Ọgbakọ Zuru ọha
Ịkwụghachi ụgwọ Ngọzi niile
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


11:18

Ịkwụghachi ụgwọ Ngọzi niile

Ebe ọtụtụ ọnọdụ dị na ndụ nwere ike bụrụ ihe karịrị anyị ijikwakata, ọ dịghị onye ọbụla niime anyị nọ ebe aka na-agaghị erute ngọzi niile nke Onyenwe anyị na-enweghị nsọtụ.

Ije ozi niime Otu Bishọp Nduzi, e nwewo m ohere nke izute Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a na gburugburu ụwa niime ọnọdụ na omenaala dị iche iche. Anọ m rịị na-enwe mkpatemmụọ esepụghị aka site nʻokwukwe unu na-adịgide na nnukwu ịhụnaanya na-ebe Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nọ. Otu ọ dị o metụkwawo m na-ahụ site nʻọnọdụ ihe isi ike dị iche iche ọtụtụ mgbe ọtụtụ niime unu na-ezute—ụdị ihe aka mgba ndị dị ka ọrịa, nkwarụ, enweghị ego otu a chọrọ, ohere maka alụmdi ma ọ bụ agụmakwụkwọ na-adịghị ọtụtụ, mmetọ site nʻaka ndị ọzọ, na mmachi ma ọ bụ ihe mgbochi ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ, mnwale ndị a nwere ike yie ihe ga-adọla ọganiihu gị azụ ma maa ezigbo mbọ gị niile iji bie ndụ ozi ọma nʻuju aka niihu, na-eme ya ka o sie ike karịa ije ozi, ife ofufe, na imejupụta ọrụ ndị dị nsọ.

Ezigbo ndị enyi m, ọ bụrụ na o nwetuwo rịị mgbe unu chere na inwechaghị ohere otu o kwesịrị ma ọ bụ nọghị nʻọnọdụ ime ihe site nʻọnọdụ niile nke ndụ gị, a chọrọ m ka ị mara nke a: Onyenwe anyị nʻonwe ya hụrụ gị naanya,. Ọ maara ọnọdụ gị niile, ma ọnụ ụzọ nke ngọzi Ya niile nọgidere ghere obosara oghe nye gị na-agbanyeghị ihe aka mgba ndị ị na-ezute.

A mụtawo m eziokwu nke a site na nhụmiihe nke onwe na, na-agbanyeghị iyi dị ka ihe na-abaghị uru, hapurụ echiche na-adịgide adịgide niime m. Mgbe m gbara afọ 22, ebe m na-eje ozi na French Air Force nọ na Paris, ọ tọrọ m obi ụtọ ịmata na Okenye Neal A. Maxwell, Onye ozi nke Onyenwe anyị, ga-ekwu okwu nʻọgbakọ na Champs-Élysées. Otu osila dị, ntakịrị oge tupu mmemme ahụ, anatara m ikike ịkwọga onyeisi ọrụ gbagoro agbago nʻebe ọdọ ụgbọ elu na kpọm kwem oge ọgbakọ ahụ na-ebido.

Agharịpụrụ m. Mana na mkpebi ije, a gara m kwọpụ onyeisi ọrụ ahụ ma gawa ọsịsọ ebe ọgbakọ ahụ. Mgbe m chọtasịrị ebe m ga-anyaba ụgbọala, a gbara m ọsọ gbadawa na Champs-Elysées ebe a na-eme ọgbakọ ahụ ma rute na-ekughị ume ebe ọ fọrọ naanị nkeji ise tupu ọgbakọ ahụ e bie. Dị nnọọ ka m banyere, a nụrụ m ka Okenye Maxwell na-ekwu, “Ugbu a aga m enye unu ngọzi nke onye ozi.” Notu oge ahụ, e nwetara m nhụmiihe nke ime mmụọ mara mma, na-adịghị nchefu. E nwere m mmeri nke Mmụọ ma mkpụrụokwu niile nke ngọzị ahụ yiri ka ihe mikpuru eriri niile nke mkpụrụ obi m, dị ka a ga-asị na-ekwuru ha naanị maka m.

Nhụmiihe m nwetara ụbọchị ahụ dịịrị nta otu ọ dị ngosipụta dị ike nke akụkụ atụmatụ nke Chineke maka ụmụ Ya na-enye nkasi obi: Mgbe ọnọdụ ndị karịrị anyị gbochiri anyị site na-imejupụta ọchịchọ niile nke obi anyị ziri ezi, Onyenwe anyị ga-akwụghachi anyị ụgwọ nʻụzọ ndị ga-enye anyị ohere ịnata ngọzi niile O kwere na nkwa.

Eziokwu nke a na-enye mmasi obi ike ka ehiwere nʻisi ụkpụrụ atọ nke ahụrụ niime ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere.

  1. Chineke hụrụ onye ọbụla niime anyị naanya nʻụzọ zuru oke. “Ọ na-akpọku [anyị] niile íbịakwute ya ma keta oke ịdị mma ya.” Atụmatụ nke Mgbapụta Ya na-ahụ na mmadụ niile, na-enweghị onye ọbụla a hapụrụ, ka a ga-enye nnọọ ohere otu ụbọchị ịnata ngọzi niile nke nzọpụta na mbuli elu.

  2. Niihi na Chineke ziri ezi ma dị obi ebere ma atụmatụ Ya zuru oke, Ọ gaghị ama anyị ikpe maka ihe ndị karịrị anyị ike. Okenye Neal A. Maxwell kọwara na “Chineke …na-ahụta nʻobi ebere ọ bụghị naanị ọchịchọ anyị na ịgba nkà anyị, mana ogo niile nke ihe isi ike nke ọnọdụ anyị ndị gbara iche iche borokwasịrị nʻisi anyị.”

  3. Site na Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya, anyị nwere ike inweta ume iji nagide ma nʻikpeazụ merie ihe aka mgba niile dị na ndụ. Dị ka Alma kuziri, Onye Nzọpụta wekwasịrị onwe Ya ọ bụghị naanị mmehie niile nke onye chegharịrị echegharị mana kwa “mgbu niile na ọrịa niile nke ndị ya” nakwa “adịghị ike ha niile.” Site otu a, karịchaa ịnapụta anyị site na amaghịama anyị niile, ebere na amara nke Onyenwe anyị na-akwagide anyị nʻoge mmegbu niile, ezughị oke niile, na mmachi niile nke nhụmiihe nke ndụ anụ ahụ bokwasịrị anyị.

Ịnata nkwụghachi ụgwọ ngọzi ndị a niile na-eji ọnọdụ ndị dị an̄aa abịa. Onyenwe anyị gwara anyị ka anyị mee “ihe niile anyị nwere ike ime” ma “nye mkpụrụ obi [anyị] dum dị ka onyinye ebe ọ nọ.” Nke a chọrọ ọchịchọ miri emi, obi dị ọcha ma kwesị ntụkwasị obi, na mgbasi ike anyị kachasị ukwuu nʻidobe iwu nsọ Ya niile ma mee ka echiche anyị na nke Ya makọọ.

Mgbe mbọ niile nke obi anyị na-erughị ka anyị tụrụ anya niihi ọnọdụ ndị karịrị anyị, Onyenwe anyị ka nwekwara ike nabata ọchịchọ niile nke obi anyị dị ka onyinye zuru oke. Onyeisi Dallin H. Oaks kuziri, “Aga agọzi anyị maka ọchịchọ niile nke obi anyị ziri ezi ọbụladị ụfọdụ onodụ ndị nọ nʻezi emewo ka ọ hapụ ikwe omume anyị itinye ọchịchọ ahụ nʻọrụ.”

Dị ka Onye amụma Joseph Smith chegburu onwe ya maka nwanne ya nwoke Alvin, onye nke nwụrụ na-enwetaghị emume nsọ niile nke ozi ọma dị oke mkpa, ọ natara mkpughe nke a na-enye nkasi obi: “Ndị niile ga-anwụ site ugbua gawa na-amaghị maka [ozi ọma], ndị nke gaara eji obi ha niile anata ya, ga-abụ ndị nketa oke nke [alaeze selestịal nke Chineke].” Onyenwe anyị mesịrị gbakwunye, “Niihi na Mụ onwe m, Onyenwe unu, ga-ekpe ụmụ mmadụ niile ikpe dị ka otu ọrụ ha siri dị, dị ka otu ọchịchọ nke obi ha siri dị.”

Ihe dị Onyenwe anyị mkpa abụghị nnọọ ma anyị dị ike mana ma ọ bụ na anyị dị njikere ime ihe niile anyị nwere ike ime iji soro Ya dị ka Onye Nzọpụta anyị.

Otu enyi otu mgbe kasiri onye mgbasa ozi ọma dị nta na-eru uju obi maka ntọghapụ ngwa ngwa ya niihi ihe banyere ahụ ike, na-agbanyeghị ekpere ya ndị si nʻobi na ezigbo ọchịchọ nke obi ya ije ozi. Enyi nke a kọwara otu ihe e dere nʻakwụkwọ nsọ ebe Onyenwe anyị mara ọkwa na mgbe ụmụ Ya “jiri ume ha niile jee” ma “na-akwusịghị nrụsi ọrụ ike ha” iji mejupụta iwu nsọ Ya niile, “ma ndị iro ha [nke nwere ike gụnye ọnọdụ ọjọọ niile dị niime ndụ anyị] gbochie ha site nʻịrụ ọrụ ahụ, lee, ọ dịịrị m ihapụ ịchọ ọrụ ahụ ọzọ n’aka ndị [nke ahụ], mana ịnabata onyinye ha niile.”

Enyi m gbara ama nye nwata nwoke ahụ na Chineke maara na o mewo ihe o kwesịrị ime nʻịza oku ije ozi. Ọ kasiri ya obi na Onyenwe anyị anabatawo onyinye ya ma na ngọzi niile e kwere ndị mgbasa ozi ọma kwesịrị ntụkwasị obi na nkwà bụ nke a na-agaghị ejichi.

Nkwụghachi ụgwọ ngọzi niile nke Onyenwe anyị ọtụtụ mgbe na-abịa site na obi ọma na ozi nke ndị ọzọ na-enyere anyị aka mejupụta ihe anyị na-enweghị ike ime nʻonwe anyị. E chetara m otu oge mgbe, ibi nʻebe tere aka site nʻebe otu niime ụmụada anyị bi na France nọ, ọ rara anyị ahụ inyere ya aka mgbe ọ mụchara nwa rara ahụ. Nʻotu izu ụka ahụ kwa ngalaba ukwu anyị na Uta chọrọ enyem aka maka onye nne nke mụworo ejima. Nwunye m, Valérie, wepụtara onwe ya iwetara ya nri —jiri ekpere nʻobi ya maka nne ọhụrụ nke a na nwa anyị nke nwanyị nọ na mkpa. Mgbe na-adịghị anya, anyị matara na ụmụnne nwanyị nọ na ngalaba ukwu nke nwaada anyị nwanyị na France ahaziela ị na-eweta ihe oriri maka ya na ezi na ụlọ ya. Nye anyị, Chineke azawo ekpere anyị, ziga ndị mmụọ ozi Ya iwete nkasi obi mgbe anyị na-enweghị ike.

Mgbe a na-ezute mmachi niile na ihe aka mgba niile, ka anyị mata ngọzi niile nke onwe anyị—onyinye niile, akụrụngwa niile, na oge anyị—ma jiri ha jeere ndị ọzọ nọ na mkpa ozi. Site nʻịdị na-eme otu ahụ, ọ bụghị naanị na anyị ga na-agọzi ndị ọzọ, mana na-eweta ọgwụgwọ na nkwụghachi ụgwọ niime ndụ nke onwe anyị.

Otu niime ụzọ ndị kachasị ike anyị nwere ike iji tụnye ụtụ na nkwụghachi ụgwọ ngọzi niile nke Chineke bụ site na ọrụ nnọchite anya anyị na-arụ maka ndị nna nna ochie anyị ha niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Anyị na-eme emume nsọ niile nʻaha ha, anyị na-esosi ike eme ihe na nnukwu ọrụ nke nzọpụta nke Onyenwe anyị, na-eji onyinye anyị na ike anyị niile iji weta ọtụtụ ngọzi nye ndị ahụ na-enweghị ohere ịnata ha nʻoge ndụ nke anụ ahụ ha.

Ozi ịhụnaanya ahụ anyị na-eje niime tempụl nsọ niile na-echetara anyị na amara nke Onye Nzọpụta na-agbatị gafee ndụ nke a. Na ndụ nke na-abịa abịa, e nwere ike nye anyị ohere ọhụụ iji mejuputa ihe anyị na-enweghị ike ime na ndụ apụrụ ịnwụ anwụ nke a. Nʻịgwa ụmụnne ndị nwanyị okwu ndị nke na-aka enwetabeghị ọnọnye dị ebighị ebi, Onyeisi Lorenzo Snow na-ịhụnaanya kwuru: “Enweghị Onye nsọ Ụbọchị ikpeazụ a nke nwụrụ mgbe o bichara ndụ na nkwesị ntụkwasị obi nke ihe ọbụla ga-efunahụ niihi enweghị ike imezu ụfọdụ ihe mgbe a na-enyeghị ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ohere niile. … Ha ga-enweta ngọzi niile, mbuli elu, na otito nke nwoke ma ọ bụ nwanyị ọbụla ga-enweta onye nke nweburu ohere nke a.”

Ozi nke Olileanya na nkasi obi nke a bụ maka anyị niile, ụmụ Chineke. Ọ dịghị onye ọ bụla niime anyị nwere ike zere aka mgba niile na mmachi niile nke ndụ anụ ahụ. A sị ka e kwuwe, anyị niile ka a mụrụ site na-enweghị ike dị anyị niime iji zọpụta onwe anyị. Otu ọ dị anyị nwere Onye Nzọpụta dị ịhụnaanya, “anyị ma na ọ bụ site n’amara [Ya] ka e si zọpụta anyị, mgbe anyị mesịworo ihe niile anyị nwere ike ime.”

Ana m agba ama na ebe ọtụtụ ọnọdụ dị niime ndụ nwere ike bụrụ ihe karịrị anyị, ọ dịghị onye ọbụla niime anyị nọ ebe aka na-agaghị erute ngọzi niile nke Onyenwe anyị na-enweghị nsọtụ. Site na Aja mgbaghara mmehie Ya, Onye Nzọpụta ga-akwụghachi anyị ụgwọ maka adịghị ike niile na ikpe nsọmanya ma ọ bụrụ ma anyị enye Ya obi anyị dum. Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.