Ọgbakọ Zuru ọha
Sonye Iji Kwado maka Nlaghachi nke Kraịst
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


11:23

Sonye Iji Kwado maka Nlaghachi nke Kraịst

Ọkpụkpọ oku na ụzọ ndị ọzọ anyị si abanye nime ọrụ nke Chineke na-akwado anyị nʻụzọ pụrụiche izute Onye Nzọpụta.

Ọnwa ole nʻole gara aga, E guzorom na hall mgbe Okenye Neil L. Andersen gafere m. Mgbe ahụ otebeghi aka a kpọrọ m ọhụrụ dịka Onye Ji Ikike Zuru ọha. Nihi ọ dị ka ọ matara mmetụta m nke adịghị ike, ọ mumuru ọchị ma kwuo, “Ngwanụ, lee onye nke a yiri nwoke onye na-enweghi ịhe ọ maara ọ ga-eme.”

Ma echere m nʻobi, “Onye a bụ ezi onye amụma na onye ọhụụ ụzọ.”

Okenye Andersen mgbe ahụ a takaara m sị, “Echegbula onwe gị, Okenye Shumway. Ọ ga-adị mma karịa—mgbe afọ ise ma ọ bụ isii ruru.”

Ichewo ihe kpatara eji agwa anyị ịme ihe nʻala eze Chineke ndị nwere ike ịdị ka ha karịrị anyị? Nʻetiti ọchịchọ niile nke ndụ, ịjụwo onwe gị ihe kpatara ọkpụkpọ oku na Nzukọ nsọ jiri dịrị anyị mkpa? Nʻezie, ajụwom onwe m.

Ma a natara m azịza niime ọgbakọ zuru ọha mgbe Onyeisi Russell M. Nelson kwuru, “Ugbua bụ oge nke unu na maka mụ iji kwado maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst.” Mgbe Onyeisi Nelson kwuru nke a, Mmụọ ahụ kuziri m na dịka anyị na-esonye niime ọrụ nke Chineke, anyị na-akwado onwe anyị na ndị ọzọ maka nlaghachi nke Kraịst. Nkwa nke Onyenwe anyị na-amanye na ọkpụkpọ oku niile, ije ozi nleta, ofufe tempụl, isoro mkpali, na ụzọ ndị ọzọ anyị si abanye na-ọrụ Chineke na-akwado anyị n’ụzọ pụrụ iche izute Onye Nzọpụta.

Obi Na-atọ Chineke ụtọ Mgbe Anyị nọ Nʻọrụ Ya

Na “ebube nke oge nke a,” dị ka alaeze Chineke na-agbasa agbasa ma ọtụtụ tempụl na-ejuputa nʻụwa, enwere mkpa na-eto eto maka mkpụrụ obi ndị dị njikere isonye nʻọrụ nke Chineke. Ije ozi na-achọghị ọdịmma naanị maka onwe bụ isi ihe dị na-ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Mana ọ na-ara ahụ ka ije ozi daba mgbe ọ dị mfe. Ọ bụ ya kpatara m ji nwee m mmasị maka unu bụ ndị na-eso ụzọ na-edebe ọgbụgba ndụ ha, gụnyekwara ndị mgbasa ozi oma anyị, ndị tọgbọrọ ọchịchọ na ịma aka ha niile iji jeere Chineke ozi site na ijere ụmụ Ya ozi. Chineke na-enwe obi ụtọ ị “kwanyere [unu] ugwu [maka ife Ya ofufe] n’ezi omume.” Ọ kwere nkwa na, “Ukwuu ka ụgwọ-ọrụ [unu] ga-adị ma ebighi-ebi ka ebube [unu] ga-adị kwa.” Mgbe anyị sịrị eeh na-ịjee ozi, anyị na-asị eeh nye Jizọs Kraịst.” Ma mgbe anyị na-asị eeh nye Kraịst, anyị na-asị ee nye ndụ ahụ nke kachasị baa ụba.

A mụtara m nkuzi nke a mgbe m na-arụ ọrụ ma na-amụ chemical engineering na mahadum. A kpọrọ m ka m bụrụ onye nhazi egwuruegwu maka ngalaba ukwu nke ndị na-emebeghi ọlụlu. Nke a bụ ọkpụkpọ oku na-atụ m ụjọ. Nagbanyeghi ya, a nabatara m ya, ma na mbụ ọdịghị ụtọ. Emesịa nʻotu egwuruegwu otu nwata nwanyị ọma enwe mmasị nʻebe m nọ nihi otu m si eke ice cream. Ọ laghachiri ugboro atọ, na-enwe olile anya na ọ ga-adọrọ uche m. Anyị abụọ dabara nʻịhụnaanya, ma ọ rịọrọ m ka m lụwa ya mgbe izu ụka abụọ gasịrị. Nʻezie ọ meghi ọsọsọ otu ahụ, ma ọ bụ m rịọrọ ya ọlụlụ, mana eziokwu bụ nke a: ọ na-awụ m akpata oyi ịche na Heidi agaraghị abata na ndụ m ma ọbụrụ na m jụrụ ọkpụkpọ oku ahụ.

Nsonye Anyị Bụ Nkwado maka Nlọghachi nke Kraịst

Anyị na-abanye nʻọrụ nke Chineke na-abụghị nihi Chineke chọsiri anyị ike kama nihi anyị chọsiri Chineke na nnukwu ngọzi Ya ike. Ọ kwere nkwa, “N’ihi, lee, a ga m agọzi ndị nile na-arụ ọrụ n’ụbị vine m site n’ijiri nnukwu ngọzi.” Ka m kesara unu ụkpụrụ atọ nke na-akuzi otu nsonye anyị niime ọrụ nke Chineke si agọzi ma na-enye aka akwado anyị izute Onye Nzọpụta.

Nke mbụ, dịka anyị na-esonye, anyị na-aga niihu irute “mmezu ihe eji kee [anyị]”

Anyị na-amụta usoro nke a site na nkọwapụta nke Okike. Mgbe ọrụ nke ụbọchị ọbụla gwụrụ, Chineke na anakwere ọganiihu emere site na-ikwu “Ọ dị mma.” O kwughị na-arụsiwo ọrụ ahụ ma ọbụ na o zuru oke. Kama ihe Ọ kwuru bụ na enwere ọganiihu, ma nʻanya Chineke, nke ahụ dị mma!

Ọkpụkpọ oku abụghị ihe eji a mata ma ọbụ kwado ugwu ma ọ bụ ntozu oke nke mmadụ. Kama, dịka anyị na-arụko anyị na Chineke niime ihe ọbụla Ọ chọrọ nʻaka anyị, anyị na-etolite irute mmezu ihe eji kee anyị.

Chineke na-an̄ụrị ọn̄ụ nʻọganiihu anyị, ma anyị kwesịkwara ịme otu ahụ, ọbụnadị mgbe anyị ka nwere ọrụ a ga-arụ. Mgbe ụfọdụ, ume na ụzọ iji jee ozi niime ọkpụkpọ oku nwere ike kọọ anyị. Agbanyeghi, anyị nwere ike sonye nʻọrụ ahụ ma chekwaa ọgbụgba ama niile anyị site nʻụzọ ndị bara uru dịka ekpere na ọmụmụ akwụkwọ nsọ. Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnaanya anaghị ama anyị ikpe mgbe anyị dị njikere ije ozi kama o kweghi omume nihi adịghị ike.

Nke abụọ, ije ozi na-ebuli ebe obibi na nzukọ nsọ anyị niile elu ruo nʻebe niile dị nsọ, ebe anyị nwere ike ibi ndụ ọgbụgba ndụ.

Nʻọmụmatụ, ọgbụgba ndụ anyị ịcheta Kraịst mgbe niile ka a na-eme nʻisi nʻisi, mana ọgbụgba ndụ nke a ka a na-ebi dịka anyị na-ejere ndị ọzọ ozi. Ọkpụkpọ oku na-agba anyị gburugburu jiri ọtụtụ ohere iji “burịta … onwe anyị ibu arọ, ma site otu a mezuo iwu nke Kraịst.” Mgbe anyị na-eje ozi nihi nʻanyị hụrụ Chineke naanya ma chọọ idebe ọgbụgba ndụ anyị, ije ozi nke ahụ yiri ka ọ bụ ọrụ na nke na-agwụ ike ga-abụrụzi nke ọn̄ụ na nke na-agbanwe.

Emume nsọ niile anaghị azọpụta anyị niihina ha na-emejuputa ndekọihe nke eluigwe. Kama, mgbe anyị na-edebe ọgbụgba ndụ ndị ahụ jikọrọ ya na emume nsọ ndị ahụ, anyị na-abụ ụdị mmadụ na-achọ ị nọ nʻiru nke Chineke. Nghọta nke a na-emeri obi abụọ niile enwere iji jee ozi ma ọbụ ọchịchọ obi ịhapụ ịje ozi. Nkwado anyị izute Jịzọs Kraịst ga-abawanye mgbe anyị kwụsịrị ịjụ ihe Chineke ga-ekwe ka ọ mee ma malite jụwa ihe Chineke ga-achọ.

Nke atọ, isonye niime ọrụ nke Chineke, na-enyere anyị aka nata onyinye amara nke Chineke ma nwete mmetụta nke nnukwu ịhụnaanya Ya.

Anyị adịghị anata ụgwọ ọrụ nke ego maka ije ozi. Kama, akwụkwọ nsọ na-akuzi na maka “ọrụ [anyị ga] na-anata amara nke Chineke, ka [anyị] wee gbasie-ike na Mụọ, [nwee] mmata nke Chineke, [ma] kuzie n’ike na ikike sitere na Chineke.” Nke ahụ bụ azụmahịa dị mma!

Nihi amara nke Chineke, ịdị ike anyị na adịghị ike anyị abụghị isi ndabere eji enye ma ọ bụ nabata ọkpụkpọ oku. Chineke anaghị atụ anya ọrụ zuru oke ma ọbụ akaraka pụrụiche iji sonye nʻọrụ Ya. Ọ bụrụ otu ahụ, Eze Nwanyị Esta agaraghị azọpụta mba ya, Pita agaraghị edu ndị nzukọ nsọ nke mbụ ahụ, ma Josef Smit agaraghị abụ Onye amụma nke mweghachite ahụ.

Dị ka anyị jiri okwukwe na-eme ihe karịrị ike anyị, a na-agba adịghịike anyị oshi. Nke a anaghị adị mfe ma ọlị, mana ọ dịịrị anyị mkpa iji “wee mata na ọbụ site n’amara [Chineke] … ka anyị jiri nwe ike ime ihe ndị a.”

Anyị ga-ada ọtụtụ mgbe dịka anyị na-esonye n’ọrụ nke Chineke. Mana na mgbalị anyị, Jizọs Kraịst na-aghọrọ anyị. Ọ na-eji nwayọọ bulie anyị iji nwete nhuụmihe nzọpụta site na ọdịda na ụjọ ma site na ịnwe mmetụta na anyị agaghị ezu ezu ma ọlị. Mgbe anyị nyefechasịrị obere mgbalị anyị mana nke ike kwere anyị, Chineke na-amụba ya. Ọ bụrụ n’anyị chụọrọ Jizọs Kraịst aja, Ọ na-eme anyị kʻanyị dịrị nsọ. Nke a bụ ike mgbanwe dị niime amara nke Chineke. Dịka anyị na-eje ozi, anyị na-etolite nʻamara tutu a kwado anyị ị bụ ndị Nna buliri “elu, iguzoro nʻiru [Jizọs Kraịst].”

Nyere Ndị ọzọ aka Ịnata na Ịn̄ụrị ọn̄ụ nime Onyinye nke Ọkpụkpọ oku niile

A maghịm ihe niile nke Onye Nzọpụta ga-ajụ m mgbe m ga-eguzoro nʻiru Ya, mana ikekwe otu ajụjụ ga-abụ “Onye ka ị kpọtara?” Ọkpụkpọ oku bụ onyinye dị nsọ site nʻaka Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya iji nye aka kpọtara Jizọs Kraịst ndị ọzọ. Nihi nke a, A na m akpoku ndị ndu na onye ọbụla niime anyị, ikpachara anya chọpụta ndị ahụ na-enweghi ọkpụkpọ oku. Gbaa ha ume ma nyere ha aka sonye n’ọrụ nke Chineke ma nyere ha aka kwado maka nlọghachi Kraịst.

Jọn abụghị onye kwudesịrị ike na Nzukọ nsọ mgbe bishọp ya bịara zute ya ma gwa ya na Onyenwe anyị nwere ọrụ maka ya ịrụ. Ọ kpokuru Jọn ka ọ hapụ ịse siga. Nagbanyeghi na Jọn anwanwo ọtụtụ mgbe ịkwụsị, nʻoge nke a ọ nwetere mmetụta ike enyemaka nke a na-adịghị ahụ anya.

Naanị mgbe izu ụka atọ gasịrị, onyeisi stek bịa leta Jọn. Ọ kpọra ya ka ọ jee ozi niime otu ndị bishọp. Ọ tụru Jọn naanya. Ọ gwara onyeisi stek ahụ na ọ tebeghi aka ọ kwụsịrị ịse siga. Ọ bụrụ na nke pụtara na ọ ga-ahapụ omenala ya nke ịga lee egwuruegwu ụkwụ bọl nʻụbọchị Sọnde, nʻeziokwu, nke ahụ bụ nnukwu ihe achọrọ nʻaka ya. Azịza onyeisi stek ahụ nke mmụọ kpalitere dị mfe: “Jọn, ọ bụghị m na-arịọ gị; ọ bụ Onyenwe anyị.”

Nye nke a ka Jọn zara, “Ngwanụ, ọ bụrụ na ọ bụ otu ahụ ka ọ dị, a ga m eje ozi.”

Jọn gwara m na aja ndịa ọ chụrụ bụụrụ oge nchigharị nke ime mmụọ maka ya na maka ezinaụlọ ya.

A nam eche mʻanyị ọ nwere ebe anya anyị anaghị erucha, wee ghara ịnye ụfọdu ndị mmadụ ọkpụkpọ oku ndị nʻanya nke anụ arụ anyị, yiri ndị na-etozughi oke. Ma ọ bụkwanụ ihe kacha dịrị anyị mkpa bụ omenala nke iruzi ọrụ nke ọma karịa ozizi nke ọganiihu, wee hapụ ịhụ otu Onye Nzọpụta si amụba ike niime nke a na-atụghị anya ma nke ahụ a na-anwabeghi mbụ site na-inye ha ohere ka ha jee ozi.

Okenye Devid A. Bednar kuziri mkpa iwu ahụ enyere na akwụkwọ nsọ bara “ka nwanyị na nwoke] ọbụla mụta ọrụ [ha], na rụwa ọrụ” Anyị ọ na-eme nke a? Mgbe ndị ndu na ndị nne na nna kwere ka ndị ọzọ mụta ma mee ihe nʻaka ha, ha na-epuputa ma na-amụba. Ọ bụ ezie na ụzọ dị mfe nwere ike ịbụ inye ndị otù kwesịrị ntụkwasị obi ọkpụkpọ oku nke abụọ, ụzọ kachasị mma bụ ịkpọ ndị a na-atụghị anya ije ozi ma hapụ ha ka ha mụta ma tolite.

Ọ bụru na Kraịst nọ nʻebe a, Ọ ga-eje leta ndị ọrịa, kuzie klasị nke ụlọ akwụkwọ Sọnde, nọdụ ọdụ ya na ndị iyom nta obi gbawara, ma gọzie ụmụntakịrị. Ọ nwere ike ịrụ ọrụ nke onwe Ya. Mana Ọ na-ebi ndụ ụkpụrụ nke a nke ịhapụ anyị mee ihe ma mụta ihe, nihi ya, Ọ zitere anyị ịnọchite anya Ya.

Ihe na-esote nsonye n’ọrụ nke Chineke bụ “ugwu, ohere pụrụiche na oke nʻọrụ iji nọchite Onyenwe anyị [Jizọs Kraịst].” Mgbe anyị na-eje ozi iji nye Kraịst otuto ma ghara ịnye onwe anyị otuto, ije ozi anyị na-abuzi nke ọn̄ụ. Mgbe ndị ọzọ hapụrụ klasị anyị, ọgbakọ, ije ozi nlekọta, ma ọ bụ egwuruegwu wee na-echeta Kraịst karịa otu ha si echeta anyị, ọru ahụ bụ nke na-enye ume.

Dịka anyị na-achọsị ike ịnọchite anya Onye Nzọpụta, anyị ga na-adịrizi ka Ya karịa. Nke ahụ bụ nkwado kachasị maka oge nsọ ahụ mgbe ọnye ọbụla niime anyị ji esekpuru nʻala ma kwupụta na Jizọs bụ Kraịst, nke m na-agba aka ebe na Ọ bụ ma nakwa na Onyeisi Russell M. Nelson bụ “olu nke [Ya] na-agaru nsọtụ nile nke ụwa” iji nyere anyị aka “kwadobe … maka nke ahụ ga-abịa.” N’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Russell M. Nelson, “Onyenwe anyị Jizọs Kraịst Ga-abịa Ọzọ,” Liahona,, Me 2024, 121.

  2. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 4:2–4.

  3. Russell M. Nelson, “Onyenwe anyị Jizọs Kraịst Ga-abịa Ọzọ,” 121.

  4. Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 76:5–6.

  5. Lee Jọn 10:10.

  6. Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 21:9.

  7. Ozizi na ọgbụgba-ndụ nile 88:19.

  8. Lee Jenesis 1.

  9. N’ilu nke Onye nzọpụta gbasara onyinye chi, Nnaukwu ahụ na-enye ọrụ nʻelu “ihe ole na ole” nye nwa odibo ọbụla. Nnaukwu ahụ kachasị lekwasị anya na ọganiihu nke nwa odibo ọbụla na-eme iji bụrụ ndị nnaukwu “nelu ọtụtụ ihe” ma ghara ichegbu onwe ya maka nlọghachi nke ngwa ahịa Ya. Otu nwa odibo nke na-atụ ụjọ ma na-adịghị njikere ịrụ ọrụ ka ahapụru na amamikpe ma na-enweghi ọganiihu. (Lee Matiu 25:14–28.)

  10. Lee Luk 21:19. Okenye Devid A. Bednar na-akuzi na “Ọrụ ezi omume bụ ihe dị mkpa maka ọganiihu nke ime mmụọ” (“Ihe niile Otu Ha Dị Nʻezie nʻezie 2.0” [ofufe nro zuru ụwa maka ndị okenye nta niile, Nov. 3, 2024], Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma).

  11. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:4.

  12. Lee Mozaya 4:24..

  13. Lee Russell M. Nelson, “Ihe Anyị Na-amụta ma Gaghị Echefu Ma ọlị,” Liahona, Mee 2021, 79: “Chineke chọrọ ka anyị rụkọta ọrụ ọnụ ma nyere ibe anyị aka. Nke ahụ bụ ihe kpatara O jiri zipụ anyị n’ụwa niime ezi na ụlọ ma hazie anyị niime ngalaba ukwu na stek niile. Ya mere O ji na-arịọ anyị ije ozi ma lekọta ibe anyị. Anyị nwere ike tikọta aka mepụta ihe n’ebe ọ dị ukwuu karịa anyị nwere ike mee nanị anyị. Atụmatụ an̄ụrị nke Chineke ga-emebi ma ọbụrụ ụmụ ya nọrọ iche iche otu onye na ibe ya.”

  14. Ndị Galeshia 1:12; lee kwa Mosaịa 18:8-9.

  15. Onyeisi Henry B. Eyring kuziri: “Oku akpọrọ ije ozi bụ oku iji bịa hụ Nnaukwu ahụ a na-ejere ozi naanya. Ọ bụ ọkpụkpọ oku iji gbanwee ọdịdị anyị” (“Dịka Nwata,” Liahona, Mee 2006, 17).

  16. Lee Henry B. Eyring, “Onye nsọ Ụbọchi ikpeazụ ọ kwesịrị ire ahịa nke na-emebi iwu nke Okwu nke Amamiihe?,” Ensign, Apr. 1977, 30.

  17. Mosaia 18:26; lee kwa Mosaia 27:5.

  18. Lee 2 Nefi 3:13, 24.

  19. Jekọb 4:7.

  20. Lee Aịzaya 40:29–31; 2 Ndị Kọrịnt 12:9.

  21. Lee Matiu 14:15-21. Nagbanyeghi na ntakịrị achịcha ise na azụ abụọ ka ewepụtara iji zụọ igwe mmadụ ahụ, Onye Nzọpụta jiri obi ekele were onyinye ahụ ma mụbaa ya karịadị ihe achọrọ. Otu niime nnukwu mmụta ihe nke ọrụ ebube nke a bụ na ihe Onye Nzọpụta na-enye anyị mgbe niile zuru nnọọ ezu!

  22. Nʻasụsụ Latin ịchụ aja bụ sacer, nke pụtara ịdị nsọ, ma ọ bụ nsọ, na facere, nke pụtara ị mee. Dịka anyị na-achụrụ Chineke aja, Ọ na-eme anyị kʻanyị dịrị nsọ (lee Hilaman 3:35; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:50).

  23. 3 Nefi 27:14.

  24. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 15:6; 16:6; 18:10–16.

  25. Lee Moronaị 7:2; Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazu a,, 4.1,Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  26. Lee kwa “Ka Anyị Niile Gaaniihu,” Abụno. 243.

  27. Nhụmihe nke onwe na nzikọrịta ozi, Jen. 4, 2025; agbanwewo aha.

  28. Lee Matiu 10:5–8; Luk 10:1–9; Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 4.2.6.

  29. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:99; okwu emesiri ike ka agbakwunyere; site na mkparịta ụka ya na Okenye Devid A. Bednar, Dec. 2024.

  30. Lee Joseph Smith—Agụgụala 1:20. Ndị ntorobịa anyị abụghị naanị ndị ndu Nzukọ nsọ nke ọdịniihu. Ha pụrụ idu nʻọtụtụ ụzọ bara uru ugbua. A hụrụ m eziokwu nke a mgbe m na-eje ozi mụ na ndị na-eso ụzo pụrụiche nke Jizọs Kraịst ruru 744 na Illinois Chicago Mishọn bido na 2019 ruo 2022. Nʻoge COVID, ndịa na-eso Kraịst dị nta ma dị ike duuru ọrụ nke Chineke gaa niihu ruo ogo anya ahụbeghi mbụ jiri ụzo dị ịtụnaanya na echiche pụrụiche.

  31. Lee 2 Nefi 27:20–21.

  32. Kwusaa Ozi ọma M: Odudu iji Kwusaa Ozi ọma nke Jizọs Kraịst (2023), 3.

  33. Na Jekọb 1:17, 19, ozi nke Jekọb bụkwa ozi nke Onyenwe anyị. Ọ mụbaghị ọkwa ọrụ ya nye onwe ya kama nye Onyenwe anyị ka ọ wee nwee ike ikuzi okwu nke Chineke ma site otu a “ghara ịnwe ntụpọ nụbọchị ikpeazụ ahụ.”

  34. Lee 3 Nifaị 27:27.

  35. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:11–12.