Ọgbakọ Zuru ọha
E jiri Omume ọma nke Ime ihe nʻoke Chọọ mma
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


15:8

E jiri Omume ọma nke Ime ihe nʻoke Chọọ mma

Ana m esetịpụ ezigbo òkù nye anyị niile iji agwa ọma ime ihe nʻoke yiri Kraịst achọ uche na obi anyị mma.

Na Me 2021, mgbe m gara ileta nrụzigharị nke Tempụl Salt Lake, ọ tụrụ Onyeisi Russell M. Nelson naanya na mgbalị niile nke ndị mgbughe ụzọ ndị, nwere akụrụngwa ole ma ole na okwukwe na-adịghị ada ada, wuru ọmarịcha ụlọ ahụ dị nsọ, mkpụrụ mma ahụrụ anya na nke ime mmụọ nke nọworo ogologo oge. Kosiladị, ọ hụkwara mmetụ nke mgbawa ala, nke nʻogologo oge emewo ka enwee oghere niime okwute ntọala niile nke isimbụ nke tempụl ahụ ya na ụkwụ esighị ike na masonry, ihe iriba ama doro anya maka mkpa ọ dị ịrụsi ụlọ ike.

Onyeisi Nelson nọ nʻezi Tempụl Salt Lake

Onye amụma anyị hụrụ naanya mesịrị kuziere anyị na dị ka ọ si dị mkpa iji tinye nʻọrụ atụ niile nke eji eme ka ntọala nke tempụl ahụ sie ike ka o nwee ike guzogide ike niile nke eke, anyị kwesịkwara ịkpachara anya nʻụzọ pụrụ ezigbo iche—elemanya atụ ndị anyị na-ejibeghị kpọrọ ihe mbụ—iji mee ka ntọala ime mmụọ nke onwe anyị niime Jizọs Kraịst sie ike. Nozi ya kwere ncheta, ọ hapụụrụ anyị ajụjụ abụọ miri emi maka ntụgharị uche nke onwe: “Kedụ otu ntọala gị si sie ike? Ma kedụ ihe ndị ana achọ iji mee ka ama na nghọta gị nke ozi ọma sikwuo ike?”

Ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-ewetere anyị ụzọ dị mma eluigwe kpalitere iji gbochie mbuze ime mmụọ niime mkpụrụ obi anyị, na-eme ntọala anyị sikwuo ike nʻụzọ dị ike ma na-enyere anyị aka zere oghere niime okwukwe anyị na ụkwụ esighị ike ma na ama anyị ma na nghọta anyị nke eziokwu niile dị nsọ nke ozi ọma. Otu ụkpụrụ dị mkpa kpọmkwem maka inwete ebumnuche nke a ka ana achọta niime nkeji 12 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, mkpughe enyere site nʻaka Onye amụma Josef Smith nye Josef Knight, nwoke ezi omume onye chọsiri ike ịghọta uche nke Onyenwe anyị, ọ bụghị maka naanị mgbanwe ahụru anya mana iguzosi ike nʻiso ụzọ ya—kwụsie ike dị ka ogidi nke eluigwe.” Onyenwe anyị mara ọkwa:

“Lee, ana m ekwuru gị, nakwa nye ndị niile nwere ọchịchọ niile iwepụta ma hiwe ọrụ nke a;

“Ma o nweghị onye ọbụla ga-enye aka n’ọrụ a ma ọ bụghị ma ọ dị umeala ma juputakwa n’ịhụnaanya, nwee okwukwe, olileanya, na afọ ọma, nwee anya udo n’ihe niile, ihe ọbụla aga enyefe n’aka ya.”

Odudu nke Onye Nzọpụta, edepụtara niime mkpughe nke a dị nsọ, na-echetere anyị na ime ihe nʻoke bụ nrụsi ike dị mkpa maka ntọala kwụsiri ike niime Jizọs Kraịst. Ọ bụ otu niime omume ọma dị mkpa ọ bụghị naanị maka ndị akpọworo, mana ọzọkwa maka ndị niile meworo ọgbụgba ndụ dị nsọ ha na Onyenwe anyị ma nabata isoro Ya na nkwesị ntụkwasị obi. Ime ihe nʻoke na-adakọrịta ma na-agba njirimara nyiri Kraịst ndị ọzọ akpọrọ aha niime mkpughe nke a: ịdị umeala, okwukwe, olileanya, afọ ọma, na ịhụnaanya na-enweghị ntụpọ nke na-asọpụta site na Ya. Ọzọkwa, izulite ime ihe nʻoke bụ ụzọ bara uru iji chekwaa mkpụrụ obi anyị megide mbuze ime mmụọ aghụghọ nọ mgbe niile nke ike mmetụta niile nke ụwa kpatara nke nwere ike ime ntọala anyị niime Jizọs Kraịst ghara isi ike.

Nʻetiti àgwà ndị eji achọ ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst mma, ime ihe nʻoke na-apụta ihe dị ka ntụgharị uche nke Onye Nzọpụta Nʻonwe Ya, mkpụrụ nke Mmụọ dị oke ọnụ ahịa, nke dị adị nye ndị niile dị njikere nye ike mmetụta sinachi. Ọ bụ omume ọma na-ewete ndakọrịta nye obi, na-ahazi ọchịchọ niile na mmetụta niile jiri amamiihe na ịdị jụụ. Niime akwụkwọ nsọ, ime ihe nʻoke ka egosipụtara dị ka akụkụ dị mkpa nke ọganiihu dị niime njem ime mmụọ anyị, na-edu anyị ruo inwe ndidi, ịdị ka chi, na ọmịiko mgbe ịn̄ụcha mmetụta anyị, okwu anyị, na omume anyị.

Ndị na-eso ụzọ Kraịst ndị na-agba mbọ izulite njirimara nke a nyiri Kraịst na-adịrịzi umeala nke ukwuu ma juputa nʻịhụnaanya. Ike dị jụụ na-apụta niime ha, ma ha na-adị mma karịa nʻijide iwe, na-azụlite ndidi, ma na-emeso ndị ọzọ jiri ndidi, nkwanye ùgwù, na inwe ugwu, ọbụna mgbe oke ifufe niile nke mkpagbu na-efe nʻike nʻike. Ha na-agba mbọ ịghara ime ihe ngwa ngwa mana na-ahọrọ ime omume jiri amamiihe ime mmụọ, nke ịdị nwayọọ na mmetụta dị nwayọọ nke Mmụọ Nsọ na-edu. Site nʻụzọ a, ha na-ebelata na-adịghị ike nye mbuze ime mmụọ niihi na, dị ka Onye Ozi Pọl kuziri, ha maara na ha pụrụ ime ihe niile site na Kraịst, onye na-agba ha ume ọbụna nʻihu mnwale niile nke nwere ike ịkwagharị ama ha nke Ya.

Niime Ozi ya nye Titus, Pọl nyere ndụmọdụ dị nsọ gbasara ntozu oke niile nke ndị ahụ na-achọ ịnọchite anya nke Onye Nzọpụta ma mee uche Ya jiri okwukwe na nranye. Ọ sịrị na ha kwesịrị inwe agwa nnabata, dị nro, zie ezi, ma dị nsọ nke na-atụgharị uche nʻụzọ doro anya nʻike mmetụta ime ihe nʻoke.

Kosiladị, Pọl dọrọ aka na ntị na ha ekwesịghị ịbụ onye nganga, onye na-ewe iwe ọkụ, … [na] onye na-alụ ọgụ mgbe niile.” Ụdị njirimara ndị a megidere echiche nke Onye Nzọpụta ma gbochie ezi uto ime mmụọ. Nʻọnọdụ akwụkwọ nsọ, “abụghị onye nganga” bụ onye na-ajụ ime ihe nʻomume okomoko na mpako; “adịghị ewe iwe ọkụ” bụ onye na-ezere nkwanye eke ịghọ onye enweghị ndidi na onye ntakasị ahụ; na “adịghị alụ ọgụ mgbe niile” na-ekwu maka onye na-ajụ akparamagwa na-ese okwu, na-eme ihe ike, na omume ọjọọ ekwuru nʻọnụ, nke ahụru anya, na nke na-emetụ nʻuche. Dị ka anyị na-agba mbọ ịgbanwe akparamagwa jiri okwukwe na umeala, enwere ike ijigidesi anyị ike nʻoke nkume nke amara Ya ma bụrụ ngwa ọrụ dị ọcha na nke na-egbu maramara nʻaka Ya dị nsọ.

Hannah na Samuel

Nʻịtụgharị uche maka mkpa izulite omume ọma nke ime ihe nʻoke, ana echetere m okwu niile nke Hannah, nne onye amụma Samuel—nwanyị nwere okwukwe dị ịrịba ama onye, ọbụna mgbe nnukwu mnwale gasịrị, bụrụ abụ ekele nye Onyenwe anyị. O sịrị, “Ekwukwala okwu ọzọ nʻụzọ mpako dị ukwuu; ekwekwala ụka okomoko site nʻọnụ gị pụta: niihi na Onyenwe anyị bụ Chineke nke mmata ihe, ma site na ya ka ana atụ omume niile.” Abụ ya karịrị ekpere—ọ bụ ọkpụkpọ oku enyere onwe iji mee omume nʻumeala, njide onwe, na imeru ihe nʻókè. Hannah na-echetere anyị na ezigbo ike ime mmụọ abụghị ihe a na-ekwupụta na mmeghachi omume mkpali niile ma ọ bụ okwu mpako niile mana na àgwà nwere uche ime ihe nʻoke, dakọtara ya na amamiihe nke Onyenwe anyị.

Mgbe ụfọdụ, ụwa na-ebuli omume nke sitere na ime ihe ike ike, nʻokomoko, enweghị ndidi, na imefe ihe, na-akwadokarị ụdị agwa ndị a site ọkwụkwa niile nke ndụ kwa ụbọchị na ọchịchọ maka nkwado na iwu ewu. Mgbe anyị bupụrụ uche anyị site nʻomume ọma nke ime ihe nʻoke ma leghara ike mmetụta nke Mmụọ Nsọ dị nwayọọ na nke imeru ihe nʻókè anya nʻụzọ omume na ikwu okwu anyị, ọ na-adịrị anyị mfe ịdaba nʻọnya nke onye iro, nke na-apụghị izere ezere na-eduba anyị ikwu okwu na ịmụta àgwà ndị anyị ga-akwa mmakwara nke ukwuu, ma ọ bụ na mmekọrịta ọha, ezi na ụlọ, ma ọ bụ nke nzukọ nsọ anyị. Ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-akpọku anyị itinye omume ọma nke a nʻọru karịsịa nʻoge aka mgba niile, niihi na ọ bụ kpọmkwem nʻoge ndị a ka ezigbo agwa nke mmadụ na-apụta ihe. Dị ka Martin Luther King Jr. kwuru otu mgbe, “Ihe eji atụrụ mmadụ nʻikpeazụ abụghị ebe ọ nọ nʻoge udo na ihe ịdị mfe, mana ebe ọ nọ nʻoge aka mgba na esemokwu.”

Dị ka ndị ọgbụgba ndụ, akpọrọ anyị ibi ndụ jiri obi anyị gbara mgbọrọgwụ siri ike na nkwa niile dị nsọ anyị meworo nye Onyenwe anyị, kpachapụ anya na-esoro usoro nke O hiwere site nʻọmụmaatụ Ya zuru oke. Nʻaka nke ọzọ, O kwewo nkwa, “N’ezie, n’ezie, asị m unu, na nke a bụ ozizi m, ma onye ọbụla wukwasịrị n’elu nke a wukwasịrị n’elu nkume m, ma ọnụ ụzọ ama niile nke ala mmụọ agaghị emeri ha.”

Onye Nzọpụta

Let Not Your Heart Be Troubled, by Howard Lyon, courtesy of Havenlight

Ozi nke Onye Nzọpụta nʻelu ụwa ka e jiri omume ọma nke ime ihe nʻoke mara nʻakụkụ niile nke agwa Ya. Site nʻọmụmaatụ Ya zuru oke, Ọ kuziiri anyị “inwe ndidi na mkpagbu niile, ekwujọkwala megide ndị ahụ na-ekwujọ.” Dị ka Ọ kuziri na anyị ekwesịghị ị na-ewe iwe niihi arụmarụ ụka na esemokwu niile, Ọ mara ọkwa, “Unu ahaghị ichegharị, ma dịrịzie dị ka obere nwata.” Ọ kuzikwara na ndị niile na-achọ ịbịakwute Ya jiri nzube juru eju nke obi garịrị emezi ha na ndị ahụ ha na-ewere iwe ma ọ bụ ha na ndị nwere ihe megidere ha. Jiri omume nʻefeghị oke na obi dị ọmịiko, O kwewo anyị nkwa na mgbe emesoro anyị nʻobi ọjọọ, enweghị obi ọma, enweghị nsọpụrụ, ma ọ bụ ileghara anya, obi ọma Ya agaghị ahapụ anyị, ma ọgbụgba ndụ nke udo Ya abụghị nke aga ewepụ site na ndụ anyị.

Afọ ole ma ole gara aga, mụ na nwunye m nwetere ohere ọma dị nsọ izute ụfọdụ ndị otu Nzukọ nsọ kwesịrị ntụkwasị obi niime Obodo ukwu Mexico. Ọtụtụ niime ha, ma ọ bụ nʻonwe ma ọ bụ site nʻaka ndị ha hụrụ naanya, anagidewo mnwale ọnụ apụghị ịkọwa, tinyekọta ịtọrọ mmadụ, igbu mmadụ, na ihe ọjọọ ndị ọzọ na-agbawa obi.

Dị ka anyị lebara anya nʻihu Ndị nsọ ahụ, anyị ahụghị iwe, enweghị mmasị, ma ọ bụ ọchịchọ maka mmegwụrụ. Kama, anyị hụrụ obi umeala dị nwayọọ. Mbara ihu ha, agbanyeghị ejiri mwute mara ya, gbukere ọchịchọ ziri ezi maka ọgwụgwọ na nkasi obi. Ọbụna na-agbanyeghị obi ha gbawara site ntaram ahụhụ, Ndị nsọ ndị a garaniihu nʻokwukwe niime Jizọs Kraịst, na-ahọrọ ịhara ikwe mkpagbu ha ghọọ oghere niime okwukwe ha ma ọ bụ kpata ụkwụ esighị ike niime ama ha nke ozi ọma.

Na mmechi ọgbakọ ahụ dị nsọ, anyị kelere onye ọbụla niime ha. Ikwe aka niile, nnabata niile ghọrọ ama dị nwayọọ nke bụ site na enyemaka nke Onyenwe anyị, anyị nwere ike họrọ ejighị iwe zaghachi nye obi nkoropụ niile na aka mgba niile nke ndụ. Ọmụmaatụ ha dị nwayọọ na nke enweghị atụ rụrụ ọrụ dị ka ọkpụkpọ oku dị nro iji jee ije nʻụzọ nke Onye Nzọpụta jiri ime ihe nʻoke nʻihe niile. Ọ dịịrị anyị ka anyị nọọrọ nʻihu ndị mmụọ ozi.

Jizọs Kraịst, onye kachasị onye niile, tara ahụhụ maka anyị tutu ruo Ya agbaa ọbara site nʻoghere niile, na-agbanyeghị ọ dịghị mgbe O kwere ka iwe nwuru obi Ya ọkụ, ọbụghị ma okwu iwe, mkparị ma ọ bụ okwu rụrụ arụ ịdapụta nʻọnụ Ya, ọbụna nʻetiti ụdị nsogbu. Jiri ime ihe nʻoke zuru oke na ịdị nwayọọ nʻobi na-enweghị atụ, O cheghị maka Onwe Ya mana maka ụmụ nke Chineke nke ọbụla—ndị gara aga, ugbu a, na nʻọdịniihu. Onye Ozi Pita gbara ama nke agwa dị ebube nke Kraịst mgbe ọ mara ọkwa, “O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya; Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ; kama o were onwe ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi.” Ọbụna nʻetiti ihe mgbu Ya kachasị, Onye Nzọpụta gosipụtara ime ihe nʻoke zuru oke na nke sinachi. Ọ mara ọkwa, “Na-agbanyeghị nke ahụ, otuto dịrị Nna, ma eso m keta ma mechaa nkwadobe m niile nye ụmụ nke mmadụ.”

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị m hụrụ naanya, ana m esetịpụ ọkpụkpọ oku nye anyị niile iji omume ọma nke ime ihe nʻoke yiri nke Kraịst ji chọọ uche na obi anyị mma, dị ka nzaghachi dị nsọ nye oku amụma nke Onyeisi Russell M. Nelson anyị. Dị ka anyị na-agba mbọ nʻokwukwe na nrụsi ọrụ ike iji ganye ime ihe nʻoke niime omume anyị na okwu anyị niile, ana m agba ama na anyị ga-agba ndụ anyị ume ma kwado ndụ anyị nʻụzọ kacha sie ike nʻelu isi ntọala nke Onye Mgbapụta anyị.

Ana m agba akaebe m nʻobi umeala na ọchịchọ mgbe niile nke ime ihe nʻoke na-asachasị mkpụrụ obi anyị ma na-edo obi anyị nsọ nʻihu Onye Nzọpụta, jiri nwayọọ na-akpọta anyị nso nye Ya ma na-akwado anyị, jiri olileanya na udo, maka ụbọchị ahụ dị ebube mgbe anyị ga-ezute Ya nʻỌbịbịa nke Ugboro Abụọ Ya. Ana m ekwuputa okwu ndị a dị nsọ n’aha Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, amen.