Onyinye Ebighị ebi nke Ama
Nwa nwoke ma ọbụ nwa nwanyị nke Chineke ọ bụla nwere ike nwetakwuo ihe ọmụma miri emi, nke kwu chịm na nke eziokwu nye onwe ha.
Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, na nso nso a anọwo m na-atụ uche nʻeziokwu atọ dị ike sitere na Mweghachite. Eziokwu ndị a agọziwo ndụ m nke ukwuu. Taa, ọ ga-amasị m ikesara unu otu eziokwu ndị siworo duo m na njem mụ ruo nʻezigbo akaebe nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
1. Chineke Bụ Nna nke Eluigwe Anyị Hụrụ naanya
Ọ maara ihe niile ma nwere ike niile. Site na Ìhè nke Kraịst na ndakwasị nke Mmụọ Nsọ, ike mmetụta Ya dị ebe niile. Ọ bụ ihe dị nọdịdị Ya ịgọzi anyị.
Ọ na-ahụ oge anyị gara aga, nke ugbu a, na akaraka ebighị ebi anyị. Ọ dịghị ihe a pụrụ izoro Ya.
Oku Onyeisi Russell M. Nelson kpọrọ “iche seleshial” na-agba anyị ume ịn̄ọmi uche na ọdịdị nke Nna anyị nke Eluigwe.
Niihi omume Ya niile sinachi, Nna anyị nke Eluigwe na-enye anyị onyinye niile dị mma, nke ọbụla buru echiche na uche ebighị ebi Ya nʻobi.
2. Ohere nhọrọ Bụ Onyinye nke Ịhọrọ ma Mee ihe nke Onwe anyị
Ọ bụkwa oke na ọrụ ịhọrọ nke ọma.
Jizọs Kraịst kwụrụ ụgwọ kacha maka ohere ahụ iri ọbara Ya dị oke ọnụ ahịa.
Mgbe ụfọdụ anyị nwere ike kwere na ohere nhọrọ pụtara ime ihe ọbụa nke anyị chọrọ. Mana ebe ọ bụ na akwụrụ ụgwọ ahụ pụtara na ohere nhọrọ bụ onyinye dị nsọ.
Anyị bụ ndị ọrụ, ma ndị ọrụ nwere oke na ọrụ maka ihe. Nʻokwu nke a, anyị nwere oke na ọrụ maka nhọrọ niile anyị na-eme nke dabere na mmata ihe anyị nwere na onyinye niile enyere anyị. Anyị apụghị ime nhọrọ na-abụghị na anyị nwere oke na ọrụ maka nsonazụ ya.
Gịnị kpatara anyị jiri nwee ohere nhọrọ?
Ime nhọrọ ọma.
Ịhọrọ Kraịst.
3. Ama Anyị Na-abịa Site na Ike nke Mmụọ Nsọ
Akaebe sitere nʻaka Mmụọ Nsọ karịrị ihe a hụrụ anya. Ọ bụ onye akaebe kacha nke Nna na Ọkpara ahụ. Onyeisi Nelson kuziri “N’ụbọchị ndị n’abịa abịa, ọ gaghị ekwe omume ịnya ndụ ime mmụọ na-enweghi nduzi, ntuziaka, nkasi obi na mmetụta nke Mmụọ Nsọ na-adịgide.”
Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ihe a bụ ihe kpatara anyị otu otu nwere mkpa ike nke Mmụọ Nsọ taa.
Ama sitere na Mmụọ Nsọ pụrụ ịbịa site nʻụzọ dị iche iche. Dị ka ọwarị ọkụ dị nʻọnụ ụlọ gbara itiri, o nwere ike ịgbanye nʻụzọ dị egwu na nʻotu ntabi anya. O nwere ike ịbịa dị ka anyanwụ ntakịrị ntakịrị na mgbe oge gasịrị. O nwere ike ịbịa dị ka ụzarị ọkụ, na-egosiputa ugboro ugboro nye mmata ihe na-enweghị ntụpọ. Ihe ọbụla ụzọ ahụ bụ, ihe dị mkpa bụ na ọ na-abịa site na Mmụọ Nsọ.
Ịchọta Ama niime Jamaica
Etolitere m nʻọmarịcha Jamaica; ọ bụụrụ ihe ọn̄ụ na ịtụnaanya. Kosiladị, mgbe m malitere ụlọakwụkwọ sekọndịrị, ụfọdụ ndị otù klass m na ndị enyi ndị enweghị ike aghọta mkpebi m ịghọ onye otù nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. “Kedụ otu ị ga-esi esonye nzukọ ahụ?,” ka ha jụrụ. Kedụ otu ị ga-esi ekwere akụkọ ahụ?”—na-arụtụ aka na Ọhụ nke Mbụ “Gịnị mere i ji agụ akwụkwọ ahụ?”—nʻekwu maka Akwụkwọ nke Mọmọn. “I kwenyere nihe niile ndị ahụ nʻezie?” Na “Gịnị kpatara i jiri na-atụfu ndụ gị?”
Ọ bụ ihe na-afụ ụfụ, kacha nke mgbe ọ bịara site nʻaka ndị m hụrụ naanya.
Mana ihe ha na-amaghị bụ nke a: enwere m rịị nhụmiihe mụ na Mmụọ Nsọ. Dị ka ama ahụ juputara m nobi, ọ belatara mgbu nke ụbọchị niile, ma “na nke nke oge, ihu eluigwe [pụtara ihè] nʻihu m.”
Elemaanya ajụwo gị ụfọdụ niime ajụjụ ndị a. Elemaanya ọbụna ugbua a na-ajụkasị gị ahụ dị ka emere m.
Onyinye na akaebe nke Mmụọ Nsọ dị adị nye onye niile.
Jamaica dị mụ dị ka Palmyra dịịrị Josef Smith. Ọ bụ Ọdọ osisi m Dị Nsọ. Amaghị m ebe ọ bụ kpọmkwem Josef sekpuuru ala ikpe ekpere niime Ọdọ otu ụdị osisi Dị Nsọ, mana ama m kpọmkwem ebe mụ onwe m nọ mgbe Ọdọ otu ụdị osisi Dị Nsọ bịara bụrụ eziokwu. O mere na Four Grove Road, Mandeville, Jamaica, niime ọnụ ụlọ ịsa ahụ m, nelekere 6:00 ụtụtụ na Wednesday afọ atọ baptizim mụ gasịrị. Nhụmiihe nke a dị nsọ mere niihi na izu ụka abụọ isimbụ nwanne nwanyị mgbasa ozi ọma nwere mmụọ mkpake kpọkuru m ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn. Nwanne nwanyị Audrey Krauss nọ nʻọgbakọ nke a taa ya na ezi na ụlọ ya, ma ahụrụ m ya naanya ruo ebighị ebi.
Nhụmiihe ahụ gbanwere m.
Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, anaghị enye ama maka ojiji otu mgbe. Onyinye nke a sitere nʻaka Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnaanya bụ nke kwesịrị ịdị ebighị ebi niihi n onye na-enye dị ebighị ebi. Ama ekwesịghị inwe ụbọchị mmebi. O kwesịghị ịda mba ma ọ bụ belata niihi na otu ihe na ndụ m gbanwere ma ọ bụ otu ihe niime ụwa gbanwere. O kwesịrị isikwu ike niihi na, dị ka onyinye chi nwa odibo niime ụkabụilu nke onyinye chi, ama nke onwe m bụ onyinye aga amụbanye—ọbụghị ili ya.
ileghachi anya azụ nʻụbọchị niile nke mnwale na mkpagbu ndị ahụ rara ahụ nke m gabigara dị ka nwata enyeworo m aka rute ebe m nọ ugbu a maka onwe m. Ọ bụghị naanị na m kwere, nwee olileanya, ma ọ bụ nwee ntụkwasị obi, ọbụna na-agbanyeghị ndị a bụ irighiri ihe bara uru nke okwukwe nʻụzọ ruo ezigbo akaebe. Ana m aja unu maka ime ụzọ nke onwe unu site nʻịjụ ajụjụ niile, ịmụ ihe, ikpe ekpere, ibu ọnụ, na itule uche. Biko akwụsịkwala. O ruru mgbalị niile iji chụọ ụzọ nke rutere ebe ama nọ. Onye ma ọ bụ gịnị ka ị ga-ekwe iwepụ nke ahụ? “Olee akaebe dị ukwu karịa ka i nwere ike inwete site n’aka Chineke?”
Nwa nwoke ma ọbụ nwa nwanyị nke Chineke ọ bụla nwere ike nwetakwuo ihe ọmụma miri emi, nke kwu chịm na nke eziokwu nye onwe ha. Dị ka Josef Smit, onye kwadoro ama ya na-agbanyeghị mmegide, anyị nwere ike ikwu nobisike, “A maara m ya, a makwaara m na Chineke maara ya, ma apụghị m ịgọnarị ya, nke m gaara anwa ime ya.”
Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, kwe ka ntakịrị mkpụrụ akụkụ nke ama rụọ ọrụ niime unu tutu ruo ya etolite ruo ezi mmata mgbe ebighị ebi ihe dị ebube
Ọ bụrụ na i mewo baptizim ma anabata gị dị ka ndị otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a mana ka na-adọlị na “Ejighi m nʻaka ma ọ bụ na m ma,” biko cheta nkwa nke a dị niime ekpere oriri nsọ: “Na ha ahaghị inwe Mmụọ ya ịnọnyere ha.” Niihi nkwa nke a, onye ọbụla niime anyị nwere ike gaa nụzọ nke ọgbụgba ama na mmata ihe siri ike.
Lekọta Ama Gị
Ugbu a nke a bụ nnukwu eziokwu: Nʻụzọ nke ọbụla esi gbaa ama—ma ọ bụ na-asachawo ya dị ka ọwụwa anyanwụ ma ọ bụ na-abịa nʻọhụ dị ebube—ọ ka na-achọ nhọrọ iji nata onyinye nke a dị oke ọnụ ahịa.
Ikwu “A họọrọ m ikwere” na-eme ya adị mfe ịnata akaebe site nʻaka Chineke. Ọ bụrụ ma anyị hụta na ama anyị na-ada mba, cheta na ọ bụ nhọrọ niile anyị na-eme na-ebelata ike nke ama ahụ. Mana ama ahụ enwebeghị ebe ọ gara. Ihe anyị na-achọ bụ naanị ịhọrọ ijikọtagharị anyị na ya.
Ịhọrọ ikwere bụ ụzọ dị mma ma dị ike itinye ohere nhọrọ anyị nʻọrụ.
Enweghị m ike ịhụta ụzọ katụ mma iji ohere nhọrọ m karịa ichekwa ama m.
Onyeisi Nelson kuziri: “Ana m arịọ unu ilekọta ama unu. Rụọ ọrụ maka ya. Nwe ya. Lekọta ya. Zụlite ya ka o wee nwee ike too eto. Were eziokwu zụọ ya.”
Nye mụ onwe m, mkpụrụ okwu na-elekọta, rụọ ọrụ, lekọta, nwere, zụọ ọzụzụ, na inye nri na-ada dị ka ihe eji arụ ọrụ enyere iwu inye nkọwa maka ihe dị oke ọnụ ahịa ma dị mkpa.
Na Nzukọ isimbụ, Parley P. Pratt weere Onye amụma Josef Smith iwe ma họrọ ikwutọ ya na Nzukọ nsọ. Mgbe Jọn Taylor onye Parley kuziiri ozi ọma bịara obodo, Parley kpọpụrụ ya nʻakụkụ ma dọọ ya aka na ntị ka ọ hapụ isoro Josef. Jọn Taylọr gwara Parley:
“Tupu gị ahapụ Kanada, ị gbara ama siri ike nye Josef Smith onye bụ onye amụma nke Chineke, … ma i kwuru na gị maara ihe ndị a site na mkpughe na onyinye nke Mmụọ Nsọ.
“… Ugbu a enwewo m otu ụdị ama ahụ nke i n̄ụrịrị ọn̄ụ na ya. Ọ bụrụ na ọrụ ahụ bụ eziokwu ọnwa isii gara aga, ọ bụ eziokwu taa. Ọ bụrụ na Josef Smith bụ onye amụma mgbe ahụ, ọ bụ onye amụma ugbu a.”
Ana m agba ama na Josef Smith bụ onye amụma nke Chineke ma na ọkwa amụma ọ natara na-aganiihu taa. Jizọs Kraịst na-eduzi ọrụ nke a.
Ana m akpọku unu iche echiche banyere ụzọ gị iji ruo akaebe siri ike nke Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya. Lekọta ama gị; jiri ohere nhọrọ gị nke ọma ma nakwere onye na-enye na njirimara Ya niile dị ebube. Ana m agba akaebe na ike ahụ nọ niime gị. Ọ dịghị onye nwere ike ịhọpụtara gị. Ọ dịghị onye nwere ike ịnapụ onyinye nke a. I nwere ike họrọ ikwere.
Ana m ekwe nkwa na dị ka unu na-eme nke a, ama gị ga-abụ “olulu mmiri nke mmiri dị ndụ, na-asọpụta ruo ndụ ebighị ebi.” Ọ ga-abụ ihe nkedo na ihe mkpali, ma ọ ga-akwado unu site nʻoge niile rara ahụ. Ọ ga-enye gị ike ịzụlite onyinye ime mmụọ niile. Ọ ga-enyere gị aka nije ozi nlekọta na ije ozi nke onwe gị. Ọ ga-abụ ngwa ọgụ megide Setan na ndị iro gị niile. Ama gị ga-abụ ihe ọn̄ụ dị ka ị na-ahụ ya nʻụmụ gị, ụmụ ụmụ gị, na ụmụ ụmụ ụmụ gị na niime ndị ahụ unu hụrụ naanya ma nʻejere ozi. Ọ ga-adị ike mgbe unu na-ekesa ya ma na-eji ya gbaa ama.
Ọ bụrụ na unu ma, unu ma. Ama m na m ma. Anyị ka chọkwuru akaebe niile siri ike nke Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya. Ruo ebe ahụ! Chọọ ya! Ọ dị ngwa ngwa! Nke a bụ ọgbọ nke ikpeazụ—ọgbọ nke uju oge niile.
Jizọs Kraịst mara ọkwa eziokwu nke a: “Eluigwe na ụwa ga-agafe, mana okwuọnụ m agaghị agafe.”
Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ama nke Jizọs Kraịst enweghị mgbe o ji bụrụ onyinye otu mgbe. Enweghị ihe banyere ya na-eme naanị ugbu a—ọ bụghị onye na-enye, ọ bụghị onyinye ahụ nʻonwe ya, ọ bụghị onye na-enyeru onyinye ahụ, ọ bụghị onye onyinye ahụ bụ banyere ya. Ka ama unu bụrụ ihe akọwara nʻotu ụdị ụzọ ahụ. Na-agbanyeghị “eluigwe na ụwa ga-agafe,” ama gị na akaebe gị nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst agaghị agafe. Ugbu a bụ oge ijigide nʻonyinye nke a dị oke ọnụ ahịa. Nʻaha Jizọs Kraịst, amen.