere unu nʻisi m. Ha metụtawo m.

I.

Ozizi nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a dabeere na ezi na ụlọ. Dị mkpa nye ozizi anyị maka ezi na ụlọ bụ tempụl. Emume nsọ niile anatara ebe ahụ na-enye anyị ike ịlọghachi dị ka ezi na ụlọ ebighị ebi niile niihu nke Nna nke Eluigwe.

Dị ka nʻọgbakọ zuruọha Eprel 2025 Onyeisi Russell M. Nelson amawo ọkwa iwu tempụl 200 ọhụrụ. Ọ na-amasị ya ịma ọkwa tempụl ọhụrụ na mmechi nke ọgbakọ zuru ọha nke ọbụla, ma anyị niile na-eso ya na-an̄ụrị. Kosiladị, jiri ọtụtụ ọnụọgụgụ nke tempụl niile ugbua dị na ogo kachasị isimbụ nke ịtụ atụmatụ na owuwu, o kwesịrị ekwesị na anyị ga-ewedata aka ala nʻịma ọkwa maka tempụl ọhụrụ niile. Ya mere, jiri nkwado nke Kworum nke Ndị Ozi Iri na Abụọ, anyị agaghị ama ọkwa tempụl ọhụrụ ọbụla nʻọgbakọ nke a. Ugbu a anyị ga-aganiihu nʻiwete emume nsọ niile nke tempụl nye ndị otu nke Nzukọ nsọ gburugburu ụwa gụnyere mgbe na ebe aga ama ọkwa aga ama ọkwa owuwu nke tempụl ọhụrụ niile.

Akụkụ nke okwu m nke m nyeworo ka edere mgbe ọnwụ nke Onyeisi Russell M. Nelson anyị hụrụ naanya gasịrị. Ihe sotere ugbu a ka edere ma kwadoo izu ụka ole ma ole tupu ugbu a, mana ọ ka nọchitere nkuzi m niile, nke Onyenwe anyị kpakere mmụọ.

II.

Ọkwa a mara nye ezi na ụlọ, a mara ọkwa kpọmkwem afọ 30 gara aga, na-ama ọkwa na “ezi na ụlọ ka Chineke hiwere” ma “ọ dị nʻisi atụmatụ nke Onye Okike maka akara aka ebighị ebi nke ụmụ Ya.” Anyị na-ama ọkwa “na iwu nsọ nke Chineke maka ụmụ Ya ịmụba na imejupụta ụwa ka dị ire.” Ma “anyi na-aganiihu na-ama ọkwa na Chineke enyewo iwu na ike nsọ niile nke ịmụta ụmụ ka a ga-eji rụọ ọrụ naani n’etiti nwoke na nwanyị, ejikọtara n’okpụrụ iwu dị ka di na nwunye.” Dị ka mgbe ahụ-Okenye Russell M. Nelson kuziiri ndị ọgbakọ Mahadum Brigham Young, ezi na ụlọ dị “nʻisi atụmatụ nke Chineke. … Nʻezie, ebumnuuche nke atụmatụ ahụ bụ ibuli ezi na ụlọ.”

Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst bụ nke ama mgbe ụfọdụ dị ka nzukọ nsọ dabeere na ezi na ụlọ. Ọ bụ ya! Mmekọrịta anyị nye Chineke na ebumnuuche nke ndụ anụ ahụ ka akọwara nʻụzọ nke ezi na ụlọ. Ozi ọma nke Jizọs Kraịst bụ atụmatụ nke Nna anyị nke Eluigwe maka uru nke ụmụ Ya na mmụọ. Anyị nwere ike kwuo nʻezie na atụmatụ ozi ọma bụ nke akuziiri anyị na mbụ na kansụl nke ezi na ụlọ ebighị ebi, etinyere ya nọrụ site nʻezi na ụlọ ndụ anụ ahụ anyị niile, ma akara aka ya ebu nʻobi bụ ibuli ụmụ Chineke elu nʻezi na ụlọ ebighị ebi.

III.

Agbanyeghị ọnọdụ nke ozizi ahụ, enwere mmegide. Niime United States anyị na-agabiga mmebi na alụmalụ na ọmụmụ nwa. Ihe ruru otu narị afọ nkepụta nke ezi na ụlọ ebe di na nwunye lụrụ alụ na-achị agbadawo, otu ahụkwa dị ka ọmụmụ. Alụmalụ niile na ọmụmụ niile nke ndị otu Nzukọ nsọ dị mma karịa, mana ha agbadakwala nke ukwuu. Ọ dị ezigbo mkpa na Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a atụfughị nghọta ha nke ebumnuuche nke alụmalụ na uru nke ụmụ. Nke ahụ bụ ọdịniihu maka nke anyị na-agba mbọ. “Mbuli elu bụ ihe gbasara ezi na ụlọ,” Onyeisi Nelson akuziworo anyị. “Naanị site na emume nsọ nzọpụta niile nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst ka enwere ike isi ebuli ezi na ụlọ niile.”

Mgbada mba ụwa niile na alụmalụ na ọmụmụ kwere nghọta maka nzube niile nke agụgụala, mana ụkpụrụ niile na omume niile nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a kwesịrụ imelite—ọbụghị isoro—usoro ndị ahụ niile.

Afọ 70 gara nʻoge ịbụ nwata ntakịrị nwoke m, ebiri nʻubi nne na nna m ukwu na nhazi ebe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe niile mere mgbe ụbọchị ka dị bụ nʻokpuru ntuziaka nke ezi na ụlọ. Enweghị igwe onyonyo ma ọ bụ ngwá electronic ndị ọzọ iji bupu uche site nʻihe omume ezi na ụlọ niile. Na ịdịiche, niime obodo mepere emepe taa, ndị otu ole ma ole na-ahụbiga ihe omume niile na-adịnudị dabeere na ezi na ụlọ. Ibi ndụ obodo mepere emepe na njem ụgbọala ọgbara ọhụrụ, mmemme ahaziri ahazi, na nzikọrịta ozi na-aga ọsọ ọsọ emewo ya adị mfe maka ndị ntoroọbịa iwere ebe obibi ha dị ka ụlọ bọdịn, ebe ha na-ehi ụra ma rie nri mgbe ụfọdụ mana ebe enwere nduzi dị nta nke ndị nne na nna maka ihe omume ha niile.

Ike mmetụta ndị nne na nna ka atụgharịkwara site ụzọ ndị otu Nzukọ nsọ ugbu a si akpata ihe eji ebi ndụ. Nʻoge gara, otu niime ike mmetụta kachasị nke jikọtara ezi na ụlọ bụ nhụmiihe nke ịdọlịkọta nʻọchịchọ ebumnuuche yiri otu—dị ka ịkụdasị alaịkpa ma ọ bụ ịkpata ihe eji ebi ndụ. Ezi na ụlọ bụ ngalaba nke nrụpụta akụ na ụba, ahaziri ahazi na nke ana eduzi. Taa, ọtụtụ ezi na ụlọ niile bụ ngalaba niile nke oriri akụ na ụba, nke adịghị achọ ogo dị elu nke otu ezi na ụlọ na imekọ ihe ọnụ nke ezi na ụlọ.

IV.

Dị ka ike mmetụta nke ndị nne na nna na-ebelata, Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a ka nwere oke na ọrụ Chineke nyere iji kuziere ụmụ ha ịkwado maka akara aka ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:25). Ọtụtụ niime anyị ga-emerịrị nke a mgbe na-abụghị ndị ezi na ụlọ anyị niile bụ nke ọdịnaala. Ịgba alụkwaghị m, ọnwụ, na nkewa bụ nsiridị niile. Enwetere m nhụmiihe ahụ niime ezi na ụlọ nke m tolitere na ya.

Ezi na ụlo Oaks

Nna m nwụrụ mgbe m gbara afọ asaa, ya mere nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị na m ka azụlitere site nʻaka onye nne nwanyị isimkpe. Nʻọnọdụ ndị kacha sie ike, ọ garaniihu. Ọ nọọrọ naanị Ya ma nweghị olileanya, mana jiri ike nke Onyenwe anyị, nkuzi ya dị ike nke ozizi nke Nzukọ nsọ eweghachitere duru anyị. Otu o siri kpee ekpere maka enyemaka nke eluigwe nʻizulite ụmụ ya ma agọziri ya! Azụlitere anyị nʻebe obibi obi ụtọ nke nna anyị nwụrụ anwụ na-abụkarị nsiridị. Ọ kuziiri anyị na anyị nweburu nna ma na o nweburu di ma anyị ga na-abụrịrị ezi na ụlọ niihi alụmalụ tempụl ha. Nna anyị pụrụ nwa oge niihi na Onyenwe anyị akpọwo ya nʻọrụ dị iche.

Ama m na obi adịghị ọtụtụ ezi na ụlọ ndị ọzọ mma, mana onye nne nke ọbụla nwere ike ikuzi maka ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe na ngọzi niile nke alụmalụ tempụl nʻikpeazụ. Gị nwa kwa nwere ike ime nke a! Atụmatụ nke Nna nke Eluigwe na-emesi obi ike ikwe omume nke a maka onye niile. Obi dị anyị niile ekele maka alụmalụ tempụl na maka ngọzi niile elere anya maka nrachi dị ka ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi. Dị ka nne m, ọ na-amasị anyị ịn̄ọmi nkwa nke Lehi kwere nwa ya nwoke Jekọb na Chineke “ga-eme mkpagbu gị niile maka uru gị” (2 Nefi 2:2). Nke ahụ metụtara ezi na ụlọ niile nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a, nke zuru ezu ma ọ bụ ezughị ezu ugbu a. Anyị bụ ezi na ụlọ nzukọ nsọ.

Ozizi anyị na nkwenye anyị niime ezi na ụlọ ebighị ebi na-agba anyị ume ma na-ejikọ anyị. Enweghị m ike ichefu nkwa nke Nna mama m Harris, mgbe anyị ụmụaka birịị nʻubi ya nʻakụkụ Payson, Utah. O ziri m ozi ọjọọ ahụ na nna m anwụwo nʻebe dị anya Denver, Colorado. Agbabara m niime ọnụ ụlọ ma sekpuru nʻakụkụ akwa, bepụta obi m. Nna mama m sooro m ma sekpuru nʻikpere ya nʻakụkụ m ma kwuo, “Aga m abụ nna gị.” Nkwa ahụ dị nro bụ ọmụmaatụ dị ike nke ihe nne na nna ukwu nwere ike ime iji mejuputa oghere niile mgbe mmadụ nwụrụ ma ọ bụ funara ezi na ụlọ.

Ndị nne na nna, otu onye ma ọ bụ ndị lụrụ alụ--—na ndị ọzọ, dị ka nne na nna ukwu, ndị na-emejuputa ọrụ ahụ maka ụmụaka—bụ ndịisi nkuzi. Nkuzi ha kacha nwee mmetụta bụ site na ịma atụ. Ogige ezi na ụlọ bụ ebe kacha mma iji gosipụta ma mụọ ụkpụrụ ebighị ebi niile, dị ka ịdị mkpa nke alụmalụ na ụmụntakịrị, ebumnuuche nke ndụ, na ezigbo nsipụta nke ọn̄ụ. Ọ bụkwa ebe kacha mma ịmụ ihe mmụta ndị ọzọ niile dị mkpa nke ndụ, dị ka obi ọma, mgbaghara, njikwata onwe, na uru nke agụmakwụkwọ na ọrụ eziokwu.

Nʻezie, ọtụtụ ndị otu Nzukọ nsọ nwere ndị otu ezi na ụlọ ha hụrụ naanya ndị na-adịghị anabata ụkpụrụ niile na atụmanya niile nke ozi ọma. Ụdị ndị otu nwere mkpa ịhụnaanya na ndidi anyị. Na mmetụta nye onye ọzọ, anyị kwesịrị icheta na izu oke anyị na-achọ abụghị nke ebelatara nye ọnọdụ nrụgide niile nke ndụ anụ ahụ. Nkuzi dị ukwuu niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 138:57–59 na-emesi anyị obi ike na nchegharị na uto ime mmụọ nwere ike gaaniihu niime ụwa mmụọ nke na-esote ndụ anụ ahụ. Nke kacha nke, dị ka ezi na ụlọ na-ejikọta ịgba onye na ibe ya ume, anyị niile kwesịrị icheta na mmehie niile na adịghị ike niile nke anyị na-agabiga na ndụ anụ ahụ ka enwere ike ịgbaghara site na nchegharị niihi Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst dị ebube ma dị nzọpụta.

V.

Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, bụ onye nlere anya kachasị. Aga agọzi anyị ọ bụrụ ma anyị kpụọ ndụ anyị dị ka otu nkuzi Ya niile na aja nke onwe Ya. Isoro Kraịst na inye onwe anyị nʻije ozi onye nʻibe ya bụ ọgwọm nọrịa kacha mma maka ịdị nke onwe naanị na ihe otu onye nke ugbu a yiri ka ihe na-emekarị.

Ndị nne na nna nwekwara ọrụ ikuziri ụmụ ha mmata ihe ahụrụ anya ewepụ na ụkpụrụ niime nke ozi ọma. Ndị ezi na ụlọ na-ejikọta mgbe ha na-emekọta ihe niile bara uru ọnụ. Ubi nta ezi na ụlọ na-ezulite mmekọrịta ezi na ụlọ. Ezi na ụlọ nwere obi ụtọ na-enwe njikọ ezi na ụlọ gbasiri ike. Ime kampụ, ihe omume egwuregwu niile, na egwuregwu ndị ọzọ ka ejikarịsịrị kpọrọ ihe iji jikọta ezi na ụlọ niile. Ndị ezi na ụlọ kwesịrị ịhazi nzukọta iji cheta ndị nna nna ha ha, nke na-eduba na tempụl.

Ndị nne na nna kwesịrị ikuziri ụmụ ha na nka niile dị mkpa eji ebi ndụ, tinyekọta ịrụ ọrụ niime ọgba na ebe obibi. Ịmụ asụsụ dị iche iche bụ nkwado bara uru maka ije ozi mgbasa ozi ọma na ndụ ọgbara ọhụrụ. Ndị nkuzi maka ihe ọmụmụ ndị a nwere ike bụrụ ndị nkuzi ma ọ bụ ndị nne na nna ukwu ma ọ bụ ndị ezi na ụlọ ukwu. Ezi na ụlọ na-eme nke ọma mgbe ha mụtara dị ka ndị otu ma dụkọrịta ndụmọdụ ọnụ nʻihe niile na-echekasị nye ezi na ụlọ na ndị otu ya.

Ụfọdụ nwere ike kwuo, “Mana anyị enweghị oge maka ihe ọbụla nke ahụ.” Ịchọta oge iji mee ihe bara uru nezie, ọtụtụ ndị nne na nna ga-ahụ na ha nwere ike gbanye ezi na ụlọ ọ bụrụ ma ha niile gbanyụọ tekịnụzu ha niile. Ma ndị nne na nna, chetanụ, ihe ụmụaka ndị ahụ na-achọ nʻezie maka nri anyasị bụ iso gị gbuo oge.

Nnukwu ngọzi niile na-abịara ezi na ụlọ niile ọ bụrụ ma ha kpekọta ekpere ọnụ, sekpuru nʻabalị na nʻụtụtụ inye ekele maka ngọzi niile ma kpee ekpere maka nchekasị niile na-emekarị. Anakwa agọzi ezi na ụlọ niile dị ka ha na-efekọrịta ofufe nʻozi niile nke Nzukọ nsọ na niime nhazi ndị ọzọ. Njikọ ezi na ụlọ ka anakwa agba ume site nʻakụkọ ezi na ụlọ niile, na-ekepụta omenaala ezi na ụlọ, ma na-ekesa nhụmiihe niile dị nsọ. Onyeisi Spencer W. Kimball chetaara anyị na “akụkọ niile nke mkpate mmụọ site na ndụ nke onwe anyị na ndị nke bu anyị ụzọ bịa … bụ ngwa nkuzi dị ike.” Ha na-abụkarị nsipụta kacha mma nke mkpate mmụọ maka anyị na ụmụ ụmụ anyị ha.

Ana m agba ama nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, onye bụ Ọkpara nke Chineke, Nna anyị nke Ebighị ebi, A Mụrụ Naanị Ya. Ọ na-akpọku anyị isoro ụzọ ọgbụgba ndụ nke na-eduba na nzukọta ezi na ụlọ nke eluigwe. Ikike nrachi nke ọkwa nchụaja niile, nke ntụghe ụzọ niile eweghachitere niime tempụl Kirtland, na-achịkọta ezi na ụlọ ọnụ ruo mgbe ebighị ebi (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:13–16). Ana etinye ha nʻọrụ ugbu a niime ọtụtụ tempụl nke Onyenwe anyị gburugburu ụwa. Nke a dị irè. Ka anyị bụrụ ndị so na ya, ka m na-ekpe ekpere, n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  2. Russell M. Nelson, “Okwukwe na Ezi na ụlọ niile” (Brigham Young University fireside, Feb. 6, 2005), 3, speeches.byu.edu.

  3. Russell M. Nelson, “Mepee Eluigwe niile Site na Ọrụ Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ,” Liahona, Ọkt. 2017, 18.

  4. Spencer W. Kimball, “Ya mere Akuziiri M,Ensign, Jan. 1982, 4.