Kpachapụ Anya Ọnwụnwa nke Abụọ ahụ
Ezonarịla ndị ga-ahụ gị naanya ma na-kwado gị; kama, gbakwuru ha.
Afọ ole na ole gara aga, mgbe m gbara afọ 12, a kpọkuru m ịbịa ogige nhibọchi kworum Ọkwa nchụaja nke Erọn nke mbụ m. Nke a bụ mkpọku e chere ogologo oge dịka nna m bụ onye ndu kworum ma na-esokarị ụmụ nwoke nta nọ na ngalaba ukwu ahụ, aga ogige mgbe a hapụrụ m nʻụlọ.
Mgbe ụbọchị ahụ bịara, E nwere obi ụtọ. Ma A ga m ekwetarịrị na A chọsiri m ike ka mụ na ndị ụmụ nwoke tọrọ m nọọkọ. E kpebiri m igosi onwe m nke ọma. Nime mbọ ahụ o teghị aka tupu a nwale m ka a mara ma m ga-emeli ma bụrụ otu nime igwe mmadụ ahụ.
Ọrụ e kenyere m bụ inweta ntụghe niile nke ụgbọala nna m ka e nwee ike ịdọrọ ndị ndu ihe egwuregwu. A naghị m echeta kpọmkwem ihe m kwuru iji mee ka papa m kweta, ma nʻoge na-adịghị anya a gbakwuuru m igwe nke ụmụ okorobịa ahụ jiri ndị mpakotụghe niile nʻaka, na-anya isi maka ihe m rụzuru.
Mgbe ahụ ọrụ ọzọ bịara. M ga-atụghe ọnụ ụzọ ụgbọala ahụ ma dọba osisi nʻetiti oche azụ onye ọkwọ ụgbóala na opi ụgbọala. Ma m ga-atuchikwa ọnụ ụzọ ka opi ahụ wee gburuo uhuruchi nʻenwewghị ụzọ ọ bụla isi banye nime ụgbọala ahụ iji wepụ ngwa ọjọ ahụ.
Ugbu a, nke a bụ ebe akụkọ ahụ tụgharịrị nʻụzọ mgbu na-eme m ihere. Ozugbo m tinyesịrị osisi ahụ nke ọma, a kpọchiri m ụzọ ahụ wee gbaa ọsọ ọsọ ka m nwere ike zoo nime mkpọ nke ọhịa dị nso. Ka m makpuru nʻala , e nwere m mmetụta nnukwu ihe mgbu. Nime ọchịchịrị na ime ọsọ ọsọ m, a nọwo m ọdụ nʻelu cactus pear na-egbu mgbu.
Opi ahụ na-eti mkpu kpagburu mkpu niile nke mgbu m, ma e nweghị kwa m efe ime ihe ọbụla karịa iji nwayọ laghachị na ụgbọala ahụ, na-ekwupụta “mmehie” m niile, ma na-achọ nlekọta ahụike na-eme ihere.
Ihe fọdụrụ nʻabalị ahụ, e dinara m na afọ m nime otu ụlọikwuu ka nna m, ji mkpali, wepụ ogwu ndị nke cactus ahụ nime m … mana, ka m kwuo nnọọ na-anọkwataghị m nke ọma ka ọtụtụ ụbọchị gachara.
A tụgharịala m uche na ahụmihe ahụ ọtụtụ ugboro. E nwere m ike chịa ọchị ugbua nihi nzuzu nke ntoroọbịa m, ọbụna dị ka ụkpụrụ ụfọdụ na-edola m anya.
Ọtụtụ ụkpụrụ dị nʻomume mmadụ dị ka ihe a na-ahụkarị na mmadụ eke—ọchịchọ ịsoro na ihe a na-eme, ọchịchọ igosipụta onwe onye, egwu nke ịpụ apụ, na mkpa siri ike izotu ka anyị zere ihe niile ga-esi na ya pụta. Ọ bụ omume ikpeazụ nke a ka m ga-elekwasị anya taa—ozuzo mgbe anyị mechara ihe anyị ekwesịghị ime.
Ugbu a, anaghị m ewere ihe egwuregwu nke nwata m ka mmehie jọgburu onwe ya, mana anyị nwere ike ịwepụta ụfọdụ myiemetụ nwere ike ịbara anyị uru dịka a na-anwale anyị na ọbịbịa anyị nʻụwa.
Nime Ogige nke Iden, Adam na Iv nwere ọnọdụ magburu onwe ya—uju nke ihe oriri, ịma mma na-enweghị atụ nke ogige ahụ—ọ bụghị naanị ogige mara mma mana ogige na-enweghị ahịhịa ma ọ bụ pear na-adụ ogwu niile.
Agbanyeghị, anyị makwaara na ndụ ogige gbochiri ọganihu ha chọrọ. Ogige ahụ abụghị ebe ikpeazụ kama ọ bụ ule, nke mbụ nime ọtụtụ nke ga-egosi, kwado, ma kwe ka ha nwee ọganihu ruo ebe ikpeazụ ha nke ịlaghachi nihu Nna na Ọkpara ahụ.
Ị ga-echeta na enwere mmegide nime ogige ahụ. E kwere ka Lucifa nwaa Adam na Iv. O bu ụzọ nwaa Adam ka o rie mkpụrụ nke osisi nke ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. Nʻicheta iwu nsọ e nyere ka ọ ghara iri ya, Adam guzogidere. Mgbe ahụ Iv a gọziri agọzi bịara, onye họọrọ iri mkpụrụ ahụ, na-eme ka Adam kweta ime otu ahụ.
E mesịa, Adam na Iv kwupụtara na mkpebi a dị mkpa iji mezuo atụmatụ nke Nna nke Eluigwe. Mana site na iri mkpụrụ ahụ, ha emebiwo iwu ahụ— iwu enyere ha kpọmkwem site nʻaka Nna. Nghọta nke ihe ọma na ihe ọjọọ nke sitere na ya pụta ga-ahapụrịrị ha na nhujuanya mgbe ha nụrụ olu nke Nna na-ekwupụta nlọghachi Ya nʻogige ahụ. Ha wee mata na ha gbaworị ọtọ, nihi na ha nʻezie enweghị uwe, ka ha biri nʻọnọdu dị ọcha. Mana eleghị anya nke na-ewute ha karịa ịbụ ndị na-eyighị uwe nʻoge ahụ, e kpughepụrụ ha ugbu a maka mmebi iwu ha. Ha enweghị ihe nchebe ma dịghị ike. Ha gba ọtọ nʻechiche ọ bụla nke okwu ahụ.
Onye nwere ohere ọbụla, Lucifa, nʻịmara ọnọdụ ekpughere ha na adịghị ike ha,nwakwara ha ọzọ—oge a ka ha zonarị Chineke.
Ọnwụnwa nke a—m ga-akpọ ya “ọnwụnwa nke abụọ,” bụ ọnwụnwa nke nwere ike iweta nsonazụ kachasị ukwuu ma ọ bụrụ na anyị daa mba. Nʻezie, ịgbanarị ọnwụnwa mbụ niile imebi iwu nke Chineke bụ ihe kasị mma, mana anyị maara na mmadụ niile ga-adaba nʻụdị ọnwụnwa nke mbụ dị iche iche nʻụwa ebe a. Ka anyị na-aga nihu na ntozu oke na nghọta anyị, anyị na-atụ anya na ike anyị iji zere ọnwụnwa niile nke mbụ ga-aga nihu ka anyị na-agbalị ịdịrịzi karịa dịka Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst.
Ụfọdụ nwere ike ịnwa izopụ nʻebe Chineke nọ nihi na ha achọghị ka a chọpụta ha ma ọ bụ kpughe ha, ma ha enwe ihere ma ọ bụ ikpe ọmụma. Agbanyeghị, ọtụtụ akwụkwọ nsọ na-akụziri anyị na izonarị Chineke agaghị ekwe omume. A ga m ekesa naanị ole na ole.
Onyenwe anyị kụziri Jeremaya site na ajụjụ ndị a na-esote: “Ọ dị onye ọ bụla nwere ike zoo onwe ya nʻebe nzuzo niile ka M nʻagaghị ahụ ya? Onyenwe anyị kwuru. Ọ bụ na-anaghị M ejupụta eluigwe and ụwa? ?”
Ma a kuziiri Job:
“Nihi na anya ya abụọ dị nʻụzọ niile nke mmadụ, ma ọ na-ahụ ije ọpụpụ ya niile.
“Ọ dịghị ọchịchịrị, ma ọ bụ onyinyo nke ọnwụ, ebe ndị ọrụ nke ajọọ omume nwere ike zobe onwe ha.
Onye abụ ọma Devid ji uri kwuo nke ukwuu:
“O Onyenwe anyị, i chọwo m, ma mata m.
“Ị marawo adịghị ike m na mbuli m, ị ghọtara echiche m site n’ebe dị anya. …
“Nihi na ọ dịghị okwu ọ bụla dị nʻire m, mana, lee, O Onyenwe anyị, ị maara ya kpam kpam. …
“Olee ebe m ga-aga site na mmụọ gị? ma ọ bụ ole ebe m ga-agbapụ site na iru gị?
“Ọ bụrụ na m arịgoro nʻeluigwe, ị nọ nʻebe ahụ: ọ bụrụ na m edobe àkwà m na ala mmụọ, lee, ị nọ nʻebe ahụ.”
Ndị Ntọghata Ọhụrụ
Maka ndị ahụ sonyere Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a na nso nso a, ọnwụnwa nke abụọ nwere ike iyi ihe siri nnọọ ike. Site na baptizim gị ị meela ọgbụgba ndụ iwekwasị onwe gị aha nke Jizọs Kraịst, nke nʻebe ọtụtụ ndị nọ gụnyere mgbanwe nke ụdị ibi ndụ dị mkpa. Ịgbanwe ụzọ ibi ndụ mmadụ adighị mfe. Ọtụtụ mgbe ọ na-achọ ka ị gbanwe omume na ihe omume niile ma ọbụna mkpakọrịta niile iji nwee ọganihu nʻebe Nna gị nke Eluigwe dị ịhụnaanya nọ.
Onye iro ahụ maara na ị nwere ike bụrụ onye na-adịghị ike ịdaba nʻọnwụnwa aghụghọ ya. Ọ ga-eme ka ndụ gị gara aga, nke mere ka ị ghara inwe afọ ojuju nʻọtụtụ ụzọ, ugbu a yie ihe kacha mma. Onye ebubo, dịka a na-akpọ ya nime akwụkwọ nke Mkpughe, ga-anwa gị jiri echiche ndị yiri nke a: “Ị nweghị ike nke ukwuu ịgbanwe ndụ gị; ị gaghị eme nke a; ị bụghị onye otu ndị a; ha enweghị ike anabata gị; ị dara oke mba.”
Ọ bụrụ na echiche ndị a yiri ka ọ na-ada na ntị gị bụ onye a kụrụ ọhụrụ nʻụzọ ọgbụgba ndụ ahụ, anyị na-arịọ gị ka ị ghara ịge ntị nʻolu nke onye ebubo ahụ. Anyị hụrụ gị naanya; ị nwere ike ime ya; anyị nabatara gị; ma ya na Onye Nzọpụta, ị ga-enwe ike ime ihe niile. Nʻoge ị chọrọ ịhụnaanya na nkwado anyị nke ukwuu, ekwela ka e duhie gị nʻechiche na anyị ga-ajụ gị ma ọ bụrụ na ị were otu nzọụkwụ laghachi azụ nʻụdị ndụ gị mbụ. Site niʻke na-enweghị atụ nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, a ga-eme ka ị dị mma ọzọ. Ma ọ bụrụ na i zonarị onwe gị site na Ya ma wezuga onwe gị site nʻogbe okwukwe ọhụrụ gị, ị na-ewezuga onwe gị site na nsipụta nke nwere ike ma ga-enye gị ike imeri.
Otu enyi m m hụrụ naanya, onye chegharịrị nʻoge adịghị anya, kwupụtara otu o si esi ike ịkwado okwukwe na ịnọpụ iche. Enwere ike dị ukwuu nʻighọ na ịnọgide na-abụ akụkụ nke obodo na-akwado—ha niile na-asụ ngọngọ ma na-aga nihu ebe ịhụnaanya nke Jizọs Kraịst na-agọzi ha.
Onyeisi Russell M. Nelson kuziri na “Imeri ụwa a bụghị mmemme a na-eme n’otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ. Ọ na-eme n’ụbọchị niile nke ndụ dị ka anyị na-anabata ozizi nke Kraịst ugboro ugboro na-esepụghị aka. Anyị na-ehiwe okwukwe niime Jizọs Kraịst site na ichegharị kwa ụbọchị na idobe ọgbụgba ndụ niile na-eme ka anyị juputa na-ike. Anyị na-anọ n’okporo ụzọ nke ọgbụgba ndụ ma na-abụ ndị a gọziri agọzi site na ike nke ime mmụọ, mkpughe nke onwe, mbawanye n’okwukwe, na ije ozi nlekọta nke ndị mmụọ ozi.”
Ọ bụrụ na ị merụọ ahụ, ọnọdụ gị ga-akawanye njọ ma nwere ike ịghọ ihe na-eyi ndụ egwu ma ọ bụrụ na ịchọghị nlekọta ahụike kwesịrị ekwesị. Nke a bụkwa eziokwu maka ọnya niile nke ime mmụọ. Naanị, ọnya niile ime mmụọ a na-agwọbeghị nwere ike imenye nzọpụta ebighị ebi gị egwu. Ezonarịla ndị ga-ahụ gị naanya ma kwado gị; kama gbakwuru ha. Ezi ndị bishop, ndịisi ngalaba nta, na ndị ndu nwere ike inyere unu aka inwete ike ọgwụgwọ nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.
Nye ndị ahụ nwere ike ịnọ na nzuzo, anyị na-arịọ unu ka unu lọghachi. Ị chọrọ ihe ozi ọma ahụ na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist na-enye, ma anyị chọrọ ihe ị na-enye. Chineke maara mmehie gị niile; ị pụghị izonarị Ya. Mee ka onwe gị dị na mma nihu Ya.
Dịka Ndị nsọ Ya, onye ọ bụla nime anyị ga-akwalite ọdịbendị nke ịnọ na Nzukọ nsọ nke nwere ịhụnaanya, na-anabata, ma na-agbamume nke ndị niile chọrọ ịga nihu n’ụzọ Ya.
Kpachapụ Anya Ọnwụnwa nke Abụọ ahụ! Soro ndụmọdụ ahụ nke ndị amụma ma oge ochie na nke oge a ma mara na ị pụghị izonarị site nʻebe Nna dị ịhụnaanya nọ.
Kama, rite uru site na ohere ị nweta ike ọgwụgwọ dị ebube nke Aja Mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Nke a bụ isi ebumnobi nke ịdị adị anyị—ị nweta ahụ adịghị ike na nke pụrụ ịnwụ anwụ bụ “nke nọ nʻokpuru ụdị adịghị ike niile” ma nke ahụ ga-adaba na, nʻụzo dị mwute, ọtụtụ ọnwụnwa nke mbụ; ịga nihu ọbụna mgbe anyị dabara nʻọnwụnwa ndị a; na ịchọ enyemaka dị nsọ mgbe anyị mesịworo otu ahụ, ka anyị wee dịkarịa ka Onye Nzọpụta anyị na Nna anyị nke Eluigwe. Ọ bụ ụzọ Ya. Ọ bụ naanị ụzọ ahụ. Maka ihe ndị a bụ eziokwu ka M na-agba ama ha n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.