Nkwado nke Onwe maka Izute Onye Nzọpụta
Soro nkuzi niile nke Onye Nzọpụta. Ntuziaka Ya niile abụghị ma ọ dị omimi ọ bụghị ma ọ dị mgbagwoju anya. Mgbe anyị sooro ha, anyị ekwesịghị ịtụ egwu ma ọ bụ ị na-echegbu onwe anyị.
Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, Ọktoba gara aga, Onyeisi Russell M. Nelson kuziri, “Ugbua bụ oge nke mụ na unu iji kwadoo maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst ahụ.” Mgbe Onyeisi Nelson na-ekwu okwu maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, ọ na-ejikarị nchekwube na-enye ọn̄ụ. Otu osila dị, otu nwata nwanyị nọ na Praịmarị mgbe na-adịghị anya gwara m na ọ na-echegbukarị onwe ya mgbe ọbụla a kpọrọ Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ aha. Ọ sịrị, “Egwu na-atụ m niihi na ihe ọjọọ ndị na-aga ime tupu Jizọs abịa ọzọ.”
Ọ bụghị nnọọ naanị ụmụntakịrị nwere ike inwe mmetụta dị otu a. Ndụmọdụ kachasị mma e nwere maka ya, maka gị, na maka mụ bụ isoro nkuzi niile nke Onye Nzọpụta. Ntuziaka Ya niile abụghị ma ọ dị omimi ọ bụghị ma ọ dị mgbagwoju anya. Mgbe anyị sooro ha, anyị ekwesịghị ịtụ egwu ma ọ bụ ị na-echegbu onwe anyị.
Nʻebe ngwụcha nke ozi nke anụ ahụ Ya, a jụrụ Jizọs Kraịst mgbe Ọ ga-abịa ọzọ. Nʻazịza, Ọ kuziri ụkabụilu atọ, ededatara na Matiu 25, gbasara otu esi akwado izute Ya—ma ọ bụ nʻoge Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ Ya ma ọ bụ mgbe ọbụla anyị hapụrụ ụwa nke a. Nkuzi ndị a siri ike niihi na nkwadobe nke onwe bụ isi ebumnuuche nke ndụ iji zute Ya.
Onye Nzọpụta na mbụ kọrọ ụkabụilu nke ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke. Niime ụkabụilu nke a, ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke gara oriri agbam akwụkwọ. Ise jiri amamiihe weta mmanụ ịgbaju oriọna ha, ma ise na nzuzu ewetaghị. Mgbe a mara ọkwa ọbịbịa dị nso nke nwoke na-agba akwụkwọ, ndị aghọghọ ise na amaghị nwoke ahụ dị nzuzu pụwara gaa ịzụ mmanụ ọkụ. Mgbe ha lọghachiri, oge agaala nke ukwuu; ọnụ ụzọ oriri ahụ ka emechiri.
Jizọs chọpụtara ụzọ akụkụ atọ nke ụkabụilu ahụ iji nyere anyị aka. Ọ kọwara:
“Ma n’ụbọchị ahụ, mgbe m ga-abịa n’ebube m, ka a ga-emezu nkọnilu ahụ nke m kwuru banyere ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke.
“Niihi na ndị ahụ maara ihe ma nabatawokwa eziokwu ahụ, ma werewokwa Mmụọ Nsọ dị ka onye ndu ha, ma eduhieghịkwa ha—n’ezie a sị m unu, ha … ga-anọgide nʻụbọchị ahụ.”
Ikwu ya nʻụzọ ọzọ, ha ekwesịghị ịtụ egwu ma ọ bụ nwee nchekasị, niihi na ha ga-anya ndụ ma mee nke ọma. Ha ga-emeri.
Ọ bụrụ na anyị maara ihe, anyị na-anata eziokwu site na ịnabata ozi ọma nke Jizọs Kraịst site na emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile nke ọkwa nchụaja. Nke ọzọ, anyị na-agbalịsi ike ịnọgide na ntozu oke nke inwe Mmụọ Nsọ ịnọnyere anyị mgbe niile. Mmenwu nke a ahaghị ị bụ ihe a na-enweta nʻotu nʻotu na nʻonwe nʻonwe, kpọm kpọm kpọm. Ịdị na-anọgide, ihe gbasara onwe onye, ihe omume niile nke uchu na-adịghị eme na-ọha na-akpọbata Mmụọ Nsọ idu anyị.
Mmewere nke atọ nke Jizọs gosịpụtara bụ izere nduhie. Onye Nzọpụta dọrọ aka na ntị:
“Geenụ ntị ka onye ọbụla ghara iduhie unu.
“N’ihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa n’aha m, na-asị, Mụ onwe m bụ Kraịst; ma gakwa eduhie ọtụtụ.”
Onye Nzọpụta maara na ndị maramaraniihu ga-agbalị iduhie ndị a họpụtara ma na ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ka a ga-aghọgbu. Anyị agaghị ma ọ bụ ekwenyere ndị ahụ na-ekwu nʻụzọ ụgha na ha nwere mmachibido sinachi ma ọ bụ nwaa anwaa daba nʻụzọ mbụrụ nhicha ọnụ ma ọ bụ ụlọọgbakọ nzuzo niile ịnata nkuzi site nʻaka ndị anwansị.
Akwụkwọ nke Mọmọn na-akuziri anyị ụzọ anyị ga-esi amata ndịiche dị na ndị nduhie site na ndị na-eso ụzọ. Ndị na-eso ụzọ mgbe niile na-akwalite ikwere na Chineke, na-ejere Ya ozi, ma na-eme ihe ọma. Agaghị eduhie anyị mgbe anyị na-achọ ma na-anata ndụmọdụ site na ndị atụkwasịrị obi ndị na onwe ha bụ ndị na-eso ụzọ nke Onye Nzọpụta kwesịrị ntụkwasị obi.
Anyị nwekwara ike zere nduhie site na ị na-efe ofufe na tempụl kwa oge. Nke na-enyeaka ejigide nhụnuuche dị ebighị ebi ma chekwaa anyị site na mmetụta niile nke nwere ike imegharị anya ma ọ bụ kwapụ ihu site nʻụzọ ọgbụgba ndụ.
Ihe ọmụmụ dị oke mkpa banyere ụkabụilu nke a banyere ụmụagbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke bụ na anyị maaraihe mgbe anyị nabatara ozi ọma, chọọ inwe Mmụọ Nsọ ịnọnyere anyị, ma zere nduhie. Umuagbọghọ ise ndị ahụ maaraihe e nweghị ike inyere ndị ahụ na-ejighị mmanụ aka; o nweghị onye ọbụla nwere ike nabata ozi ọma, nata Mmụọ Nsọ dị ka onye ndu, ma zere nduhie nʻọnọdụ anyị. Anyị ahaghị ime nke a maka onwe anyị.
Onye Nzọpụta mgbe ahụ kọrọ ụkabụilu nke akara aka niile ahụ. Niime ụkabụilu nke a, otu nwoke nyere ọnụ ego dị iche iche, a rụtụrụ aka dị ka akaraka niile, ruo ndị odibo atọ. Otu nwa odibo ka o nyere onyinye ise, onye nke ọzọ ka o nyere abụọ, ma onye nke atọ o nyere otu. Ka oge na-aga, ndị odibo abụọ ndị nke mbụ mụbara ihe ha natara. Mana nwa odibo nke atọ gara nnọọ lie otu onyinye ya nʻala. Nye ndị odibo abụọ ndị ahụ ndị mụbaworo onyinye ha, nwoke ahụ sịrị, “I mere nke ọma, … ezi odibo kwesịrị ntụkwasị obi: i kwesịwo ntụkwasị obi niihe ole ma ole, aga m eme gị onye ọchịchị na-achị ọtụtụ ihe: banye n’ọn̄ụ nke Onyenwe gị.”
Nwoke ahụ mechara baara nwa odibo onye nke liri onyinye ya mba maka ịbụ “onye obi ọjọọ na onye ume ngwụ.” Onyinye nke nwa odibo nke a ka anapụrụ, ma a chụpụrụ ya. Otu ọ dị, a sị na nwa odibo nke a mụbara onyinye ya, ọ gaara anata otu ụdị otuto ahụ na ụgwọ dịkwa ka ndị ọzọ.
Otu ozi nke ụkabụilu nke a bụ na Chineke na-atụanya nʻaka anyị ịmụbawanye mmeli niile enyeworo anyị, mana Ọ chọghị anyị ịtụnyere mmeli anyị na nke ndị ọzọ. Tụlee nghọta nke a enyere site nʻaka 18th-century Hasidic scholar Zusya nke Anipol. Zusya bụụrụ onye nkuzi amaama onye malitere ịtụ egwu dị ka ọ na-erute ịnwụ. Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ, “Nna anyị ukwu, gịnị mere iji ama jijiji? I biwo ezi ndụ; nʻezie Chineke ga-akwụ gị ụgwọ dị ukwuu.”
Zusya kwuru: Ọ bụrụ na Chineke a sị mụ, ʻZusya, gịnị mere na ị bụghị Mozis ọzọ?ʻ Aga m a sị, ʻNiihi na inyeghị m ịdị ukwuu nʻobi nke inyere Mosis.ʻ Ma ọ bụrụ na m eguzoro niihu Chineke ma Ya a sị, ʻZusya, gịnị mere na ị bụghị Solomọn ọzọ?ʻ Aga m a sị, ʻNiihi na inyeghị m amamiihe nke inyere Solomọn.ʻ Mana, ewo, gịnị ka m ga-ekwu ma ọ bụrụ na m eguzoro niihu Omeè m ma Ya a sị, ʻZusya, gịnị mere na ị bụghị Zusya? Gịnị mere na ị bụghị nwoke ahụ onye M nyere gị ike ị bụ?ʻ Ahaa, ọ bụ ihe mere m jiri na-ama jijiji.”
Nʻezie, Chineke ga-enwe ndakpọ olileanya ma ọ bụrụ na anyị adabereghị nʻuru niile, ebere, na amara nke Onye Nzọpụta ịbawanye mmeli niile anyị na-anatawo. Site na enyemaka nke ịhụnaanya Ya, Ọ tụrụ anya nʻaka anyị ịghọ ụdị kachasị mma nke onwe anyị. Ka anyị nwee ike malite ịmata na mmelite dị iche iche enweghị ihe o mere nʻebe Ọ nọ. Ma o kwesịrị ịdịkwa otu ahụ nye anyị.
Nʻikpeazụ, Onye Nzọpụta kọrọ ụkabụilu nke atụrụ na ewu. Mgbe Ọ ga-alọta nʻebube Ya, niihu Ya ka aga akpọkota mba niile: ma ọ ga-ekewa ha otú site na ibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewa atụrụ site na ewu ya: ma ọ ga-edote atụrụ ahụ nʻaka nri ya, mana ewu nʻaka ekpe ya.”
Ndị nke nọ nʻaka nri Ya na-aghọ ndị nketa oke nke alaeze Ya, ma ndị ahụ nọ nʻaka ekpe Ya e nweghị ihe nketa ha na eketa. Ihe eji a mara ndịiche bụ ma ha nyere Ya nri mgbe agụụ na-agụ Ya, nye Ya ihe ọn̄ụnū mgbe akpịrị na-akpọ Ya nkụ, kpọbata Ya nʻụlọ mgbe ọ bụ onye ọbịa, yinye Ya uwe mgbe Ọ gba ụtọ, ma leta Ya mgbe Ọ nọ nʻọrịa ma ọ bụ na mkpọrọ.
Ọ gbagwojuru onye ọbụla anya, ma ndị ahụ nọ nʻaka nri ma ndị nọ nʻaka ekpe. Ha jụrụ ajụjụ mgbe ha nyere, ma ọ bụ mgbe ha na-enyeghị, Ya nri, ihe ọn̄ụn̄ụ, na ihe oyiyi ma ọ bụ nyere Ya aka mgbe Ọ nọ na-adịghị ike. Na nzaghachi, Onye Nzọpụta kwuru, “Nʻezie a sị m unu, Chetakwa okwu niile nke Onyenwe anyị: “Ọ bụrụ raa na unu emewo ya nye otu onye kachasị nta niime ụmụnne m ndi a, unu emewo ya nye m.”
Ozi nke ụkabụilu ahụ doro anya: mgbe anyị na-, ejere ndị ọzọ ozi, anyị na-ejere ya Chineke; mgbe anyị na-emeghị ya, anyị na-agharịpụ Ya Ọ tụrụanya nʻaka anyị iji onyinye anyị, akaraka anyị, na mmeli anyị mee ihe iji gọzie ndụ nke ụmụ Nna nke Eluigwe. Inwe agụụ sinachi ijere ndị ọzọ ozi ka egosipụtara niime abụ e dere na 19th century site nʻaka odeabụ si Finnish Johan Ludvig Runeberg. Mụ na ụmụnne m ugboro ugboro nụrụ abụ ahụ “Onye ọrụ ugbo Paavo” oge niile anyị dị nta. Niime abụ ahụ, Paavo bụụrụ onye ọrụ ugbo na-enweghị ka ọ dị ya, onye ya na nwunye ya na ụmụ 10 bi na mpaghara ọdọmmiri nke dị nʻetiti Finland. Ọtụtụ afọ nʻụkwụ nʻụkwụ, ọtụtụ niime akụkụ ubi ya ka emebiri, ma ọ bụ site na ụsọrọ mmiri sno gbazere agbaze, akịmmiri ọkọchị, ma ọ bụ ijiriji mmalite autum. Oge ọbụla obere ihe ndị ewetere nʻubi batara, nwunye onye ọrụ ubi ahụ na-akwa arịrị, “Paavo, Paavo, gị agadi nwoke onye ahụhụ, Chineke ajụwo anyị.” Paavo, na nzaghachi, nʻolu dimkpa ji edi ihe kwuru, “Gwakọta bark na rye flawa iji mee achịcha ka ụmụntakịrị hapụ ịlaba na-agụrụ Aga m arụsi ọrụ ike iji hụ na mmiri gbapụrụ nʻubi pọtọpọtọ ahụ niile. Chineke na-anwale anyị, mana Ọ ga-ezite.”
Oge ọbụla e mebiri ihe akụkụ ubi, Paavo na-agwa nwunye ya ka ọ mụbaa ọnụego nke bark ọ na-agwakọta na flawa iji gbochie ịnwụ na agụụ. Ọ na-arụsikwa ọrụ ike karịa, na-egwu olulu iji gbapụ mmiri nʻala ahụ ma belata ubi ya ịdaba na nsogbu ụsọrọ mmiri na ijiriji isi mbụ nke autum.
Ka ọtụtụ afọ ihe isi ike gasịrị, Paavo mechara nʻikpeazụ nwete akụkụ ubi juru eju nʻoge owuwe ihe ubi. Nwunye ya n̄ụrịrị ọn̄ụ tie, “Paavo, Paavo, ndị a bụ oge ọn̄ụ! Ọ bụ oge itufu bark ahụ, ma jiri rye naanị mee achịcha.” Mana Paavo na nsọpụrụ jidere aka nwunye ya ma kwuo, gwakọta ọkara flawa ahụ ya na bark, maka na ubi nke ndị agbata obi anyị ejuwokwa na mmiri.” Paavo jiri uju akụkụ ubi ya chụọ aja iji nyere ndị agbata obi ya nọ na ahụhụ ma na-enweghị ka ọha ha aka.
Ihe ọmụmụ nke ụkabụilu nke Onye Nzọpụta banyere atụrụ na ewu bụ na anyị ga-eji onyinye ndị e nyeworo anyị—oge, akaraka, na ngọzi niile—iji jeere ụmụ Nna nke Eluigwe ozi, kachasị ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa.
Oku m nye nwata Praịmarị ahụ nọ na nchekasị nke m kpọtụrụ na mbụ, ma nye onye ọbụla niime unu, bụ isoro Jizọs Kraịst ma tụkwasị Mmụọ Nsọ obi dị ka ị ga-atụkwasị obi na enyi na-amasị gị. Dabere nʻaka ndị ahụ hụrụ gị naanya ma hụkwa Onye Nzọpụta naanya. Chọọ nduzi nke Chineke iji wulite ike ndị pụrụ iche i nwere, ma nyere ndị ọzọ aka, ọbụna mgbe ọ na-adịghị mfe. Ị ga-adị na njikere izute Onye Nzọpụta, ma i nwere ike sonye Onyeisi Nelson na ị bụ onye ji ọn̄ụ ekwere na ihe ga-adị mma. Na-ime otu ahụ, ị na-enye aka akwado ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst, ma ị ga-enweta ngọzi site na olileanya zuruoke ịbanye na ezumiike na ọn̄ụ nke Onyenwe anyị, ugbua ma nʻọdịniihu.
Dị ka anyị na-ekwe nʻotu niime abụ ndị ọhụrụ anyị:
Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.