Ọgbakọ Zuru ọha
Ụzọmmepụta Ozi ahụ Dị Mma
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


10:38

Ụzọmmepụta Ozi ahụ Dị Mma

Kedu ihe ọ ga-adị ka ya itinyekwu Jizọs Kraịst niime ndụ gị?

Ọbụrụ na ị gatụla obodo anyị bụ Louisiana, ọ ga bụ na ị maarala ọtụtụ nri anyị niile tọrọ ụtọ—gumbo, jambalaya, étouffée, ma ndepụta ahụ na-aga nʻihu.

Site n’oge ruo n’oge, A na m ahụ onwe m na-enwe obi ike iji sie otu niime nri ndị ahụ na-atọ ụtọ. Nzọụkwụ ikpeazụ na-edeghị ede mgbe ị gwakọtara ihe niile eji esi nri ma soro ntụziaka niile zuru ezu bụ ịdetụ nri ahụ nʻire nke ikpeazụ ma lee ma enwere ihe ọ bụla na-efu efu. Nʻoge ahụ, E nwere m ike ịnụ ndị Creole bụ ọkachara nʻisi nri ka ha na-ataka na ntị m, “Tinyekwuo Tonyʻs niime ya.” Tonyʻs bụ ihe na-esi isi ụtọ Creole emere niime Opelousas, Louisiana, obodo m. A na-ejikarị ya eme ihe dị ka “ngwa isi nri nke dị nzuzo” iji kwụọ ụgwọ maka ezughị oke niile emere mgbe a na-agbaso ụzọmmepụta ahụ.

Mụ na Michelle nwunye m nwere nnukwu ugwu ije ozi dị ka ndị ndu mgbasa ozi ọma niime Louisiana. Anyị nwere omenala ịkụziri ndị mgbasa ozi ọma otu Michelle si emepụta nri jambalaya ya pụrụ iche nʻabalị ikpeazụ ha nọrọ nʻebe obibi ndị mgbasa ozi ọma tupu ha alaghachikwuru ezinaụlọ ha. Na mgbakwunye ọgbụgba ama ha niile nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere, ndị mgbasa ozi ọma anyị hapụrụ ụlọ ozi ọma ahụ nʻinwe ekele maka ụzọmmepụta nri ndị ahụ.

Ọnwa ole na ole gara aga, A na m a chọgharị site na Ọba Midia Nzukọ nsọ wee hụ njikọ nke nchịkọta vidiyo ndị dị nke nke a kpọrọ Mkparịta ụka Mweghachite ya na Onyeisi Russell M. Nelson. 1 Aha nke otu niime obere vidiyo ndị ahụ dị na ndepụta ahụ dọọrọ mmasị m ma mee ka m mụmụọ ọnụ ọchị. A kpọrọ ya “Akwụkwọ nsọ niile Bụ Ụzọmmepụta niile nke Chineke maka Ibi ndụ Obiụtọ.” A pịnyere m ozugbo vidiyo nkeji abụọ ahụ ma wee lelee Onyeisi Nelson na-akuziri otù ụmụntakịrị Praịmarị ozi dị mfe ma dị ike gbasara otu esi enwe obi ụtọ. Ọ kuzirị: “Ọ bụrụ na ị na-eme achịcha, ị na-esoro ntụziaka ahụ niile, ị naghị eme ya? Ma ị ga-enweta ezigbo nsonaazụ mgbe ọ bụla, ị gaghị?”

Ọ gara niihu, na-ekwu banyere afọ 95 nke ọ gbara nʻoge na-adịghị anya:“Ndị mmadụ na-ekwu, ʻGịnị ka ị na-eri? Gịnị bụ ihe nzuzo gị?’” Ọ zaghachiri, “Ihe nzuzo ahụ ka a na-akpọ akwụkwọ nsọ niile. Ị nwere ike ịgụ ha ma nwalee ha.”

Ọ dị mma, ugbua anyị a matawo ya. Ihe nzuzo dị mfe maka ibi ndụ obi ụtọ bụ ị soro naanị ụzọmmepụta nke Chineke dịka akọwara nʻụzọ zuru ezu niime akwụkwọ nsọ niile. A na m akpọ ya “Ụzọmmepụta Ozi ahụ Dị Mma.”

Kedụ ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe emebie mgbe ị na-esoro ụzọmmepụta ahụ? Ọ dị mma, ihe agbakwunyere niime Ụzọmmepụta Ozi ahụ Dị Mma ahụ bụ “ngwa isi nri nke dị nzuzo” iji hụ na ị na-enweta ya nke ọma mgbe niile na njedebe. Azịza ahụ mgbe niile bụ Jizọs Kraịst.

E chere m na anyị niile nwere oge niile mgbe anyị na-enwe mmetụta na ngwa isi nri anyị niile adịghị mma nke ọma, ma ọ bụ na anyị na-agbasi mbọ ike isoro ntụziaka niile ahụ, ma ọ bụ ike kwa anyị mere ihe na-adịghị mma, ma ọ bụ ihe na-eme nke na-esighị nʻaka anyị, na ihe ndị ọzọ.

Gịnị bụ ihe ngwọta ya? Ọ bụ naanị ịgbakwunye kwu ihe ndị na-akpọta Jizọs Kraịst niime ndụ gị.

Yabụ, kedu ihe ọ ga-adị ka ya itinyekwu Jizọs Kraịst niime ndụ gị?

Mgbe m na-eje ozi dịka onyeisi mishọn, E nwere m obi ụtọ ịhụ na onwe m onye mgbasa ozi ọma ọbụla nta kwa izuụka isii. Mgbe a na-enwe nzukọ nke otu nʻotu a, ndị mgbasa ozi ọma nta ndị a na-achọkarị nduzi nʻotu ha ga-esi na-emekwu nke ọma na mmekọrịta ha na ndị nsuso ha.

Nʻotu oge, otu onye mgbasa ozi ọma batara maka ajụjụ ọnụ ya ma nọdụ ala. E nwere m ike site na asụsụ ahụ ya mata na o nwere ihe na-esogbu ya nʻobi. A jụrụ m, “Okenye, gịnị ka ị ga-achọ ikwurịta taa?” Anyị gara niihu kwurịta ụfọdụ ihe ịma aka niile ndị ya na onyenso ya na-enwe na otu o si metụta ikike ha ịrụ ọrụ mgbasa ozi ọma. Na anya mmiri nʻanya ya, o lere m anya ma jụọ,“Onyeisi, gịnị ka m ga-eme?”

N’ihe atụ ahụ, nʻeziokwu amaghị m otu m ga-esi zaghachi. Mgbe obere oge gasịrị, A jụrụ m ya ma ọ dị mma ka anyị gbuo ikpere nʻala nʻekpere maka nduzi sitere na Mmụọ. O kwetara, ma anyị gbukwara ikpere nʻala kpee ekpere maka mkpate mmụọ.

Mgbe e kpechara ekpere, anyị gara niihu na-egbu ikpere nʻala ruo nwa oge ma nọdụ ala nʻoche anyị chere ibe anyị ihu. A jụrụ m ma anyị nwere ike ịgụkọ otu akwụkwọ nsọ ọnụ. Ka anyị meghere akwụkwọ nsọ anyị niile, akwụsịrị m ma gwa ya ,“Okenye, ka anyị na-agụ akwụkwọ nsọ a, biko jụọ onwe gị ajụjụ a na-esote: Ọ bụrụ na m ebie agwa niile ndị a, ọ ga-eme ka mkpakọrịta mụ na onye nso m na ọrụ mgbasa ozi ọma anyị dịkwuo mma?”

Emesịa anyị emeghe Moronaị 7:45 ma gụpụta nʻolu dara ụda: “Ma afọ-ọma nwere ogologo ntachi-obi, ma o nwere obi ọma, ma ọ naghị enwe ntaji-anya, ma ọ naghị afụli elu, ọ naghị achọ nke ya, ọdịghị-mfe ịkpasu ya iwe, ọ naghị eche ihe ọjọọ, ma ọ naghị enwe ọn̄ụ nʼajọọ-omume kama ọ na enwe ọn̄ụ nʼezi-okwu, na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-ele anya ihe niiile, na-anagide ihe nile.”

Okenye ahụ mgbe ahụ lere m anya na anya mmiri wee sị, “Ee, Onyeisi, mana nke ahụ siri ike ime.” E kwetara m ma chetara ya na ọ bụ nwa nwoke nke Chineke nwere ikike dị nsọ imekọta ya ọnụ ya na Onyenwe anyị.

Mgbe ahụ anyị tụlere na nke nke ilu nke mkpọda nke Okenye Clark G. Gilbert nke Otù Iri Asaa ahụ kuziri, nke chetara anyị na anyị kwesịrị ibido ebe anyị nọ ma, anyị na Onyenwe anyị, gaa niiru na nʻelu nʻụzọ dị mma. E nwere m ike ịsị na ọ ka na-enwe nkụda mmụọ maka usoro ndị na-esote, ya mere a jụrụ m ya ka ọ kọwaa nghọta ya maka nke akwụkwọ nsọ ahụ “site niihe ndị dị ntakịrị na ndị dị mfe ka a na-esi ewepụta nnukwu ihe niile.” Ọ gara niihu ị kọwa echiche ahụ na site niime obere ihe na ihe niile dị mfe, nnukwu ihe niile nwere ike ime. A jụru m ya ka o were otu nkeji ma chọpụta ihe abụọ dị obere na dị mfe o nwere ike ime iji nwee obi ọma nʻebe onye nso ya nọ.

Mgbe obere oge gachara, o kwuru echiche ya niile. Mgbe ahụ A jụru m ya ka o were otu nkeji ma chọpụta ihe abụọ dị obere na dị mfe o nwere ike ime iji nwee ndịdi nʻebe onye nso ya nọ. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ka ọkọrọ echiche ya abụọ. O doro anya na ọ nọworị na-atụgharị uche na nke a tupu nzukọ anyị. A kpọrọ m ya oku ka o were ihe ole na ole ahụ gakwuru Chineke nʻekpere ma rịọ maka nkwenye, ntụziaka, na mkpate mmụọ maka otu esi eme atụmatụ ya jiri ezigbo ebum nʻobi. O kweere. Dị ka anyị kwubiri, a gwara m ya ka o wepụta ntakịrị mmelite nʻakwụkwọ ozi ya kwa izuụka.

Ka izuụka ole na ole sochirinụ na-aga, E nwere m ike hụ niime akwụkwọ ozi ya niile kwa izuụka na ihe niile na-akawanye mma. Mana ọbụghị naanị na m nwere ike ịhụ ọganihu ahụ niime akwụkwọ ozi ya niile kwa izuụka, E nwekwara m ike ịhụ ya niime akwụkwọ ozi kwa izuụka nke onye nsuso ya. Niime nzukọ anyị ọzọ, A hụrụ m ọdịiche dị ka abalị na ehihe niihu na mmụọ ya. A jụrụ m ya, “Ya mere, Okenye, ọ bụ eziokwu na afọ ọma anaghị ada ada?” Ọ zara jiri nnukwu ọnụ ọchị, “Ee, na site n’ihe ndị dị ntakịrị na ndị dị mfe ka a na-esi ewepụta nnukwu ihe nile.”

Ka ị na-eso Ụzọmmepụta Ozi ahụ Dị Mma ahụ maka ibi ndụ obi ụtọ, cheta nkuzi nke Onyeisi Nelson: “Ajụjụ nke ọbụla ma ọ bụ nsogbu ndị i nwere, azịza ya ka a na-achọtakarị niime ndụ na nkuzi niile nke Jizọs Kraịst. Mụtakwuo banyere Aja mgbaghara mmehie Ya, ịhụnaanya Ya, ebere Ya, ozizi Ya, na ozi ọma Ya eweghachitere nke ọgwụgwọ na ọganiihu. Tụgharịa na Ya! Soro Ya!”

Mgbe ọ dị gị mkpa “ịnụ Ya” ma mara ka ị ga-esi kpokuo Jizọs Kraịst niime ndụ gị, tulee ịgbaso usoro niile nke Onyeisi Nelson kuziri anyị gbasara mkpughe nke onwe:

“Chọta ebe dị jụụ ebe ị nwere ike ịga mgbe niile. Nwedata onwe gị n’umeala n’ihu Chineke. Wụpụta obi gi niile nye Nna gị nke Eluigwe. Gakwuru Ya maka aziza niile na nkasi obi.

“Kpee ekpere nʻaha nke Jizọs Kraịst banyere nchegbu gị niile, egwu gị niile, adịghị ike gị niile—ee, kpọmkwem ọchịchọ niile nke obi gị. Ma mgbe ahụ gee ntị! Dee echiche niile ndị na-abịa n’uche gị. Dekọọ mmetụta niile ma soro mee ihe omume niile akpaliri gị ime. Ka ị na-emegharị usoro a kwa ụbọchị kwa ụbọchị, kwa ọnwa kwa ọnwa, site nʻafọ ruo nʻafọ, ị ‘ga-eto n’ime ụkpụrụ nke mkpughe.ʻ”

A na m agba ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị na Onye Mgbapụta anyị. O mezuwo “ihe niile dị anyị mkpa iji nwee ike ịlaghachikwute Nna nke Eluigwe.” Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen