Gaa ma Mee Otu ahụkwa
Ọ ga-amasị m ime ka ndị mgbasa ozi ọma ndị ahụ pụta ihe ndị akpọrọ nʻọrụ ije ozi. Ha bụ ọmụmaatụ nye anyị.
Mgbe Onye Nzọpụta na-eme njem site Betsaịda, ụfọdụ ndị mmadụ kpọtaara Ya nwoke isi kpuru. Ikekwe ha na-atụ anya ịhụ ọrụ ebube naanya ha. Onye Nzọpụta “kpọọrọ nwoke ahụ isi kpuru nʻaka, ma dupu ya nʻobodo ukwu ahụ” ịgwọ ya na nzuzo. Na mbụ, ọgwụgwọ ahụ yiri ihe na-erughị ihe na-arụ ọrụ. Nwoke ahụ “leliri anya elu, ma kwuo, ana m ahụ ndịikom dị ka osisi, na-aga ije.” Jizọs, nʻobi ọmịiko, tinyere aka ya ọzọ nʻelu anya ma mee ka o lee anya elu.” Jiri mmetụ aka ọzọ nke aka nke Onye Nzọpụta, nwoke ahụ kpuru isi ugbu a “hụrụ ụzọ … nke ọma.”
Nke a bụ nnọọ otu ihe atụ otu ndụ nke Onye Nzọpụta jiri juputa site nʻihe omume umeala niile nke ije ozi. Ọ na-echetere anyị na Ọ “bịaghị ka ejee ozi nlekọta nye ya, mana ije ozi nlekọta” ma emesịa na-akpọku anyị isoro ọmụmaatụ Ya site nʻịgatukwu niihu, na-enye ndị ahụ na-arịọ nʻaka anyị, na ịhụ ndị agbata obi anyị naanya. Mgbe a jụrụ, “Onye bụ onye agbata obi m?” Kraịst kesara ụkabụilu nke ezi Onye Samerịa, enyere iwu “ịga, ma meenụ otu aka ahụ.”
Ndị mgbasa ozi ọma nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a bụ ọmụmaatụ ụbọchị ugbu a nke ezi Onye Samerịa na Kraịst na-akpọku anyị ịghọ. Ọ ga-amasị m ime ka ndị mgbasa ozi ọma ndị ahụ pụta ihe ndị akpọrọ nʻọrụ ije ozi. Ha bụ ọmụmaatụ nye anyị nke otu ije ozi si (1) emepe obi nye ozi ọma nke Jizọs Kraịst, (2) ekwe anyị niile ije ozi na-agbanyeghị ọnọdụ anyị niile, na (3) ewete ike nke Kraịst niime ndụ anyị.
Nke mbụ, Ije ozi Na-emepe Obi niile nye Ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
Nʻihe ruru 91 Tupu A Mụọ Kraịst, Amọn, otu onye mgbasa ozi ọma, kọwara onwe ya nye Eze Lamoni site nʻikwu, “Ana m achọ ịnọ nʻetiti ndị a na nwa oge; … [ma] aga m abụ nwa odibo gị.” Niihi ije ozi ya nye eze ahụ, e nyere Amọn ohere “ikwu okwu atụghị ụjọ, …ma gwa [Eze Lamoni] site nʻike nke o siri jee ozi ya. Na nzaghachi, eze ahụ kwere nkwa na “ihe ọbụla ọ bụ [Amọn] na-achọ … [eze ahụ] ga-enye ya.” Naanị arịrịọ nke Amọn bụ na eze ahụ ga-ege ntị nye ozi nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ije ozi nke Amọn mere “puku kwuru puku mkpụrụ obi [eruo] na nchegharị.”
Nʻụbọchị anyị, ije ozi na-aganiihu esepụghị aka iji duga ndị ọzọ ruo ozi ọma ahụ. Nwanne nwanyị Bevan nọ na-eje ozi dị ka onye mgbasa ozi ọma na-akuzi ihe mgbe o bidoro inwe nsogbu ahụike nke mere ya alọghachi ụlọ maka inwete ọgwụgwọ. Kama ịtọghapụ ya, ọ gara niihu ije ozi dị ka onye mgbasa ozi ọma na-eje ozi site nʻebe obibi.
Mgbe m gara nleta na park, Nwanne nwanyị ya na otu enyi nwere mkpali mmụọ ikwuru otu onye nne kpọ ụmụntakịrị anọ okwu, mana ha jụrụ ma ezi na ụlọ ahụ anyara pụọ. Ụbọchị nke sotere, ha laghachiri na park ahụ nʻekpere na ezi na ụlọ nke a ga-anọ ebe ahụ. Nʻịtụnaanya, onye nne ahụ nọdụrụ odụ nʻotu ebe ahụ kpọmkwem dị ka nʻụbọchị gara aga. Ugbu a Nwanne nwanyị Baven na enyi ya gakwuuru onye nne ahụ, mata ya, ma chọpụta na ọ nọ nʻezigbo mkpa enyemaka mgbe ahụ. Ha nyeere ya aka ma emesịa kpọkuo ya ịmụ banyere ozi ọma.
Niihi ije ozi ahụ na ọkpụkpọ oku ahụ onye nne ahụ na nwa ya nke kacha okenye mere baptizim, emesịa nke nʻesote nʻokenye niime otu afọ sotere. Ha nọgidere na nkwesị ntụkwasị ruo ụbọchị taa. Nwanne nwanyị Baven maara na nhụmiihe nke a bụ nke eluigwe kpalitere ma o “gosiri [ya] na [ya] nọ kpọmkwem ebe Chineke chọrọ [ya] ịnọ.”
Dị ka Amọn na Nwanne nwanyị Baven, dị ka anyị na-ejere ndị ọzọ ozi, anyị “na-egosipụta ọmụmaatụ dị mma nye ha” ma ha na-achọ ịmara “ihe kpatere olileanya ahụ nke nọ niime [anyị].”
Jizọs na-akpọku anyị ị “ga, ma mee otu ahụkwa.”
Nke abụọ, Ije ozi Na-ekwe Anyị niile Ịlekọta Na-agbanyeghị Ọnọdụ Anyị Niile
Onyeisi Russell M. Nelson kpọrọ “onyeikom nta ọbụla tozuru oke, gbasiri ike ikwado maka ma jee ozi mishọn” na ka onyeinyom nta ọbụla “ikpe ekpere ịmara ma Onyenwe anyị ga-achọ [ya] ije ozi mishọn.” O kwere nkwa na “mkpebi gị ije ozi mishọn, ma ọ bụ nke nke ịtọghata ma ọ bụ mishọn ije ozi, ga-agọzi gị na ọtụtụ ndị ọzọ.” Mishọn ije ozi gbanwere nkọwa nke mkpụrụokwu ahụ gbasiri ike. Ugbu a onyeikom nta na inyom nta ọbụla tozuru oke na-achọ ije ozi mishọn nuju oge maka Onyenwe anyị nwere ike ime otu ahụ, jiri atụmaanya ole ma ole.
Okenye Holgado bụ otu ọmụmaatụ nke ịgbasi ike ije ozi na-agbanyeghị ọnọdụ nke onwe. A mụrụ ya nʻọnọdụ rare genetic disorder, nke gbochiri ya site nʻije ozi mishọn na-akuzi ihe. Okenye Holgado ka akpọrọ ije ozi mgbasa ozi ọma na-eje ozi ma wepụta onwe ya ịrụ ọrụ ụlọ nkwakọba ihe nke bishọp, ebe o nyeere ndị ọzọ aka inwete enyemaka ha na-achọ. Ọ haziri shelf niile, gbaa akwụkwọ nri na-akpa, ma gbawaa igbe cadbọọdụ niile.
Dị ka Okenye Holgado kwuru okwu na nzukọ oriri nsọ mgbe mishọn ya gwụrụ, ọ kọrọ na “Chineke na-achọ ndị mgbasa ozi ọma na-eje ozi. Ọ na-achọ ndị ga-ahụ ndị ọzọ naanya ma jeere ha ozi. Ndị a na-ahazi toilet paper, gbaa broccoli na-akpa, rụọ oche ma ha bụ ezigbo ndị mmadụ.”
Ọ bụghị na ị ga-enwerịrị ọrụ ije ozi ekenyere ma ọ bụ yiri tag aha iji mee ihe dị mma. Omume nke ọbụla nke ije ozi ka Onye Nzọpụta na-amata. Anyị niile gbasiri ike inyere ndị ọzọ aka bịarute Kraịst site nije ozi nʻobi ịhụnaanya dị mma. Anyị niile nwere ike ije ozi nlekọta nʻaha nke Kraịst nye otu onye ahụ site nʻike nke Mmụọ Nsọ ma bie dị ka ọmụmaatụ nke okwukwe niime Jizọs Kraịst. Ije ozi na-ekwe anyị igosipụta onwe anyị dị ka onye dị ndụ eji chụọ aja nke Chineke nabatara.
Jizọs na-akpọku anyị ị “ga, ma mee otu ahụkwa.”
Nke atọ, Ije ozi Na-ewete Ike nke Kraịst niime Ndụ Anyị
Otu onye mgbasa ozi ọma nta onye akpọfetere ọrụ nkuzi nʻọrụ ije ozi gbara lịka lịka ya na aka mgba nke onwe nke dobere ya na mkpa ike ọgwụgwọ nke Kraịst. Ije ozi enyefechasịrị wetere ike ahụ niime ndụ ya. O kwuru, “Enwere m mmetụta na mgbe m nọ na-agba lịka lịka, ọ metụtara m ka Kraịst na-ebuli m elu. Enwere ihe pụrụiche gbasara ịhụ ka Ọ na-agọzi ndị mmadụ site na ebe nri na-adị, niime tempụl, na site nʻozi ọma Ya.”
Okenye nke a malitere inwe ọn̄ụ miri emi, ma mmasị ya achọtara ọhụrụ gọziri ya na ezi na ụlọ ya niile. Mmụọ banyere ebe obibi ha ebe ọ dị ukwuu, ha gakọtara tempụl ọnụ mgbe niile, ma Kraịst ghọrọ nlekwasị anya dị ukwuu karịa niime ezi na ụlọ ha. Onye mgbasa ozi ọma nke a kwere na Kraịst zọrọ ndụ ya ma gọzie ezi na ụlọ ya site nʻije ozi.
Onyeisi Nelson akuziwo, “Ịdị njikere ije ozi na ịgba ndị ọzọ ume guzooro dị ka ọdịmara nke ịdị njikere mmadụ ka agwọọ ya” site nʻike mgbapụta nke Onye Nzọpụta.
Jizọs na-akpọku anyị ị “ga, ma mee otu ahụkwa.”
Ndị Mgbasa ozi ọma Bụ Ọmụmaatụ niile nke Ndị Na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst Nyefechasịrị.
Mgbe eji ọkpụkpọ oku dị ka onye mgbasa ozi ọma na-eje ozi gọzie gị ma ọ bụ onye otu ezi na ụlọ, nke ahụ bụ oge iji nwee an̄ụrị. Ezi na ụlọ gị ugbu a ga-enwe onye nnọchite nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst edopuru iche bi ebi nʻebe obibi gị. Nke ahụ ga-agbanwe unu niile maka ezi ihe. Agaghị enwe ndakpọ olileanya nʻọkpụkpọ oku ọbụla iji jee ozi. Anyị na-agụ, “Aga m aga ebe ị chọrọ ka m gaa” na “Aga m abụ ihe ị chọrọ ka m bụrụ.” Ebe a bụ ohere iji gosi na anyị nʻezie maara ihe anyị na-ekwu!
Nye unu niile ndị na-eje ozi, ma kacha nke ruo ihe gafere 4,000 ndị mgbasa ozi ọma nta na-eje ozi, anyị hụrụ unu naanya! Ọ bụrụ na ndị mgbasa ozi ọma na-akuzi ihe bụ ọnụ nke Onyenwe anyị, mgbe ahụ unu bụ aka nke Onyenwe anyị, ma unu abụghị ndị mgasa ozi ọma klas nke abụọ. Onye ọbụla niime unu dị mkpa nye mkpokọta nke Izrel. Onyeisi Nelson na-akuzi na oge ọbụla anyị mere ihe ọbụla nke na-enyere onye ọ bụla aka … ime ma debe ọgbụgba ndụ ha na Chineke, anyị na-enye aka ikpokọta Izrel.”
Unu ndị mgbasa ozi ọma na-eje ozi na-akpokọta Izrel nʻụzọ dị ọtụtụ, ma ije ozi unu na-agbanwe ndụ. Mgbe ụfọdụ ị gaghị ama onye ga-erite uru site nʻije ozi gị, mana Chineke maara. Na-echete mgbe niile na “mgbe unu [jere ozi] nye otu niime ndị a, … unu [na-ejere Ya ozi].” Anyị na-anụ olu unu dị ka unu na-arụ ọrụ obi ọma nʻogige niile ịkpọ oku Nzukọ nsọ; anyị na-ahụ ọnụ ọchị unu dị ka unu na-enye aka niime otu niile dị nʻobodo; anyị na-ahụta ìhè unu dị ka unu na-eje ozi na tempụl. Anyị na-enye ndị agụụ nri, yinye ndị gba ọtọ uwe, ma nye ndị akpịrị na-akpọ nkụ mmiri.
Anyị niile kwesịrị ịga ma mee otu ahụkwa.
Ije ozi Bụ Ọbara ndụ nke Ndị na-eso ụzọ nke Kraịst.
Ije ozi nwere ike iji mepee obi niile nye ozi ọma ma na-ekwe anyị niile inye Kraịst mkpụrụ obi anyị niile. Ọ na-agbanwe obi anyị ịdị ka Ya karịa, ma nʻusoro ahụ, anyị na-ebuli ndị ọzọ. Onyeisi Nelson otu mgbe jụrụ, “Niime ụwa nke a ure ime mmụọ mebisiri, ndị mmadụ ha nwere ike … ime ihe dị iche?” Azịza Ya: “Ee! … ʻNdị ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị, … jikeere … nʻike nke Chineke nʻebube dị ukwuu’ … nwere ike bulie ndụ nke ụmụ mmadụ niile.” Site nʻije ozi anyị pụrụ ịgbanwe obi niile—na ụwa.
Kraịst “garaniihu na-eme ihe dị mma.” O lekọtara ndị nọ nʻọrịa, nye ịhụ ụzọ ndị adịghị ahụ ụzọ, ma gaa leta ndị dara mba. O siri nri dị iche iche, nyee aka na oriri alụm di na nwunye, ma nyee puku kwuru puku ndị agụụ na-agụ nri. Dị ka anyị na-eje ozi nʻaha nke Kraịst nye onye nʻibe ya, anyị na-adiwanye nsọ ma tozuo oke maka onyinye nke ndụ ebighị ebi. Jizọs Kraịst dị ndụ. Ọ bụ Onye Nzọpụta m na nke gị. Ọ bụ Onye Mgbapụta anyị. Ọ bụ nnukwu onye ọmụmaatụ anyị nke ije ozi nlekọta. Ọ na-akpọku onye ọbụla niime anyị ịga ma mee otu ahụkwa. Site nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.