Ọgbakọ Zuru ọha
Ọkwa a mara nye Ezi na ụlọ—Okwu niile sitere nʻaka Chineke
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


13:57

Ọkwa a mara nye Ezi na ụlọ—Okwu niile sitere nʻaka Chineke

Ọkwa ahụ si n’igwe bịa, niihi ya anyị kwesịrịrị imeso ya agwa nsọpụrụ ụdị ndị ahụ tozuru okè ịnye okwu ndị sitere na Chineke.

Na ọgbakọ zuru ọha nke Ọktoba nke a, ka a ga-eme mmemme ncheta afọ 30 nke ekwuputara “Ezi na ụlọ: Ọkwa A Mara nye Ụwa.” Site na nhazi si nʻigwe, ọkwa nke a, ya na okwu niile nke mkpughe ya, ka ekepụtara iji “kwado ma gbaa ezinaụlọ ume dịka ntọala nke obodo.”

Onye ọbụla sonyere na otu ezinaụlọ, ma ịbụ nne, nna, nwa nwanyị, nwa nwoke, nwanwa, nne na nna ukwu, danne, deede, nwanne nwoke, nwanne nwanyị ma ọbụ nwanna. Nke kacha mkpa, onye ọbụla niime anyị, dịka ọkwa ahụ kwuru bụ “nwada nke nne na nna nke eluigwe … [nwere] ọdịdị dị nsọ na akaraka dị si nʻigwe.”

Mgbe akpọrọ m ịbata ije ozi nke ndịozi dị nsọ na 2015, enyere m ndụmọdụ na “Ọkwa nke a buzi nke gị. Aha gị [na-arụtụ aka nʻokwu ahụ ʻKansụl nke Ndịozi Iri Abụọʻ nọ na etutu aha ahụ] nọ nnọọ ebe a. Metụ ya aka ma kuzie ya dịka ọ bụ gị nwee ya.”

Ahụrụ m ọkwa a maara ezi na ụlọ naanya. Agbawo m akaebe gburugburu ụwa bido na Afrịịka ruo Australia na ebe niile nọ nʻetiti maka oke nʻọrụ nke ezinaụlo niime atụmatụ ebighị ebi nke Chineke. Ọkwa ahụ si n’igwe bịa, niihi ya anyị kwesịrịrị imeso ya agwa jiri okwu ndị dị nsọpụrụ sitere na Chineke.

Cheta, ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, dịka m kwuru nʻọgbakọ zuru ọha emere nʻoge nke a gara aga site n’ikpo okwu nke a, “Okwu dị mkpa.”

Ka m kọọrọ unu ụfọdụ ihe ndị mere nʻazụ banyere ọkwà ahụ dịka ọkpụrụkpụ ozi nke ihe anyị kwere.

Na 1994, otu afọ tupu ewepụta ọkwa ahụ, Kworum nke Ndịozi Iri na Abụọ kparịtara ụka otu obodo na ndị ọchịchị si na-ewezuga onwe ha site nʻiwu nke Chineke nyere maka ezinaụlo, alụmalụ, na okike ọmụmụ. “Kama nke ahụ abụghị njedebe nke ihe anyị hụrụ,” Onyeisi Russell M. Nelson kọwara mgbe emesịrị. “Anyị pụrụ ịhụ mgbalị niile nke ọtụtụ obodo na-eme iwepụ ụkpụrụ niile na okè niile gbasara iwu mmekọrịta. Anyị hụrụ mgbagwoju anya nke okike ọmụmụ. Anyị pụrụ ịhụ ihe ndị a niile na-abia.”

Ndị Iri na Abụọ ahụ kpebiri ịrọpụta otu akwụkwọ, otu nkwupụta enyere ikike, nke ga-achịkọta nkuzi Nzukọ nsọ nwere maka ezinaụlọ. Nʻafọ ahụ, Ndịozi ndị ahụ, ndị ọhụụ Chineke kpọrọ okù, kwadoro otu nkwuputa banyere ezinaụlọ. Onyeisi Dallin H. Oaks chetara na ha jiri ekpere chigharịa nʻebe Onyenwe anyị nọ maka “ihe [ha] kwesịrị ikwu na otu [ha] kwesịrị iji kwuo ya.” Ha kwuputara ya nye Otù Ndịisi Mbụ: Ndịisi—Howard W. Hunter, Gordon B. Hinckley, na Thomas S. Monson—maka nlebara anya ha.

Naanị ka ọnwa ole ma ole gasịrị, na Maachị 1995, Onyeisi Hunter anwụọ ma Onyeisi Hinckley abụrụ Onyeisi Nzukọ nsọ nke ugboro 15. Ọkwa ahụ nọ zi nʻaka ya ugbu a. Kedụ mgbe ga-abụ ezi oge iji kwuputara Nzukọ nsọ ozi a? Oge ahụ bịara mgbe ọnwa isii gachara.

Ụbọchị ndị tupu eme ọgbakọ zuru ọha nke Otù Enyem Aka na Septemba 23 nke emere tupu ọgbakọ zuru ọha, Onyeisi Hinckley na ndị ndụmọdụ ya zutere ha na Ndịisi Zuru ọha nke Otù Enyemaka. Ndị ụmụnne nwanyị ndị a, dịkwa ka Ndịozi, nakwa akparịta ụka banyere ndịinyom na ezinaụlọ. Ha tụkwasịrị anya nʻihe banyere ezinaụlọ maka ọgbakọ ha nke na-abịa niihu.

Onyeisi Hinckley ka enyere ohere ikwuuru ndịinyom nʻọgbakọ ahụ okwu. Ọ nọkwa na-atụle ihe ọ ga-ekwu maka ya. Dịka mkparịta ụka ahụ na-aga niihu, ọ rụtụrụ aka nʻakwụkwọ ahụ arọpụtara ọhụrụ ma agwabeghị ya ndị ọha “Ezi na ụlọ: Ọkwa A Mara nye Ụwa.” Ọgbakọ ndịinyom nke a ọ ga-abụ ebe kacha mma iji kwuputa ọkwa ahụ banyere ezinaụlọ?

Onyeisi Zuruọha nke Otù Enyemaka bụ Elaine Jack kọwara mgbe emesịrị: “Anyị amaghị ihe Okwa a mara maka Ezinaụlọ bụ nʻoge ahụ. … [Anyị] nwere ntakịrị nghọta site nʻaha ya, mana anyị maara na ihe ọbụla gbasara ezinaụlọ … ga-abụ ihe ọma. … A maara m nke ọma na anyị nweburu ndị otù Kworum nke Iri na Abụọ ndị na-anata mkpughe.”

Ọgbakọ nke Otù Enyemaka na Satọde ahụ bụ nke tozuru oke nʻagụgụala. Onyeisi Hinckley dubatara ọkwa amara nye ezinụlọ jiri okwu ndị a dị mkpa: “Niihi ọtụtụ ọkaibe ndị a na-ewere ugbu a dị ka eziokwu, niihi ọtụtụ aghụghọ gbasara ụkpụrụ na omume niile, niihi ọtụtụ ihe ndị na-adọ akpịrị ndị na-eji nwayọ nwayọ emetọ ụwa, anyị enwewo mmetụta ịdọ aka na ntị … maka ụkpụrụ niile, ozizi, na omume niile nke metụtara ezinaụlọ nke ndị amụma, ndị ọhụ uzọ, na ndị mkpughe nke nzukọ nsọ nke a kwuworo maka ha ugboro ugboro kemgbe agụgụala ya.”

Mgbe ahụ ọ gụpụtara ọkwa ahụ kpamkpam. Dị ka Onyenwe anyị siworo kwuo, “Ma ọ bụ site n’olu nke mụ onwe m ma ọ bụ site n’olu nke ụmụ odibo m, ọ bụkwa otu ihe ahụ.”

Ọkwa ahụ kwuru sị, “Ezinaụlọ bụ ihe Chineke hiwere.” A hụrụ m ido anya nke nkwupụta nke ahụ naanya. Ọkwa ahụ bụ ọkpụkpọ okù maka anyị ibi niime ụwa nke a, wee buru nʻuche mgbe niile akaraka si nʻigwe nke dị anyị niime, nakwa ọdịniihu ebighị ebi nke chere anyị nihu. Onyeisi Nelson kwuru: “Unu bụ ụmụ Chineke nke mmụọ n’ezie n’ezie. … Enwekwala nghọtahie gbasara ya: Ike mmepụta unu si na chi. Jiri obi nchọsike unu, Chineke ga-enyetu unu ohere ị hụ onye unu nwere ike ị bụ.”

Mgbe agụpụtara ya, ọkwa ahụ adabaghị dịka echiche ọtụtụ ndị mmadụ sịrị dị nʻụwa. Ọ dabaghị mgbe ahụ. Ọ dabaghị ugbu a. Ma e nwere ndị na-anabataghị ihe ọkwa ahụ kwuru banyere ezinaụlọ, alụmalụ na okike ọmụmụ. Ụfọdụ na-atụ aro ka Nzukọ nsọ kwugharịa okwu, gbanwee ọnọdụ ma ọ bụ wezuga kpamkpam ọkwa ahụ.

Ọkwa ahụ a mara nye ezinaụlọ bụ, dịka Onyeisi Hinckley kwuru, ozizi, ụmụnne m ọma ndị nwoke na ndị nwanyị. Ụkpụrụ ndị ahụ abụghị nke na-ezighị ezi mana ọ dabara adaba nʻụzọ zuru okè dịka otu ụzọ nke Onyenwe anyị na ọgbụgba ndụ Ya sịrị dị. Nkuzi niile nke ọkwa ahụ ka ekpughere site nʻaka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nye Ndịozi Ya mgbe ahụ na ugbu a. Nke a bụ Nzukọ nsọ Ya, O hiwewo eziokwu niile nke anyị ga-ebi dịka ha sịrị dị.

Ụfọdụ niime unu nwere ike tụgharịa uche nʻọkwa ahụ ma kwuo, “Nke abụghị maka mụ.” “Ọ cheghị maka ọnọdụ m.” “Ezinaụlọ m eyighị otu ahụ.” “Esonyeghị m niime nke a.”

Maka ndị nwere ụdị nchekasị obi ndị a, mara na ịbụ nwa nke nne na nna nke eluigwe, ịbụ otu akụkụ nke ezinaụlọ nke Nna nke Eluigwe. Enweghi onye mara gị nke ọma ma ọ bụ na-elekọta gị nʻụzọ dị omimi karịa otu O si eme. Chigharịa nʻebe Ọ nọ; wụpụta obi gị nye Ya; tụkwasị obi na Ya ma na nkwa Ya niile. I nwere ezinaụlọ niime Onye Nzọpụta gị, Jizọs Kraịst, onye hụrụ gị n’anya. Ọ bịara nʻụwa iji chụọ aja maka mmehie anyị ma buo ibu nke njehie anyị niile na ụbọchị niile nke anyị na-adịghị mma. Ọ ghọtara ihe ị na-agabiga na ihe na emetụta gị. Chigharịa nʻebe Ọ nọ; tụkwasị obi ma Ọ ga-ezite Mmụọ Nsọ ịnọnyere gị, bulie gị, ma duo gị. Nwee mmetụta ịhụnaanya Ha nke “wụpụtara onwe ya n’ebe niile niime obi niile nke ụmụ nke mmadụ; … ọ bụ ihe kwesịrị onwunwe karịa ihe niile … na nke karịchara obi ụtọ nye mkpụrụ obi.”

Ndịozi niile nke Onyenwe anyị hụrụ unu naanya nke ukwuu. Anyị na-ekpere unu ekpere ma chọọ odudu nke Onyenwe anyị maka unu. Nọnyere anyị. Unu bi nʻoge niile nke ịma aka mgbe onye iro na-achọ ime ka unu bụru nke ya. Ekwekwala ka adọpụta unu nʻụzọ. Ma ọ bụrụ na unu emewo otu a, bịaghachi azụ. Ogweaka anyị niile na-esetịpụ nʻebe unu nọ nakwa nke ndị ahụ hụrụ unu naanya.

Ọkwa ahụ kwuru sị, “Ndị nne na nna nwere oke nʻọrụ dị nsọ izulite ụmụ ha nʻịhụnanya na ezi omume.” Akwụkwọ nke Mọmọn bụ akaebe nke abụọ banyere eziokwu nke a. Na amaokwu nke mbụ niime isi nke mbụ, anyị na-agụ, “Mụ Nifaị, ebe a mụrụ m site n’ezi nne na nna.” Ole mmadụ ole niime anyị ndị bidoro Akwụkwọ nke Mọmọn—ma bido ọzọ na ọzọkwa—ma site nʻusoro nke a buruzie okwu niile ahụ nʻisi? Kanye ha niime obi.

Otu niime okwu ndị na-amasịm dị niime ọkwa hụ bụ nke a: “Obi ụtọ na ndụ ezinaụlọ bụ ihe a ga-akachasị enweta mgbe e wukwasịrị ya n’elu nkuzi niile nke … Jizọs Kraịst.”

Kedụ onye na-achọghị ịnwe obi ụtọ?

Ma kedụ ihe bụ nkuzi niile nke Jizọs Kraịst? Ọzọ, niime ọkwa hụ: “Okwukwe, ekpere, nchegharị, mgbaghara, nsọpụrụ, ịhụnanya, ọmịiko, ọrụ, ọtụtụ egwuregwu dị nma.”

Kedụ onye ndụ ya na agaghị adịkwu mma karịa nihi itinye ụkpụrụ ndị a dị mkpa nʻọru? Enweghị onye niime anyị ga-eme ya nʻụzọ zuru okè; mana anyị nwere ike soro okwu amamiihe nke Onyeisi Hinckley ndị a: “Mee ike gị niile.”

Anyị na-agụ site nʻọkwa ahụ, “Ndị nna ga-eduzi nʻịhụnaanya na nʻezi omume,” ma “ndị nne ka enyere ọrụ ọzụzụ nke ụmụ ha.” Nduzi apụtaghị ọchịchị aka ike, ma ọzụzụ apụtaghị na ọ bụ oke nʻọrụ nke dị nta. Chineke enyewo ndịikom na ndịinyom ọrụ dị iche iche na nke dị nhata aha ma dịkwa mkpa iji nyerekọrịta onwe ka aka.

Ka m kọọ otu akụkọ nke onwe.

Mụ na nwunye m mụtara ịrụkọta ọrụ dịka ndị dị nhata aha, mana otu ụbọchị mgbe m mere otu mkpebi obi dị mkpa na-agakwughị ya maka ndụmọdụ. Omume m tụrụ ya naanya, wee gbagwojuo ya anya, ma debe ya niime ọnọdụ rara ezigbo ahụ. Mgbe emesịrị, o dobere aka ya nʻelu ubu m ma kwuo nʻolu doro anya, “Ron, biko, akpasikwala m ụdị agwa ahụ ọzọ.” Kemgbe ahụ ukwu anyị bụ otu.

Anyị na-achọta nime ọkwa amara nye ezinụlọ: “Ndị nne na nna nwere ọrụ inyeritara otu onye na ibe ya aka dịka ndị nrụkọ ọrụ dị ahata aha.”

Nhata aha bụ otu okwu dị mkpa. Kemgbe afọ ndị ahụ dika Nwanne nwanyị Rasband na mụ rụkọtara ọrụ ọnụ nʻihe ọkwa ahụ kọwara dịka “oke na ọrụ anyị dị nsọ,” anyị emewo ka alụmalụ mụ na ya bụrụ nke nhata aha. Ebe ụmụ anyị emewo alụmalụ ugbua, Nwanne nwanyị Rasband na mụ gara niihu nye ndụmọdụ ha na ndị di ma ọ bụ ndị nwunye ha maka otu esi abụ ndị ha otu.

Mgbe anyị na-ebi ndụ ma jiri anya anyị na-elekwasị naanị n’otuto nke Chineke, anyị na-asọpụrụ ibe anyị ma na-akwado ibe anyị. Usoro ezi omume nke a dị nsọ na-eme ka anyị niile n’otu n’otu, ezinaụlọ anyị na obodo ghara ịbụ ndị a na-akwagharị akwagharị.

Nna anyị nke Eluigwe arọpụtawo ọkwa a mara nye ezinaụlọ iji nye aka duo anyị lota nʻebe Ọ nọ, iji nyere anyị aka mụta ihe, ma juputa nʻịhụnaanya, ume, ebumnuche, na nghọta ebighị ebi. Jiri mkpụrụ obi m niile, ana m arịọ ka i biri nso nʻebe Ya na Ọkpara Ọ Hụrụ naanya nọ. Ana m ekwe nkwa na dịka ị na-eme otu a, Mmụọ ahụ ga-akpake ma duru gị ma nyere gị aka mata niime obi gị udo ahụ Ha kwere na nkwa nke “gafere nghọta niile.” Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  2. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  3. Lee Ronald A. Rasband, “Okwu niile Dị Mkpa,” Liahona, Me 2024, 70, 75–76.

  4. Lee Sheri Dew, Nghọta ndị sitere na Ndụ Onye amụma: Russell M. Nelson (2019), 208.

  5. Nke a abụghị ọkwa mbụ enyere ikike nke Nzukọ nsọ. Tupuu nke 1995 “Ezịnaụlọ: Ọkwa amara nye Ụwa,” enwere ọkwa ndị ọzọ nagụgụala nke Nzukọ nsọ nʻafọ 1841, 1845, 1865, and 1980.Hiburu 1845:1865Abraham 3:181980 Ọkwa nke ikpeazụ ka enyere na 2020: “Mweghachite n’Uju nke Ozi ọma nke Jizọs Kraịst: Ịma Ọkwa Emume ncheta Narị Afọ Abụọ nye Ụwa.” (Lee Emma Benson, “Ihe Anyị Na-amụta site na Nkuputa niile nke Mweghachite” digital-only article], Liahona, Dec. 2021, Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.)

  6. Dallin H. Oaks, “Atụmatụ ahụ na Ọkwa ahụ,” Liahona, Nov. 2017, 30.

  7. Lee Dew, Nghọta ndị sitere na Ndụ Onye amụma, 209–10.

  8. Lee Barbara Morgan Gardner and Olivia Osguthorpe, “Delivering the Family Proclamation: Insights from Former Relief Society President Elaine L. Jack,” Religious Educator, vol. 24, no. 2 (2023), 164.

  9. Lee Gardner and Osguthorpe, “Delivering the Family Proclamation,” 162–65; lee kwa Elaine L. Jack, “Otù Enyem aka: Otu Balm na Gilead,” Ensign, Nov. 1995, 92. N’okwu ya, Onyeisi Jack kuziri: “Ezinụlọ na-ewetere anyị nnukwu ọn̄ụ na mgbe ụfọdụ obi mgbawa anyị kacha agbawa agbawa. Ezinụlọ na-arọpụta ebe enwere ike ịnwe mmụta, ụlọ akwụkwọ nke anyị na-agaghị agụcha agụcha mana anyị nwere ike ịmụta ihe mgbe niile. Nime ezinụlọ anyị na-amụta ịnwere obi ekele maka udo nke ime mmụọ na-abịa site na-itinye ụkpụrụ ndịa nʻọrụ, afọ ọma, ndidi, ịkesaa, ịkwụwa aka ọtọ, obe ebere, mmesapụ aka, njide onwe na ije ozi. Ndị a karịrị ụkpụrụ ezinụlọ, ụmụnne nwanyị; ndị a bụ ụzọ ndụ nke Onyenwe anyị.

    Okenye Dallin H. Oaks, onyeisioche nke Kansụl Ọkwa nchụaja nʻoge ahụ, bịakwara nzukọ ahụ (lee Gardner and Osguthorpe, “Delivering the Family Proclamation,” 167).

  10. Lee Gardner and Osguthorpe, “Delivering the Family Proclamation,” 165.

  11. “Ezịnaụlọ: Ọkwa amara nye Ụwa” ga-abụ ọkwa nke mbụ nke Nzukọ nsọ kemgbe Eprel 6, 1830. Ruo mgbe ahụ, Nzukọ nsọ ewepụtala naanị ọkwa ise enyere ikike, na-ekwu banyere ozizi, okwukwe, agụgụala, ịdọ aka na ntị, ịkpọ okù na okwu niile banyere uto na ọganihu nke Nzukọ nsọ (see Encyclopedia of Mormonism [1992], “Proclamations of the First Presidency and the Quorum of the Twelve Apostles,” 3:1151–57).

  12. Elaine L. Jack, in Gardner and Osguthorpe, “Delivering the Family Proclamation,” 166.

  13. Gordon B. Hinckley, “Kwusie ike megide Aghụghọ nile nke Ụwa,” Ensign, Nov. 1995, 100. Niime ọgbakọ zuru ọha nke Ọktoba 1976, Onyeisi Spencer W. Kimball n̄omiri onye odee America, onye kwuru, “N’ime agụgụala niile, mba dị iche iche enwewo ike ịlanarị ọtụtụ ọrịa, mbuso agha, ụnwụ nri, ala ọmajiji, ọrịa na-efe efe, ịda mbà n’obi, mana ha enwebeghị ike ịlanarị ndakpọ nke ezinụlọ.” (in “A Report and a Challenge,” Ensign, Nov. 1976, 7–8).

  14. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:38

  15. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  16. Russell M. Nelson, “Nhọrọ niile maka Ebighị ebi” (worldwide devotional for young adults, May 15, 2022), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  17. Gordon B. Hinckley, “Kwusie ike megide Aghụghọ nile nke Ụwa,” 100.

  18. Lee “Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa amara nye Ụwa,” Ọba Akwụkwọ nke Ozi ọma.

  19. 1 Nefi 11:22–23

  20. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  21. 1 Nefi 1:1

  22. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  23. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  24. Gordon B. Hinckley, “Ndị inyom nke Nzukọ nsọ,” Ensign,, Nov. 1996, 67.

  25. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma. “Mgbe ọ na-enweghị di ma ọ bụ nna n’ụlọ, nne na-elekọta ezinụlọ ya.” (Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, 2.1.3).

  26. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  27. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  28. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  29. Niime ọgbakọ izugbe nke Ọktoba 1991, Onyeisi Gordon B. Hinckley kuziri na Adam na Iv “guzoro n’akụkụ n’akụkụ niime ubi ahụ. A chụpụrụ ha ọnụ n’ogige ahụ, ha na-arụkọkwa ọrụ n’akụkụ n’akụkụ na-inweta nri ha site n’ọsụsọ na-agba ha.” (“Our Solemn Responsibilities,” Ensign, Nov. 1991, 51).

  30. Ndị Filipaị 4:7