Ịdị-nsọ Nʻenye aka maka Ndụ anụ ahụ
Atụmatụ nke Nna anyị nke Eluigwe dobere nyemaka niile iji duzie anyị na njem niile nke ịnwụ anwụ anyị.
I.
Site n’aka Onye amụma Joseph Smith, Onyenwe anyị kpughere ihe ole na ole gbasara ndụ anyị tupu ụwa. Nʻebe ahụ anyị nọọrọ dịka ụmụ mmụọ nke Chineke. Nihi na Chineke chọro inyere ụmụ Ya aka inwe ọganihu, O kpebiri i kee ụwa ebe anyị nwere ike inweta ahụ, mụta ihe site na ahụmihe, zụlite agwa niile dị nsó, ma tulee anyị ịhụ ma anyị ga-edebe iwu nsọ niile nke Chineke. Ndị tozuru etozu ga-enwe “otuto a ga-atụkwasị ha n’elu isi ha niile ruo mgbe nile na mgbe nile.” (Ebreham 3:26).
Iji hiwe ọnọdụ niile nke atụmatụ dị nsọ nke a, Chineke họọrọ Ọkpara A Mụrụ Naanị Ya ị bụ Onye Nzọpụta anyị. Lucifa, onye atụmatụ ya nke ọzọ gara ebibi ohere nhọrọ nke mmadụ, ghọrọ Setan ma a “chụdara ya” Nʻịbụ onye a chụdara nʻụwa ma gọnarị ya ihe ugwu nke ndụ nke ịnwụ anwụ, e nyere Setan ohere ị nwaa “iduhie na ime ka ndị mmadụ kpuo isi, na-ịdọkpụrụ ha n’agha n’ọchịchọ obi ya, ọbụna ka ha ra bụ ndị na-agaghị an̄a ntị n’olu okwu nke Chineke” (Mozis 4:4).
Ihe dị mkpa na nnukwu atụmatụ nke Chineke maka itolite anwụ anwụ nke ụmụ Ya bụ ka ha nweta ahụmihe “mmegide nime ihe niile.”(2 Nephi 2:11). Dị nnọọ ka akwara anụ ahụ anyị na-apụghị ịzụlite ma ọ bụ na-edobe ya nʻemebighị iwu nke ike ndọda, otu ahụ ka uto na-anwụ anwụ na-achọ ka anyị dọlịa na imegide ọnwụnwa niile nke Setan na mmegide ndị ọzo na-anwụ anwụ. Nke kachasị mkpa maka uto nke ime mmụọ bụ ọchịchọ ahụ ịhọrọ nʻetiti ezi ihe na ihe ọjọọ. Ndị ahụ họrọ ezi ihe ga-aga nihu ruo ọdịnihu ebighị ebi ha. Ndị ahụ họrọ ihe ọjọọ—dịka mmadụ niile ga-eme nʻọnwụnwa dị iche iche nke ịnwụ anwụ—ga-achọ enyemaka nzọpụta, nke Chineke na-ahụ naanya mere ka ọpụta.
II.
Ka ọ dị ugbu a, enyemaka kachasị ike nke Chineke na-anwụ anwụ bụ onyinye Ya nke Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst, onye ga-ata ahụhụ ịkwụ ụgwọ ahụ ma dobe mgbaghara maka mmehie niile echegharịrị echegharị. Aja mgbaghara mmehie ahụ nke dị ebube ma nwee obi ọma na-akọwa ihe kpatara okwukwe nime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ji bụrụ ụkpụrụ nke mbụ nke ozi ọma ahụ. Aja mgbaghara mmehie Ya “na-eweta na mmezu mbilite nʻọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ”(Alma 42:23) ma ọ “agbaghara mmehie niile nke ụwa” (Alma 34:8), na-ehichapụ mmehie anyị niile echegharịrị ma nye Onye Nzọpụta anyị ike iji nyere anyị aka na-adịghị ike anyị niile nke ịnwụ anwụ.
E ewzụga mkpochapụ ahụ dị ebube nke mmehie niile e mere na ịnweta mgbaghara, atụmatụ nke Nna nke Eluigwe na-ahụ naanya na-enye ọtụtụ onyinye niile ndị ọzọ iji chebe anyị, gụnye ichebe anyị site na emeghị mmehie na mbụ. Ndụ anyị na-anwụ anwụ mgbe ọ bụla na-amalite site na nna na nne. Nʻezie, ha abụọ nọ, nwere onyinye niile dị iche iche iji duzie uto anyị. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya, enweghị ha bụ akụkụ nke mmegide anyị na-aghaghị imeri.
III.
Atụmatụ nke Nna anyị nke Eluigwe dobere nyemaka ndị ọzọ iji duzie anyị na njem niile nke ịnwụ anwụ anyị. A ga m ekwu maka anọ nke atụmatụ ndị ahụ. Biko ejidela m nye nọmba m nke anọ, nihi na enyemaka niile ndị a na-ejikọta ọnụ. Ọzọkwa, e nwere ihe nchebe ndị ọzọ dị ebere na mgbakwunye na ndị a.
Nke mbụ, A na m ekwu maka Ihē ma ọ bụ Mmụọ nke Kraịst. Nime nnukwu nkuzi ya nime Akwụkwọ nke Moronaị, Moronaị n̄omiri nna ya na “Mmụọ nke Kraịst ka enyere mmadụ niile, ka o wee mata ihe ọma site na ihe ọjọọ” (Moronaị 7:16). Anyị na-agụ otu nkuzi a na mkpughe ọgbara ọhụrụ niile:
“Ma Mụọ ahụ na-enye ìhè nye mmadụ ọbụla nke na-abịa n’ime ụwa; ma Mụọ ahụ na-agba ama nye mmadụ ọbụla rute ụwa nile, nke n̄ara ntị n’olu nke Mụọ ahụ.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:46).
Ọzọ: “N’ihi na Muọ m ka e zipụworo n’ime ụwa inye ndị dị umeala na ndị na-echegharị ìhè, na nye ndị na-amaghị Chineke ikpe-ọmụma.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 136:33).
Onyeisi Josef Fielding Smit kọwara akwụkwọ nsọ ndị a niile: “Onyenwe anyị a hapụghị mmadụ (mgbe a mụrụ ha nime ụwa a) nʻenweghị enyemaka, na-akpagharị iji chọta ihē na eziokwu, mana mmadụ niile … ka a mụrụ na ikike ịnata nduzi, ntụziaka ahụ, ndụmọdụ ahụ nke Mmụọ nke Kraịst ma ọ bụ Ihē nke Eziokwu.”
Nke abụọ nke enyemaka ukwu Onyenwe anyị wepụtara iji nyere anyị aka ịhọro ihe ziri ezi bụ ụyọkọ nke ntụziaka jikọtara ọnụ nime akwụkwọ nsọ niile dịka akụkụ nke atụmatụ nke nzọpụta (atụmatụ nke obi ụtọ). Ntụziaka ndị a niile bụ iwu nsọ niile, emume nsọ niile, na ọgbụgba ndụ niile.
Iwu nsọ niile na-akọwa ụzọ Nna anyị nke Eluigwe debeworo anyị maka anyị ịga nihu ruo ndụ ebighị ebi. Ndị mmadụ na-eche iwu nsọ niile dị ka ụzọ Chineke si ekpebi onye a ga-ata ahụhụ aghọtaghị nzube a nke atụmatụ obi ọma nke ịhụnaanya nke Chineke. Nʻụzọ ahụ, anyị na-eji nwayọọ nwayọọ nweta mmekọrịta dị mkpa anyị na Onye Nzọpụta anyị ma tozuo maka mmụba nke ike Ya iji nyere anyị aka nʻụzọ anyị na-aga ebe O chọrọ maka anyị niile. Nna nke Eluigwe chọrọ ka ụmụ Ya niile laghachi nʻalaeze selestịal, ebe Chineke na Onye Nzọpụta anyị bi, na inwe ụdị ndụ nke ndị ahụ bi nime ebube selestịal ahụ.
Emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile bụ akụkụ nke iwu ahụ nke na-akọwa ụzọ nke ndụ ebigh-ebi. Emume nsọ niile, na ọgbụgba ndụ dị nsọ anyị na Chineke na-eme site na ha, bụ nzọụkwu niile achọrọ na nchekwa dị mkpa nʻụzọ ahụ. Ọ masịrị m iche echiche maka ọrụ nke ọgbụgba ndụ niile dị ka nke na-egosi na nʻokpuru atụmatlu nke Chineke, ngọzi Ya niile kachasị elu ka a na-enye ndị ahụ kwere nkwa nʻọdịnihu idebe ụfọdụ iwu nsọ na ndị na-edebe nkwa ndị ahụ.
Enyemaka Chineke niile ndị ọzo maka ime nhọrọ ziri ezi bụ ngosipụta nke Mmụọ Nsọ. Mụọ Nsọ bụ ọnye nke atọ nime Chukwu. Ọrụ Ya, a kọwara nime akwụkwọ nsọ, bụ ịgba akaebe maka Nna na Okpara ahụ, ịkụziri anyị ihe, na-echetara anyị ihe niile, na iduzi anyị nʻeziokwu niile. Akwụkwọ nsọ niile gụnyere ọtụtụ nkọwa niile nke “ngosipụta niile” nke Mmụọ Nsọ, dịka ịgba ama nke mmụọ nsọ na nzaghachi nye ajụjụ gbasara eziokwu nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Ngosipụta agaghị enwe mgbagwoju anya na onyinye nke Mmụọ Nsọ, nke a na-enye ma emesịa baptizim.
Otu nime ihe kachasị mkpa nke enyemaka niile Chineke nyere ụmụ Ya kwesịrị ntụkwasị obi bụ onyinye nke Mmụọ Nsọ. Mkpa nke onyinye a pụtara ihē nʻeziokwu na a na-enye ya mgbe nchegharị na baptizim site na mmiri gachara, “ma mgbe ahụ [akwụkwọ nsọ ahụ kọwara] ka nsachapụ nke mmehie unu niile site n’ọkụ na site na Mụọ Nsọ ga-abịa.” (2 Nephi31:17). Ndị nwere mgbaghara mmehie nke a—ma na emezigharị kwa ịdị ọcha ha site na nchegharị kwa ụbọchị na ibi ndụ dịka ọgbụgba ndụ ahụ ha na-eme site na emume nsọ nke oriri nsọ—ruru eru maka nkwa ahụ na Mmụọ Nsọ, Mmụọ Nsọ nke Onyenweanyị, “na oge niile … ga-anọnyere ha” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77.).
Ya mere, Onyeisi Josef F. Smit kuziri na Mmụọ Nsọ ahụ ga “eme ka uche niile nke ndị mmadụ pụta ihē nihe banyere ihe niile nke Chineke, ime ka ha kwenye nʻoge mgbanwe ha mere na ha mere uche nke Nna, ma ka ọ dị nime ha ịgba ama na-adịgide dị ka onye-nso na ndụ, na-eme ihe dịka onye ndụ nke kwesịrị ntụkwasị obi nime eziokwu niile ma na-emeju ha kwa ụbọchị nʻọn̄ụ na obi ụtọ, na ọchịchọ ime ihe ọma nye mmadụ niile, na-ata ahụhụ karịa ime ihe ọjọọ, na-enwe obi ọma na obi ebere, ogologo ntachi obi na ọrụ ebube. Ndị niile nwere onyinye a na-enweghị atụ, pel nke oke ọnụ ahịa a, na-enwe akpịrị ịkpọ nku na-aga nihu maka ezi omume. Ma-enweghị enyemaka nke Mmụọ Nsọ,” Onyeisi Smit kwuru, “ọ dịghị mmadụ na-anwụ anwụ nwere ike jee ije nʻụzọ kwu ọtọ na warara. ”
IV.
Site nʻọtụtụ enyemaka dị ike iduzi anyị na njem anyị niile , ọ bụ ihe na-akụda mmụọ na ọtụtụ ndị mmadụ adịbeghị njikere maka nzukọ ha a họpụtara ha na Onye Nzọpụta anyị na Onye Mgbapụta, Jizọs Kraịst. Ilu Ya banyere ụmụ agbogho iri ahụ na-amaghị nwoke, ekwuru ugboro ugboro nime ọgbakọ nke a, na-egosi na nime ndị a kpọrọ oku izute Ya, ọbụ naanị ọkara ga-adị na nkwado.
Anyị niile mara ihe ịmaatụ niile nke adịghị na nkwado: ndị mgbasa oziọma lọtara bụ ndị kụbiworo uto ime mmụọ ha site na oge niile ha dapụrụ nʻokwukwe., ndị ntoroọbịa tinyeworo uto ime mmụọ ha nihe ize ndụ site na ịghara ịsonye na nkuzi na mmemme niile nke Nzukọ nsọ, ndị ikom ndị yigharịrị echichi ha nye Ọkwa nchụaja Melkizedek, ndị nwoke na ndị nwanyị—mgbe ụfọdụ ụmụ ụmụ nke ndị ọsụ ụzọ mara mma ma ọ bụ nne na nna tozuru oke—bụ ndị hapụworo ụzọ ọgbụgba ndụ dị mkpụmkpụ nke ime na idobe ọgbụgba ndụ niile nime tempụl dị nsọ.
Ọtụtụ nke ntụgharị niile dị otu a na-eme mgbe ndị otu na-agbasoghị atụmatụ nlekọta mmụọ bụ isi nke ekpere nke onwe, ọmụmụ akwụkwọ nsọ, na nchegharị ugboro ugboro. Nʻụzo dị iche, ụfọdụ na-eleghara anya imegharị ọhụrụ ọgbụgba ndụ kwa izu ụka site na ikere oke oriri nsọ ahụ. Ụfọdụ na-ēkwu na Nzukọ nsọ ahụ anaghị egbo mkpe ha niile; were ihe ha na-aghọta dịka mkpa ha dị nihu ka ọnọchie anya nke ihe Onyenwe anyị nyeworo na ọtụtụ nkuzi Ya niile na ohere niile maka ije ozi anyị di mkpa nye ndị ọzọ.
Ịdị umeala nʻobi na ntụkwasị obi bụ ihe ngwọta niile maka mgbagha niile dị otu ahụ. Dịka Akwụkwọ nke Mọmọn na-akuzi, Onyenwe anyị ahụ “ na-agọzi ma na-enye ndị tinyere ntụkwasị-obi ha na ya ime nke ọma.” (Hilaman 12:1). Ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị bụ mkpa pụrụ iche maka ndị niile na-atụle iwu nsọ niile nke Chineke na nkuzi niile nke ndị amụma Ya megide nchọpụta ọhụrụ na amamiihe nke mmadụ.
E kwuwo m maka ọtụtụ enyemaka niile nke Nna bi Nʻeluigwe anyị hụrụ naanya nyere ụmụ Ya iji nyere ụmụ Ya aka ịlaghachite nye Ya. Akụkụ anyị nʻatụmatụ dị nsọ nke a bụ ịtụkwasị Chineke obi ma ịchọ na ijiri enyemaka ndị a dị nsọ mee ihe, nke kachasị Aja mgbaghara mmehie nke Ọkpara Ya ọ hụrụ naanya, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị, Jizọs Kraịst. Ana m ekpe ekpere na anyị ga-akuzi, ma bie ndụ ụkpụrụ ndị a niile n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.