Ọgbakọ Zuru ọha
Onyenwe anyị Na-ele anya n’Obi
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


10:41

Onyenwe anyị Na-ele anya n’Obi

Ihe niile Chineke na-achọ iji mejupụta nzube Ya na iji nyere anyị aka ghọọ onye Ọ na-achọ bụ maka onye ọbụla niime anyị tụgharịa obi anyị kpamkpam na Ya.

Mgbe e nyere iwu ịhọrọ eze Izrel ọhụrụ site nʻetiti ụmụ Jesse ndị nwoke, onye amụma Samuel, dị ka o lere nwa Jesse nke nwoke kacha okenye, Eliab, tiri mkpu nʻobi ụtọ, “Nʻezie onye nke Onyenwe anyị e tere mmanụ nọ nʻihu ya.” Mana Eliab abụghị nwa odibo nke Onyenwe anyị ahọọrọ. Onye Nzọpụta dọrọ Samuel aka na ntị: “E lekwala anya na mbara ihu ya, ma ọ bụ ogologo dimkpa ya; niihi na a jụwo m ya: niihi na Onyenwe anyị adịghị ele anya dị ka mmadụ si ele; niihi na mmadụ na-ele anya nʻihu, mana Onyenwe anyị na-ele anya n’obi.”

Ebe ọ bụ na Devid abụghị na ọ bụ onye kachasị sie ike nʻanya ma ọ bụ kachasị nwee nka nʻetiti ụmụnne ya ndị nwoke, obi ya siri ike nʻanya Chineke. O ji obi ya niile hụ Chineke naanya ma nwere mmasị miri emi irubere Ya isi. O nwere okwukwe na-adịghị ada ada nʻịhụnaanya, ike, na ngọzi niile ekwere nkwa nke Chineke, dị ka o mesịrị gosipụta mgbe ọ lụrụ ọgụ na-atụghị egwu ma merie Goliat site nʻenyem aka nke Onyenwe anyị.

Akụkọ nke na-akuziri anyị na ihe niile Chineke na-achọ iji mejupụta nzube Ya na iji nyere anyị aka ghọọ onye Ọ na-achọ ka anyị bụrụ bụ maka onye ọbụla niime anyị tụgharịa obi anyị kpamkpam na Ya. Nye otu ọka iwu, O nyere iwu, “Ị ga-ahụ Onyenwe anyị Chineke gị naanya jiri obi gị niile.” Nye Onye amụma Josef Smit, Ọ sịrị, “Lee, Onye Nwe anyị n’achọ obi na uche nke chọrọ ịrụ-ọrụ.” Ma nye Ndị Nefi, Onye Nzọpụta bilitere nʻọnwụ setịpụrụ ọkpụkpọ oku nke a: “Unu ga-achụ aja unu nye m jiri obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị.”

Gịnị kpatara nke a jiri bụrụ? Onye Nzọpụta kuziri na ọ bụrụ na obi anyị tụgharịrị kpamkpam na Ya, niihi aja mgbaghara mmehie Ya e nwere ike iji ume na onyinye ime mmụọ ndị anyị nwere mkpa ya ji gọzie anyị iji merie aka mgba niile nke ndụ anụ ahụ anyị, guzogide ọnwụnwa, nata odudu na nghọta, ma nwee mmetụta ọn̄ụ na udo niime ndụ anyị. “Site n’ihe nta niile ka oke ihe si apụta.” O kwuru na Ya pụrụ “ime ihe ndị na-adịghị ike dịrị ike” ma jiri ihe niile anyị na-achọ gọzie anyị iji mee nke ọma na ndụ anụ ahụ nke a ma nata ndụ ebighị ebi. “Ngọzi na-adịrị ndị niile dị ọcha n’obi,” ka O kwuru, “niihi na ha ga-ahụ Chineke.”

E kwere m na nke a bụ ihe kpatara, opekempe nʻakụkụ, Jizọs Kraịst ugboro ugboro gbaziri ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii olu nʻoge ije ozi Ya nke ndụ anụ ahụ. Na-agbanyeghị ịdị uchu nʻidebe iwu Ya, ha mere otu ahụ maka nzube ndị ezighị ezi. Ọ baara ha mba na-asị, “Ndị a na-erute m nso jiri ọnụ ha, ma nʻegbirigbe ọnụ ka ha si asọpụrụ m; mana obi ha nọ ebe dị anya site nʻebe m nọ.”

Nke a bụ ihe nchetere dị nro nye ndị niile na-eso ụzọ Ya na ọ bụghị naanị banyere ihe anyị na-eme—okwu ọnụ anyị na omume anyị—mana kwa ihe kpatara anyị si eme ihe Jizọs Kraịst na-asị ka anyị mee—ọchịchọ anyị na ebumnobi anyị. O kwuru sị, “Niihi na Mụ onwe m, Onyenwe, ga-ekpe ụmụ mmadụ niile ikpe dị ka otu ọrụ ha niile siri dị, dị ka otu ọchịchọ nke obi ha niile siri dị.” Nna anyị nke Eluigwe na-achọ karịa omume nrube isi na ije ozi nʻesighị nʻobi site nʻaka ụmụ Ya. Ọ na-achọ ka anyị mee ihe ndị ahụ jiri ebumnobi ziri ezi niihi na anyị ji obi anyị niile hụ Ya naanya. Ọ chọrọ ka anyị na-achọ ịdị ka Ya.

Ugbu a, ọ bụrụ na ahuike ime mmụọ nke obi anyị bụ ihe kacha dị Onye Nzọpụta mkpa—ihe Ọ na-achọ ịhụ nʻaka ezi onye na-eso ụzọ—otu anyị nwere ike isi nyocha obi anyị ma mara ma o ziri ezi naanya Chineke?

Na nso nso a, dị ka mụ na nwunye m lọghachiri site na mishọn dị na Portugal, anyị nyochasịrị usoro ule ahụike iji nyochaa ọnọdụ anụ ahụ anyị. Ụfọdụ niime ule ndị ahụ lekwasịrị anya na ahụike nke obi anyị—dị ka ule ọbara, echocardiograms, na ule ndọlị niile. E kwere m na Onye Nzọpụta ewetekwaara anyị usoro ule ime mmụọ ndị anyị nwere ike ile iji tulee ọnọdụ ime mmụọ nke obi anyị. Ka m kọọrọ unu ole ma ole.

Inyocha Obi Unu jiri Ule niile nke Ime mmụọ

Nke mbụ, Nlekwasị anya Anyị, Ihe ndị kacha mkpa, na ebumnobi anyị

“Niihi na ebe akụ unu dị, n’ebe ahụ ka obi unu ga-adịkwa,” ka Jizọs kuziri. Akụ na ụba bụ otu ihe dị anyị oke mkpa, otu ihe nke anyị na-aranye mgbalị na ịn̄antị. Ebe anyị na-ahọrọ igbu oge anyị ma tụkwasị uche anyị, ya na ihe na-akpalite anyị ime ihe anyị na-eme, na-ekwu ọtụtụ ihe banyere obi anyị. Onye Nzọpụta dọrọ anyị aka na ntị na mgbe a kpọrọ ọtụtụ oku site nʻaka Ya, ole ma ole ka ahọọrọ “niihi na obi ha tụkwasịrị nke ukwuu nʻelu ihe niile nke ụwa a, ma [ha] na-achọ nsọpụrụ nke ụmụ mmadụ.” Ana m eme Onye Nzọpụta onye kachasị mkpa niime ndụ m? Anya m ọ dabeere naanị nʻotuto nke Ya niihe niile nke m na-eme?

Nke abụọ, Ịdị Njikere Anyị maka Irube isi nye Iwu nsọ niile nke Chineke

Gburugburu akwụkwọ nsọ, Onyenwe anyị na ndị amụma Ya ejikọtawo mpako na enweghị nrube isi ha na inwe obi mkpọchi. Nefi gbara ụmụnne ya ndị nwoke ume, na-asị: “Olee otu o siri bụrụ na unu anaghị edebe iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị? Olee otu o siri bụrụ na unu ga-ala n’iyi, niihi mkpọchi obi unu?” Nye Ndị nsọ na Missouri, Onyenwe anyị dọrọ aka na ntị, “Mana onye ahụ nke na-anaghị eme ihe ọbụla ma ọ bụghị ma e nyere ya n’iwu, ma na-anabata iwu nsọ n’obi abụọ, ma na-edebe ya n’ume ngwụ, onye ahụ kwa ka ikpe mara.” Ebe ọ bụ na Onye Nzọpụta anaghị atụanya ntozu oke nʻidebe iwu nsọ Ya niile, Ọ na-arịọ ka anyị nwee ọchịchọ ma gbaa mbọ idebe ha jiri obi anyị niile.

Nke atọ, Nrụsi Ọrụ Ike Anyị nʻỊmụ Akwụkwọ nsọ niile na Ịchọ Mkpughe

Onyenwe anyị dụrụ Oliver Cowdery ndụmọdụ “ikwakọba okwu ndị a nʻobi gị.” Ana akpọku anyị ịchọsigharị ike akwụkwọ nsọ ma, site nʻike nke Mmụọ Nsọ, chọọ ịnata nghọta na akaebe nke eziokwu nke ozi ọma niime obi anyị.

Onye amụma Abinadaị baara ndị nchụaja nke ajọọ Eze Noa mba maka emeghị nke ahụ, na-asị, “Unu etinyebeghị obi unu iji nwee nghọta; unu a marabeghị ihe.” Ana m agba ezigbo mbọ ịmụ akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị nakwa itinye obi iji ghọta ha site nʻikpe ekpere?

Nke anọ, Echiche Anyị na Okwu Anyị

Onye Nzọpụta kuziri na “site nʻobi ka echiche ọjọọ niile si apụta” ma na “site nʻuju nke obi ọnụ na-ekwu okwu.” Mma nke echiche anyị na okwu anyị bụ ihe ngosi dị mma nke ịdị ọcha nke obi anyị. Ana m akwado ọtụtụ echiche na-adịghị mma banyere omume ma ọ bụ ebumnobi nke ndị ọzọ, ma ọ bụkwa gbasara onwe m? Ana m adị oke ngwa ngwa ikpe ikpe na ịma ndị ọzọ ikpe? Ana m achọ inwete ngọpụ niile na izi ezi maka njehie m niile? Ma kedụ maka okwu m niile? Ha na-ebuli ma kpalie ndị gbara m gburugburu? Ma ọ bụ ha na-akpatakarị esemokwu na iwe iwe?

Mgbe ule anụ ahụ m gasịrị, dọkịta m gwara m na, nʻozuzu, obi m kpa ahụ—mana enwere ihe ole ma ole gbasara nke ekwesịrị ka emezie ha ugbu a, tupu ha adị ọjọọ. Emesịa ya edepụtara m ụfọdụ mgbanwe nʻụdị ibi ndụ. Nʻotu aka ahụ, dị ka unu na-eme nyocha ime mmụọ nke obi unu nke a ma mata ụfọdụ mgbaàmà ndị na-adịghị mma na-amalite ịrịbata, biko atụla egwu! Onye Nzọpụta ewetewo ọgwụ ime mmụọ na ọgwụgwọ magburu onwe ya iji nyere gị aka. O kwewokwa nkwa inye gị obi ọhụrụ! Ndị a bụ ụfọdụ omume ndị nwere ike imelite ike ime mmụọ nke obi gị.

Imelite Ahụike Ime mmụọ nke Obi Gị

Nke mbụ, Mee ka Mmekọrịta Gị na Kraịst Sie Ike

Dị ka anyị na-aranye oge kwa ụbọchị iji bịaruo Kraịst nso, obi anyị na-agbanwe. Ọmụmụ akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, nke ejikọtara ya na ekpere si nʻobi na obubu ọnụ mgbe niile, ga-abawanye ịhụnaanya gị maka Onye Nzọpụta ma mee ka okwukwe gị na ọchịchọ gị ichegharị sie ike ma nʻumeala nyefee Chineke obi gị. Tulee ọmụmaatụ nke a sitere nʻaka Nefi: “Ya mere, ebekuru m Onyenwe anyị; ma lee ọ bịara leta m, ma mee kwa ka obi m dị nro nke mere na m kwenyere okwu niile nke nna m kwuworo.”

Dị ka anyị na-aganiihu izulite mkpụrụ nke okwukwe site nʻọchịchọ na omume ezi omume anyị niile, anyị ga-enwete nhụmiihe otu ido nsọ nke obi anyị dị ka Ndị Nefi: “Ha buru ọnụ ma kpee ekpere ugboro ugboro, ma gbasie ike nʼelu mgbasike nʼumeala ha, na nkwụsike nʼelu nkwụsike nʼokwukwe nke Kraịst, ruo nʼimejupụta mkpụrụ obi ha nʼọn̄ụ na nkasi obi, ee, ọbụna ruo nʼịsachasị na ido nsọ nke obi ha, bụ ido nsọ nke na-abịa n’ihi inyefe obi ha n’aka Chineke.”

Nke abụọ, Hazie Uche Gị na nke Ya

Onye Nzọpụta kuziri, “Ọ bụrụ na unu hụrụ m naanya, debe iwu nsọ m niile.” Ọ na-akpọku anyị igosipụta ịhụnaanya anyị site na ime na idebe ọgbụgba ndụ anyị na Ya niile. Dị ka anyị na-agba mbọ kwa ụbọchị idebe iwu nsọ Ya niile, chegharịa nʻezie site na mmehie anyị, ma nagide nʻiwekwasị onwe anyị aha Ya ma hazie uche anyị na nke Ya, enwere ike ịgọzi anyị jiri nsiso nke Mmụọ Nsọ mgbe niile.

Nefi gbara ama, “Ama m na ọ bụrụ na unu ga-esoro Ọkpara ahụ, jiri nzube juru eju nke obi, na-egosighị ihu abụọ ọbụla na-enweghị aghụghọ n’ihu Chineke, mana jiri nzube nke ziri ezi, na-echegharị site na mmehie unu niile, na-agbara Nna akaebe na unu dị njikere ibukwasị onwe unu aha nke Kraịst, site na baptizim … , mgbe ahụ ka unu ga-enweta Mmụọ Nsọ.” Mmụọ nsọ ga-edu gị ma nyere gị aka ịmata uche nke Onyenwe anyị ma mee nhọrọ ndị dị mma.

Nʻikpeazụ, Jiri Obi Gị niile Jeere Chineke na Ndị Ọzọ Ozi

Onye Nzọpụta na-akpọku onye niile “iji obi unu niile jere ya ozi.” Mgbe anyị na-ahọrọ ime ihe nke ọbụla nke Onyenwe anyị gwaworo anyị ime—dị ka idebe iwu nsọ niile, iri oriri nsọ, ife ofufe niime tempụl, na ijere ndị ọzọ ozi—nʻobi ziri ezi ma jiri ebumnobi ziri ezi, omume ije ozi na ife ofufe nke ọbụla na-aghọ nhụmiihe ime mmụọ siri ezigbo ike nke na-agba okwukwe na ama anyị ume ma na-emeju obi anyị jiri ọn̄ụ na ịhụnaanya maka Chineke na ụmụ mmadụ ibe anyị.

Ajụjụ nke onye amụma Alma ka na-ada ụda taa: “Amụwo unu na ime mmụọ site nʻaka Chineke? Unu anatawo onyinyo ya na mbara ihu unu? Unu enwetawo nnukwu mgbanwe nke a n’obi unu?”

Ụmụnne ndị nwoke na ụmụnne ndị nwanyị, ana m akpọku unu inye Onye Nzọpụta obi unu dum taa. Kwe ka omume ife ofufe na ije ozi nke ọbụla bụrụ eziokwu na nke akpachapụrụ anya mee. Wepụ ihe mmegharị anya niile nke ụwa ma gbaa mbọ idopụ oge bara uru maka Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ anyị. Chegharịa ma laghachiri Ya jiri obi gị niile, ma Ọ ga-agbaghara gị ma jiri ogweaka nke ịhụnaanya Ya gbaa gị okirikiri. Achọkwala ụmụ ihe nke ụwa nke a, mana họrọ idebe anya gị naanị na otuto Ya ma na-achọ ihe niile nke kacha mma. Ọ maara echiche gị niile na ọchịchọ niile nke obi gị, ma dị ka ị na-abịakwute Ya, Ọ ga-agọzi gị jiri ume, obisike, udo, na ọn̄ụ niime ụwa nke a ya na ọnọdụ niime alaeze seletịal Ya maka ebighị ebi niile.

Ama m na Jizọs Kraịst dị ndụ. Ọ bụ Onye Mgbapụta anyị. Ma Ọ hụrụ mụ na gị naanya jiri obi Ya niile. Site nʻaha Jizọs Kraịst, amen.