Ọgbakọ Zuru ọha
Jizọs Kraịst na Mmalite Ọhụrụ Gị
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


14:19

Jizọs Kraịst na Mmalite Ọhụrụ Gị

Anyị nwere ike inwe mmalite ọhụrụ site na, ma niihi nke, Jizọs Kraịst. Ma gị nwa.

Nkwuwa okwu nke Akwụkwọ nsọ: Jizọs Garaniihu Na-eme Ihe Dị mma

Jizọs “garaniihu na-eme ihe dị mma.” Anyị na-agụ nkọwapụta ahụ dị mfe niime akwụkwọ nke Ọlụ. Lee ụdị okwu nnukwu nkwuwa okwu nke ahụ bụ. Jizọs nʻezie garaniihu na-eme ihe dị mma! Ọ bụ isi kacha mkpa—na nsipụta—nke ịdị mma! Ọ ranyere ndụ anụ ahụ Ya dum ịdị na-eme ihe dị mma. Ọ dị “obi ebere ma dị amara, ogologo ntachi obi, ma juputa” nʻịdị mma nenweghị ọgwụgwụ na ebere na-adịgide adịgide.

Mnwale ọbụla ịkọwa ma ọ bụ ịchịkọta ịdị mma na ebere Ya ga-abụ okwu ebelatara ebelata. Nʻezie, dị ka Onye Ozi Pọl gbalịrị ịkọwa, ọ bụrụ na anyị naara anwa idekọ ngosipụta ọbụla nke ịdị mma nke Onye Nzọpụta, “ọbụna ụwa nʻonwe ya agaghị ebuteli akwụkwọ niile nke aga ede.”

Jizọs Kraịst Na-enye Onye Ọbụla Niime Anyị Mmalite Ọhụrụ

Ọmụmaatụ kpọmkwem ndị anyị na-eme ka e denyeworo niime akwụkwọ nsọ maka Jizọs na-aganiihu “na-eme ihe dị mma” na-akpali egwu na ịtụnaanya, nke ka nke mgbe anyị na-atule nezie ihe ọ gaara adị ka ya ịnọ ebe ahụ, ịgba akaebe ọrụ ebube Ya niile, ịnata nkuzi Ya niile, na inwete nhụmiihe ọgwụgwọ Ya. Ya na ndị achụpụrụ nihu ọha kwuru okwu, Ọ metụrụ ndị ọrịa na ndị na-adịghị ọcha O wetere nkasi obi nye ndị ike gwụrụ, Ọ kuziri eziokwu na-atọhapụ mmadụ, ma Ọ kpọkuru ndị mmehie ichegharị. Nye onye ekpenta ọbụla, onye kpuru isi, na nwanyị na-akwa iko; nye onye ngwọrọ, onye ntị chiri, na onye ogbu; nye onye nne na-eru uju, onye nna obi dara mba, na nwanyị isi mkpe na-eru uju; nye ndị a mara ikpe, onye emechuru ihu, na onye na-ata ahụhụ; nye onye nwụrụ ọnwụ anụ ahụ na ọnwụ ime mmụọ, ihe O mere bụ inye mmalite ọhụrụ. Ee, nkwuwa okwu ọzọ na-adajọgharị!

Ihe niile O kwuru ma mee wetere mmalite ọhụrụ maka onye ọbụla nke Ọ gwọrọ, gọziri, kuziri, ma gbaghara mmehie. O sighị nʻetiti ha pụọ, ma Ọ nweghị ike nʻezie apụ site nʻebe unu nọ. Tulee nʻoge nke a ịnụrụ okwu ọbụla niime ndị a na-enye ndụ sitere na Ya:

“Nwa m, agbagharawo gị mmehie gị.”

“Nwa agbọghọ nta, asị m gị, kulie.”

“Dịrịkwa ọcha.”

“Ọ bụghị ma m na-ama gị ikpe: gaa, ma emehiekwala ọzọ.”

“Nwa m nwanyị, nwere ezi nkasi obi: okwukwe gị azọpụtawo gị; laa n’udo.”

Okwu niile nke Onye Nzọpụta nye ndị mmadụ ndị a dịịrị nke nke, mana jiri ha O tere agba ịhụnaanya ọhụrụ buru ibu nke mgbaghara, ọgwụgwọ, mweghachite, udo, na ndụ ebighị ebi. Ma ozi abụ dị ebube bụ Ọ na-enye otu ụdị mmalite ọhụrụ nye mụ na gị. Anyị nwere ike inwe mmalite ọhụrụ site na, ma niihi nke, Jizọs Kraịst. Ọbụna gị onwe gị. Mmalite ọhụrụ niile nọ nʻisi atụmatụ nke Nna maka ụmụ Ya. Ebe a bụ nzukọ nsọ nke mmalite ọhụrụ niile! Ebe a bụ nzukọ nsọ nke mbido niile dị ọhụrụ!

Nke a Bụ Nzukọ nsọ nke Mmalite Ọhụrụ niile

Jiri baptizim na mmiri na Mmụọ, “a mụrụ anyị ọzọ” ma nwere ike “ije ije nʻịdị ọhụrụ nke ndụ.” Olileanya ha ka gịnị ka mmalite ọhụrụ ahụ na-ewetere onye azọdara nokpuru ibu arọ nke mmehie ma ọ bụ tara ahụhụ site na mmetụta niile nke ndụ nwere nsogbu na mmekọrịta na-enweghị isi? Jizọs enweghị mkpa mgbaghara nke mmehie nʻonwe Ya ma ọ bụ mbido ọhụrụ na ndụ, otu ọ dị e mere Ya baptizim, na-egosi anyị nʻụzọ dị elu ụzọ ruo mmalite ọhụrụ O rọpụtaworo maka onye ọbụla niime anyị.

Ma mmalite ọhụrụ anyị anaghị eme nnọọ otu mgbe. Anyị na-echekarị na baptizim anyị bụ otu ụzọ naanị nke mmalite ọhụrụ. Ọ bụghị ya. Anyị enweghị naanị otu ohere. Mmalite ọhụrụ ndị a nwere ike ime ụbọchị niile! Ma nezie izu ụka ọbụla dị ka anyị na-eri iberibe achicha ma n̄ụọ obere iko mmiri na ncheta nke onyinye nke Onye Nzọpụta anyị zuru oke, onye nwụrụ niihi ebumnuuche doro anya nke inye anyị ka ha bụ ọtụtụ mmalite ọhụrụ dị ka anyị na-achọ! Jizọs na-enye anyị ka ha ra bụ ọtụtụ mmalite ọhụrụ dị ka anyị na-achọ.

Jiri nranye na ntachi obi niime mkpebi ruo na ndụ ọhụrụ niime Kraịst, anyị nwere ike ịghọ “ihe ekere eke ọhụrụ,” ebe ihe ochie niile ga-agabiga ma ihe niile adịrịzie ọhụrụ. Kedụ mgbagha ụdịrị ụtụtụ ọhụrụ ahụ na-ewetere mkpụrụ obi onye na-aganiihu na-agba mbọ, site nʻịhọrọ esepụghị aka okwukwe niime ike nke Onye Mgbapụta iji gwọọ ma weghachite, na-agbanyeghị ndọlaazụ ọjọọ niile nke ibi ndụ niime ụwa dara ada? Onye Nzọpụta enweghị mgbe Ọ hapụrụ mkpebi Ya imejuputa uche nke Nna ma mezuo ozi mgbaghara mmehie Ya si nʻigwe, ọbụna site nʻihe mgbu nke mere Ya a maa jijiji, gbaa ọbara site nʻoghere ọbụla, taa ahụhụ anụ ahụ na mmụọ, na ikpe ekpere ka enwee ike wepụ iko ilu ahụ. Ọzọkwa, Ọ nọ na-egosipụtara anyị ihe nnagide nʻikwesị ntụkwasị obi yiri ka ya.

Jiri ọgbụgba ndụ nke ọbụla anyị na-eme ya na mbọ ọbụla anyị na-etinye iji debe ya, anyị nwere ike nata “obi ọhụrụ” ya na atụ nke “mmụọ ọhụrụ” juru karịa. Obere obere, ka anyị na-akpọku ịdị mma Ya niime obi anyị ma chụpụ olu niile ndị na-emeri onwe dị niime isi anyị, anyị na-aghọ ndị Ya niihi na anyị nʻezie na-eme Ya Chineke anyị. Jizọs na-achọsi ike ịbụ Eze anyị na Onye ọzụzụ atụrụ anyị na Eze Udo anyị, ma anyị nwere ike họrọ ime Ya otu ahụ niime obi na echiche nke onwe anyị.

Mmalite Ọhụrụ Nʻotu Anyị Si Ahụta Nchegharị

Nchegharị na-emepe ọnụ ụzọ ruo mmalite ọhụrụ anyị niile, mbido ọhụrụ niile, na ohere nke abụọ niile. Nkuzi niile nke ezi Onyeisi Russell M. Nelson anyị emewo ka echiche ndị na-ezighị ezi banyere onyinye nke nchegharị sinachi doo anya, ma ana m eche na anyị ebidowala nʻikpeazụ ịnabata ya.

Ọ na-atọ ụtọ ịnụ ndị ntoroọbịa anyị na-akọwa ihe nchegharị pụtaara ha. Nso nso a anụrụ m otu nwainyom kwuru, nʻihu ọchị na mbara ihu ya, “Mgbe m na-eche maka nchegharị, nchegharị kwa ụbọchị, ana m enwete ọn̄ụ na olileanya dị ịtụnanya. Ana m enwete mmetụta ịhụnaanya na obi ụtọ nke Nna m nke Eluigwe na Onye Nzọpụta m. Egwu anaghị atụ m ịbịakwute Nna nke Eluigwe nʻekpere ma rịọ maka enyem aka Ya jiri ihe ọbụla nke m na-agba lịka lịka ya. Ana m na Ha anaghị achọ ijide m mgbe m na-eme ihe ọjọọ. Ogweaka Ha ghe oghe. Nke a bụ nchegharị nye m,” ka o kwuru. Nwainyom nke a ghọtara na niihi Jizọs Kraịst, o nwere ike inwe mmalite ọhụrụ!

Mmalite Ọhụrụ maka Onye Niile, Oge Niile

I nwere mkpa mmalite ọhụrụ? I nwere ike ibidogharị ọhụrụ, ọbụna gị nwa? Chee banyere ndị ahụ Onye Nzọpụta jeere ozi nlekọta nye—ndị ahụ Ọ kuziiri, gwọro, kpọlitere, gbaghaara, na ndị O weghachitere. Ọ naara ahọrọ ha site na otu klas mkpata ego ma ọ bụ otu ọzụzụ kpọmkwem? Ọ naara amata ọdịiche nʻetiti ndị ezi omume na ndị juputara na mmehie? Ọ naara elekwasị anya nʻotu onye niihi na ha toruru karịa ma ọ bụ ka a hụrụ naanya karịa? Mba.

Ụfọdụ bịakwutere Ya na nnukwu okwukwe, kwere nike Ya iji gwọọ—dị ka nwanyị ururo ọbara, senturịọn Onye Rom onye nwa odibo ya nọ nʻọnụ ọnwụ, onye ekpenta, Jarus, na Batimọs kpuru isi. Onye ọbụla niime ha tinyere okwukwe nʻọrụ, na-atụ anya na ịdị ma na ike nke rabaị ahụ sitere Nazareth ga-agbanwe ndụ ha na ebumnoobi ha. Ma O mere. O kwere ka ọgwụgwọ Ya wụpụta.

Mana Jizọs gọzikwara ndị ahụ nwere okwukwe na-ama jijiji, dị ka nna nwa ahụ na-arịa ọrịa onye tiri oke mkpu, ikekwe dị ka i meworo, “Onyenwe anyị, E kwere M; nyere ekweghị ekwe m aka.” Ma ọbụna ọ wụpụtara ọmịiko nʻisi ndị ahụ ndị na-achọtụbeghị Ya ma ọlị, dị ka nwanyị ahụ ejidere nịkwa iko, nwanyị isi mkpe nke Nain, nwoke ahụ nke nwere nkwarụ dị na pool nke Betesda, na nwoke ahụ kpuruisi mgbe a mụrụ ya. I nwetewo mmetụta na Ọ na-aganiihu na-eme ihe dị mma niime ndụ gị ọbụna mgbe ị na-adịghị achọ Ya ma ọ bụ na-esoro Ya.?

Nye onye nke ọbụla akpọrọ aha niime akwụkwọ nsọ, na nye ndị niile ndị ga-ege ntị ma zaghachi, O nyere mmalite ọhụrụ, ma ọ bụ ndụ agbaghara mmehie ma ọ bụ ndụ ọhụrụ agwọrọ ọrịa, ma ọ bụ ndụ ọhụrụ akpọlitere site nʻọnwụ.

Gịnị ka nke a pụtara nye mụ na nye gị? Ịdị mma na ebere na obi ọma Ya dị ịhụnaanya adịghị akpa oke. Mmalite ọhụrụ niile nọ nʻisi atụmatụ nke Nna maka ụmụ! Mbido ọhụrụ niile bụ ozi nke Ọkpara ahụ! Chi ọbụbọ niile, isi ihe ọhụrụ niile, na ohere ọhụrụ niile bụ isi ozi dị mma nke ozi ọma!

Ya mere, ị pụwo apụ ogologo oge site nʻọgbụgba ndụ gị ịnata mmalite ọhụrụ? Mba. I mewo nke a ma ọ bụ nke ahụ ọtụtụ oge ka enye ya ohere ọzọ? Mba. Ị gawo nʻebe dị anya site nʻebe Kraịst nọ maka Ya inyere gị aka dee akụkọ ọhụrụ site ugbu a gawa? Mba. Onye iro bụ onye na-erite site na nchepụta nke i mikpuru niime ya. Ọ bụghịsọ unu onwe unu so.

Ma mmalite ọhụrụ niile bụ maka karịa naanị mmehie na njehie anyị niile. Site na ịdị mma na amara nke Onye Nzọpụta, anyị nwere ike nwee ebe mbido ọhụrụ nke na-akpọpụta mgbanwe niime echiche ochie, agwa ọjọọ, àgwà mkparị, omume ndị na-adịghị mma, mmetụta nke enweghị ike ọbụla, na echiche niile nke ịta ndị ọzọ ụta ma zere oke na ọrụ nke onwe. I nwere ike nʻeziokwu gbanwee ọtutụ ihe banyere onwe gị nke nọ na-adọda gị ala ruo ọtụtụ afọ. I nwere ike bido ọzọ site na ume nke Onyeisi mmalite ọhụrụ Ike anaghị agwụ ya agwụ inye anyị mmalite ọhụrụ niile.

Nye ndị ahụ na-agba lịka lịka nʻotu ụdị mmehie ma ọ bụ otu ụdị mkpọghachi azụ ugboro ugboro, na-aganiihu. O tinyeghị ihe mgbochi nʻụzọ niihu gị. O tinyeghị ókè nʻohere nke abụọ gị niile. Na-aganiihu. Gị na-agbakwu mbọ. Gị na-achọ enyemaka site nʻaka ndị gbara gị gburugburu. Ma ị tụkwasịrị obi na mmalite ọhụrụ nke nọ ebe ahụ maka gị mgbe ọbụla ị laghachikwuru Nna gị nʻezi obi. Hapụ nʻazụ gị mmuke ama ama eme, mmegharị ụkpọrọ niile, na nnupụ isi mpako juru nʻebe ha sonyere. Ị kwesighi ịbụ onye ị bụbuuru na mbụ. Nabata mbido ọhụrụ gị, ohere nke abụọ ma ọ bụ nke atọ—ma ọ bụ nke ugboro otu narị—enyere gị site nʻọbara mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.

Obi dị m ekele fere nkọwa maka mmalite ọhụrụ niile enyeworo m na maka ndị ahụ aka ga-enye m.

Nchịkọta

Onye Nzọpụta anyị kwuputara otu nkwuwa okwu ikpeazụ, nke ewezuga ya agaraghị enwe ihe ga-akpata olileanya ma ọ bụ n̄ụrị ọn̄ụ nʻụbọchị anyị a. Mgbe mgbu niile nke Getsemani na na mmechi nke obe ahụ na-ata ahụhụ, naanị ihe Ọ kwuru bụ, “Ọ gwụsiwo.” Amụma nke ịbụ Mezaya ka emejupụtara, ma uju ụgwọ eji maka mmehie na ntaram ahụhụ nke ụmụ mmadụ ka akwụrụ. Ọ mara ọkwa aja Ya na-enweghị ọgwụgwụ na nke dị ebighị ebi “gwụsiwo”. Otu ọ dị Aja mgbaghara mmehie Mgbaghara Ya agaraghị ezu oke tutu ruo Ya Onwe Ya agabiga ndụ ọhụrụ nʻụbọchị nke atọ, mmalite ọhụrụ ahụ, dị ka onye dị ebube, bilitere nʻọnwụ site nʻike nke Nna.

Niihi na Ọ na-emekarị ihe ndị ahụ nke masịrị Nna Ya, ma niihi na Ọ “gabigara uche nke Nna nʻihe niile,” mụ na gị pụrụ inwe mmalite ọhụrụ. Biko nara mmalite ọhụrụ gị, ọbụna taa, ugbu a. Jizọs Kraịst bụ Mmmalite na Ọgwụgwụ nke okwukwe, na-ede isi ihe ọhụrụ niile anyị na ya ọnụ apụghị ịgụ agụ. Ọ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ—ọgwụgwụ nke ihere na ntaram ahụhụ anyị mmalite nke ndụ ọhụrụ niime Ya, na-ekwe anyị ịnata amara Ya, ịhapụ mgbe gara aga nʻazụ ma malite ọzọ jiri chi ọbụbọ, ka ha ra bụ ugboro ugboro anyị na-achọ ya. Nʻezie, “ịdị mma na ebere Ya ga-esoro [anyị] ụbọchị niile nke [ndụ anyị].” Nʻaha Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Ọlụ 10:38; lee kwa “Kraịst Dị ndụ: Ama nke Ndị Ozi,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  2. Lee Moronaị 7:12–13.

  3. Lee Ọpụpụ 34:5–7.

  4. Jọn 21:25.

  5. Mak 2:5.

  6. Mak 5:41.

  7. Matiu 8:3.

  8. Jọn 8:11.

  9. Luk 8:48.

  10. Lee Shayne M. Bowen, “Niihi na M Dị ndụ, Unu Ga-adịkwa Ndụ,” Liahona, Nọv. 2012, 15–17.

  11. Jọn 3:3; Mozaya 27:25.

  12. Ndị Rom 6:4.

  13. Moronaị 6:8.

  14. 2 Ndị Kọrịntị 5:17.

  15. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 19:16-19.

  16. Lee Izikiel 36:26–28.

  17. Okwukwe anyị niime Kraịst na ịhụnaanya anyị maka Ya na-eduba anyị ichegharị, ma ọ bụ gbanwee echiche anyị niile, nkwenye niile, na omume niile nke na-adabaghị nʻuche Ya. Nchegharị gụnyere imepụta echiche ọhụrụ maka Chineke, onwe anyị, na ụwa” (Kwusaa Ozi ọma M: Odudu nye Ije ozi Mgbasa ozi ọma [2004], 62).

    “Ozizi nke nchegharị sara mbara nke ukwuu karịa nkọwa nke ọkọwa okwu. Mgbe Jizọs kwuru ʻchegharịa,ʻ ndị na-eso ụzọ Ya dekọrọ iwu ahụ nʻasụsụ Greek jiri ngwa ahụ metanoeo. Mkpụrụ okwu nke a dị ike nwere uru dị ukwuu. Niime mkpụrụ okwu nke a, mbuzọ meta pụtara ʻmgbanwe.ʻ The suffix relates to four important Greek terms: nous, meaning ‘the mind’; gnosis, meaning ‘knowledge’; pneuma, meaning ‘spirit’; and pnoe, meaning ‘breath’” (Russell M. Nelson, “Repentance and Conversion,” Liahona, May 2007, 103).

    Enweghi ihe karịrị ịtọghapụ, karịrị inye ugwu, ma ọ bụ dịịrị mkpa karịa nye uto nke otu onye karịa ka nlekwasị anya na nchegharị mgbe niile kwa ụbọchị dị. Nchegharị abụghị otu mmemme; ọ bụ ịhe nwere usoro. Ọ bụ otụghe-ụzọ nke añụrị na udo nke uche. Mgbe agbakwụnyere ya okwukwe, nchegharị n’emehere anyị ohere ịnweta ike nke Aja Mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.

    “… Nweta nhụmiihe ike na-enye ike nke ịchegharị ụbọchị niile—nke ị mee ihe ọma ma ọ bụ ị dị mma karịa n’ụbọchị niile.

    “Mgbe anyị họrọ nchegharị, anyị họọrọ ị gbanwe! Anyị n’ahapụ ka Onye Nzọpụta gbanwee anyị, k’anyị bụrụ mmadụ kachasị nma nke anyị kwesịrị ị bụ. Anyị na-ahọrọ ito-eto nime mmụọ ma nata ọñụ—ọñụ nke mgbapụta enwetara nihi Ya. Mgbe anyị họrọ ị chegharị, anyị họrọ ị dị ka Jizọs Kraịst karịa!” (Russell M. Nelson, “Anyị Nwere ike Ime Ihe Dị Mma ma Dị Mma karịa,” Liahona, Me 2019, 67).

    “Chọpụta ọńụ nke nchegharị kwa ụbọchị.

    “Kedụ ụdị mkpa nchegharị dị? Alma kụziri na anyị agaghị ʻekwusa ozi ọma ọbụla ma ọ bụghị nchegharị na okwukwe n’Onyenwe anyị’ [Mozaya 18:20]. Nchegharị bụ ihe a chọrọ n’aka onye ọ bụla ruru ogo inye nkọwapụta nke chọrọ ebube dị ebighị ebi. Enweghị ndị a gụpụrụ. …

    “Walking the covenant path, coupled with daily repentance, fuels positive spiritual momentum” (Russell M. Nelson, “The Power of Spiritual Momentum,” Liahona, May 2022, 98–99).

  18. Lee Mak 5:25–34.

  19. Lee Matiu 8:5–13.

  20. Lee Matiu 8:1–4.

  21. Lee Mak 5:22–43.

  22. Lee Mak 10:46–52.

  23. Lee Mak 9:17–27.

  24. Lee Jọn 8:3–11.

  25. Lee Luk 7:12–15.

  26. Lee Jọn 5:1–9.

  27. Lee Jọn 9:1–7.

  28. Jọn 19:30.

  29. Lee Alma 34:14–16.

    “Mgbe Onye Nzọpụta kwuru, Ọ gwụsiwo,ʻ ọ naara ekwu gbasara nhụmiihe anụ ahụ ya, niihi na mkpọgbu nọnwụ ya gosipụtara ọbụna milepost nike na-agbasa agbasa” (Spencer W. Kimball, in Conference Report, Apr. 1946, 49).

    “Onye Nzọpụta arụchaghị ọrụ ya mgbe ọ nwụrụ nʻelu obe, mgbe o tipụrụ akwa, ʻỌ gwụsiwo.ʻ Ya, nʻiji okwu ndị ahụ, enweghị nrụtụ aka nye nnukwu ozi ya nʻelu ụwa, mana naanị maka nye nhujuanya niile nke ọ gabigara” (Joseph F. Smith, Ozizi nke Ozi ọma, 5th ed. [1939], 449–50).

  30. Lee Jọn 8:29.

  31. 3 Nefi 11:11.

  32. Abụ ọma 23:6.