Ọgbakọ Zuru ọha
Lekwasị Chineke anya ma Dị ndụ
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


14:13

Lekwasị Chineke anya ma Dị ndụ

Ọ bụ naanị site nʻilekwasị Chineke anya ka ndị mmadụ, ndị ezi na ụlọ, na ọbụna mba niile nwere ike ime nke ọma.

Na Jun gara aga, ihe mberede dị egwu mere na mba Lesotho dị na southern Afrịịka. Obere bọs bu ndịinyom nta 20 nke Ngalaba Nzukọ nsọ dị na Maputsoe na ndị ndu ha asaa na-aga ebe isi obodo ukwu ahụ, Maseru, maka mgbakọta nke ndịiyom nta sitere na distrikt ha. Ka ha na eme njem na mwịụzọ-abụọ ụzọ awara awara nʻoge ụtụtụ ahụ, ụgbọala si ụzọ nke chuwereihu ebe ọzọ, na mbọ ịgbafe ụgbọala nke ọzọ, gbabatara na mwịụzọ nke bọs ahụ na-agba. Enweghịkwa oghere ma ọ bụ oge izere nkụkọta, ma na nkebi tịkọm tịkọm abụọ ụgbọala abụọ ahụ kụkọtara, dapụ nʻụzọ, ma nwuru ọkụ.

Niihe niile, mmadụ 15 nwụrụ niihe mberede ahụ, gụnyere ndịiyom nta isii, ndị ndu Ndịiyom Nta abụọ, na Onyeisi ngalaba nta na nwunye ya. Ndị nyara ndụ, ndị otù ezi na ụlọ, na ndị enyi egosiwo mwute nʻụzọ dị iche iche, tinyere oge ndị nke ewere iwe, nkụda obi, ma ọbụla amamikpe. Na-agbanyeghị mmetụta niile na ajụjụ ndị na-asaghị asa ndị a, ha akasiwo onye na ibe ya obi ma chigharịkwute Chineke site na abụ dị nsọ, akwụkwọ nsọ, na ekpere, ebe ha nwetaworo nkasiobi. Setsoʻana Selebeli gbara afọ iri na asaa nyara ndụ gbara ama na, “Jizọs Kraịst hụrụ anyị naanya ma nọnyeere anyị, ọbụladị na obi anyị nwere mwute.”

Ndịotu nọ na Lesotho

Otu onyeinyom nta na otu onye ndu ndị edebere nʻụlọ ọgwụ maka ọgwụgwọ ọkụ ọgbụgba mụkọtara Akwụkwọ nke Mọmọn ọnụ. Otu onye kwuru “N’oge na-adịbeghị anya anyị nọ na-agụ na Moronaị, ma Moronaị na-ekwu kpọmkwem mmetụta nke m nọọrọ na-enwe. Mgbe ọ na-ekwu okwu, ọ dị ka ọ na-asị, ʻỊga-amụ okwu ndị a niihi na edere ha maka gị iji nyere gị aka gabiga nke a.ʻ”

Olili ozu na Lesotho

Na njikọ ụka olili ozu maka ndị ahụ nwụrụnụ, Okenye Mpaghara Iri asaa Siyabonga Mkhize nyere ndụmọdụ, anyị niile ga-echigharịkwute Onyenwe anyị nʻoge a ma rịọ Ya ọ kasie anyị obi na … ịbịajụ mgbu anyị na-enwe.” Onyeisi Ndịiyom Nta sitere na Ngalaba nta Leribe, Mampho Makura dị nso, nyere mgbam ume: “Chigharịkwute Onyenwe anyị, ma nweta ume ịnabata uche Ya. Jizọs Kraịst bụ ʻmmalite na ọgwụgwụ nke okwukwe anyị’ [Ndị Hibru 12:2]. Elepụkwala anya mana, lekwasị Ya anya.”

Lekwasị Ya anya. Okwu ya mere ka ndụmọdụ nke Alma nyere nwa ya nwoke Helaman hie ụda: “Hụ na unu lekwasịrị Chineke anya ma dị ndụ.” Alma rụtụrụ aka na nhụmiihe nke Lehi na ndị ya jiri Liahona dị ka ụdị ya: “Ọ dị mfe ịn̄a ntị nʻokwu nke Kraịst, nke ga-egosi gị ụzọ guzoro kwem na-eduba na an̄ụrị dị ebighị ebi, dị ka ọ dịịri ndị nna nna anyị ha ịn̄a ntị na kọmpas nke a, nke ga-eduba ha nʻụzọ guzoro kwem ruo nʻala ekwere na nkwa.” Alma sịrị: “Ọ bụrụ na ha ga-eleanya ha nwere ike dịrị ndụ. Ma ọ bụrụ na anyị … leeanya anyị nwere ike dịrị ndụ ruo ebighị ebi.”

Na mmemme ọzọ, Alma rụtụrụ aka na ọmụmaatụ nke agwọ bras nke Moses weliri elu mgbe ndị Izrel mgbe gboo nwere mkpagbu site na agwọ na-ewe iwe ọjọọ. Onyenwe anyị gwara Moses ka o mee ihe yiri agwọ ma bulie ya elu nʻotu okporo, ma kwee nkwa “na onye ọbụla agwọ tụrụ, mgbe o lekwasịrị ya anya, ga-adị ndụ.” Alma kọwara na oyiyi bras ahụ bụụrụ ụdị ma ọ bụ ọdịmara nke Kraịst, onye a ga-ebuli elu nʻelu obe. Ọtụtụ lereanya ma dị ndụ, mana ndị ọzọ bụụrụ, nʻokwu nke Alma, ndị “kpọchiri obi nke ukwuu” nke mere na ha naanị enweghị ike ileanya ma laa nʻiyi.

Alma jụrụ:

“Ọ bụrụ na enwere ike gwọọ unu naanị site na unu ilegharị anya gburugburu ka e wee gwọọ unu, ọ bụ na unu agaghị ele ọsọ ọsọ, ma ọ bụ ọ ga-akara unu mma ịkpọchi obi unu n’ekweghị ekwe, ma dị ume ngwụ, nke mere na unu agaghị elegharị anya gburugburu, ka unu wee laa n’iyi?

“ … Emesịa legharịa anya gburugburu ma malite ikwere nʻỌkpara nke Chineke, na ọ ga-abịa ịgbapụta ndị ya, ma na ọ ga-ata ahụhụ ma nwụọ iji chụọ aja maka mmehie ha niile; ma na ọ ga-ebilite ọzọ site na ndị nwụrụ anwụ, nke ga-eweta na mmezu mbilite n’ọnwụ ahụ, na ụmụ mmadụ niile ga-eguzoro n’ihu ya, ka ekpee ha ikpe n’ụbọchị ikpeazụ na ụbọchị ikpe, dị ka otu ọrụ ha niile siri dị.”

Nʻezie, ndụmọdụ ahụ “Lekwasị Chineke anya ma dị ndụ” nwere mpụtara nye anyị na-abụghị naanị nʻebighị ebi, mana na-emekwa ndịiche niile na agwa na otu ndụ anụ ahụ anyị dị. Cheta okwu niile nke Nwanne nwanyị nta nọ na Lesotho akpọpụtawororịị—“Jizọs Kraịst hụrụ anyị naanya ma nọnyeere anyị, ọbụladị na obi anyị nwere ihe mgbu.”

Ọ dị nʻọdịdị nke ụwa dara ada—ebe ekwensu na-agbọ ụja na ebe onye niile na-ezughị oke—nke mere na a ga-enwe ndakpọ olileanya niile na mmejọ niile, ịta ahụhụ na mwute, ọdịda na nfunarị, mkpagbu na ekpeghị ikpe ziri ezi. Ọ bụ naanị site nʻilekwasị Chineke anya ka ndị mmadụ, ndị ezi na ụlọ, na ọbụna mba niile nwere ike ime nke ọma. Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo: “Niihi na Onye Nzọpụta, site na Aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị ọgwụgwụ, gbapụtara onye ọbụla niime anyị site na-adịghị ike niile, mmejọ niile, na mmehie, ma niihi na O nwere nhụmiihe mgbu niile, nchekasị, na ibu arụ nke inwetụgoro [lee Alma 7:11–13ya mere dị ka ị na-enwe ezi nchegharị ma na-achọ enyem aka Ya, inwere ike kulie merie ụwa nke ugbu a juputara na nsogbu.”

Enweghị nkwa ekwegharịrị ọtụtụ mgbe niime akwụkwọ nsọ Akwụkwọ nke Mọmọn karịa nke a: “Ọbụrụraa na unu ga-edebe iwu nsọ m niile unu ga-eme nke ọma n’ala ahụ: mana ọbụrụraa na unu agaghị edebe iwu nsọ m niile a ga-ebepụ unu site n’ihu m.” Nhụmiihe ndị mmadụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn nwetere ọtụtụ narị afọ gara aga na-egosị eziokwu nke okwu ndị a. “Mee nke ọma” pụtara inwete odudu na ngọzi nke eluigwe niime ndụ ha. “Ime nke ọma” pụtara inwetezu ogo niile nke ọdị–mma ihe gbasara ego nke nyeere ha aka ime ọlụlụ, zulite ezi na ụlọ niile, na inye nlekọta na mkpa nke ndị ọzo. “Ime nke ọma” gụnyere ike ịkarị ihe isi ike na mnwale. Site nʻamara nke Kraịst, “ihe niile na-aga[kọ] nke ọma maka ọdịmma [ha],” nuchaa ha, ma mikpukwo mmekọrịta ha na Ya.”

Alma kọwara na ilekwasị Chineke anya bụ idobe iwu nsọ Ya niile, tikuo Ya esepụghị aka maka nkwado Ya, nata ndụmọdụ nʻaka Ya niihe niile ị na-eme, ma kwe ka obi gị juputa nʻekele nye Ya ehihie na abalị. Iwu nsọ niile nke Chineke na ndụmọdụ ka ahụrụ niime akwụkwọ nsọ na okwu niile nke ụmụ odibo Ya. Ụkpụrụ niile na uche ọma niile edepụtara niime “Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa amara nye Ụwa” bụ ọkanga ọmụmaatụ. Nke ọzọ bụ nduzi a hụrụ niime obere akwụkwọ Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa. Isiokwu Ndịikom Nta na Ndịiyom Nta maka afọ nke a bụ “Lekwasị Kraịst anya,” ewetere site na ntuzi aka na-enye nkasi obi nke Onyenwe anyị nyere Josef Smith na Oliver Cowdery: “Lekwasi m anya nʻechiche niile; enwela obi abụọ, atụla egwu.” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa na-ekwu okwu nye ọtụtụ iwu nsọ na ụkpụrụ nke Chineke kachasị dị ọsịsọ ma na-akuzi otu esi elekwasị Onyenwe anyị anya nʻime ezi mkpebi niile. Ọ bụ nduzi na-abụghị naani maka ndị ntoroọbịa mana maka anyị niile.

Dị ka otu ezigbo ọmụmaatụ dị mkpa, Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa nwere nduzi bara oke uru niime isi nke enyere aha “Ahụ Gị Dị nsọ.” Ọ na-akuzi, “Lekọta ahụ gị—na ahụ nke ndị ọzọ—na nkwanye ugwu. Dị ka ị na-eme mkpebi niile gbasara uwe, ọdịdị isi gị, na ngosipụta gị, jụọ onwe gị, ʻAna m akwanyere ahụ m ugwu dị ka onyinye dị nsọ si nʻaka Chineke?ʻ”

Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa garaniihu kwuo, “Na-edebe mmekọrịta nwoke na nwanyị na agụụ mmekọrịta nsọ. Ha ekwesịghị ị bụ isiokwu nke egwuregwu ma ọ bụ ime ihe ọchị. A sị na ọ bughị alụmdi dị nʻetiti nwoke na nwanyị, ọ bụ ihe jọrọ njọ imetụ aka nʻebe akụkụ ahụ onye ọzọ dị nzizo na nsọ ọbụna ọ bụrụ na-eyi uwe. Ọ bụrụ na nhọrọ niile gbasara ihe ị na-eme, ihe ị na-eleanya, agụ, ihe ị na-egere ntị, na-eche gbasara, ihe ezipụrụ nʻikuku, ma ọ bụ edereede, zere ihe ọbụla nke na-akpachara anya akpake echiche agụụ mmekọ na ndị ọzọ ma ọ bụ nʻonwe gị.”

Nke a na-ewete nʻuche ịdọ aka na ntị nke Onyeisi Nelson mere na nso nso a:

“Ihe ole ma ole ga-emebisi ndụ gị ngwa ngwa karịa imebi iwu nke a dị nsọ [banyere ịdị ọcha mmekọrịta]. Maka ndị ahụ ha na Chineke gbaworo ọgbụgba ndụ, omume rụrụ arụ bụ otu ụzọ kacha dị ngwa iji tufuo ama gị.

“… Ikike nke ike ndụ bụ otu ihe ugwu nke ịbụ chi nke Nna nke Eluigwe na-ekwe ka ụmụ Ya na anwụ anwụ ime. Ya mere, Chineke setịpụrụ ụkpụrụ nduzi niile maka ojiji nke ike a dị nsọ. Mmekọrịta nke anụ ahụ bụ naanị maka otu nwoke na otu nwanyị lụrụ di na nwunye.

“Ọtụtụ nime ụwa ekwenyeghị nke a, mana echiche ọha mmadụ abụghị nke na-ekpebi eziokwu. Onyenwe anyị ekwuola na o nweghị onye na-adịghị ọcha mmekọ ahụ ga-aba nʻalaeze seletịal. … Ma ọbụrụ na ị dịghị ọcha mmekọ ahụ, ana m arịọ gị ka ichegharịa. Biakwutenụ Kraịst ma nata nkwà Ya banyere mgbaghara zuru oke dị ka ị na-echegharị site na mmehie gị nʻuju [Lee Aịzaya 1:16–18; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:42–43].”

Cheta nkwa ahụ nọ niime Akwụkwọ nke Mọmọn, chewere ihu na ọgaranya abụghị ogbenye—ọ bụ ibepụ site na ihu Onyenwe anyị. Ọnịnọ Ya na-arụtu aka na mmetụta nke Mmụọ Ya na ndụ mmadụ. Mmadụ niile juputara nʻIhè nke Kraịst dị ka ha na-abata nʻụwa.” Na mgbakwunye, ụfọdụ na-eme ihe iji mee baptizim ma nata onyinye na ihè onyinye nke Mmụọ Nsọ gbakwunyere. Ọ na-ewete mkpatemmụọ na odudu, gbakwunye ma nuchaa onyinye niile na ike niile dị mfe nke mmadụ, ma na-enye aka izere mmetụta ọjọọ niile, mkpebi ndị na-adịghị mma, na ebe oruru gwụ.

Dị ka gị, a maara m ụfọdụ ndị otu mgbe n̄ụrịrị ọn̄ụ onyinye nke Mmụọ Nsọ mana ndị site na-ịda idobe iwu nsọ niile nke Chineke etufuwo ngọzi ahụ. Otu nnọọ kacha agbata nʻuche onye ịbụ onye otu na Nzukọ nsọ abụrụwo ihe anapụrụ niihi njehie. Ọ sịrị na ihe gbatara ya nʻobi na mbụ bụ iwe iwe. Ọ dịịrị ka onye ndị ndu na-ezughị oke kpere ikpe. Ọ maara na omume nke ya onwe ya dịrịị njọ, mana ọ haziri ya site na-ịrụaka na mperi niile na mmejọ niile nke ndị ọzọ. Mgbe ntakịrị oge gasịrị, ọ malitere inwe obi ụtọ nʻụdị ndụ ọ na-ebi na-abụghị na Nzukọ nsọ na-enweghị oke na ọrụ nke ọkpụkpọ oku niile, na atụmanya niile banyere ije ụka ofufe niile na ilekọta ndị ọzọ.

Nke a garaniihu ọtụtụ mgbe, mana ọ malitere inwe mmetụta nke ukwuu maka enweghị Mmụọ Nsọ—ọnịnọ nke Chineke—niime ndụ ya. Site na nhụmiihe, ọ maara ihe ọ dị ka ya inwe, si nʻụbọchị ruo nʻụbọchị, nkasi obi, odudu, na obisi ike enwere site na Mmụọ, ma o nwetaghị ya. Nʻikpeazụ, o mere ihe a chọrọ iji chegharịa ma tozuokwa oke ọzọ maka baptizim nke mmiri na nke Mmụọ.

O yiri ka enweghị nsọtụ ruo nsiputa dị iche iche ndị mmadụ na-eleanya maka mpụtara, an̄ụrị, na enyemaka. Ọtụtụ ndị “na-elehiekarị anya.” Mana anyị ekwesịghị ịbụ “ụmụntakịrị, ana akwagharị akwagharị, ma bugharịa site nʻikuku ọbụla nke ozizi [ma ọ bụ uwe na-ewu ewu].” Nʻilekwasị anya na Chineke, anyị nwere ike ịchọta udo niihe isi ike, ma okwukwe anyị nwere ike ịganiihu na-eto eto ọbụna nʻoge obi abụọ na aka mgba nke ime mmụọ. Anyị nwere ike nata ume nʻoge mmegide na ọnọdụ ndopụ iche. Anyị nwere ike kpezie ihe kwesịrị ekwesị site na ọnọdụ a nọ na ya ugbu a. Nʻezie,enweghị ụzọ ọzọ karịa ihe Chineke nʻOnwe Ya chiworo echichi: “Lekwasị m anya, ma nwee nzọpụta, unu nsọtụ niile nke ụwa: niihi na abụ M Chineke, ma enweghị onye ọzọ.”

Ilekwasị Chineke anya pụtara na Ọ bụghị nnọọ otu niime ihe ndị kacha dị anyị mkpa; ọ pụtara, kama, na Ọ bụ otu ihe kachasị dị anyị mkpa. Ana m akpọta nʻuche ọzọ mkpọka ahụ dị egwu mere na Lesotho na Jun gara aga. Site na-akwà ọrịa ya nʻụlọ ọgwụ, otu niime ndị ndu Ndịiyom Nta nke nyara ndụ, onye na-ekweghị na Chineke tupu ya abata na Nzukọ nsọ, kwuru na ebumnuuche ya bụ ugbu a ịchọpụta ihe eji hapụ ndụ ya. “Ịnọgide nʻefe Chineke bụ otu m ga-esi enweta azịza, ma ọ bụrụ ma m nweta azịza,” ka o kwuru. “A naara m eche na m hụrụ Chineke naanya, mana ugbu a, a hụrụ m Ya naanya okpukpu okpukpu. Ugbu a Ọ bụ [nke mbụ] niihe kachasị mkpa niime ndụ m.”

Ana m agba ama banyere Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ, onye na njikọta nke okwu, echiche, ebumnuuche, na omume zuru oke, bụcha otu Chineke, ndị anyị nwere ike ilenyeanya maka ihe niile dị mma. Ana m agba ama banyere Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst ebe ike iji mejuputa nkwà dị ịtụnaanya na-esi abịa: “Lekwasị m anya, ma nagide ruo ọgwụgwụ, ma unu ga-adị ndụ; n’ihi na onye ahụ na-anagide ruo ọgwụgwụ ka m ga-enye ndụ ebighị ebi.” Nʻaha Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Lee Ryan Jensen, “Ndị Nyara ndụ Mkpọka Bọs na Lesotho Kọrọ Mwute—na OkwukweFaith—nʻOge Ihe Egwu,” Akụkọ Gbasara Nzukọ nsọ, July 18, 2025, thechurchnews.com; Ryan Jensen, “‘Chineke Ka Bụkwa Chineke’—Icheta Ndụ Ndị Furu na Mkpọka Bọs na Lesotho,” Akụkọ Gbasara Nzukọ nsọ, July 19, 2025, thechurchnews.com.

  2. Alma 37:47.

  3. Alma 37:44.

  4. Alma 37:46; nkwusi ike agbakwụnyere.

  5. Lee Ọnụ Ogụgụ 21:5–6.

  6. (Ọnụọgụgụ 21:8.

  7. Lee Alma 33:19.

  8. Alma 33:22

  9. Alma 33:21-22. Nwa nwa Alma nke nwoke, Nefi, nʻịgba ama banyere Onye Nzọpụta, gbakwunyere, “Ma ka ha ra bụ ndị ga-elekwasị agwọ ahụ anya ga-adị ndụ, ọbụna otu ahụ ka ha ra bụ ndị ga-elekwasị Ọkpara Chineke anya nʼokwukwe, nwee mmụọ dị nchegharị, ga-adị ndụ, ọbụna ruo na ndụ ahụ nke dị ebighị ebi” (Helaman 8:15).

  10. Russell M. Nelson, “Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” Liahona, Nọv. 2022, 96.

  11. 2 Nifaị 1:20.

  12. Ndị Rom 8:28.

  13. Anyị nwere ike hụ na gburugburu anyị mkpụrụ niile nke ilekwasị Chineke anya na inwe Mmụọ Ya ịnọnyere anyị. Iji maatụ, nchọcha achọpụtawo na “ọganiihu nke ime mmụọ bụ ihe eji atụnyere nchekwa megide nkụda uche na ọgwu mmara ahụ, na ihiwe ndị dimkpa nta maka inwe mmekọrịta dị mma, orụ nke kacha baa uru, na mgbasi ike nke echiche karịrị sie ike” (Cornelia Powers, “Onye Ndu Ọhụrụ Nke Ime Mmụọ na Kampus,” Atlantic, Me 18, 2025, theatlantic.com).

    Ogo dị iche iche nke oke owu ọmụma, ndopụ iche nke echiche, na obi nkoropu na ndịiche izugbe ọnụọgụgụ ndị bi nʻobodo na obosara ụdị ibi ndụ dị mma karịa, ịdị ike nke anụ ahụ na nke ụbụrụ, ogo agụmakwụkwọ niile dị elu, na iji okwukwe kwere na ihe ga-adịmma nʻetiti Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a. Ọbụghị na anyị, dị ka mmadụ, enwetụbeghị aka mgba ndị a na-ahụkarị nʻụwa. Kama, ọ bụ na nʻilekwasị anya na Jizọs Kraịst, anyị nwere ike merie.

  14. Lee Alma 37:35–37.

  15. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:4.

  16. Ozizi na Ọgbụgbandụ niile 6:36.

  17. Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile (2022), 24, 25.

  18. Russell M. Nelson, “CheeThink Selestịal!,” Liahona, Nọv. 2023, 118; nkwusi ike nọ na nsinambụ.

  19. Lee Jọn 1:9; Moronaị 7:16; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:45-46; 93:2.

  20. Jekọb 4:14.

  21. Ndi Efesọs 4:14.

  22. Aịzaya 45:22.

  23. Mapule Joyce Takane, nọ na Jensen, “Ndị Nyara ndụ Mkpọka Bọs Dị egwu na Lesotho Kọrọ Mwute—na Okwukwe—nʻOge Ọdachi,” thechurchnews.com.

  24. Lee 1 Jọn 5:7; 3 Nefi 11:36; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:28; Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Chineke, Chukwu,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  25. 3 Nịfaị 15:9.