Ọgbakọ Zuru ọha
“Site Nke a Ndị Niile Ga-amata Na Unu Bụ Ndị Na-eso Ụzọ M”
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


15:4

“Site Nke a Ndị Niile Ga-amata Na Unu Bụ Ndị Na-eso Ụzọ M”

Ịhụnaanya anyị maka Chineke na ụmụ Ya bụ ama siri ike nye ụwa na ebe a nʻezie bụ Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta.

Ọtụtụ afọ gara aga mụ na Nwanne nwanyị Uchtdorf naara eme njem site mpaghara ndịda Germany. Ọ bụ nnọọ tupu Ista, ma anyị akpọkuwo otu ezi enyi, onye na-abụghị onye otù Nzukọ nsọ, isonye anyị na nzukọ ofufe Sọnde. Anyị hụrụ ezi enyi nke a naanya, ya mere ọ dịịrị anyị mfe na eke ikesara ya otu Onye Nzọpụta na Nzukọ nsọ Ya si emetụta anyị na ịkpọku ya ịbịa ma hụ! Ọ nabatara ọkpụkpọ oku ahụ ma sonyere anyị na nzukọ niile nke ngalaba nta dị nso.

Ọ bụrụ na ị kpọtawo otu enyi bịa nzukọ nsọ oge mbụ, i nwere ike ghọta otu o siri metụta m nʻụtụtụ Sọnde ahụ. A chọburu m ka ihe niile gaa nke ọma. Enyi anyị bụ onye okpukperechi gụrụ akwụkwọ nke ukwuu. Enwere m olileanya siri ike na nzukọ niile nke ngalaba nta nke a ga-egosipụta ezi mmetụta nye ya ma nọchite anya Nzukọ nsọ nke ọma.

Ngalaba nta ahụ zukọtara niime ọnụ ụlọ ole ma ole na mgbago nke abụọ nʻụlọ elu nke ụlọ azụmahịa. Ịgaru ebe ahụ, anyị sitere na mgbago nzọụkwu dị na-azụ ụlọ ahụ, na-agafe isi ísì ọma niile siri ike sitere na ngwa ahịa edobere ebe ahụ.

Dị ka nzukọ oriri nsọ malitere, echere m maka enyi m ịgabiga nke a nʻoge mbụ ya, ma enweghị ihe m nwere ike ime mana ịmata ihe ndị kụdara mmụọ m nwa obere. Ịgụ egwu, iji maa atụ, adaghị nnọọ ka Kwaya Tabanakụl. Ụmụntakịrị ahụ na-atakasị, na-eme mkpọtụ ka e nwere ike ịnụ nʻoge oriri nsọ. Ndị kwuru okwu mere ike ha, mana ha enweghị nka ikwu okwu nʻihu ọha. Anọdụrụ m oche nʻobi erughị ala na nzukọ ahụ niile, na-atụ anya na Ụlọ akwụkwọ Sọnde ga-adị mma karịa.

Ọ dịghị.

Ụtụtụ niile echegburu m onwe m ihe enyi anyị ahaghị iche maka nzukọ nsọ nke a anyị kpọọrọ ya gaa.

Mgbe emesịrị, dị ka anyị nyaara ụgbọala laa ụlọ, atụgharịrị m ịgwa enyi m okwu. Achọburu m ịkọwa na nke a bụ naanị ntakịrị ngalaba nta ma na o gosipụtaghị nʻezie Nzukọ nsọ dum. Mana tupu m enwee ike kwuo otu okwu, o kwuputara.

“Nke ahụ amaka,” ka o kwuru.

Ogbu dara m.

Ọ gara niihu, “ọ masịrị m nnọọ otu ndị mmadụ si akpasị ibe ha agwa niime nzukọ nsọ gị. Ha niile yiri ka ndị si nʻọzụzụ dị iche iche, ma otu ọ dị o doro anya na ha hụrụ ibe ha naanya nʻeziokwu. Nke a bụ ihe m chere Kraịst naara achọ Nzukọ nsọ Ya dịrị ka ya.”

Nʻezie, echegharịrị m site na agwa ịma ikpe m. Achọbuuru m nzukọ ndị zuru oke iji masị enyi m. Mana ihe ndị otù ngalaba nta nke a metaworo bụ mmụọ zuru oke nke ịhụnaanya, obi ọma, ndidi, na ọmịiko.

Ka Okwukwe Nwee ike Ịbawanye niime Ụwa

Ezigbo ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ezi ndị enyi m, e nwere m ịhụnaanya maka Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a. Ọ bụ ezi Nzukọ nsọ dị ndụ nke Onye Nzọpụta, ma ọ na-akuzi ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere nʻuju. Ike na ikike ọkwa nchụaja Ya bi ebe a. Jizọs Kraịst na-edu Nzukọ nsọ nke a nʻonwe ya, site na ụmụ odibo Ọ kpọworo ma nye ikikere, na site nʻaka onye amụma dị ndụ, ọbụna Onyeisi Russell M. Nelson. Onye Nzọpụta nyewo Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a ozi pụrụ iche ịkpọkọta ụmụ nke Chineke ma kwadoo ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta. Ana m agba akaebe na ihe ndị a niile bụ eziokwu.

Mana ọ dị mkpa icheta na mgbe ọtụtụ na-abịa Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nʻoge mbụ, ha anaghị eche banyere ikike ọkwa nchụaja ma ọ bụ emume nsọ niile ma ọ bụ mkpokọta nke Izrel. Ihe ha nwere ike ị na-amata, karịa ihe niile ọzọ, bụ otu o si emetụta ha mgbe anyị na ha nọ na otu anyị si akpasịrị ibe anyị agwa.

“Hụ ibe unu naanya,” ka Jizọs kwuru. “Site nke a ndị niile ga-amata na unu bụ ndị na-eso ụzọ M.” Ọtụtụ mgbe, ama nke mmadụ nke mbụ nke Jizọs Kraịst na-abịa mgbe o nwetere mmetụta ịhụnaanya nʻetiti ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst.

Onye Nzọpụta mara ọkwa na Ya weghachitere Nzukọ nsọ Ya ka … okwukwe nwee ike ịbawanye niime ụwa.” Ya mere, mgbe ndị mmadụ bịara nzukọ niile nke Nzukọ nsọ anyị, Onye Nzọpụta na-achọ ka ha pụọ jiri okwukwe siri ike na Ya karịa! Ịhụnaanya ndị enyi anyị na-enwete netiti anyị ga-ebuli ha nso ruo Jizọs Kraịst! Nke ahụ bụ ebumnuuche anyị dị mfe oge ọbụla anyị gbakọtara.

Onye ọbụla nke na-achọ nnukwu okwukwe niime Kraịst ma ọ bụ njikọ dịtụ nso ya na Nna nke Eluigwe kwesịrị inwe obi iruala niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a. Ịkpọku ha na nzukọ anyị niile nwere ike dịrị mfe na eke dị ka ịkpọku ha nʻebe obibi anyị.

Nke Kwesịrị na nke bụ Eziokwu

Ugbua, amatara na m na-akọwa nke kwesịrị. Ma niime ndụ anụ ahụ nke a, anyị anakarịghị enwete nhụmiihe ihe nke kwesịrị. Ma “tutu ruo ụbọchị ahụ zuru oke,” aga na-enwekarị ohere nʻetiti ihe kwesịrị na nke bụ eziokwu. Ya mere, gịnị ka anyị ga-eme mgbe Nzukọ nsọ eyighị dị ka ụbọchị zuru oke? Mgbe, agbanyeghi ihe ọbụla kpatara na ngalaba ukwu anyị adịbeghị zulite okwukwe ma ọ bụ ịhụnaanya zuru oke? Ma ọ bụ mgbe o yiri ka anyị adabaghị nke ọma?

Otu ihe anyị ekwesịghị eme bụ ịda mba na nke kwesịrị ekwesị!

Ihuakwụkwọ Akwụkwọ nke Mọmọn gụnyere ịdọ aka na ntị nke a dị mkpa: “Ọ bụrụ na enwere ndejọ,” ka o kwuru, “ha bụ mmejọ nke mmadụ; ya mere, amakwala ihe niile nke Chineke ikpe.”

O kwere omume na akwụkwọ ọbụla—ma ọ bụ nzukọ nsọ ma ọ bụ onye ọbụla—ga-enwe “ndejọ” na “mmejọ” ma ka bụrụ ọrụ nke Chineke?

Ọsịsa ya bụ eeh! na-ehi ụda

Ya mere, dị ka anyị na-ejide onwe anyị nye ọkọlọtọ dị elu nke Onyenwe anyị, ka anyị nwekwaa ndịdị onye nʻibe ya. Onye ọbụla niime anyị bụ ọrụ na-aganiihu, ma anyị niile dabeere nʻelu Onye Nzọpụta maka ọganiihu nke ọbụla anyị mere. Nke ahụ bụ eziokwu nye anyị dị ka mmadụ nʻotu nʻotu, ma ọ bụ eziokwu maka alaeze nke Chineke nʻelu ụwa.

Onyenwe anyị na-akpọku anyị ọbụghị naanị isonye alaeze Ya mana ịnọsikwa ike nʻọrụ ewulite ya. Chineke na-ahụta ndị mmadụ “nwere otu obi na otu uche.” Ma ịbụ ndị nwere otu obi, anyị ahaghị ịchọ obi dị ọcha , na nke na-achọ nnukwu mgbanwe nke obi.

Mana nke ahụ apụtaghị ịgbanwe obi m ịnọ nʻotu ahịrị ya na nke gị. Ọbụghị ma ọ pụtara ịgbanwe obi gị ịnọ nʻotu ahịrị ya na nke m. Ọ pụtara na anyị niile na-agbanwe obi anyị ịnọ nʻotu ahịrị ya na nke Onye Nzọpụta.

Ọ bụrụ na anyị erubeghị ebe ahụ, cheta: na jiri enyemaka nke Onyenwe anyị, ọdịghị ihe a na-apụghị ime.

Ịdaba adaba na Nsonye

Ma ọ bụrụ na ọ dịwo gị ka ịdabaghị adaba, biko mara na ị nọghị naanị gị. Ọ bụ na anyị niile anọbeghị nọnọdụ nke ndụ mgbe ọ dị anyị ka onye ọbịa niime ụlọ nzukọ? Enwetewo m nhụmiihe nke karịa otu ugboro. Mgbe m gbara afọ 11, amanyere ezi na ụlọ m ịhapụ ebe obibi anyị ma kwaga mpaghara obodo anyị amachaghị nke ọma. Ihe niile dịrị iche site nʻihe mawooro m ahụ. Ma ụda olu m mere ya edo ụmụntakịrị ndị ọzọ anya na m dị iche site nʻihe ndị maara ha ahụ. Otu oge mgbe m chọsiri ike ime enyi na nsonye, owu mara m ma ya adị ka achụpụrụ m achụpụ.

Ebe a nʻelu ụwa, ọtụtụ ndịiche ndị anyị matara—ndịiche niile ụfọdụ niime anyị na-eji ahazie ibe ha na katigori dị iche iche—nwere njikọ ha na ihe niile nke ụwa: ọdịdị anụ ahụ, mba onye si pụta, asụsụ, uwe, omenaala niile, na ndị ọzọ. Mana “Chineke adịghị ele ihe anya otu ndị mmadụ si ele. Ndị mmadụ na-ele anya nʻọdịdị anụ ahụ, mana Onyenwe anyị na-ele anya nʻobi.”

Site nʻechiche Ya, e nwere otu katigori na-abịa tupu ihe ndị ọzọ niile: nwa Chineke. Ma anyị niile dabara nke ọma niime nke a.

Ọ bụ eke ịchọ ịnọ nʻakụkụ ndị mmadụ na-ele anya, kwuo okwu, kpaa agwa, ma chee echiche dị ka anyị na-eme. E nwere ọnọdụ maka nke ahụ.

Mana niime Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta, anyị na-ekpokọta ụmụ Chineke niile ndị dị njikere ka ekpokọta ha na ndị na-achọ eziokwu. Ọ bụghị ọdịdị anụ ahụ anyị, echiche anyị nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, omenaala anyị, ma ọ bụ agbụrụ anyị na-akpọkọta anyị ọnụ. Ọ bụghị ọnọdụ ọzụzụ anyị yiri ibe na-ejikọta anyị ọnụ. Ọ bụ otu ebumnobi anyị nwekọtara ọnụ, ịhụnaanya anyị maka Chineke na ịhụnaanya maka agbata obi anyị, mkpebi anyị nye Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya eweghachitere. Anyị bụ “otu niime Kraịst.”

Ịdị notu anyị na-achọ abụghị inwe ndị niile guzoro nʻotu ebe; ọ bụ inwe ndị niile chewe ihu nʻotu ụzọ—ruo Jizọs Kraịst. Anyị bụ otu ọ bụghị niihi ebe anyị nọwooro mana ebe anyị na-agba mbọ ịga, ọbụghị niihi onye anyị bụ mana onye anyị na-achọ ịbụ.

Nke ahụ bụ ihe ezi Nzukọ nsọ nke Kraịst bụ nnọọ maka ya.

Otu Anụ Ahụ

Ọ bụrụ ma gị hụ Chineke naanya, ọ bụrụ ma gị chọọ ịmata Ya karịa site na-isoro Ọkpara Ya, mgbe ahụ i sonyere ebe a. Ọ bụrụ na gị na-achọsike idebe iwu nsọ niile nke Onye Nzọpụta—ọbụna agbanyeghị i zughị oke na ya ugbua—mgbe ahụ ị dabara nke ọma maka Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a

Ma asịkwa nnọọ na gị gbaa iche site na ndị mmadụ gbara gị gburugburu? Nke ahụ emeghị gị onye adabaghị—ọ na-eme gị akụkụ dị mkpa achọrọ nke otù nke Kraịst. Onye niile ka achọrọ niime otù nke Kraịst. Ntị niile na-anụ ihe niile anya enweghị ike anụ. Ụkwụ na-eme ihe niile nke aka agaghị enwe ike na ya.

Nke ahụ apụtaghị na ọrụ gị bụ ịgbanwe onye niile ịdị ka onwe gị. Mana ọ pụtara na gị nwere ihe dị mkpa inye—ma na i nwere ihe dị mkpa ịmụta!

Otu Olu

Na nzukọ ọbụla nke ọgbakọ zuru ọha, ana eji egwu mkpatemmụọ sitere nʻaka ndị kwaya maara agụ agọzi anyị. Dị ka ị na-ege ntị, i nwere ike mata na ndị na-agụ egwu ha niile anaghị agụ nʻotu ụda. Mgbe ụfọdụ otu nkeji agụọ melọdi, mgbe ụfọdụ ọzọ. Mana ha niile na-etinye aka nye ọmarịcha ụda, ma ejikọtara ha kpamkpam. Onye otù kwaya ọbụla nwere otu isi ebumnuuche: inye Chineke otito ma bulie obi anyị nye Ya. Onye ọbụla ga-etinyerịrị uche ya na obi ya nʻotu ebumnuuche ahụ dị nsọ. Ma mgbe nke ahụ mere, ha nʻezie na-abụrụzi otu olu.

Ọ bụrụ na ị ka abụghị onye otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, anyị na-akpọku gị isonyere anyị dị ka anyị na-enwe ọn̄ụ “nʻegwu ịhụnaanya mgbapụta” nke Onye Nzọpụta. Anyị chọrọ gị. Anyị hụrụ gị naanya. Nzukọ nsọ ga-akatụ mma ma itinye mgbalị gị ijere Onyenwe anyị na ụmụ Ya ozi.

Ọ bụrụ na gị egosiworịị, site na baptizim, site na ịgba ọgbụgba ndụ gị na Chineke, ọchịchọ gị “ịbata niime otù nke Chineke ma akpọọ gị ndị ya,” imeela maka ịbụ akụkụ nke nnukwu ọrụ nke a dị nsọ na maka inye aka ime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst ihe Onye Nzọpụta na-achọ ya ịbụ.

Dị ka m mụtara site nʻaka enyi m na Germany, ịhụnaanya anyị maka Chineke na ụmụ Ya bụ ama siri ike nye ụwa na ebe a nʻezie bụ Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta.

Ka Chineke gọzie anyị inwe ndidi mana na-achọsike ibi ruo nke kwesịrị ekwesị nke Onye Nzọpụta anyị, Onye Mgbapụta, na Nna Ukwu doziworo maka anyị—ka ndị niile mara na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Ya. N’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Jọn 13:34–35, Vashọn Eze King James Ọhụrụ.

  2. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:21.

  3. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 45:5–6.

  4. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:24.

  5. Mozis 7:18.

  6. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:21.

  7. Lee Alma 5:14.

  8. Lee Luk 1:37.

  9. 1 Samuel 16:7, Ntụgharị Asụsụ Bekee Ọhụrụ.

  10. Lee Russell M. Nelson, “Nhọrọ niile maka Ebighị ebi” (worldwide devotional maka ndị okenye nta, Me 15, 2022), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  11. Ndị Galetia 3:28.

  12. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:36.

  13. Lee 1 Ndị Korịnt 12:12–27. Niime otu nke Kraịst, anyị anaghị eleghara ndịiche niile anya, ma anyị anaghị anabata nnọọ ha. Obi dị anyị ekele maka ntụnye pụrụiche onye otu ọbụla na-eme, maka ọdịmma nke otu niile dum.

  14. Naanị nnọọ dị ka ọ gaghị ezi ezi ka ntị lee ahụ anya ma sị, “Adịghị m ka anya; agaghị enwe ohere maka m nʻebe a,” ọ gakwa abụ ihe nʻezighị ezi maka anya ịgwa ntị, “Ị dịghị ka m; anyị enweghị ihe anyị ji gị eme ebe a” (lee 1 Ndị Kọrịnt 12:16, 21).

  15. Alma 5:26.

  16. Mozaya 18:8. Mgbe anyị mere baptizim, anyị na-amata na, nʻetiti ihe ndị ọzọ, anyị na-achọ ịbụ akụkụ nke ndị mmadụ “nʻebukọrịta ibu arọ nke ibe ha” ma “na-eso ndị [ahụ] na-eru uju na-eru uju” ma kasie obi nye ndị ahụ nọ na mkpa nkasi obi” (amaokwu 8–9). Nʻaka nke ọzọ, mgbe anyị sonyere Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst, anyị na-asị—nʻobi umeala mana nke doro anya—na anyị na-achọ ịdịrị karịa dị ka Onye Nzọpụta anyị hụrụ naanya, ma anyị chọrọ imekọta ya ọnụ.