Ọgbakọ Zuru ọha
Ị Nọgide N’Okwukwe Nke Ndị Nne na Nna Anyị Ha Hụrụ naanya
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


11:0

Ị Nọgide N’Okwukwe Nke Ndị Nne na Nna Anyị Ha Hụrụ naanya

Biko mụọ ma nata ume site nʻokwukwe na ama niile nke ndị ahụ bu unu ụzọ.

Mgbe m naara aga ileta Nashville Tennessee Tempụl maka ntulegharị tempụl, e nwere m ohere ịgagharị dị ka akụkụ nke ọrụ nke a ekenyere, na-atụlegharị ọmarịcha ụlọ nke Onyenwe anyị nke a. Ọ masịrị m nʻụzọ pụrụ iche gbasara otite agba nke Mary Wanlass a kpọrọ Gaaniihu koro nʻelu mgbidi niime ụlọ ọrụ nke metrọn.

Nke a bụ akụkọ gbasara otite agba ahụ:

Na Missouri na 1862,, Mary Wanlass gbara afọ 14 kwere onye o jiri mere nne na-anwụ anwu nkwa na ya ga-ahụ na nna ya nwere nkwarụ [na ụmụnne ya anọ ndị ọzọ dị ezigbo nta na ha niile] ga-agaru na Ndagwurugwu nke Nnukwu obodo Salt Lake ahụ. … Mary chịrị ehi ma pịa mmiri ara ehi nke na-adọ ụgbọala ibu ahụ, niime ebe nna ya [nọ nʻute ọrịa, ma] ya a na-elekọta ụmụnne … ya. Ka njem ụbọchị ọbụla gasịrị, o nyere ezi na ụlọ ahụ nri site na ịchọgharị ahịhịa, okoko osisi, na beri ndị a na-eri eri. Naanị ihe nduzi ụzọ o nwere bụ ihe ntuzi aka ọ natara ị nọ na-aga njem na ọdịda anyanwụ tutu ruo mgbe urukpuru ghọrọ ugwu ukwu niile.

“Ha rutere Ndagwurugwu Utah [ahụ] na Septemba, ebe ha megoro njem oge udu mmiri na oge ọkọchị niile. Nna ya nwụrụ mgbe na-adịghị anya ezi na ụlọ ahụ nwetere ebe obibi na Ogbe Uta, ebe Mary mesịrị lụọ di ma zulite ezi na ụlọ nke [onwe] ya.”

Nke a bụ akụkọ dị ịtụnaanya banyere okwukwe na ume nke onyeinyom nta gbara afọ 14 nke nwere ike inyere onye ọbụla niime anyị aka ụbọchị taa ị “nọ nnọọ na-aganiihu.”

“Nọrọ Nnọọ Na-aganiihu,”— ma ọ bụ ịtapịa ya otu o kwesịrị na Dutch asụsụ obodo m, Gewoon Doorgaan—bụkwa okwu ejiama nke nne na nna m mgbe ha dị ndụ.

Ndị nne na nna m na ndị ọgọ m bụ ndị ogbuhere ụzọ dị na ezi na ụlọ anyị. Ha akụfewo “ụzọụkwụ” nke ha, dị kwa nnọọ ka ndị ahụ niile na-abata niime Nzukọ nsọ, otù nke Onyenwe anyị, ụbọchị niile. Akụkọ ha enwechaghị ihe jikọrọ ya na ehi na ụgbọala ibu mana nwere otu ụdị mmetụta ahụ na ndudugandu ndị dị niihu.

Ha nabatara ozi ọma ma e mee ha baptizim nʻoge dimkpa nta ha. Ma nne ma nna m nwere ihe isi ike nʻoge ha bụ nwata. Nna m tolitere nʻikpere mmiri nke Java na Indonesia. Nʻoge Agha Mba Ụwa II, a dọpụrụ ya nʻike site nʻebe ezi na ụlọ ya nọ ma dọba ya na kamp ebe a na-akpọchi ndị mmadụ, ebe ọ tara ahụhụ nke ọnụ apụghị ịkọ mgbe ọ dị nta.

Nne m ka azụlitere nʻebe obibi tisara etisa ma ọ takwara ahụhụ agụụ na ihe isi ike nke Agha Mba Ụwa II. Mgbe ụfọdụ ọ na-adaba nʻiji bọlbụ tulip mere nri. Niihi ihe ndị nna ya mere na ya ịgba alụkwaghịm sotere site nʻaka nne ya, ọ naara ara ya ahụ mgbe ụfọdụ ịhụ Nna nke Eluigwe dị ka Nna dị ịhụnaanya.

Ndị nne na nna m zutere nʻoge ihe omume nke Nzukọ nsọ ma mgbe na-adịghị anya kpebie ịlụ di na nwunye ma rachie niime Bern Tempụl Switzerland. Eche nʻọdọ ụgbọ onyoko, ebe ego ha na-enweghị ebe o ruru gwụgoro na njem ha ịga tempụl, ha nọọrọ na-eche otu ha ga-esi ahazi ụwa ha mana nwee obisiike na ihe niile ga-adị mma. Ma ọ mere!

Ha malitere izulite ezi na ụlọ nke ha site nʻobere otu ọnụ ụlọ nta dị nʻetiti Amsterdam. Ka ọtụtụ afọ nke iji aka asa akwa ha gasịrị, ha mechara nʻikpeazụ nwetezuo ego zuru ịzụ igwe eji asa akwa. Naanị tupu ha achọọ ịzụ ya, bishọp bịara leta ha, rịọ maka ụtụ iji wuo ụlọụka na Amsterdam. Ha kpebiri inye ihe niile ha chekwara maka ịzụ igwe eji asa akwa ahụ ma gaaniihu iji aka asa akwa.

Dị ka ezi na ụlọ anyị tara ahụhụ, dịkwa ka ezi na ụlọ ọbụla ọzọ. Ihe ndị a naanị emewo ka anyị dị ike karịa ma mewo ka okwukwe anyị mie emie niime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, dị nnọọ ka mgbe Alma na-akọ akụkụ ya, ya na nwa ya nwoke Helaman, ebe ọ gwara ya na ya enwetawo “nkwado nʻoge mnwale niile na nsogbu niile nʻụdị ọbụla” niihi na ọ tụkwasịwo obi nOnyenwe anyị Jizọs Kraist.

Kedụ otù mmadụ abụọ ndị hụtaworo ọtụtụ mnwale mgbe ha dị nta jiri ghọọ ndị nne na nna a maara a mara kachasị mma nke enwere ike ịchọ? Azịza ya dị mfe: ha nabatara ozi ọma nʻuju ma bie ndụ site nʻọgbụgba ndụ ha ruo nʻụbọchị taa!

Ka ihe karịrị afọ 65 nke alụmdi na nwunye gasịrị, nne m, onye rịara ọrịa Alzheimer, nwụrụ na Febrụwarị. Nna m, onye gbara afọ 92 ma ka bikwa nʻebe obibi, gara leta ya ọtụtụ mgbe dị ka o nwere ike tutu ya a nwụọ. Mgbe na-adịghị anya ọ gwara ụmụnne m ndị m tọrọ na nhụmiihe niile dị oke egwu enwetara na kampụ ahụ na Indonesia nʻoge Agha Mba Ụwa II akwadowo ya iji ndidi lekọta nwunye ya ọtụtụ afọ dị ka ọ dabara nʻọrịa ma gbadaa na-ahụ ike site nʻajọọ ọrịa nke a nakwa maka ụbọchị ahụ akara aka ọ ga-enyefe ọrụ o nwere nʻaka ndị ọzọ ma nweghịkwa ike ị nọ nʻakụkụ ya ọzọ. Okwu nlekwasị anya ha bụrịị ma ka bụkwa “Nọrọ Nnọọ Na-aganiihu,” na-enwe olileanya zuru oke niime Kraịst ịkpọlite gị nʻụbọchị ikpeazụ na ibinyere Ya nʻotuto ruo ebighị ebi.

Okwukwe na ama ha niile bụ ihe na-enye mgbam ume maka ndudugandu ndị sotere ha.

Niime obodo ebe nwunye m toro, nne na nna ya, bụ ezigbo ndị na-eje ụka, nabatara ozi ọma dị ka ndị dị nta mere alụmdi na nwunye ebe nwunye m bụ nwa ha nwanyị gbara afọ abụọ na naani onye a mụrụ oge ahụ. Mkpebi ha ịghọ ndị otù Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a metụtara ndụ ha nke ukwuu ebe ndị obodo na ndị ezi na ụlọ ha jụrụ ha. O were ọtụtụ afọ, nootu ndị na-egosị ịhụnaanya nye ndị otu ezi na ụlọ, na ijere ndị obodo ha ozi tupu anabata ha nʻikpeazụ.

Otu oge mgbe nna nwunye m na-eje ozi dị ka bishọp, e boro ya ebubo ụgha maka otu ihe ma atọghapụrụ ya ozugbo. Ọgọ m nwanyị were iwe nke ukwuu nke mere na ọ jụrụ di ya ma ha ga-aganiihu ịdị na-aga nzukọ nsọ. Ọ zara na ha nʻezie ga-aganiihu ịga nzukọ nsọ ebe ọ bụ na nzukọ nsọ nke a abụghị nke ụmụ mmadụ, mana nke a bụ Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst.

O wetụrụ oge tupu eziokwu apụta ihe ma arịọrọ ya arịrịọ. Ihe gaara abụ ihe gaara egbuda mmụọ ha gbakwunyere ihe na ume na mkpebi ha.

Gịnị mere o ji bụrụ na ụfọdụ niime anyị na-eji okwukwe na ama nke ndị nne na nna anyị eme ihe egwuregwu ndị site na ihe isiike ha niile ka nọgidere kwesị ntụkwasị obi? Anyị chere na ha enweghị nghọta doro anya banyere ihe niile? Ha abụghị ma eduhieghị ha! Ha enwewo nnọọ ọtụtụ nhụmiihe ha na Mmụọ ma nwere ike ikwu ha na Onye amụma Josef, “A maara m ya, … ma enweghị m ike ịgọnarị ya.”

Ọ bụ na inweghị mmasi na egwu ahụ gbasara otu ndị agha nke Helaman, a hụrụ niime Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị?

Amụwo anyị, dị ka Nefi mgbe ochie,

Nye ndị nne na nna dị mma ndị hụrụ Onyenwe anyị naanya.

Akuziworo anyị ihe, ma anyị na-aghọta,

Na anyị garịrị eme dị ka Onyenwe anyị nyere nʻiwu.

Ọbụna mgbe na ọdịghị otu a, dị ka nne m nwere nhụmiihe ya dị ka nwata, i nwere ike ịghọ otu niime ndị nne na nna ahụ dị mma ndị hụrụ Onyenwe anyị naanya” ma na-enye ndị ọzọ ọmụmaatụ ezi omume.

Anyị na-eche na nke a bụ ezigbote eziokwu mgbe anyị na-ekwe ya? Unu chere na unu bụ “dị ka otu ndị agha nke Helaman” nakwa unu “ga-abụ ndị mgbasa ozi ọma nke Onyenwe anyị iwetara ndị ụwa eziokwu ya”? o metụtawo m ọtụtụ ugboro mgbe m na-ekwe ukwe nke a nʻọtụtụ ntọ FSY na ọgbakọ ndị ntoroọbịa ndị ọzọ.

Ma ọ bụ gịnị na-emekụta anyị mgbe anyị na-abụ abụ ahụ “Ị Nọgide NʻOkwukwe”?

Ndị ntoroọbịa nke Zayọn ha ga-ada mba

Nʻichekwa eziokwu, na ihe kwụ ọtọ?

Ebe onye iro na-ebuso agha,

Anyị ga-akpọnwụ ma ọ bụ ghara ịlụ ọgụ ahụ? Mba!

Ị nọgide n’okwukwe nke ndị nne na nna anyị ha hụrụ naanya.

Nye ndị ahụ bụ ndudugandu na-etolite etolite ebe ọbụla unu nọ ma nʻọnọdụ ọbụla unu nwere ike ịhụ onwe unu, biko mụọ ma nata ume site nʻokwukwe na ama niile nke ndị ahụ bu unu ụzọ. Ọ ga-enyere unu aka ghọta na iji hụ na i nwetere ma ọ bụ zụlite otu ama, a ga-achụ aja dị iche iche ma “aja ahụ ga-ewepụta ihe ngọzi niile nke eluigwe.”

Iche echiche gbasara otu aja nke ga-agọzi ndụ gị nʻezie, biko tulee ma kpee ekpere banyere ọkpụkpọ oku nke onye amụma anyị hụrụ n’anya, Onyeisi Russell M. Nelson, mgbe ọ kpọrọ “ndị ọbụla tozuru oke, onyeikom nta ahụ̀ dị ike ịkwado maka ma jee ozi mishọn. Maka ndịikom nta Ndị nsọ Ubọchị ikpeazụ a, ije ozi mgbasa ozi ọma bụ oke na ọrụ nke ọkwa nchụaja. …

“Maka … ụmụnne ndị nwanyị dị nta ma dị ike, mishọn bụkwa ohere dị ike, mana dị nhọrọ,

E nwere ike kpọọ gị dị ka onye mgbasa ozi ọma nke ozi ma ọ bụ ikuzi nkuzi. Ụdị mgbasa ozi ọma abụọ ndị a na-etinye ihe nʻotù ebumnuuche ahụkwa nke iwete ọtụtụ mkpụrụ obi nye Kraịst, nke ọbụla nʻụzọ nke onwe ha pụrụ iche ma dị ike.

Nʻụdị ozi abụọ ndị a, ị ga-egosị Onyenwe anyị na ị hụrụ Ya naanya nakwa ị chọrọ ịmata Ya nʻụzọ dị mma karịa. Chetanụ, niihi na olee otu mmadụ ga-esi mata nna ya ukwu onye ọ na ejerebeghị ozi, na onye ọ na-amataghị, ma dịrị anya site n’echiche niile na nzube niile nke obi ya?”

Anyị niile, ma ọ bụ na anyị bụ ndudugandu nke mbụ nʻozi ọma ahụ ma ọ bụ nke ise, kwesịrị ịjụ onwe anyị, Olee akụkọ ndị nke gbasara okwukwe, ume, na mkpebi selestịal m ga-enyefe ndudugandu na-abịa abịa?

Ka anyị niile gaaniihu na mbọ anyị ịmata Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst, nke ọma karịa na itinye Ya nʻetiti obi anyị. Ọ bụ oke nkume nʻelu nke anyị ahaghị iwu ụlọ nke ọ ga-abụ mgbe ihe bịara sie ike, anyị ga-enwe ike guzosie ike.

Ka anyị “nọgidesie ike nʻokwukwe nke ndị nne na nna anyị ha anyị hụrụ naanya, nọgide nʻeziokwu nke ndị egburu nʻokwukwe siri laa nʻiyi, nye iwu nke Chineke, obi, mkpụrụ obi, na aka, kwesị ntụkwasị obi ma zie ezie anyị ga-eguzo mgbe niile.” Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. “Akụkọ Ahụ Na-esote Gaaniihu,” alyoung.com.

  2. Alma 36:27.

  3. Lee Alma 36:28.

  4. Josef Smith—Agụgụala 1:25.

  5. “Anyị Ga-ewetere Ụwa Eziokwu Ya,” Akwụkwọ Ukwe nke Ụmụntakịrị, 172–73.

  6. Akwụkwọ ukwe nke Ụmụntakịrị,172– 73.

  7. “Ị Nọgide NʻOkwukwe,” Abụ, nọ. 254.

  8. “Otito dịrị Onye ahụ,” Abụ, nọ. 27.

  9. Russell M. Nelson, “Ikwusa Ozi ọma nke Udo,” Liahona, Me 2022, 6.

  10. Mozaya 5:13.

  11. Lee Helaman 5:12.

  12. Abụ, nọ. 254.