Ha Bụ Ndị Ikpe nke Onwe Ha
Ọ bụrụ ma anyi etinyewo okwukwe na Kraịst nʻọrụ, gbaa ma debe ọgbụgba ndụ anyị na Chineke gbara, ma chegharịa site na mmehie anyị niile, mgbe ahụ oche ikpe ahụ ga-abụ nke nwere mmasị.
Akwụkwọ nke Mọmọn pịachiri okwu jiri ọkpụkpọ okù na-akpalite mmụọ sitere nʻaka Moronaị ị “bịakwute Kraịst,” “zuo-oke nʼime ya,” “wezuga onwe [anyị] site nʼamaghị Chineke nile,” ma “hụ Chineke nʼanya jiri ike [anyị] nile, echiche na ume.” Ọ bụ ihe na-akpali mmasị na ahịrị ikpeazụ nke nkuzi ya kwuru banyere Mbilite n’ọnwụ na Ikpe nke Ikpe azụ.
O kwuru “Aga m a ga ọsọ-ọsọ izu-ike na paradaịs nke Chineke, ruo mgbe mụọ m na arụ m ga-ejikọta kwa ọnụ ọzọ, ma akpọruta m na mmeri site nʼikuku, izute unu nʼiru oche-ikpe dị mmasị nke nnukwu Jehova ahụ, Onye-ikpe Ebighi-ebi nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ-anwụ.”
Enwere m mmasị otu Moronaị siri jiri okwu ahụ “dị mmasị” iji kọwaa Ikpe nke Ikpe azụ ahụ. Ndị amụma ndị ọzọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn nʻotu aka ahụ kọwara Ikpe ahụ dịka “ụbọchị nwere otuto” na nke anyị kwesịrị ị “na-enwe olile anya [ya] jiri anya nke okwukwe.” Mana mgbe ụfọdụ anyị na-atụanya maka Ụbọchị Ikpe ahụ, nkọwa ndị amụma ndị ọzọ abịa anyị nʻuche, ụdị dịka “ihere na ọmụma-ikpe dị egwu,” “oke-egwu na ụjọ,” na “nhuju-anya agwụghị-agwụ.”
Ekwere m na ndịiche siri ike dị na asụsụ nke a na-egosi na ozizi nke Kraịst mere ka Moronaị na ndị amụma ndị ọzọ lewe anya maka nnukwu ụbọchị ahụ jiri obi ịnụ ọkụ na olileanya, kama ụjọ ahụ ha dọrọ aka na ntị maka ya maka ndị ahụ na-akwadoghị niime mmụọ. Kedụ ihe Moronaị ghọtara nke mụ na gị kwesịrị ịmụta?
Ana m ekpe ekpere maka enyemaka Mmụọ Nsọ dịka anyị na-atule atụmatụ an̄ụrị nke Nna nke Eluigwe na ebere, ọrụ ịchụ aja nke Onye Nzọpụta niime atụmatụ nke Nna ahụ, na otu anyị ga-eji “zara ọnụ onwe [anyị] maka mmehie nke onwe [anyị] nile n’ụbọchị nke ikpe.”
Atụmatụ nke An̄ụrị nke Nna
Ebumnuche ndị kachasị dị niime atụmatụ nke Nna bụ ịrọpụtara ụmu Ya na mmụọ ohere iji nata anụ ahụ, mụta “ezi ihe site na ajọọ ihe” site na nhụmihe nke ịnwụ anwụ, tolite niime mmụọ, ma gaa niihu ebighị ebi.
Ihe Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile na-akọwa dịka “ohere nhọrọ ezi omume” bụ isi nkume nke atụmatụ nke Chineke iji weta na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke ụmụ Ya ndị nwoke na ndị nwanyị. Ụkpụrụ nke a dị oke mkpa ka akọwakwara niime akwụkwọ nsọ dịka ohere nhọrọ na mnwere onwe iji họrọ ma iji mee ihe.
Okwu ahụ “ohere nhọrọ ezi omume” nwere nkuzi niime ya. Okwu ndị yiri okwu nke a “ezi omume” gụnyere “ịdị mma,” “ịkwụwa ata ọtọ,” na “agwa ọma.” Okwu ndị yiri okwu nke a “ohere nhọrọ” gụnyere “ime ihe,” “emume,” na “ọrụ.” Ya mere “ohere nhọrọ ezi omume” ka enwere ike ịghọta dịka ike na ohere iji họrọ na ime ihe maka onwe anyị nʻụzọ ndị dị mma, kwụwara aka ọtọ, nwere agwa ọma, na bụrụ eziokwu.
Ihe okike niile nke Chineke gụnyere ma “ihe ndị ga-eme eme ma ndị a ga-eme eme.” Ma ohere nhọrọ ezi omume bụ “ike nke ihe omume nọrọ onwe ya” ahaziri site nʻigwe nke na-enye anyị ike dịka ụmụ Chineke iji bụrụ mmadụ na-eme eme ma ghara ịbụ ihe a na-eme eme.
Ekere ụwa dịka ebe ụmụ Nna nke Eluigwe ga ewete mnwale iji gosi ma ha “ga-eme ihe niile ọbụla ọ bụ Onyenwe anyị Chineke ha ga-enye ha n’iwu.” Isi ebumnuche nke Okike ahụ na maka anyị ibi nʻụwa ịnwụ anwụ bụ ịrọpụtara anyị ohere iji mee ihe ma bụrụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-akpoku anyị ka anyị bụrụ.
Onyenwe anyị kuziri Ịnok sị:
“Lee ụmụ nne gị ndị a, ha bụ ọrụ-aka nke aka m, na enyere ha ọmụma ihe ha, n’ụbọchị ahụ m keworo ha; na n’ime Ubi ama nke Iden, ka m nyeworo mmadụ ohere nhọrọ ya;
“Ma nye ụmụnne gị ka m sịworo, ma nyewokwa iwu-nsọ, na ha ga-ahụrịta onye na ibe ya n’anya, ma na ha kwesịrị ịhọrọ m, bụ Nna ha.”
Isi ebumnuche nke itinye ohere nhọrọ anyị nʻọrụ bụ ịhụkọrịta ibe anyị naanya ma ịhọrọ Chineke. Ma ebumnuche abụọ ndịa dabara nnọọ nke ọma ha na iwu nsọ ukwu nke mbụ na nke abụọ ahụ ịhụ Chineke naanya jiri obi anyị, mkpụrụ obi anyị na uche anyị niile, nakwa ịhụ onye agbata obi anyị naanya dịka onwe anyị
Tulee na enyere anyị iwu—nʻabụghị naanị ịdọ aka na ntị ma ọ bụ ndụmọdụ, kama iwu—ijiri ohere nhọrọ anyị iji hụkọrịta ibe anyị naanya ma họrọ Chineke. Ka m tụnye aro na niime akwụkwọ nsọ, okwu nkọwa ahụ “ezi omume” abụghị nnọọ nkọwa aha mana ikekwe ọ bụkwa ntuziaka si nʻigwe banyere otu ekwesịrị isi ejiri ohere nhọrọ anyị mere ihe.
Otu abụ ama ama nwere ihe kpatara ejiri kpọọ ya “Họrọ nke ahụ Ziri ezi” . Agọzighi anyi jiri ohere nhọrọ ezi omume ka anyị mee ihe ọbụla anyị chọro ime mgbe ọ bụla anyị chọrọ. Kama, dịka atụmatụ Nna siri dị, anyị anatawo ohere nhọrọ ezi omume iji chọo maka ma mee ihe dịka o siri daba adaba niime eziokwu nke ebighị ebi. Dika “ndị-nnochite-anya nye onwe [anyị],” anyị kwesịrị ịnọ nʻoke agụụ nʻichụso ihe ọma, “mee ọtụtụ ihe site nʻọchịchọ nke [onwe anyị], ma na-eweta na mmezu nnukwu ezi-omume.”
Mkpa ebighị ebi ohere nhọrọ ezi omume anyị dị ka akọwara ọfụma niime ihe e dere na akwụkwọ nsọ banyere kansụl ndụ tupu ndụ anụ ahụ. Lucifa nupuru isi megide atụmatụ nke Nna maka ụmụ Ya ma chọo ibibi ike nke ime ihe na nnwere onwe ime. N’ezie nnupu isi nke ekwensu bụ nnọo nihi iji mebie ụkpụrụ nke ohere nhọrọ ezi omume.
Chineke kọwara, “Ya mere, n’ihi … Setan nupuru isi megide m, ma chọọ ka o bibie ohere nhọrọ nke mmadụ, … M wee mee ka a chụda ya.”
Echiche nanị nke onwe nke onye iro ahụ bụ ka anapụ ụmụ Chineke ike ha iji bụrụ “ndị nnochite anya nye onwe ha” ndị nwere ike ime ihe nʻeziomume. Ebumnobi ya bụ ka emee ka ụmụ nke Nna nke Eluigwe bụrụ ihe akpụrụ akpụ a ga-akwa aka.
Ịme na Ịbụrụ
Onyeisi Dallin H. Oaks ekwusiwo ike na ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-akpọku anyị ị mara ihe na ị bụrụ ihe site na-iji ohere nhọrọ ezi omume anyị mee ihe nʻụzọ ziri ezi. O kwuru:
“Ọtụtụ Baịbụl na akwụkwọ nsọ agbaa ọhụrụ na-ekwu maka ikpe nke ikpe azụ nʻebe mmadụ niile ga anata ụgwọ ọrụ dịka otu agwa ha ma ọ bụ ọrụ aka ha ma ọ bụ ọchịchọ niile nke obi ha sịrị dị. Mana akwụkwọ nsọ ndị ọzọ na-amụba nkuzi nke a site na-ịrụtụ aka na a ga ekpe anyị ikpe site na ọnọdụ nke anyị mezuworo.
“Onye amụma Nefi kọwara Ikpe nke Ikpe azụ ahụ nʻụdị ihe ahụ anyị buworo: ʻMa ọbụrụ na ọrụ ha abụworịị iru inyi, ha ga-abụ ndị ruru inyi; ma ọbụrụ na ha bụ ndị ruru inyi ọ ga-abụ na ha agaghị ebi n’ime ala-eze nke Chineke’ [1 Nifaị 15:33; agbakwunyere nkọwa]. Moronaị kwuputara, ʻOnye nke ruru inyi ga-anọgide nʼiru inyi; ma onye nke bụ onye ezi-omume ga-anọgide kwa nʼezi-omume’ [Mọmọn 9:14; agbakwunyere nkọwa].”
Onyeisi Oaks gara niihu kwuo: “Site n’ụdị nkuzi dị otu ahụ anyị na-ekpebi na Ikpe nke Ikpe azụ ahụ abụghị nnọọ naanị mnwale nke ihe ọma na ihe ọjọọ niile agụkọtara ọnụ—ihe anyị meworo Ọ bụ nnakwere nke ndapụta ikpeazụ nke ihe ndị anyị mere na ihe ndị anyị chere—ihe anyị bụworo,”
Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta
Ọrụ anyị niile na ọchịchọ niile nke anyị nʻonwe ha anaghị ma enweghi ike azọpụta anyị. “Mgbe anyị mesịworo ihe niile anyị nwere ike ime,” a na-eme udo nʻetiti anyị na Chineke naanị site nʻebere na amara dị adị site na aja mgbaghara mmehie na-enweghi ọgwụgwụ dịkwa ebighị ebi nke Onye Nzọpụta.
Alma kwuputara, “Malite ikwere n’Ọkpara nke Chineke, na ọ ga-abịa ịgbapụta ndị ya, ma na ọ ga-ata ahụhụ ma nwụọ ịchụ-aja maka mmehie ha nile; ma na ọ ga-ebilite ọzọ site na ndị nwụrụ-anwụ, nke ga-eweta na mmezu mbilite n’ọnwụ ahụ, na mmadụ nile ga-eguzoro n’iru ya, ka ekpe ha ikpe n’ụbọchị ikpe-azụ na ụbọchị ikpe ahụ dịka ọrụ ha nile siri dị.”
“Anyị kwere na site na Aja Mgbaghara mmehie nke Kraịst, mmadụ nile ga-enweta nzọpụta, site na nrube isi nye iwu nile na emume-nsọ nile nke Ozi-ọma.” Anyị kwesịrị ịnwe obi ekele na mmehie anyị na ajọọ omume anyị niile agaghị eguzo dịka ihe akaebe megide anyị ma ọbụrụ ma “amụgharịa anyị ọzọ” nʻezie tinye okwukwe niime Onye Mgbapụta nʻọrụ, chegharịa “nʻobi eziokwu” ma “nzube nke ziri ezi,” ma “nagide ruo ọgwụgwụ.”
Egwu Chineke
Ọtụtụ niime anyị nwere ike na-atụanya na ọbịbịa anyị nʻihu oche ikpe nke Onye ọka ikpe Ebighị ebi ahụ ga adị dịka nke usoro nke ụlọ ikpe nke ụwa. Onye ọka ikpe ga-anọ niisi. A ga-eweputa ihe akaebe niile. A ga-amazi ikpe. Ma eleghị anya anyị agaghị amacha ihe ga-eme ma na-atụ egwu ruo mgbe anyị matara ihe ga-esi na ya pụta ma emesịa. Mana ekwere m na ụdị nkọwa usoro nke ahụ ezighi ezi.
Ụjọ ndị dị iche mana metụtara ndị anyị na-enwe nʻụwa nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-akọwa dị ka “egwu Chineke” ma ọ bụ “egwu nke Onyenwe anyị.” Nʻadịghị ka egwu nke ụwa nke na-ebute obi nkoropụ, egwu chineke na-akpobata udo, imesi obi ike, na obisiike niime ndụ anyị.
Egwu nke ezi omume gụnyekọtara mmetụta nsọpụrụ dị omimi na nkwanye ugwu maka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, nrube isi nye iwu nsọ Ya niile, na ịtụanya maka Ikpe nke Ikpe azụ, na ikpe ziri ezi nʻaka Ya. Egwu Chineke na-apụta site na nghọta ziri ezi nke ezi ọdịdị dị nsọ na ozi nke Onye Mgbapụta, ịdị njikere ịrara uche anyị nyefe nʻuche nke Ya, na ọmụma ihe na nwoke na nwanyị ọbụla ga-azara ọnụ ya maka ọchịchọ niile, echiche niile, okwu nile na omume niile nke oge ndụ ya, nʻoge Ụbọchị nke Ikpe ahụ.
Egwu nke Onyenwe anyị abụghị ịtụ egwu ịbata n’ihu Ya ka e kpee anyị ikpe. Kama, ọ bụ atụmanya nke nʻikpeazụ ikweta banyere onwe anyị “ihe nile dịka ha dị n’ezie”, na “dịka ha ga-adị n’ezie.”
Onye ọbụla bibụrụ nʻụwa a, onye bi ugbua, ma onye ọbula ka ga-ebi nʻelu ụwa ga “eguzoro n’iru oche-ikpe nke Chineke, ka o kpee ya ikpe dịka ọrụ [ya] nile siri dị ma ha dị mma ma-ọbụ ma ha dị njọ.”
Ọ bụrụ ma ọchịchọ obi abụrụwo maka ezi omume ma ọrụ anyị nke dị mma—nke pụtara na anyị etinyewo okwukwe anyị n’ime Jizọs Kraịst nʻọrụ, gbaa ma debe ọgbụgba ndụ anyị na Chineke gbara, ma chegharịa site na mmehie anyị niile—mgbe ahụ oche ikpe ahụ ga-abụ nke nwere mmasị. Dịka Ịnos kwupụtara, anyị ga “ga-eguzoro n’iru [Onye Mgbapụta]; mgbe ahụ ka [anyị] ga-ahụ iru ya n’inwe mmasị.” Ma nʻụbọchị ikpe azụ ahụ ka a “ga-akwụ [anyị] ụgwọ ọrụ n’ezi-omume.”
Nʻịtụgharị ya, ọ bụrụ nʻọchịchọ anyị bụrụ maka ajọọ ihe ma ọrụ anyị abụrụ ajọọ omume, mgbe ahụ ka oche ikpe ahụ ga-abụ ihe egwu. Anyị ga-enwe “amamihe zuru okè,” “nwe ncheta doro anya,” na “dị gara-gara n’uche n’ịta ụta nke onwe [anyị].” “Anyị agaghị anwa anwa ilelite anya lee Chineke anyị; ma anyị ga-enwe obi-ụtọ ma ọbụrụ na anyị nwere ike inye nkume nile na ugwu ukwu nile iwu ịdakwasị anyị izo anyị site nʼiru ya.” Ma nʻụbọchị ikpeazụ ahụ ka a “ga-akwụ [anyị] ụgwọ ihe ọjọo.”
Nʻikpeazụ, anyị bụ ndị ikpe nke onwe anyị. Enweghi onye ga-agwa anyị ebe anyị ga aga. Nʻiru Onyenwe anyị, anyị ga anakwere ihe ahụ anyị họrọworo ịbụ na ndụ anụ ahụ ma mara nʻonwe anyị ebe anyị kwesịrị ịnọ nʻebighị ebi.
Nkwa na Ama
Ịghọta na Ikpe nke Ikpe azụ ahụ nwere ike bụrụ nke dị mmasị abụghị ngọzi edokwara maka naanị Moronaị.
Alma nyere nkọwa make ngọzi ndị ekwere na nkwa nke ga-adịịrị onye ọbụla na-eso ụzọ Onye Nzọpụta kwesịrị ntụkwasị obi. O kwuru:
“Ihe okwu ahụ mweghachite pụtara bụ iweghachi ọzọ ihe ọjọọ maka ihe ọjọọ, ma-ọbụ ihe nke anụ arụ maka ihe nke anụ arụ, ma-ọbụ ihe na-eso ekwensu maka ihe na-eso ekwensu—ihe ọma maka ihe nke dị mma; ezi-omume maka ihe nke bụ ezi-omume; ikpe ziri ezi maka ihe nke bụ ikpe ziri ezi; obi ebere maka ihe nke nwere obi ebere.
“… Meso n’ikpe ziri ezi, kpee ikpe n’ezi-omume, ma mee ihe ọma esepụghị aka; ma ọbụrụ na i mee ihe ndị a nile mgbe ahụ ka ị ga-enweta ụgwọ ọrụ gị; e, ị ga-enwe obi ebere eweghachiiri gị ọzọ; ị ga-enwe ikpe zịrị-ezi e weghachiiri gị ọzọ; ị ga-enwe ikpe ezi-omume e weghachiiri gị ọzọ; ma ị ga-enwe ihe ọma akwụghachịrị gị ọzọ.”
Eji m on̄ụ na-agba ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị dị ndụ. Nkwa nke Alma bụ eziokwu ma ọ dịịrị gị na mụ—taa, echi, ma ruo ebighị ebi niile. Esi m otu a agba ama n’aha dị nsọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.