Ime ka a mata
Ugbu a anyị na-aga niihi na ọgbakọ zuru ọha nke ọkara afọ a, na-aga niihu dịka atụmatụ ya na ndị na-ekwu okwu na egwu nke Onyeisi Nelson kenyere ya mgbe ọnwa ole na ole nke nkwadebe gasịrị.
Ụmụnne m ọma ndị nwoke na nwanyị, anyị na-ezuta ka anyị na-eru uju ọnwụ nke Onyeisi Russell M. Nelson anyị hụrụ naanya. A na m agwa unu okwu dịka Onyeisi nke Kworum nke Iri na Abụọ, ọnọdụ nke a kwadoworo m nʻọgbkọ ọ bụla nke ward, stek, na ọgbakọ zuru ọha anyị kemgbe afọ asaa na ọkara gara aga.
Anyị na-aga niihu na ọgbakọ zuru ọha nke ọkara afọ a, na-aga niihu dịka atụmatụ ya na ndị na-ekwu okwu na egwu nke Onyeisi Nelson kenyere ya mgbe ọnwa ole na ole nke nkwadebe gasịrị. Naanị ihe ndị agbakwunyere bụ nke a, nkọwa mmalite m, na ikwu okwu m nʻọnọdụ nke Onyeisi Nelson na nnọkọ mmechi a nʻehihie Sọnde.
Nke a bụ nke mbụ niime ihe dị ka afọ 75 ka Onyeisi Nzukọ nsọ nwụrụ ụbọchị ole na ole tupu ọgbakọ zuru ọha. Nke a akpọọla anyị ka anyị hazie ka anyị ga-esi nwee nzukọ ndị ndu niile dị mkpa niihe gbasara ọgbakọ zuru ọha yana nnọkọ zuru ọha nke ọgbakọ, nʻotu oge ahụ na-ahazi olili ozu ya ozugbo enwere ike. Onyeisi Nelson ghọtara uru ọgbakọ zuru ọha baara inye Ndị nsọ ntụziaka nʻọnwa ndị na-abịa. Anyị na-asọpụrụ ya site nʻịgbaso usoro ọgbakọ ọ kwadoro.
Nʻoge iru uju a, anyị enweelarị nzukọ ịsọpụrụ Onyeisi Russell M. Nelson tupu nzukọ niile nke ọgbakọ zuru ọha anyị ma mgbe ahụ kwado olili ya ngwa ngwa o kwere omume mgbe ọgbakọ gachara. E mewo ihe ndị a niile site na nkwado nke ezinaụlo nke Onyeisi Nelson na Kworum nke Iri na abụọ ahụ.
Ebe ọ bụ na anyị niile bụ ndị ekenyere ikwu okwu nʻọgbakọ zuru ọha ga-achọ itinye oge ekenyere anyị nʻịtụ ụtụ nke onwe nye Onyeisi Nelson, anyị arịọla ka ndị niile na-ekwu okwu nʻọgbakọ anyị jide ụtụ ọ bụla d[ otu ahụ na opekempe, na-bufe ụtụ niile kpụ ọkụ nʻọnụ maka olili ozu ahụ, nke anyị malitelarị ime atụmatụ.
Ụtụ nke m dị nkenke—dabara adaba na ọgbakọ a na nʻụtụ ndị anyị kwuwororịị—bụ nke a: A hụrụ m Russell M. Nelson naanya ma amụtara m karịa ọtụtụ ihe gbasara ozi ọma na nduzi nke ozi ọma site na ogologo enyi na mkpakọrịta mụ na ya karịa site nʻaka onye ndu ọzọ m maara nʻonwe m. Ọ bụ ihe nlereanya anyị dị ka onye odibo na onye na-eso Onyenwe anyị Jisus Kraịst. Maka ihe ndị a niile ka m na-agba ama ya, n’aha Jizọs Kraịst, amen.