Aha Ahụ Nke Esi Na Ya Kpọọ Unu
Gịnị ka ọ pụtara ịbụ onye a kpọrọ site nʻaha nke Kraịst?
Onyeisi Russell M. Nelson kuziri na ọ bụrụ na Onyenwe anyị nọọrọ na-agwa anyị okwu ihu na ihu, ihe mbụ Ọ ga-achọrịrị ka anyị ghọta bụ ezi njirimara anyị: anyị bụ ụmụ Chineke, ụmụ ọgbụgba ndụ, na ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst. Inye aha ọzọ ga-ebuda anyị ala nʻikpeazụ..
A mụtara m nke a nʻonwe m mgbe nwa m nwoke kacha okenye natara ekwe ntị ya nke mbụ. Na nnukwu obi ụtọ, ọ malitere itinye aha ndị ezi na ụlọ ya na ndị enyi ya niime ndị kọntat ya. Otu ụbọchị, a hụtara m na mama ya na-akpọ. Ihe pụtara na skirin ya bụ “Nne.” Nke ahụ bụurụ nhọrọ dị mma ma nwee ugwu—ma, aga m ekweta, akara nke nsọpụrụ maka onye nne/nna dị mma karịa nʻebe obibi anyị. Otu o kwesịrị, ọ tụrụ m uche. Olee aha nke o nyeworo m?
E skorulu m kọntat ya, nọrọ na-eche na ọ bụrụ na Wendi bụụrụ “Nne,” aga m abụrịrị “Nna.” A nọghị m ebe ahụ. Enyochara m maka “Papa.” Ọ nọghịkwa ya. Ịnụọkụobi m ghọrọ obere nchekasị. “Ọ na-akpọ m ʻCoreyʻ?” Mba. Na mbọ nke ikpeazụ, e chere m, “Anyị bụ ndị na-akụ bọọlụ—ikekwe ọ na-akpọ m ʻPelé.ʻ” Iche echiche ọma. Nʻikpeazụ, a kpọrọ m nọmba ya nʻonwe m, mkpụrụokwu abụọ nuputara na skirin ya: “Ọbụghị Nne”!
Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, kedụ aha nke ana akpọ unu?
Jizọs kpọrọ ndị na-eso Ya site nʻọtụtụ aha: Ndị na-eso ụzọ. Ụmụ Ndị Nwoke na Ndị Nwanyị. Ụmụ nke ndị amụma. Ụmụ atụrụ. Ndị enyi. Ìhè nke ụwa. Ndị nsọ. Nke ọbụla bu uru dị ebighị ebi ma na-ebulite mmekọrịta onwe onye ya na Onye Nzọpụta.
Mana nʻetiti aha ndị a, otu na-akarịsị ndị ọzọ—aha nke Kraịst. Niime Akwụkwọ nke Mọmọn, Eze Benjamin kuziri nʻụzọ dị ike:
“Ọ dịghị aha ọzọ e nyere ebe nzọpụta ga-esi abịa; ya mere, aga m achọ na unu ga-ewekwasị onwe unu aha nke Kraịst. …
“Ma ọ ga-erukwa na onye ọbụla na-eme nke a ka a ga-ahụ n’aka nri nke Chineke, niihi na ọ ga-amata aha ahụ nke esi na ya akpọ ya; niihi na a ga-akpọ ya site n’aha nke Kraịst.”
Ndị ahụ na-ewekwasị onwe ha aha nke Kraịst na-aghọ ndị na-eso ụzọ Ya na ndị aka ebe Ya. Nʻakwụkwọ nke Ọrụ, anyị na-agụta na mgbe Mbilite nʻọnwụ nke Jizọs Kraịst gasịrị, ndị aka ebe a họọrọ ka enyere iwu ịgba ama na onye ọbụla ọ bụ kwere na Jizọs, mee baptizim, ma nata Mmụọ Nsọ ga-anata mgbaghara nke mmehie niile. Ndị ahụ natara emume nsọ ndị a dị nsọ gbakọtara ọnụ ha na ndị Nzukọ nsọ, ghọọ ndị na-eso ụzọ, ma a kpọrọ ha Ndị kwere na Kraist. Akwụkwọ nke Mọmọn kọwakwara ndị kwere na Kraịst dị ka Ndị kwere na Kraịst na ndị ahụ mere ọgbụgba ndụ dị ka “ụmụ nke Kraịst, ụmụ ya ndị nwoke, na ụmụ ya ndị nwanyị.”
Gịnị ka ọ pụtara ịbụ onye a kpọrọ site nʻaha nke Kraịst? Ọ pụtara ime na idobe ọgbụgba ndụ niile, na-echeta Ya mgbe niile, na-edobe iwu nsọ Ya niile, na ị na-adị “njikere … iguzo dị ka ndị aka ebe nke Chineke nʻoge niile na niime ihe niile.” Ọ pụtara iguzoro gị na ndị amụma na ndịozi dị ka ha na-eburu ozi nke Kraịst—ya na ozizi ya, ọgbụgba ndụ niile, na emume nsọ niile—akụfe ofe ụwa dum. Ọ pụtakwara ijere ndị ọzọ ozi inye aka belata ntaramahụhụ, ị bụ ihè, na iweta olileanya na Kraịst nye ụmụ mmadụ niile. Eziokwu, nke a bụ nchụso ogologo ndụ mmadụ. Onye amụma Josef Smith kuziri na “nke a bụ otu ebe nke na-enwetụghị onye na-erute ya nʻotu mgbe.”
Niihi na njem nke ịbụ onye na-eso ụzọ na-ewe oge na mbọ ewuru “ahịrị nʻelu ahịrị, usoro nʻelu usoro,” ọ dị mfe ịdaba na aha niile ụwa na-enye anyị. Ndị a na-eweta naanị uru nke anụ ahụ ma nweghị ike izu ezu nʻonwe ha. Mgbapụta na ihe ndị nke ebighị ebi naanị “na-abata ma site na Mezaya Dị nsọ.” Ya mere, isoro ndụmọdụ nke onye amụma ime ịbụ onye na-eso ụzọ ihe kachasị mkpa bụ ihe dị ma nʻoge kwesịrị ekwesị ma nwee akọnuuche, kachasị nʻogo afọ nke e nwere ọtụtụ olu na mmetụta ndị na-arị ibe ha elu. Nke a bụ isi ndụmọdụ nke Eze Benjamin mgbe ọ sịrị, “Aga m achọ ka i cheta ijigide niime gị aha [nke Kraịst] e deworo mgbe niile niime obi unu, … ka unu nụrụ ma mata olu ahụ nke esi na ya kpọọ unu, na kwa, aha ahụ nke ọ ga-esi na ya kpọọ unu.”
Ahụwo m nke a niime ezi na ụlọ nke mụ onwe m. Nna nnanna m ukwu Martin Gassner bụ onye agbanwere ruo ebighị ebi niihi onyeisi ngalaba nta dị umeala zara oku nke Onye Nzọpụta. Na Germany na 1909, ihe siiri ike ma ego kọrọ ụkọ. Martin rụrụ ọrụ dị ka onye na-agba ihe ọkụ nʻụlọ ọrụ ana arụpụta paịpụ. Site nʻọrụ o nwetere, ọtụtụ ndị a na-akwụ ụgwọ nʻụbọchị na-ala nʻịn̄ụ mmanya, ise anwụrụ, na ịzụ mmanya maka ndị enyi ya site nʻebe ana ere mmanya. Nwunye ya nʻikpeazụ dọrọ ya aka na ntị na ọ bụrụ na ọ gbanweghị, ya ga-apụ.
Otu ụbọchị, Martin na onye ọrụ ibe ya zutere ya nʻụzọ ịgawa ebe ana ere mmanya jiri akwụkwọ okpukperechi nta a rọkọtara nʻaka ya. Ọ hụtara ya nʻokporo ụzọ ma gwa Martin na ihe dị iche metụrụ ya nʻahụ mgbe ọ gụchara obere akwụkwọ ahụ enyere isiokwu Was wissen Sie von den Mormonen?, ma ọ bụ Gịnị ka ịma gbasara ndị Mọmọn? A maara m na aha ahụ agbanwewo.
E nwere adịreesị a kụpawara nʻazụ ya ana ahụ anya iji chọpụta ebe nzukọ nsọ ahụ nọ. Nzukọ nsọ ahụ nọkwa ebe dị anya, mana o metụrụ ha na-ahụ site niihe ha gụrụ ma kpebie ịgba ụgbọ onyoko na Sọnde ahụ ịga nyochaa. Mgbe ha bịaruru, ha hụrụ na adịreesị ahụ abụghị nzukọ nsọ ha tụrụ anya mana ebe ụlọ ozu. Martin gbuturu oge—niihi, nʻezie, nzukọ nsọ nʻebe ụlọ ozu dachara nnọọ ka ngwugwu a fụchiri afụchi.
Mana nʻụlọ elu, nʻebe obosara ụlọ ọgbakọ a kwụrụ ụgwọ maka ya, ha hụrụ otú obere otù Ndị nsọ. Otu nwoke kpọkuru ha ịbịa nzukọ ọgbụgba ama. Mmụọ ahụ metụrụ Martin ma o nwere mmasị site nʻịdị mfe, ama ndị kpụ ọkụ nʻọnụ mere nke mere o jiri gbaa ama nke ya. Ma ọ bụ ebe ahụ, nʻebe ahụ a na-atụchaghị anya ya, ka ọ sịrị na ọ mataworịị na ọ ga-abụrịrị eziokwu.
Ka emesịrị, nwoke ahụ dubatara onwe ya dị ka onyeisi ngalaba nta ma jụọ ma ha ga-abịaghachi. Martin kọwara na o bi ebe tere oke anya ma nweghị ike akwụli ụgwọ ụgbọala ịbịa izu ụka niile. Onyeisi ngalaba nta ahụ naanị sịrị, “Soro m.”
Ha gafere ụlọ ole ma ole ruo ụlọ mmepụta ihe dị nso ebe enyi onyeisi ngalaba nta ahụ na-arụ ọrụ. Ka akpachara obere nkata, Martin na enyi ya ka enyere ọrụ. Emesịa onyeisi ngalaba nta ahụ duuru ha gaa ebe ụlọ obibi ma nwetara ha na ndị ezi na ụlọ ha ụlọ.
Ihe nke a niile mere nʻetiti awa abụọ. Martin na ezi na ụlọ ya kwabatara nʻizu ụka na-esote. Ka ọnwa isii gasịrị e mere ha baptizim. Nwoke ahụ a maara otu oge dị ka onye an̄ụrụma na-abaghị uru bịara bụrụzie onye dị oke nkọ nʻokwukwe ọhụrụ ya nke mere na ndị nọ nʻobodo mepere emepe malitere ịkpọ ya, ikekwe ọ bụghị nʻoke ịhụnaanya, “onye nchụaja.”
Ọ bụrụ maka onyeisi ngalaba nta ahụ, apụghị m ịgwa unu aha ya—njirimara ya efuworị ọtụtụ oge. Mana ana m akpọ ya onye na-eso ụzọ, onye nnochite anya obodo, Onye otu Kraịst, ezigbo onye Samerịa, na enyi. Mmetụta ya ka dịkwa ire ka afọ 116 gasịrị, ma eguzo m nʻubu nke ya ị bụ onye na-eso ụzọ.
“E nwere okwu a na-ekwu na i nwere ike ịgụ mkpụrụ ndị dị niime otu apụl, mana inweghị ike ịgụta apụl ole na-esi nʻotu mkpụrụ apụta.” Mkpụrụ a kụrụ site nʻaka onyeisi ngalaba nta amịtawo mkpụrụ ana apụghị ịgụ ọnụ. Ọ dịghịrịị otu o nwere ike i si ama na ka afọ 48 gasịrị, ọtụtụ ndudugandu nke ezi na ụlọ Martin nʻakụkụ abụọ nke akwa mgbochi ka aga arachi na Bern Switzerland Temple.
Ikekwe okwu Chukwu kachasị ukwuu bụ ndị ahụ anyị na-anụtụghị mana ndị ahụ anyị na-ahụ nʻihe omume ndị dị jụụ, na-apụtaghị ihe na omume ndị ahụtara niime ndụ nke ndị mmadụ nkịtị, ndị, na-agbalị ịdị ka Jizọs, na-agagharị eme ihe dị mma. Ihe onyeisi ngalaba nta nke a nwere amara mere abụghị akụkụ ihe ndị nke edepụtara edepụta. Ọ nọọrọ nnọọ na-ebi ndụ ozi ọma dị ka akọwara niime akwụkwọ nke Alma: “Ha achụpụghị onye ọbụla … nke agụrụ na-agụ, ma ọ bụ ndị akpịrị na-akpọ nkụ, ma ọ bụ ndị na-arịa ọrịa, … ha na-emenyere mmadụ niile, ma ndị okenye ma ndị nta, … ma ndị nwoke ma ndị nwanyị.” Ma, ihe anyị na-enweghị ike eleghara anya, ha achụpụghị onye ọbụla “ma ọ bụ pụọ na nzukọ nsọ ma ọ bụ niime nzukọ nsọ.”
Ndị ahụ wekwasịrị onwe ha aha nke Kraịst na-amata, dị ka Josef Smith kwuru, “Nwoke juputara nʻịhụnaanya nke Chineke, anaghị enwe afọ ojuju na ngọzị nke ezi na ụlọ ya naanị, mana na-agazu gburugburu ụwa dum, na-achọsi ike ị gọzi ndị dum bi nʻụwa.”
Nke a bụ otu Jizọs si bie ndụ. Eziokwu, O mere nnukwu ihe nke mere na ndị na-eso ụzọ Ya enweghị ike dedata ihe niile. Jọn Onyeozi dedatara, “E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ nke Jizọs mere, bụ nke, ọ bụrụ na aga ede ha niile, e chere m na ọbụna ụwa nʻonwe ya agaghị abacha akwụkwọ niile a ga-ede.”
Ka anyị gbasie mbọ ike isoro ọmụmaatụ nke Kraịst, na-eme ihe ọma ma na-eme ịbụ onye na-eso ụzọ ihe kacha dị mkpa oge ndụ niile nke ọ ga-abụ oge ọbụla anyị na ndị ọzọ kparịtara nkata, ha ga-enwe ike enwe mmetụta ịhụnaanya nke Chineke na ike nke Mmụọ Nsọ na-eme ka amata ihe bụ eziokwu. Emesịa anyị nwere ike sonye nna nnanna m ochie na nde kwuru nde ndị ọzọ ndị na-amawo ọkwa, dị ka Andrew onye na-eso ụzọ, “Anyị ahụwo Mezaya ahụ.”
Nʻikpeazụ, njirimara anyị abụghị ihe ụwa na-akọwa. Mana ịbụ onye na-eso ụzọ anyị bụ ihe ana akọwa site na emume nsọ niile anyị natara, ọgbụgba ndụ niile anyị na-edobe, na ịhụnaanya anyị na-egosi Chineke na onye agbata obi naanị site na-ime ihe ọma. Dị ka Onyeisi Nelson kuziri, anyị bụ ụmụ Chineke nʻezie, ụmụ ọgbụgba ndụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.
Ana m agba akaebe na Jizọs Kraịst dị ndụ ma ọ gbapụtawo anyị. Ọ bụ Ya bụ Onye ahụ nke kwuru, “A kpọwo m unu site na … aha; unu bụ nkem.” Site nʻaha Jizọs Kraịst, amen.