Anwalere ma Gbaa ume na Kraịst
Oge niile nke mnwale abụghị ihe aka ebe na Onyenwe anyị atọgbọwo unu. Kama, ha bụ ihe akaebe na Ọ hụrụ unu naanya nʻụzọ zuru okè iji mee ka enwogharịa ma gbaa unu ume.
Ụmụnne m ọma ndị nwoke na nwanyị, A na m enwete ịhụnaanya nke Onyenwe anyị dị ka anyị gbakọtara ọnụ. Enwere m obi umeala ịgwa unu okwu. A na m ekpe ekpere na Mmụọ ahụ ga ebuba niime obi unu ihe Onyenwe anyị ga achọ ka unu nụrụ, karịa okwu niile nke m ga ekwu.
Ọtụtụ oge gara aga, a gbara m mbọ ịmụta physics na mathematics nʻafọ niile nke mahadum m. Mana nke a juru m isi. A malitere m nwenwe mmetụta na a na m agba mbọ ịmụta ihe ike ya karịrị m. Ka isi na-eju m, mgbe ahụ ka ike iji na-agbakwu mbọ na-emenyụ ka ọkụ. Obi ịda mba m mere m ka m chee na mbọ m niile enweghi isi ma ọlị. A malitere m ịche ka m kwụsị, ma menwe ihe ka dị mfe.
Abịara m nwee ike ọgwụgwụ. Dị ka m na-ekpe ekpere, enwetere m mmesi obiike dị jụụ sitere nʻaka Onyenwe anyị. A nụrụ m Ya ka ọ gwara uche m, “A na m anwale gị, mana A ka m nọnyere gị.”
A mataghị m mgbe ahụ ihe okwu niile ndị ahụ pụtara. Mana A mara m ihe m ga-eme—A bara m nʻọrụ.
Site na-itule uche ma na-ịrụ ọrụ kemgbe afọ ndị ahụ sotere, A bịara m ghọta na ozi agbam ume nke a dị niime akwụkwọ nsọ: “A pụrụ m ime ihe niile site na Kraịst nke na-akwado m.”
A mụtara m na ndọlị m ịmụta physics bụ nnọọ onyinye sitere nʻaka Onyenwe anyị. Ọ nọ na-akuziri m na site nʻenyemaka Ya, e nwere m ike ịme ihe niile nke yiri ka ọkweghi omume ma ọbụrụ na m nwee okwukwe na Ọ ga anọ nʻebe ahụ ịnyere m aka. Site nʻonyinye nke a, Onyenwe anyị na-arụ ọrụ iji nwalee ma gbam ume.
Okwu nke a nwalere nwere ọtụtụ ihe ọ pụtara. Ịnwale ihe abụghị nnọọ iji nwalee ya. Ọ bụ iji mụbaa ume ya. Ịnwale ígwè bụ ịdebe ya nʻokpụrụ ihe siri ezigbo ike. Mkpom ọkụ, ibu arọ, na nrụgide ka a na-agbakwunye, tutu ezị ụdị ya amụba ma gosipụta onwe ya. Ịdị ike nke ígwè anaghị ebelata site na-ịnwale ya. Nʻezie, ọ ga-abụ ihe dị ntụkwasị obi, ihe dị ezigbote ike nke ga ebunwu ibụ arọ dị oke nnukwu.
Otu ahụ ka Onyenwe anyị si anwale anyị iji gbaa anyị ume. Mnwale ahụ anaghị abịa nʻoge ndị dị mfe. Ọ na-abịa nʻoge niile ahụ mgbe a na-adọtị anyị karịa ihe anyị chere na anyị agaghị ebunwu. Onyenwe anyị na-akụzi na anyị kwesịrị ịga niihu na ntolite ma ghara ịda mba na mbọ anyị, na anyị agaghị ma ọlị achịla aka elu, na anyị ga aga niihu na-agba mbọ.
Mgbe anyị gara niihu na-enwe okwukwe na Jizọs Kraịst—ọbụnadị mgbe ihe niile nwere ike dị ka o kweghi anyị omume nʻoge ahụ—anyị ga esikwo ike niime mmụọ. Ndekoihe niile nke akwụkwọ nsọ na-ekwusi eziokwu nke a ike.
Onye amụma Moronaị, nʻọmụmatụ, ka anwalere ma gbaa ume nʻụzọ dị otu ahụ. O biri nanị ya na mgwụcha ndụ ya. Ọ dere na ọ nweghi enyi, na egbuwo nna ya, na ebibiwo ndị ya. Ndị ahụ chọrọ iwezuga ndụ ya nọ na-achụgharị ya ka nta.
Nagbanyeghi nke a, obi Moronaị adaghị mba. Kama, ọ kanyere ama ya nke Jizọs Kraịst nʻelu epekele niile ahụ maka ndị mmadụ ndị ọ gaghị adị ndụ ahụ, gụnyekwara ndị ụmụụmụ nke ndị ahụ na-achọ igbu ya. Ọ dere maka anyị. Ọ maara na ụfọdụ ga akwa okwu ya emo. Ọ maara na ụfọdụ ga-ajụ ha. Mana ọ gara niihu na-ede.
Nime mnwale ya, okwukwe nke Moronaị ka enwogharịrị ma agbaa ume. Ọ bịara dịkwuo ọcha. Okwu ya niile bu ike ahụ nke onye nagịdere na kwesịa ntụkwasị obi tutu ruo nọgwụgwụ. Anyị nwere ike nwee mmetụta ike ahụ dịka anyị na-agụ ọgbụgba-ama ya:
“Ugbua mụ, Moronaị, na-ede ụfọdụ ihe dịka o siri dị m mma; ma ana m edegara ụmụnne m nwoke, ndị Leman; ma ọ ga-adị m mma ma a sị na ha ga-amata na ihe karịrị narị afọ anọ na iri afọ abụọ agafewo site nʼoge e nyere ihe iriba-ama maka ọbịbịa nke Kraịst.
“Ma arachilitere m akụkọ-ndekọta nile ndị a, mgbe m kwuchaworo okwu ole na ole nʼụzọ nke agbam-ume nye unu.
“Lee, aga m agba unu ume ka mgbe unu ga-agụ ihe ndị a, ma ọbụrụ na ọ bụ amamihe nʼime Chineke na unu ga-agụ ha, na unu ga-echeta otu Onye-nwe siri nwe obi ebere nʼebe ụmụ nke mmadụ nọ, site nʼokike nke Adam gbada ruo nʼoge nke unu ga-anata ihe ndị a, ma tụgharịa ya nʼuche nʼime obi unu nile.
“Ma mgbe unu ga-anata ihe ndị a, aga m agba unu ume ka unu wee jụọ Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, nʼaha nke Kraịst, ma ihe ndị a ha abụghị ezi-okwu; ma ọbụrụ na unu ga-eji ezigbo obi, jiri ezigbo ebum-nʼobi, na-enwe okwukwe nʼime Kraịst, ọ ga-egosipụta ezi-okwu maka ya nye unu, site nʼike nke Mụọ Nsọ.
“Ma site nʼike nke Mụọ Nsọ unu ga-enwe ike mata ezi-okwu nke ihe nile.”
Ama nke Moronaị ka enwogharịrị nʻoge owu ọwụma, mana ọ na-egbukee jiri ihè iji duo ndudugandu niile iji chọ Nna anyị nke Eluigwe na Onye Nzọpụta ahụ bụ Jizọs Kraịst.
Onye amụma ọzọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn, Jekọb, ka anwalere ma gbaa ume dịka nwantakịrị onye nwere nhụmịhe nke mkpagbu na ọtụtụ iru uju. Mana nna ya, Lehi, kuziiri ya na Chineke ga agọzi ya site na mnwale ya niile.
“Ma lee, mgbe ị dị na nwata i hụworọrịị ahụhụ nke mkpagbu na nnukwu ihe mwute, n’ihi okwu na-enweghị nrube-isi nke ụmụnne gị ndị nwoke.
“Otu o sila dị, Jekọb, nwa mbụ m n’ime ọzara, ị matara ịdị ukwuu nke Chineke; ma ọ ga-agọzi mkpagbu gị nile ka ha bụrụ uru gị.
“Ya mere, mkpụrụ-obi gị ka aga-agọzi, ma ị ga-ebi n’udo, gị na nwanne gị nwoke, Nifaị; ma ụbọchị gị nile ka ị ga-eji jeere Chineke gị ozi. Ya mere, a ma m na a gbapụtawo gị, n’ihi ezi-omume nke Onye-mgbapụta gị; n’ihi na ị hụwo nke a na n’ozuzu oge akara aka ọ ga-abịa iweta nzọpụta nye ụmụ mmadụ.”
Onye Amụma Josef Smith nwetekwara ụdị mnwale na agbam ume nke a mgbe ọ nọ na mkpọrọ Libati. Nime ala ala obi nke nhujuanya ya, Onye amụma Josef Smith tipụrụ akwa:
“O Chineke, o lee ebe i nọ?” …
“Ruo ole mgbe ka aga edebe aka gị ?”
Onyenwe anyị hụrụ niime ntaram ahụhụ Josef, nsonazụ ido nsọ nke ezi nnagide ya mgbe Ọ zaghachiri:
“Nwa m, udo dịrị mkpụrụ obi gị, ihe isi-ike gị na nsogbu nile gị ga-abụ maka nwa oge nta;
“Ma mgbe ahụ, ọ bụrụ na ị nagide ya nke ọma, Chineke ga-ebuli gị n’elu, i ga-emeri ndị iro gị nile.”
Atụmatụ nke kacha ukwuu nke ịnwale na ịgba ume mere site nʻAja mgba-ghara mmehie nke Onye Nzọpụta. O bukwasịrị onwe Ya mmehie niile nke ụwa. O buuru mgbu anyị na iri uju anyi niile. Ọ n̄ụrụ site nʻiko ilu ahụ. O gosiri na Ọ kwesịrị ntụkwasị obi nʻoge ọbụla.
Niihi aja mgbaghara mmehie Ya nke dị ebube, Jizọs Kraịst pụrụ ịgba anyị ume nʻoge niile nke mnwale anyị. Ọ mara otu esi akasị anyị obi nihi Ọ nwetewo mmetụta nke aka mgba niile nke anyị ga-enwete na ndụ anụ ahụ. “Ọ ga ebukwasị onwe ya ihe mgbu nile na ọrịa nile nke ndị ya … ka o wee mata dịka n’anụ arụ otu ọ ga-esi nyere ndị ya aka dịka adịghị ike ha nile siri dị.”
Anyị mụtara na nʻoge ọ nọ nʻUbi nke Getsemane, Onye Nzọpụta nʻezie jụrụ Nna ajụjụ ma mnwale ahụ ọ nwere ike ịgafere Ya—mana Ọ kwukwara sị nʻọbụrụ uche nke Nna, mgbe ahụ Onye Nzọpụta ga-eme ya. Yamere, Onye Nzọpụta nakwere obi abụọ, mana Ọ nwere okwukwe nʻebe Nna Ya nke Eluigwe nọ.
Ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị, mnwale na agbam ume unu nwere ike ọ gaghị adịka nke Moronaị ma ọ bụ nke Jekọb ma ọ bụ nke Onye amụma Josef. Mana ọ ga-abịa. Ọ nwere ike bịa nʻụzọ dị jụụ, site na mnwale niile nke ndụ ezinụlọ. Ọ nwere ike bịa site na nrịanrịa ma ngharịpụ ma ọ bụ nhujuanya ma ọ bụ owu ọmụma.
A na m agba aka ebe na oge niile ndị ahụ abụghị ihe aka ebe na Onyenwe anyị atọgbọwo unu. Kama, ha bụ ihe akaebe na Ọ hụrụ unu naanya nʻụzọ zuru okè iji mee ka enwogharịa ma gbaa unu ume. Ọ na-eme ka unu sikwuo ike ka unu nwee ike ibunwu ibu arọ nke ndụ ebighi ebi.
Ọ bụrụ n’anyị kwesịa ntụkwasị obi niime ije ozi anyị, Onyenwe anyị ga-enwogharị anyị. Ọ ga-agba anyị ume. Ma otu ụbọchị, anyị ga-ele anya nʻazụ ma hụ na mnwale niile ndị ahụ bụ ihe akaebe nke ịhụnaanya Ya. Anyị ga-ahụ na Ọ nọ na-akpụ anyị ka anyị nwee ike ịguzoro nʻakụkụ Ya nʻebube. Dịka otu Onye Ozi nke Onyenwe anyị Pọl kwuru na njedebe nke ndụ ya, “Alụwo m agha dị mma, agbazuwo m ọsọ nke ndụ m, edebewo m okwukwe ahụ.”
A na m agba-ama na Chineke mara unu. Ọ maara maka mnwale niile ahụ nke unu na-ezute. Ọ nọnyeere unu. Ọ gaghi ahapụ unu. A na ma agba ama na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara nke Chineke. Ọ bụ ume anyị, Onye Mgbapụta anyị, olile anya anyị. Ọ bụrụ na anyị tụkwasị obi na Ya, Ọ ga-eme ka ike anyị nke ime mmụọ hara otu ya na mnwale ọbụla ga-ezute anyị. Ana m agba ama site otu a n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.