Mkpụrụ obi niile Dị Umeala nʻObi nʻEgbu ikpere nʻebe Nchụaja
Dịka anyị na-eme ma na-asọpụrụ ọgbụgba ndụ anyị niile, anyị na-ekekọta onwe anyị na Onye Nzọpụta, na-enweta ohere dị ukwuu na ebere Ya, nchekwa, ido nsọ, ọgwụgwọ ọrịa, na izu ike.
Unu emeela, ndị kwaya, maka ịgba-ama unu site na abụ ọhụrụ ahụ.
Abụ ọhụrụ oriri nsọ ahụ “Achịcha nke Ndụ, Mmiri dị Ndụ” juputara mkpụrụ obi m. Otu ahịrị niime abụ ahụ na-ekwu, “Ugbu a ana m abịa niihu ebe nchụaja, na-enye Ya mkpụru obi m tiwara etiwa.”
Nghọta m gbasara okwu ndị ahụ gbagoro nʻoge na-adịghị anya ka ezinaụlọ anyị hapụrụ nʻogige Newbury, California, ije ozi na Utah Ogden Mishọn na afọ 2015. E nwetara m ọkpụkpọ oku ịgagharị Hill Air Force Base dị nso Layton, Utah. Ọ dịtubeghị mgbe m nọ nʻogbe ndị agha, a hụtụbeghịkwa m ụkọchukwu ndị agha ma ọ bụ ndị ikom na ndị inyom na-arụ ọrụ iji chebe obodo ha na nchebe.
Ụkọchukwu Harp, dị ka puku kwuru puku ndị ụkọchukwu afọ ofufo na ndị ọkachamara ụkọchukwu bụ ndị na-eje ozi nʻụlọ mkpọrọ anyị niile, ụlọ ọgwụ niile, na nrụnye ndị agha niile gburugburu ụwa, kpalitere mmụọ m ma bulie m elu. Ebe anyị kwụsịrị nʻikpeazụ nʻogbe ahụ bụ nʻebe nsọ ahụ. A jụrụ m ụkọchukwu ahụ ma ọ na-eje ozi maka ndị mmadụ niile chọrọ ime ntule, kpee ekpere, ịtụgharị uche, na ife ofufe. Ọ gara na nʻihu mgbidi ụlọ ekpere ahụ, ma wee dọpụta obe nʻazụ akwa mgbochi ahụ niile. O kwuru na ya ji obe ahụ maka ofufe niile ndị Protestant na ndị Katọlik. A jụrụ m ihe o ji mee maka ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ndị Juu, ma o wee gaa nʻakụkụ nke ọzọ nke mgbidi ahu, ma dọpụta Kpakpando nke Devid.
Mgbe ahụ A jụrụ m, “Gịnị ka ị na-eme maka ozi niile nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a?” Ọ kwapụrụ ihe oyiyi ndị ahụ ma tụọ aka na nnukwu ebe ịchụaja eji osisi rụọ dị nʻetiti ebe nsọ ahụ. Ọ sịrị na ndị otu nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a na-akwadebe ma gọzie achịcha na mmiri nʻelu ebe ịchụaja. A jụrụ m ma e wepụrụ nnukwu, ebe ịchụaja ahụ yiri ka ọ kwụwara ebe ahụ tupu ozi ụmụnna anyị ndị Juu, Alakụba, Katọlik, ma ọ bụ ndị Protestant. O kwuru na ebe ịchụaja ahụ dị nʻebe ahụ, niihi na ọtụtụ niime okpukpe ndị ahụ na-ejikwa ebe ịchụaja ahụ eme ihe nʻụzọ ụfọdụ.
Ebreham wuru ebe ịchụaja, kee Aịzik agbụ, wee dị njikere iji naanị nwa ya nwoke chụọ aja, mana akwụsịrị ya, ma ya kwuputa, dịka Onyenwe anyị kwuputaworo si, “Ebe a Ka M nọ”! Ugboro ole ka Nnukwu A bụ M ma ọ bụ otu onye niime ndị amụma Ya weputara onwe ya, “Ebe a Ka M nọ”?
N’oge okwuchukwu Ya n’elu Ugwu, Onye Nzọpụta kpọrọ anyị ka anyị na ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwanyị dị nʻotu tupu anyị erute nʻebe ịchụaja ahụ. Pọl kuziri na “edoro anyị nsọ” nʻebe ịchụaja site na aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.
Onye amụma Lehi “hapụrụ ụlọ ya … na ihe ndị dị oke ọnụ ahịa ya niile. … [Mgbe ahụ] ya wuo ebe ịchụaja … ma chụọ aja … , ma were ekele nye Onyenwe anyị.”
Baịbụl Ahụ na Akwụkwọ nke Mọmọn na-akuziri anyị ka anyị na-efe Ọkpara nke Chineke nʻebe ịchụaja niile. Maka Gịnị?
Nne na nna anyị mbụ, Adam na Iv, wuru ma na-efe ofufe nʻebe ịchụaja niile. Mgbe a chụpụrụ ha site nʻogige nke Iden ma fee ofufe “ọtụtụ ụbọchị” otu mmụọ ozi letara ha ma jụọ ajụjụ na-emetụ nʻahụ nke a pụrụ ịjụ onye ọbụla niime anyị: “Gịnị mere i ji na-achụrụ Onyenwe anyị aja?”
Adam zara, “Amaghị m.”
Nzaghachi nke mmụọ ozi na nnabata obi umeala nke Adam dị ịtụnaanya: “Nke a … yiri aja nke Ọkpara Nna Mụrụ Naanị Ya. … Ya mere, i ga-eme ihe ọbụla i na-eme n’aha nke Ọkpara ahụ, ma ị ga-echegharị ma kpọkuo Chineke n’aha nke Ọkpara ahụ ruo mgbe ebighị ebi.”
Tebụl oriri nsọ na ebe ịchụaja niile nke tempụl na-anọchi anya aja nke Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị ngwụcha.
Dịka anyị na-eme ma na-asọpụrụ ọgbụgba ndụ anyị niile, na-anata emume nsọ niile nke oriri nsọ ahụ na nzukọ nsọ na onyinye dị nsọ ahụ na nrachi niime tempụl, anyị na-ekekọta onwe anyị na Onye Nzọpụta, na-enweta ohere dị ukwuu na ebere Ya, nchekwa, ido nsọ, ọgwụgwọ na izu ike.
Ebere na Nchekwa site na Ọgbụgba ndụ niile
Dịka nwata nwoke gbara afọ 15, E chetara m na m jụrụ nna m ma m nwere ike ifefe nzukọ oriri nsọ—naanị otu Sọnde niime ọnwa Jenụwarị maka otu egwuregwu bọọlụ America pụrụ iche. O kwuru na m etoruola ime nhọrọ ahụ maka onwe m ma gwa m ka m tulee otu ndụmọdụ. O kwuru sị, “Ọ bụrụ na ị họrọ ịhapụ oriri nsọ otu ugboro, ọ ga-adị mfe ịhọrọ ịhapụ ya ọzọ.”
Ọ bụrụ na Onye Nzọpụta bụ nnukwu njikọ, mgbe ahụ onye iro bụ onye nkewa ahụ. Ya,Setan, na-anwa anyị ikewapụ onwe anyị site na ebe niile edoro nsọ nke ofufe na site na nchekwa nke Jizọs Kraịst. Mgbe anyị na-efe Onye Nzọpụta ofufe, anyị na-anata “ike imegide mgbaba nke ụwa.” Mgbe anyị na-etinye oge na mmekọrịta anyị na Ya, anyị nwere nkwa na a “ga-anapụta anyị site nʻaka Setan.” “Mgbe ahụ, dị ka anyị n’edobe ọgbụgba ndụ niile anyị, Ọ na-enye anyị ike Ya … nke na-enye ike.” O, lee ka m si jiri ahụmihe ahụ nke iso Onye Nzọpụta kparịta ụka site na ọgbụgba ndụ niile ndị e mere nʻebe ịchụaja niile.
Iwulite nghọta nke Aja mgbaghara mmehie ebighị ebi nke Onye Nzọpụta ahịrị nʻelu ahịrị, usoro nʻelu usoro, na-enye ọgwụ mgbochi ime mmụọ megide aghụghọ niile nke onye iro. Okenye Jaggi na-eto eto na Mexico, Zuster Jaggi na Belgium, na ndị mgbasa ozi ọma ndị ọzọ nʻụwa niile nwere ike ịhụ ndị enyi ha ka ha na-enweta ngọzi niile nke baptizim na ịnata onyinye nke Mmụọ Nsọ ma ọ bụrụ na ndị enyi ha na-aga nzukọ oriri nsọ niime izuụka mbụ nke ha zutere.
Otu nwa okoroọbịa nọ na Tonga ma ọ bụ Samoa nwere ike karịa ịrachi niime ụlọ nke Onyenwe anyị ma ọ bụrụ na ha akwadola ma nata onyinye dị nsọ ha nʻoge na-adịghị anya ha gụchara ụlọ akwụkwọ. Niime onyinye dị nsọ ahụ, a na-akpọ ndị otu ka ha bie ndụ, rube isi, ma dobe iwu ise nke na-eweta ike na nchekwa na ndụ ha. Dịka anyị na Onyenwe anyị na-eme ọgbụgba ndụ niile, mmekọrịta na-echigharị anya na-apụta. Anyị na-egosipụta iguzosi ike na ịhụnaanya anyị nye Ya. Ume na ike anyị na-eto site na nkwa ọ bụla e kwere ma debe ya,
Ntụgharị Uche na Ido nsọ
Mgbe anyị ji obi umeala gbuo ikpere nʻala nʻebe ịchụaja niile nke Onyenwe anyị, ọ bụ ohere ịtụgharị uche, “na-enyocha maka mpako nke obi [anyị] niile, … [na-eweda onwe anyị ala] niihu Chineke.” Tupu mụ na ndị enyị m a pụọ nʻoge ntoroọbịa, nne m na-ekwukarị, “Cheta onye ị bụ, ma biko deba aha gị ma ị laruo na ebe obibi.” Abalị ụfọdụ, e debaghị m aha m niihi na A lọtara m ebe obibi mgbe oge gachara. Ọ na-ewute m na mụ agaghị leta Nne m ndị ahụ dị mkpa.
Taa A na m na-atụ anya idetu njikọ niile nke Nna nke Eluigwe. Nʻm nụkpụrụ m nke ofufe onwe onye kwa ụbọchị, A na m egbu ikpere nʻala nʻekpere, nʻakụkụ akwa ndina m ma ọ bụ ndị ezinaụlọ m gbakọtara, ma nʻele onwe m anya ka m na-egbu ikpere nʻala nʻebe ịchụaja niile, na-atụgharị uche ma na-enyocha ndụ m. Ana m eche maka oriri nsọ ahụ, ọbụna iberibe niile nke achịcha, a gbajiri ma dọkasịa maka anyị, nke ọ bụla bụ akara nke ahụ gbajiri agbaji nke Onye Nzọpụta anyị. A na-echetara m maka nkuzi nke Onyeisi Dallin H. Oaks na “mpekele nke achịcha ọ bụla pụrụ iche, dịka ndị na-eri ya pụrụ iche.” Mgbe m gburu ikpere nʻala nʻekpere, Ana m na-eche otu m ga-esi nye Chineke uche m.
Okenye Devid A. Bednar kuziri: “Emume nsọ nke oriri nsọ bụ ọkpụkpọ oku dị nsọ na nke ugboro ugboro ka e chegharịa nʻeziokwu na ka eme ka ọ dị ọhụrụ niime mmụọ. Omume nke ikere oke nke oriri nsọ, niime onwe ya, anaghị agbaghara mmehie niile. Mana dịka anyị ji mkpachapụ anya na-akwado ma na-esonye niime emume nsọ nke a dị nsọ jiri obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị, mgbe ahụ nkwa ahụ bụ na anyị ga-enwe Mmụọ nke Onyenwe anyị mgbe niile ịnọnyere anyị. Ma site n’ike ido nsọ nke Mmụọ Nsọ dị ka onye nsiso anyị mgbe niile, anyị nwere ike debe mgbe niile mgbaghara nke mmehie anyị niile”
Mgbe mụ na Amy leruru anya na ahụmihe niile ndụ anyị, anyị na-eme mmemme onyinye nke ịhụnaanya na ịchụ aja zuru oke nke Jizọs Kraịst. Anyị na-ahụkwa na a tọpụwo iwe nke ọkụ ala mmụọ. Olee otu anyị ga-esi merie anya niile nke ikpe, nchegbu, ịda mba nʻobi, cancer, ọrịa shụga, imegbu mmadụ online, njirimara ezuru nʻohi, afọ ime niile pụrụ apụ, na ọnwụ nke otu nwa, otu nwanne nwoke, na otu nna? Niihi na Jizọs were otu niime iko ilu nke ịma jijiji, iko nke iwe—maka mụ, maka ezi na ụlọ m, maka anyị niile!
Getsemani, site na Adam Abram, Ezi ụma nkesite nʻikike nke altusfineart.com © 2025
“Iko ilu ahụ” Ọ n̄ụrụ niime Ogige nke Gesemena na ntaram ahụhụ Ya “bawanyere” nʻelu obe nke Kalvarị, na-enye anyị ohere itokwasị ndị siri ike, ndị mkparị, ndị ime ihe ike, ndị iwe, na ndị ịma jijiji nʻelu ebe ịchụaja nke Onyenwe anyị ma bụrụ “ndị e doro nsọ site na nnabata nke Mmụọ Nsọ,” mgbe niile.
Nwanne nwanyị Patricia Holland kwuru, “Ekpere kachasị nʻobi m maka gị na maka onwe mụ taa bụ na anyị ga-enyefe kpamkpam, dobe onwe anyị nʻebe ịchụaja nke nkwa niile na udo nke Chineke na-agbanyeghị ebe anyị nọ na na-agbanyeghị ihe anyị mere.”
Ebe maka Ọgwụgwọ na Izu ike
Mgbe anyị bịara nʻebe ịchụaja ahụ, anyị anaghị enweta ụgwọ ọrụ; anyị na-amụta banyere Onye nʻenye Onyinye. Niime mmụta na njikọ ọgbụgba ndụ ahụ na-abịa ọgwụgwọ. Nefi kwuru, “O mejupụtawo m n’ịhụnaanya ya, ọbụna ruo n’iwerecha anụ arụ m.” Ma Onye Nzọpụta anyị hụrụ naanya kpọrọ oku, “Ọ bụ na unu agaghị alaghachikwute m ugbu a, ma chegharịa na mmehie unu, ma gbanwee, ka m nwee ike gwọọ unu?”
Mgbe ụmụ anyị nwanyị abụọ bụ okenye, Mackenzie na Emma, dị obere, otu niime akụkọ kacha amasị ha The Chronicles of Narnia: The Lion, the Witch and the Wardrobe. Anyị niile hụrụ ọdụm ahụ, Aslan naanya. Otu niime abalị niile anyị kacha echeta ịgụ akwụkwọ ahụ bụ mgbe nnukwu ọdụm ahụ nyere ndụ ya maka Edmund. Echefu echefu niihi na ndị nne na nna na ụmụ nwanyị ha bere anya mmiri ka Amoosu Ọcha ahụ buru ndụ ọdụm ahụ nʻelu Tebụl Nkume. Echefu echefu niihi na olile anya digidere, na-agbanyeghị ọdachi ahụ, ruo mgbe ihe dị egwu mere. Mkpọtụ niile nke ọn̄ụ na-ada niime obere ọńụ ụlo ahụ mgbe Aslan bilitere nʻonwu ma sị, “Ọ bụrụ na {Onye amoosu ahụ maara ihe ịchụaja ahụ pụtara}, nʻezie, … ọ gara a{ma} {na ọ bụrụ} na onye dị njikere nke na-emeghị aghụghọ ọ bụla {nwụrụ} nʻọnọdụ onye sabo, Tebụl {Nkume} ahụ ga agbawa ma Ọnwụ nʻonwe ya {ga-amalite na-atụgharị}.”
Jizọs Kraịst na-agwọ ọnya niile. Jizọs Kraịst na-eme ka o kwe omume ịdị ndụ ọzọkwa.
N’okwu ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022 ya, Onyeisi Russell M. Nelson kọwara ndị njem nlegharị anya na-abịa site nʻụlọ mmeghe nke tempụl. Nwata nta nwoke nọ ebe ahụ. Onyeisi Nelson kuziri:
“Mgbe otu ndị njegharị ahụ batara n’ọnụ ụlọ onyinye dị nsọ, nwata nwoke ahụ tụrụ aka ebe nchụaja, ebe ndị mmadụ na-egbisa iji mee ọgbụgba ndụ ha na Chineke, ma sị, “Ewoo, nke ahụ amaka. Ebe a bụ ebe e nwere maka ndị mmadụ izu ike n’oge njem tempụl ha.ʻ
“… O nwere ike bụrụ na ọ maghị gbasara njikọ kwụ ọtọ dị na-agbata anyị na Chineke ime ọgbụgba ndụ na tempụl na nkwa mabigara mma oke nkwa nke Onye Nzọpụta:
“Bịakwutenụ m, unu ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e bokwara ibu dị arọ, ma Mụ ga-enye unu ezumiike.
“Wekwasịnụ onwe unu yok m, ma mụọ ihe banyere m; … ma unu ga-achọta ezumiike nye mkpụrụ obi unu.
“N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ma ibu m dịkwa mfe.ʻ [Matiu 11:28–30; agbakwunyere emesịrị ike}.”
“Nwa nke Mmadụ enweghị ebe itokwasi isi ya,” ma Ọ kpọkuru ndị na-eso ụzọ Ya, gị na mụ, na tebụl oriri nsọ ka ha na Ya zuo ike nʻebe ahụ. Mgbe “mkpụrụ obi niile dị umeala nʻobi nʻegbu ikpere,” udo na-aba ụba. Ogweaka nke Onye Nzọpụta anyị esetipụwo; Agbasawo tebụl Ya Bịanụ fee Ọkpara nke Chineke ofufe nʻebe ịchụaja Ya niile dị nsọ. Site nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen