Emesịkwala Obi Gị Ike
Ọ bụrụ na anyị nwee ezi nchegharị, nwee obi umeala, ma tụkwasị obi na Onyenwe anyị ma dabere na Ya, obi anyị ka a ga-eme ka ọ dị nro.
Mweghachi nke Oziọma nke Jizọs Kraịst bidoro mgbe Chineke Nna na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya, pụtakwutere Josef Smit nta ahụ, wee zaa ekpere umeala ya. Dịka otu akụkụ nke mweghachite ahụ, Josef Smith tụgharịrị otu ndekọihe mgbe ochie site n’onyinye na ike nke Chineke. Ndekọihe ahụ kwuru maka “Mmekọrịta Chineke na ndị nile bi na Amerika mgbe ochie ma ihe dị n’ime ya bụ uju nke ozi-ọma mgbe niile na-adigide.”
Mgbe m bụ nwata nwoke, dịka m na-agụ Akwụkwọ nke Mọmọn, A na m echekarị ihe kpatara Laman na Lemuel ekwereghi eziokwu niile nke enyere ha, ọbụnadị mgbe mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtakwuru ha ma kwuoro ha okwu ihu nʻihu. Gịnị kpatara Laman na Lemuel enweghi obi umeala ma rube isi nye nkuzi niile nke nna ha, Lehi, na nwanne ha nwoke nke ntakịrị Nefi?
A chọtara m otu niime azịza nye ajụjụ nke a niime 1 Nefi, nke kwuru na Nefi nwere mwute “n’ihi isi-ike nke obi ha.” Nefi jụrụ ụmụnne ya ndị toro eto, “Olee otu obi unu jiri sie ike otu a, wee kpuo kwa isi n’ime obi unu niile?”
Gịnị ka ọ pụtara inwe obi nke emesiri ike?
Ntụgharị na asụsụ Korea maka okwu nke a “imesi ike” nime Akwụkwọ nke Mọmọn bụ 완악 (Wan-Aak: 頑惡). Nkebiokwu nke a na-ewere mkpụrụ ederede nke ndị China nke a “Wan” (頑), nke pụtara “ime isiike,” na “Aak” (惡), nke pụtara “obi ọjoọ.” Mgbe anyị mesịrị obi anyị ike, isi ga-ekpu anyị, ma ihe ọma agaghị abata niime obi anyị ma ọ bụ uche anyị ma ọlị. Anyị ga-emenwe isiike ma bido lekwasịwa anya anyị karịa nʻọchịchọ niile nke ụwa, wee na-emechi obi anyị nye ihe ndị nke Chineke. Anyị ga-ahọrọ ịlekwasị anya naanị nʻechiche nke onwe anyị ma ghara ịnabata echiche niile na odudu nke ndị ọzọ. Anyị ga-aghara ịhọrọ ịmepee obi anyị nye ihe niile nke Chineke kama nye ihe mmetụta niile nke ụwa na nke onye iro. Mgbe anyị mesịri obi anyị ike, anyị na-emegide mmetụta nke Mmụọ Nsọ ahụ. Anyị “na-eji nwayọ echeta Onye-nwe” ma ka oge na-aga anyị “akarịa okwu Ya imetụ anyị n’obi”.
Alma kuziri ndị Amọnịha na ụfọdụ ha “ga-ajụ Mmụọ nke Chineke site isi-ike nke obi ha nile.” Ọ kuzikwara na “ndị ahụ ga-emesi obi ha ike, ha ka e nyere akụkụ ka ntakịrị nke okwu ahụ ruo mgbe na ọdịghị ihe ha ga-amata gbasara ihe omimi ya nile.” Nʻikpeazu, Mmụọ ahụ ga esepụ aka, ma Onyenwe anyị “ga ewepụ okwu [Ya]” site nʻebe ndị ahụ mesiri obi ha ike, dịka kwa Laman na Lemuel. N’ihi Laman na Lemuel gara n’ihu mesie obi ha ike wee jụụ mmetụta niile nke Mmuo nsọ ahụ ma ghara ịnabata okwu niile na nkuzi niile nke nna ha na nke Nefi, ha jụrụ kpam kpam eziokwu niile ebighị ebi ahụ sitere na Chineke.
Na-emeghi otu Laman na Lemuel mere, Nefi gara niihu wedata onwe ya nʻala wee na-achọ odudu site n Mmụọ nke Onyenwe anyị. Nihi nke a, Onyenwe anyị mere ka obi Nefi dị nro. Nefi kwuru na “ebekuru m Onye-nwe; ma lee ọ bịara leta m, mee kwa ka obi m dị nro na m kwenyere okwu nile nke nna m kwusịworo.” Onyenwe anyị nyere Nefi aka ịnabata, ghọta, ma kwere nʻihe omimi niile nke Chineke na okwu Ya niile. Nke a mere Nefi enwee ike iji nwe nnonyere na-adịgide nke Mmụọ Nsọ.
Kedụ ihe anyị nwere ike ime ka anyị ghara ime ka obi anyị sie ike?
Nke mbụ, anyị nwere ike ị na-echegharị ụbọchị niile.
Onye Nzọpụta anyị kuziri, “Onye ọbụla nke chegharịrị ma bịakwute m dị ka nwantakịrị, ya ka m ga-anabata” Onye amụma anyị anyị hụrụ naanya, Onyeisi Russell M. Nelson kuziri:
“Inwe nchegharị bụ ọtụghe eji enwe ọganiihu. Okwukwe na-enweghị ntụpọ na-eme ka anyị na-aganiihu n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ.
“Biko atụla ụjọ ma ọ bụ gbuo oge inwe nchegharị. Setan na-enwe an̄ụrị n’oke nchekasị nke obi gị. … Malite n’ụbọchị taa inweta nhụmiihe ọn̄ụ nke iwezuga mmadụ eke. Onye Nzọpụta hụrụ anyị naanya mgbe niile mana kachasị mgbe anyị chegharịrị.”
Dịka anyị na-enwete nhụmihe ọn̄ụ nke obi emere ka ọ dị nro ma bịakwute Onyenwe anyị, anyị na-adịrị “dị ka nwata, na-adanye, dị nwayọ, dị umeala, nwee ndidi, juputa n’ịhụnaanya, dị na njikere ịdanye n’ihe niile nke Onyenwe anyị hụworo na o kwesịrị ịdakwasị ya, ọbụna dị ka nwatakịrị na adanyere nna ya.”
Nke abụọ, anyị nwere ike gosiwe obi umeala.
Nchegharị kwa ụbọchị ga-ewete obi umeala nye obi anyị niile. Anyị chọrọ ịdị umeala nihu Onyenwe anyị, dịka nwa ntankịrị onye na-erubere nna ya isi. Mgbe ahụ anyị ga-enwe mgbe niile Mmụọ Nsọ ahụ ịnọnyere anyị ma a ga-eme ka obi anyị dị nro.
Nwunye m Sue, na mụ amarawo otu di na nwunye ọma ihe ruru afọ anọ gara aga. Mgbe anyị zutere ha na mbụ, di ya bụ onye otù Nzukọ nsọ dị ọhụrụ ma nwunye ya ka na-ezute ndị mgbasa ozi ọma iji mụọ oziọma ahụ. Ọtụtụ ndị mgbasa ozi ọma zutere nke nwanyị iji nyere ya aka bịakwute Kraịst. Anyị nwere mmetụta na ọ nwetawo ama na-enwu ọkụ nke ozi ọma ma maara na Nzukọ nsọ bụ eziokwu. Ọ na-enwetakarị mmetụta nke Mmụọ nʻoge nleta niile nke anyị ma ọ na-esonye na ọgbakọ niile jiri obi ya. Ọ na-amasị ya ịkparịta ya ndị otù ọma nke ngalaba ukwu ahụ. Nagbanyeghi nke a, ọ rara ya ahụ ikpebi obi ịbanye niime mmiri niile nke baptizim. Otu ụbọchị ọ nọ na-agụ Moronaị 7:43–44, nke kwuru:
“Ma ọzọ, lee asị m unu o nweghị ike inwe okwukwe na olile-anya, ma ọbụghị na ọ ga-adị nwayọ ma wedata obi ala.
“Ọbụrụ otu ahụ, okwukwe [gị] na olile-anya bụ ihe efu, n’ihi na ọdịghị onye a na-anabata nʼiru Chineke, ma ọbụghị na ọ di nwayọ ma wedata obi ala.”
Mgbe ọ gụsịrị amaokwu ndịa, ọ matara ihe ọ kwesịrị ịme. Ọ chere na ọ ghọtawo ihe ọ pụtara ịdị nwayọ na ịdị umeala. Otu ọ dị, nghọta ya ezughi oke iji nwee okwukwe na olile anya iji rubere iwu nsọ niile nke Chineke isi. Ọ hapụziri ime isiike ya na amamiihe nke onwe ya. Ọ malitere ịdị umeala site na nchegharị ejiri obi ọcha mee. Ọ malitere ịghọta obi umeala site n’otu ahụ echiche nke anya Chineke sịrị dị. Ọ dabere na Nna nke Eluigwe ma kpee ekpere ka emee ka obi ya dị nro. Site nʻekpere niile ndịa, ọ nwetere mmetụta dịka Mmụọ na-agbara ya aka ebe na Nna nke Eluigwe chọrọ ka eme ya baptizim.
Ma di ma nwunye kwuru na ka ha na-enwe obi umeala karịa, otu ahụ ka ha na-abịa aghọta okwu niile nke Chineke karịa, ma emere ka obi ha dịrị nro iji soro nkuzi niile nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.
Nke atọ, anyị ga-atụkwasị obi nʻOnye Nzọpụta ma dabere na Ya.
Nefi bụ nnukwu ọmụmatụ nke ịhapụ obi ya ka ọ dị nrọ site na-ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị. Ọ kuziri, “A tụkwasịwo m gị obi, ma a ga m atụkwasị gị obi ruo mgbe nile. A gaghị m etinye ntụkwasị-obi m n’aka nke anụ arụ.” Nʻotu aka ahụ, niime otu mkpughe enyere Onye amụma Josef Smith, Onyenwe anyị kwuru, “Tinye ntụkwasị-obi gị na Mụọ ahụ nke na-edụba n’ime ihe ọma—e, ime ihe ziri-ezi, ije-ije n’umeala.” Mgbe anyị tụkwasịrị obi na Onyenwe anyị ma dabere na Ya, Ọ ga-eme ka obi anyị dị nro, ma a ga-akwado anyị niime mnwale anyị niile, nsogbu niile, na mkpagbu niile.
Ọ bụrụ na anyị nwee ezi nchegharị, nwee obi umeala, ma tụkwasị obi na Onyenwe anyị ma dabere na Ya, obi anyị ka a ga-eme ka ọ dị nro. Mgbe ahụ Ọ ga-awụkwasị Mmụọ Ya nʻisi anyị ma gosi anyị ihe dị omimi niile nke eluigwe. Anyị ga-ekwere nʻokwu niile nke Ọ kuziworo, ma nghọta anyị ga-adịkwu omimi.
Onye Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst bụ ọmụmatụ kachasị nke ịdị nwayọọ n’obi. Niime 2 Nefi 31:7, anyị na-agụ, “Ma na na-agbanyeghị ịdị nsọ ya, o gosịrị ụmụ nke mmadụ na, dịka n’anụ arụ ọ na-eme onwe ya umeala n’iru Nna ya, ma gbaara Nna ya aka-ebe na ọ ga-erubere ya isi n’idebe iwu-nsọ ya nile.” Nagbanyeghi na Ọ dị nsọ ma zuo oke, Ọ wedatara onwe Ya nʻumeala nʻiru Nna ma rubere Ya isi site na-ịme baptizim.
Na njedebe nke ndụ anụ ahụ Ya, Jizọs Kraịst rara uche nke onwe Ya nyefee Nna Ya site na-ịn̄ụ iko ilu ahụ. Ntaram ahụhụ nke a mere ya a “maa jijiji n’ihi mgbu, ma gbaa ọbara site na ntakịrị oghere ọbụla, ma taa ahụhụ ma arụ ma na mụọ.” Onye Nzọpụta rịọrọ ka ọ “ghara ịn̄ụ n’iko ilu, ma wee laa azụ.” “Otu osila dị,” Ọ kwuru, “otuto dịrị Nna, [Ọ] n̄ụrụ ma mesịa njikere [Ya] nile nye ụmụ nke mmadụ.”
Ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, enyewo anyị ohere nhọrọ ziri ezi. Anyị nwere ike ịhọrọ imesi obi anyị ike, ma ọ bụ họrọ ị mee ka obi anyị dị nro. Na ndụ anyị nke ụbọchị niile, anyị nwere ike họrọ ihe niile nke na-akpoku Mmụọ nke Onyenwe anyị iji bata ma biri nime obi anyị. A mara m na nime nhọrọ niile ndịa, enwere udo na ọn̄ụ.
Ka anyị gbasoro ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, onye gbasoro uche nke Nna. Dị ka anyị na-eme otu ahụ, Onyenwe anyị ekwela anyị nkwa “N’ihi na, lee, a ga m achịkọ ha dịka nnekwu ọkụkọ na-esi-achịkọta ụmụ nke aka ya n’okpuru nku ya abụọ, m’ọbụrụ na ha agaghị emesị obi ha ike.” Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.