Ọgbakọ Zuru ọha
Ndị amụma nke Chineke
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


11:8

Ndị amụma nke Chineke

Ị na-ege ntị ma na-erube isi nʻolu nke onye amụma dị oke mkpa nye ijidesi aka ike nʻihe ọbụla dị mma tutu ruo Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ

Ezi ndị ntoroọbịa, olee ụdịrị ọmarịcha nkeji ọgbakọ anyị na-enwe! Anyị anụworịị site nʻọnụ Ndịozi nke Jizọs Kraịst atọ dị ndụ. Olee ụdị ngọzị dị ịtụnaanya otu a! Anyị ka ga-anụkwu otu ọzọ, Onyeisi Henry B. Eyring. Oriri nke ime mmụọ ahụ na-aganiihu!

Mgbe m kwuru okwu afọ gara aga, anyị mụtara otu esi ezute ụwa nke a site na nhụmiihe nke Devid na Goliath. Ichetara okwute ise ahụ? Taa, ana m akọ otu akụkọ nke Agba Ochie m gụrụ mgbe m ha ka unu nke hapụrụ m ịchọ ịdị ka onyeisi egwuregwu ya. Baịbụl emeghị ka anyị mata aha ya, ya mere anyị ga-akpọ ya nwanyị Shunem niihi na nke a bụ aha obodo ya.

Nwanyị na-eme achịcha maka onye amụma

Otu ụbọchị onye amụma Elisha sitere na Shunem na-agafe, ma anyị gụtara na e nwere ebe ahụ “otu nnukwu nwanyị; ma ọ [kpọkuru] ya ịbịa rie nri. Ma otu ahụ ka ọ dị, na ka ha ra bụ oge ọbụla ọ gafetara, ọ gabara … iri nri.” E chere m na onye amụma Elisha nwere oke obi ụtọ site nʻọkpụkpọ oku iri nri nʻụlọ ya! Ọ gaworịị ọtụtụ ugboro, mgbe otu ụbọchị nwanyị ahụ gwara di ya, “Ugbu a, a hụtara m na nke a bụ onye nsọ nke Chineke.”

Nwanyị ahụ na-asị, “Ugbu a, ahụtara m.” O yiri ka ọ kpọbatara Elisha nʻụlọ ya na-amaghị na ọ bụ onye amụma; ọ natara ama ya site nʻaka Mmụọ Nsọ site nʻịn̄a ntị nke ọma niihe Elisha kwuru ma kuzie. (Cheta na, enweghị foto ndị nọ oge ahụ! Ya mere ọ rara ahụ ịmata onye amụma naanị site nʻihu ya.)

Nwanyị na-emezi otu ọnụ ụlọ maka onye amụma

Mana akụkọ ahụ akwụsịghị ebe ahụ. Otu ụbọchị, nwanyị ahụ gwara di ya, “Ka anyị rụta otu obere ọnụ ụlọ, … ma ka anyị meziere ya akwà ebe ahụ, na otu tebụlụ, na otu oche, na otu mkpịsị oriọna: ma ọ ga-abụ, mgbe ọ bịakwutere anyị, ọ ga-alaba alaba.”

Nwanyị a kwesịrị ntụkwasị obi dịịrị na njikere ịrụ otu ọnụ ụlọ nʻụlọ ya nke ga-eme ka onye amụma ahụ, na-agafe obodo ukwu ahụ, ga-enwe ebe ọ ga-anọ!

Taa, anyị nwere ike ịmụta otu ihe ọmụmụ dị ike site na nhụmiihe nke a.

Onyenwe anyị gbaara nwanyị Shunem ahụ ama na Elisha bụ onye amụma nke Chineke, ma o mere ihe kwesịrị omume site na-imepe ụlọ ya ịnabata ya.

Anyị onwe anyị kwa nwere ike ịnata otu ama nke onwe banyere ndị amụma nke Chineke taa ma meghee obi anyị na uche anyị—ụlọ anyị—nye ozi ahụ nke Nna anyị nke Eluigwe nwere maka anyị nʻụbọchị ikpeazụ ndị a.

Ezi ndị ntoroọbịa, ana m akpọku unu ịjụ onwe unu ajụjụ nke a: “Enwere m ama nke onwe m banyere ndị amụma dị ndụ nke Chineke?”

Ka anyị malite na mbido.

Gịnị bụ onye amụma? Onye amụma bụ nwoke onye nke Chineke kpọworo ikwu okwu maka Ya. E nwere ndị amụma nọ nʻụwa taa, dịkwa nnọọ ka e nwere mgbe gboo.

Ndị amụma bụ ndị ọhụụ na ndị mkpughe. Nke ahụ pụtara na ha nwere ike ịhụ ihe ndị ọzọ na-enweghị ike ihụ, ma ha nwere ike ibu amụma banyere ihe ndị ga-eme nʻọdịniihu. Ha nwekwara ike kwadoo anyị maka ọdachi niile. Ndị amụma na-anata iwu nsọ na mkpughe niile site nʻaka Onyenwe anyị. Edide nke okwukwe nke iteghite na-ekwu maka mkpughe na-aganiihu nʻụbọchị ikpeazụ ndị a. Ọ sịrị, “Anyị kwere ihe niile nke Chineke kpugheworo, ihe niile Ọ na ekpughe ugbu a, ma anyị kwekwara na Ọ gaje ikpughe ọtụtụ oke ihe na ihe niile dị mkpa gbasara Alaeze nke Chineke.”

Okenye Gary E. Stevenson kwuru, “Onyenwe anyị na-aganiihu na-ekpughe iwu nsọ Ya niile na uche Ya nye ndị amụma Ya ụbọchị taa niihi na Ọ chọrọ iduba anyị n’ọn̄ụ niime ndụ nke a ma ruo na ebube nke selestịal na ndụ nke na-abịa abịa.”

Ndị amụma nakwa ama ọkwa ozi ọma ma bụrụkwa ndị nkuzi nwere mkpakemmụọ na ndị ozi nke Chineke nye onye ọbụla nọ nʻụwa.

Onye otù ọbụla nke Otú Ndịisi Mbụ na Kworum nke Ndịozi Iri na abụọ bụ onye amụma, onye ọhụụ, na onye mkpughe. Na-eje ozi dị ka onye kansụl nʻokpuru ntuzi aka nke Onyenwe anyị, ha nwere ikike ịma ọkwa na ịtapịa ozizi ma hiwe ụkpụrụ maka Nzukọ nsọ Ya. Ha na-akpachara anya ekpe ekpere ma na-atụgharị uche, maka na mkpebi niile nke ndị kworum ndị a ahaghị ị bụ ihe ekwekọtara. Nʻụzọ dị otu a, Onyenwe anyị na-amasi anyị obi ike na uche Ya ga-eme.

Ndị amụma na-agba ama banyere Kraịst—ịdị adị Ya, ozi Ya, na ịdị nsọ Ya.

Ka anyị gụọ ụfọdụ ama nke ndị amụma sitere na Akwụkwọ nke Mọmọn.

Abinadaị mara ọkwa:

“Chineke n’onwe ya ga-agbadata n’etiti ụmụ mmadụ, ma ga-agbapụta ndị ya.

“Ma niihi na o bi na anụ ahụ a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke.”

Samuel onye Laman gbakwara ama na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke, Nna nke eluigwe na ụwa, Onye okike nke ihe niile site na mmalite.”

Ma onye amụma Moronaị kwuru, “A hụwo m Jizọs, ma … ọ gwawo m okwu ihu na ihu.”

Mgbe Kraịst gara leta ndị Nefi, otu niime ihe mbụ ndị O mere bụ ịkpọ Ndịozi Iri na abụọ. Ma Ọ gwara ndị mmadụ, “Ngọzi na-adịrị unu ma ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nʻokwu niile nke ndị iri na abụọ ndị a ndị m họrọworo.”

Ugbu a ka m kwuo mkpụrụ okwu ole ma ole maka ndị nne na nna ma ọ bụ ndị otu ezi na ụlọ ndị ọzọ na-azụlite ụmụaka. Onyenwe anyị nʻOnwe Ya kuziiri Adam na Iv eziokwu niile banyere atụmatụ nke nzọpụta. Ma emesịa Ọ sịrị ha, “Enye m unu otu iwu nsọ, ikuzi ihe ndị a na-atụghị egwu nye ụmụ unu.”

Gịnị bụ ihe ọ pụtara ikuzi ihe na-atụghị egwu? Ọ bụ ịmụ eziokwu niile banyere ozi ọma, inwe ama nke onwe banyere ha, na ịkọrịta mmata ihe ahụ anyị na ụmụ anyị. Ọ bụ ma ịkwalite oge nkuzi niile ma nke ahaziri ahazi ma nke na-ahazighị ahazi. Ọ bụ ibi ndụ dị ka otu mmata ihe na ama ahụ siri dị.

Akwụkwọ nke Mọmọn kọwara 2,060 ndị agha siri ike ahụ dị ka “ndịikom kwesịrị ntụkwasị obi na ndị anya udo, niihi na a kuziworo ha idebe iwu nsọ niile nke Chineke na ije ije n’iguzosị ike nʻihu ya.” Ndịikom nta ndị a nʻikwesị ntụkwasị obi rubeere Hilaman isi, onye nʻoge ahụ bụụrụ onye ndu ndị agha ha nakwa onye amụma ha, ma ha kọtara na ndị nne ha emejuputawo obi ha jiri eziokwu na okwukwe.

Ndị nne na nna, niime ụwa a ebe enwere ọtụtụ olu ma mgbe ụfọdụ oke ọchịchịrị, Chineke nʻOnwe Ya enyewo anyị iwu ịzụlite ụmụ anyị nʻihè na eziokwu. O nyefere anyị nʻaka oke na ọrụ ikuziri ụmụ anyị eziokwu niile nke ozi ọma na-enye nzọpụta. Ọ bụrụ na anyị ahapụ ime otu ahụ, ndị ụwa agaghị eme ya.

Ezi ndị enyi m nta, ana m akpọku unu: Nʻụbọchị ndị na-abịa abịa, ana m akpọku unu igbu ikpere nʻala, meghee obi unu, ma kpee ekpere nʻokwukwe nye Nna nke Eluigwe, na-arịọ Ya ime ka unu mata na onye amụma na ndị ozi Ya ọ họọrọ bụ olu Ya nọ nʻụwa taa.

Nwanyị Shunem kuziiri anyị na anyị nwere ike nwee ama ahụ site na Mmụọ Nsọ. Ana m ekwe unu nkwa na ozugbo anyị maara ha bụ ndị Chineke tere mmanụ, ndụ anyị ga-adị mfe karịa na-agbanyeghị ihe aka mgba anyị ndị na-aganiihu, ebe anyị ga-erube isi nʻolu ha na ntụkwasị obi, okwukwe, na olileanya. Ị na-ege ntị ma na-erube isi nʻolu nke onye amụma dị oke mkpa nye ijidesi aka ike nʻihe ọbụla dị mma tutu ruo Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta anyị.

Ajọọ omume nke ndị ụwa na-abawanye, mana Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst na Alaeze Ya dị ike karịa ka ọ dị na mbụ. Zayọn na-eyikwasị ọmarịcha gamentị ya niile, ma ocheeze nke Kraịst agaghị ada. Onyenwe anyị tụrụ anya nʻaka anyị ịgbasi ike na ama anyị niile, ịbụ ndị juputara nʻokwukwe, na ichegharị kwa ụbọchị. Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, na-atụanya nʻaka onye ọbụla niime anyị ịganiihu nʻọrụ Ya.

Otu mgbe, Onye amụma Josef Smith kwuru, “Ụmụnna m, anyị agaghị aganiihu nʻoke ọrụ dị ukwuu otu a?” Ka osila dị, ebe ozi m bụ nnọọ maka unu, ndị ntoroọbịa, ọ ga-amasị m iji mkpụrụokwu a ndị ntoroọbịa kama iji ụmụnna. Unu dị njikere?

“[Ndị ntoroọbịa], ọ bụ na anyị agaghị aganiihu na nnukwu ọrụ dị otu a? Gaaniihu ma alala azụ. Nweenụ mgbam ume, [ndị ntoroọbịa]; gaanụ niihu, ruo na-inwe mmeri! Kwenụ ka obi unu n̄ụrịa, ma nweenụ nnukwu obi ụtọ.

Obi m juru na-ekele maka nduzi na ezi mbọ niile nke ndị amụma dị ndụ. Ana m agba ama m dị nro na Chineke kpọrọ ha ịganiihu, ehiwe, ma na-edu alaeze Ya nʻelu ụwa taa. Ọga na-adịkwa otu ahụ mgbe niile. Onyenwe anyị mgbe niile ga-abụ onye na-ahọrọ ndị odibo Ya. Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Ntụgharị asụsụ ndị Spain banyere nkebi okwu nke a na-egosị mpụtara “nọgidere na-akpọku.”

  2. 2 Ndị Eze 4:8.

  3. 2 Ndị Eze 4:9; nkwusi ike agbakwunyere.

  4. 2 Ndị Eze 4:10.

  5. Lee Emọs 3:7.

  6. “Nʻokpuru ntuzi aka nke Onyenwe anyị, [Onyeisi nke Nzukọ nsọ ahụ] na-achị Nzukọ nsọ ma bụ naanị onye nọ nʻụwa enyere ikike iji ntụghe niile nke ọkwa nchụaja rụọ ọrụ. … O nwere ikike ịnata mkpughe ma maa ọkwa uche nke Chineke maka Nzukọ nsọ dum” (Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, 5.1.1.1, Ọba akwụkwọ Ozi ọma).

  7. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:38.

  8. Gary E. Stevenson, “Ozi ọma nke Jizọs Kraịst: Ụda Na-atọ ụtọ na ntị,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Julaị 2025, 5.

  9. Lee Matiu 28:19–20; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 21:1, 4–5; 107:35.

  10. “Onyeozi ọbụla ji ntughe niile nke alaeze ahụ ma na-eji ntughe niile ahụ arụ ọrụ nʻokpuru ntuzi aka nke Onyeisi Nzukọ nsọ ahụ” (Akwụkwọ ntuzi aka Izugbe, 5.1.1.1).

  11. Lee Akwụkwọ ntuzi aka Izugbe, 5.1.1.1.

  12. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 107:27–31.

  13. “Ndịozi Iri na abụọ bụcha ʻndị aka ebe pụrụ icheʻ nke aha nke Jizọs Kraịst. … Ha na-agba aka ebe enye ụwa niile banyere ịdị nsọ Ya na nsiridị nke Mbilite nʻọnwụ Ya” (Akwụkwọ ntuzi aka Izugbe, 5.1.1.1).

  14. Mosaịa 15:1–2.

  15. Helaman 14:12.

  16. Ita 12:39.

  17. Ikwu banyere Akwụkwọ nke Mọmọn, Onye amụma Josef Smith kuziri: “Akwụkwọ nke a nakwa agwa anyị na Onye Nzọpụta anyị gosịpụtara onwe ya na kọntinentị nke a mgbe mbilite nʻọnwụ ya gasịrị, na ọ kụnyere ozi ọma ahụ ebe a nʻuju ya niile, na ụbara, na ike, na ngọzi niile; nke mere na ha nwere ndịozi, ndị amụma, ndị pastọ, ndị nkuzi, na ndị nkwusa ozi ọma; nʻotu ụdị usoro ahụ, otu ụdị ọkwa nchụaja ahụ, otu ụdị emume nsọ niile ahụ, onyinye niile, ike niile, na ngọzi niile, dị ka an̄ụrịrị na mpaghara Kọntinentị Owụwa anyanwụ” (Agụgụala, 1838–1856, volume C-1 [2 Nọvemba 1838–31 Julaị 1842], 1282, josephsmithpapers.org).

  18. 3 Nefi 12:1; nkwusi ike agbakwunyere.

  19. Moses 6:58; nkwusike agbakwunyere.

  20. Lee Ozizi na Ọgbụgbandụ niile 68:25–28.

  21. Anyị ga-ewere ohere ọbụla iji kọrịta nkuzi niile nke Jizọs Kraịst anyị na ụmụ ntakịrị. Oge nkuzi ndị a bara uru nke ukwuu ma dị oke nta karịchaa ma atụnyere ya na oke mbọ ndị nke ike mmegide niile. Na awa niile etinyere na-ịkụnye ozizi niime ndụ nke otu nwata, e nwere awa ndị apụghị ịgụta ọnụ nke mmegide juputara na ozi niile na oyiyi niile nke na-eche aka mgba ma ọ bụ jụ eziokwu ndị ahụ na-enye nzọpụta.

    “Ụfọdụ niime unu nwere ike ị na-eche ma ọ bụ na ọ ga-aka mma ịkpọkete ụmụ gị nso n’ebe ị nọ site na-ikpori ndụ, ma ọ bụ i nwere ike jụọ ma ọ bụ na nwa ahụ nwere ike bido inwe ike ọgwụgwụ site na nkuzi gị niile. Kama, anyị kwesịrị itule, ʻSite n’obere oge ha otu a na ohere ole ma ole ndị dị otu a, olee mkpụrụokwu ndị nke ozizi m nwere ike ịkọ nke ga-agba ha ume megide ihe aka mgba niile na-ahaghị ịdị nye okwukwe ha?ʻ Mkpụrụokwu ndị unu na-akọsa taa nwere ike bụrụ ndị nke ga-adị niime ha, ma taa ga-agafe mgbe na-adịghị anya” (Henry B. Eyring, “Ozizi nke Jizọs Kraịst Dị mfe,” Liahona, Nọv. 2024, 97).

  22. Onye ntoroọbịa ọbụla dị mkpa! (lee Alma 57:6, 20).

  23. Alma 53:21, nkwusi ike agbakwunyere.

  24. Lee Alma 56:44–48; 57:21.

  25. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:40.

  26. Anyị nwekwara ọmụmaatụ nke ndị nne na nna Enọs, ndị zulitere ya “nʻọdịdị na ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị” (Enọs 1:1) ma kuziere ya ihe gbasara “ndụ ebighị ebi, na ọn̄ụ nke ndị nsọ” (Enọs 1:3). Enọs maara agwa nke Chineke (lee Enọs 1:6, 15, 17).

  27. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 21:1-2, 4–6. “Ebe ndị ụwa kwesịrị ike na ike, akụ na ụba ndị e nwere, iwu ewu, na ihe ụtọ nke anụ ahụ niile na-eweta ańụrị, ha anaghị eme ya! Ha enweghị ike! Ihe ha na-emepụta enweghị ihe ọ bụ kama oghere na-anọchi anya maka “ịdị ngọzi na ọnọdụ an̄ụrị nke ndị ahụ [bụ ndị] na-edebe iwu nsọ niile nke Chineke’ [Mozaya 2:41].

    “Nke bụ eziokwu bụ na ọ na-akacha agwụ ike ị chọ an̄ụrị ebe ị na-enweghị ike achọta ya! Otu osila dị, mgbe ị nyakudoro onwe gị na Jisọs Kraịst ma rụọ ọrụ nke ime mmụọ a chọrọ iji merie ụwa, Ya, ma naanị Ya onwe Ya, nwere ike i buli gị bufee ihe niile na-adọtu mmadụ nke ụwa nke a.

    “Ugbu a, kedụ otu imeri ụwa na-esi agọzi ndụ anyị? Azịza ahụ doro anya: ịbanye niime mmekọrịta ọgbụgba ndụ gị na Chineke na-ekedo anyị na Ya n’ụzọ nke na-eme ihe niile banyere ndụ adị mfe karịa. Biko aghọtahiekwala m: asịghị m na ime ọgbụgba ndụ niile na-eme ndụ adị mfe. N’ezie, tụọ anya mmegide, niihi na onye iro anaghị achọ ka ịchọpụta ike nke Jizọs Kraịst. Mana ịnyakudo onwe unu na Onye Nzọpụta pụtara na inwere ohere ruo n’ume na ike nke mgbapụta Ya” (Russell M. Nelson, “Merienụ Ụwa ma Nweta Ezumiike,” Liahona, Nọv. 2022, 97).

  28. Lee Ita 8:26; Moronaị 7:19 –25.

  29. Lee Aịzaya 52:1.

  30. Lee Abụ ọma 125:1; Aịzaya 28:16.

  31. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:22; nkwusi ike agbakwunyere.

  32. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:30.

  33. Lee Edide niile nke Okwukwe 1:5.