Ọgbakọ Zuru ọha
Ngọzi Na-adịrị ndị Ome udo
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


13:16

Ngọzi Na-adịrị ndị Ome udo

Ime udo ka na-amalitekwa niime ebe kachasị dị ala—niime obi anyị. Emesịa niime ebe obibi anyị niile na ezi na ụlọ niile.

Unu abịala na ọgbakọ ozuruọha. Lee otu anyị si juputa n’obi ekele ịgbakọta ọnụ.

Dị ka anyị na-atụanya ka ihe niile ga-esi gaa na ọgbakọ nke a, anyị maara nke ọma banyere izu ụka ndị ahụ na-edubawo na ya. Anyị matara na mkpụrụ obi dị na-eru uju nfunarị na ụfọdụ ejighị nʻaka nke ihe kpatara ya bụ ime ihe ike ma ọ bụ ọdachi nọ nʻakụkụ ụwa dum. Ọbụna ndị kwesịrị ike nʻokpukperechi gbakọtara nʻebe niile dị nsọ—gụnyere ụlọ ụka anyị dị na Michigan edoro nsọ—etufuwo ndụ ha ma ọ bụ ndị anyị hụrụ naanya. Esi m nʻobi na-ekwu, na-amata na ọtụtụ niime mkpụrụ obi unu nwere nsogbu site na ihe unu, ndị ezi na ụlọ unu, na ụwa anyị na-agabigawo kemgbe ọgbakọ zuru ọha gara aga.

Capernaum niime Galili

Soro m chee na ịbụ nwata gbara afọ iri na atọ na ụma nọ na Capernaum, nọ nso nʻOke osimiri Galilee, nʻoge ije ozi nke Jizọs Kraịst. Okwu na-agbasa banyere otu onye rabaị—onye nkuzi—onye nke ozi ya na-adọta igwe mmadụ. Ndị agbata obi tụrụ atụmatụ imega njem nʻotu nnukwu ugwu chuwere ihu nʻoke osimiri ahụ ịnụrụ Ya.

Unu sonyere ndị ọzọ na-eje ije nʻụzọ uzuzu niile nke Galili. Mgbe ị bịarutere, nnukwu igwe mmadụ gbakọrọ ịnụrụ Jizọs nke a na-atụ gị naanya. Ụfọdụ jiri nwayọ na-ataka, “Mezaya.”

Geenụ ntị. Okwu ya niile metụrụ obi gị. Nʻogologo njem ịla nʻebe obibi, ị họọrọ ịnọ jụụ karịa ịkpa nkata.

Ị na-eche ihe ndị dị ịtụnaanya—ihe ndị dị elu karịa ọbụna iwu nke Mosis. O kwuru maka ịtụgharị ibe nti nke ọzọ na ịhụ ndị iro gị naanya. O kwere nkwà, “Ngọzi na-adịrị ndị ome udo: niihi na-aga akpọ ha ụmụ Chineke.”

Na nke bụ eziokwu gị, dị ka arụ nke ụbọchị niile nke ihe isi ike na-emetụta gị—ejighị nʻaka na egwu—udo na-adị ka ihe dị anya.

Nzọụkwụ gị na-adị ọsọ ọsọ; gị erute nʻebe obibi nʻume ọkụ. Ezi na ụlọ gị agbakọọ; nna gị a jụọ, “Gwa anyị ihe ị nụrụ ma na-enwe mmetụta.”

Gị akọọ na ọ kpọkuru gị ka ikwe ka ihè gị chakee nʻihu ndị ọzọ, ịchọ ezi omume ọbụna mgbe akpagburu gị. Olu gị na-enwete ndị mmadụ dị ka ị na-ekwugharị: “Ngọzi na-adịrị ndị ome udo: niihi na aga akpọ ha ụmụ Chineke.”

Ị na-ajụ, ”M nwere ike nʻezie ịghọ onye ome udo mgbe ụwa nọ nʻọgbaghara, mgbe obi m juru nʻegwu, na mgbe udo yiri ka ọ dị anya?”

Nna gị a na-ajụnyere nne gị anya ma jiri nwayọọ zaa, “Ee. Anyị na-amalite niime ebe kachasị dị ala—niime obi anyị. Emesịa niime ebe obibi anyị niile na ezi na ụlọ anyị niile. Dị ka anyị na-amụgharị ya ebe ahụ, ime udo nwere ike ịgbasa ruo na okporo ama na ọnụmara anyị niile.”

Mee ka ọ gaa ngwa ngwa afọ 2,000

Mee ka ọ gaa ngwa ngwa afọ 2,000. Ọ baghị uru iche echiche—nke a bụ nsiridi anyị. Na-agbanyeghị nkwụnkwụ niile ndudugandu na-eto eto na-enwe ụbọchị taa gbara iche site na ndị ahụ nke onye dị nta nọ na Galili na-enwe—nkewasị, ime ka ọha mata, mmegwara, iwe ọkụ nʻokporo ụzọ, oke iwe, na ihe ndị soshal midịa na-ebupụtasị—ndudugandu abụọ ahụ na-ezute omenaala niile nke ọgbaaghara na esemokwu.

Nʻobi ekele, ndịikom nta na ndịinyom nta anyị nʻụzọ yiri ndị a ka ana adọta nʻoge ndị nke Okwu chukwu ha e kwuru nʻElu ugwu—semịnarị, ọgbakọ niile nke Maka ume nke Ndị Ntoroọbịa, na Bịanụ, Soro M. Ebe a ha na-anata otu ụdịrị ọkpụkpọ oku ndị dị nnakwere site nʻaka Onyenwe anyị: ikwe ka ihè ha mụkee nʻihu ndị ọzọ, ịchọ ezi omume ọbụna mgbe e nwere mkpagbu, na ịhụ ndị iro ha naanya.

Ha natakwara okwu mgbamume sitere nʻaka ndị amụma dị ndụ nke Mweghachite: “Ndị ome udo Ka achọrọ.” Ekwela na-abụghị onye na-ekwetaghị. Were mgbaghara na ịhụnaanya dochie esemokwu na mpako. Wuo akwà nke mmekọrịta na nghọta, ọbụghị mgbidi nke akpamoke ma ọ bụ nkewa. Ma otu nkwà ahụkwa: “Ngọzi na-adịrị ndị ome udo: niihi na aga akpọ ha ụmụ Chineke.”

Obi nke ndudugandu na-etolite etolite ụbọchị taa juputara na ama nke Jizọs Kraịst na olileanya maka ọdịniihu. Otu ọ dị ha na-ajụkwa, ”M nwere ike nʻezie ịghọ onye ome udo mgbe ụwa nọ nʻọgbaghara, mgbe obi m juru nʻegwu, na mgbe udo yiri ka ọ dị anya?”

Azịza na-ada ụda bụkwa otu ugboro ọzọ ee! Anyị na-anabata okwu niile nke Onye Nzọpụta: “Udo ka m na-ahapụrụ unu, udo m ka M na-enye unu. … Unu enyela obi unu nsogbu, ọbụghị ma unu ga-ekwe ka ọ tụọ ụjọ.”

Taa, ime udo ka na-amalitekwa niime ebe kachasị isi—niime obi anyị. Emesịa niime ebe obibi anyị niile na ezi na ụlọ niile. Dị ka anyị na-amụgharị ya ebe ahụ, ime udo ga-agbasa baa niime agbataobi anyị niile na ọhaobodo niile.

Ka anyị gaaniihu tulee ebe atọ ndị a ebe Onye nsọ Ụbọchị ikpeazụ ọgbara ọhụụ na-eme udo.

Ime udo niime Obi Anyị

Nke mbụ bụ nʻobi anyị. Mmewere ana ahụ anya banyere ije ozi nke Kraịst na-egosi otu esi dọta ụmụntakịrị nye Ya. Ebe ahụ ka enwere kepukepu. Ileba anya niime obi nke nwata na-enweghị ntụpọ ma nweghị ụta na-eme udo nwere ike bụrụ mkpatemmụọ nye obi anyị. Nke a bụ otu ọtụtụ ụmụntakịrị nọ nʻogo afọ ndị Praịmarị siri saa “Gịnị ka ọ dị ka ya ịbụ onye ome udo?”

Akọsara m azịza ha niile sitere kpọkwem nʻobi ha pụta! Luk sịrị, “Nyere ndị ọzọ aka mgbe niile.” Grace kọrọ otu o si dị mkpa ịgbaghara onye na ibe ya, ọbụna mgbe nʻọdịghị ka o kwere omume. Anna sịrị, “A hụrụ m otu onye nke na-enweghị onye ya na ya ga-egwurịta egwu, ya mere a gara m soro ya gwuo egwu.” Lindy tụgharịrị uche na ịbụ onye ome udo bụ inyere ndị ọzọ aka. “Emesịa gị enyefee ya onye ọzọ. Ọga anọgide na-aganiihu nnọọ.” Liam sịrị, “Emesola ndị mmadụ omume ọjọọ, ọbụrụgodị na ha na-emeso gị omume ọjọọ.” London tipụrụ, “Ọ bụrụ na mmadụ araa gị nra ma ọ bụ meso gị omume ọjọọ, sị ya, ʻBiko kwụsị.ʻ” Trevor hụtara, “Ọ bụrụ na enwere otu doonọtụ fọrọ ma unu niile chọrọ ya, unu ekee ya.”

Azịza nke ụmụntakịrị ndị a bụ ihe aka ebe nye m na amụrụ anyị niile inwe ndabere sinachi chuwere ihu na-afọ ọma na ọmịiko. Ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-enye ọzụzụ ma na-akpakọta àgwà ndị a sinachi, gụnyere ime udo, niime obi anyị, ịgọzi anyị niime ndụ nke a na nke ọzọ.

Ime udo nʻebe Obibi

Nke abụọ, iwulite ime udo nʻebe obibi anyị site nʻiji nsoro nke Onyenwe anyị iji nwee ike metụta mmekọrịta anyị na ibe anyị: nkwagide, ogologo ntachi obi, ịdị nwayọọ, obi ọma, ịdị umeala nʻobi, na ịhụnaanya na-adịghị ada mba.

Nke a bụ akụkọ na-akpatemmụọ nke gosipụtara otù otú ezi na ụlọ ji mee ime udo okwu ezi na ụlọ, itinye ụkpụrụ ndị a nʻomume.

Ụmụntakịrị nọ niime ezi na ụlọ nke a ka ọ naara ara ahụ na mmekọrịta ha na onye dimkpa onye omume ya naara abụkarị iwé iwè, na-eruda ala, na nkọcha. Ụmụntakịrị ahụ, na mmejọ na ngharịpụ obi, malitere ị na-eche ma naanị ụzọ esi aganiihu ọ bụ isoro otu ụdịrị omume agwa ọjọọ ahụ.

Otu mgbede ezi na ụlọ ahụ kwukọtara hoo haa gbasara nkwụkwụ na ntisa ọ naara ewe. Emesịa otu echiche batara—ọ bụghị nnọọ azịza mana nlele.

Kama ịzaghachi site na-igba nkịtị ma ọ bụ mmegwara, ụmụntakịrị ahụ ga-eme ihe a na-atụghị anya ya: ha ga-azaghachi nʻobi ọma. Ọ bụghị naani njikwa olu ọma mana okwu ọma na omume ọma echebara echiche, akpachaara anya, si nʻobi wụpụta Mmadụ niile kwekọtara ịnwale ya nwa oge nta, nke ha ga-emecha ha agbakọta ọzọ ma tụgharịa uche.

Na-agbanyeghị ụfọdụ nwere ụkwụ oyi na mbụ, ha kpebiri iji ezi obi ha tụọ atụmatụ.

Ihe ọzọ sotere abụghị ihe aga echefu echefu.

Okwu iwe ndị ahụ malitere ibelata. Ọnụ ọchị anọchie anya iwe niile. Dimkpa ahụ, onye naara anọpụ iche ma nʻewe iwe, malitere ịgbanwe. Ụmụntakịrị ahụ, site na-inwe ike ha ịhọrọ idu site nʻịhụnaanya, chọtara udo niime mnwogharị ahụ. Mgbanwe ahụ dịịrị oke iriba ama nke mere na nzukọ na-esote atụrụ atụmatụ ya bụzirịị ihe na-adịzighị mkpa. Obi ọma arụwo ọrụ ya dị jụụ.

Ka oge na-aga, ezi njikọ nke ime enyi bụ ihe ehiwere, na-ebuli onye niile elu. Ịbụ ndị ome udo, anyị ga na-agbaghara ndị ọzọ ma kpachara anya wulite ndị ọzọ kama ịkatọ ha.

Ime udo niime Ọnụmara Anyị niile

Nke atọ, ime udo niime ọnụmara anyị niile. Nʻafọ niile nke nsogbu Agha Mba Ụwa II, Okenye John A. Widstoe kuziri: “Naanị ụzọ esi ewu ọnụmara nwere udo bụ iwu ndịikom na ndịinyom bụ ndị hụrụ udo naanya na ndị na-eme udo. Mmadụ ọbụla, site na ozizi nke Kraịst ahụ … ji nʻaka ya udo nke ụwa [dum].”

Akụkọ nke a na-esote nʻọmarịcha ụzọ na-egosi ụkpụrụ ahụ.

Ọtụtụ afọ gara aga, ndịikom abụọ, onye ịmam Alakụba na pastọ Onye na-eso Kraịst sitere na Naịjirịa—guzooro nʻakụkụ okpukperechi dị iche iche rara ezigbo ahụ. Nke ọbụla niime ha atawo oke ahụhụ. Ma otu ọ dị, site nʻike ọgwụgwọ nke mgbaghara, ha họọrọ ijekọta ije ọnụ nʻotu okporo ụzọ.

Pastọ James Wuye na Imam Muhammad Ashafa

Ịmam Muhammad Ashafa na Pastọ James Wuye ghọrọ enyi na ndị oso eme udo atụghị anya. Ijikọta ọnụ ha hiwere otu etiti maka mkpezi metụtara okpukperechi dị iche iche. Ugbu a ha na-akuziri ndị ọzọ ijiri olileanya dochie mkpọrọm asị. Dị ka ndị a họpụtara ugboro abụọ maka Nobel Peace Price, ha ghọrọ mgbe na-adịghị anya ndị mmalite natara Commonwealth Peace Price.

Ndị a bụụrụ ndị iro ugbu a na-ejekọ ụkwụ na ụkwụ iwugharị ihe etiwara etiwa, ndị dị ndụ agba aka ebe na ọkpụkpọ oku nke Onye Nzọpụta ịbụ ndị ome udo abụghị naanị na o kwere omume—ọ dị ike.

Mgbe anyị bịara mata ebube nke Chineke, emesịa anyị “agaghị enwe uche ịmerụ onye na ibe ya ahụ, mana ibi n’udo.” Niime ọgbakọ anyị niile na ọnụmara anyị niile, ka anyị họrọ ịhụ onye na ibe ya dị ka ụmụ Chineke.

Atụmatụ Ome udo Otu Izu ụka

Na mpịakọta, ana m akpọku. Ime udo chọrọ omume ihe—gịnị ka nke ahụ nwere ike ịbụ, maka onye ọbụla niime anyị, malite echi ya? Ịga elebanya na atụmatụ otu izu ụka, nzọụkwụ atọ onye ome udo?

  1. 1. Mpaghara ebe obibi na-enweghị esemokwu: Mgbe esemokwu bidoro, kwụsịtụ ma malitekwa ọzọ jiri okwu ọma na omume ọma.

  2. 2. Iwu àkwà dijital: Tupu ezipụwa, inye ọsịsa, ma ọ bụ ikwu okwu nʻikuku, jụọ, “Nke a ọ ga-ewu àkwà? Ma ọ bụghị ya , kwụsị. Ezipụkwala. Kama ya, kọsaa ịdị mma. Kwuo maka udo kama mkpọrọm asị.

  3. Mezie ma jikọtagharịa ọnụ: Onye otù ezi na ụlọ ọbụla nwere ike chọpụta mmekọrịta dọnwụrụ adọnwụ maka ịrịọ mgbaghara, ilekọta, imezi emezi, na ijikọtagharị ọnụ.

Nchịkọta

O mewo ọnwa ole ma ole kemgbe m nwere echiche na-enweghị mgbagha dubara nʻozi nke a: “Ngọzi na-adịrị Ndị Ome udo.” Na nchịkọta, ka m kọọ echiche ndị na-akpatụwo m nʻobi kemgbe oge a.

Ime udo bụ njirimara nke ịdị ka Kraịst. Ndị ome udo mgbe ụfọdụ bụ ndị a na-ahụ ka ndị na-amaghị ihe ma ọ bụ ndị ike gwụrụ—site nʻakụkụ niile. Otu ọ dị, ịbụ ome udo abụghị ịbụ onye ike gwụrụ mana ị bụ onye siri ike nʻụzọ ndị ụwa na-enweghị ike aghọta. Ime udo chọrọ mgbam ume na abụghị mkpazi mana chọghị aja nke ụkpụrụ. Ime udo bụ iji obi ghere oghe duo odudu, ọ bụghị uche kpọchiri akpọchi. Ọ bụ ịbịakwute onye na ibe ya nʻaka agbatịpụrụ agbatịpụ, ọ bụghị aka ọkpọ. Ime udo abụghị ihe ọhụụ, a ka ebipụtara ọhụụ. Ọ bụ Jizọs Kraịst nʻOnwe Ya kuziri ya, ma nye ndị nọ na Baịbụl ma nye ndị Akwụkwọ nke Mọmọn. Ime udo abụworịị ihe akuziri site nʻọnụ ndị amụma oge ugbu a sitere nʻoge mmalite nke Mweghachite ọbụna ruo ụbọchị taa.

Anyị na-emejuputa ọrụ anyị nwere ịrụ sinachi dị ka ụmụ nke Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya dị ka anyị na-agba mbọ ịghọ ndị ome udo. Ana m agba ama banyere Jizọs Kraịst onye bụ Onyeisi Udo, Ọkpara nke Chineke dị ndụ, nʻaha Jizọs Kraịst, amen.