Ihu Ọchị na Obi Ekele
Ịdị ukwuu nke Ndị nsọ anyị dị niime Afrịịka na-adịrịkwu ọbụna karịa dị ka ha na-ezute aka mgba niile nke ndụ na ihe niile nke Nzukọ nsọ na-eto eto na-achọ.
Ihe gafetụrụ otu afọ gara aga, atọghapụrụ m site nʻọrụ m nʻotu Ndịisi Iri Asaa, mgbanwe a mara ọkwa ebe a nʻọgbakọ zuru ọha. Niihi na akpọrọ aha m nʻakụkụ Ndị Ji ikike Zuru ọha ndị ahụ naara aghọ ndị emeritus, ọtụtụ chere na m arụsiwo oge ije ozi m. Mgbe ọgbakọ gasịrị, anatara m imerime ozi obi ekele na ezi uche maka akụkụ nke ndụ m sotere. Ọbụna ụfọdụ rịọrọ ịzụ ụlọ m dị na Mpaghara Ugwu Salt Lake. Ọ mara mma ịhụ na agụụ m ga-agụ ha nakwa ịmara na anyị agaghị enwe nsogbu ire ebe obibi anyị mgbe m mesịrị. Mana a kaa erubeghị m ebe ahụ.
Ọrụ ọhụrụ m kpọgara mụ na Monika ruo ọmarịcha Afrịịka, ebe Nzukọ nsọ na-achawapụta. Ọ bụrụwo ngọzi ije ozi nʻetiti Ndị nsọ kwesịrị ntụkwasị obi niime Mpaghara Ndịda Afrịịka ma gbaa akaebe ịhụnaanya nke Onyenwe anyị maka ha. Ọ na-akpake mmụọ ịhụ ndị otu ezi na ụlọ ndudugandu nke ọzụzụ niile, gụnyere ọtụtụ ndị otu Nzukọ nsọ na-eme nke ọma na ndị gụrụ ezigbo akwụkwọ, na-aranye oge ha na onyinye chi ha iji jeere ndị ọzọ ozi.
Nʻotu oge ahụkwa, dị ka otu igwe mmadụ nọ na mpaghara ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ na-akpatatụ ihe ndị ha ji ebi ndụ nọ na-esonye Nzukọ nsọ ma na-agbanwe ndụ ha site na ngọzi niile nke ikwesị ntụkwasi obi nʻịkwụ otu ụzọ nʻụzọ iri na ohere agụmakwụkwọ niile nke Nzukọ nsọ na-enye. Ụdị atụmatụ ndị a dị ka Succeed in School, EnglishConnect, BYU–Pathway Worldwide, na Perpetual Education Fund na-agọzi ọtụtụ ndụ, kacha nke ndị nke ndudugandu na-etolite etolite.
Onyeisi James E. Faust otu mgbe kwuru, “E kwuwo ya na nzukọ nsọ nke a anaghị adọtakarị ndị nnukwu mmadụ mana na-emekarị ndị mmadụ efu ghọọ nnukwu mmadụ.”
Ịdị ukwuu nke Ndị nsọ anyị dị niime Afrịịka na-adịrịkwu ọbụna karịa dị ka ha na-ezute aka mgba niile nke ndụ na ihe niile nke Nzukọ nsọ na-eto eto na-achọ. Ha na-ejikarị omume dị mma ezute ya. Ha na-eyinyekwasị nke ọma nkuzi sitere nʻaka Onyeisi Russell M. Nelson ama ama:
“Ọn̄ụ ahụ anyị na-enwe nwere ntakịrị mmetụta nye ọnọdụ niile nke ndụ anyị ma ọ metụtara ihe niile nye olileanya nke ndụ anyị.
“Mgbe nlekwasị anya nke ndụ anyị dabeere n’atụmatụ nzọpụta nke Chineke … na Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya, anyị nwere ike nwee mmetụta ọn̄ụ na-agbanyeghị ihe na-eme—ma ọ bụ na-anaghị eme—niime ndụ anyị.”
Ha na-achọta ọn̄ụ na-agbanyeghị aka mgba ha niile. Ha amụtawo na mmekọrịta anyị na Onye Nzọpụta na-enye anyị ike izute ihe isi ike niile jiri ihu ọchị na obi ekele.
Ka m kesaa ụfọdụ nhụmiihe mụ na Ndị nsọ ndịa kwesịrị ntụkwasị obi ndị na-egosipụta ụkpụrụ nke a, jiri Mozambique bido.
Mozambique
Ọnwa ole ma ole gara aga, e duziri m ọgbakọ stek maka stek gbara otu afọ nke nwererịị ngalaba 10. Ndị karịrị mmadụ 2,000 juputara obere ụlọ ụka ahụ ya na ụlọ ikwuu atọ ndị nọ nʻezi. Onyeisi stek ahụ gbara afọ 31, nwunye ya gbara afọ 26, ma ha nwere ọbere ụmụaka abụọ. E nweghị mkpesa, ọ na-edu stek nke a na-eto eto na ama aka—naanị ihu ọchị na obi ekele.
Nʻotu ajụjụ ọnụ mụ na petrak, a mụtara m na nwunye ya nọ nʻezigbo ọrịa, ma ọ gbara mbọ ilekọta ya. Mgbe mụ na onyeisi stek kwusịrị maka okwu ahụ, anyị nyere ya ngọzi ọkwa nchụaja. A jụrụ m petrak agwaetiti ọnụọgụgụ ngọzi ọ na-enye.
“Asatọ ruo iri,” ka o kwuru.
A jụrụ m, “Nʻọnwa ọbụla?”
Ọ zaghachiri, “Nʻizu ụka ọbụla!” E nyere m ya ndụmọdụ na ime ọtụtụ ahụ ngwụcha izu ụka ọbụla adịchaghị mma.
“Okenye Godoy,” ka o kwuru, “ha nọ na-abịa izu ụka ọbụla, gụnyere ndị otu ọhụrụ na ọtụtụ ndị ntoroọbịa.” Ọzọkwa, ọ dịghị mkpesa—naanị ihu ọchị na obi ekele.
Mgbe nzukọ mgbede Satọde nke ọgbakọ stek ahụ gasịrị, nʻụzọ mụ ịlawa ebe họteelụ, ahụtara m ndị mmadụ nọ na-azụ ihe oriri nʻụzọ na-abalị. Ajụrụ m onye na-anya m nʻụgbọala ihe kpatara ha si na-eme ya mgbe itiri gbara nnukwu kama mgbe ụbọchị dị. Ọ zaghachiri na ha na-arụ ọrụ nʻoge ehihie iji nwete ego iji zụọ ya mgbe emesịrị.
“O, ha naara arụ ọrụ taa iji rie nri echi na-abịa abịa,” ka m kwuru.
Mana ọ gbaziri m olu: “Mba, ha naara arụ ọrụ nʻoge ehihie iji rie nri na-abalị.” Echewo m na ndị otu anyị nwere ike ịnọ nʻọnọdụ katụ mma, mana o mere ka m mara na ọtụtụ na-agabiga otu ụdị aka mgba ndị a nʻakụkụ obodo ahụ. Ụtụtụ sotere, nʻoge nzukọ Sọnde na ịmara ọnọdụ ha ọhụrụ ọhụrụ a, ihu ọchị na obi ekele ha metụtara m karịa.
Zambia
Nʻụzọ ịgawa nzukọ Sọnde, onyeisi stek na m hụrụ di na nwunye ku otu nwata na ụmụntakịrị abụọ ji ụkwụ aga nʻụzọ. Anyị kwụsịrị ịkwọrọ ha nʻụgbọala. Ọ tụrụ ha naanya ma obi tọrọ ha ụtọ. Mgbe m jụrụ anya ọ dị ha ga-eji garuo nʻụlọ ụka, nna ahụ zaghachiri na o nwere ike iwe ha nkeji 45 ruo otu awa, site otu ụmụ ha si gasie ike. Ha gabigara njem nke a nʻọbịbịa na ọlụla, Sọnde niile, na-enweghị mkpesa—naanị ihu ọchị na obi ekele.
Malawi
Otu Sọnde tupu ọgbakọ stek, a gara m leta ngalaba nta abụọ na-eji ụlọakwụkwọ ọha dị ka ụlọ ụka. Akpata oyi wụrụ m niihi ọnọdụ ụlọ ndị ahụ na-enweghị otu ọ dị, nke na-enweghị ọbụna ihe ndị dị mkpa. Dị ka m zutere ndị otu ole ma ole ebe ahụ, adịịrị m njikere ịrịọ mgbaghara maka ọnọdụ na-adịchaghị mma nke ụlọ ụka ha, mana obi dị ha ụtọ inwe ebe nọ nso ha ga-agbakọta, zere ogologo ije ije ha na-emekarị. Ọzọkwa, enweghị mkpesa—naanị ihu ọchị na obi ekele.
Zimbabwe
Isote nzukọ ọzụzụ ndị ndu na Satọde, onyeisi stek kpọgara m nzukọ Sọnde ana eme nʻụlọ a na-akwụ ụgwọ. Enwere mmadụ 240 bịara. Emesịa bishọp nabatara ndị otu 10 mere baptizim izu ụka ahụ. Ndị ọgbakọ juputara nʻọnụ ụlọ ntakịrị abụọ, ụfọdụ ndị otu nọkwa nʻezi ụlọ ahụ, na-ele nzukọ site na mpio na ọnụ ụzọ niile. Ọzọkwa, enweghị mkpesa—naanị ihu ọchị na obi ekele.
Lesotho
A gara m leta ọmarịcha ntakịrị obodo nke a, amakwaara dị ka “alaeze ugwu ukwu,” ịhụ distrit Nzukọ nsọ na-akwado ịghọ stek. Isote Satọde emere ọtụtụ nzukọ, a gara m nzukọ Sọnde nʻotu ngalaba nta ha dị na ụlọ a na-akwụ ụgwọ ya. Ọnụ ụlọ nke oriri nsọ jufere ejufe, ebe ndị mmadụ guzo nʻazụ ụzọ isonye ihe a na-eme. A gwara m onyeisi ngalaba nta na ọ ga-achọ ụlọ buru ibu karịa. Nʻịtụnaanya m, ọ gwara m na ihe a bụ naanị ọkara nke ndị otu. Ọkara ndị nke ọzọ ga-abịa nzukọ oriri nsọ nke abụọ mgbe awa nke abụọ gasịrị. Ọzọkwa, enweghị mkpesa—naanị ihu ọchị na obi ekele.
Alaghachiri m Lesotho mgbe emesịrị niihi ihe mberede okporo ụzọ jọgburu onwe ya gụnyere ọtụtụ ndị ntoroọbịa anyị, ndị Okenye D. Todd Christofferson kwuru na mbụ. Mgbe m gara leta ndị ezi na ụlọ ahụ na ndị ndu, atụrụ m anya ọnọdụ na-adịchaghị mma. Kama, ezutere m Ndị nsọ siri ike ma gbasie ike ndị naara anagide ọnọdụ ahụ nʻụzọ na-ebuli elu na nke na-akpake mmụọ.
Mpho Aniciah Nku, 14, onye nyara ndụ ihe mberede dị na foto nke a, kọwara ya nke ọma nʻokwu ya niile: “Tụkwasị obi na Jizọs ma na-elekwasị anya na Ya mgbe niile, niihi na site na Ya ị ga-achọta udo, ma Ọ ga-enyere gị aka nʻusoro ọgwụgwọ.”
Ndị a bụ nnọọ ọmụmaatụ ole ma ole ebe anyị na-ahụ omume ha dị mma niihi ha na-etinye ndụ ha nʻozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ha ma ebe ha ga-achọta enyemaka na olileanya.
Ike Ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta
Gịnị mere Onye Nzọpụta ga-esi enyere anyị na ha aka nʻọnọdụ ọbụla nke ndụ anyị? Azịza ahụ ka e nwere ike ịchọta niime akwụkwọ nsọ niile:
“Ma ọ ga-aganiihu, na-ata ahụhụ mgbu niile na mkpagbu niile na ọnwụnwa niile n’ụdị ọbụla. …
“… Ma ọ ga-ebukwasị onwe ya adịghị ike ha niile, ka afọ ya niile wee juputa n’ebere, … ka o wee mata … otu ọ ga-esi nyere ndị ya aka dị ka adịghị ike ha niile siri dị.”
Dị ka Okenye Devid A. Bednar kuziri, enweghị mgbu anụ ahụ, nhujuanya, ma ọ bụ adịghị ike anyị nwere ike ịgabiga nke Onye Nzọpụta amaghị maka ya. “Mụ na gị nʻoge adịghị ike nwere ike tipụta mkpu, ʻỌ dịghị onye na-aghọta [ihe m na-agabiga]. …’ Enweghị mmadụ ọbụla, elemanya, maara. Mana Ọkpara nke Chineke mazuru ma na-aghọta nke ọma.” Ma gịnị kpatara? Niihi na O nwewo mmetụta ma buo ibu arọ anyị tupu anyị eme ya.”
Ana m emechi jiri ama m nke okwu niile nke Kraịst dị na Matiu 11:
“Bịakwutenụ m, unu ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, ma Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.
“Nyaranụ ịnyagba m, ma mụtakwanụ ihe n’aka m; niihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi: ma mkpụrụ obi unu ga-enweta ezumiike.
“N’ihi na ịnyagba m dị mfe, ma ibu arụ m dịkwa mfe ịbu.”
Otu ahụkwa Ndị nsọ ahụ dị niime Afrịịka, ama m na nkwa nke a bụ eziokwu. Ọ bụ eziokwu ebe ahụ, ma bụrụkwa eziokwu ebe niile, Nke a ka m na-agba ama ya n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.