Ọgbakọ Zuru ọha
Inwe Nsọpurụ maka Ihe niile Dị Nsọ
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


14:49

Inwe Nsọpurụ maka Ihe niile Dị nsọ

Nsọpụrụ maka ihe dị nsọ na-akwalite ezigbo obi ekele, mụbaa ezi an̄ụrị, na-eduba uche anyị na mkpughe, ma na-eweta ọn̄ụ kacha ukwuu na ndụ anyị.

Niime akwụkwọ nke Ọpụpụ, anyị na Mosis so jee na mgbada mgbada nke Ugwu ukwu Họreb dị ka ọ hapụrụ nchekasị ya kwa ụbọchị—mgbe ụfọdụ anyị ga-adị na njikere ime otu ahụ—ịhụ ọhịa na-ere ọkụ nke na-erechapụghị. Dị ka anyị rutere, “Chineke kpọpụtara ya site nʻetiti ọhịa ahụ, wee sị, Mosis, Mosis. Ma ọ siri, Ebe a ka m nọ. Ma [Chineke] kwuru, … yipụ akpụkpọ ụkwụ gị site nʻụkwụ gị, niihi na ebe iguzoro bụ ala nsọ.” N’oke nsọpụrụ, umeala, na ịtụnaanya, Mosis yipụrụ akpụkpọ ụkwụ ya ma kwadoo onwe ya ịnụ okwu nke Onyenwe anyị na ịhụta ihu Ya dị nsọ.

Ugwu ukwu ahụ dị nsọ a na-eme mmemme ndị ụka bụ nhụmiihe juputara na nsọpụrụ dị egwu, jikọtara Mosis na ejiri mara ya sinachi, ma bụụrụ, nʻeziokwu, isi mmewere nke mnwogharị ya site na onye ọzụzụ atụrụ dị umeala ruo na onye amụma dị ike, dubara ya ije ije nʻụzọ ọhụrụ na ndụ. Nʻotu aka ahụ kwa, onye ọbụla niime anyị nwere ike inwogharị ịbụ onye na-eso ụzọ anyị bụ banye na nsoro nke ime mmụọ kacha dị elu site na-ime omume ọma nke ịsọpụrụ akụkụ dị nsọ nke omume ime mmụọ.

Mkpụrụ okwu ahụ nsọpụrụ ka enwere ike chọta na enyemaka ngwaa Latin revereri, nke pụtara i “guzoro nʻịtụ egwu nke.” Nʻechiche nke ozi ọma, nkọwasị nke a gwakọtara ya na mmetụta ma ọ bụ omume nke nsọpụrụ, ịhụnaanya, na obi ekele miri emi. Ụdịrị ngosịpụta maka ihe ahụ dị nsọ site nʻaka ndị ahụ nwere obi dị nchegharị na nraranye dị omimi nye Chineke na Jizọs Kraịst na-akpalite ọn̄ụ bara ụbara niime obi ha.

Nsọpurụ maka ihe niile dị nsọ bụ ngosipụta kachasị ukwuu nke àgbà ime mmụọ dị mkpa; ọ bụ ihe na-esi na njikọ anyị nye ịdị nsọ apụta ma na-egosịpụta ịhụnaanya anyị maka na ịdị Nna anyị nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst nso. Ọ bụkwa otu niime nhụmiihe nke mkpụrụ obi kachasị elu. Ụdịrị omume ọma dị otu a na-eduzi echiche, obi, na ndụ anyị chee ihu nʻebe Chi nọ. Nʻezie, nsọpụrụ abụghị nnọọ otu akụkụ nke imemmụọ; ọ bụ isi ihe eji eme ya—ntọala nʻelu nke a na-ewu imemmụọ, ekewapụta njikọ nke onwe onye nye sinachi, dị ka ụmụ anyị kuziri mgbe ha na-ekwe: “Mgbe m na-enye nsọpụrụ, ama m niime obi m Nna nke Igwe na Jizọs nọ nso.”

Dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, a na-akpọku anyị iwulite onyinye nke nsọpụrụ niime ndụ anyị iji meghee onwe anyị inwe mmekọrịta anyị na Chineke na Ọkpara Ya Jizọs Kraịst kacha dị omimi, site nʻotu aka ahụ na-akwadosi ike agw`a nke ime mmụọ anyị. Ọ bụrụ na anyị kara nwee ụdị mmetụta dị otu ahụ niime obi anyị, a gaara na-enweghị obi abụọ enwe ọn̄ụ na mmasị kacha dị ukwuu na ndụ anyị, ma agaghị enwecha ohere maka iru uju na mwute. Anyị ahaghị icheta na igosi nsọpụrụ maka ihe niile dị nsọ na-eme ka ọtụtụ ihe anyị na-eme ụbọchị niile baa uru ma na-akwado mmetụta nke obi ekele anyị—na-akpake ịdị egwu, nsọpụrụ, na ịhụnaanya maka ihe ndị dị elu ma dị nsọ karịa.

Na mwute, anyị bi nʻụwa ebe igosi nsọpụrụ maka ihe ndị dị nsọ na-abawanye na-ịghọ ihe na-anaghị ahụkarị. Nʻeziokwu, ndị bi nʻụwa na-enwe ọn̄ụ nʻihe na-ekwesịghị nsọpụrụ, dị ka nnyocha nke tabụlọịd magazin, ihe ndị a na-eme na televishọn, ma ọ bụ intanet na-egosi. Enweghị nsọpụrụ maka ihe dị nsọ na-ebute omume akpọghị ihe mkpa na akpachaghị anya na omume ịbawanye, nke nwere ike nʻọkụ ọkụ ịgba otu ndudugandu okirikiri ịbanye na-enweghị obi ebere ma kụba ndudugandu nke na-abia abịa niime nhujuanya.

Enweghị nsọpụrụ nwekwara ike idupu anyị site na nkwekọrịta nke ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke na-ewete ma belata echiche nke anyị inye nkọwa niihu Chi. Niihi nke a, anyị na-abanye nʻọghọm nke iche naanị maka ọdịmma nke onwe anyị; na-enwetazu ihe maka akpịrị anyị na-anaghị eju eju; ma mesịa erute nʻebe na-adịghị nsọ nke a na-elelị ihe ndị dị nsọ, ọbụna Chineke, ma ya mere ọdịdị sinachi anyị dị ka ụmụ Nna nke Eluigwe. Enweghị nsọpụrụ nʻebe ihe ndị dị nsọ nọ na-eme ka nzube onye iro bawanye site na ikewa okpo mkpughe anyị niile na-emetụta emetụta, ndị dị mkpa maka ịnya ndụ nke ime mmụọ anyị nʻụbọchị anyị.

Mpụtara na ịdị mkpa nke nsọpụrụ maka ihe dị nsọ ka edepụtara nke ọma ebe niile niime akwụkwọ nsọ. Otu ọmụmaatụ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile yiri ihe na-egosi na inye Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya Jizọs Kraịst nsọpụrụ, bụ omume ọma dị oke mkpa maka ndị ahụ nke ga-erute ogo alaeze selestịal.

Dị ka ndị nzukọ nsọ anyị na-agba mbọ idobe Nna na Ọkpara nʻịdị nsọ kachasị ukwuu na nsọpụrụ nʻụzọ niile, tinyere otu anyị si egosipụta Oyiyi Ha. Nduzi nke Mmụọ Nsọ bụ ngwa dị mkpa na-ime mkpebi otu oyiyi ndị a ga-esi egosị ọdịdị dị nsọ, agwa, na njirimara niile dị ka chi nke Nna na Ọkpara ahụ. Anyị na-akpachaara anya nke ukwuu izere igosi mmewere niile nke nwere ike imegharị anyị anya site nʻisi nlekwasị anya anyị na Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya Jizọs Kraịst na nkuzi Ha niile, tinyekwara otu anyị si eji ngwa ọrụ ndị eburịị ụzọ nye site na teknụzụ, ụdị dị ka iji artificial intelligence (AI) wee mepụta ọdịnaya na oyiyi niile.

Otu ụkpụrụ nke a kwa ka a na-etinye na nsipụta ọbụla esi enwete ozi dị adị site na okporo nzikọrịta ozi nke Nzukọ nsọ iwu kwadoro. Ihe ọmụmụ ọbụla, akwụkwọ, manụal, na ozi ka akpachapụrụ anya wulite ma nye nkwado nʻokpuru ntuziaka nke Mmụọ ahụ iji hụ na anyị jigidere omume ọma dị nsọ, abamuru niile, na ọkọlọtọ niile nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Nʻozi enyere na nso nso a maka ndị dimkpa nta nke Nzukọ nsọ, Okenye David A. Bednar kuziri: “Iji nyagharịa nghọchiri mgbagwo nke ime mmụọ na teknụzụ, Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a kwesịrị nʻisite nʻumeala na nʻekpere (1) chọpụta ụkpụrụ niile nke ozi ọma nke nwere ike duo ha iji artificial intelligence eme ihe ma (2) gbaa ezi mbọ maka nsiso nke Mmụọ Nsọ na onyinye ime mmụọ nke mkpughe.”

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, na-agbanyeghị otu ọbụla teknụzụ nke oge ugbua si na-aghọwọ ịgharamịgha, o nweghị ike nʻụzọ dị mfe ịkpake ịdị egwu, egwu, na ịtụnaanya a hụrụ nʻụdị nsọpụrụ na-abịa site na mmetụta nke Mmụọ Nsọ. Dị ka ndị na-eso Jizọs Kraịst, anyị ga-akpachapụ anya ghara ịtụnwụ njikọ anyị na Chineke na Ọkpara Ya site nʻiji ọdịnaya na oyiyi niile AI-nʻebupụta nʻụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Anyị ga-echeta na ịdabere na teknụzụ nke oge ugbua “ogwe aka mmadụ” bụ ndochi anya na-ekwesịghị ekwesị na-anaghị enye nsọpụrụ maka mkpatemmụọ, ibuli elu, na aka ebe nke enwere ike naanị ịnata site na ike nke Mmụọ Nsọ. Dị ka Nefi mara ọkwa: “O Onyenwe anyị, a tụkwasịwo m gị obi, ma aga m atụkwasị gị obi ruo mgbe ebighị ebi. A gaghị m atụkwasị obi m n’ogweaka nke mmadụ.”

Na mkpughe ọzọ, e nyere Onye amụma Joseph Smith nkuzi na tempụl niile ewuru nye Onyenwe anyị ga-abụ ebe nsọpụrụ nye Ya. Nʻoge ije ozi ya niile, onye amụma anyị hụrụ naanya, Onyeisi Russell M. Nelson, ekwusiwo ike nʻụzọ siri ike ife ofufe anyị na nsọpụrụ niime tempụl dị nsọ. Niime ụlọ nke Onyenwe anyị, ana akuziri anyị gbasara ịbanye niihu Nna na Ọkpara dị nsọ. Ahụtawo m ya mgbe niile ka nkuzi ma ọbụla ihe na-akpatemmụọ na otu niime ihe mbụ ndị anyị na-eme ma abanye na tempụl na ịkwado onwe anyị nʻisonye mee emume nsọ niile dị nsọ ebe ahụ bụ iyipụ akpụkpọ ụkwụ anyị ma gbanwee yiri uwe ọcha anyị. Dị ka Mosis, ọ bụrụ ma anyị kpachapụrụ anya, anyị nwere ike mata na iyipụ akpụkpọ ụkwụ nke ụwa anyị bụ mmalite nke ịzọba ụkwụ nʻala dị nsọ na inwe mnwogharị nʻụzọ ndị dị elu ma dị nsọ karịa.

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, anyị enweghị mkpa ịrịgo nʻelu ugwu ukwu, dị ka Mosis mere, iji chọpụta nsọpụrụ maka ihe ndị dị nsọ ma gbanwegharịa ịbụ onye na-eso ụzọ anyị banye nʻogo nke ime mmụọ na nnukwu ịhụnaanya. Anyị nwere ike chọta ya, iji maatụ, dị ka anyị na-agba mbọ ichekwa gburugburu ebe obibi anyị site na mmetụta nke ndị ụwa. Ekpere si nʻobi ma arịọsiri ike niihu Nna nke Eluigwe nʻaha Jizọs Kraịst nwere ike sochie nke a, ma na-achọ ịmatakwu Onye Nzọpụta karịa site na ịmụsi okwu Chineke ike nke ahụrụ niime akwụkwọ nsọ nakwa niime nkuzi niile nke ndị amụma anyị. Na mgbakwunye, ụdịrị mnwogharị nke ime mmụọ dị otu ahụ nwere ike ịbịa mgbe anyị na-agba mbọ ịkwanyere ọgbụgba ndụ anyị na Onyenwe anyị meworo ugwu site nʻibi ndụ na nrube isi nye iwu nsọ Ya niile. Mbọ ndị a nwere ike iweta ịdị jụụ na idere duu dị an̄aa na mkpụrụ obi anyị. Ilekwasị anya nʻụdị omume dị otu ahụ nwere ike nʻezie nye aka nwogharịa ebe obibi anyị ịbụ ebe mgbaba nke ime mmụọ nwere nsọpụrụ—ebe ndị dị nsọ nke okwukwe onwe onye ebe Mmụọ na-ebi, dịkwa nnọọ ka nhụmiihe nke ugwu ukwu nke Mosis

Anyị nwekwara ike hụta ụdị mnwogharị nke ime mmụọ ahụ mgbe anyị jiri okwukwe sonye na-ime ihe na nzukọ ife ofufe nke Nzukọ nsọ, tinyekwara ichigharị obi anyị nʻebe Onyenwe anyị nọ site na ịbụ abụ dị nsọ si nʻobi. Ịtụgharị na-akụkụ—dị ka Mosis—site nʻihe mmegharị anya niile nke ụwa, nke ka nke ekwe ntị niile ma ọ bụ ihe ọbụla na-amagbaghị ya na oge nke a dị nsọ, na-enye anyị ike inyefe echiche anyị nʻuju nʻiri oriri nsọ, were uche na obi anyị tụkwasị nʻOnye Nzọpụta na aja mgbaghara mmehie Ya tinyekwara ọgbụgba ndụ nke onwe anyị. Ụdịrị nlekwasị anya nke ọgbụgba ndụ dị otu ga-akwalite oge iji nsọpụrụ emegharị ọhụrụ oriri anyị na Onye Nzọpụta ma ga-eme Ụbọchị izu ike ihe ọn̄ụ ma nwogharịa ndụ anyị.

Emesịa, anyị nwere ike nweta mgbanwe nke ime mmụọ nke a niime ịbụ ndị na-eso ụzọ anyị dị ka anyị na-efe ofufe mgbe niile niime ugwu ukwu nke ụlọ nke Onyenwe anyị—tempụl anyị niile dị nsọ—ma gbaa mbọ ibi ndụ site na ntụkwasị obi ọgbụgba ndụ, nke ka nke mgbe anyị zutere mnwale niile nke ndụ a pụrụ ịnwụ anwụ.

Mụ na nwunye m na onwe anyị enwetawo ụfọdụ oge ndị nke ugwu ukwu dị nsọ na nsọpụrụ mgbe anyị na-agbawo mbọ itinye ụkpụrụ ndị a niime ndụ anyị, bụ nke na-akpatawo mnwogharị bara uru niime nsoụzọ anyị. E chetara m ọ dị ka ụnyahụ na-agafe ebe semetrị tupu a na-eli nwa anyị nke abụọ, onye a mụrụ na-akaghị aka ma ọ nyaghị ndụ, ebe nwunye m ka nọbe agbake agbake nʻụlọ ọgwụ. E chetara m ikpesị ekpere ike nye Chineke na nnukwu ugwu, na-arịọ maka enyemaka iji die mnwale ahụ chere m aka mgba. Nʻotu oge ahụ, anatara m mmasi obi ike nke ime mmụọ siri ike ma doo anya niime obi m: Ihe niile ga-adị mma niime ndụ anyị ma ọ bụru na nwunye m na mụ onwe m edie, jigide aka na ọn̄ụ na-abịa site nʻibi ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ihe yiburu ka ihe aka mgba na-anyịgbu anyịgbu, dị mwute nʻoge ahụ ghọrọ nhụmiihe nwere nsọpụrụ, dị nsọ, isi okwute nke na-enyewo aka kwadoo okwukwe anyị ma nyewo anyị obisi ike niime ọgbụgba ndụ niile anyị meworo anyị na Onyenwe anyị na niime nkwa Ya niile maka mụ na ezi na ụlọ m.

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, nsọpụrụ maka ihe dị nsọ na-akwalite ezigbo obi ekele, mụbaa ezi an̄ụrị, na-eduba uche anyị na mkpughe, ma na-eweta ọn̄ụ kacha ukwuu na ndụ anyị. Ọ na-edobe ụkwụ anyị nʻala nsọ ma bulie obi anyị nye Chi.

Ana m agba ama na dị ka anyị na-agba mbọ iwebata omume ọma dị otu ahụ niime ndụ anyị kwa ụbọchị, anyị ga-enwe ike ịbawanye umeala anyị, bawanye nghọta nke uche Chineke maka anyị, ma kwadosie ike obisi ike anyị niime nkwa niile nke ọgbụgba ndụ ahụ niile anyị meworo anyị na Onyenwe anyị. Ana m agba aka ebe na dị ka anyị na-anabata onyinye nke nsọpụrụ nke a maka ihe ndị dị nsọ—ma ọ bụ nʻelu ugwu ukwu nke ụlọ nke Onyenwe anyị, niime ụlọ nzukọ, ma ọ bụ niime ebe obibi anyị—anyị ga-ejuputa na-ịtụnaanya hiri ụda ma dị egwu dị ka anyị na-ejikọta ọnụ ruo nʻịhụnaanya zuru oke nke Nna anyị nke Eluigwe na Jizọs Kraịst. Ana m eji nsọpụrụ agba aka ebe eziokwu ndị a n’aha dị nsọ nke Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị, Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Ọpụpụ 3:4–5.

  2. Lee latin-dictionary.net, “revereri.”

  3. “Nsọpụrụ Bụ Ihụnaanya,” Akwụkwọ Ukwe nke Ụmụntakịrị, 31.

  4. Lee Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: David O. McKay (2003), 31.

  5. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 63:64.

  6. Lee Boyd K. Packer, “Nsọpụrụ, Na-ebute Mkpughe,” Ensign, Nov. 1991, 22; leekwa Russell M. Nelson, “Ọn̄ụ na Ịnya ndụ nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nov. 2016, 81–84.

  7. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 76:92–95.

  8. David A. Bednar, “Ihe niile dị ka Ha Dị Nʻezie 2.0” (worldwide devotional for young adults, Nov. 3, 2024), Ọba akwụkwọ Ozi ọma; leekwa Gerrit W. Gong na John C. Pingree Nta, “Ụkpụrụ niile maka Nzukọ nsọ Iji Artificial Intelligence eme ihe” (Leadership Enrichment Series, Mar. 13, 2024); Gerrit W. Gong, “Artificial Intelligence—Ohere niile, Mkpachapụ anya niile, Ụkpụrụ niile Na-eduzi Nzukọ nsọ” (nzukọ odudu ọgbakọ zuru ọha, Epr. 5, 2024).

  9. 2 Nifaị 4:34.

  10. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:13, 16–21.

  11. Lee Russell M. Nelson, ,“Ịghọ Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a Eji amaatụ,” Liahona, Nọv. 2018, 114; “Tempụl ahụ na Ntọala Imemmụọ Gịv,” Liahona,Nọv. 2021, 96.

  12. Lee Russell M. Nelson, “Jiri Okwukwe Nabata Ọdịniihu,” Liahona, Nọv. 2020, 74–75.

  13. See Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 136:28.