Ọgbakọ Zuru ọha
Nkwado nke Ndị Ji Ikike Zuru ọha, Ndị Mpaghara Iri Asaa, na Ndị Ọrụ Zuru ọha
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


3:26

Nkwado nke Ndị Ji Ikike Zuru ọha, Ndị Mpaghara Iri Asaa, na Ndị Ọrụ Zuru ọha

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ugbua a ga m agụpụta ndị Ji Ikike Zuru ọha, ndị Otù Iri Asaa Mpaghara, na Ndị Ọrụ Zuru ọha nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ maka ntuli aka nkwado unu.

Biko gosịpụta nkwado unu n’ụzọ ahụ esi eme ya. Ọ bụrụ na-enwere ndị na-akwadoghị ntụpụta ọbụla, anyị na-arịọ ka ị kpọtụrụ onyeisi stek gị.

A na-atụpụta ka anyị kwado Dallin Harris Oaks dị ka Onyeisi nke Kworum Ndị Ozi Iri na abụọ nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraist nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazu a.

Ndi niile ọ masịrị, biko gosipụta ya

Onye ọ masịghị gosipụta ya.

A na-atụpụta ka anyị kwadoo ndị a sotere dị ka ndị otù nke Ndị Ozi Iri na Abụọ: Dallin H. Oaks, Jeffrey R. Holland, Henry B. Eyring, Dieter F. Uchtdorf, David A. Bednar, Quentin L. Cook, D. Todd Christofferson, Neil L. Andersen, Ronald A. Rasband, Gary E. Stevenson, Dale G. Renlund, Gerrit W. Gong, Ulisses Soares, na Patrick Kearon.

Ndị niile ọ masịrị, biko gosipụta ya

Onye ọ masịghị nwere ike gosipụta ya.

A na-atụpụta ka anyị kwado ndị otu nke Kworum Ndi ozi Iri na Abụọ dịka ndị amụma, ndị ọhụụ ụzọ, na ndị mkpughe.

Ndị niile ọ masịrị, biko gosipụta ya.

Onye ọ masịghị, ọbụrụ n’enwere onye, soro ụdị akárá ahụ.

Anyị na-echeta na Ndị Iri Asaa Mpaghara ọhụrụ dị abụọ ka akwadoro n’oge nzukọ nke Ndị ndu nke Ọgbakọ Zuru ọha ma amara ọkwa ya na website nke Nzukọ nsọ. Anyị na-akpoku unu ịkwado ndị ụmụnne nwoke ndị a n’ọrụ ọhụrụ ha.

Ndị niile ọ masịrị, biko gosipụta ya

Onye ọbụla na-akwadoghi, site n’ụdị akara ahụ.

A na-atụpụta ka anyị kwadoo ndị ọzọ Ji Ikike Zuru ọha, ndị Iri Asaa Mpaghara, na Ndị Ọrụ Zuruọha dị ka otu ha sịrị dị n’oge ugbu a.

Ndị niile ọ masịrị gosipụta ya.

Ndị niile ọ masịghị, ọbụrụ n’enwere, gosipụta ya.

Unu emela, ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, maka ntuli aka nkwado unu nʻaha ndị ndu nke nke Nzukọ nsọ.

Mgbanwe niile nye ndị Iri Asaa Mpaghara

Ndị Iri Asaa Mpaghara ndịa sotere ka akwadoro n’oge ọgbakọ nke ndị ndu nke emere dị ka otu akụkụ nke ọgbakọ zuru ọha:

Bhanu K. Hiranandani and Fernando Vivas.