Ọgbakọ Zuru ọha
Sistem Odudu Anyị nke Eluigwe
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


10:48

Sistem Odudu Anyị nke Eluigwe

Mgbe anyị tụkwasịrị ndụ anyị na Jizọs Kraist, anyị ga-achọta ụzọ anyị ịla nʻebe obibi anyị, na-anagide ruo ọgwụgwụ ma na-an̄ụrị ọn̄ụ ruo ọgwụgwụ.

Jizọs Kraịst gbanwere ndụ m mgbe m mere baptizim nʻafọ 26 na Frutillar, Chile m hụrụ naanya. Nʻoge ahụ, ọrụ kpọgara m nʻofe oke osimiri, osimiri niile, na ọdọ mmiri niile nke ọmarịcha Chilean Patagonia. Mgbe m mechara baptizim, a hụrụ m orụ m na ndụ m nʻụzọ ọhụrụ na nke pụrụ iche, na-akọta nʻezie na “ihe niile na-egosị na enwere Chineke.”

Nʻọdịdị, a na-amụ salmon na nsipụta nke osimiri niile. Nʻotu mgbe na ndụ ha, ha kwesịrị igwu mmiri gbadaa nʻosimiri irute oke osimiri, ebe ha na-enweta ndoziahụ na ọnọdụ ndị dị mkpa maka uto ha.

Mana oke osimiri bụkwa ebe ihe egwu dị ebe anụ ndị na-eri ibe ha juru na ebe ndị ọkụ azụ na-agbalị ijide salmọn jiri nko maramara nke na-en̄omi nri mana ọ naghị edozi ha ahụ. Ọ bụrụ na salmon nwere ike ịnya ihe iyiegwu ndị a, ha ga-adị njikere iji sistem odudu ha siri ike iji site nʻebe mgbago mmiri lọghachi nʻotu ebe ahụkwa bụ ebe a mụrụ ha, na-ezute ụfọdụ ihe aka mgba ọhụrụ na ndị nke ha maara a mara. Ndị nka sayensị amụwo ihe banyere omume njegharị ha ọtụtụ afọ ma achọpụtawo na ha na-eji ihe dị ka maapụ ndọkọ, nke yiri GPS, idu ha ruo na ngwụcha ebe ha na-aga na nkenke ziri ezi.

Anyị niile nwere ike otu ụbọchị ịlaghachi nʻebe obibi anyị nʻeluigwe ebe anyị siri bịa. Ma dị ka salmon ahụ, anyị nwere ndọkọ maapụ nke anyị—ma ọ bụ Ìhè nke Kraịst”—idu anyị ebe ahụ. Jizọs kuziiri ndị na-eso ụzọ Ya, “Abụ m ụzọ, eziokwu, na ndụ: ọdighị onye ọbụla na-abịakwute Nna, mana site na mụ.”

Mgbe anyị tụkwasịrị ndụ anyị na Jizọs Kraist, anyị ga-achọta ụzọ anyị ịla nʻebe obibi anyị, na-anagide ruo ọgwụgwụ ma na-an̄ụrị ọn̄ụ ruo ọgwụgwụ. Onyeisi Russell M. Nelson kuziri na: “Ọn̄ụ ahụ anyị n’enwe nwere ntakịrị ihe ime ya na ọnọdụ niile nke ndụ anyị ma nwere ihe niile ime ya na ihe ndị anyị na-etinye uche na ndụ anyị.”

Ọdịdị Sinachi na Akaraka Anyị

Site na ọkwa nye ezi na ụlọ, anyị na-agụta na “onye ọbụla [niime anyị] bụ nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwanyị nke mmụọ nke nne na nna nke eluigwe hụrụ naanya, ma, n’ụdị ahụ, nke ọbụla nwere ọdịdị na akaraka dị nsọ. N’ebe obibi ndụ tutu abịa n’ụwa, ụmụ nke mmụọ ndị nwoke na ndị nwanyi matara ma fere Chineke ofufe dị ka Nna nke ebighị ebi ha ma nabatara atụmatụ Ya site na nke ụmụ Ya nwere ike iji nweta ahụ anụ ahụ ma nwete nhụmiihe nke ụwa ịganiihu chee ihu n’izu oke ma n’ikpeazụ chọpụta akaraaka ha dị nsọ dị ka ndị nketa oke nke ndụ ebighị ebi.”

Tupu ọmụmụ Ya na ndụ anụ ahụ, Jizọs Kraịst bịakwutere Mosis ma gwa ya okwu nʻọnọdụ Nna ahụ. Ọ gwara Mosis na Ya nwere ọrụ dị ukwuu ọ ga-arụ. Nʻoge nzukọ ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ ya “nwa m nwoke” ugboro ugboro.

Mgbe nhụmiihe ahụ gasịrị, Setan bịara ịnwa ya,” n’ekwu, “Mosis, nwa nke mmadụ, fee m ofufe.”

Mosis zaghachiri nʻọnwụnwa ahụ site na icheta ọdịdị ya dị nsọ, na-asị: “Onye ka ị bụ? Niihi na lee, abụ m nwa nke Chineke.” Eziokwu napụtara Mosis site na mbuso agha nke onye iro.

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, nko niile nke ndụ anụ ahụ bụ eziokwu. Ọtụtụ ugboro ha na-eto akpịrị, mana ha na-achọ naanị otu ihe ha bu nʻobi: ịdọpụ anyị nʻụzọ nke mmiri na-enye ndụ nke na-eduba ebe Nna nọ na ndụ ebighị ebi.

A maara m nʻezie otu nko niile nke ndụ anụ ahụ nwere ike ịdị. Otu Sọnde, dị ka onye atọghatara ọhụrụ, a naara m akuziri klaasị ọkwa nchụaja mgbe mkparịta ụka na-ebute ọgba aghara bidoro. A gbara m mbọ ikuzicha ihe ọmụmụ m. E were m iwe ma chee na ọ bụ m ka ana ekwu maka ya. Na-ekwughị okwu ọbụla, a pụwara m gaa nʻụzọ e si apụ na-echiche na m agaghị alọghachikwa na nzukọ nsọ obere oge.

Nʻoge ahụ kpọmkwem, onye ji ọkwa nchụaja o metụtara guzooro niihu m. Nʻịhụnaanya ọ kpọkuru m ilekwasị anya na Kraịst ma na-abụghị nʻọnọdụ ahụ anyị hụtara na klaasị. Ichela azụ na nhụmiihe ahụ m nwere mụ na ya, ọ kọọrọ m na ya nụrụ olu gwara ya, “Chụso ya; ọ dị mụ mkpa.”

Okenye Vargas na onye ndu ahụ chusoro ya.

Ezigbo ndị enyi m, anyị niile dị mkpa nye Ya. Onyeisi Nelson kuziri na, “niihi ọgbụgba ndụ nke anyị na Chineke, Ọ gaghị ma ọlị ada mba na mbọ Ya inyere anyị aka, ma anyị agaghị enwe ike ma ọlị ewete na ngwụcha ndidi obi ebere Ya n’ebe anyị nọ.” Ọdịdị sinachi anyị na mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Chineke nyere anyị oke ịnata enyemaka sinachi.

Mkpa Ndoziahụ Dị

Dị nnọọ ka salmọn nwere mkpa inwe ndoziahụ niime oke osimiri iji too uto, anyị nwekwara mkpa idozi ahụ anyị niime mmụọ iji zere ịnwụ anwụ site na kwashọkọ nke ime mmụọ. Ekpere, akwụkwọ nsọ, tempụl, na anyị ịdị na-aga nzukọ Sọnde niile esepụghị aka dịcha mkpa na nri dị iche iche nke ime mmụọ.

Na Nọvemba 1956, Ricardo Garcia banyere na mmiri niile nke baptizim na Chile, na-aghọ onye otu Nzukọ nsọ nke mbụ na obodo m. Naanị otu ụbọchị tupu ya anwụọ, o kwuputara niihu ezi na ụlọ na ndị enyi ya, ”Ọtụtụ afọ gara aga, ndị mgbasa ozi ọma kpọkuru mụ inwe obi ụtọ mụ na ndị ezi na ụlọ m. Taa abụ m nwoke nwere obi ụtọ. Gwa onye ọbụla nọ na Chile na ozi ọma bụ an̄ụrị.”

Ka o nwechara ndoziahụ site nʻozi ọma nke Jizọs Kraịst, Ricardo nyefere ndụ ya niile nʻijere Chineke na ndị agbata obi ya ozi nʻịhụnaanya. Ọmụmaatụ nke ịbụ onye na-eso ụzọ nke ọ bụ agọziwo ndudugandu niile, tinyere m. Onye amụma Joseph Smith kuziri na ”nwoke jupụtara nʻịhụnaanya nke Chineke, anaghị enwe afọ ojuju nʻịgọzi naanị ezi na ụlọ ya, mana na-agazu ụwa niile, na-achọsi ike ị gọzi ndị niile bi nʻụwa.”

Laghachi nʻEbe obibi Anyị nke Eluigwe

Niime ime onye ọbụla niime anyị ka e nwere ọchịchọ ịlaghachi nʻebe obibi anyị nke eluigwe, ma Jizọs Kraịst bụ sistem onye ndu nke eluigwe anyị. Ọ bụ Ụzọ ahụ. Àjà mgbaghara Ya na-eme ka e nwee ike ịgbaghara anyị mmehie mere ka okwe omume anyị ịgba ndụ ndị dị nsọ anyị na Chineke. Ozugbo anyị mere ọgbugba ndụ ndị ahụ, mgbe ụfọdụ anyị na-ahụta onwe anyị mgbe ụfọdụ iji echiche anyị eme ihe dị mma. Ihe egwu, ndakpọ olileanya, ọnwụnwa, na mkpagbu ga-anwale okwukwe na ume nke ime mmụọ anyị. Rịọ maka enyemaka. Jizọs Kraịst ghọtara ma dị na njikere mgbe niile iso buru ibu arọ anyị.

Cheta na a maara Ya dị ka “nwoke nwere mwute, ma ọ maara iru uju.” Onye Nzọpụta kuziri, “Niime ụwa unu ga-enwe mkpagbu: mana nwee nụ ańụrị; emeriwo M ụwa.” Aja mgbaghara mmehie Ya na-enye ohere ka agbaghara mmehie anyị niile ruo na Ọ nakwaghị echeta ha ọzọ.

Anyị nwere ike hapụ ichefucha mmehie anyị kpamkpam dị ka akụkụ nke ọmụmụ ihe nke ndụ anụ ahụ anyị ya mere anyị ga-echeta ịhapụ ime ha ọzọ. Kama, anyị ga-echeta Ya mgbe anyị na-eri oriri nsọ na nzukọ nsọ na Sọnde niile. Emume nsọ nke a bụ akụkụ ofufe na ito uto nke ime mmụọ anyị dị oke mkpa. An̄ụrị na-abịa mgbe anyị ghọtara na nke a bụghị nnọọ ụbọchị ọzọ. “E mere ụbọchị izuike maka mmadụ,” na nzube nke inye anyị ezumiike site nʻụwa na imegharị ọhụrụ ahụ na mmụọ anyị.

Anyị na-echetakwa Ya mgbe anyị gara tempụl—ụlọ nke Onyenwe anyị. Tempụl niile na-enye anyị mmata ihe kacha dị omimi banyere Jizọs Kraịst dị ka isi nke ọgbụgba ndụ ahụ na-eduba anyị na ndụ ebighị ebi, “nke kachasị ukwuu site … nʻonyinye niile nke Chineke.”

Ịdị na-aga tempụl enyewo m nkasi obi na nnukwu olileanya gbasara akaraka dị ebighị ebi anyị. E nwetawo m nhụmiihe njikọ niile nke eluigwe mụ na ndị mmadụ na-akụkụ abụọ nke akwà mgbochi. Ahụwo m ọgwụgwọ dị ebighị ebi niime ndụ ụmụ m dị ntakịrị, ndị abụọ niime ha nwere ọrịa na-adịghị ahụ anya nke chọrọ nlekọta anya kwa ụbọchị nke ndụ nke a.

Ezi na ụlọ anyị n̄ụrịrị ọn̄ụ mgbe anyị kọrọ banyere atụmatụ nke an̄ụrị. Ihu nke ụmụ m wara nʻọchị mgbe ha nụrụ nke ahụ, ekele dịrị Jizọs Kraịst, “mkpagbu ha niile ga-abụ mana nwa mgbe nta.” Anyị hụrụ ụmụ anyị naanya nʻụzọ dị omimi, ma anyị ma na otu ụbọchị, dị ka Onyeisi Jeffery R. Holland kuziri, ha “ga-eguzo niihu anyị nʻịdị ebube na ịdị mkpa, nʻịtụnaanya zuru oke nʻahụ na nʻuche.” Ọgbụgba ndụ anyị na-ewete anyị nso na Chineke ruo na-ime ihe ndị na-anaghị ekwe omume ekwe omume, na-emejupụta oghere ọbụla gbara ọchịchịrị na obi abụọ na ìhè na udo.

Ekele dịrị Jizọs Kraịst, e nwere olileanya na ihe ndị na-enweghị mgbagha eji aganiihu nʻịhụnaanya, ikpe ekpere, na ịkwado ndị ahụ dị anyị mkpa.

Ama m na Chineke dị ndụ. Ọ maara anyị ma Ọ hụrụ anyị naanya. Ọ bụ ụzọ, eziokwu, na ndụ nke ụwa.

Ana m a kpọku anyị niile taa ka anyị hiwe ndụ anyị na Jizọs Kraịst na nkuzi Ya niile. Ime otu ahụ ga-enyere anyị aka zere ịtagide eze na nko nke ọnwụnwa, ụrụ, na ọmịiko onwe onye. Anyị ga-akwụrụ dị ka tempụl niile—dị nsọ, kwụrụ chịm, ma na-adịgide. Anyị ga-emeri nsogbu niile, ma anyị ga-eru nʻebe obibi, na-anagide ruo ọgwụgwụ ma na-an̄ụrị ọn̄ụ ruo ọgwụgwụ. Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. A rụrụ m ọrụ dị ka injinịa ihe karịrị afọ 20 iwulite ebe a na-azụ azụ na chile.

  2. Alma 30:44.

  3. Lee Steve Lundeberg, “Ndọkọ Obi otiti niile Na-agbanwe Nhazi nke Salmon, Na-atụnye uche ka Ha gaa Gwugharịa site na Ihendọkọ dị niime Anụ ahụ Ha,” Oregon State University Newsroom, Me 2, 2020, oregonstate.edu.

  4. Jọn14:6.

  5. Russell M. Nelson, “Ọńụ na Ịnya ndụ nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nọv. 2016, 82.

  6. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa amara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  7. Lee Mozis 1:4–13.

  8. Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” Liahona, Ọkt. 2022, 6.

  9. Lee Dallin H. Oaks, “Idozi ahụ Mmụọ,” Ensign, Diz. 1998, 6-13; Liahona, Ọgọ. 2001, 10–19.

  10. Lee Trent Toone, “Ndị Owuwu na Ngọzi niile: Otu Ndị Ogbuhere ụzọ Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a Isi mbụ Ji Hazie Uto nke Nzukọ nsọ na Chile,” Ozi Nzukọ nsọ, Feb. 18, 2025, thechurchnews.com.

  11. Ajụjụ ọnụ nke onwe onye ya na Perla Garcia, nwa Ricardo Garcia nke nwanyị.

  12. Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Joseph Smith (2007), 426.

  13. Aịzaịah 53:3.

  14. Jọn 16:33

  15. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 58:42.

  16. Lee Neil L. Andersen, “Chegharịanụ … Ka M Wee Gwọọ Unu,” Liahona, Nov. 2009, 40–43.

  17. Lee Isiokwu niile na Ajụjụ niile, ““Oriri nsọ” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  18. Mak 2:27

  19. Lee Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” 4-11.

  20. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 14:7

  21. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:7.

  22. Jeffrey R. Holland, “Dị ka Arịa Tiwara etiwaLiahona, Nọv. 2013, 42.

  23. Lee Ndị Hibru 3:6.