Ịhụnaanya Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst
Ọgwụgwọ na mgbaghara ka a na-ahụ nʻuju ha nime ịhụnaanya mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.
A na m ekwupụta ịhụnaanya m nwere maka Onyeisi Russell M. Nelson na ekele m maka mmetụta dị ịrịba ama o mewooro na onye ọ bụla niime anyị. Ma maka anyị niile, A na m ekele Chineke maka ichekwa na ibuli ndụ ọma nke Onyeisi Dallin H. Oaks.
Nʻafọ ọbụla na-agafe, A na m enwe ịhụnaanya ka ukwuu maka Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, na maka Aja mgbaghara mmehie obi ebere Ya. Aja Ya kachasị, iji nweta mmeri nʻebe ọnwụ na mmehie nọ, bụ onyinye kachas;i pụta ihè nke agụgụala mmadụ niile. Ịghọta onyinye Ya dị nsọ bụụrụ m nkuzi eluigwe mepere emepe nke ga-aga niihu nʻofe ili.
Ọmịiko siri ike ahụ nke Onye Nzọpụta nʻịgbaghara mmehie na nʻịgwọ ọnya niile nke mmehie niile nke ndị ọzọ kpatara bụ ngosipụta dị ebube nke ịhụnaanya nke Chineke.
Ọchịchọ m bụ inye olile anya maka ndị na-achọ mgbaghara maka mmehie niile dị oke njọ na ịkasi ndị na-achọ ọgwụgwọ obi site nʻọnya mgbu niile nke mmehie niile dị oke njọ nke ndị ọzọ kpatara.
Ọgwụgwọ na mgbaghara ka a na-ahụ nʻuju ha nime mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.
Okwukwe niime Jizọs Kraịst
Ọ bụrụ na i meela mmehie niile dị oke njọ ma bido usoro nchegharị ma ọ bụ nwee ọchịchọ ichegharị nʻụzọ zuru ezu ma nweta ọńụ nke mgbaghara nke enweghị atụ, biko mara na ọrụ ebube a na-eche gị. Onye Nzọpụta na-akpọ mgbe ọbụla, “Bịakwutenụ m.”
Na-ịgba okwukwe gị ume nime Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst, ga-emelite ọchịchọ nke mkpụrụ obi gị ị mara Ya, kwere na Ya, ma nyefee Ya obi gị. Ịnos jụrụ gbasara mgbaghara nke ya, “Onyenwe anyị, kedụ otu esi eme ya?” Onyenwe anyị zara ya, “N’ihi okwukwe gị n’ime Kraịst, onye nke ị nụtụbeghị olu ya ma-ọbụ hụtụ ya anya mbụ.”
Ma Moronaị gbakwunyere, “Ma ọbụrụ na unu ga-ewezuga onwe unu site nʼamaghị Chineke niile, ma hụ Chineke nʼanya jiri ike unu niile, echiche na ume, mgbe ahụ ka amara ya zuru-oke nye unu.”
Ichigharị site na mmehie, ichigharịkwute Chineke, na ịgba okwukwe gị niime Jizọs Kraịst ume bụ mmalite mara mma. Iji obi umeala na-edo onwe gị nʻaka Chineke gụnyere ịnakwere nnukwu mmehie niile nʻaka Bishọp ma ọ bụ Onyeisi ngalaba nta, mana mgbaghara gị zuru oke ga-esi nʻaka Onye Nzọpụta pụta. Mgbaghara bụ onyinye dị nsọ nke a na-enye site na amara nke Jịzọs Kraịst.
Ịkwụwa aka ọtọ
Ọchịchọ ịlaghachikwute Chineke nʻezie na-esonyere mkpebi siri ike ikwu eziokwu kpam kpam nye Nna gị nke Eluigwe, nʻebe onwe gị nọ, nʻetiti ndị ahụ e merụrụ ahụ, na ya na onye ndu ọkwa nchụaja gị. Nna gị nke Eluigweị na-enwe an̄ụrị nʻọchịchọ gị ịbịakwute Ya jiri obi tiwara etiwa na mmụọ nchegharị. Ị nwee mmụọ nke nchegharị bụ iji obi umeala na-etinye onwe gị nʻaka nke Chineke; inwe obi mgbawa na-eweta ihe Onye ozi Pọl kọwara dị ka “iru uju nke chineke,” ọchịchọ miri emi nke mkpụrụ obi ịlaghachikwute Ya nʻagbanyeghị ihe ọ ga-efu.
Na-ewghachi Ihe Mebiri Emebi
Ọ chịchọ gị na-eduga gị ịchọ ịmezi ihe ị ịgbajiri. Nʻagbanyeghị nke ahụ, ịmara na ụfọdụ ihe adịghị na aka gị imezi, ị na-ekpesi ekpere ike na Onyenwe anyị, site na amara Ya, ga-enya aka gwọọ ndị e merụrụ ahụ niihi nke omume gị niile.
Mmetụta niile nke mmehie niile dị oke njọ emere ndị ọzọ na-esikarị ike imeri. Ị na-agbaso ihe nlereanya ahụ nke ụmụ nwoke nke Mosaia, ndị ji “ọnụnụ ọkụ nʻobi na arụsị ọrụ ike na-achọ idozigharị mmebi ihe niile nke ha meworo”? Gwa ndị ị na-akwanyere ugwu okwu maka ihe ị na-adịghị ahụ anya.
Dị ka m na-akwado okwu a, E nwetara m email site nʻaka onye nọ na usoro nke nchegharị ma na-achọ ịlaghachi na Nzukọ nsọ. Nwunye mbụ ya ka nọ na ntaram ahụhụ site na ofufu “nke alụmdi na nwunye ebighị ebi [ha], {ihe isi ike na ụmụ ha}, ofufu nke ego nchebey, … enweghị [ike] ịkwado mmefu ego niile, [na] mmetụta na-egbu mgbu nke ịbụ onye a raara nye.”
Ọ gwara m ka onye ndu ọkwa nchụaja ya “ji nwee mmetụta [ịsị ya] ka o jiri ekpere tụlee ihe ọzọ [o nwere ike imere nwunye na ụmụ ya].” Site nʻikike enyere m, a ga m ekerịta otu akụkụ nke email ya:
“Ihe [mbụ] m chere bụ na [ego] m nyere nʻiwu ịgba alụkwaghịm ahụ karịrị akarị, ma onyeisi ngalaba nta m gbara m ume ka m buo ọnụ ma kpee ekpere banyere ya. …
“Na mbụ, agbasiri m ike nʻechiche nke nkwụghachi ọzọ. Ebe ọ bụ na mmehie m abụghị maka ego, E chere m ihe ‘nkwụghachi ụgwọ nʻụba’ pụtara nʻezie. … [mana] na oge nʻadịghị anya m chọpụtara na ọ bụghị naanị ihe gbasara ego.
“Ndị ndu ọkwa nchụaja m zutere [nwunye m mbụ] na ụmụ m ma wee chọpụta na ha ka na-adọga ma ha anatabe ọgwụgwọ .…
“Ebumnobi m nke ọhụru bụụrụ iji okwukwe gaa niihu. … Ekwupụtara m ọchịchọ inye aka nʻenweghị atụmanya ọ bụla agbakwunyere. … E kpebiri m [izipu nwunye m mbụ otu ego] site nʻụgwọ-ọnwa ọ bụla, nke bụ akụkụ dị ịrịba ama nke ụgwọ ọnwa m. Tupu m kwụọ ugwọ nke mbụ, Onyenwe anyị ahụ [mere ka m nwee mmasị nʻobi m na m kwesịrị] ịkwụ [okpukpu abụọ].
“A’ mụtala m na nkwụghachi abụghị naanị ego chọpụtara na ọ bụghị naanị gbasara ego. Ọ bụ maka iji obi umeala rara ndụ mnye Onyenwe anyị. … Ego ahụ bụ iji nye aka dochie ihe m napụrụ nʻaka ezinaụlọ m niihi nhọrọ m niile adịghị mma. Ọ bụ maka ime na idobe nkwa niile na-atụghị anya ihe ọ bụla na nkwụghachi ma nyere ya aka ka ọ ghara ichegbu onwe ya maka ụgwọ ego niile ka o nwere ike chọọ Mmụọ nsọ.”
Mgbalị gị iweghachi ihe ndị ị mebiri nwere ike o nweghị ihe jikọrọ ya na ego, mana ka ị na-eji obi umeala na-arịọ Onyenwe anyị, ị nwere ike ịhụ na enwere ihe ndị ọzọ ị nwere ike ime.
Nkwado Chineke site na Ogo niile
Ka ị na-achọ mgbaghara nke Onyenwe anyị, nwee ndịdị ka ị na-eche nkwado Ya nʻuju. Tulee uche na akwụkwọ nsọ nke a:
“Ha … wedatara onwe ha ala … nime omimi niile nke obi umeala; ma … tisie mkpu akwa ike nye Chineke; e, ọbụna ogologo ụbọchị niile. … [Mana] Onyenwe anyị emeghị ngwa n’ịnụ akwa ha niihi ajọọ-omume ha niile.”
“Otu o sila dị Onyenwe anyị nụrụ akwa ha niile, ma malite … ime ka ibu ha niile dị nro; … ma … ha inwe ọganihu site na ogo niile.”
Nwee ndịdị dịka Onyenwe anyị na-enye gị ngọzi na nkwado Ya site na ogo niile.
Nʻoge nke Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu Ya na-agwa gị, “Ka ihe ndị a ghara isogbu gị ọzọ.” Otu ụbọchị, ka ị na-aga niihu na-atụgharị gakwuru Onye Nzọpụta, Nna gị nke Eluigwe ga-ewepụ “ịta ụta ahụ site [nʻobi gị], site nʻịdị mma niile nke Ọkpara ya.”
Emerụrụ ahụ na Ntaram ahụhụ
Maka gị onye e merụrụ ahụ nʻụzọ na-ezighị ezi site na nnukwu mmehie niile nke onye ọzọ, ọ na-agụ agụ ikerịta ịhụnaanya na ọmịiko nke Onye Nzọpụta, nkasi obi na udo Ya.
Mwute ahụ ị nweworo, obi mgbawa, mfu ahụ, mmetụta na-egbu mgbu nke nraranye, ntụgharị nke ndụ gị dịka ị chere na ọ dị—A na m enye gị mmesi obi ike m zuru oke, Onye Nzọpụta maara gị ma hụ gị naanya. Gakwuru Ya. Ọ bụ nkasi obi na ume gị; Ọ ga-ezite ndị mmụọ ozi Ya ka ha bulie gị elu. Ole mgbe ihe mgbu gị ga-apụ, iru uju gị ebelata, chefuo ihe ncheta ndị a na-achọghị? A maghị m. Mana nke a ka m maara: O nwere ike i weta mma site na ntụ nhụjuanya gị.
Ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwanyị m hụrụ naanya nke ukwuu nke Grand Blanc, Michigan, jiri okwukwe ha na-adịghị agwụ agwụ niime Jizọs Kraịst, jiri obi ike na achọghị ọdịmma onwe ha, anatawo ma ga-enweta, niime izuụka na ọnwa niile dị niihu, nata nke ukwuu nke ịhụnaanya na amara nke Onye Nzọpụta na-enweghị atụ.
Ka ị na-aga niihu na-atụkwasị Ya obi, igwe ojii nke ọchịchịrị na iru uju gị nʻabalị ga-agbanwe ghọọ anya mmiri nke ọn̄ụ na udo nʻihè ụtụtụ. “A ga-eme ka Iri uju gị gbanwe bụrụ ọñụ. … Ma ọn̄ụ gị o nweghị {onye} ga-anapụ gị.” Oge ahụ ga-abịa. A na m agba-ama na ọ ga-abịa.
Ịhụnaanya aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst ka enwere ike chọta niime ọnọdụ niile ndị kachasị sie ike, mana anyị niile chọro mgbe niile amara mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta. Onyeisi Dallin H. Oaks akuziwo: “Niihi ahụmihe mgbaghara mmehie Ya nʻọnwụ, Onye Nzọpụta anyị nwere ike ịkasi obi, gwọọ, ma gbaa ndị nwoke na ndị nwanyị nʻebe niile ume, kama E kwere m na Ọ na-eme otu ahụ naanị maka ndị na-achọ Ya ma rịọ maka enyemaka Ya. Onye Ozi Jemis kuziri, ‘Wedanụ onwe unu ala niihu Onyenwe anyị, ma ọ ga-ebuli unu elu’ (Jemis 4:10). Anyị na-eru eru inweta ngọzi ahụ mgbe anyị kwere na Ya ma na-ekpe ekpere maka enyemaka Ya.”
Okenye Robert E. Wells
E nwetara m ikike site nʻaka ezigbo enyi m na onye Ji Ikike Zuru ọha emeritus, Okenye Robert E. Wells, dị afọ 97 ugbu a, ịkọ nhumiihe ya nke ihe karịrị afọ 60 gara aga:
Mgbe o bi na Paraguay nime afọ 1960 ma na-arụ ọrụ dị ka onye na-elekọta ụlọ akụ na mba ụwa, Robert Wells, mgbe ahụ ọgbara afọ 32, ma nwunye ya, Meryl, onye ọ bụla bụ onye na-anya ụgbọelu nʻụgbọelu abụọ dị iche iche, si Uruguay na-efega Paraguay. Mgbe ha zutere nnukwu igwe ojii, Robert na Meryi enwetaghị kwa mmekọ ịhụ ụzọ na redio. Robert rutere nʻala ngwa ngwa, bụ ebe ọ matara nʻụzọ dị mwute na ụgbọ elu nwụnye ya kpọkasịrị. Ma nwụnye ya ma ndị enyi ya abụọ so ya na-efe efe nwụrụ. Ụmụ ya, nọ nʻụlọ na Asunción, dị afọ asaa, ise, na abụọ.
Okenye Wells kwuru maka iru uju ya:
“Okwu a gaghị ezu ruo mgbe ebighị ebi nʻigosipụta ihe mgbu nke zara nime m, na-erichapụ mmetụta uche m niile ma kpọnwụọ ahụ m niile. Anya mmiri miri emi nke iru uju agaghị akwụsi ịwụ. Nke ka njọ, ka uche m na-agbalị inabata mmetụta dị egwu nke ọnwụ nwụnye m, ebidoro m nwenwe nnukwu obi amamikpe na ọ bụ m kpatara ihe mberede ahụ.”
Robert boro onwe ya ụta maka na o nyochaghị ụgbọ elu ahụ nke ọma na kwa na o nyeghị nwụnye ya ntụziaka kaa mma maka ife ụgbọ elu. O chere na ya nwere amamikpe nke nleghara anya.
Robert kwuru:
“Uche m banyere nʻọchịchịrị.… Ọ dịghị ihe m dị ndụ eme—{maka hiihi ụmụaka,} ọbụghị maka ihe ọzọ.”
“E … nwekwaghị m ọchịchọ ịga niihu.”
Ka oge na-aga, e jiri ahụmihe ime mmụọ gọzie Robert. Ọ kọrọ:
“Otu mgbede, ihe dị ka otu afọ mgbe emesịrị, ka m gburu ikpere nʻala nʻekpere, otu ọrụ ebube mere. Mgbe m na-ekpe ekpere ma na-arịọ Nna m nke Eluigwe, ọ dị m ka a ga-asị na Onye Nzọpụta bịara nʻakụkụ m ma anụrụ m olu na-ekwu okwu ndị a na mkpụrụ obi m na ntị m: ‘Robert, aja mgbaghara mmehie m kwụrụ ụgwọ maka mmehie gị niile na mmejọ gị niile. Nwụnye gị na-agbaghara gị. Ndị enyi gị na-agbaghara gị. A ga m ebupụ ibu gị. …’
“Site na mgbe ahụ, ibu nke ikpe ọmụma [na obi nkoropụ] ka ebupụrụ m nʻụzọ dị ịtụnaanya. A napụtawo m! A ghọtara m ozugbo ike nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta na … ka o si emetụta m ozugbo. … E … nwetara m ihè na ọńụ dịka m na-amabughị. … E nyewo m onyinye nʻefu —onyinye Onyenwe anyị nke amara. … Ekwesighị m inweta ya—E meghị m ihe ọ bụla inweta ya, kama O nyere m ya nʻagbanyeghị.”
Ụmụnne nwoke na nwanyị, ka onye ọbụla niime anyị “nweta nsacha niime Kraịst site nʼamara nke Chineke, site nʼịkwafu ọbara nke Kraịst, … [ịdị] nsọ, na-enweghị ntụpọ.”
A na m agba ama nke ịhụnaanya, ebere, na amara nke Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị. Ọ dị ndụ. Anyị bụ nke Ya; anyị bụ ụmụ nke ọgbụgba-ndụ ahụ. Dịka anyị kwere niime Ya, soro Ya, ma tụkwasị Ya obi, Ọ ga-ebuli anyị site na mwute na mmehie anyị niile. Mgbe ahụ, ị gafere ndụ nke ịnwụ anwụ nke a, niime ụlọ nke Nna anyị, anyị na Ya ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.