Ịcheta Atụrụ ndị ahụ
Nʻezie ụkpụrụ nke ịgụkọta na nlekọta na-arụ ọrụ. Ọ bụ ụzọ Onyenwe anyị.
Kraịst bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma. Nke ọ bụla n’ime ìgwè atụrụ ahụ dị oké ọnụ ahịa n’anya Ya. Ọ haziri usoro ọzụzụ atụrụ ma kuziere anyị ihe site n’okwu ọnụ ma n’omume agwa niile nke onye ọzụzụ atụrụ ọma, gụnyekwa ịmata aha atụrụ gị, ịhụ ha naanya, ịchọta ndị ahụ furu efu, ịnye ha nri, ma, nke ka nke, iduru ha lọghachi ebe obibi ọzọ. Ọ na-atụ anya ka anyị mee otu ihe ahụ dịka ndị na-azụ atụrụ n’okpuru ntuziaka Ya.
Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe banyere ije ozi nlekọta n’ụzọ nke Onyenwe anyị site n’aka onye amụma oge ochie—onye ọzụzụ atụrụ pụrụ iche—Moronaị. O biri n’oge ihe isiike, na-enweghi uru niile nke ekwentị, kọmpụta, na ịntanet. Ma ọ gbara mbọ ịlẹkọta atụrụ ndị ahụ. Kedụ otu esi mee nke a? Anyị na-amatakwu banyere usoro ọrụ ya niime Moronaị 6 N’ebe ahụ anyị na-agụ na ndị otù ka “a gụnyere n’etiti ndị nzukọ nsọ nke Kraịst; ma e dere aha ha, ka e wee cheta ha ma zụọ ha site nʼokwu ọma nke Chineke, idebe ha nʼezi ụzọ ahụ. … Ma nzukọ nsọ ahụ “gbakọtara ọnụ ugboro-ugboro, ibu ọnụ na ikpe ekpere, na ikwurịta okwu otu onye na ibe ya gbasara ọdịmma nke mkpụrụ-obi ha nile” (Moronaị 6:4–5; agbakwunyere nkọwa).
Maka Moronaị, ọ bụ nnọọ banyere ndị mmadụ—aha niile! O tinyere n’ọrụ ụkpụrụ nke ịgụkọta ọnụ na nlekọta ka e wee cheta mmadụ niile . Onye ọbụla na-adọlị adọlị ma ọ bụ na-akpafu akpafu ka echetara, wee nye Ndị nsọ ohere ka ha kparịta ụka banyere ọdịmma ha n’ebe kansụl ha. Dịka onye ọzụzụ atụrụ ahụ onye hapụrụ iri itolu na itolu (a ma m na ọbụ n’ebe nwere nchekwa) ma gaa ịchọta otu ahụ furu efu (lee Luk 15:4–7), agwawo anyị ka anyị nọrọ na nche n’ebe igwe atụrụ anyị nọ—ịmata na ịcheta ma gaa ma mee otu ahụkwa.
Dịka onye ndu mishọn n’obodo India, A na m echeta mgbe m jụrụ otu onyeisi ngalaba nta banyere ụfọdụ ebumnuche ya n’afọ na-abịa niihu: “Ụmụ nwoke ole ka ị na-akwado ka ha nata Ọkwa nchụaja Melkizedek?” Azịza ya otu mgbe ahụ bụ “Asaa!”
Atụlere m n’isi m ebe o siri wepụta ọnụọgụgụ nke a kpọmkwem! Tupu m nwere ike iji zaghachi, ọ wepụtara otu mpempe akwụkwọ edere ọnụọgụgụ nke mbụ ruo nke asaa n’akụkụ ya. Ahịrị ndị mputeụzọ nke ise nwere aha edere n’akụkụ ha—ezigbote ndị mmadụ ya na ndị kworum ndị okenye ya na-akwado ikpoku ma gbaa ume ka ha nwete ngọzi nke ọkwa nchụaja niime ndụ ha. Dị ka ịmara, ajụziri m ya banyere ahịrị isii na asaa ndị ahụ ghee oghe. “O, Onyeisi,” ka o kwuru, na-efe isi kpakam kpakam n’obi ọmịiko, “nʻezie anyị ga-eme ọbụnadị ụmụ nwoke abụọ baptizim na mbido afọ ndị ga-enwete ọkwa nchụaja na ngwụcha afọ.” Onye ndụ nke a mara ihe ọ na-eme ghọtara ụkpụrụ nke ịgụkọta ọnụ na nlekọta.
Kraịst haziri Nzukọ nsọ Ya n’ụzọ nke ga ara ezigbote ahụ ichefu otu mkpụrụ obi, niihi onye ọbụla dịrị Ya oke mkpa. Onye ọbụla niime ngalaba ukwu ọbụla, agbanyeghi afọ ọ gbara ma okike ọmụmụ ya, nwere ndị nlẹkọta na-enweghi ọnụọgụgụ—ndị ọzụzụ atụrụ—ndị ekenyere ọrụ ịlekọta ha na ịcheta ha. N’ịmatụ, otu nwa okorobịa ka ekenyere ọdịmma ya n’aka ndị otù bishọp, ụmụnne nwoke ndị ije ozi nlekọta, ndị okenye na-enye ndị ntorobịa ndụmọdụ, ndị nkuzi semịnarị, ndịisi kworum, ma ndị ọzọ—ndịa niile na-eje ozi dịka ebe nchekwa, tikọtara aka ọnụ n’okpuru onye ntorobịa ahụ iji ghọro ya ọbụrụ na ọ daa. Ọbụrụgodi na ọ bụ otu niime ihe ndị nchekwa ka edebere ebe dị mma, nwa okorobịa ahụ ga-enwe nchekwa, a mata ya ma echeta ya. Kosiladị, mgbe na mgbe anyị adịghị achọta nchekwa ebe ọ kwesịrị ịnọ. Mgbe na mgbe ka ndị mmadụ na-akpafu niime igirigi ahụ—ma enweghi onye mataranụ. Kedụ otu anyị nwere ike iji bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ọma karịa? Anyị nwere ike ịmụta otu esi agụ ọnụọgụgụ ma na-elekọta ihe anya.
Nzukọ nsọ anyị na-arọpụtara anyị ọtụtụ rịpọtụ na ngwa ọrụ iji mee nke ahụ—ịji cheta. Rịpọtụ nke Ome Nʻọnwa anọ bụ otu ọmụmatụ pụrụ iche. Ọ na-ekwe ka anyị gụọ ma lekọta onye otù ọbụla ọtụtụ ugboro ma chọpụta ndị ahụ na-efu efu ma ọ bụ chọo enyemaka anyị na ịhụnaanya anyị. Ndekọihe nke Action na Interview na-achọpụta ndị ahụ chọrọ nlebara anya anyị ugbu ugbua, ma rịpọtụ Ọnọdụ Tempụl Rekọmendị na ndị ọzọ na-emekwa otu ihe ahụ. Ngwa ọrụ ndịa eji agụkọta ọnụ ma mee nlekọta na-eme ka anyị lekwasị anya na ndị mmadụ. Onye nwere mkpa ọkpụkpọ okù, ịganihu na ọkwa nchụaja ma ọbụ nwee mkpa ịwere otu aha ezinụlọ gaa na tempụl? Onye ka anyị nwere ike ịnye aka ịkwado maka ije mishọn nʻuju oge? Onye na-efu efu nʻọnwa nke a? Ngwa ọrụ ndịa na-enyere anyị aka ị cheta ndị mmadụ.
A maburu m otu ezinụlọ sitere na United States ndị nabatara ọrụ na Afrịka. Nʻụbọchi Sọnde mbụ ha, ha bara niime otu Nzukọ nsọ nke ọ bụ naanị ya nọ na obodo ahụ, ebe ejiri obi sara mbara kelee ha. Mgbe ụtụtụ bịara na njedebe, nwunye nwoke ahụ ka akpọwọrọ ịbụ onyeisi otù Enyem aka ma ya onwe ya dịka onye ndu nke Ndịikom Nta! Ọ jụrụ onyeisi ngalaba nta ahụ yiri ka ike ọgwụwo ya na ndịikom nta ole ka enwere. Onye ndu nke a kwesịrị ntụkwasị obi atụọ aka nʻazụ ọnụ ụlọ sara mbara nke oriri nsọ ma kwuo, “Ndị abụọ ahụ nọ ebe ahụ.” Nke a ejughi nwoke ahụ afọ, ya mere o jiri akwụkwo ngalaba nta ahụ laa nʻụlọ wee mata na nʻezie enwere ndị ikom nta 20 nọ na akwụkwọ. Ọ laghachiri nʻebe onyeisi ngalaba nta ahụ nọ ma rịọ maka otu ndị okenye nta abụọ na-asụ asụsụ abụọ ka ha jee ozi dịka ndị ndụmọdụ ya ma nọdụ ọdụ ya na ha na ụmụ nwoke abụọ ndị ahụ iji nyochagharịa aha ndị ahụ.
Emesịa ndị ụmụ okorobịa ndịa dị ike nʻọrụ ebido ọrụ. Mgbe ọnwa ole nʻole gafere, ha chọtara nwa nwoke ọbụla aha ya nọ nʻebe ahụ. Aha nʻaha, atụrụ ndị ahụ furu efu ka a nabatara ọzọ site nʻaka ndị ọgbọ ha ma azụọ ha nime mmụọ na nke anụ ahụ! Mgbe otu afọ gara, nʻụbọchị Sọnde ọbụla, a na enwekarị ihe ruru ndịikom nta 21 bịara ọgbakọ. Ekele dịrị ndị ndịikom nta ahụ ndị rụrụ ọrụ ma ndị elekọtara anya.
Otu enyi m ọma, dịka onye gụchara mahadum, kwabatara ya na ezinụlọ ya niime otu obodo ukwu niime Amerịka iji gaa niihu nʻagụmakwụkwọ ya. Akpọrọ ya ozugbo ahụ ị nọrọ n’isi kworum nke ndị okenye. Obi nọ nʻakụ ya kpum kpum banyere ajụjụ ọnụ nke mbụ ya na onyeisi stek ahụ, ma ọ kpebiri obi ị gaa na nkwado. Ọ gwara onyeisi stek ahụ na ọ nwere ebumnuche atọ maka afọ na-abịa niihu: (1) ịme ka ije ozi nlekọta ruo 90 percent, (2) ịme ka nkuzi ozi ọma kwa izuụka dị omimi, ma (3) ịme ka enwe ihe egwuruegwu kworum ahaziri ahazi kwa ọnwa.
Jiri imumu ọchị, onyeisi stek nke a nwere akọ nʻuche jụrụ, “Ịnwere ike ịkpọpụta otu aha onye kworum gị dara mba ịnwere ike ịnyere aka ya na ezinụlọ ya a gaa tempụl nʻafọ nke a?” Nke a tụrụ enyi m nke a naanya. O jiri nwayọọ chee echiche ma kpọpụta otu aha. “Detụo nke ahụ,” ka onyeisi stek tuziri aka. Mgbe ahụ onye ndu nke a mara ihe ọ na-eme ajụọ otu ajụjụ nke a ugboro atọ ọzọ—ma ajụjụ ọnụ ahụ akwụsị. Nwa okorobịa nke a apụta nʻezi nʻubọchị ahụ wee mụta otu ihe nke kachasị ibe ya banyere ịbụ onye ndu na ije ozi nlekọta. Ọ jiri atụmatụ, nkuzi na ihe egwuruegwu banye ajụjụ ọnụ ahụ. O jiri ọtụtụ aha pụta! Aha anọ ndị ahụ mechara bụru ọkpụrụkpụ nlekwasị anya nke ije ozi ya na nke kworum ya.
Dịka onye ndu mishọn, a gara m leta otu niime ngalaba nta nke m nʻotu ụtụtụ Sọnde. A hụrụ m ka onyeisi ngalaba nta ahụ mgbe ọbụla na-ewepụta otu mpempe akwụkwọ site nʻakpa ya ma na-ede ihe nʻelu ya. Ekpebiri m ịjụ ya banyere ya mgbe ekpesịrị ekpere mmechi. Mgbe ọgbakọ bịara na njedebe, ma tupu m nwere ike ịjụ ajụjụ banyere mpempe akwụkwọ ahụ, onye ndu mishọn nke ngalaba nta ahụ a gbara ọsọ rute nʻebe isioche, ebe enyefere ya mpempe akwụkwọ ahụ. Ozugbo ozugbo esochiri m onye ndu nke a dị ike nʻọru gaa na ọgbakọ nhazị ọru mgbasa oziọma nke ngalaba nta ha na-emekarị izuụka ọbụla. Tupu ha ebido, ọ wepụtara akwụkwọ ahụ site na akpa ụwe ya. Ihe juputara na ya bụ aha ndị otù ndị na-abịabeghi ọgbakọ oriri nsọ. Nanị na nkeji ole nʻole, onye otù ọbụla nke kansụl ahọrọwo otu aha ma ọbụ abụọ, wee kpebie ileta ha nʻụbọchị ahụ iji mara ma ha dịkwa mma ma iji mee ka ha mata na echetara ha. Ugbu a nke ahụ bụ ịgụkọta ihe ọnụ na ịme nlekọta.
A na m echeta otu distrit, nke dị ezigbo anya site na tempụl kacha dị nso, ebe ihe ejiri mara ha bụ ịnwe tempụl rekọmedị na-arụ ọrụ, nagbanyeghi na enwere ike a gaghị eji ya arụ ọrụ ma ọlị. Na Sọnde mbụ nke ọnwa ọbụla, ndị ndụ na-eji ngwa ọrụ ha niile iji gụkọọ ndị otù ha nataworo onyinye dị nsọ. Ọ bụrụ na ha chọta rekọmendị nke ga emebi na nso nso a, onyeisi odee akwụkwọ ga ahazi ọgbakọ maka ajụjụ ọnụ ịnweta nke ọhụrụ. Ndị mmadụ nwere rekọmendị mebiri emebi ka a na-enye ndụmọdụ, ma achọpụta ha iji nyere ha aka laghachi nʻụzọ ọgbụgba ndụ. A jụrụ m ha mmadụ ole ha nataworo onyinye dị nsọ ndị nwere rekọmendị nʻarụ ọrụ. Aziza ya dị itụnanya bụ 98.6 percent. Mgbe a jụrụ banyere isii ndị ahụ rekọmendị ha mebiri emebi, ndị ndu mara aha otu nʻotu ma kọwara m mbọ niile a na-agba iji kpọghachi ha azụ!
Mgbe afọ ole nʻole gara, ezinụlọ m laghachiri azụ na United States. Obi tọrọ anyị ụtọ ị gaa nzukọ nsọ nʻebe a mgbe ọ ruru afọ 26 anyị na-aga ngalaba ndị dị ntakịrị ma na anọkọtaghị ọnụ. A kpọrọ m ka m bụrụ onye mgbasa ozi ọma nke ngalaba ukwu. Anyị nwere onye ndu mishọn bụ dike ma anyị na-eme ọtụtụ ihe na-enye obi ụtọ ma na-akụziri ndị mmadụ dị ịtụnanya. A rịọrọm ka m sonye nʻotu ọgbakọ kansụl nke ngalaba ukwu iji mara ihe na-eme ma iji nata enyemaka ha maka ndị enyi ahụ anyị na-arụ ọrụ nʻisi ha. Ọ tụrụ m naanya na naanị ihe ekwuru bụ ihe egwuruegwu nke ngalaba ukwu na-abịa niihu. Ezutere m onye ndu mishọn nke ngalaba ukwu mgbe emesịrị ma kwuo na o nweteghi ohere iji nyee rịpọtụ banyere ndị enyi ahụ. Ị ma azịza ya? “O, A naghị m enye rịpọtụ ma ọlị.”
Atụnyere m nke a ya na ọgbakọ kansụl nke ngalaba nta nʻobodo Lahore, Pakistan, nke m gara nanị izuụka ole nʻole gara aga. Ọgbakọ ntakịrị nke a nọdụrụ ọdụ okirikiri ntakịrị tebụlụ, ma nanị ihe ha kwuru bụ banyere mmadụ. Aha niile. Onye ndu ọbụla nyere rịpọtụ banyere ọrụ ekenyere ya na ndị mmadụ na ndị ezinụlọ nke ha na-echeta nʻobi ha. Onye niile nwere ohere iji gbakwụnye echiche nke ya nʻelu ụzọ ahụ kachasị mma ha nwere ike ị gaa iji gọzie ndị ahụ ha na-ekwu maka ha. Atụrụ ọtụtụ arọ ma ekenyere ọtụtụ ọrụ. Nke a bụ nkuzi banyere ịgụkọta ihe ọnụ na ịme nlekọta nye anyị site nʻaka ndị a bụ ụmụnne anyị ndị nwoke na nwanyị, ndị ọhụrụ nzụkọ nsọ anyị.
Na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst, akụziworo anyị site nʻaka ndị amụma ochie ma ndị amụma ugbua—na site nʻusoro nke Onye Nzọpụta anyị debere—maka otu esi eme ije ozi nlekọta. Anyị na-enwere aha niile, anyị na-echeta, ma anyị na-adụkọrịta ọdụ banyere ọdịmma nke mkpụrụ obi niile. Ndị ndu na-eme otu a agaghị ma ọlị enwe ihe ga akọ ha ikwu maka ya niime ọgbakọ kansụl ha niile! Nʻezie ụkpụrụ nke ịgụkọta na nlekọta na-arụ ọrụ. Ọ bụ ụzọ Onyenwe anyị. Anyị pụrụ ime nʻụzo kacha mma. Nye Chineke, onye kere mbara eluigwe niile ma na-achị ha niile, ọrụ nke a—Ọru na ebubeYa —dịrị ya oke mkpa. Ma otu a ka ọ kwesịri ịdịrị onye ọbụla nime anyị, dịka ngwa ọrụ na aka Ya niime ọrụ ịtụnanya Ya nke nzọpụta na mbuli elu. Ọtụtụ ọrụ ebube niime ndụ ndị mmadụ ga-abụ nsonazụ. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.