Ọgbakọ Zuru ọha
Dịrị Nʻudo unu na Chineke
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


10:21

Dịrị Nʻudo unu na Chineke

Ịdị nʻudo nke a ruo Chineke, site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, na-eduba nʻokwukwe akwaa akwụrụ.

Dị ka m na-amụ akwụkwọ nsọ, ana m ezute okwu ndị na-enwete uche m, kacha mkpa niihi na ha nwere mpụtara pụrụiche dị ka nsonazụ nke nhụmiihe ndị m nweteworo nʻoge ndụ. Anọrọ m oge ọrụ m ịrụ ọrụ dị ka forensic accountant. Jiri ọzụzụ ahụ, mkpụrụokwu ahụ dịrị nʻudo enwetewo uche m dị ka m na-agụ akwụkwọ nsọ. Ọrụ m bụ ịgbakọta ego ole enyere nkọwa jiri ndekọihe gbasara ego site nʻitinye nka accounting niile, nnyocha niile, na nchọpụta niile. Nʻaka nke ọzọ, ebumnobi m bụ idozi nkwa ego niile jiri dọkumentị ego ndị so na ya iji hụ izi ezi na ịdaba adaba. Agbara m ezigbo mbọ iji mezie ndịiche niile, ma ọ bụ ihe na-emekarị na oge bara uru ka aranyere iji hazie ọbụna ndịiche ndị kacha obere.

Onye Ozi Pọl rịọrọ Ndị Kọrịnt arịrịọ ka “ha na Chineke dịrị nʻudo.” Ịdịrị nudo unu na Chineke pụtara ịkpọtaghachi gị azụ baa na ndakọrịta unu na Chineke ma ọ bụ iweghachite mmekọrịta unu na Chineke nke dọtịworo ma ọ bụ mebiworo niihi njọ ma ọ bụ omume anyị niile. Nʻụzọ dị mfe, ịdịrị nudo unu na Chineke pụtara idozi uche na omume anyị ya na uche nke Chineke ma ọ bụ dị ka akuziri site nʻaka Onyeisi Russell M. Nelson, ikwe ka Chineke merie niime ndụ anyị.

Dị ka akuziri niime akwụkwọ nsọ, anyị nweere onwe ime ihe nʻonwe anyị, “ịhọrọ ụzọ nke ọnwụ ebighị ebi ma ọ bụ ụzọ nke ndụ ebighị ebi.” Mana ọ bụrụ na anyị anaghị arụsị ọrụ ike, nnwere onwe nke a ime ihe nʻonwe anyị nwere ike idu ruo na imebi nhazi anyị na uche nke Chineke.

Onye amụma Jekọb kuziri na mgbe anyị na-ahụ onwe anyị na enweghị ndakọrịta ma ọ bụ enweghị nhazi anyị na uche nke Chineke, naanị ụzọ anyị nwere ike iji nwete ịdị nʻudo bụ “ịdịrị nʻudo nye [Chineke] site nʻaja mgbaghara mmehie nke Kraịst.” Anyị garịrị amata na ịdị nʻudo dabeere nʻebere, na-egosi na omume aja mgbaghara mmehie dị ebube nke Jizọs Kraịst na-eme ịdị nʻudo ekwe omume.

Dị ka ị na-atụgharị uche maka ndụ nke onwe gị, chee banyere oge mgbe ọ dịrị ka ị nọ nebe dị anya site nʻebe Nna nke Eluigwe nọ niihi na i siwo nʻebe ọ nọ gaa ebe dị anya. Ịma atụ, ikekwe ị dawo mba nʻikpe ekpere nye Ya ma ọ bụ nʻidebe iwu nsọ Ya niile. Dị nnọọ ka anyị na-ahọrọ idobe onwe anyị nʻebe dị anya site nʻebe Chineke nọ, anyị ahaghị ịhọrọ ibido mgbalị nke ịdị nʻudo. Onyenwe anyị na-ekwusi ike oke na ọrụ anyị mgbe O kwuru, “Biakwutenụ m nso ma aga M abịakwute unu nso; chọsienụ m ike ma unu ga-achọta m; rịọnụ, ma unu ga-anata; kụọ aka, ma a ga-emeghere unu ya.”

Olee otu Onye Nzọpụta si enyere anyị aka weghachite ma dịrị nʻudo na mmekọrịta nke a dị mkpa? Nye mụ nwa, ana m eme nnukwu ọganiihu na njem mụ ịdị nʻudo mụ na Chineke mgbe m na-esoro ndụmọdụ akuziri site nʻaka Onyeisi Nelson ma chegharịa ụbọchị niile. Ebumnuuche bụrụ na ịdị nʻudo gosipụtara mweghachite nke mmekọrịta mebiri emebi, kacha nke nʻetiti ụmụ mmadụ na Chineke, site nʻiwepụ ihe mgbochi nke mmehie.

Otu niime ịdị nʻudo ndị kacha ukwuu anyị na-agụ banyere ya niime akwụkwọ nsọ bụ nke Ịnos. Otu ihe niime ndụ ya anọzighị ya na Chineke. O gosipụtara ịdabere na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst ya na ịdị nʻudo na Chineke. Ọ kọwara ọchịchọ ya ichegharị, ụmeala ya, nlekwasị anya ya, na mkpebi ya. Ịdị nudo ya na Chineke ka akwadoro mgbe ọ nụrụ otu olu, na-asị, “Ịnos, agbagharawo gị njọ gị, ma aga agọzi gị.” Ịnos matara mmetụ nke nchegharị na ịdị nʻudo ahụ nwere nʻahụ ya mgbe ọ sịrị, “Ma mụ onwe m, Ịnos, maara na Chineke enweghị ike ịtụ asị; ya mere, azapụrụ ikpe ọmụma.”

Ịdị nudo na-ewete ọbụghị naanị enyemaka site na mmetụta nke ikpe ọmụma mana nakwa udo niime onwe anyị na ndị ọzọ. Ọ na-agwọ mmekọrịta, na-eme obi adị nro, ma na-agba iso ụzọ anyị ume, na-ewete obisike bawanyere niihu Chineke. Ihe na-ewetere m nnukwu olileanya na obisike bụ mkpụrụ ọzo nke ịdị nʻudo nke Ịnos kọwara mgbe o kwuru sị, “Ma emesịa mụ omwe m, Ịnos nụru okwu ndị a, okwukwe m malitere ịbụ akwaa akwụrụ niime Onyenwe anyị.”

Mgbe m bụ obere nwantakịrị nwoke, nna ukwu nebe nne m nwere nnukwu ubi cherry. Enwetere m ohere ịrụ ọrụ na ụbi ahụ, kachasị nʻoge summer nʻoge owuwe ihe ubi cherry. Dị ka ezigbo nwatakịrị nwoke, a chọpụtara m na ogo nsonye m bụ ịnata bọkeetị ma tegoro elu osisi ịhọta cherries.

Owuwe ihe ubi cherries gbanwere nke ukwuu mgbe nna ukwu m zụtara igwe akpọrọ cherry shaker. Igwe nke a na-ejide ukwu osisi ahụ ma kwagharịa ya, nke mere cherry niile adapụ site nʻosisi niime ụgbụ nke eji achịkọta cherrry niile. Amatara m na mgbe igwe nkwagharị ahụ ga-amalite ịkwagharị osisi ahụ, ihe gaara eru cherry niile dapụtara ihe nʻerughị tịkọm abụọ. Amatakwara m na ọ dịghị ihe o mere ọ bụrụ na akwara ya ruo tịkọm 10 ma ọ bụ uju nkeji, ụfọdụ cherry agaghị ada. Ha bụ nʻezie akwaa akwụrụ.

Ịkwapụta cherry site nʻosisi kwere omume niihi na nchụpụta nke ethylene. Homonụ nke a na-eme oyi akwa nke mkpụrụ ndụ dị nʻetiti ogwe osisi cherry na osisi ịda mba. Ya mere, ogwe osisi nke cherry chara acha na-adapụ ọsọ ọsọ site nʻosisi niihi njikọ ahụ dara mba.

Niime akwụkwọ nsọ, anyị na-amụta na stem nke Jesse bụ ihe atụ maka Mezaya, Jizọs Kraịst, onye eburu amụma ga-abịa site na agbụrụ nke Jesse, nna Eze Devid. Dị nnọọ ka ethylene sị eme njikọ ogwe osisi cherry chara acha adaa mba, enweghị nrube isi, obi abụọ niile, na ụjọ nwere ike mee njikọ anyị na stem nke Jesse, ma ọ bụ Jizọs Kraịst daa mba, na-ekwe ka akwagharịa anyị nʻụzọ dị mfe ma kewapụ anyị site na Ya. Dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi anyị nwere ike ịbụ, anyị ahaghị ichekwa onwe anyị megide ịda mba nke njikọ anyị na Jizọs Kraịst.

Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, ọbụna ndị kwesịrị ntụkwasị obi ka adọrọ aka na ntị: “Mana mmadụ nwere ike ịda site nʻokwukwe ma pụọ site na Chineke dị ndụ.” Onyenwe anyị garaniihu, “Ee, … ma ọbụna ka ndị a sachaworo nụrụ kwa.” Izere ịda ada, Onyenwe anyị nyere ndụmọdụ, “Ya mere kwe ka nzukọ nsọ nụrụ ma kpee ekpere mgbe niile, ka ha ghara ịdaba n’ime ọnwụnwa.”

Mmadụ nwere ike hata ọnọdụ nke ịbụ onye a na-akwagharị mgbe niile nihe akwụkwọ nsọ kọwara dị ka ịchazu maka mbibi ya na nsonazụ ndị na-abịa maka ihe omume niile. Nkebiokwu ahụ ka enwekwara ike iji nʻụzọ sara mbara iji gosipụta ọnọdụ nke ire ure, nrụrụ aka, ma ọ bụ ọdịda nke na-eme ihe adanyere ntụbọ ma ọ bụ mbibi.

Gịnị ka ịcha acha nke a na-egosipụta? Ọ pụtara na anyị nwere ike ruo ebe anyị agaghị enwe ike ịgbanwe? Mba, E chere m Ọ pụtara na anyị nwere ike ruo ebe anyị agaghị enwe ike ịgbanwe? Ọgwụ nke ịchazu maka mbibi bụ ime ihe ndịa nke ga-agba njikọ anyị na Jizọs Kraịst ume. Dị ka ekwuru, nchegharị duru Ịnọs ruo nʻogo nke okwukwe akwaa akwụrụ E nwere ike dị niime nchegharị—nke oge niile, nke ngwa ngwa na nke nchegharị ugboro ugboro. Dị ka Onyeisi Russell M. Nelson kuziiri anyị, “Enweghi ihe na-akarị ntọghapụ mmadụ, na-akarị enye mmadụ ugwu, ma ọ bụ siri ike nye ọganiihu nke mmadụ karịa ka nchegharị nke ana elekwasị anya ụbọchị niile na-adịgide adị.”

Na mgbakwunye nye ikwusa nchegharị, onye amụma Jekọb kuziri na ịmara aka Chineke niime ndụ anyị, na-achọ ma na-anata mkpughe, na-ege ntị nye Chineke mgbe Ọ na-ekwu okwu ihe niile na-enyere anyị aka ghara ịkwagharị. Jekọb kuzikwara, “Ya mere, anyị na-achọgharị ndị amụma, ma anyị nwere ọtụtụ mkpughe na mmụọ nke ibu amụma; ma inwe akaebe ndị a niile anyị na-enwete olileanya, ma okwukwe anyị na-abụrụ akwaa akwụrụ.” Ige ntị nye na ime ihe nʻokwu niile na ọkpụkpọ oku niile nke ndị amụma na ndịozi nwere ike jiri olileanya, obisike, na mgbam ume juputa anyị, na-akpata okwukwe anyị ịghọ akwaa akwụrụ.

Amụtawo m na ọchịchọ ịdị nʻudo nye Chineke ahaghị ka ọchịchọ nke nchegharị soro ya. Ichegharị na inwe nhụmiihe ngọzi niile nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na-eduba ruo okwukwe akwaa akwụrụ. Okwukwe akwaa akwụrụ na-eduba ruo ọchịchọ ị na-adịkarị nʻudo anyị na Chineke. Nke a bụ usoro gbara okirikiri, ma ọ bụ nke na-atụgharị.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ana m akpọku unu ịdị nʻudo unu na Chineke site nʻAja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Ana m agba ama na ime na idebe ọgbụgba ndụ na-eme njikọ anyị ruo Onye Nzọpụta siri ike, site otu a zere ịchapụ maka mbibi. Ana ma agba ama na ịdị nʻudo nke a ruo Chineke, site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, na-eduba nʻokwukwe akwaa akwụrụ.

Ama m na Nna nke Eluigwe hụrụ mụ na gị naanya, ma O zitere Ọkpara Ọ Hụrụ naanya, Jizọs Kraịst, ịbụ Onye Nzọpụta, na nnukwu Onye Ndozigharị. Ana m agba ama nke Jizọs Kraịst ma na-eme otu a n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.