Ịdị mfe niime Kraịst
Itinye ozizi nke Kraịst ahụ nʻụzọ dị mfe na nke lekwasịrị anya ga-enyere anyị aka chọta ọn̄ụ niime ndụ anyị kwa ụbọchị.
1. Ndubata
Afọ Iri atọ na atọ gara aga, a natara m ọkpụkpọ okù ije ozi dịka onye mgbasa oziọma na Utah Ogden Mission. Nʻezie, nihi a na m abịa site na Europe, ụfọdụ omenala nke Utah ndị dịka “green Jell-O na carrots” na “funeral potatoes” dị m iche naanya!
Kosiladị, ihe metụrụ m niime ime obi bụ ịdị uchu na iso ụzọ nke ọtụtụ Ndị nsọ, igwè mmadụ na-aga ọgbakọ nke Nzukọ nsọ, na atụmatụ niile nke Nzukọ nsọ nke na-eme nʻuju ha. Mgbe mishọn m bịara na njedebe, achọburu m ịhụ na ọn̄ụ m nwetere na ume ime mmụọ na ntolite nke m hụrụ ga-adịkwa adị maka ezi na ụlọ m nke ọdịniihu. Ekpebiri m nʻobi ịlaghachi azụ ozugbo ibi ndụ m niime “onyinyo nke ugwu nta niile nke ebighị ebi.”
Kosiladị, Onyenwe anyị nwere atụmatụ ndị dị iche. Nʻụbọchị Sọnde mbụ m nʻụlọ, bishọp m onye nwere akọ nʻuche kpọrọ m ịje ozi dịka onyeisi Ndịikom Nta niime ngalaba ukwu anyị. Ijere ndịikom nta ọma ndịa ozi, a mụtara m ọsọ ọsọ na ọn̄ụ ahụ na-abịa site na-ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst enwechaghị otu o siri metụta mmadụ ole na-abịa ọgbakọ Nzukọ nsọ ma ọ bụ otu atụmatụ niile si hara.
Nihi ya mgbe m lụrụ ọmarịcha nwunye m Margret, anyị jiri an̄ụrị kpebie ịnọ na Europe ma zulite ezi na ụlọ anyị nʻala nna anyị bụ Germany. Anyị abụọ gbara akaebe ihe Onyeisi Russell M. Nelson kuziri ọtụtụ afọ gara aga: “Ọn̄ụ ahụ anyị na-enwe enwechaghị otu o jiri gbasa ọnọdụ niile nke ndụ anyị kama ọ gbasara nʻụzọ dị ukwuu ihe ndị anyị na-etinye uche na ndụ anyị.” Mgbe nlekwasị anya nke ndụ anyị nọ na Kraịst na ozi nke ozi ọma Ya, anyị ga-enwe nhumiihe nke uju ngọzị niile nke ịbụ onye na-eso ụzọ nʻebe ọbụla anyị bi.
2. Ịdị mfe Ahụ Nke Nọ nime Kraịst
Kosiladị, niime ụwa nke a na-abawanye nʻichefu okpukperechi, na-esi ike, ma na-agbagwoju anya, nke nwere ọtụtụ ozi dị iche iche ma na-achọ ọtụtụ ihe nʻaka anyị, kedụ otu anyị ga-esi gbochie anya anyị ikpu isi na obi anyị isi ike ma gaaniihu na-elekwasị anya na ozi ọma nke Jizọs Kraịst nke dị “mfe nghọta ma dị oke ọnụ ahịa”? Nʻoge mgbagwoju anya, Onye Ozi Pọl nyere Ndị nsọ Kọrịnt nnukwu ndụmọdụ site na ịchetara ha ka ha lekwasị anya na “ịdị mfe ahụ nke nọ niime Kraịst.”
Ozizi nke Kraịst na iwu nke ozi ọma ahụ dị nnọọ mfe nke mere na ọbụnadị ụmụntakịrị nwere ike ighọta ha. Anyị nwere ike nata ike mgbapụta nke Jizọs Kraịst ma nata ngọzi niile nke ime mmụọ nke Nna anyị nke Eluigwe kwadoro anyị site na-itinye okwukwe anyị na Kraịst nʻọrụ, ime baptizim, ido nsọ site na onyinye nke Mmụọ Nsọ, na ịnagide ruo ọgwụgwụ. Onyeisi Nelson kọwara njem nke a nʻụzọ mara mma dịka “okporo ụzọ nke ọgbụgba ndụ” na usoro ịbụ “onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi.”
Ọ bụrụ na ozi nke a dị mfe, gịnị kpatara o ji adịkarị ka ihe ịma aka ibi iwu nke Kraịst na isoro ọmụmatụ Ya? O nwere ike bụrụ na anyị ghọtaghiere ịdị mfe dịka ihe na araghị ahụ imezu ma a na-etinyeghi mbọ ma ọ bụ nrụsi ọrụ ike. Isoro Kraịst chọrọ mbọ na-esepụghị aka na mgbanwe na-aganiihu. Anyị kwesịrị “[iyipụ] mmadụ nkịtị ma … [dịrị ka nwata] ntakịrị.” Nke a gụnyere idebe “ntụkwasị obi anyị nʻebe Onyenwe anyị nọ” ma wezuga ihe isiike ahụ dị na ya, dị ka ụmụ ntakịrị sị eme. Itinye ozizi nke Kraịst ahụ nʻọrụ nʻụzọ dị mfe na nke lekwasịrị anya ga-enyere anyị aka chọta ọn̄ụ niime ndụ anyị kwa ụbọchị, nye odudu niime ọkpụkpọ okù anyị, zaa ụfọdu ajụjụ ndị siri ike na ndụ, ma rọpụta ume iji zute ihe ịma aka niile na-abịara anyị.
Mana olee otu anyị ga-esi na-eme ihe nke a dị mfe na njem ogologo ndụ anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst? Onyeisi Nelson echeteworo anyị ka anyị lekwasị anya na “eziokwu na-enweghi ntupọ, ozizi na-enweghi ntupọ, na mkpughe na-enweghi ntupọ” dịka anyị na-achọsike isoro Onye Nzọpụta. Ịjụ ajụjụ a mgbe niile, “Kedụ ihe Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ga-achọ ka m mee?” na-ekpughe nnukwu odudu. Isoro ọmụmatụ Ya na-arọpụta ụzọ nwere nchekwa gafee mgbagwoju anya na aka odudu dị ịhụnaanya nke anyị ga-ejide site nʻụbọchị ruo nʻụbọchị. Ọ bụ Onyeisi Udo na Onye ọzụzụ atụrụ Ọma. Ọ bụ Onye Nkasị obi na Onye Mgbapụta anyị. Ọ bụ Nkume na ebe Mgbaba anyị. Ọ bụ enyi—enyi gị na enyi m! Ọ na-akpoku anyị niile ka anyị hụ Chineke naanya, dobe iwu nsọ Ya niile, ma hụ ndị agbataobi anyị naanya.
Dịka anyị na-ahọrọ isoro ọmụmatụ Ya ma gaa niihu jiri okwukwe niime Kraịst, nabata ike Aja mgbaghara mmehie Ya, ma cheta ọgbụgba ndụ anyị, ịhụnaanya ga-ejuputa nʻobi anyị, olileanya na ọgwụgwọ ga-ebuli mmụọ anyị, ma ekworo na iri uju ga-apụ ka obi ekele were ọnọdụ ya na ndidi iji chere ngọzi niile ekwere na nkwa. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike dị mkpa iwezuga onwe anyị site nʻọnọdụ ndị na-adịghị mma ma ọ bụ chọọ enyemaka site nʻaka ndị ọkacha mara. Mana niime ọnọdụ nke ọbụla, itinye ụkpụrụ niile nke ozi ọma nʻọrụ ga-enyere anyị aka na-agafe site nʻihe ịma aka nke ndụ nʻụzọ nke Onyenwe anyị.
Mgbe ụfọdụ anyị na-ebelata ume ahụ anyị na-anata site nʻihe ndị ahụ dị mfe dịka ekpere, ibu ọnụ, ọmụmụ akwụkwọ nsọ, nchegharị kwa ụbọchị, iri oriri nsọ kwa izu, na ịga nʻụlọ nke Onyenwe anyị mgbe niile. Mana mgbe anyị chetara na anyị ekwesịchaghị “ịme otu ihe dị nnukwu” ma anyị etinye ozizi ahụ ntụpọ adịghi na nke dị mfe nime ndụ anyị, anyị ga-ebido hụwa otu ozi ọma ahụ si “arụ ọrụ nʻụzọ dị ịtụnaanya” nye anyị, ọbụnadị nʻoge ndị ahụ kachasị sie ike. Anyị ga-achọta ume na “obisike nʻihu Chineke,” ọbụnadị mgbe anyị na-enwe obi mgbu. Okenye M. Russell Ballard echetaworo anyị ọtụtụ mgbe, “Ọ bụ niime ịdị mfẹ ahụ ka [anyị] ga-achọta … udo, ọn̄ụ, na an̄ụrị.”
Itinye ịdị mfe ahụ nke nọ niime Kraịst nʻọrụ na-eme anyị ewere mmadụ dịka ihe ka mkpa karịa usoro na njikọ ebighị ebi karịa agwa niile nke nwa ntịntị oge. Anyị elekwasị anya nʻelu “ihe ndị ahụ kacha dị mkpa” niime ọrụ Chineke nke nzọpụta na mbuli elu kama ị nọ na nhazi ije ozi nlekọta anyị. Anyị enwere onwe anyị site na-itinye uche n’ihe ndị ahụ anyị nwere ike ime, kama ibokwasị onwe anyị ibu ihe ndị ahụ anyị na-apụghị ime. Onyenwe anyị chetara anyị sị: “Ya mere, ike agwụla unu n’obi na-ime ihe ọma, n’ihi na unu na-atọ ntọala nke ọrụ dị ukwuu. Ma site n’ihe nta niile ka ihe dị ukwuu si apụta.” Nke a bụ mgbam ume dị ike iji mee ihe nʻụzọ dị mfe na nke obi umeala, na-agbanyeghi otu ọnọdụ anyị sịrị dị.
3. Oma Cziesla
Nneukwu m Marta Cziesla (nwanyị nke a nọ nʻaka nri na ihe osise a) bụ ezigbo ọmụmatụ nke ime “ihe ndị dị nta na nke dị mfe” iji mee ka nnukwu ihe bịa na mmezu. Anyị ji obi ịhụnaanya akpọ ya Oma Cziesla. Oma nabatara ozi ọma nʻobodo ntakịrị nke nọ na Selbongen na East Prussia ya na nne nke ukwu ukwu m nʻọnwa May 30, 1926.
Marta Cziesla (nʻaka nri) nʻụbọchị baptizim ya.
Ọ hụrụ Onyenwe anyị na ozi ọma Ya naanya ma kpebie obi idebe ọgbụgba ndụ niile nke ọ gbara. N’afọ 1930 ọ lụrụ nnaukwu m, onye na-abụghị onye otù Nzukọ nsọ. Nʻoge nke a ọ kweghị omume na Oma ga-aga ọgbakọ nke Nzukọ nsọ, niihi ubi nnaukwu m nọ ebe tere ezigbo aka site na igwè ndị ụka kacha nso. Mana o lekwasịrị anya nʻihe o nwere ike ime. Oma garaniihu ịkpe ekpere, ịgụ akwụkwọ nsọ niile, ma ịbụ abụ niile nke Zayọn.
Ụfọdụ ndị mmadụ nwere ike chee na ọ kwụsịchazighi ike nʻokwukwe ya, mana nke ahụ abụghị eziokwu. Mgbe a mụrụ danne m na nna m, na-enweghị ọkwa nchụaja nʻebe obibi ahụ ma na-enweghị ọgbakọ Nzukọ nsọ ma ọ bụ ohere ịnata emume nsọ nʻebe dị nso, ọzọkwa o mere ihe ahụ o nwere ike ime ma lekwasị anya na-ikuziri ụmụ ya “ikpe ekpere, na igazi ije n’ihu Onyenwe anyị.” Ọ gụụrụ ha ihe site na akwụkwọ nsọ, ya na ha abụọ abụ nke Zayọn, ma nʻezie kpee ekpere ya na na ha—ụbọchị niile. Nke a bụ nhụmiihe Nzukọ nsọ nke dabere nʻebe obibi kpam kpam.
Na 1945 nnaukwu m nọ na-alụ agha nʻebe dị anya site nʻebe obibi ha. Mgbe ndị iro bịarutere ubi ha nso, Oma kpọrọ ụmụ ntakịrị ya abụọ ma hapụ ọmarịcha ubi ha iji chọọ ebe mgbaba nʻebe nwere ezi nchekwa. Mgbe ha mechara njem siri ezigbo ike nke nwere ike ibibi ndụ, ha mechara chọta mgbaba nʻọnwa Me nke afọ 1945 na mpaghara ugwu nke Germany. Enweghi ihe ha nwere ma ọ bụghị uwe nke kpuchiri ahụ ha. Mana Oma garaniihu na-eme ihe ọ nwere ike ime: o kpere ekpere ya na ụmụ ya—ụbọchị niile—ụbọchị niile. Ya na ha bụkọtara abụ nke Zayọn nke o buru nʻisi—ụbọchị niile.
Ndụ siri ezigbote ike ma ruo ọtụtụ afọ o lekwasịrị anya naanị na-ịhụ na nri dị na tebụl. Mana nʻafọ 1955 nna m, mgbe ahụ dị afọ 17, na-aga ụlọ akwụkwọ ịmụta aka ọrụ nʻobodo ukwu Rendsburg. Ọ gafere otu ụlọ ma hụ ihe edere nʻezi nke bụ “Kirche Jesu Christi der Heiligen der Letzten Tage”—“Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a.” Ọ chere nʻobi ya, “Nke a dị ịtụnanya; nke a bụ nzukọ nsọ Nne m.” Niihi ya, mgbe ọ lọtara ụlọ, ọ gwara Oma na ọ chọtawo nzukọ nsọ ya.
Ị nwere ike ịtule nʻuche ụdị mmetụta o nwere na ihe karịrị afọ 25 o zutebeghị Nzukọ nsọ. O kpebiri nʻobi ị gaa na Sọnde na-esote ma mee ka nna m kwere isoro ya. Rendsburg karịrị maịlụ 20 (32 km) site nʻobodo ntakịrị ahụ ha biiri. Mana nke a agaghị egbochi Oma ịga nzukọ nsọ. Na Sọnde na-esote, o rigoro na igwe ya ya na nna m ma nyara gawa nzukọ nsọ.
Mgbe ọgbakọ oriri nsọ bidoro, nna m nọdụrụ ọdụ nʻazụ azụ, na-atụ anya na ọ ga-agwụ ọsọ ọsọ. Nke a bụ Nzukọ nsọ Oma ma ọ bụghị nke ya. Ihe ọ hụrụ ejughị ya anya: naanị agadi nwanyị ole nʻole nọ nʻebe ahụ ha na ndị mgbasa oziọma ntoroọbịa abụọ na-ahụ na ihe na-aga nke ọma nʻọgbakọ ahụ. Mana ha malitere bụwa abụ, ma ha bụrụ abụ nke Zayọn nke nna m nụrụ kemgbe ọ bụ nwata nwoke ntakịrị: “Bịa, Bịa, Unu Ndị nsọ,” “O Nna M,” “Otito dịrị Nwoke Ahụ.” Ịnụ dịka igwè ndị ụka ntakịrị a na-abụ abụ nke Zayọn ndị ahụ ọ mara kemgbe nwata ya rukpuru obi ya, ma ọ maara ozugbo ahụ ma na-enweghị obi abụọ ọbụla na Nzukọ nsọ ahụ bụ eziokwu.
Ọgbakọ oriri nsọ nke mbụ ahụ nneukwu m gara ihe gafere afọ 25 bụ ọgbakọ ebe nna m natara akaebe nke onwe banyere ịbụ eziokwu nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere. Emere ya baptizim mgbe izuụka atọ gafere, na Septemba 25, 1955, ya na nnaukwu m na danne m.
Ọ gafewo afọ 70 kemgbe emere ọgbakọ ntakịrị ahụ na Rendsburg. Mgbe na mgbe ka m na-echekarị banyere Oma, ụdị mmetụta o nwere nʻabali niile ahụ naanị ya nọ, na-eme ihe ndị dị ntakịrị na mfe nke o nwere ike ime, dịka ịkpe ekpere, ịgụ ihe na ịbụ abụ. Dị ka m guzoro nʻebe a taa nʻọgbakọ zuru ọha ma kwuo banyere Oma m, mkpebi obi ya idebe ọgbụgba ndụ ya niile na ịtụkwasị obi nʻOnyenwe anyị na-agbanyeghị ndọlị ya niile juputara obi m nʻumeala na obi ekele—na-abụghị naanị maka ya kama maka ọtụtụ Ndị nsọ dị ịtụnaanya juru gburugburu ụwa ndị na-elekwasị anya nʻịdị mfe dị niime Kraịst nʻoge ọnọdụ niile nke ịma aka ha, ikekwe na-ahụ sọọsọ mgbanwe dị ntakịrị ugbua mana tụkwasị obi nʻihe ndị dị ukwuu ga-abịa na mmezu otu ụbọchị nʻọdịniihu.
4. Ihe niile ndị dị Ntakịri ma dị Mfe
A mụtawo m site na nhụmiihe nke m na ihe niile dị ntakịri ma dị mfe nke ozi ọma na iji nkwesị ntụkwasị obi elekwasị anya na Kraịst na-eduru anyị rute ebe ezi ọn̄ụ dị, rọpụta nnukwu ọrụ ebube, ma nye anyị obisiike iji kwere na ngọzi niile ekwere na nkwa ga-abịa na mmezu. Nke a bụkwa eziokwu nye gị dịka otu o si bụrụkwa eziokwu nye mụ. Nʻokwu nke Onyeisi Jeffrey R. Holland, “Ụfọdụ ngọzi na-abịa ọsọ ọsọ, ụfọdụ anaghị abịa ọsọ ọsọ, ma ụfọdụ anaghị abịa tutu ruo nʻeluigwe; mana maka ndị ahụ nabatara oziọma nke Jizọs Kraịst, ha na-abịa.” Nke a ka m na-agbakwa ama ya n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.