Ahapụkwala Ebere Nke Gị Onwe Gị
I nwere ohere ozugbo ozugbo inweta enyem aka na ọgwụgwọ sinachi na-agbanyeghị ntụpọ ndị iji bụrụ mmadụ.
Onye nkuzi ụlọakwụkwọ otu mgbe kuziri na oyu whale—ọbụna na-agbanyeghị na o buru ibu—enweghị ike ilo mmadụ niihi na whale niile nwere obere akpịrị. Otu nwata nwanyị rụrụ ụka, “Mana Jona ka whale loro.” Onye nkuzi ahụ zaghachiri, “Nke ahụ ekweghị omume.” Ka nọkwa na-edoghị anya, nwata nwanyị ahụ kwuru, “Ọdịmma, mgbe m ruru eluigwe, aga m ajụ ya.” Onye nkuzi ahụ kwara ya emo, “Ma ọ bụrụkwanụ na Jona bụ onye mmehie ma gaghị eluigwe?” Nwata nwanyị ahụ zara, “Mgbe ahụ i nwere ike ịjụ ya.”
Anyị na-achị ọchị, mana anyị ekwesịghị ichefu ike nke akụkọ Jona na-enye onye ọbụla “ji umeala achọ an̄ụrị,” nke ka nke ndị ahụ ọ na-ara ahụ.
Chineke nyere Jona iwu “ịga na Nineveh” ịma ọkwa nchegharị. Mana Nineveh bụụrụ ndị oke onye iro nke Izrel mgbe gboo—ya mere Jona ji gbughị oge chuwe ihu nʻụzọ ọzọ, site nʻụgbọ mmiri, gawa Tarshish. Dị ka ọ na-akwọpụ nʻugbọ mmiri site nʻọkpụkpọ oku ya, ebili mmiri na-emikpu ụgbọ mmiri malitere. Nʻido anya na nnupu isi ya bụ ihe kpatara ya, Jona wepụtara onwe ya ka akwapụ ya nʻụgbọ. Nke a mere ka ụja oke osimiri dajụọ, nke zọpụtara ndụ ndị ya na ha nọ nʻụgbọ mmiri.
Nʻụzọ dị ịtụnaanya, Jona gbanahụrụ ọnwụ mgbe otu “nnukwu azụ” Onyenwe anyị “kwadoro” loro ya. Mana ọ nọ na-nhusianya niime ebe gbara ọchịchịrị ma ree ure nke ọnụ apụghị ịkọ mkpụrụ ụbọchị atọ, tutu ruo mgbe a gbụpụtara ya nʻala akọrọ. Mgbe ahụ ka ọ nabatara oku ya ije Nineveh. Otu ọ dị, mgbe nnukwu obodo chegharịrị ma ahapụ ibibi ha, Jona were iwe na ebere egosịrị ndị iro ya. Chineke na ndidi kuziiri Jona na Ọ hụrụ ya naanya ma na-achọ ịnapụta ụmụ Ya niile.
Ndajọgharị karịa otu ugboro na ọrụ ya niile, Jona wetere otu ama doro anya na niime ndụ anụ ahụ, “mmadụ niile adawo.” Aanyị ọtụtụ mgbe anaghị agbakarị ama banyere Ọdịda. Mana site nʻinwe nghọta ozizi na aka ebe nke ime mmụọ banyere ihe mere onye ọbụla niime anyị ji na-enwe ihe akamgba metụtara agwa ọma, nke ahụ, na nke ọnọdụ bụ nnukwu ngọzi. Nʻelu ụwa ebe a, ahịhịa ọjọọ na-eto, ọbụna ọkpụkpụ siri ike na-agbaji, ma mmadụ niile “etozughị ebube nke Chineke.” Mana ọnọdụ anụ ahụ nke pụrụ ịnwụ anwụ—ndapụta nke nhọrọ niile Adam na Iv mere—dị oke mkpa ruo na isi ihe kpatara anyị jị dị ndụ: “ka [anyị] wee nwee ọn̄ụ”! Dị ka nne na nna anyị mbụ mụtara, naanị site nʻidetụ ilu ọnụ na inwe mmetụta mgbu nke ụwa dara ada ka anyị nwere ike ịmata maka, ọbụna naanị kpori ndụ, ezi an̄ụrị.
Ama banyere Ọdịda ahụ agọpụghị mmehie ma ọ bụ ụzọ ejighị kpọrọ ihe nʻọrụ niile nke ndụ, nke mgbe niile na-achọ nrusi ọrụ ike, omume ọma, na inye nkọwapụta. Mana ọ ga-ebelata nkụda obi anyị mgbe ihe niile gara nnọọ otu a na-achọghị ma ọ bụ anyị ahụ omume ọma na-ada nʻonye otu ezi na ụlọ, enyi, ma ọ bụ onye ndu. Ọtụtụ mgbe ihe dị ka nke a na-akpata anyị ịdaba na nkatọ na-ebute esemookwu ma ọ bụ mkpọrọmasị na-anapụ okwukwe anyị. Mana ama kwụsiri ike banyere Ọdịda ahụ nwere ike inyere anyị aka ịdịkarị ka Chineke dị ka Jona si kọwaa, ya bụ, “ịdị ebere, adịghị nkọ nʻiwe iwe, ma nwee nnukwu obi ọma” nye mmadụ niile—tinyere onwe anyị—niime ọnọdụ ezughị oke anyị na-enweghị mgbagha.
Ọbụna dị ukwuu karịa igosipụta ndapụta niile nke Ọdịda ahụ, akụkọ nke Jona nʻụzọ siri ike na-eduba anyị na Ya onye pụrụ ịnapụta anyị site na ndapụta ndị ahụ. Aja nke Jona jiri onwe ya chụọ iji zọpụta ndị ya na ha nọ nʻụgbọ mmiri dị ka nke Kraịst nʻezie. Ma ugboro atọ mgbe a jụrụ Jizọs maka akara dị iriba ama banyere ịdị nsọ Ya, O kwusiri ike na “ọdịghị akara aga enye … mana naanị akarà nke Jonas [Jona],” na-ama ọkwa na dị ka Jona nọrọ “mkpụrụ ụbọchị atọ na abali atọ nʻafọ whale; otu ahụ ka Nwa nke mmadụ ga-anọ mkpụrụ ụbọchị atọ na abali atọ niime obi nke ụwa.” Dị ka ọdịmara nke ọnwụ eji chụọ aja nke Onye Nzọpụta na mbilite nʻọnwụ dị ebube, Jona enwere ike ịgbaọrụ. Mana nke a bụkwa ihe na-eme aka ebe nke onwe ya banyere na nkwudosi ike ya nye Jizọs Kraịst, enyere niime afọ whale ahụ, na-emetụ nʻahụ ma na-akpate mmụọ nke ukwuu.
Akwá Jona bụ nke ezigbo mmadụ nọ nʻọgbaghara, otu nʻụzọ dị ukwuu nke ya onwe ya kpatara. Maka onye nsọ, mgbe ọdachi dakwasịrị gị niihi agwa mmakwaara, okwu, ma ọ bụ mkpebi, na-agbanyeghị ezi mbọ nke ezi omume, o nwere ike nʻụzọ pụrụ iche egbuda mmụọ ma ha onye ahụ inwe mmetụta nke onye ajụrụ ajụ. Mana ihe ọbụla kpatara ma ọ bụ ogo nke ụkwụtụkwụ anyị na-ezute, e nwere mgbe niile ala akọrọ maka olileanya, ọgwụgwọ, na an̄ụrị. Gee Jona ntị:
“Ebere m akwa niihi mkpagbu nke onwe m nye Onyenwe anyị … ; site nʻolulu nke ala mmụọ ka m bere akwa. …
“Niihi na Ị kwabawo m nʻoke ogbu, nʻetiti oke osimiri niile; …
“[Ma] a sịrị m, akwapụrụ m site nʻihu gị; otu ọ dị aga m elekwasị gị anya ọzọ chee ihu nʻebe tempụl nsọ gị.
“Mmiri niile gbara m gburugburu, ọbụna ruo na mkpụrụ obi: oke ogbu ahụ gbara m gburugburu, ahịhịa niile gbara isi m gburugburu.
“Agbadara m na-alaala niile nke ugwu ukwu niile; … otu ọ dị ịkpọpụtawo ndụ m site nʻure. …
“Mgbe mkpụrụ obi m dara mba … e chetara m Onyenwe anyị: ma ekpere m bịara … niime tempụl nsọ gị.
“Ha ndị na-ahụ ihe efu niile na-aghọ aghụghọ na-ajụ ebere nke onwe ha.
“Mana aga m achụ aja nye gị site nʻolu nke inye ekele; Aga m akwụ ụgwọ nke ahụ m kwere na nkwa. Nzọpụta si nʻaka Onyenwe anyị abịa.”
Na-agbanyeghị na ọ bụ ọtụtụ afọ gara aga, a pụrụ m ịgwa gị kpọmkwem ebe m nọ ọdụ, na kpọmkwem ka o si na-emetụta m mgbe, nʻomimi afọ nke ala mmụọ nke onwe, a chọpụtara akwụkwọ nsọ nke a. Maka onye ọbụla taa ọ na-emetụta dị ka o metụtara m oge ahụ—na akwapụrụ gị, na-emikpu nʻebe mmiri niile kachasị dị omimi, ebe ahịhịa mmiri gbakụrụ isi gị ma ugwu ukwu niile dị nʻoke osimiri a na-adagide gị gburugburu—arịrịọ m, dị ka Jona si kpatee mmụọ, bụ ahapụkwala ebere nke gị onwe gị. I nwere ohere ozugbo ozugbo inweta enyem aka na ọgwụgwọ sinachi na-agbanyeghị ntụpọ ndị iji bụrụ mmadụ. Ebere nke a na-atụ egwu na-abata ma site na Jisọs Kraịst. Niihi na Ọ maara ma hụ gị naanya nʻụzọ zuru oke, Ọ na-enye gị ya dị ka nke “gị onwe gị,”nke pụtara na ọ dabaara gị nʻụzọ zuru oke, emebere iji belata ahụhụ niile nke gị onwe gị ma gwọọ ihe ndị ahụ na-egbu gị mgbu. Ya mere, nʻaha Chineke na nke gị, agbanyerelakwa nke ahụ azụ. Nabata ya. Malite site na ịjụ ige ntị nye “ihe efu na-aghọ aghụghọ” nke onye iro, nke ga-anwa gị ọnwụnwa ịna eche na ana enweta enyem aka na-ịkwọpụ site na oke na ọrụ niile nke ime mmụọ i nwere. Kama, soro odudu nke Jona nwere nchegharị. Tikuo Chineke. Gaa na Tempụl Jidesie ike ọgbụgba ndụ gị niile Jere Onyenwe anyị ozi, Nzukọ nsọ Ya, na ndị ọzọ ozi site nʻịchụ aja na inye ekele.
Ime ihe ndị a na-eweta ọhụ pụrụ iche nke ọgbụgba ndụ dị ịhụnaanya nke Chineke nwere maka gị— ihe Hibru Baịbụl na-akpọ hesed. Ị ga-ahụ ma nwee mmetụta ike nke Chineke na-enye ugwu, anaghị ada mba, enweghị ọgwụgwụ, na “obi ebere dị nro” nke nwere ike ime gị “adị ike… ruo na… nnapụta” site na mmehie ọbụla ma ọ bụ ihe ndọla azụ ọbụla. Nhujuanya siri ike na nke malitere na mbụ nwere ike kpuchie ọhụ ahụ nʻisi mbụ. Mana dị ka ị na-aganiihu “ịkwụ ụgwọ ihe ahụ nke [i] kwere na nkwa,” ụdị ọhụ dị otu ahụ ga-amụke nʻụzọ karịrị akarị niime mkpụrụ obi gị. Ma site nʻọhụ ahụ ịgaghị enweta naani olileanya na ọgwụgwọ mana, na-ịtụnaanya, ị ga-enweta ọn̄ụ, ọbụna nʻetiti mgbu gị niile. Onyeisi Russell M. Nelson kuziri anyị nʻụzọ dị oke mma: “Mgbe nlekwasị anya nke ndụ anyị nọ n’atụmatụ nke nzọpụta nke Chineke … na Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya, anyị nwere ike nweta mmetụta ọn̄ụ na-agbanyeghị ihe na-eme—ma ọ bụ na-anaghị eme—niime ndụ anyị. Ọn̄ụ na-abịa site na ma niihi Ya.”
Ma ọ bụ na anyị na-ezute ihe dị omimi, dị ka ihe ike nke Jona, ma ọ bụ aka mgba ụbọchị niile nke ụwa anyị na-ezughị oke, ọkpụkpọ oku ahụ bụkwa otu ihe ahụ: Ahapụkwala ebere nke gị onwe gị. Lebaanya na ihe iriba ama nke Jona, Kraịst ahụ dị ndụ, Ya onye bilitere site na ili mkpụrụ ụbọchị atọ Ya ebe omeriworo ihe niile—maka unu. Chigharịkwute Ya. Kwere na Ya. Jeere Ya ozi. Chịa ọchị Niihi na niime Ya, na naanị Ya, ka ana achọta nʻuju na ọgwụgwọ na-enye obi ụtọ sitere na Ọdịda ahụ, ọgwụgwọ nke anyị nwere mkpa ya ngwangwa ma na-achọ nʻobi umeala. Ana m agba ama na nke a bụ ezịokwu. N’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.