Ọgbakọ Zuru ọha
Nkwado nke Onwe maka Izute Onye Nzọpụta
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


14:9

Nkwado nke Onwe maka Izute Onye Nzọpụta

Soro nkuzi niile nke Onye Nzọpụta. Ntuziaka Ya niile abụghị ma ọ dị omimi ọ bụghị ma ọ dị mgbagwoju anya. Mgbe anyị sooro ha, anyị ekwesịghị ịtụ egwu ma ọ bụ ị na-echegbu onwe anyị.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, Ọktoba gara aga, Onyeisi Russell M. Nelson kuziri, “Ugbua bụ oge nke mụ na unu iji kwadoo maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst ahụ.” Mgbe Onyeisi Nelson na-ekwu okwu maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, ọ na-ejikarị nchekwube na-enye ọn̄ụ. Otu osila dị, otu nwata nwanyị nọ na Praịmarị mgbe na-adịghị anya gwara m na ọ na-echegbukarị onwe ya mgbe ọbụla a kpọrọ Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ aha. Ọ sịrị, “Egwu na-atụ m niihi na ihe ọjọọ ndị na-aga ime tupu Jizọs abịa ọzọ.”

Ọ bụghị nnọọ naanị ụmụntakịrị nwere ike inwe mmetụta dị otu a. Ndụmọdụ kachasị mma e nwere maka ya, maka gị, na maka mụ bụ isoro nkuzi niile nke Onye Nzọpụta. Ntuziaka Ya niile abụghị ma ọ dị omimi ọ bụghị ma ọ dị mgbagwoju anya. Mgbe anyị sooro ha, anyị ekwesịghị ịtụ egwu ma ọ bụ ị na-echegbu onwe anyị.

Nʻebe ngwụcha nke ozi nke anụ ahụ Ya, a jụrụ Jizọs Kraịst mgbe Ọ ga-abịa ọzọ. Nʻazịza, Ọ kuziri ụkabụilu atọ, ededatara na Matiu 25, gbasara otu esi akwado izute Ya—ma ọ bụ nʻoge Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ Ya ma ọ bụ mgbe ọbụla anyị hapụrụ ụwa nke a. Nkuzi ndị a siri ike niihi na nkwadobe nke onwe bụ isi ebumnuuche nke ndụ iji zute Ya.

Onye Nzọpụta na mbụ kọrọ ụkabụilu nke ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke. Niime ụkabụilu nke a, ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke gara oriri agbam akwụkwọ. Ise jiri amamiihe weta mmanụ ịgbaju oriọna ha, ma ise na nzuzu ewetaghị. Mgbe a mara ọkwa ọbịbịa dị nso nke nwoke na-agba akwụkwọ, ndị aghọghọ ise na amaghị nwoke ahụ dị nzuzu pụwara gaa ịzụ mmanụ ọkụ. Mgbe ha lọghachiri, oge agaala nke ukwuu; ọnụ ụzọ oriri ahụ ka emechiri.

Jizọs chọpụtara ụzọ akụkụ atọ nke ụkabụilu ahụ iji nyere anyị aka. Ọ kọwara:

“Ma n’ụbọchị ahụ, mgbe m ga-abịa n’ebube m, ka a ga-emezu nkọnilu ahụ nke m kwuru banyere ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke.

“Niihi na ndị ahụ maara ihe ma nabatawokwa eziokwu ahụ, ma werewokwa Mmụọ Nsọ dị ka onye ndu ha, ma eduhieghịkwa ha—n’ezie a sị m unu, ha … ga-anọgide nʻụbọchị ahụ.”

Ikwu ya nʻụzọ ọzọ, ha ekwesịghị ịtụ egwu ma ọ bụ nwee nchekasị, niihi na ha ga-anya ndụ ma mee nke ọma. Ha ga-emeri.

Ọ bụrụ na anyị maara ihe, anyị na-anata eziokwu site na ịnabata ozi ọma nke Jizọs Kraịst site na emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile nke ọkwa nchụaja. Nke ọzọ, anyị na-agbalịsi ike ịnọgide na ntozu oke nke inwe Mmụọ Nsọ ịnọnyere anyị mgbe niile. Mmenwu nke a ahaghị ị bụ ihe a na-enweta nʻotu nʻotu na nʻonwe nʻonwe, kpọm kpọm kpọm. Ịdị na-anọgide, ihe gbasara onwe onye, ihe omume niile nke uchu na-adịghị eme na-ọha na-akpọbata Mmụọ Nsọ idu anyị.

Mmewere nke atọ nke Jizọs gosịpụtara bụ izere nduhie. Onye Nzọpụta dọrọ aka na ntị:

“Geenụ ntị ka onye ọbụla ghara iduhie unu.

“N’ihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa n’aha m, na-asị, Mụ onwe m bụ Kraịst; ma gakwa eduhie ọtụtụ.”

Onye Nzọpụta maara na ndị maramaraniihu ga-agbalị iduhie ndị a họpụtara ma na ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ka a ga-aghọgbu. Anyị agaghị ma ọ bụ ekwenyere ndị ahụ na-ekwu nʻụzọ ụgha na ha nwere mmachibido sinachi ma ọ bụ nwaa anwaa daba nʻụzọ mbụrụ nhicha ọnụ ma ọ bụ ụlọọgbakọ nzuzo niile ịnata nkuzi site nʻaka ndị anwansị.

Akwụkwọ nke Mọmọn na-akuziri anyị ụzọ anyị ga-esi amata ndịiche dị na ndị nduhie site na ndị na-eso ụzọ. Ndị na-eso ụzọ mgbe niile na-akwalite ikwere na Chineke, na-ejere Ya ozi, ma na-eme ihe ọma. Agaghị eduhie anyị mgbe anyị na-achọ ma na-anata ndụmọdụ site na ndị atụkwasịrị obi ndị na onwe ha bụ ndị na-eso ụzọ nke Onye Nzọpụta kwesịrị ntụkwasị obi.

Anyị nwekwara ike zere nduhie site na ị na-efe ofufe na tempụl kwa oge. Nke na-enyeaka ejigide nhụnuuche dị ebighị ebi ma chekwaa anyị site na mmetụta niile nke nwere ike imegharị anya ma ọ bụ kwapụ ihu site nʻụzọ ọgbụgba ndụ.

Ihe ọmụmụ dị oke mkpa banyere ụkabụilu nke a banyere ụmụagbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke bụ na anyị maaraihe mgbe anyị nabatara ozi ọma, chọọ inwe Mmụọ Nsọ ịnọnyere anyị, ma zere nduhie. Umuagbọghọ ise ndị ahụ maaraihe e nweghị ike inyere ndị ahụ na-ejighị mmanụ aka; o nweghị onye ọbụla nwere ike nabata ozi ọma, nata Mmụọ Nsọ dị ka onye ndu, ma zere nduhie nʻọnọdụ anyị. Anyị ahaghị ime nke a maka onwe anyị.

Onye Nzọpụta mgbe ahụ kọrọ ụkabụilu nke akara aka niile ahụ. Niime ụkabụilu nke a, otu nwoke nyere ọnụ ego dị iche iche, a rụtụrụ aka dị ka akaraka niile, ruo ndị odibo atọ. Otu nwa odibo ka o nyere onyinye ise, onye nke ọzọ ka o nyere abụọ, ma onye nke atọ o nyere otu. Ka oge na-aga, ndị odibo abụọ ndị nke mbụ mụbara ihe ha natara. Mana nwa odibo nke atọ gara nnọọ lie otu onyinye ya nʻala. Nye ndị odibo abụọ ndị ahụ ndị mụbaworo onyinye ha, nwoke ahụ sịrị, “I mere nke ọma, … ezi odibo kwesịrị ntụkwasị obi: i kwesịwo ntụkwasị obi niihe ole ma ole, aga m eme gị onye ọchịchị na-achị ọtụtụ ihe: banye n’ọn̄ụ nke Onyenwe gị.”

Nwoke ahụ mechara baara nwa odibo onye nke liri onyinye ya mba maka ịbụ “onye obi ọjọọ na onye ume ngwụ.” Onyinye nke nwa odibo nke a ka anapụrụ, ma a chụpụrụ ya. Otu ọ dị, a sị na nwa odibo nke a mụbara onyinye ya, ọ gaara anata otu ụdị otuto ahụ na ụgwọ dịkwa ka ndị ọzọ.

Otu ozi nke ụkabụilu nke a bụ na Chineke na-atụanya nʻaka anyị ịmụbawanye mmeli niile enyeworo anyị, mana Ọ chọghị anyị ịtụnyere mmeli anyị na nke ndị ọzọ. Tụlee nghọta nke a enyere site nʻaka 18th-century Hasidic scholar Zusya nke Anipol. Zusya bụụrụ onye nkuzi amaama onye malitere ịtụ egwu dị ka ọ na-erute ịnwụ. Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ, “Nna anyị ukwu, gịnị mere iji ama jijiji? I biwo ezi ndụ; nʻezie Chineke ga-akwụ gị ụgwọ dị ukwuu.”

Zusya kwuru: Ọ bụrụ na Chineke a sị mụ, ʻZusya, gịnị mere na ị bụghị Mozis ọzọ?ʻ Aga m a sị, ʻNiihi na inyeghị m ịdị ukwuu nʻobi nke inyere Mosis.ʻ Ma ọ bụrụ na m eguzoro niihu Chineke ma Ya a sị, ʻZusya, gịnị mere na ị bụghị Solomọn ọzọ?ʻ Aga m a sị, ʻNiihi na inyeghị m amamiihe nke inyere Solomọn.ʻ Mana, ewo, gịnị ka m ga-ekwu ma ọ bụrụ na m eguzoro niihu Omeè m ma Ya a sị, ʻZusya, gịnị mere na ị bụghị Zusya? Gịnị mere na ị bụghị nwoke ahụ onye M nyere gị ike ị bụ?ʻ Ahaa, ọ bụ ihe mere m jiri na-ama jijiji.”

Nʻezie, Chineke ga-enwe ndakpọ olileanya ma ọ bụrụ na anyị adabereghị nʻuru niile, ebere, na amara nke Onye Nzọpụta ịbawanye mmeli niile anyị na-anatawo. Site na enyemaka nke ịhụnaanya Ya, Ọ tụrụ anya nʻaka anyị ịghọ ụdị kachasị mma nke onwe anyị. Ka anyị nwee ike malite ịmata na mmelite dị iche iche enweghị ihe o mere nʻebe Ọ nọ. Ma o kwesịrị ịdịkwa otu ahụ nye anyị.

Nʻikpeazụ, Onye Nzọpụta kọrọ ụkabụilu nke atụrụ na ewu. Mgbe Ọ ga-alọta nʻebube Ya, niihu Ya ka aga akpọkota mba niile: ma ọ ga-ekewa ha otú site na ibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewa atụrụ site na ewu ya: ma ọ ga-edote atụrụ ahụ nʻaka nri ya, mana ewu nʻaka ekpe ya.”

Ndị nke nọ nʻaka nri Ya na-aghọ ndị nketa oke nke alaeze Ya, ma ndị ahụ nọ nʻaka ekpe Ya e nweghị ihe nketa ha na eketa. Ihe eji a mara ndịiche bụ ma ha nyere Ya nri mgbe agụụ na-agụ Ya, nye Ya ihe ọn̄ụnū mgbe akpịrị na-akpọ Ya nkụ, kpọbata Ya nʻụlọ mgbe ọ bụ onye ọbịa, yinye Ya uwe mgbe Ọ gba ụtọ, ma leta Ya mgbe Ọ nọ nʻọrịa ma ọ bụ na mkpọrọ.

Ọ gbagwojuru onye ọbụla anya, ma ndị ahụ nọ nʻaka nri ma ndị nọ nʻaka ekpe. Ha jụrụ ajụjụ mgbe ha nyere, ma ọ bụ mgbe ha na-enyeghị, Ya nri, ihe ọn̄ụn̄ụ, na ihe oyiyi ma ọ bụ nyere Ya aka mgbe Ọ nọ na-adịghị ike. Na nzaghachi, Onye Nzọpụta kwuru, “Nʻezie a sị m unu, Chetakwa okwu niile nke Onyenwe anyị: “Ọ bụrụ raa na unu emewo ya nye otu onye kachasị nta niime ụmụnne m ndi a, unu emewo ya nye m.”

Ozi nke ụkabụilu ahụ doro anya: mgbe anyị na-, ejere ndị ọzọ ozi, anyị na-ejere ya Chineke; mgbe anyị na-emeghị ya, anyị na-agharịpụ Ya Ọ tụrụanya nʻaka anyị iji onyinye anyị, akaraka anyị, na mmeli anyị mee ihe iji gọzie ndụ nke ụmụ Nna nke Eluigwe. Inwe agụụ sinachi ijere ndị ọzọ ozi ka egosipụtara niime abụ e dere na 19th century site nʻaka odeabụ si Finnish Johan Ludvig Runeberg. Mụ na ụmụnne m ugboro ugboro nụrụ abụ ahụ “Onye ọrụ ugbo Paavo” oge niile anyị dị nta. Niime abụ ahụ, Paavo bụụrụ onye ọrụ ugbo na-enweghị ka ọ dị ya, onye ya na nwunye ya na ụmụ 10 bi na mpaghara ọdọmmiri nke dị nʻetiti Finland. Ọtụtụ afọ nʻụkwụ nʻụkwụ, ọtụtụ niime akụkụ ubi ya ka emebiri, ma ọ bụ site na ụsọrọ mmiri sno gbazere agbaze, akịmmiri ọkọchị, ma ọ bụ ijiriji mmalite autum. Oge ọbụla obere ihe ndị ewetere nʻubi batara, nwunye onye ọrụ ubi ahụ na-akwa arịrị, “Paavo, Paavo, gị agadi nwoke onye ahụhụ, Chineke ajụwo anyị.” Paavo, na nzaghachi, nʻolu dimkpa ji edi ihe kwuru, “Gwakọta bark na rye flawa iji mee achịcha ka ụmụntakịrị hapụ ịlaba na-agụrụ Aga m arụsi ọrụ ike iji hụ na mmiri gbapụrụ nʻubi pọtọpọtọ ahụ niile. Chineke na-anwale anyị, mana Ọ ga-ezite.”

Oge ọbụla e mebiri ihe akụkụ ubi, Paavo na-agwa nwunye ya ka ọ mụbaa ọnụego nke bark ọ na-agwakọta na flawa iji gbochie ịnwụ na agụụ. Ọ na-arụsikwa ọrụ ike karịa, na-egwu olulu iji gbapụ mmiri nʻala ahụ ma belata ubi ya ịdaba na nsogbu ụsọrọ mmiri na ijiriji isi mbụ nke autum.

Ka ọtụtụ afọ ihe isi ike gasịrị, Paavo mechara nʻikpeazụ nwete akụkụ ubi juru eju nʻoge owuwe ihe ubi. Nwunye ya n̄ụrịrị ọn̄ụ tie, “Paavo, Paavo, ndị a bụ oge ọn̄ụ! Ọ bụ oge itufu bark ahụ, ma jiri rye naanị mee achịcha.” Mana Paavo na nsọpụrụ jidere aka nwunye ya ma kwuo, gwakọta ọkara flawa ahụ ya na bark, maka na ubi nke ndị agbata obi anyị ejuwokwa na mmiri.” Paavo jiri uju akụkụ ubi ya chụọ aja iji nyere ndị agbata obi ya nọ na ahụhụ ma na-enweghị ka ọha ha aka.

Ihe ọmụmụ nke ụkabụilu nke Onye Nzọpụta banyere atụrụ na ewu bụ na anyị ga-eji onyinye ndị e nyeworo anyị—oge, akaraka, na ngọzi niile—iji jeere ụmụ Nna nke Eluigwe ozi, kachasị ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa.

Oku m nye nwata Praịmarị ahụ nọ na nchekasị nke m kpọtụrụ na mbụ, ma nye onye ọbụla niime unu, bụ isoro Jizọs Kraịst ma tụkwasị Mmụọ Nsọ obi dị ka ị ga-atụkwasị obi na enyi na-amasị gị. Dabere nʻaka ndị ahụ hụrụ gị naanya ma hụkwa Onye Nzọpụta naanya. Chọọ nduzi nke Chineke iji wulite ike ndị pụrụ iche i nwere, ma nyere ndị ọzọ aka, ọbụna mgbe ọ na-adịghị mfe. Ị ga-adị na njikere izute Onye Nzọpụta, ma i nwere ike sonye Onyeisi Nelson na ị bụ onye ji ọn̄ụ ekwere na ihe ga-adị mma. Na-ime otu ahụ, ị na-enye aka akwado ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst, ma ị ga-enweta ngọzi site na olileanya zuruoke ịbanye na ezumiike na ọn̄ụ nke Onyenwe anyị, ugbua ma nʻọdịniihu.

Dị ka anyị na-ekwe nʻotu niime abụ ndị ọhụrụ anyị:

N̄ụrịanụ! Ma kwadoonụ maka ụbọchị ahụ! …

Ọdịghị onye maara ụbọchị ahụ na awa mgbe Ọ ga-abịa ọzọ,

Mana Ọ ga-alọghachi dị ka akwụkwọ nsọ kwuru; ọ ga-abụ ụbọchị an̄ụrị

Mgbe Onye Nzọpụta anyị hụrụ naanya ga-abịa ọzọ.

Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Russell M. Nelson, “Onyenwe anyị Jizọs Kraịst Ga-abịa Ọzọ,” Liahona, Nọv. 2024, 121.

  2. Anyị ekwesịghị inwe nchekasị, niihi na Jizọs Kraịst ga-enwogharị anyị nke ga-eme ka anyị dị njikere izute Ya. Mgbe anyị nọgidesịrị ike na ịkwanyere ọgbụgba ndụ anyị ugwu ma debe iwu nsọ niile, anyị na-eji nwayọ aghọ, site na amara na ngọzi Ya niile, na-akarị adị mma dị ka Onye Nzọpụta. Ma dị ka anyị na-eme, anyị ga-adị na njikere maka Ọbịbịa Ya Nke ugboro Abụọ. Dị ka ekwuru na 1 Jọn 3:2-3:

    “Ndị m hụrụ naanya, ugbua anyị bụ ụmụ Chineke, ma ọ pụtabeghi ihè ugbua ihe anyị ga-abụ: mana anyị mara na, mgbe ọ ga-abịa, anyị ga-adị ka ya; niihi na anyị ga-ahụ ya dị ka ọ dị.

    “Ma onye ọbụla nke nwere olileanya nke a niime ya na-eme onwe ya ka ọ dị ụcha, ọbụna dị ka o si dị ụcha.”

  3. Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị ga-eme na mmalite nke otu puku afọ mgbe Onyenwe anyị ga-achị, mgbe Ọ ga-alọghachi nʻebube, ma mmadụ niile ga-ekwete na Ọ bụụrụ ma bụ Mezaya ahụ e kwere na nkwa (lee Aịzaya 45:23; Zekaraya 12:10; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:104).

  4. Lee Russell M. Nelson, “Ozi Mmepev,” Liahona, Me 2020, 6.

  5. Lee Ntụgharị asụsụ Josef Smith, Matiu 25:1 (niime Matiu 25:1, nkọwada a); Matiu 25:1–4, 6–13.

  6. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:56-57.

  7. Lee David A. Bednar, “Atọghatara nye Onyenwe anyịv,” Liahona, Nọv. 2012, 109.

  8. Lee 2 Nifaị 32:5.

  9. Matiu 24:4–5.

  10. Lee Joseph Smith—Matiu 1:5–6, 8–9, 21–22, 25–26.

  11. Lee Moronai 7:13, 15–17. Nkuzi ndị dị niime Akwụkwọ nke Mọmọn jikọtara aka ma mee ka nkuzi ndị nke dị na baịbụl doo anya “ruo na nghaghagbu nke ozizi ụgha niile” (2 Nefi 3:12). Ikekwe nke a bụ akụkụ ezi uche maka nkuzi nke Onyeisi Russell M. Nelson na “Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ngwa ọrụ nke Chineke iji kwadoo ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ (lee “Akwụkwọ nke Mọmọn, Mkpokọta nke Izrel, na Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ,” Liahona, Julaị 2014, 27).

  12. Lee Russell M. Nelson, “Chee Selestịal!,” Liahona, Nọv. 2023, 119. Onyeisi Nelson kuzikwara: “Agbarụkwala [ama gị] site na filọsọfi ụgha nke ndị nwoke na ndị nwanyị na-ekweghị ekwe” (Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” Liahona, Nọv. 2022, 97). Were ajụjụ gị niile gakwuru Onyenwe anyị na nsipụta ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi. … Kwụsị ịbawanye obi abụọ gị niile site na ikwugharị ha gị na ndị osiagụgọ ndị ozọ” (“Kraịst Ebilitewo; Okwukwe na Ya Ga-eme Ugwu ukwu niile Anọgharịa,” Liahona, Me 2021, 103). Dị ka Alma onye amụma nke Akwụkwọ nke Mọmọn nke Okenye nyere na ndụmọdụ, “Atụkwasịla onye ọbụla obi ịbụ onye nkuzi unu ma ọ bụ onye ozizi ozi ọma unu, ma ọ bụghị ma ọ bụ onye nke Chineke, na-aga n’ụzọ ya niile ma na-edebe iwu nsọ ya niile” (Mozaya 23:14). Nʻọgbọ nke a, Onye Nzọpụta kuziiri anyị ịdabere naanị na ndị ahụ “ndị mmụọ ha dị nchegharị, … ndị asụsụ ha dị nwayọọ ma na-ebuli elu, … [onye] na-ama jijiji nʻokpuru ike m … ma … na-amịpụta mkpụrụ nke otuto na amamiihe, dị ka otu mkpughe niile na eziokwu niile nke m nyeworo unu siri dị” (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:14-19).

  13. Lee Russell M. Nelson, “Onyenwe anyị Jizọs Kraịst Ga-abịa Ọzọ,” 121.

  14. Mgbe e mere emume nsọ nnọchi anya niile na ọnọdụ ndị nna nna ochie nwụrụ anwụ, ndị nna nna ochie ahụ na-ekpebi maka onwe ha ma ha ga-anabata ozi ọma ma nọgide kwesị ntụkwasị obi ma ọ bụ gaghị. Ọbụna niime ọnọdụ ndị ahụ niile, ọ dịghị onye ọbụla na-eme mkpebi niile maka onye ọzọ.

  15. Lee Matiu 25:14–30.

  16. Lee Ihendu nye Akwụkwọ nsọ, “Talent.” Talent bụụrụ otu ihe mgbe ochie banyere ịdịarụ na ihe banyere uru ego bara nʻoge ndị Grik na ndị Roman. Eweere ya na otu talent ruru ihe dị ka 6,000 denarii, ma ebe ọ bụ na otu denarus bụ ihe ruru ụgwọ onye ọrụ nke otu ụbọchị, naanị otu mkpụrụ talent ga-abụ ihe dị ka ụgwọ ọrụ nke afọ 20 nke onye ọrụ ụgwọ ọrụ ya na-ebuchaghị ibu.

  17. Matiu 25:21; lee kwa amaokwu 23.

  18. Lee Matiu 25:24–26.

  19. Ịgbatị ụkabụilu ahụ, niime atụmatụ nke ihe niile dị ebighị ebi, ozugbo nwa odibo ọbụla banyere nʻọn̄ụ nke Onyenwe ya ma ghọọ onye nketa oke na ihe niile nke Onyenwe anyị nwere, dị ka o kwere ghọta, ụmụ urughuru ndịiche dị na ihe nwa odibo ọbụla nweburu na mmalite na-aghọ ihe a na-elefuru anya.

  20. Na mgbakwunye, Onyenwe anyị na-atụnyere talent ndị akpọrọ aha nʻụkabụilu nke a na akụkụ dị iche iche nke ndụ na ozi ọma, tinyere mmata ihe na ama (lee Eta 12:35; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:2, 13) tinyekwara arịa na ọrụ nlekọta (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 82:18).

  21. Lee Harold S. Kushner, Imeri Ndakpọ Olileanya niile nke Ndụ (2006), 26.

  22. Dị ka edere niime Kwusaa Ozi ọma M: Ihe Ndu nye Ịgbasa Ozi ọma nke Jizọs Kraịst (2023), 48, Mmegide niile dị na ndụ ka e nwere ike idozi site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.”

  23. Lee Matiu 25:31-46.

  24. Matiu 25:32–33.

  25. Lee Matiu 25:37-39, 44.

  26. Matiu 25:40; lee kwa amaokwu nke 45

  27. Lee Mozaya 2:17. Anyị na-esonye nʻozi nke Onye Nzọpụta mgbe anyị gbasara ozi ọma Ya, nye aka gwọọ ndị obi tiwara etiwa (lee Aịzaya 61:1-3; Luk 4:16-21, nyere ndị na-adịghị ike aka, welite aka ndị dara mba, ma kwadosie ike ikpere ndị dara mba (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81:5).

  28. Ime ime nke azụ osisi ahụ sitere na osisi birch nwetụrụ nriọcha na faịba. E nwere ike iri ya ma ahụghị ihe ọzọ dị.

  29. Lee Johan Ludvig Runeberg, “Högt Bland Saarijärvis Moar,” Idyll och epigram Dikter (1830), nummer 25; Suomen kansalliskirjallisuus (Helsinki, 1941), 9:50–52; sv.wikisource.org/wiki/Högt_bland_Saarijärvis_moar. Ntụgharị asụsụ sitere nʻaka Swedish bụ nke m.

  30. Nke a nọchitere anya ihe Chineke gwara ndị Izrel mgbe ochie ime: “Niihi na ndị ogbenye agaghị agwụcha nʻala ahụ: ya mere enye M unu iwu, na-asị, Unu ga-agbasa aka unu mbara nʻebe nwanne unu nọ, na ndị dara ogbenye niime unu, na ndị nọ na mkpa niime unu” (Ditronomị 15:11).

  31. Lee Dallin H. Oaks, “Nkwadobe maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ,” Liahona, Me 2004, 7–10, maka mkparịta ụka dị egwu gbasara Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ na ụzọ ndị esi akwado maka ya.

  32. Lee Russell M. Nelson, “Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” 95-98. Onyeisi Nelson kuziri, “Otu mmewere nke ọgbakọ nke a dị ike bụ ịkwado ndị mmadụ bụ ndị nwere ike, ndị dị njikere, na ndị tozuru oke ịnabata Onyenwe anyị mgbe Ọ ga-abịa ọzọ; ndị na-ebuworịị ụzọ họrọ Jizọs Kraịst karịa ụwa nke a dara ada; ndị dị iche iche bụ ndị na-an̄ụrị ọn̄ụ na ohere nhọrọ ha idobe iwu niile nke Jizọs Kraịst kacha dị elu, kacha dị nsọ.” (“Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” 98).

  33. Lee Moronaị 7:3. Onyeisi Joseph F. Smith kuziri: “Ezumiike a rụtụrụ aka abụghị ezumiike nke anụ ahụ. … [Ọ bụ] ezumiike nke ime mmụọ na udo nke na-abịa site na nnakwere nke eziokwu na-ekpebiwo. … Anyị nwere ike site otu a banye niime ezumiike nke Onyenwe anyị nʻụbọchị taa, site na-ịbịa na nghọta nke eziokwu nke ozi ọma ahụ. … [Ndị ahụ banyeworo na ezumiike nke a bụ ndị ahụ] ndị uche ha na-enwetawo ojuju afọ, na ndị na-edebewo anya ha nʻakàrà nke ọkpụkpọ oku ha dị elu na mkpebi na-anaghị ahụ anya niime obi ha ịkwụsi ike nʻeziokwu, na ndị na-eje ije nʻumeala na ezi omume nʻuzọ amawapụtara maka … ndị na-eso Jizọs Kraịst. Mana e nwere ọtụtụ ndị, ebe ha na-erubeghị na mkpebi siri ike nke a, ka a na-akwagharị site nʻozizi ọbụla dapụtara, wee site otua nọrọ nʻọrịa, na-emezighị, na-enwetaghị onwe ha. Ndị a bụ ha ndị nwere ndakpọ olileanya maka ihe ndị mere na Nzukọ nsọ, ma nʻala ahụ, na niime ọgbaaghara nke ụmụ mmadụ. … Ha na-ebu nʻobi mmetụta nke nnyocha, ọgbaaghara, ejighị nʻaka. Obi anaghị ezu ha ike nʻihe ha na-eche, ma ha na-ewe iwe na obere ihe gbanwere agbanwe, dị ka onye nọ nʻoke osimiri onye nke fuworo ụzọ” (Ozizi Ozi ọma, 5th ed. [1939], 126).

  34. “Mgbe Onye Nzọpụta Ga-abịa Ọzọ,” Abụ—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.