Ọgbakọ Zuru ọha
Gị Bụ Kraịst ahụ
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


11:11

Gị Bụ Kraịst ahụ

(Matiu 16:16)

Anyị na-achọ ụmụ anyị ikwere niime Jizọs Kraịst, sonyere Jizọs Kraịst na Nzukọ nsọ Ya site na ọgbụgba ndụ, ma na-agba mbọ ịdịrịzi ka Jizọs Kraịst.

Mgbe nwa anyị nwoke Eli nọ na elementrị nke anọ, klas ya haziri ọchịchị mnwale ebe ahọpụtara ya site nʻaka ndị ebiri ya ije ozi dị ka ọka ikpe klas. Otu ụbọchị ọka ikpe nọ nʻọrụ sitere na Distrit Court Utah nke Abụọ bịara nleta, tụkwasị uwe mwụda ya nʻahụ Eli, ma emesịa nyekwasị ịn̄ụ iyi nke ọkwa ọrụ maka klas ha. Nke kpalitere niime mkpụrụ obi nta Eli, mmetụta mmasị maka ịgụ gbasara iwu na Onye na-enye iwu Nʻonwe Ya, Jizọs Kraịst.

Mgbe ọtụtụ afọ nke mgbalisike, Eli natara ọkpụkpọ oku maka ajụjụ ọnụ ya na ụlọakwụkwọ law nke ọ họọrọ mbụ. O kwuputara, “Nne m, a jụrụ m ajụjụ 10. Ajụjụ nke ikpeazụ bụ, ʻKedụ ebe i si enwete ntuziaka omume ọma gị?ʻ E kwuputara m na gburugburu agụgụala ndị mmadụ enwetewo sistem niile nke omume ọma site nʻịhazi ndụ ha site na archetypes. Archetype nke omume ọma nke m na-agba mbọ ịhazi ndụ m sitere na nke Jizọs Kraịst. E kwuputara m na ọ bụrụ na ndị mmadụ niile nọgide site na nkuzi niile nke Jizọs Kraịst nʻokwuchukwu nʻelu Ugwu, ụwa ga-abụ ebe dịtụ mma, ebe udo karịa.” Mgbe ahụ ajụjụ ọnụ emechie, ma ya echee nye onwe ya, “Legodi nzube oge nwata m. Ọ dịghị onye nọ na agụmakwụkwọ na-achọ ịnụ banyere Jizọs Kraịst.”

Izu ụka abụọ gasịrị, anabatara Eli nʻego enyemaka ịgụakwụkwọ. Tupu ịnabata, anyị jere nleta nebe ụlọakwụkwọ ahụ. Ụlọakwụkwọ law ahụ yiri nnukwu ụlọ ma dịrị nʻelu ugwu ilefe anya nọmarịcha leeki. Nke magburu onwe ya, dị ka anyị na-eje ije site nʻebe ọdọ akwụkwọ na kọrịdọ magburu onwe ya, anyị hụtara bana na okwute akanyere njirimara niile sitere na Okwuchukwu nʻelu Ugwu.

Okwuchukwu nʻelu Ugwu bụ mkparịta ụka doro anya dị ezigbo mma enyewororịị, ịsụ ụzọ na nkuzi ya niile. Ọ dịghị okwuchukwu ọzọ nwere ike inyere anyị aka ghọta agwa nke Jizọs Kraịst, njirimara Ya niile dị nsọ, na ebumnuuche anyị kachasị elu ịdịrịzi ka Ya.

Ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst oge ndụ na-amalite nʻebe obibi anyị—na niime Praịmarị dị ka agbara ọnwa 18. Anyị na-achọ ụmụ anyị ikwere niime Jizọs Kraịst, sonyere Jizọs Kraịst na Nzukọ nsọ Ya site na ọgbụgba ndụ, ma na-agba mbọ ịdịrịzi dị ka Jizọs Kraịst.

Kwere na Jizọs Kraịst

Nke mbụ, kwere na Jizọs Kraịst.

Mgbe okwuchukwu achịcha nke ndụ gasịrị, “ọtụtụ niime ndị na-eso ụzọ [nke Onyenwe anyị]” ka ọ rara ahụ ịnabata nkuzi Ya niile na ozizi Ya, ma ha “laghachiri azụ, ma ghara iso ya ọzọ. Jizọs mesịrị tụgharịara Iri na abụọ ahụ ma jụọ ajụjụ na-agbawa obi: “Unu ga-apụkwa apụ?”

Pita zaghachiri:

“Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? gị ji okwu niile nke ndụ ebighị ebi.

“… Anyị kwere ma mara n’ezi ya na gị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.”

Dị ka Pita gosipụtara, nkwenye bụ “inwe okwukwe na mmadụ ma ọ bụ ịnabata ihe dị ka ihe ziri ezi.” Ma maka okwukwe anyị inwe ike duba anyị ruo nzọpụta, ọ ga-adaberịrị na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. “Anyị … na-enwe okwukwe niime [Jizọs] Kraịst mgbe anyị nwere nkwesi ike na Ọ dị adị, [nghọta] nke [ezigbo] agwa na [eke] Ya, na mmata ihe na anyị na-agbọ ibi ndụ dị ka otu uche Ya siri dị.”

Onye amụma anyị hụrụ naanya, Onyeisi Russell M. Nelson, mara ọkwa, “Okwukwe niime Jizọs Kraịst bụ ntọala nkwenye niile na ebe esi adọrọ ike si na chi.”

Kedụ otu anyị ga-esi enyere ụmụntakịrị aka gbaa nkwenye ha niime Jizọs Kraịst ume ma nata ike Ya dị nsọ. Anyị ekwesịghị ele anya ebe ọzọ karịa na Onye Nzọpụta nʻOnwe Ya.

“[Onyenwe anyị] gwara ndị ahụ okwu, na-asị:

“Lee, abụ m Jizọs Kraịst. …

“Kulie ma bịa nso. …

“… Igwe mmadụ ahụ garuru, ma rụnye aka ha niile n’akụkụ ya, ma metụ aka n’apa niile nke ntu niile ahụ n’aka ya abụọ na n’ụkwụ ya abụọ; ma nke a ka ha mere, na-agaru n’otu n’otu … ma hụ n’anya ha, ma jiri aka ha metụ, ma mata n’eziokwu ma gbaa ama, na ọ bụ ya.”

Ana m akpọku unu itule ihe nke a nwere ike iyi na ndụ nke ụmụntakịrị. Ha na-anụ ama niile nke Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya? Ha na-ahụ oyiyi dị nkwanye ugwu, kwere ofufe nke ije ozi Ya na ịbụ chi? Ha na-enwe mmetụta ma na-amata Mmụọ Nsọ na-agba ama nke nsiridị na ịdị nsọ Ya? Ha maara maka ozi na ozi mgbasa ozi ọma Ya?

Sonyere Jizọs Kraịst na Nzukọ nsọ Ya

Nke abụọ, sonyere Jizọs Kraịst na Nzukọ nsọ Ya.

Ndị Eze Benjamin gabigara nnukwu mgbanwe nke obi ma site nʻọgbụgba ndụ raranye ndụ ha ịdị na-eme uche nke Chineke. Niihi ọgbụgba ndụ ha mere ha na Chineke na Jizọs Kraịst, a “na-akpọ ha ụmụ nke Kraịst, ụmụ ya ndị nwoke, na ụmụ ya ndị nwanyị.” Dị ka ndị otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, anyị nwere oke na ọrụ nke ọgbụgba ndụ iwu alaeze Ya ma kwadoo maka nlọghachi Ya.

Akụrụngwa niile iji kwadoo ụmụntakịrị maka oge ndụ n’ụzọ ọgbụgba ndụ nke Chineke.

Kedụ otu anyị nwere ike isi nyere ụmụntakịrị aka mee ma debe ọgbụgba ndụ dị nsọ? Niime akwụkwọ Bịanụ, Soro M, niime appendix A na B, anyị na-ahụta ihe mmalite mkparịta ụka na ihe ọmụmụ nke ga-enye ezi na ụlọ niile ikike ma kwadoo ndị nkuzi na ndị ndu nʻọrụ ha dị nsọ iji kwadoo ụmụntakịrị maka oge ndụ nʻụzọ ọgbụgba ndụ nke Chineke.

Dịrịzie ka Jizọs Kraịst

Nke atọ, dịrịzie ka Jizọs Kraịst.

Niime Akwụkwọ nke Mọmọn, Onye Nzọpụta nyere ndị na-eso ụzọ Ya akpọrọ ọhụrụ ndụmọdụ ịn̄ọmị Ya nke ọma dị ka o kwere omume: “Kedụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ? N’ezie asị m unu, ọbụna dị ka m dị.”

Kedụ otu anyị ga-esi enyere ụmụntakịrị emere baptizim ma nabata aka mejuputa oke na ọrụ ọgbụgba ndụ ha ikpokọta onwe ha na ndị ọzọ nye Jizọs Kraịst? Ịbụ onye na-eso ụzọ nʻoge ndụ na-achọ ka anyị “bụrụ … ndị na-eme ihe ekwuru, na-abụghị naanị ndị na-anụ anụ.”

Mgbe a na-akpọ ndị na-eso ụzọ nke Onyenwe anyị ndị kachasị nta, biko were ohere ọbụla ji duo ha, tuziere ha aka, soro ha jee ije, ma nyere ha aka chọta Ụzọ ahụ. Nwee ndụmọdụ gị na ụmụntakịrị ndị a dị oke ọnụ ahịa dị ka ha na-akwado ikuzi ihe, gbaa ama, kpee ekpere, ma ọ bụ jee ozi ka ha nwee obisike ma nwete nhụmiihe ọn̄ụ nʻimejuputa oke na ọrụ ha. Chọọ ụzọ ndị mmụọ kpatere iji nyere ha aka bịa mata nke a bụ Nzukọ nsọ ha ma na ha nwere ọrụ dị oke mkpa ịrụ nʻikwado maka nlọghachi nke Onye Nzọpụta.

Dị ka Jizọs Kraịst na-abụrụzi ebe nlekwasị anya nke ndụ anyị, ihe anyị na-achọ, na otu anyị si achọ ya, ka agbanwere ruo ebighị ebi. Ntọghata na-agbanwe ihe niile! Ọ na-agbanwe ọdịdị anyị “na anyị enweghịkwa mmasị ime ihe ọjọọ, mana ime ihe dị mma esepụghị aka.” Ọ na-agbanwe otu anyị si egbu oge anyị, akụrụngwa anyị niile; ihe anyị na-agụ, ele, ege ntị nye, ma na-ekesa. Ọbụna na-agbanwe otu anyị si azaghachi na ajụjụ ọnụ pụrụiche, nke agụmakwụkwọ.

Anyị kwesịrị itinye Ìhe nke Jizọs Kraịst niime akụkụ nke ndụ anyị niile. Ọ bụrụ na anyị anaghị agba ama eziokwu nke ịbụ chineke na ndụ tupu ndụ anụ ahụ Ya, ozi mgbasa ozi ọma Ya dị nsọ, na Mbilite nʻọnwụ Ya na-agbawa ụlọ mkpọrọ nʻebe obibi anyị na na nzukọ ọbụla niile nke Nzukọ nsọ nke a, mgbe ahụ ozi anyị niile nke ịhụnaanya, ije ozi, ịkwụwa aka ọtọ, ịdị umeala, inwe obi ekele, na ọmịiko nwere ike ịghọ ihe efu na-akarịghị pep talk jaunty nke ibi ndụ echebara uche na ya. Ewezuga Jizọs Kraịst ọ dịghị ike ọbụla ịgbanwe, ọ dịghị nzube ịchọsi ike na ya, ma ọ dịghị mmkpezi nke ihe niile mere eme niime ndụ. Ọ bụrụ ma anyị kpaa agwa nkịtị nʻịbụ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, o nwere ike bụrụ oke ihe ọjọọ maka ụmụ anyị.

Mgbe anyị na-agwa ụmụ anyị na anyị hụrụ ha naanya, anyị ọ nakwa agwa ha na Nna ha nke Eluigwe na Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst hụkwara ha naanya? Ịhụnaanya anyị nwere ike nye nkasi obi ma kpatee mmụọ, mana ịhụnaanya Ha pụrụ ido nsọ, bulie elu, ma gwọọ ọrịa.

Jizọs nke a ekwesịghị ịbụ Jizọs ihe akụkọ ifo, ma ọ bụ Jizọs dị mfe, ma ọ bụ Jizọs na-enweghị anụ ahụ, ma ọ bụ Jizọs nkịtị, ma ọ bụ Jizọs ana amaghị onye ọ bụ, mana Ọkpara Chineke nke nwere ebube, nwere ike niile, bilitere nʻọnwụ, ebuliri elu, a na-efe ofufe, dị ike A Mụrụ Naanị, onye dị ike ịzọpụta. Ma dị ka nwata nta na ndị Filipin gbara ama na-amanye amanye nye m otu ụbọchị, “Anyị ruru ịzọpụta azọpụta!” Nʻaha nsọ na nke dị nsọ nke Ya “onye Chineke wepụtaworo ịbụ [nnukwu] omee udo,” Jizọs Kraịst, amen.