Obisiike nʻIhu nke Chineke
Dịka anyị na-agbasi mbọ ike ka anyị nweta afọ-ọma na omume ọma mejupụta ndụ anyị, obisiike anyị nwere na-ịbịakwute Chineke ga-abawanye.
Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, enwere m obi ekele ikwuuru unu okwu taa, na ọgbakọ zuru ọha nke a dị mkpa. Anya m na-aga niihu na-eme okenye. Unu emeela maka nghọta unu dịka m na-enye ozi m.
Anyi bi nʻoge nnukwu ike niime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a. Obi juputara m n’ọn̄ụ dịka m na-ahụ ọgannihu n’ọtụtụ mpaghara niile.
Ndị kpatere mmụọ m nʻụzọ pụru iche bụ ndị ntorobịa anyị. Ha na-eje ozi n’ọnụogụgụ bara ụba. Ha na-achọpụta ndị nna nna ha ma na-eme emume nsọ niile niime tempụl. Ndị ikom na iyom nta anyị na-etinye akwụkwọ mgbasa ozi ọma n’ọnụọgụgụ bara ụba. Ndị ndudugandu na-etolite etolite na-ebili ọtọ dịka ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst kwụdesiri ike.
Otebeghi aka ezutere m otu nwa nwa-nwam ọhụrụ nke ukwu nke nwanyị. Mgbe m tulere ịma aka niile ọ ga-enwete na ndụ nke ya, a na m enwe oke mmasị ịnyere ya aka wulite okwukwe nime Jizọs Kraịst. Ibi ndụ ozi ọma Ya dị mkpa maka an̄ụrị nke ọdịniihu ya.
Ya nwa, dị ka ọ dịrị onye ọbụla niime anyị, ga-ezute ịma aka niile. Anyị niile ga-ezute nrịa nrịa, ndakpọ olileanya, ọnwụnwa, na ọnwụ. Ịma aka ndịa were ike gbuo obisiike nke onwe anyị. Agbanyeghị, ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst nwere ohere ịnata ụdị obisike dị iche.
Mgbe anyị na-agba ma na-edebe ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke, anyị nwere ike nwe obisiike nke amụrụ site na Mmụọ ahụ. Onyenwe anyị gwara Onye amụma Josef Smit na obisiike anyị nwere ike “ịkasi ike n’iru Chineke.” Cheegodi maka obi iruala nihi ịnwe obisiike nʻiru nke Chineke!
Mgbe m na-ekwu banyere ịnwe obisiike n’iru Chineke, a na m arụtụ aka na-ịnwe obisiike ịbịakwute Chineke ugbua! A na m arụtụ aka na-ịkpe ekpere jiri obisiike na Nna nke Eluigwe na-anụ anyị, na Ọ na-aghọta mkpa anyị niile karịa otu anyị si wee ghọta. A na m arụtụ aka na-ịnwe obisiike na Ọ hụrụ anyị naanya karịa otu anyị nwere ike chee, na Ọ na-ezite ndị mmụọ ozi ịnọnyere anyị na ndị ahụ anyị hụrụ anyị naanya. A na m arụtụ aka na-ịnwe obisiike na Ọ nwere oke mmasị ịnyere onye ọbụla niime anyị aka rute akaraka anyị nke kachasị elu.
Ugbua, olee otu anyị si enweta ụdị obisiike ahụ? Onyenwe anyị zara ajụjụ a jiri okwu niile ndịa: “Ka afọ gị niile … jupụta na afọ-ọma nye mmadụ niile, … ma ka ezigbo omume chọọ echiche gị niile mma n’agwụghi agwụ; mgbe ahụ ka obisiike gị ga-akasi ike n’iru nke Chineke.”
Nke a bụ ọgwụ ya! Dị ka okwu niile nke Onyenwe anyị sịrị dị, afọ ọma na ezi omume na-emeghe ụzọ ahụ eji enwe obisiike n’iru Chineke! Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, anyị nwere ike ị mee nke a! Obisiike anyị nwere ike n’ezie kasie ike n’iru nke Chineke, ugbu a!
Ka anyị tulee ma afọ ọma ma omume ọma.
Nke mbụ, afọ ọma. Afọ abụọ gara aga, akpokuru m anyị, dịka ndị ọgbụgba ndụ na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, ịbụ ndị omee udo. Ka m kwugharịa ihe m kwuru mgbe ahụ: “Iwe enweghi mgbe ọ na-akwagide. Iro anaghị eme onye ọbụla mmadụ. Esemokwu anaghị eduba n’ụzọ nchọpụta sitere na mkpate mmụọ.”
Ezi afọ ọma nye mmadụ niile bụ nnukwu ejirimara nke ndị omee udo niile! Ọ dị mkpa na anyị nwere afọ ọma niime mkparịta ụka anyị, ma nke ọha ma nke nzuzo. A na m ekele ndị ahụ nabatara ndụmọdụ m nke mbụ n’obi. Mana anyị nwere ike ị gaa niihu mekwuo nke ọma.
Ịkpọasị nke dị ugbu a niime mkparịta ụka ọha na eze ma na soshial midiya dị egwu. Okwu nke mkpọm asị bụ ngwa agha niile ndị na-egbu egbu. Esemokwu na-egbochi Mmụọ Nsọ site na-ịbụ onye nsiso anyị mgbe niile.
Dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, anyị kwesịrị ịnọ n’isi dịka ndị omee udo. Mgbe afọ ọma na-abụ otu akụkụ nke ọdịdị anyị, anyị ga-akwụsị agwa ahụ nke ịwedata ndị ọzọ n’ala. Anyị ga-akwụsị ịma ndị ọzọ ikpe. Anyị ga-enwe afọ ọma maka ndị ahụ sitere na mpaghara di iche niile nke ndụ. Afọ ọma nye mmadụ niile dị oke mkpa maka ọganiihu anyị. Afọ ọma bụ ntọala nke agwa yiri nke chukwu.
Ka anyị rịọ Nna anyị nke Eluigwe ka o juputa obi anyị na afọ ọma bakwuru ụba—tụmadị nye ndị ahụ ọ na-ara ahụ ịhụ naanya—nihi afọ ọma bụ onyinye sitere nʻaka Nna anyị nke Eluigwe maka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst ziri ezi. Onye Nzọpụta bụ Onyeisi Udo. Anyi kwesịrị ị bụ ngwa ọrụ Ya niile maka udo.
Ugbua, ka anyị kwuo maka omume ọma. Onyenwe anyị na-agwa anyị ka anyị jiri omume ọma chọọ echiche anyị niile mma na-agwụghị agwụ . Cheedị echiche nkwalite ị ga-enweta, nye echiche ọ bụla dị mma, mgbe i jiri omume ọma kwalite ya. Omume ọma na-eme ka ihe niile dị mma karịa na nwe an̄ụrị karịa! N’aka nke ọzọ, cheedị ihe ga-eme, mgbe ị gbakwunyere omume ọma nye echiche nke na-ezighi ezi, echiche obi ọjọọ, ma ọbụ otu echiche nkụda mmụọ. Omume ọma ga-achụpụ echiche niile ndịa ahụ . Omume ọma ga-ewezuga gị site n’echiche niile nke obi nkoropu, nke na-enye nsogbu.
Ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị, dịka ụwa na-abawanye n’obi ọjọọ, anyị kwesịrị ito eto na-ịdị ọcha. Echiche anyị niile, okwu niile, na omume anyị niile kwesịrị ịbụ nke omume ọma na-esepụghị aka, ma juputa na ịhụnaanya nke Jizọs Kraịst nke na-enweghi ntupọ nye mmadụ niile. Nnukwu ohere ahụ nọ anyị niihu bụ ịbụ ndị mmadụ ahụ Chineke chọrọ ka anyị bụrụ.
Ofufe mgbe niile nime ụlo nke Onyenwe anyị na-abawanye ike anyị maka omume ọma na afọ ọma. Ya mere, oge ahụ anyị nọ nime tempụl na-amụba obisiike anyị n’iru Onyenwe anyị. Ịnokwu oge niime tempụl ga-enyere anyị aka kwado anyị maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. Anyị amaghị ụbọchị ahụ ma ọ bụ awa nke ọbịbịa Ya. Mana a ma m na Onyenwe anyị na-akpalim ka gbaa anyi ume ịdị na njikere “maka nnukwu ụbọchị ahụ dị egwu.”
Dịka anyị na-agbasi mbọ ike ka anyị nweta afọ ọma na omume ọma mejupụta ndụ anyị, obisiike anyị nwere na-ịbịakwute Chineke ga-abawanye. A na m akpoku unu ka unu zọpụ ụkwụ iji tolite na obisiike unu n’iru nke Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, dịka anyị na-agakwuru Nna anyị nke Eluigwe jiri obisiike na-abawanye, a ga-ejuputa anyị n’ọn̄ụ karịrị akarị, ma okwukwe unu na Jizọs Kraịst ga-abawanye. Anyị ga-amalite na-enwete mmetụta nke ike ime mmụọ nke karịrị olile anya anyị nke kachasị.
Anyị nwere obi ekele nye Onyenwe anyị maka ọsịsọ nke eji na-arụ tempụl n’afọ niile nke nso nso a. Nʻokpuru odudu Ya, taa anyị na-ama ọkwa atụmatụ ịrụ otu tempụl ọhụrụ n’ebe ọbụla nime ebe 15 ndị a niile:
-
Reynosa, Mexico
-
Chorrillos, Peru
-
Rivera, Uruguay
-
Campo Grande, Brazil
-
Porto, Portugal
-
Uyo, Nigeria
-
San Jose del Monte, Philippines
-
Nouméa, New Caledonia
-
Liverpool, Australia
-
Caldwell, Idaho
-
Flagstaff, Arizona
-
Rapid City, South Dakota
-
Greenville, South Carolina
-
Norfolk, Virginia
-
Spanish Fork, Utah
A na m agba ama na Jizọs Kraịst, Onye Mgbapụta nke Izrel, na-edu nke a, Nzukọ nsọ Ya. Ọ na-akwado ịbịa ọzọ. Kʻanyị jiri otu aka ahụ kwado ịnabata Ya. Niihi nke a ka m na-ekpe ekpere n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.