Na-agba Ibe Unu Ume
Naanị Onyenwe anyị maara nʻuju mbelata niile na ikike nke onwe, ma niihi nke ahụ, Ọ bụ naanị onye tozuru nʻuju ikpe arụmọrụ anyị ikpe.
Na nso nso a agụrụ m maka otu nhụmiihe nke metụtara m nke ukwuu. O mere na USA Masters Track and Field National Championship—ịsọmpi maka ndị agadị.
Otu niime ndị sonyere na ihe omume mita 1,500 bụ Orville Rogers gbara afọ 100. Odee dere:
“Mgbe agbara egbe mmalite, ndị ọsọ gbapụrụ, ebe Orville nọ nʻikpeazụ, ebe ọ nọrọ naanị ya nọ nʻọsọ ahụ niile, jiri nwayọọ na-arịta. Mgbe onye ikpeazụ nʻakụkụ Orville gbachara, Orville ka nwere lap abụọ na ọkara ịgba. Ihe ruru ndị nlereanya 3,000 nọdụrụ ala ekwughị okwu na-ekiri ka ọ na-eji nwayọọ nwayọọ na-aga gburugburu track ahụ—naanị ya kpamkpam, emeghị mkpọtụ, na erughị ala.
“[Mana] mgbe ọ malitere ịgba lap nke ikpeazụ, igwe ndị ahụ guzoro nʻụkwụ ha, na-agba ya ume ma na-akụrụ ya aka. Mgbe o ruru ahịrị ebe ngwụcha ọsọ, igwe ndị ahụ nọ na-ebigbọ ebigbọ. Jiri mgbam ume ahụ nke puku kwuru puku ndị nlereanya, Orville kpọkuru ike ikpeazụ ya. Igwe ndị ahụ ji obi ụtọ vọlie dị ka ọ gbafere ahịrị ịgbacha ọsọ ma ndị asọmpi ya makuru ya. Orville nʻobi umeala na nʻobi ekele feere igwe ndị ahụ aka ma soro ndị enyi ọhụrụ ya pụọ nʻahịrị ọsọ ahụ.”
Nke a bụ ọsọ asọmpi nke ise nke Orville, ma na mmemme nke ọbụla, ọ gbawo kwa onye ikpeazụ. Ụfọdụ nwere ike ọ dịwo ha ikpe Orville ikpe, na-eche na o kwesịghị nnọọ ịsọmpi nʻafọ ya—na o soghị na ndị ịgba ọsọ niihi na o mere ka mmemme ya too oke ogologo nye onye ọbụla ọzọ.
Mana ọbụnadị na ọ na-agbakarị onye ikpeazụ, Orville ritere rekọọdụ ụwa ise ụbọchị ahụ. Ọ dịghị onye na-ele ka ọ na-agba ọsọ nke gaara ekwe na nke ahụ kwere omume, mana bụghị ma ndị nlereanya ma ọ bụ ndị asọmpi ibe ya bụụrụ ndị ikpe. Orville emebighị iwu ọbụla, ma ndị isi ọrụ ewedaghị ụkpụrụ nke ọbụla. Ha gbara otu ụdị ọsọ ahụ ma mejuputa otu ụdị ihe ndị achọrọ dị ka ndị asọmpi ndị ọzọ. Mana ogo ya nke ịra ahụ—nʻọnọdụ nke a afọ ole ọ gbara na ike anụ ahụ ya belatara—ka eji mejuputa itinye ya na otu ndị gbara afọ 100 gbakwunyere. Ma niime otu ahụ, o ritere rekọọdụ ụwa ise.
Dị nnọọ ka o were Orville nnukwu ume ịzọnye ụkwụ na ahịrị ọsọ ahụ oge ọbụla, ọ nakwa ewe ụfọdụ umunne anyị ndị nwanyị na ụmụnne anyị ndị nwoke nnukwu ume ịzọnye ụkwụ nʻụzọ nke ụbọchị ọbụla, mara na enwere ike ikpe ha ikpe nʻụzọ nʻezighị ezi ọbụna na-agbanyeghị ha na-eme ebe ike ha ruru megide ọgbaghara ndị na-akụda mmụọ iji soro Onye Nzọpụta ma sọpụrụ ọgbụgba ndụ ha na Ya.
Na-agbanyeghị ebe anyị bi niime ụwa, na-agbanyeghị afọ ole anyị gbara, ọ bụ isi ihe mmadụ na-achọ ka anyị niile inwete uche nke nsonye, inwe mmetụta na-achọrọ anyị ma anyị dị mkpa ma na ndụ anyị nwere ebumnuuche na mpụtara, na-agbanyeghị ọnọdụ anyị niile na mmachi niile.
Na ahịrị ọsọ nke ikpeazụ, igwe ndị ahụ gbara Orville ume nke ukwuu, na-enye ya ume iji na-aganiihu. O nweghị ihe o mere na ọ gbachara ikpeazụ. Maka ndị nlereanya na igwe ndị ahụ, nke a bụ maka ihe karịrị ịsọmpi. Nʻụzọ dị ọtụtụ, nke a bụ ọmarịcha ọmụmaatụ nke ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta nʻomume. Mgbe Orville gbachara, ha niile n̄ụrịkọtara ọn̄ụ onụ.
Dị nnọọ ka Masters Championship, ọgbakọ anyị niile na ezi na ụlọ anyị nwere ike bụrụ ebe mgbakọta ebe anyị na-agba ibe anyị ume—ogbe niile nke ọgbụgba ndụ nke ịhụnaanya nke Kraịst make onye nʻibe ya na-enye ike—na-enyere ibe anyị aka merie ihe aka mgba ọbụla anyị na-ezute, na-enye ibe anyị ume na mgbam ume na-ekpeghị onye n’ibe ya ikpe. Anyị chọrọ onye nʻibe anyị. Ume si na chi na-abịa site nʻịdị notu, ma nke ahụ mere Setan ji buru nʻobi ikewa anyị.
Dị mwute ikwu, maka ụfọdụ niime anyị, ịga nzukọ nsọ nwere ike bụrụ ihe siri ike mgbe ụfọdụ maka ọtụtụ ebumnuuche dị iche iche. O nwere ike bụrụ onye na-agba lịka lịka jiri ajụjụ niile nke okwukwe ma ọ bụ onye nwere obinkonelu ihu ọha ma ọ bụ nkụnwụ. O nwere ike bụrụ onye sitere na obodo dị iche ma ọ bụ agbụrụ ma ọ bụ ọnọdụ ọzụzụ ma ọ bụ onye nwere nhụmiihe ndụ ndị dị iche ma ọ bụ ụzọ niile eji ahụ ụmụ ihe ndị o nwere ike ịdị ka ha adabaghị nʻọkpụrụkpụ ahụ. O nwekwara ike bụrụ ndị nne na nna ụmụaka na obere ụmụntakịrị ụra churu na ndị mmetụta uche ha dọtịrị ma ọ bụ onye ọgbakọ na-alụbeghị ọlụlụ ebe di na nwunye na ezi na ụlọ juputara. O nwekwara ike bụrụ onye na-achịkọta ume iji laghachi mgbe ọtụtụ afọ nke anọghị nso gasịrị ma ọ bụ onye na-enwe mmetụta ịn̄àisi na enweghị mgbe ha tozuru ma ha enweghị ike isonye.
Onyeisi Russell M. Nelson kwuru: “Ọ bụrụ na otu nwoke na otu nwanyị mere ọlụlụ nọ na ngalaba ukwu gị gbara alụkwaghịm, ma ọ bụ onye mgbasa ozi ọma nta alọta nʻebe obibi tupu ozuzu oge, ha achọghị ikpe ikpe gị. Ha kwesịrị inweta nhụmiihe ịhụnaanya nke Jizọs Kraịst na-enweghị ntụpọ egosipụtara n’okwu na omume gị niile.”
Nhụmiihe anyị na nzukọ nsọ bụ nke kwesịrị iwete njikọ niile dị mkpa anyị na Onyenwe anyị na anyị nʻibe anyị nke anyị na-achọkarị maka ahụike ime mmụọ na nke mmetụta uche anyị. Ebumpụta ụwa nke ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke na-eme, jiri baptizim bido, bụ oke na ọrụ anyị inwe ịhụnaanya na nlekọta maka ibe anyị dị ka ndị otu ezi na ụlọ nke Chineke, ndị otu otu nke Kraịst, ma ọ bụghị nnọọ ịkanye ihe nʻakụku ihe ndị edepụtara atụrụ anya na anyị ga-eme.
Ịhụnaanya na nlekọta yiri Kraịst dị elu karịa ma dị nsọ karịa. Ịhụnaanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ bụ afọ ọma. Dị ka Onyeisi Nelson kuziri, “Afọ ọma na-akwalite anyị ịganiihu ʻibukọrịta ibu nke onye na ibe yaʻ [Mozaya 18:8] karịa ibukwasị ibu arọ niile nʻisi ibe anyị.”
Onye Nzọpụta kwuru, “Site otu a ka ụmụ mmadụ niile si amata na unu bụ ndi na-eso ụzọ m, ọbụrụ na unu nwee ịhụnaanya onye ọbụla na ibe ya.” Ma Onyeisi Nelson gbakwunyere: “Afọ ọma bụ isi njirimara nke ezi onye na-eso Jizọs Kraịst.” “Ozi nke Onye Nzọpụta doro anya: Ezi ndị na-eso ụzọ Ya na-ewu, na-ebuli elu, na-agba ume, na-akwagide, ma na-akpakemmụọ. … Otu anyị si ekwu okwu nye na ihe anyị na-ekwu banyere ndị ọzọ … nʻezie nwere ihe o mere.”
Nkuzi nke Onye Nzọpụta maka nke a dị ezigbo mfe. Agụkọtara ya ọnụ na Iwu Mee m ka Imere ibe m: Mesoo ndị ọzọ dị ka ị ga-esi achọ ka ha mesoo gị. Tinye onwe gị nʻọnọdụ nke onye ahụ ma mesoo ha otu ị ga-esi achọ ka e mesoo gị ọ bụrụ na ị nọ nʻọnọdụ ha nwa.
Ịmeso agwa yiri Kraịst nye ndi ọzọ gafere oke karịa ndị ezi na ụlọ anyị na ndị ọgbakọ. Ọ gụnyere ụmụnne anyị ndị nwanyị na ndị nwoke nke okpukperechi ndị ọzọ ma ọ bụ ndị na-adịghị efe chi ọbụla. Ọ gụnyere ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwanyị sitere na mba ndị ọzọ na omenaala ndị ọzọ, dị kwa ka ndị ahụ nke ọchịchọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ. Anyị niile bụ akụkụ nke ezi na ụlọ nke Chineke, ma Ọ hụrụ ụmụ Ya niile naanya. Ọ na-achọ ka ụmụ Ya hụ Ya naanya na kwa onye nʻibe ya.
Ndụ nke Onye Nzọpụta bụ otu ọmụmaatụ nke inwe ịhụnaanya, ikpokọta, na ibuli elu ọbụna ndị ahụ ndị ọha mmadụ kpeworo ikpe dị ka ndị achụpụrụ achụpụ na ndị adịghị ọcha. Ọ bụ ọmụmaatụ enyere anyị iwu isoro. Anyị nọ ebe a ihiwe njirimara yiri Kraịst ma nʻikpeazụ dịrịzie dị ka Onye Nzọpụta anyị. Ọ bụghị ozi ọma nke ihe ndepụta niile; ọ bụ ozi ọma nke ịdịrịzi—ịdịrịzi dị ka Ọ dị ma nwee ịhụnaanya dị ka Ọ na-eme. Ọ na-achọ anyị ịghọ ndị Zayọn.
Mgbe m nọ na ngwụcha afọ 20 m, agabigara m oge oke nkụnwụ dị omimi, ma nʻoge ahụ, ọ dịịrị dị ka nsiridị ahụ na Chineke dị pụrụ nʻotu ntabi anya. E nweghị m ike ịkọwa mmetụta ahụ nuju ma ọ bụghị karịa ikwu na ọ dịịrị m ka m furu efu kpamkpam. Site mgbe m bụ nwata nta, a marawo m nke ahụ kemgbe na Nna m nke Eluigwe nọ ebe ahụ ma na m nwere ike ịgwa Ya okwu. Mana nʻoge ahụ, amaghịzi m ma e nwere Chineke. Ahụtụbeghị m ihe ọbụla dị otu ahụ niime ndụ m, ma ọ dịrị ka ntọala m niile na-ada nʻala.
Niihi nke ahụ, ọ rara m ahụ ịga nzukọ nsọ. A gara m, mana ọ bụ notu aka niihi na egwu tụrụ m maka ịkpọ m aha “onye esighị ike nʻokwukwe” ma ọ bụ “ekwesịghị ntụkwasị obi,” ma egwu tụrụ m nke ịghọ ọrụ enyere onye ọzọ. Ihe m na-achọ nʻezie nʻoge ahụ bụ inwe mmetụta ezi ịhụnaanya, nghọta, na nkwado site nʻaka ndị ahụ gbara m gburugburu, na-abụghị ikpe ikpe.
Ụfọdụ echiche ndị na-atụ m egwu na ndị mmadụ ga-eche gbasara m, mụ onwe m echewo gbasara ndị ọzọ mgbe ha abịaghị nzukọ nsọ mgbe niile. Nhụmiihe nke onwe ahụ na-afụ ụfụ kuziiri m ụfọdụ nkuzi bara uru banyere ihe mere esi wee nye anyị iwu ịhara ikpe onye nʻibe ya ikpe nʻụzọ ajọọ omume.
E nwere ndị ahụ nọ nʻetiti anyị na-ata ahụhụ na-ekwughị okwu, na-atụ egwu maka ndị ọzọ ịmara aka mgba ha ndị zoro ezo niihi na ha amaghị ihe mmeghachi omume ahụ ga-abụ?
Naanị Onyenwe anyị maara nʻuju ezi ogo nke ihe isi ike nke onye ọbụla niime anyị si na-agba ọsọ ndụ anyị—ibu arụ niile, aka mgba niile, na ihe mgbochi niile anyị na-ezute nke ndị ọzọ enweghị ike ịhụ ọtụtụ mgbe. Naanị Ya na-aghọta nʻuju ntipịa niile na-agbanwe ndụ ya na trọma ụfọdụ niime anyị nwere ike gabigawo mgbe gara aga nke ka nọ na-emetụta anyị oge ugbu a.
Mgbe ụfọdụ, anyị na-ekpe onwe anyị ikpe ike, na-eche na anyị kwesịrị ịnọ ebe dị anya nʻụzọ ahụ. Naanị Onyenwe anyị maara nʻuju mbelata niile na ikike nke onwe, ma niihi nke ahụ, Ọ bụ naanị onye tozuru nʻuju ikpe arụmọrụ anyị ikpe.
Ụmụnne nwanyị na ụmụnne nwoke, ka anyị dịrị ka ndị nlereanya ahụ dị niime akụkọ ahụ ma gbaa ibe anyị ume na njem anyị nke iso ụzọ na-agbanyeghị ọnọdụ anyị niile! Nke ahụ anaghị achọ ka anyị mebie iwu niile ma ọ bụ belata ụkpụrụ niile. Ọ bụ nʻeziokwu iwu nsọ nke abụọ kachasị ukwuu—ịhụ onye agbata obi anyi naanya dị ka onwe anyị. Dị ka Onye Nzọpụta anyị kwuworo, “Ọbụrụraa na unu meworo ya nye ọbụladị otu niime ndị a … , unu e mewo ya nye m,” maka ịdị mma ma ọ bụ nke na-adịghị mma. Ọ gwawokwa anyị, “Ọ bụrụ na unu adịghị nʻotu unu abụghị nke m.”
Aga enwe oge niime ndụ onye ọbụla niime anyị mgbe anyị ga-abụ ndị ga-achọ enyemaka na mgbam ume. Ka anyị kpebie ugbu a ịna eme nke ahụ mgbe niile nye onwe anyị. Dị ka anyị na-eme, anyị ga-azụlite ịdị nʻotu dị ukwuu karịa ma kwadoo oghere maka Onye Nzọpụta ịrụ ọrụ Ya dị nsọ nke ọgwụgwọ na ịgbanwe onye ọbụla niime anyị.
Nye onye nke ọbụla niime unu ndị nwere ike iche na unu alawo azụ nke ukwuu nʻọsọ nke ndụ, njem a nke ndụ anụ ahụ, biko na-aganiihu. Naanị Onye Nzọpụta nwere ike ikpe ikpe nʻuju ebe i kwesịrị ịnọ nʻoge ugbu a, ma Ọ dị ọmịiko ma zie ezie. Ọ bụ Nnukwu Ọka ikpe nke ọsọ ndụ ma naanị Ya na-aghọta nʻuju ogo nke ịra ahụ nke iji na-agba ọsọ ma ọ bụ na-eje ije ma ọ bụ na-apụgharị ụkwụ nʻala. Ọ ga-amata adịghị ike gị, ike gị, nhụmiihe nke ndụ gị niile, na ibu arọ gị niile zoro ezo i bu, ya na ọchịchọ niile nke obi gị. I nwere ike nʻezie na-erite rekọọdụ keọdịmara ụwa niile kwa. Biko ahapụkwala inwe olileanya. Biko, na-aganụ niihu! Biko nọrọ! I sonye kwara! Onyenwe anyị chọrọ gị, ma anyị chọkwara gị!
Ebe ọbụla i bi niime ụwa, na-agbanyeghị otu o si dịpụ adịpụ, biko na-echeta mgbe niile na Nna gị Bi Nʻeluigwe na Onye Nzọpụta gị maara gị kpamkpam ma hụrụ gị naanya nʻụzọ zuru oke. Ị bụghị onye echefuru echefu nye Ha. Ha na-achọ ịkpọlata gị ụlọ.
Debe anya gị na Onye Nzọpụta. Ọ bụ okporo igwe gị. Ahapụkwala Ya aka. Ana m agba ama na Ọ dị ndụ ma na i nwere ike tụkwasị obi na Ya. Ana kwa m agba ama na Ọ na-agba anyị ume.
Ka anyị niile soro ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta ma mee ibe anyị obi an̄ụrị bụ ekpere m nʻaha Jizọs Kraịst, amen.