Nihu Anyị
Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazu a na-eto eto nʻọnụọgụgụ na ezinaụlọ niile, mishọn niile, ụlọ nzukọ niile na tempụl niile.
Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, E nwere m obi ekele dị ukwuu ịnọnyere unu. Anyị hụrụ unu naanya, anyị nwere obi ekele maka unu, ma anyị na-enwe mmetụta nke ngọzi site na ekpere unu niile.
Onyeisi Russell M. Nelson kwuru na ọgbakọ ikpeazụ anyị: “Ụnu ọ na-ahụ ihe na-eme nihu anyị? Ana m ekpe ekpere na anyị agaghị eji oge a dị ebube kpọrọ ihe efu! N’ezie Onyenwe anyị na-eme ka ọrụ Ya na-aga ọsịsọ.”
Ịjị ọsọsọ rụọ ọrụ Ya. “Iji ọsọsọ” bụ otu okwu dị mkpa. Ọ na-atụ aro ịga ngwa ngwa, ịgasiike, ma ọbụna ngwa ngwa. Na uto nke Nzukọ nsọ na atụmatụ nke Kraịst, ime ọsịsọ na-eme. Ma anyị niile bụkwa otu akụkụ nke ya .
Nime Eprel 1834, na Kirtland, Ohio, Onye amụma Josef Smith kpọkọtara ndị niile ji ọkwa nchụaja n’obere ụlọ akwụkwọ dị ihe dị ka sụkwe feet 14 (4.3m). Anyị nwere ike tinye ọtụtụ ụlọ akwụkwọ ndị ahụ niile nime Ụlọ Ọgbakọ a, ma nwee ọnụ ụlo ga-afọ. Ọnye amụma Josef Smit sịrị, “Ọ bụ nanị ntakịrị Ọkwa nchụaja achị n’aka ka unu na-ahụ ebe a n’abalị a, mana Nzukọ-nsọ a ga-ejupụta North na South Amerika—ọ ga-ejupụta ụwa.”
Amụma ahụ na-emezu “nihu anyị.” Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazu a na-eto eto nʻọnụọgụgụ na ezinaụlọ niile, mishọn na ndị mgbasa ozi ọma niile, ụlọ nzukọ na tempụl niile, na na-idebanye aha na semịnarị anyị niile, institute niile, na mahadum niile nʻụwa niile.
Anyị nwere obi ekele ịnọ nʻụwa mgbe Nzukọ nsọ na-abawanye nʻọnụọgụgụ na mmetụta, mana nke ka mkpa nime obi na ndụ niile nke ndị otù ya. A maara anyị dị ka ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst. Anyị na-ekesa ịgba ama anyị niile banyere Ya, Nzukọ nsọ Ya, ụzọ Ya niile, na ụzọ ọgbụgba ndụ Ya. Anyị bụ ndị Ya, ma Ọ bụ Onye Nzọpụta anyị.
Ọ na-atụ m naanya ihe Onyeisi Nelson na-akpọ “ịdị ebube nke oge a” ma kwupụta oke ekele nye Onyenwe anyị maka ọrụ Ya. A na m agba anyị ume ka anyị guzoro ogologo dị ka ndị na-eso ụzọ Ya, ndị ji anya ha hụ nke mmezu nke amụma, ma oge ochie na nke oge a.
Enwere ndị ekweekwe ndị na-eti mkpu, ʻLee, ebe a!’” ma … ‘Lee ebe ahụ!ʻ” dịka ha mere nʻoge nke Onye amụma Josef Smith. Agbanyeghị, ha bụ ma ga-abụ naanị ihe odide ala ala peeji nime ezigbo ọrụ nke a. Cheta okwu niile nke Josef Smith: “Enweghi aka rụrụ arụ ga-akwụsị ọrụ nke a iga niihu; mkpagbu nwere ike ịdị ọkụ, … kama eziokwu ahụ nke Chineke ga-aganiihu atụghị ụjọọ, nke ọma, ma nọrọ n’onwe ya, tutu ruo mgbe ọ rikpụru mpaghara mba niile, gaa leta clime niile, zachaa obodo niile, ma daa na ntị niile, ruo mgbe ebumnuche niile nke Chineke mezuworo, ma Nnukwu Jehova ahụ ekwuo na emezuwo ọrụ ahụ.”
Nime ọrụ m niile nʻafọ a, E nwere m ohere ị nọ nihu ọrụ na-ahụ ka Onyenwe anyị na-eme ọrụ Ya ọsịsọ. Nzukọ nsọ ahụ na-ewu tempụl niile nụzọ a na-enwetụbeghị ụdị ya, na-enye ọtụtụ ndị otù ohere ife ofufe n’ụlọ nke Onyenwe anyị. Nke abụọ, ọrụ mgbasa ozi ọma na-achịkọta ọnụọgụgụ nʻigwè na-akpọbata nʻogige nke Onye ọzụzụ atụrụ Ọma, Jizọs Kraịst. Na nke atọ, agụmakwụkwọ nke Nzukọ nsọ nʻọtụtụ nhazi dị iche iche nọ nʻogo dị elu ọhụrụ na-ịkụziri ndị “na-achọ Jizọs a.”
Taa Nzukọ nsọ nwere tempụl 367 nọ nʻogo dị iche iche, nke a na-atụ atụmatụ ha, nke a na-ewu ewu ma ọ bụ nke nọ nʻọrụ. Maka ebumnuuche gịnị? A na-ekwusa aziza ya na tempụl ọ bụla: “Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị.” Tempụl ahụ na-emepe ụzọ ahụ maka ngọzi kachasị elu nke Nna nke Eluigwe nwere maka onye ọbụla n’ime anyị. Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, anyị na-eme ka ịdị nsọ anyị bịa ọsọ ọso ka anyị na-ebi ndụ tempụl kwesịrị ekwesị, ka anyị na-efe ofufe nʻụlọ nke Onyenwe anyị, na ka anyị na Chineke na-agba ndụ maka onwe anyị na nʻaha ndị nna nna anyị nọ nʻakụkụ nke ọzọ nke akwa mgbochi.
Onyeisi Nelson e kwuola: ”Mmejọ niile nke onye mmegide nọ na-abawanye nke ukwuu, n’ike n’ike na ịdị iche iche. Mkpa ọ dị anyị ịnọ niime tempụl oge niile adịbeghị mgbe ọ dị ukwuu karịa. A na m arịọ gị ka ị were ekpere leba anya ka ị na-eji oge gị eme ihe.” Nime ụlọ Ya, anyị nwere ike nwee mmetụta ọnụnọ dị nsọ nke Onyenwe anyị na udo karịrị akarị.
Nʻafọ gara aga E nwere m ihe ugwu nke ịbụ onyeisi oche na nraranye nke Tempụl Mendoza Argentina. Nime ozi m, a rụtụrụ m aka nʻamụma 1926 nke Okenye Melvin J. Ballard na ọrụ nke Onyenwe anyị ga-eto nwayọ nwayọ ruo nwa oge na South America, “dịka osisi oak na-eto nwayọ nwayọ site na acorn. Ọ gaghị agbapụ notu ụbọchị,” mana puku kwuru puku ga-esonye na Nzukọ nsọ ahụ, ma mba niile nke South America ga-abụkwa “ike nime Nzukọ nsọ ahụ.” A hụrụ m amụma ahụ ka omezuru nʻanya m abụọ.
Mendoza, bụụrụ obere acorn, aghọwo nnukwu osisi oak. A na-emeghachi uto ahụ nʻofe kontinent niile na agwaetiti niile nke oke osimiri.
Anyị na-ahụ ka Onyenwe anyị na-eme ọrụ Ya ọsịsọ nime mishọn niile. Nime afọ 2024, ihe ruru 80,000 ndị mgbasa ozi ọma na-eje ozi na mishọn niile dị 450. Iri atọ na isii nime ndị ahụ bụ mishọn ọhụru niile. Nʻafọ gara aga, ọrụ mgbasa ozi ọma wetara ihe karịrị ndị otù ọhụrụ 308,000 nime Nzukọ nsọ. Karịa ọnụọgụgụ, mmụọ nke mkpọkọta ahụ na-eweta mkpụrụ obi nye Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya.
A na m eche maka Ndị-ozi Brigham Young na Heber C. Kimball, ndị na afọ 1839 malitere dịka ndị mgbasa ozi ọma na British Isles. Ha na-arịa ọrịa, ha hapụrụ ezinaụlọ niile na-arịa ọrịa ma dara ogbenye. Otu o sina dị, ha abụọ rịgoro nʻotu ụgbọala, ma ka ha nʻọkwa na-ahụ ndị ha hụrụ naanya, Heber sịrị, “Ka anyị bilie ma nye ha obi ụtọ.” Ha abụọ wee gbalịa kwụrụ ọtọ ma tie mkpu, “Hurrah, hurrah maka Izrel.”
A hụrụ m otu ịnụ ọkụ nʻobi ahụ maka ọrụ nke Onyenwe anyị na Lima, Peru, mgbe m zutere ndị mgbasa ozi ọma sitere na ebe ọzụzụ mishọn na mishọn niile nime Lima. Nke a bụ ihe dị mma iji anya hụ! A hụrụ m ime ngwa ngwa nihu m. Enwere ugbu a mishọn asaa naanị nime obodo Lima.
Na ngwụcha nke nzukọ anyị, ndị mgbasa ozi ọma ahụ nwere ihe ijuanya pụrụ iche maka m. Ha biliri ma tie nʻọn̄ụ, “Hurrah maka Izrel.” Agaghị m echefu oge ahụ; ọ dị m ka ọ bụrụ na unu niile nọọrọ na ebe ahụ. Nihu m ka e nwere ndị mgbasa ozi ọma bụ ndị dosara nʻakụkụ “ ihe niile nke ụwa a” ijere Onyenwe anyị ozi ma nye aka na-ime ka ọbịbia Ya mee ngwa ngwa.
Anyị na-ahụ ka Onyenwe anyị na-eme ngwa ngwa ohere niile agụmakwụkwọ maka ndị otù anyị ma ọbụna ndị na-abụghị ndị otù gburu gburu ụwa. Otu nime ihe na-eme ka anyị dị iche dị ka Nzukọ nsọ bụ itinye uche anyị na agụmakwụkwọ. Onyenwe anyị nyere iwu nụbọchị niile mmalite nke Mweghachite ka “achọ mmụta ọbụna site n’ọmụmụ na kwa site n’okwukwe.” Nke ahụ na-eme taa ma o tozuru oke ịnweta “Hurrah” dara ụda.
Ugbua ihe karịrị ụmụakwụkwọ 800,000 nʻụwa niile ka edebanyere aha na semịnarị na institute, ndebanye aha kachasị elu na agụgụala nke Nzukọ nsọ. Ndị ntoroọbịa anyị na-ezukọ nʻụzọ niile dị iche iche, site nisi ụtụtụ, ehihie, na klaasị niile mgbede nye online, na ọmụmụ ime ebe obibi. Ha bụ ndị agha dị ike na ndị ezi omume, na-enweta ume site nʻaka ibe ha ka ha na-amụta banyere Jizọs Kraịst, na-eso, ma na-agba akaebe banyere Ya dịka Ọkpara ahụ nke Chineke.
Nʻoge fall nke ikpeazụ e kwuru m okwu na ofufe nro nye mpaghara semịnarị na institute jupụtara na ụmụakwụkwọ na ndị mụrụ ha na Mahadum nke Utah. Ndị bịaranụ kwuru ọtụtụ ihe banyere ọchịchọ ha ịmara na iso Jizọs Kraịst. Ozi m nyere ụmụakwụkwọ ahụ doro anya: Nye Onyenwe anyị ahụ oge nhata. A dụrụ m ha ọdụ ka ha mee ka ọmụmụ ihe ha ghara igafe okè site na-ịmụtakwa ọmụmụ ihe ahụ kacha dị elu, ọbụna ọmụmụ ihe nke “Ọkpara nke Chineke dị ndụ.”
A na m arịọ onye ọ bụla otu ihe ahụ taa: Ihe ọ bụla dị na listi gị nke ị ga-eme, nyekwa otu ụdị oge ahụ, nye Onyenwe anyị nʻọmụmụ akwụkwọ nsọ nkeonwe, ọmụmụ ezinaụlọ nke Bịa Soro M, ekpere, ọkpụkpọ oku niile Nzukọ nsọ, ije ozi nlekọta, i na-eri oriri nsọ, ife ofufe nime tempụl, na ịtụgharị uche nihe niile nke Chineke. Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị ekwuwo, “Mụọ ihe banyere m; … ma unu ga-achọta ezumike nye mkpụrụ-obi unu niile.” Were Ya na okwu Ya. Ma nye Ya otu ụdị oge ahụ.
Onyeisi Nelson ekwuola: “Ana m arịọ unu ka unu kwe ka Chineke merie n’ime ndụ unu. Nye Ya ezigbo ohere gị. Dị ka ị na-eme nke a, hụta ihe ga-eme na ike nke ime mmụọ na-abịa abịa na-enye aka nke gị.”
Anyị na-ahụ nnukwu ike ahụ na semịnarị niile, institute niile, na mahadum Nzukọ nsọ niile. Nebe ndị a niile, Onyenwe anyị bụ Ihe kacha mkpa. Ya mere O kwesịriị ịdị na ndụ niile nke onye ọ bụla nime anyị.
Ebe ọzọ nke na-egosi otu agụmakwụkwọ niime Nzukọ nsọ si agbasa Ụwa niile bụ BYU-Pathway. Gburugburu ụwa, ndebanye aha nọ ntakịrị ka oruo 75,000 ma na-aga nihu na-eto ngwa ngwa. Ọtụtụ bụ ndị otù, ma ihe karịrị otu ụzọ na ụzọ atọ nọ nime Afrịịka. Pathway bụ ihe niile gbasara ohere ịnwete agụmakwụkwọ. Imecha ihe ọmụmụ niile ahụ pụtara ịnweta ọrụ, ma ịnweta ọrụ pụtara ndụ ka mma maka ezinaụlọ niile yana ohere ndị ọzọ niile iji jeere Onyenwe anyị ozi.
Mgbe mụ na ndị ndu Stek na-ezute nime Uganda, A mụtara m na ndị isi oche stek niile debanyere aha na BYU-Pathway. Ka anyị na-adịkwu njikere nke anụ ahụ na nke ime mmụọ, anyị ga-aka adị na nkwado imeri atụmatụ aghụghọ niile nke onye iro. Cheta okwu niile nke Pita: “Ekwensu ahụ, dịka ọdum na-ebigbo ebigbo, na-ejegharị na-achọ onye ọ ga-eripịa.”
A ghọtara m na nʻetiti nke akụkọ ọma nke ozi ọma, e nwere ndị na-adọga, ndị nwere ihe ịma aka niile nke okwukwe, obi abụọ niile, na ajụjụ niile ndị yiri ka ha enweghị azịza. Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, Jizọs Kraịst bụ aziza ahụ. Malite na Ya. Chọọ aka Ya nime ndụ gị. Gee Ya ntị. “Ka obi unu ghara ịlọ mmiri,” Ọ gwara ndị na-eso ụzọ Ya nʻoge ikpeazụ tupu Getsemani, tupu O buo obe Ya nʻokporo ụzọ niile nke Jerusalem, tupu Golgotha, ebe o mechara aja mgbaghara mmehie Ya—ihe naanị Ya, Ọkpara nke Chineke, nwere ike ime.
Maara na Ọ na-aghọta. O wekwasịrị Onwe Ya mmehie anyị niile, mmejọ niile, nhujuanya, na ụbọchị ọjọọ niile, ka anyị wee nwee ike bie ọzọ anyị na Nna anyị bi n’Eluigwe mgbe ebighị ebi. O kwuru, “Lekwasịnụ m anya n’echiche ọbụla; enwela obi-abụọ, atụla ụjọ.” Okwukwe niime Jizọs nwere ike ibuli gị elu ma gwọọ mkpụrụ obi gị merụrụ ahụ. Tụkwasị Ya obi ma ị ga-eme ka nlaghachi gị na “aka niile nke ịhụnaanya Ya.” gaa ọsịsọ.”
A na m ekwusi ike ọzọ okwu niile nke onye amụma anyị dị ndụ: “Ụnu ọ na-ahụ ihe na-eme nihu anyị? Ana m ekpe ekpere na anyị agaghị eji oge a dị ebube kpọrọ ihe efu! Onyenwe anyị na-eme ka ọrụ Ya na-aga ọsịsọ.” Ka anyị dịka ndị na-eso ụzọ nke ụbọchị anyị tie mkpu, “Hurrah maka Izrel,” dịka anyị na-akwado maka nlọghachite nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen,