Ọgbakọ Zuru ọha
Mara Onye Ịbụ Nʻezie
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2025


10:45

Mara Onye Ịbụ Nʻezie

Nagbanyeghi ebe anyị nọ nʻụzọ nke ịbụ onye na-eso ụzọ, ndụ anyị ga-agbanwe nʻụzọ dị ukwuu ma ọbụrụ ma anyị ghọta nke ọma ọnye anyị bụ nʻezie.

Ọtụtụ afọ gara aga, nwa anyị nwanyị nwere nhụmihe dị ukwuu na mishọn ya. Ejim ikike ọ nyere na-ekesa ihe ọ detere anyị nʻizuụka ahụ:

“Ụnyahụ, otu onye otù na-abịaghachi nzukọ nsọ gwara anyị ka anyị bịa nʻụlọ ya ozugbo ọ kwere omume. Mgbe anyị bịaruru, anyị hụrụ ya nʻala ka ọ na-ebe akwa akwụsịghị akwụsị. Ka ọ na-ebe akwa, anyị bịara mata na achuwo ya nʻọrụ, achụpụwo ya nʻebe obibi ya, ma ọzọ, o nweghizi ebe obibi.”

Nwa anyị nwanyị gara niihu: “Amalitere m chọwa akwụkwọ nsọ m, na-achọ ịchọta ihe—ihe ọbụla—iji nyere ya aka. Dịka m na-achọ maka amaokwu nke ahụ zuru okè, echere m nʻobi, ʻGịnị ka m na-eme? Nke a abụghị ihe Kraịst gaara eme. Nke a bụghị nsogbu nke m pụrụ igbo, mana onye a bụ nnọọ nwa ada nke Chineke onye chọrọ enyem aka m.ʻ Nihi ya, emechiri m akwụkwọ nsọ m, sekpuru ala nʻakụkụ ya, ma jide ya aka ka anyị bekọtara akwa ọnụ, tutu ọ dị njikere ibili ọtọ ma gaa zute mnwale nke a.”

Mgbe akasiworo nwanyị nke a obi, nwa anyị nwanyị emesịa jiri akwụkwọ nsọ iji gbaa mbọ ma nyere ya aka ghọta na ọ nwere ugwu si nʻachi nʻezie ma ikuziri ya otu niime eziokwu nke kachasị banyere ịdị adị anyị—na anyị bụ ụmụ ndị nwoke na nwanyị ahụrụ naanya nke Chineke, Chineke onye nwere ọmịiko zuru okè maka anyị mgbe anyị na-ata ahụhụ ma dịrị na njikere ịnyere anyị aka bilie ọtọ.

Ọ bụ ihe nwere mmụta na isi ozizi nke mbụ nke ndị mgbasa oziọma anyị na-akuzi bụ na Chineke bụ Nna anyị nke Elu-igwe anyị hụrụ n’anya. Eziokwu ndị ọzọ na-esote na-ewulite nʻelu nghọta ahụ bụ ntọala maka onye anyị bụ n’ezie.

Susan H. Porter, Onyeisi Zuruọha nke Praịmarị, kuziri: “Mgbe ị maara ma ghọta kpam kpam otu esi hụ gị n’anya dịka nwa nke Chineke, ọ na-agbanwe ihe niile. Ọ na-agbanwe otu i si enwe mmetụta banyere onwe gị mgbe i jehiere. Ọ na-agbanwe otu i si enwe mmetụta mgbe ihe siri ike mere. Ọ na-agbanwe echiche gị nke iwu nsọ niile nke Chineke. Ọ na-agbanwe echiche gị maka ndị ọzọ na maka ike gị ime ihe dị iche.”

Mgbanwe nke a ka a na-egosipụta dịka anyị na-agụ banyere nhumihe ahụ Mozis nwere mgbe ọ nọ na-ekwuru Chineke okwu ihu-na-ihu. Nʻoge mkparịta ụka ahụ, Chineke ugboro ugboro kuziiri Mozis maka agbụrụ ya dị nsọ, na-ekwu “Mozis, … ịbụ nwa m nwoke.” Chineke kọwara na Mozis dị na-oyiyi nke Ọkpara Ọ Mụrụ Nanị ya. Mozis bịara ghọta nʻụzo doro anya onye ọ bụ, na ọ nwere ọrụ ọ ga-arụ, na ọ nwere Nna nke Eluigwe hụrụ ya naanya.

Mgbe nhụmihe nke a gasịrị, onye iro ahụ bịakwutere ya ịnwa ya ma ozugbo ahụ kpọọ ya site na-ikwu “Mozis nwa nke Mmadụ.” Nke a bụ ngwaọrụ ama ama dịkwanụ egwu nọ niime ngwaọgụ nke onye iro ahụ. Ebe Nna anyị nke Eluigwe mgbe niile ma jiri ịhụnaanya na-echetara anyị na anyị bụ ụmụ Ya, onye iro ahụ mgbe niile na-agba mbọ ijiri adịghịike anyị gụọ anyị aha. Mana Mozis amataworịị na ọbụghịzi “nwa nke mmadụ.” Ọ jụrụ Setan ajụjụ: “Onye ka ịbụ? Niihi na lee, abụ m nwa nke Chineke.” Nʻotu aka ahụ, mgbe ịma aka niile nke ụwa nke a zutere anyị ma ọbụ mgbe ọ dịịrị anyị ka mmadụ ọ na-agba mbọ ijiri adịghịike anyị gụọ anyị aha, anyị kwesịrị iguzoro chim niime ọmụma ihe nke onye anyị bụ nʻezie. Anyị kwesiri ịchọ nnabata nke igwe nʻabụghị nke ụwa. Ma dịka anyị na-eme otu ahụ, anyị ga-eji obisiike tie mkpu sị “A bụ M Nwa nke Chineke.”

Na ofufe nro zuruụwa nke ndị okenye nta, Onyeisi anyị hụrụ naanya Russell M. Nelson kuziri: “Yamere onye ka ịbụ? Nke mbụ na nke kachasị mkpa, ị bụ nwa nke Chineke, nwa nke ọgbụgba ndụ, na onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst. Dị ka unu nabatara eziokwu ndị a, Nna anyị nke Eluigwe ga-enyere unu aka rute ebumnoobi nke ibi niihu Ya dị nsọ ruo ebighị ebi ma emesịa,”

Ọbụghị ihe ndabanye na niime akwụkwọ nsọ akacha kwugharịa ugboro ugboro, Chineke na-echetere anyị njikọ dị nʻetiti anyị na Ya. Niime aha niile nke ejiri mara Ya niime ekpere nke oriri nsọ, Ọ gwawo anyị ka akpọọ Ya “Nna nke Ebighị ebi.”

Dịka anyị na-abịa mata onye anyị bụ nʻezie, anyị ga-amata nke ọma na Nna anyị nke Eluigwe onye dị ịhụnaanya arọpụtaworo atụmatụ maka anyị ịlaghachikwuru ma bie anyị na Ya ọzọ. Okenye Patrick Kearon kuziiri: “Ọmarịcha atụmatụ nke Nna anyị, ọbụna atụmatụ Ya ʻmagburu onwe yaʻ, ka ahaziri iji kpọlata unu ụlọ, abụghị ịchụpụ gị. … Chineke nọ na-achụso gị akwụsịghị akwụsị.” Chee maka nke a nwantịtị oge—Nna anyị onye kachasị ike, onye dị ịhụnannya nọ “na-achụso gị akwụsịghị akwụsị.”

Nagbanyeghi ebe anyị nọ nʻụzọ nke ịbụ onye na-eso ụzọ, ndụ anyị ga-agbanwe nʻụzọ dị ukwuu ma ọbụrụ ma anyị ghọta nke ọma ọnye anyị bụ nʻezie. Ka m tuo arọ ihe abụọ nke anyị nwere ike iji mee ka nghọta anyị baakwuo ụba.

Nke mbụ, Ekpere

Dika nʻoge Onye Nzọpụta na-amalite ozi ya nʻụwa, eduuru ya baa niime ọzara ịga “nọnyere Chineke.” Ikekwe anyị kwesịrị ịwepụ uche site na-ikpe naanị ekpere dị mfe ma malite ịwere nnukwu oge iji kwuoro Ya okwu na “nọnyere Chineke” kwa ụbọchị.

Ahụtawom na ekpere m na-abakwu ụba ka m na-ewere nkeji ole nʻole iji kwado maka ikwuuru Nna m. Akwụkwọ nsọ na-egosi anyị na usoro nke a na-arụ ọrụ. Ma ọ bu Josef Smit; Nefi, nwa nwoke nke Hilaman; ma ọ bụ Ịnos, ha niile nwere agwa itule nʻuche na ịchebara ya nʻechiche tupu ha amalite ịkparịta ha na Chineke. Ịnos kwuru na mkpụrụ obi ya nwere oke agụụ dịka okwu niile nke nna ya mibara ala-ala n’ime obi ya. Ọmụmatụ ndịa nke ọbụla na-akuziri anyị mkpa ọ dị ikwado niime mmụọ maka oge anyị ụbọchị ọbụla “ịnọnyere Chineke.”

Nye ndị Nefi, Onye Nzọpụta kuziri “Mgbe unu na-ekpe ekpere, baa n’ime ụlọ-nta unu, ma mgbe unu mechiworo ụzọ, kpeere Nna unu onye nọ na nzuzo.”

Ma ọbụ niime ụlọ-nta ma ọbụ niime imeụlọ, ụkpụrụ ahụ bụ ịchọta ebe naanị gị nwere ike ịnọ iji kpee ekpere, iji hapụ ka mkpụrụ obi gị nọrọ jụụ, na iji nwete mmetụta niile nke “olu nwayọ dị ntakịrị.” Anyị nwere ike kwado ịtụle uche nihe niile nke anyị nwere ekele maka ya na ajụjụ niile ma ọbụ nchekasị obi niile nke anyị ga-achọ ibutere Nna anyị. Anyị kwesịrị ịgba mbọ ghara ịnwe otu usoro eji ekpe ekpere, mana kwuoro Nna anyị okwu, nʻolu dara ụda ma ọ kwee omume.

A matawom na niime ọgbaghara nke ndụ anyị, mgbe anyị na ụmụ anyị na-egwu egwuruegwu ma ọbụ siri na ọgbakọ nke a gaa na nke ọzọ, anyị agaghị enwecha ohere nke ịnọ ebe ụlọ-nta na mee nkwado ejiri obi mee—mana ekpere ndị ahụ agbara nkịtị kpee, ndị ọsịsọ ahụ na nke ike ike, nwekwara ike baa uru ma ọbụrụ na anyị agbawo mbọ ị “nọnyere Chineke” na mmalite nke ụbọchị ahụ.

Enwere ike inwe ụfọdụ ndị na-ekpebeghị ekpere kemgbe ogologo oge ma ọ bụ ndị ọzọ na-enwebeghị mmetụta na a na-anụ ekpere ha. A na m ekwe gị nkwa na Nna gị nke Eluigwe maara gị, hụ gị n’anya, ma chọọ ịnụ n’ọnụ gị. Ọ chọrọ ikwuuru gị okwu. Ọ chọrọ ka icheta onye ịbụ nʻezie.

Okenye Jeffrey R. Holland kuziri na nso nso a: “Nagbanyeghi otu ọdị ka ịna-ekpe ekpere, kpeekwuo ekpere. Nagbanyeghi ike iji na-ekpe ekpere, jiri ike karịrị ya kpeekwuo ekpere.”

Na mgbakwunye na ịbawanye ugboro na ike nke ekpere anyị, ịmụ Akwụkwọ nke Mọmọn kwa ụbọchị na ife ofufe n’ime temple ga-enye aka kwado uche anyị maka mkpughe. Dịka anyị na-agba mbọ imelite nzikọrịta ozi anyị na Nna anyị nke Eluigwe, Ọ ga-agọzi anyị ka anyị nwee mmetụta miri emi karịa na anyị bụ ụmụ Ya.

Nke abụọ, Bịa ka Ịmara na Jizọs bụ Kraịst ahụ

Ihe ngosipụta kacha ukwuu nke ịhụnanya Nna nke Eluigwe nwere n’ebe anyị nọ dị ka ụmụ Ya bụ eziokwu ahụ na o zitere Ọkpara Ya, Onye Nzọpụta nke onwe anyị, iji nyere anyị aka ịlọtaghachi nʻebe obibi. Yamere, anyị kwesịrị ịbịa ịmata Ya.

Ọtụtụ afọ gara aga, mgbe m na-eje ozi dị ka onyeisi stake, ahọpụtara m otu nwanne nwoke ka ọ jee ozi dị ka onye ọrụ emume nsọ n’ime tempụl. Mgbe m kọwachara ya otu ọ ga-esi abụ ezigbo onye ọrụ emume nsọ, n’amaghị ama apịrị m aka na ọdụmbi nke “Akwadoghịm ya” nke zipuru nhọpụta m ahụ. Mgbe m gbalịsịrị ike ịkpọghachita ozi ahụ azụ ma nke ahụ ekweghi omume, akpọrọ m onyeisi nke tempụl wee sị, “Emewo m mmehie jọgburu onwe ya.” Na-enweghi obi abụọ, onyeisi tempụl bụ nwoke ọma kwuru, “Onyeisi Eyre, enweghị ihe ị meworo nke a na-apụghị ịgbaghara ma mechaa mezie ya.” Nke a bụ eziokwu dị ukwuu. Nʻezie, Jizọs Kraịst bụ “dike na-nzọpụta.”

Na 2019, enwere mgbanwe pụrụiche emere na ajụjụ niile nke ịnye rekọmend tempụl. Na mbụ, otu ajụjụ jụrụ ma ịnweburu ọgbụgba ama nke oke nʻọrụ Jizọs Kraịst dị ka Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta. Mana ọ na-ajụ ugbua ma ịnwere ọgbụgba ama nke oke nʻọrụ Ya dịka Onye nzọpụta na Onye mgbapụta gị . Aja mgbaghara mmehie Jizọs Kraịst anaghị arụ ọrụ naanị maka ndị ọzọ; ọ na-arụkwa ọrụ maka gị na maka mụ. Ọ bụ Onye Nzọpụta m. Ọ bụ Onye Nzọpụta gị. Nʻotu nʻotu. Naanị site na Ya ka mụ na gị pụrụ ịlaghachikwuru Nna anyị.

Yamere, ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ka anyị chọọ Ya. Ka anyị mụọ njikọ dị nsọ dị netiti Ya na Nna na nke dị nʻetiti anyi na Ya. Ka anyị nwee nhụmihe nke abụ ịhụnaanya mgbapụta ahụ nke na-abịara onye niime anyị otu nʻotu site nʻaka Onye Mgbapụta anyị mgbe anyị chegharịrị. Dịka anyị na-abịa ịmata “ya onye bụ dike na nzọpụta,” anyị ga-abịa ghọta na anyị, dịka ụmụ nke Chineke, bụ ọn̄ụ Ya—ndị Ọ kacha lekwasị anya—ma nʻezie onye ọbụla niime anyi tozuru okè ịzọpụta.

Ana m agba ama nʻanyị nwere Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya. Dịka anyị na-abịa ịmata eziokwu ebighị ebi nke a site na ekpere dị ike, mkpughe nke onwe, na ịbịakwute Jizọs Kraịst, anyị ugbua ma mgbe niile ga-eji obisiike kwuputa “A bụ M nwa nke Chineke.” Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.