Iwekwasị Aha nke Jizọs Kraịst
Ka anyị na-aka amata ma na-echeta Jizọs Kraịst, otu ahụ ka anyị na-achọ ịdị ka Ya.
Na 2018, na Mahadum nke Utah, ogo ọkammụta pụruiche ka ekewapụtara nke akpọrọ “Dr. Russell M. Nelson and Dantzel W. Nelson Presidential Chair in Cardiothoracic Surgery”—cardio, nke pụtara “obi,” thoracic, nke pụtara “eze obi.” O nyere ọrụ dị mkpa nke Onyeisi Nelson nkwanye ugwu dị ka ọwa obi na nkwado ọ natara site nʻaka nwunye ya nwụrụ anwụ, Dantzel. Ogo ọkammụta nke a ka akwụrụ ụgwọ ya site nʻego emebere ịnọru nʻọdịniihu. Onye nke ahọọrọ maka ụdị ogo ọkammụta nwere ugwu nke a na-anata nnabata, nkwado ụgwọ ọnwa, na ego nnyocha.
Ọwa ahụ nke mbụ ahọọrọ ijide ogo ọkammụta a bụ Dkt. Craig H. Selzman, ọwa obi nwere nka onye na-abụghị onye otu nzukọ nsọ. Na mmemme iwere onyinye ogo ọkammụta nke a nye Dkt. Selzman, ọtụtụ ndị ọbịa dị mkpa bịara, gụnyere Onyeisi Nelson na nwunye ya Nwanne nwanyị Wendy W. Nelson. Nʻoge nzukọ ahụ, Onyeisi Nelson kwuru nʻumeala maka ọrụ ịwa ahụ ọsụ ụzọ ya.
Mgbe ahụ Dkt. Selzman kwuru ihe ọ pụtaara nye ya ịbụ onye a kpọrọ nʻogo ọkammụta nke a. O kwuru na ụbọchị anọ gara aga, mgbe otu ogologo ụbọchị niime ọnụ ụlọ ịwa ahụ gasịrị, ọ chọpụtara na otu niime ndị ọrịa ya kwesịrị ịgaghachi ịwa ahụ. Ike gwụrụ ya ma nwee ndakpọ olileanya, ịmara na ọ ga-ehi nʻụlọ ọgwụ otu abalị ọzọ.
Na mgbede a, Dkt. Selzman gwara onwe ya okwu na-agbanwe ndụ. Nʻoge ahụ, o chere: “Na Fraịde, aga ahọpụta m ruo nʻogo ọkammụta akpọrọ nʻaha Dr. Nelson. Ọ bụ onye a maara mgbe niile dị ka onye na-ejikwata mmetụta uche ya, na-emeso ndị mmadụ omume jiri nkwanye ugwu, na-enweghị mgbe o were oke iwe. Ugbu a aga ejikọta aha m na nke ya, aga m agbalị ịdịkarị ka ya.” Dkt. Selzman abụrụworịị ọwa ahụ na-eme nke ọma. Mana ọ naara achọ ịdịkwu mma.
Mgbe gara aga, otu ịwa ahụ ya nwere ike bụrụ na ha maara banyere ike ọgwụgwụ na obi nkoropụ ya niihi na o nwere ike na-ekwe ka o gosi nʻagwa ya na ụda olu ya. Mana niime ọnụ ụlọ ịwa ahụ nʻabalị ahụ, Dkt. Selzman mere mgbalị akọnuche ịkwado na ịghọta ndị otu ya nʻụzọ pụrụ iche. Ọ dịrị ya ka enwere ihe dị iche ma kpebie ịganiihu ịnwa ịdịrịkwu ka Dkt. Nelson.
Afọ ise gasịrị, Onyeisi Nelson nyere Mahadum Utah onyinye edereede ọkammụta ya. Ndịisi sitere na mahadum ahụ bịara ikele Onyeisi Nelson nke ọma. Nʻoge mmemme nke a, Dkt. Selzman kwuru okwu ọzọ. Na-arụtụaka na ndebiri aha nke Onyeisi Nelson, RMN, ọ sịrị, “E nwere usoro ʻRMNʻ nke juru ebe niile na Ngalaba Cardiothoracic Surgery na Mahadum Utah.”
Nʻọnọdụ obi nkoropụ, Dkt. Selzman kọwara: “Ana m eme ihe anyị na-akuziri ndị anyị na-azụ ọzụzụ ugbu a ime—lekwasị anya, chefuo ya, ma mee nke i nwere ike ime. Ụda nke a bi niime anyị ụbọchị niile. Anyị na-enye onye otu ọbụla nke ngalaba anyị na onye ọhụrụ ọbụla a na-azụ ọzụzụ lapel pin. Nʻokpuru pin ahụ ka enwere mkpụrụ edemede ʻRMN.ʻ Usoro RMN bụ ntọala nye ọzụzụ anyị; anyị na-akuziri ya onye niile.” Dkt. Selzman ma ama melitewo agwa na ọchịchọ ochie ya niile niihi na ejikọwo aha ya na nke Onyeisi Nelson ugbu a.
Usoro mmemme nke a gụnyere Dkt. Selzman kpatara mụ ịjụ onwe m ajụjụ: “Kedụ otu m siworo gbanwee kemgbe m jikọtara aha mụ na aha nke Jizọs Kraịst? Ewerewo m ụda yiri nke Kraịst niihi nke ahụ? Agbalịwo m n’eziokwu ịdịrịzi ka Ya karịa ma dịkwa ka Ya?”
Niime nhụmiihe nke Dkt. Selzman, anyị nwere ike ịhụ opekampe myịemetụ ise nye usoro site nʻebe anyị si ewekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst. Ọbụnadị na usoro ahụ na-amalite site na baptizim, o zughị ezu tutu ruo mgbe anyị na-adị ọcha ma dị nsọ karịa ma bịa dịrịzie ka Ya karịa.
Myịemetụ nke mbụ bụ nrugosị. Nhọpụta Dkt. Selzman ruo ogo ọkammụta Nelson jikọtara aha ya na nke Onyeisi Nelson, ma Dkt. Selzman malitere ịrụgosị ya na Onyeisi Nelson. Mgbe anyị na-ewekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst, anyị na-ejikọ aha anyị na nke Ya. Anyị na arụgosị anyị na Ya. Ana amata anyị nke ọma dị ka ndị nke Kraịst. Anyị na-anakwere Onye Nzọpụta ma na-eleghị anya na-azụ eguzoro ka agụọ anyị dị ka ndị Ya.
Ihe ọzọ metụtara nrụgosị nke ọma bụ myịemetụ ọzọ—ncheta. Mgbe Dkt. Selzman bara niime ụlọọrụ ya, anya ya gara na medalịọn o nwetere mgbe ahọpụtara ya nʻogo ọkammụta Nelson. Medalịọn nke a na-echetere ya ụda RMN niile kwa ụbọchị. Maka anyị, iri oriri nsọ izu ụka ọbụla na-enyere anyị aka cheta Jizọs Kraịst oge izu ụka ahụ niile. Dị ka anyị na-eri oriri nsọ, anyị na-eme otu ahụ na ncheta nke ụgwọ Ọ kwụrụ iji gbapụta anyị. Anyị na-emegharị ọhụrụ ọgbụgba ndụ iji cheta Ya, mata ịdị ukwuu Ya, ma nabata ịdị mma Ya. Anyị na-anakwere ugboro ugboro na ọ bụ naanị niime na site na amara Ya ka esi azọpụta anyị site nʻọnwụ nke anụ ahụ na nke ime mmụọ.
Ncheta pụtara na anyị na-esoro ndụmọdụ enyere site nʻaka onye amụma Akwụkwọ nke Mọmọn Alma. Anyị “na-ekwe ka ihe omume [anyị] niile dịrị Onyenwe anyị, ma ebe ọbụla ọ bụ [anyị na-aga, anyị] na-ekwe ya ịbụrụ nʻaha Onyenwe anyị; … [anyị] na-ekwe ka eduzie echiche [anyị] niile nye Onyenwe anyị; … [ma anyị] na-ekwe ịhụnaanya nke [obi anyị] bụrụ nke atụkwasịrị na Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.” Ọbụna mgbe anyị nwere ihe ndị ọzọ anyị na-eme, anyị na-akpachara anya nʻebe Ọ nọ, dị ka anyị na-echeta aha nke onwe anyị, na-agbanyeghị ihe ọzọ anyị na-atụkwasị uche na ya.
Ntopụta nke icheta ihe Onye Nzọpụta meworo maka anyị bụ myịemetụ nke atọ—nn̄omi. Dr. Selzman malitere in̄omi Onyeisi Nelson na usoro RMN niile. Ekwere m na usoro niile nke Onyeisi Nelson bụ nnọọ ngosipụta nke ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst ogologo ụbọchị ndụ ya. Maka anyị, ka anyị na-aka arụgosị ma na-echeta Jizọs Kraịst, otu ahụ ka anyị na-achọ ịdị ka Ya karịa. Dị ka ndị na-eso ụzọ Ya, anyị na-agbanwe maka ọdịmma mgbe anyị na-elekwasị anya na Ya, ọbụladị karịa mgbe anyị lekwasịrị anya nʻonwe anyị. Anyị na-agba mbọ ịdịrịzi ka Ya karịa ma na-achọ ka ejiri njirimara Ya niile gọzie anyị. Anyị na-ekpesi ekpere ike ka anyị jupụta nʻafọ ọma, ịhụnaanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ.
Dị ka Onyeisi Nelson kuziri na Eprel: “Mgbe afọ ọma ghọrọ otu akụkụ nke ọdịdị anyị, anyị ga-akwụsị agwa ahụ nke ileda ndị ọzọ anya. Anyị ga-akwụsị ịma ndị ọzọ ikpe. Anyị ga-enwe afọ ọma maka ndị ahụ sitere nʻakụkụ ụwa niile. Afọ ọma nye ndị niile … dị oke mkpa maka ọganiihu anyị. Afọ ọma bụ ntọala nke agwa ịdị ka chineke.” Ya na afọ ọma, anyị na-achọ, “na-azụlite, … ma na-agbasa” onyinye nke ime mmụọ ndị ọzọ sitere nʻaka Onye Nzọpụta gụnyere omume ọma, inwe ugwu, ndidi, umeala, na ịrụsi ọrụ ike.
In̄omi Jizọs Kraịst na-eduba anyị na myịemetụ nke anọ—ikwekọ na ebumnobi Ya niile. Anyị na-esonye Ya nʻọrụ Ya. Dị ka dibịa ọwụwa ahụ, Dkt. Nelson bụ onye ama dị ka onye nkuzi, ọgwọọrịa, na onye nchọcha. Lapel pin ejiri niime nkewa Nke Dkt. Selzman na-ekwusi ike mgbalị ndị a, na-egosipụta mkpụrụokwu ndị a kuzie, gwọọ, ma chọpụta. Maka anyị, akụkụ nke iwekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst gụnyere iji obi anyị niile eme ihe, jiri mkpachapụ anya, ma nʻobi mmasị mee ka ebumnuuche Ya na nke anyị dabakọta. Anyị na-esonye Ya nʻọrụ Ya mgbe anyị “na-enwe ịhụnaanya, na-ekesa, ma na-akpọku.” Anyị na-esonye Ya nʻọrụ Ya mgbe anyị na-eje ozi nlekọta nye ndị ọzọ, kacha nke ndị na-adịghị ike na ndị ahụ etipịara etipịa, ndị akụsasiworo, ma ọ bụ etiriri etiri site na nhụmiihe elu ụwa ha niile.
Ya mere anyị na-ewekwasị onwe anyị nʻuju aha nke Jizọs Kraịst site na nrugosị, ncheta, nn̄omi, na ndakọrịta. Ime ihe anọ ndị a na-eduba anyị ruo na myiemetụ nke ise—ike. Anyị na-enwete ike na ngọzi niile nke Chineke niime ndụ anyị. Ogo ọkammụta Nelson na-ewetere Dkt. Selzman ego nnabata na nkwado nke ọ na-eji agbanwe omenaala dị na ngalaba ya. Ọ na-etinye “ike nke onyinye” nke a iji nyere ndị ọzọ aka. Nʻotu ụzọ ahụkwa, mgbe anyị na-ewekwasị onwe anyị aha nke Onye Nzọpụta, Nna anyị nke Eluigwe na-agọzi anyị jiri ike Ya iji nyere anyị aka mejuputa ozi anyị na ndụ anụ ahụ.
Dị ka anyị na Chineke na-agba ọgbụgba ndụ ndị ọzọ, anyị na-ewekwasị onwe anyị nʻuju karịa aha nke Jizọs Kraịst. Ya mere, Chineke na-eji ọtụtụ ike Ya agọzi anyị. Dị ka Onyeisi Nelson kuziworo: “Onye ọbụla nke mere ọgbụgba ndụ niile nʻebe baptizim na niime tempụl niile—ma na-edobe ha—nwere ụzọ bara ụba esi enweta ike nke Jizọs Kraịst. … “Ụgwọ ọrụ nke idobe ọgbụgba ndụ niile nke gị na Chineke bụ ike nke eluigwe … nke na-agba anyị ume iji nagide mnwale niile, ọnwụnwa niile, na obi mgbu niile n’ụzọ dị mma karịa.”
Anyị na-adịkarị enwe karịa nnabata nke ime mmụọ. Anyị na-enwekwu mgbam ume karịa iguzogide ọnọdụ ndị yiri ka ihe na-adịghị ekwe omume. Ana agba anyị ume karịa niime mkpebi anyị isoro Jizọs Kraịst. Anyị na-echegharị ngwa ngwa karịa ma laghachikwuru Ya mgbe anyị jehiere. Anyị na-adịkwu mma karịa nʻikesa ozi ọma Ya jiri ike na ikikere Ya. Anyị na-enyere ndị ahụ nọ na mkpa aka mgbe anyị anaghị ekpe ha ikpe nke ukwuu, nke na-anaghị ekpe ikpe nke ukwuu. Anyị na-ejigide mgbaghara nke mmehie anyị. Anyị nwere ike inwe udo, anyị na-enwe obi ụtọ karịa niihi na anyị nwere ike ịn̄ụrị ọn̄ụ mgbe niile. Ebube Ya ga-agba anyị okirikiri, ma ndị mmụọ ozi Ya ga-enwe ike nʻebe anyị nọ.
Onye Nzọpụta na-akpọku anyị, “Bịakwutenụ Nna nʻaha m, ma nʻoge akara aka nata ngọzi ya nʻuju.” Ana m agba unu ume ime nke a. Bịakwutenụ Nna anyị nke Eluigwe. Wekwasịnụ onwe unu aha nke Jizọs Kraịst. Unu na Ya nwee nrụgosị. Na-echeta Ya oge niile. Gbaa mbọ ịdị ka Ya. Sonye Ya nʻọrụ Ya. Nata ike na ngọzi Ya niile niime ndụ gị. Kanye aha Ya niime obi gị, jiri obi ma na mkpachapụ anya. Nke ahụ na-enye gị “ọnọdụ” niihu Chineke ma mee gị etozuo oke maka nkwuchite ọnụ nke Onye Nzọpụta maka gị. Ị ga-abụrụ onye nketa oke ebuliri elu niime alaeze nke Nna anyị bi Nʻeluigwe, onye ya na Nwa mbụ Ya so nwere oke, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị hụrụ naanya.
Ọ dị ndụ. O doro m anya nʻezie. Ọ hụrụ gị naanya. O nyere ndụ Ya maka gị. Ọ na-arịọ gị ịbịakwute Nna site na Ya. Site nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.