Ike nke Ije ozi nlekọta nye Otu ahụ
Dịka anyị na-eje ozi nlekọta nye otu onye ahụ, anyị akpọkuo otu onye ahụ ịbịakwute Kraịst ma fee ofufe niime ụlọ nke Onyenwe anyị.
Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, unu emeela maka nkwesị ntụkwasị obi unu na-ịbịakwute Jizọs Kraịst nʻoge ndị a niile juputara nʻihe ịma aka. Unu dị ịtụnaaya; unu mara mma; unu niile nʻotu nʻotu bụ nwa Chineke. Ọ bụ ekpere m na anyị ga-amata mmetụta ahụ Mmụọ Nsọ nwere na ndụ anyị dịka anyị na-abụrụ, ma na-enyekọrịtara ibe anyị aka ịbụ ezi ndị na-eso Jizọs Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ma nwete ọn̄ụ nke Ya dịka anyị na-efe ofufe niime ụlọ nke Onyenwe anyị.
Onyeisi Russell M. Nelson ekwuwo sị: “Ugbu a bụ oge nke unu na maka mụ, iji kwado maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. Ugbua bụ oge maka anyị ijiri ịbụ onye na-eso ụzọ anyị kpọrọ ihe. N’ụwa nke a jupụtara na ọtụtụ ndọpụ uche, kedụ otu aga esi eme nke a?”
O nyekwara azịza ya: “Ife ofufe niime tempụl ga-enyere anyị aka. Niime ụlọ nke Onyenwe anyị, anyị na-elekwasị anya na Jizọs Kraịst. … Anyị na-abịa ịmata Ya. … Onye ọbụla ji obi ọcha achọ Jizọs Kraịst ga-achọta Ya niime tempụl..”
Ya mere, kedụ otu anyị ga-esi bụrụ, ma na-enyekọrịtara ibe anyị aka ịbụ, ndị na-eso Jizọs Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi? Site na-ije ozi nlekọta nye otu onye ahụ. Ije ozi nlekọta nʻụzọ Onye Nzọpụta gụnyere ọmịiko, obi ọma, ndidi, na ịhụnaanya nke na-adịghị ama ikpe. Dịka anyị na-eme ije ozi nlekọta nye otu onye ahụ, anyị akpọkuo otu onye ahụ ịbịakwute Kraịst ma fee ofufe niime ụlọ nke Onyenwe anyị iji nata ike mgbapụta Ya. Ya mere, anyị na-enyekọrịtara ibe anyị aka ịbụ ndị na-eso Jizọs Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi dịka anyị na-eje ozi nlekọta nye otu onye ahụ nʻụzọ niile na-eduba niime ụlọ nke Onyenwe anyị.
Anyị na-amụta site nʻaka Jizọs Kraịst ike ahụ iji jee ozi nlekọta nye otu onye ahụ jiri ịhụnaanya na-adịghị ama ikpe. Ị na-echeta nwanyị Sameria ahụ nọ n’ebe olulu mmiri. Enwere ike nwanyị ahụ chere na ọ baghị uru, na ọ nọ naanị ya, daa mba na mmụọ, na-enweghị onye na-ahụ ya. Enwere ike ọ nwere mmetụta na ọ sonyeghi. Nʻogologo ndụ ya niile o nwewo di ise, ma nwoke nke ya na ya bi ugbua abụghị di ya. Ndị ọzọ nwere ike ha amawo ya ikpe na-enweghị ezi omume niihi ha amaghị ọnọdụ nke ndụ ya. Nke a nwere ike bụrụ otu niime ihe kpatara o jiri bịa naanị ya nʻoge ahụ na-ekpo ọkụ nʻụbọchị ahụ. Ma kosiladị, ọ bụ otu niime ndị mbụ ahụ Jizọs Kraịst gwara na Ọ bụ Mezaya ahụ. Nʻebe Ọ nọ, nwanyị nke a bụ nwaada nke Chineke.
Jizọs Kraịst kuziiri nwanyị ahụ na site na Ya mmadụ nwere ike nata ndụ ebighị ebi site na-ịn̄ụ mmiri nke ndụ ahụ. O kwuru sị, “Onye ọbụla ọ bụ nke ga-an̄u mmiri nke mụ onwe m ga-enye … akpiri mmiri agaghi akpọ ya nkụ; kama mmiri ahụ nke mụ onwe m ga-enye … ga-aghọ … isi iyi na asọpụta ruo ndụ ebighị ebi.”
Nwanyị nke Sameria ahụ nwere mmetụta ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta ma nata aka ebe site na Mmụọ na Ọ bụ Mezaya ahụ. Mgbe agbachara aka ebe nke a, ọ laghachiri nʻobodo ukwu ma kpọkuo ndị ọzọ ịbịa ma hụ, ma ọtụtụ kwenyere na nʻezie Jizọs bụụrụ “nʻezie Kraịst ahụ, Onye Nzọpụta nke ụwa.” Kraịst jiri ịhụnaanya jee ozi nlekọta nye otu onye ahụ; niihi nke a, ndị ọzọ bụụrụ ndị na-eso ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi.
Anyi na-amụta maka ike nke ije ozi nlekọta nye otu ahụ jiri ọmịiko site nʻaka Ndịozi nke Kraịst bụ Pita na Jọn. Ị na-echeta maka otu nwoke, onye bụ onye ngwọrọ site nʻọmụmụ ya, onye gwọọrọ nʻala ụbọchị ọbụla nʻụzọ nke tempụl ma na-arịọ maka ego. Enwere ike nwoke ahụ echeghị na ọ bara uru, na ọ nọ naanị ya, daa mba na mmụọ, na-enweghị onye na-ahụ ya. Enwere ike ọ nwere mmetụta na ọ sonyeghi.
“Mgbe ahụ Pita kwuru, ọlaọcha na ọlaedo ọ dịghị nke m nwere; mana ụdị ihe m nwere aga [m] enye gị: N’aha Jizọs Kraịst nke Nazareth, bilie ma jee ije.”
Pita jidere nwoke ahụ nʻaka nri ya, ma kpọlite ya elu, ma emere ka nwoke ahụ zuo okè. Ozugbo emechara ọrụ ebube ahụ, nwoke ahụ banyere niime tempụl ya na Pita na Jọn “na-eje ije, ma na-awụli elu, ma na-eto Chineke otito.” Pita na Jọn jere ozi nlekọta nye otu onye ahụ nʻụzọ ndị na-edubata niime ụlọ nke Onyenwe anyị, ma nwoke nke a bụụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi.
Ndị enyi m, enwewo ọtụtụ oge niime ndụ m mgbe mụnwa chekwara echiche na abaghị m uru, na a nọ m naanị m, daa mba na mmụọ, na-enweghị onye na-ahụ m. Enwetawo m mmetụta na e sonyeghi m. Emere m baptizim ma nabata m ịghọ onye otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a mgbe m dị afọ 19. Mgbe otu afọ gafere, a nabatara m okù ije ozi dịka onye mgbasa ozi ọma nʻuju oge, mana enwere ọtụtụ ihe m na-amụtabeghị banyere agụgụala Nzụkọ nsọ.
Na mbido mbido ije ozi nke mishọn mụ, a mụtara m na enwere oge mgbe ndị bụ ndị agbụrụ Ndị isi Ojii ka egbochiri ịnata ihe niile bụ ngọzi nke ịfe ofufe niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Enwetere m ọtụtụ mmetụta nke iwe, mgbagwoju anya, obi abụọ na ụjọ nʻisi mbụ ahụ mgbe m mụtara nke a. Mmetụta ndịa niile dị ukwuu nke mere na enwere oge nke m na-enweghịzi m ike ịmata olu nke Mmụọ Nsọ.
Ekele dịrị na enwere m onye nsiso mgbasa ozi oma dị ịtụnanya, Kevin Vick, onye jeere m ozi nlekọta jiri ịhụnaanya, ndidi na obi ebere. Nʻabalị ọbụla dịka ọ na-ahụ mmetụta m nke obi abụọ na mgbagwoju anya, ọ ga-ekwuru Okenye Johnson ahụ mgbe ọ dị nta naanị nke a, “A hụrụ m gị naanya.” Mgbe izuụka abụọ gafere, ahapụrụ m onwe m ka nwete ịhụnaanya nke Kevin. Enwetere m obisiike ịkpee ekpere nye Nna nke Eluigwe n’aha nke Jizọs Kraịst. Dịka m na-ekpe ekpere, uche m gara na nkeji 6 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, amaokwu 21–23, nke kwuru:
“Lee, abụ m Jizọs Kraịst, Ọkpara nke Chineke. Abụ m ìhè ahụ na-amuke n’ọchịchịrị.
“… Kpọrọ uche gị gaa n’abalị ahụ ị kwaara mụ akwa niime obi gị, ka ị wee mara maka eziokwu dị n’ihe ndị a.
“Ọ bụ na mụ ekwughị udo nye obi gị gbasara okwu a? Gịnị bụ aka ebe dị nnukwu ị ga-enweta karia site n’aka Chineke?”
Dịka m na-agụ, echetara m. Echetara m ụbọchị ahụ m buru ọnụ ma kpee ekpere iji mata ma Akwụkwọ nke Mọmọn ọ bụ okwu nke Chineke na ma Josef Smit ọ bụ Onye amụma nke Mweghachite ahụ. Echetere m ọgbụgba ndụ ndị ahụ a na-eme niime ụlọ nke Onyenwe anyị nke na-ejikọ mụ na Jizọs Kraịst nʻụzọ nke onwe. Enwetere m mmetụta ịhụnaanya, ebere na mmesi obi ike nke Onye Nzọpụta na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazụ a bụ alaeze nke Ya n’elu ụwa ma na ọ dị ezigbo mkpa ịkwado maka Ọbịbịa nke Abụọ nke Ya. Niihi na echetere m, o mere ka m nwee ike ịmata olu nke Mmụọ Nsọ ma ghọtakwuo nʻuju na Jizọs Kraịst bụ Kraịst ahụ nakwa na abụ m onye na-eso ụzọ Ya.
Nʻụfọdụ oge, anyị ga-enwe ajụjụ ndị na-enweghị azịza na mmetụta na anyị abaghị uru, nwee ndakpọ olileanya, nọrọ naanị anyị, na na-enweghị onye na-ahụ anyị. Agbanyeghị nke a, ndị enyi m, anyị kwesịrị ịga niihu jiri okwukwe na Kraịst ma cheta okwu Ya niile:
“ Ka obi unu ghara ịlọ mmiri.”
“Niime ụwa unu ga-enwe mkpagbu: mana nweenụ an̄ụrị; E meriwo m ụwa.”
Abụ m onye aka ebe maka eziokwu nke a na maka ngọzi nke Onye Nzọpụta kwere na nkwa.
Niihi ya, kedụ ihe anyị nwere ike imee iji hụ na ije ozi nlekọta anyị nye otu onye ahụ nʻụzọ nke Onye Nzọpụta bụ nke kachasị amị mkpụrụ? Ibi ndụ ozizi nke Kraịst ga-enyere anyị aka. “Ibi ndụ ozizi nke Kraịst,” dịka Onyeisi Nelson kọwara “nwere ike mepụta ike omume ọma kachasị dị ike na-agba gburugburu, na-ekewapụta ihe nke ime mmụọ na-aga ọkụ ọkụ niime ndụ anyị.
“Dịka anyị na-agba mbọ ibi ndụ nke iwu niile dị elu nke Jizọs Kraịst … Onye Nzọpụta na-ebuli anyị elu gafee ihe ndị na-adọ adọ nʻụwa nke a dara ada site na-ịgọzi anyị jiri afọ ọma, mmepụ aka, obi ọma, ọzụzụ onwe onye, udo, na ezumiikekarịrị akarị.”
“Ike [ime mmụọ nke a] na-abịa abịa nke a na-arọpụta site na-ibi ozizi nke Kraịst” Okenye Dale G. Renlund kọwara, “anaghị enye ike nanị maka mgbanwe nke ọdịdị anyị si n’igwe ruo na akaraka ebighi ebi anyị kama nakwa akpali anyị maka ịnye aka maka [iji jee ozi nlekọta] nye ndị ọzọ n’ụzọ ndị ziri ezi.” Okenye Renlund echeteworo anyị na “ọrụ Onye Nzọpụta ahụ bụ [ịme ka anyị zuo okè]. Ọrụ anyị bụ inwe ịhụnaanya—inwe ịhụnaanya ma lekọta n’ụzọ nke ga-eme ndị ọzọ abịakwute Jizọs Kraịst.”
Ikike anyị ibi ndụ ozizi nke Kraịst ga-amụba site nʻọmụmụ Akwụkwọ nke Mọmọn kwa ụbọchị ma site na-iri oriri nsọ kwa izu. Onyeisi Nelson kwuru na Akwụkwọ nke Mọmọn “na-akuzi ozizi nke Kraịst … [ma] na-ewepụta nghọta ahụ kachasị zuo okè na nke [kachasị doo anya] banyere Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst nke enwere ike ịchọta nʻebe ọbụla.” A hụrụ m akwụkwọ nke a naanya. Ma ijiri ekpere sonye nʻoriri nsọ izuụka ọbụla ga-amụba nghọta anyị banyere Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst ma wepụta mnwogharị nke ime mmụọ, nkasi obi, na ike nke iyichineke nime ndụ anyị niile. Cheta, “n’emume nsọ niile [nke ọkwa nchụaja], ike ahụ nke ndụ iyichineke na-apụta ìhè.” ma ike nke a, nke sitere na Jizọs Kraịst, na-agba ọchịchọ anyị na ikike anyị ume iji jee ozi nlekọta nye otu onye ahụ.
Ọmụmụ m nke Akwụkwọ nke Mọmọn na iri oriri nsọ na-akụnyụ mmetụta niile nke ịda mba, na-ewulu mkpebi obim ịje ozi nlekọta nye otu onye ahụ nʻụzọ nke Onye Nzọpụta, ma nyee aka mee ka ịbụ onye na-eso ụzọ bụrụ ihe m kachasị kpọọ ihe.
Ndị enyi m, Ana m ekwe nkwa na dịka anyị na-ebi ndụ nke ozizi nke Kraịst ma na-eje ozi nlekọta nye otu onye ahụ nʻụzọ niile nke na-eduba nʻụlọ nke Onyenwe anyị, anyị ga-aga niihu jiri okwukwe na Kraịst ọbụnadị nʻetiti ajụjụ ndị na-enweghị azịza na mmetụta niile nke abụghị onye bara uru, ịnọ naanị, ịda mba nʻobi, na na-enweghi onye na-ahụ anyị. Anyị ga-akpọ okù nye otu onye ahụ ka ọ bịakwute Jizọs Kraịst ma fee ofufe niime ụlọ nke Onyenwe anyị iji nata ike mgbapụta na ịhụnaanya Ya. Niime ụlọ nke Onyenwe anyị, anyị na-enwe “mmetụta nke ebere nke [Onye Nzọpụta]. [Anyị] ga-achọta azịza nye ajụjụ ndị ahụ na-echekasị [anyị]. [Ma anyị] ga aka aghọta ọn̄ụ nke ozi ọma Ya.” Site nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.