Ọgbakọ Zuru ọha
Jiri Obi Gị Niile Rụọ Ọrụ Nke Gị
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


15:22

Jiri Obi Gị Niile Rụọ Ọrụ Nke Gị

Tụkwasị Onye Nzọpụta obi ma sonye nʻọrụ, nwee ndidi ma tinye uchu nʻịrụ ọrụ nke gị jiri obi gị niile.

Nʻafọ gara aga mgbe m mere njem ruo Europe ịje leta ebe m nʻabu arụ ọrụ, na Lufthansa German Airlines nọ na Ọdịda ụgbọelu nke Frankfurt.

Iji zulite ndị ọkwọ ụgbọelu ha, ha nwere ọtụtụ ngwa-simulator bụ ọkaibe nke na-arọputa ọnọdụ yiri ka nke ịfe nʻelu ma nke dị mma na nke na-atụ egwu. Nʻafọ niile mgbe m bụ kaptain nke ụgbọelu ahụ, ọ bụ atụmanya na a ga m agafe nlele ife nʻelu niime ngwa-simulator ahụ nʻọnwa isii ọbụla iji debe ikike mji akwọ ụgbọelu. A na m echeta oge ndị ahụ na-ara ezigbote ahụ ya na obi nkoropụ ọ na-enye ma gụnyekwa mmetụta niile nke mmeri mgbe ọ bụla m gafere ule ahụ. A bụ m ntorobịa mgbe ahụ ma ahụrụ m ihe ịma aka ahụ naanya.

Nʻoge nleta m, otu niime ndị isi Lufthansa jụrụ m ma m ga achọ ịnwale ọzọ ma nyaa ngwa-simulator nke 747 otu ugboro ọzọ.

Tupu m nwee ohere chee maka ajụjụ ahụ, a nụrụ m otu olu—nke dara nọọ ka nke m—na-ekwu, “Eeh, ọ ga-amasị m nke ukwuu.”

Ozugbo m kwuputara okwu ndị ahụ, ọtụtụ echiche dịka ide mmiri asọbata nʻuche m. Otego aka m nyara 747 ọbụla. Mgbe ahụ a bụ m onye ntorobịa na kaptain nwere obisiike. Ugbua, ekwesịrị m ị gosi na a bụbụrụ m onyeisi ọkwọ ụgbọelu. A ga m emenyere onwe m ihere nihu ndị ọkacharamara nọ nʻebe a?

Mana ọge agafewo ị laghachi azụ, yamere anọdụrụ m ọdụ nʻoche kaptain, debe akam na control ndị m mara ọfụma, ma nwee mmetụta ifeli elu dịka nnukwu ụgbọelu ahụ gbapụrụ ọsọ ma felie elu feba niime igwe.

Enwere m obi ụtọ ikwu na ofufe ahụ gara nke ọma, ụgbọelu noziri nke ọma ma ugwu m nọrọ m.

Agbanyeghi nke a, nhụmihe ahụ bụụrụ ihe umeala nye m. Mgbe m bụ akaochie, ife ife bụ nnọọ ejirimara mụ nke abụọ. Ugbua, o na-ewecha uche m niile iji mee ihe ndị ahụ dịkasị nta.

Iso ụzọ Na-ewe Ọzụzụ

Nhụmihe m niime ngwa-simulator ahụ bụụrụ ihe ncheta dị mkpa na ịbụ akaochie nʻihe ọbụla—ma ọbụ ịfe efe, ịkwọ ụgbọ miri, ịdụ akwa, ma ọbụ ịmata ihe—na-ewe ịnọgịde nʻọzụzụ na ọmụmụ nke onwe na-esepụghị aka.

Ị nwere ike nọrọ ọtụtụ afọ iji mụta otu nkà ma ọbụ melite otu onyinye chi. Ịnwere ike rụsie ọrụ ike nke ga-eme ya bụrụzie ejirimara gị nke abụọ. Mana ọbụrụ na ịchee na nke ahụ pụtara na ịnwere ike kwụsị ọmụma ihe, nwayọọ nwayọọ ị ga-echefu ọmụma ihe na ikike niile ahụ nke ịgbara mbọ na mbụ nwete.

Nke a metụtara nkà niile dịka ịmụta asụsụ, ịkpọ ngwa egwu ọbụla, na ịfe ụgbọelu. Ọ metụkwara ịbụ onye na-eso ụzọ nke Kraịst.

Ikwu ya nʻụzọ dị mfe, ịbụ onye na-eso ụzọ na-ewe ọzụzụ nke onwe.

Ọ bụghị mbọ emere nʻelu elu ma ọ naghị eme na mberede.

Okwukwe na Jizọs Kraịst bụ onyinye, mana ịnata ya bụ nhọrọ akpachara anya mee nke na-achọ mkpebi obi emere jiri “ike, uche na ume” anyị niile. Ọ bụ ọzụzụ nke ụbọchị ọbụla. Awa ọbụla. Ọ na-ewe mmụta na-adịgide na uchu ejiri obi niile tinye. Okwukwe anyị, nke bụ nkwudesiike anyị nʻebe Onye Nzọpụta nọ, na-esikwuo ike mgbe a na-anwale ya mgbe ezutere mmegide ndị na-abịara anyị na ndụ anụ ahụ nke a. Ọ na-adịgide nihi anyị na-aga niihu nye ya ọzụzụ, anyị ga na-aga niihu na-etinye ya nʻọrụ, ma anyị agaghị akwụsị ma ọlị.

Nʻotu aka nke ọzọ, ọbụrụ na anyị ghara igosipụta okwukwe na ike ya site na-itinye ya nʻọrụ, anyị ga-enwe obi abụọ nʻihe ndị anyị na mbụ weere ka ihe dị nsọ—na-enwezighi obisiike nʻihe ndị ahụ anyị maburu bụ eziokwu.

Ọnwụnwa niile ndị na-enweghi ike ịnwa anyị ọnwụnwa na mbụ, ebidozie kwụsị ịsọ anyị oyi ma bido dọwa anyị akpịrị.

Ọkụ nke ama ụnyahụ ga-enye anƴị ekpomọkụ naanị ruọ nwantịtị oge. Ọ na-achọ ọzụzụ na-adịgide iji mee ka ọ na-enwusi ike.

Niime Agba Ọhụrụ, Onye Nzọpụta kuziri otu nkọnilu banyere otu nnaukwu onye nyere ndị odibo ya abụọ ntụkwasị obi dị nsọ—ego nke akpọrọ talent. Ndị odibo jiri obi ha niile tinye talent ha nʻọrụ mụbara ha. Onye odibo nke liri talent ya nʻala nʻikpeazụ tufuru ya.

Kedụ ihe mmụta nọ ya? Chineke na-enye anyị onyinye—nke ọmụma ihe, nke ikike, nke ohere—ma Ọ chọrọ ka anyị jiri ha rụọ ọrụ ma mụbaa ha ka ha nwee ike gọzie anyị ma gọzie ụmụ Ya ndị ọzọ. Nke ahụ a naghị eme ma ọbụrụ na anyị debe onyinye ahụ nʻelu shelf dịka ihe enwetara na asọmpi nke anyị ga na-elekiri na mmasị site nʻoge ruo nʻoge. Onyinye anyị na-amụba naanị mgbe anyị tinyere ha nʻọrụ.

Ị bụ Onye Ejiri Onyinye Gọzie

“Mana Okenye Uchtdorf,” ịnwere ike kwuo, “Enweghi m onyinye chi ma ọbụ talent ọbụla—ọpekampe, enweghi nke bara uru.” Ikekwe ị na-ele ndị ozọ ndị onyinye ha pụtara ihè ma dị ịtụnaanya ma ị na-echezi na ịbụ mmadụ nkịtị ma atụnyere gị na ha. Ịnwere ike chee na nʻoge ndụ tupu ndụ anụ ahụ, nʻụbọchị ahụ ekesara onyinye na talent ndị ahụ niile, efere gị gbara chakoo—tụmadị ma atụnyere ya na nke ndị ọzọ efere ha juru eju ma na-awufusị.

O, ọ gaara amasịm na m ga amakọ gị ma nyere gị aka ghọta nnukwu eziokwu nke a: Ị bụ onye ihè agọziri agọzi; nwa nke mmụọ nke Chineke dị ebube! Ma inwere niime gị akaraaka nke karịrị uche nke onwe gị ịghọta.

Dịka ndị odee mbem kwuru, ịbịara nʻụwa “urukpu igwe dị ebube na-eso nzọụkwu gị”!

Akụkọ mmalite gị sinachị, ma otu ahụ ka ebe njedebe njem gị dị. Ịhapụru eluigwe ma bịa ebe a, mana eluigwe ahapụghị gị ma ọlị!

Ịkarịrị mmadụ nkịtị.

Ịbụ onye ejiri onyinye gọzie!

Nime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, Chineke kwuru:

“E nwere ọtụtụ onyinye, na nye mmadụ ọbụla ka e nyere otu onyinye site na Mụọ nke Chineke.

“Ụfọdụ bụ ndị e nyere otu, ma ụfọdụ ka e nyere ọzọ, ka mmadụ nile rite uru site otu a.”

Ụfọdị onyinye anyị ka edepụtara niime akwụkwọ nsọ. Ọtụtụ adịghị.

Dịka onye amụma Moronaị kwuru, “Unu ghara ịgọnarị onyinye nile nke Chineke, n’ihi na ha dị ọtụtụ; ma ha si nʼotu Chineke ahụ bịa.” Ha nwere ike na-egosipụta onwe ha “nʻụzọ dị iche iche … ; mana ọ bụ otu Chineke ahụ bụ onye na-arụ ihe nile dị nʼime ihe nile.”

Onwere ike bụrụ na onyinye anyị nke ime mmụọ anyị abụghị nke nke na-ewu ewu, mana nke a apụtaghị na mkpa ha dị dị ntakịrị. Ka m kọrọ unu ụfọdụ onyinye nke ime mmụọ nke m hụworo niime ọtụtụ ndị otù anyị gburugburu ụwa? Na-atụle nʻuche ma ejiriwo otu onyinye ma ọbụ karịa gọzie gị dịka ndị a:

  • Igosipụta ọmịiko

  • Ịmata ndị mmadụ eleghara anya.

  • Ịchọta ihe ga-akpalite ịnwe ọn̄ụ.

  • Ịbụ omee udo.

  • Ịchọta ọrụ ebube niile ndị dị ntakịrị.

  • Inye ekele ndị si n’obi.

  • Ịnwe obi mgbaghara.

  • Ịnwe mmụọ nchegharị.

  • Ịnwe mmụọ nnagide.

  • Ịkọwa ihe nʻụzọ dị mfe.

  • Inwe njikọ gị na ụmụntakịrị.

  • Ịkwado ndi ndu Nzukọ nsọ.

  • Ịnyere ndị ọzọ aka mata na ha sonyere.

Inwere ike ịgaghị ahụ onyinye ndị a ka egosipụtara ha na egwuruegwu ngosipụta onyinye chi nke ngalaba ukwu. Mana enwere m olile anya na ị na-ahụ otu ha jiri dịrị oke mkpa nye ọrụ nke Onyenwe anyị na otu enwere ike iji were onyinye gị metụ ndụ mmadụ, gọzie, ọbụnadị zọpụta otu nime ụmụ nke Chineke. Cheta na: “Site n’ihe ndị dị ntakịrị na ndị dị mfe ka a na-esi ewepụta nnukwu ihe nile.”

Ya mere ka anyị niile rụọ nke ya ọbụnadị nke ntakịrị ahụ.

Rụọ nke Gị ọbụnadị nke Ntakịrị ahụ

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị m hụrụ nanya, ezigbo ndị enyị m, a na m ekpe ekpere ka Mmụọ nyere unu aka mata onyinye niile na talent niile nke Chineke nyeworo unu. Emesịa, ka anyị, dịka ndị odibo kwesịrị ntụkwasị obi dị niime nkọnilu nke Onyenwe anyị, melite ma mụbaa ha.

Ụbọchị ahụ ga-abịa mgbe anyị ga-eguzoro nihu nke Nna anyị nke Eluigwe onye ọmịiko iji nye nkọwa maka ọrụ ekenyere anyị. Ọ ga-achọ ịmata ihe anyị jiri onyinye ndị Ọ nyere anyị mee—tụmadị, otu anyị jire were ha gọzie ụmụ Ya. Chineke maara onye anyị bụ nʻezie, onye ahaziri ka anyị bụrụ, ma atụmanya ndị Ọ nwere nʻebe anyị nọ dị elu.

Mana Ọ naghị atụ anya na anyị ga ejiri ike ike ma ọbụ mee dịka dike garuo nʻebe ahụ. Niime ụwa nke Ọ keworo, uto na-eme nwayọọ nwayọọ—mana ọ na-eme kwa nʻuzọ nʻadịgide na nke a na-esepụghị aka.

Cheta, ọ bụ Jizọs Kraịst bụ onye rụrụ ọrụ nke onye dike ahụ mgbe Ọ meriri ọnwụ na mmehie.

Ọrụ anyị bụ isoro Kraịst. Ọ bụ ọrụ anyị isi na mmehie wezuga onwe anyị, chewe ihu nʻebe Onye Nzọpụta nọ, ma gaa ije nʻụzọ Ya, otu nzọụkwu nʻotu oge. Dịka anyị na-eme nke a, jiri obi niile ma kwesịa ntụkwasị obi, anyị nʻikpeazụ ga-achụpụ nkedo niile nke ezughi okè na mperi niile ma jiri nwayọ bụrụ onye enwogharịrị, tutu nʻụbọchị ahụ zuru okè mgbe anyị ga-ezu okè niime Kraịst.

Ngọzi niile ahụ nọ nso iru aka. Nkwa ndị ahụ niile nọ ebe ahụ. Uzọ ahụ ghe oghe. Ọ bụ nhọrọ anyị ịbanye ma malite.

Mmalite nwere ike dịrị ntakịrị. Mana nke a dị mma.

Ebe okwukwe adịghị ike, malite jiri olile anya na Kraịst Jizọs na nime ike Ya nke na-eme ịdị ọcha ma sachaa.

Nna anyị kwuru na ka anyị zute ihe ịma aka nke okwukwe na ịbụ onye na-eso ụzọ nʻabụghị dịka ndị njem nkịtị kama dịka ndị jiri obi ha kwere, ndị tọgbọrọ ihe niile ma hapụ Babịlọn nʻazụ ma debe obi ha, uche ha, ma nzọụkwu ha nʻebe Zayọn nọ.

Anyị maara na mbọ anyị niile nʻonwe ha enweghi ike ịme anyị abụrụ ndị selestịal. Mana ha nwere ike mee anyị akwụdesie ike ma nọgide na Jizọs bụ Kraịst ahụ, ma pụrụ ịme anyị abụrụ ndị selestịal.

Nihi Onye Nzọpụta anyị dị ịhụnaanya, enweghi ihe ọbụla dịka mmeri adịghịrị onye ọbụla. Ọ bụrụ na anyị debe olile anya na okwukwe na Ya, mmeri anyị ga emezurịrị. Ọ kwere anyị nkwa ịnwete ume Ya, ike Ya, na amara Ya nke bara ụba. Otu nzọụkwu rụọ na otu nzọụkwu, nwayọọ nwayọọ, anyị ga-etolite tutu ruo na nnukwu ụbọchị ahụ zuru okè mgbe anyị na Ya na ndị anyị hụrụ naanya ga-ebikọta ọnụ niime ebube dị ebighị ebi.

Iji rute nʻebe ahụ, anyị garịrị arụ ọrụ nke anyị taa na nʻụbọchị nile. Anyị nwere obi ekele maka nzọụkwụ niile anyị gara ụnyahụ, mana anyị agaghị akwụsị nʻebe ahụ. Anyị mara na anyị ka nwekwara ogologo ụzọ cheere anyị niihu, ma anyị agaghị ekwe ka nke ahụ kụda obi anyị.

Nke ahụ bụ ihe ejiri mara onye anyị bụ—dịka ndị na-ezo ụzọ Kraịst.

A nam agba ume nye, ma na-agọzikwa onye otù ọbụla nke Nzukọ nsọ na ndị niile nwere ọchịchọ obi ịsonye, ịtụkwasị obi na Onye Nzọpụta ma tinye aka nʻọrụ, jiri ndidi, uchu na obi unu niile na-eme ọrụ nke unu—ka ọn̄ụ unu wee juputa ma ka, nʻotu ụbọchị, unu ga-anata ihe niile nke Nna nwere. Nke a ka m na-agba aka ebe n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Achọrọ ndị kaptain ụgbọ elu ka ha na-aga nlele ngwa-simulator kwa ọnwa isii ka ha jikwaa nka ha na imeghari ikike ha. Ọzụzụ nke a siri ike bụ usoro iwu achọrọ maka ndị kaptain ụgbọ elu site nʻaka ndị na-ahụ maka ofufe dị ka FAA.

  2. Lee 1 Ndị Kọrịnt 12:9.

  3. Moronaị 10:32

  4. “Dị nnọọ ka akwara anụ ahụ anyị na-apụghị ịzụlite ma ọ bụ na-edobe ya nʻemebighị iwu nke ike ndọda, otu ahụ ka uto na-anwụ anwụ na-achọ ka anyị dọlịa na imegide ọnwụnwa niile nke Setan na mmegide ndị ọzo na-anwụ anwụ” (Dallin H. Oaks, “Enyemaka niile nke Sinachi maka Ndụ anụ ahụ,” Liahona, Mee 2025, 104).

  5. Lee Alma 32:37–43

  6. Lee Matiu 25:14–30 Nʻụbọchị ndị mbụ nke Mweghachite ahụ, Onyenwe anyị rụtụrụ aka nʻilu ahụ dịka Ọ bara mba nye ndị ahụ zoro talent ndị O nyere ha ezo. Ọ gara niihu dọọ ha aka na ntị na ọ bụrụ na ha gaa niihu ili talent ha, “a ga-anara ha ya, ọbụna nke ahụ ha nwere.” (Ozizi na Ọgblugba ndụ niile 60:2–3).

  7. Mgbe ụfọdụ, anyị na-ekwusi ike banyere ịdị mkpa nke onyinye na nkà dị ma chefuo uru ịgba mbọ na-esepụghị aka bakwara. Otu n’ime ndị ode akwụkwọ ama ama n’oge anyị dere, sị: “N’ezie a ghaghị inwe nkà mgbe ụfọdụ, mana nkà bụ ngwá ahịa dị ọnụ ala, dị ọnụ ala karịa nnu tebụl. Ihe na-ekewa onye nwere nkà na onye na-eme nke ọma bụ ịrụsi ọrụ ike na ọmụmụ ihe; usoro nke ọzụzụ na-esepụghị aka” (Stephen King, Danse Macabre [2011], 88).

  8. “Ode: Intimations of Immortality from Recollections of Early Childhood,” The Poetical Works of William Wordsworth (1835), 249.

  9. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:11–12.

  10. Moronaị 10:8

  11. Ọtụtụ afọ gara aga, Okenye Marvin J. Ashton nke Kworum nke Ndịozi Iri na Abụọ nyere ozi dị ịrịba ama gbasara ụfọdụ onyinye ndị a na-anya nadịaghị ahụkebe; (lee “Enwere Ọtụtụ Onyinye,” Ensign, Nov. 1987, 20–23).

  12. Alma 37:6

  13. Lee Ndị Kọlọsị 3:23;; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:34.

  14. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:24.

  15. Lee Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Ohere nhọrọ.”

  16. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 84:38.