“Ị Hụrụ M Naanya?”
Ọ bụrụ na anyị chọọ igosi ịhụnaanya anyị nwere nʻebe Chineke nọ, anyị kwesịrị ịghọta otu O si na-amata ịhụnaanya anyị.
Nʻụkabụilu nke nwa mmefu, nwanne ya nwoke nke okenye na mbụsu ka ọ rara ahụ isonye na mmemme mgbe nwanne ya nwoke nke nta lọtara nʻebe obibi mgbe nhọrọ ojọọ niile na “imebi[si] ụmị ya site na ndụ ọjọọ gasịrị.” Mpako na abụ m ọkachamma nke nwanne ya nwoke nke okenye gbochiri ya site na ijiri ọn̄ụ nabata nlọta nke nwanne ya nwoke nwere nchegharị. Anyị nwekwara ike kwe ka ọtụtụ ohere gafee anyị na-emeghị ka ndị anyị hụrụ naanya mata, site nʻokwu anyị na omume anyị, banyere ezi ịhụnaanya anyị nwere maka ha.
E nwere ọtụtụ ọmụmaatụ ndị siri ike niime akwụkwọ nsọ banyere ezi ịhụnaanya akọwara ma nabata: Naomi na Rut, Amọn na Eze Lamoni, nwa mmefu na nna ya, Onye Nzọpụta na ndị na-eso ụzọ Ya.
Mgbe e nwere ịhụnaanya na-akpaghị oke ma ejiri ezi obi nabata ya, okirikiri omume ọma na-esote site na mbawanye ịhụnaanya na-adị nʻetiti ma onye na-enye enye ma onye na-anata anata.
Ịhụnaanya nke Chineke zuru oke, enweghị nsọtụ, ma na-anagide, ma “kachasị dị ụtọ.” Ọ na-eme ka mkpụrụ obi juputa na “oke ọn̄ụ dị ukwuu.” Na-agbanyeghị, mgbe ụfọdụ o nwere ike ịra anyị ahụ ịmata ịhụnaanya nke Chineke niime ndụ anyị. Ka osila dị, Nna anyị nke Eluigwe nke ịhụnaanya Ya zuru oke nʻụzọ dị oke omimi chọrọ ka anyị nweta ịhụnaanya Ya nke mere O ji “na-agwa [anyị] okwu dị ka otu nghọta … [anyị] siri dị.” Ọ ga egosị ịhụnaanya O nwere maka anyị nʻụzọ ndị anyị, nʻotu nʻotu, nwere ike ịmata. Anyị nwere ike nweta mmetụta ịhụnaanya nke Chineke nwere maka anyị mgbe anyị na-ahụta ịma mma niile nke ọdịdị, ma ọ bụ nata azịza nʻekpere niile, ma ọ bụ nweta echiche na-abata nʻuche anyị nʻoge ahụ kpọmkwem a chọrọ ya, ma ọ bụ nweta oge an̄ụrị ndị na-enye obi ụtọ. Ngosipụta ịhụnaanya kachasị ukwuu nke Nna nke Eluigwe nwere maka anyị na-ehi ụda ma nʻuche ma nʻobi bụ mgbe O kwere ka Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya nye Onwe Ya dị ka onye eji chụọ aja.
Dị ka nwanne nwoke nke nwa mmefu nke okenye, nlekwasị anya anyị ọtụtụ mgbe na-adịkarị na-ebe anyị onwe anyị nọ. Anyị na-adabakarị na ịchọ ihe akaebe na-egosi ịhụnaanya nke Chineke nwere nʻebe anyịnọ, ma nwee obi nkụda mgbe anyị na-ahụghị ya. Mana ọmarịcha igbuduokwu bụ na ka anyị na-aka elekwasị anya na igosị ịhụnaanya anyị nwere maka Chineke, ka ọ na-akacha adịrị anyị mfe ịkọta ịhụnaanya O nwere nʻebe anyị nọ. Ikekwe nke a bụ ihe mere Onye Nzọpụta jiri zaghachi ajụjụ ahụ “Olee iwu nsọ nke dị ukwuu?” site na ọkpụkpọ oku nke a dị mfe ma dị mkpa: “Ị ga-ahụ Onyenwe anyị Chineke gị naanya jiri obi gị niile, jirikwa mkpụrụ obi gị niile, jirikwa uche gị niile.”
Mgbe ụfọdụ ụzọ anyị na-esi egosi ịhụnaanya anyị nwere nʻebe ndị kachasị dị anyị nʻobi nọ anaghị abụkarị ụzọ ha na-esi amata ịhụnaanya. Nke a nwere ike na-akụda obi ma nke onye na-enye enye ma nke onye na-anata anata. O nwere ike inye aka ịjụ ndị ahụ anyị hụrụ naanya otu ha na-esi amata ịhụnaanya egosipụtara. Otu aka ahụkwa, ọ bụrụ na anyị chọọ igosi ịhụnaanya anyị nwere nʻebe Chineke nọ, anyị kwesịrị ịghọta otu O si na-amata ịhụnaanya nke anyị. Ebe ọ kacha mma, O depụtawo nʻụzọ doro anya ọtụtụ ụzọ niime akwụkwọ nsọ nke anyị nwere ike i si gosi ịhụnaanya anyị nwere nʻebe Ọ nọ.
“Ị Hụrụ M Naanya Karịa Ihe Ndị a?”
Nʻụzọ nkuzi ihe gara nʻetiti Pita na Onyenwe anyị si nʻọnwụ bilie nʻebe Oke Osimiri nke Tiberias, anyị mụtara ụzọ ndị anyị nwere ike iji gosi ịhụnaanya anyị nwere nʻebe Onyenwe anyị nọ.
“Jizọs gwara Simon Pita, Simon, nwa nke Jonas, ị hụrụ m naanya karịa ihe ndị a? Ọ sịrị ya, Ee, Onyenwe anyị; Ị maara na m hụrụ Gị naanya.”
Isi ajụjụ nke a Onyenwe anyị jụrụ bụ “Ị hụrụ m naanya karịa ihe ndị a?” Anyị na-egosi ịhụnaanya anyị nwere nʻebe Onyenwe anyị nọ mgbe anyị dobere Ya nʻelu karịa “ihe ndị a,” ma “ihe ndị a” nwere ike bụrụ onye ọbụla, ihe omume ọbụla, ma ọ bụ ihe ọbụla nke na-egbochi Ya ị bụ ihe dị mkpa kachasị emetụta ndụ anyị.
Enweghị ike enwe oge zuru oke nʻotu ụbọchị, otu izu ụka, otu ọnwa, ma ọ bụ otu afọ iji mezuo ihe niile anyị chọrọ ma ọ bụ kwesịrị imezu. Akụkụ mnwale nke ndụ anụ ahụ bụ iji akụrụngwa kachasị oke ọnụ ahịa nke oge maka ihe kachasị dị mkpa maka ọdịmma anyị dị ebighị ebi ma hapụ ihe ndị ahụ na-adịchaghị mkpa.
Onyeisi Russell M. Nelson kwuru: “Ajụjụ e nwere maka onye ọbụla niime anyị … bụ otu ihe ahụ. … Ị dị njikere ikwe ka Chineke bụrụ mmetụta kachasị mkpa niime ndụ gị? Ị ga-ekwe ka okwu Ya niile, iwu nsọ Ya niile, na ọgbụgba ndụ Ya niile metụta ihe ị na-eme kwa ụbọchị? Ị ga-ekwe ka olu Ya dịrị mkpa karịa ihe ọbụla ọzọ? Ị dị njikere ikwe ka ihe ọbụla Ọ chọrọ ka i mee bute ụzọ niihe niile ndị ọzọ ị chọrọ ime? Ị dị njikere ikwe ka uche Ya kpugide uche gị?” Anyị na-egosiputa ịbụ onye na-eso ụzọ anyị na ịhụnaanya anyị nwere nʻebe Chineke nọ mgbe anyị mere ka Ọ bụrụ ihe kachasị anyị mkpa.
Zụọ Atụrụ M
Nʻamaokwu nke ọzọ banyere otu ụdị mkparịta ụka a dị nʻetiti Pita na Onye Nzọpụta, anyị mụtara ụzọ ọzọ Onyenwe anyị na-esi amata ngosiputa nke ịhụnaanya anyị: [Onyenwe anyị] gwara ya ọzọ nke ugboro abụọ, Simon, nwa Jonas, ị hụrụ M naanya?” Ọ sịrị ya, Ee, Onyenwe anyị; Ị maara na m hụrụ Gị naanya. Ọ sịrị ya, Zụọ Atụrụ m.”
Anyị na-egosi ịhụnaanya anyị nwere maka Nna nke Eluigwe mgbe anyị na-eje ozi, ege ntị, enwe ịhụnaanya, ebuli elu, ma ọ bụ elekọta ụmụ Ya. Ozi ahụ nwere ike ị bụ dị ka ihe dị mfe bụrụkwa eziokwu ka ịhụ ndị ọzọ na-ekpeghị ikpe. Na nkeji nke 76 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, anyị na-ahụtatụ agwa nke ndị ahụ bụ ndị ga-eketa ebube selestịal: “Ha na-ahụta dị ka e si ahụta ha, ma na-amata dị ka e si mara ha.” Ha na-ahụ ndị ọzọ dị ka Chineke si na-ahụ ha, ma Ọ na-ahụ ha dị ka ha nwere ike ịghọ, nwere ike dị niime si na chi dị ebube.
Mgbe m si mishọn lọta nʻebe obibi, ewegharala m ọrụ ilekọta lawn bụ nke mụ na ụmụnne m ndị nwoke bidororịị mgbe anyị nọ nʻokoroọbịa. Anọkwa m na-agụmakwụkwọ na mahadum. Otu izu ụka nʻudu mmiri, nnukwu mmiri ozuzo na ule ikpeazụ chere m niihu nyigidere m ma dọlaa m azụ nʻọrụ ụlọ.
Nʻetiti izu ụka ihu eluigwe gbasara, ma atụrụ m atụmatụ ịrụzu ọrụ ụlọ ma klaasị niile gachaa. Mana mgbe m laruru nʻebe obibi, trọk na ngwa ọrụ m efuola. Achọ ịmata, a gara na yadị ndị ahụ m tụpụtara; nke ọbụla niime ha ka ana ebechasịworịị nke ọma. Na yadị nke ikpeazụ nọ na ntụpụta ahụ, a hụrụ m nwanne m nwoke nke nta na-eje ije na-azụ igwe eji asụ ahịhịa. Ọ hụrụ m, waa ọnụ ọchị, ma fee aka. Na ijuputa nʻobi ekele, a makuru m ya ma kelee ya. Omume ọma nke ije ozi ya nʻụzọ dị omimi mere ka ịhụnaanya m na ikwesị ugwu m nʻebe ọ nọ siwanye ike. Ijere onye na ibe ya ozi bụ ụzọ na-enweghị mgbagha anyị na-esi egosị ịhụnaanya anyị nwere nʻebe Chineke na Ọkpara Ọ hụrụ naanya nọ.
Kwuputa … Aka ọrụ Ya niime Ihe Niile
Anyị nakwa egosi ịhụnaanya anyị nwere na Chineke site na inwe obi ekele. Onye Nzọpụta kwuru, “Enweghị ihe mmadụ ji emehie Chineke, … ma ọ bụghị ndị ahụ ndị na-anaghị ekwupụta aka ọrụ ya niime ihe niile.” Anyị na-egosi ịhụnaanya anyị nwere nʻebe Chineke nọ site na ịnakwere Ya dị ka nsipụta nke ihe ọbụla dị mma niime ndụ anyị.
Na mmalite oge nke imepe otu kọmpịn, mụ na onye mụ na ya na-azụkọ ahịa na-ekpesi ekpere ike tupu nzukọ ndị dị mkpa, na-arịọ maka enyem aka nke Nna nke Eluigwe. Ugboro ugboro, Chineke zara ekpere anyị, ma nzukọ anyị niile gara nke ọma. Ka otu nzukọ gachara, onye mụ na ya na-azụkọ ahịa kwuputara na anyị emeka ọkụ ọkụ ịrịọ maka enyem aka ma jụọ oyi na-inye ekele. Site nʻoge ahụ gawa, anyị mere ka ọ bụrụ ihe maara anyị ahụ ikpe ekpere inye ekele, ịhụta aka ọrụ nke Onyenwe anyị na ime nke ọma anyị. Anyị nakwa egosi ịhụnaanya anyị na Chineke site na inwe agwa inye ekele.”
Ọ bụrụ na Ị Huru M naanya, Dobe Iwu nsọ M niile
Ụzọ ọzọ anyị na-eji egosi Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ya Ọ hụrụ naanya ịhụnaanya anyị bụ ị họrọ irubere Ha isi. Onye Nzọpụta kwuru, “Ọ bụrụ na ị hụrụ m naanya, debe iwu nsọ m niile” Ụdịrị nrube isi nke a abụghị ma o kpuru isi ma ọ bụ dị mmanye mana ọ bụ ngosipụta nke ịhụnaanya si nʻobi na-enweghị mmanye. Nna bi nʻEluigwe chọrọ anyị ị na-achọ ịdị na-erube isi. Nwanne nwanyị Tamara W. Runịa kpọrọ nke a “nrube isi dị ịhụnaanya.” Ọ sịrị, “Ọbụladị na anyị enweghị nrube isi zuru oke otu ọ dị, anyị na-anwa nrube isi dị ịhụnaanya ugbu a, ịhọrọ ịnọrọ, ugboro ugboro, niihi na anyị hụrụ Ya naanya.”
Nna nke Eluigwe nyere anyị ohere nhọrọ iji kpateemmụọ anyị ịchọ ịhọrọ Ya. Ọrụ na ebube Ya abụghị naanị iweta na mmezu ndụ ebighị ebi anyị mana gụnyekwara olileanya na ọchịchọ anyị kasị ukwuu bụ ịlaghachikwute Ya. Otu osila dị, Ọ gaghi amanye anyị irube isi. Nʻabụ “Mara Nke a, Na Mkpụrụ obi Ọbụla Nweere onwe ya,” anyị na-ekwe:
Dị ka ndị ndu Mishọn, nwunye m, Christina, na mụ onwe m nwere mkpatemmụọ site nʻaka ọtụtụ ndị mgbasa ozi ọma ndị họọrọ irube isi na-abụghị naanị niihi na ọ bụ ụkpụrụ mgbasa ozi ọma mana niihi na ha chọrọ igosi ịhụnaanya ha nwere maka Onyenwe anyị site nʻiji umeala na-ahọrọ ịnọchite anya Ya.
Okenye Dale G. Renlund kwuru: “Ebumnuuche nke Nna anyị nke Eluigwe n’ịzụ ụmụ abụghị ime ka ụmụ Ya mee ihe ziri ezi; ọ bụ ime ka ụmụ Ya họrọ ime ihe ziri ezi ma n’ikpeazụ dịrịzie ka Ya. Ọ bụrụ naanị na Ọ chọrọ ka anyị na-erube isi, Ọ ga-eji ụgwọ ọrụ na ntaram ahụhụ dị ọkụ ọkụ jiri mee ka omume anyị dị mma.” Anyị na-egosi ịhụnaanya anyị na Chineke mgbe anyị họọrọ irubere isi ma soro Ya.
Nna anyị nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị na-amata ngosipụta nke ịhụnaanya anyị nwere maka Ha mgbe anyị mere Ha ihe mbụ na ndụ anyị, jerịtara onye na ibe ya ozi, jiri obi ekele nabata ngọzi niile si nʻaka Ha, ma họrọ irube isi ma soro Ha.
Ana m agba ama na onye ọbụla niime anyị nʻezie bụ nwa Chineke, ma Ọ hụrụ anyị naanya nʻụzọ zuru oke. Ana m agba ama na Ọ na-enwe oke agụụ ka anyị nwete nhụmiihe ịhụnaanya Ya nʻụzọ ndị anyị ga-akọta ma ghọta. Ma ọmarịcha igbuduokwu ahụ bụ na anyị ga-enweta nhụmiihe ịhụnaanya Ya maka anyị ọbụna dị omimi karịa dị ka anyị na-egosi ịhụnaanya anyị nwere na Ya. Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.