Onyenwe anyị Na-eme Ka Ọrụ Ya Na-aga Ọsọ ọsọ
Dị ka Onyenwe anyị na-eme ka ọrụ Ya na-aga ọsọ ọsọ, anyị kwesịrị inwe ịhụnaanya, nye ọzụzụ, ma jeere ndị ahụ nabatara ozi ọma Ya ozi.
Charles Dickens malitere akwụkwọ ya dị tamtam A Tale of Two Cities jiri nkwusi ike na “ọ bụ oge kachasị mma, ọ bụ oge kachasị njọ.” Nʻechiche, nke a bụ eziokwu nʻụbọchị anyị.
Anyị bi nʻoge ọgba aghara mgbe “ụwa dum nọ na-agba ghara ghara.” Ndụmọdụ nke Onyeisi Russell M. Nelson ịbụ ndị ome udo, dị ka ndị nsiso Jizọs Kraịst, ka ekwuputara nʻụzọ mara mma nʻụtụtụ nke a site nʻaka Okenye Gary E. Stevenson. Nke a bụ akụkụ dị oke mkpa nke izulite ịdị nʻotu, udo, na ọgwụgwọ maka “oge niile kacha ọjọọ.”
Anyị bi kwa “nʻoge niile kachasị dị mma,” nke ga-abụ ebe m na-ekwusi ike. Onyenwe anyị, niime okwu mmalite nye Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, nkeji nke 1, mara ọkwa, uju nke ozi ọma ka “aga ama ọkwa ya … nye nsọtụ niile nke ụwa.” N’eziokwu Onyenwe anyị na-eme ka ọrụ Ya na-aga ọsịsọ nʻụbọchị anyị. Anyị kwesịrị inwe obi ekele dị ukwuu maka ime ọsọ ọsọ ahụ, nke meworo ma na-eme na-agbanyeghị oge ndị a siri ike. Anyị bi nʻụbọchị mgbe ndị nsiso nke Onyenwe anyị nwere ohere ịnụrụ olu Ya ma zaghachi jiri obi na echiche ghe oghe. Ndị otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, ndị ranyeere Onye Nzọpụta na iwu nsọ Ya niile, na-achọta nzube na udo nke onwe dị omimi.
Nʻoge dị iche iche nʻagụgụala nke Nzukọ nsọ, enweworịị mbawanye pụtara ìhè niime ndụ ndị ahụ bara nụzọ ọgbụgba ndụ. Otu ụdị oge ahụ mere nʻetiti 1837 na 1850. Ụfọdụ niime Ndịozi isimbụ niime Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị eweghachitere jere ozi mishọn na United Kingdom. Mishọn ndị a mere puku kwuru puku esonye Nzukọ nsọ, ma na 1850 enwewo ndị otu Nzukọ nsọ karịrị akarị bi niime United Kingdom karịa niime United States. Nʻoge ahụ, Onyenwe anyị nyere Ndị nsọ ntuziaka ịgbakọta na Utah. Ọpụpụ mere nʻigwe, ụfọdụ ka mbite ego ewetere site na Ego Ọpụpụ Na-adịgide kwadoro.
Nkọwapụta nke mbịarute nke imerime ọnụọgụgụ nke ndị atọghatara atọghata sitere Ingland na Wales ruo na Salt Lake Valley 1851 masịrị m. Otu ahụ ka Otu Ndịisi Mbụ zutere nʻọnụ nke Emigration Canyon nke Band nke Ọchị agha Pitt sonyere. Deseret News kọwara ha dị ka band nke ndị njem ala nsọ [gụnyere] ụmụnne nwanyị na ụmụntakịrị, na-eje ije, anyanwụ chara, ma ihu igwe etipịawo, mana enweghị iwe; obi ha dịịrị mfe ma juputa nʻekele, nke pụtara ìhè nʻụzọ doro anya site na mbara ihu ha juputara nʻobi ụtọ na ọn̄ụ.
Dị ka ha “gafere Ụlọ Tempụl, … ebe puku kwuru puku nke ndịikom, ndịinyom, na ụmụntakịrị, gbakọtara, site nʻakụkụ obodo ukwu ahụ dị iche iche, ijikọta ọnụ na nnabata ahụ dị ebube ma juputa nʻọn̄ụ.” Onyeisi Brigham Young gwara ha okwu: “Ka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel gọzie unu. … Anyị ekpewo ekpere maka unu esepụghị aka; puku kwuru puku ekpere ka enyeworo maka unu, kwa ụbọchị, nye Ya onye nyeworo anyị iwu ikpokọta Izrel, zọpụta ụmụ nke mmadụ site nʻikwusa ozi ọma, ma kwadoo ha maka ọbịbịa nke Mezaya.”
Na mmụọ nke mmemme obi ụtọ ahụ, ka m kwukwaa ya ọzọ nye ndị niile atọghatara ọhụrụ na ndị na-alọghachi na Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị: Anyị hụrụ unu naanya; anyị na-achọ unu; Onyenwe anyị na-achọ unu. Enwere ike anyị agaghị eji ndị otu nzọm ije, mana anyị na-ekpe ekpere ka ngọzi niile nke eluigwe ga-eleta mgbalị unu niile iji gaaniihu nụzọ ọgbụgba ndụ nke na-eduru na Chineke Nna na Jizọs Kraịst niime alaeze seletịal.
E nwere akaebe doro anya na okwukwe niime Jizọs Kraịst na abawanye nʻụbọchị anyị. Niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, enweworịị mbawanye pụrụiche nʻetiti ndị atọghatara na nsonye ndị atọghatara. Nʻọnwa 36 gara aga, ihe ruru ndị atọghatara ruru 900,000 esonyewo Nzukọ nsọ. Ndị a atọghara mejuputara ihedịka percent 5 nke ngụkọta ndị otu Nzukọ nsọ. Anyị na-anabata ndị otu ọhụrụ jiri ogweaka mepere emepe na ekele miri emi maka ụzọ nke unu họrọworo.
900,000 ndị a atọghatara nʻọnwa 36 gara aga gafere ngụkọta ndị otu nke Nzukọ nsọ nʻemume ncheta nke ugboro 110 na 1940, nke gafetụrụ ndị otu 860,000. Nke a bụ mgbe a mụrụ mụ onwe m, Okenye Jeffrey R. Holland, na Okenye Dieter F. Uchtdorf.
Ndị a atọghatara ọhụrụ dị ịtụnaanya bịara site nʻakụkụ niile nke ụwa. Nʻọnwa isii mbụ nke afọ nke a, ntọghata agbagowo nʻihe karịrị pesentị 20 karịa afọ nke gara aga niime Europe, Afrịịka, Eshịa, Pacific, na Latin Amerịka. Niime North America anyị ahụwo mbawanye percent 17. Ọrụ nke Onyenwe anyị na-aganiihu esepụghị aka nʻụzọ niile dị ike. Ọnụọgụgụ ndị a na-agbago bụ akaebe doro anya na ozi ọma na-emetụ obi ma na-agbanwe ọtụtụ ndụ ebe ọ bụla.
Nʻụbọchị anyị, ndị a atọghatara dị oke ọnụ ahịa anaghịkwa agbakọta nʻotu ebe. Niihi okwukwe na nyefechasị nke ndị otu Nzukọ nsọ, akụrụngwa niile dị adị iji kwadoo ndị ọgbakọ—site na owuwu ụlọ ụka niile na tempụl niile—gazuo ụwa niile. Site na ntụghe ọkwa nchụaja niile dị mkpa na akụrụngwa niile ewetere, emume nsọ nzọpụta niile dị adị ugbu a nʻọtụtụ akụkụ ụwa.
Na-agbanyeghị ebe anyị bi, ndị otu ugbu a kwesịrị ịnabata narị puku kwuru narị puku nke ndị otu ọhụrụ dị ka anyị mere Ndị nsọ Bekee na Ndị nsọ Welsh m kọwara site nʻagụgụala isimbụ anyị. Okwu Okenye Gerrit W. Gong kwuru na nzukọ nke a masịrị m ebe ọ kuziiri anyị na ọ dịghị onye kwesịrị ịnọdụ naanị ya ma ọ bụ na nke mmetụta uche ma ọ bụ na nke ime mmụọ.
Ọrụ anyị dị nsọ bụ ikwere ma nabata ndị otu ọhụrụ na ndị nke na-alọghachi. Dị ka Onyenwe anyị na-eme ka ọrụ Ya na-aga ọsọ ọsọ, anyị kwesịrị inwe ịhụnaanya, nye ọzụzụ, ma jeere ndị ahụ nabatara ozi ọma Ya ozi. Anyị nwere ike inye aka wuo ndị Zayọn, ebe anyị bụ “ndị otu obi na otu echiche, ma [biri] nʻezi omume.” Ị bụ otu anyị na Onyenwe anyị, anyị ga-abụrịrị otu niihu Onyenwe anyị. Ndị otu niile na-agbanyeghị ụbọchị baptizim, nwekọtara oke na ọrụ ịnabata ndị ọzọ.
Ndụmọdụ m nye ndị otu Nzukọ nsọ bụ iji ogweaka anyị makụọ ndị a ahọọrọ, dị oke ọnụ ahịa ndị nabataworo ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
Onyeisi Gordon B. Hinckley kuziiri anyị na onye atọghatara ọhụrụ na-achọ “otu enyi, otu oke na ọrụ, na ọzụzụ jiri okwu dị mma nke Chinekeʻ (Moronaị 6:4).” Anyị nwere ike iso na ndị enyi na-emesi ndị ọhụrụ ndị atọghatara obi ike na ha sonyere ma ha abụghị nnọọ ndị ọbịa. Anyị nwere ike nyere ha aka ghọta na ha bụ ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst ndị nwere ike ije ozi nye ndị ọzọ ma nabata ọkpụkpọ oku ije ozi. Ndị atọghatara ka na-eto eto kwesịrị itule ije ozi mishọn uju oge. Onye niile kwesịrị ikpebi ịgba mbọ ibi ndụ yiri nke Kraịst
Ọtụtụ na-esonye Nzukọ nsọ na nnukwu aja nke onwe ma nwere oke mkpa ịhụnaanya na nkwado nke Ndị nsọ ibe ha.
Nye ndị ahụ niime unu ndị dị ọhụrụ ma ọ bụ ndị na-alọghachi nʻokwukwe, e nwere akamgba ndị unu nwere ike izute. Nweere onwe gị ndidi. Ndị mgbasa ozi ọma akuziworo gị ozizi dị mkpa ma kọwaa ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ niile nke alaeze ahụ, nke ekwupụtara niime akwụkwọ nsọ na niime Kwusaa Ozi ọma M.
Ịnata emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile na ibi ndụ iwu nsọ niile dị mkpa. Lekwasị anya nʻọgbụgba ndụ niile dị mkpa maka mbuli elu. Ozi ọma na-eme mbuli elu ekwe omume, nke na-achọ niime ya ime na idebe ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke mere. Ewezuga baptizim, emume nnabata, na nnyefe Ọkwa nchụaja Melkizedek maka ndịikom, ọgbụgba ndụ niile anyị na-abanye ka a na-eme niime tempụl. Maka ndị nwụrụ anwụ, emume nsọ nzọpụta nke ọbụla na ndị a ka ana eme naanị niime tempụl. Dị ka otu o si dịrị, ịkwadobe onwe gị maka tempụl kwesịrị ịbụ ebumnuuche egbughị oge.
Mgbe ụfọdụ ọ ga-adị gị ka itozughị oke banyere ihe ị maara. Mmata ihe nke ozi ọma bụ nnukwu ngọzi a na-enwete na mbawanye noge, mana ọ bụghị emume nsọ na-azọpụta. Ozi ọma abụghị ule nke mmata ihe. Kosiladị, dị ka Onyeisi Nelson kweworo nkwa: “Dị ka ị n’eji ekpere amụ Akwụkwọ nke Mọmọn ụbọchị niile, ị ga-eme mkpebi ndị ka mma—ụbọchị niile. … Dị ka ị na atụgharị uche ihe ị mụrụ, ọnụ mpio niile nke eluigwe ga-emeghe, ma ị ga-anata azịza nye ajụjụ niile nke onwe gị na ntuziaka maka ndụ nke gị.”
Na mgbakwunye, afọ ọbụla na mbugharị kurikulum Nzukọ nsọ na nzukọ Sọnde niile bụ nke a na-amụ Agba Ochie, Agba Ọhụrụ, Akwụkwọ nke Mọmọn, na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile. Ka oge na-aga ị ga-enwekwu obisike dị ka mmata ihe gị nke ozi ọma na-etolite. Ọmụmụ akwụkwọ nsọ mgbe niile ga-agọzi ma bawanye ndụ gị site nʻimikpukwu ntọghata gị nye ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
Ịmụ ozizi nke Jizọs Kraịst na-enweghị ntụpọ bụ nchuso ndụ, ma nʻịghọta ozizi ma nʻibi ndụ yiri nke Kraịst. Ọgbụgba ndụ niile dị mkpa na-ewete nhazi nke anyị na-akọwa dị ka ụzọ nke ọgbụgba ndụ. Ụkpụrụ ndị a ka akuziworo nʻụzọ dị ike site nʻaka Onyeisi Nelson. Ndị otu niile, kacha nke ndị ọhụrụ na ndị nke na-alọghachi, ka aga agọzi site nʻịmụ na ịnabata ozi amụma ya niile banyere ọgbụgba ndụ niile na ụzọ ọgbụgba ndụ.
Ọ bụrụ na gị hiwe mbunobi nke ịnata na ntozu oke ọgbụgba ndụ ọbụla dị mkpa maka mbuli elu, ị ga-anọ nʻụzọ ahụ nke na-eduba na alaeze seletịal. Tempụl na emume nsọ niile nke tempụl ga-abụ ebe nlekwasị anya anyị. Ọtụtụ ọgbụgba ndụ dị adị nye onye ọbụla. Otu ọgbụgba ndụ, alụmdi na nwunye dị ebighị ebi, gụnyere ijikọta mgbalị niile gị ya na onye nsiso. Mbunobi anyị kwesịrị ịbụ ịchọta onye nsiso ebighị ebi ahụ.
Kosiladị, enwekwala ndakọ olileanya ọ bụrụ ma alụmdi na nwunye dị ebighị ebi ekweghị omume nʻoge ugbu a. Ndị amụma akuziwo na ọ dịghị ngọzi ọbụla aga ejichi site na ndị otu kwesịrị ntụkwasị obi ndị na-edebe iwu nsọ niile. Otu onye amụma Akwụkwọ nke Mọmọn, Eze Benjamin, kwuru ya nke ọma: “Ndị ahụ na-edebe iwu nsọ niile nke Chineke … ka agọziri nihe niile, … ma ọ bụrụ na ha … kwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ ha nwere ike binyere Chineke nʻọnọdụ nke obi ụto na-enweghị ọgwụgwụ.”
Unu ga-ahụ na, ọ bụrụ na unu ahụbeghịrịị, na ndị otu etozughị oke. Ozizi ekpughere mere ya e doo anya na niime njem anyị ebe a nʻụwa, anyị ga-eme mmejọ dị iche iche. Anyị bi niime ụwa na-ezughị oke na nke dara ada, na-abụghị ụwa selestịal. Ndụ nke a bụ oge mnwale, nwere ohere na-adịgide ichegharị na igosi onwe anyị.
Anyị niile na-enwete mmetụta etozughị oke dị ka anyị na-agba mbọ ịdịrị ka Jizọs Kraịst. Aja mgbaghara mmehie na-ekwe anyị ichegharị kwa ụbọchị dị ka anyị na-ada ada. Dị ka Nefi, onye amụma ọzọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn, kwuru: “[Anyị] garịrị na-aganiihu kwudesie ike niime Kraịst, na-enwe ìhè nke olileanya zuru oke, na ịhụnaanya nke Chineke na nke ụmụ mmadụ niile. Ya mere, ọbụrụ na unu ga na-aganiihu, n’eri oriri n’elu okwu nke Kraịst, ma nagide ruo ọgwụgwụ, lee, otu a ka Nna kwuru: Unu ga-enwe ndụ ebighị ebi.”
Dị ka anyị na-atule akamgba nke ụbọchị anyị, anyị ahaghị icheta na Onye Nzọpụta, nʻoge ije ozi Ya nʻelu ụwa, bikwara nʻoge ọgba aghara na ime ihe ike. Nlekwasị anya ya abụghị nʻakamgba ndọrọndọrọ ọchịchị nke ụbọchị ahụ; ọ bụ maka ntozu oke nke Ndị nsọ.
Isoro Onye Nzọpụta na ozizi Ya na nkuzi niile enwebeghị mgbe ọ dị mfe niime ụwa nke na-anọkarị na ọgbaghara. Ọ dịghịrị Onye Nzọpụta mfe niime ụwa na-agbanwe agbanwe nʻoge njem Ya na ndụ anụ ahụ, ọ dịghịrị ndị ndu na ndị otu isimbụ anyị mfe ma ọ dịghịrị anyị mfe. Dịtụ mma, ndị amụma dị ndụ na-ewete odudu anyị na-achọsi ike nʻụbọchị anyị. Onyeisi Dallin H. Oaks ga-eduru ihenketa ime mmụọ ahụ dị ike gaaniihu.
Ana m agba ama na ozizi nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst dị ebighị ebi ma bụ eziokwu. Ana m agba akaebe m doro anya ma na-enweghị mgbagha na Jizọs Kraịst dị ndụ, na niihi Aja mgbaghara mmehie Ya, anyị pụrụ ị bụ otu anyị na Ya. N’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.