“Lọghachikwute M … Ka M Weee Gwọọ Gị”
Enwere ịn̄ụrị ọn̄ụ nʻeluigwe maka ndị ahụ lọghachirinụ. Oge agabeghị maka gị ịlọghachi azụ.
Anyị bibuuru nʻebe obibi osisi niile dị ebube gbara gburu gburu. Nke na-esote ọnụ ụzọ bụ ọmarịcha osisi willow. Otu abalị ọjọọ nnukwu ikuku fere, ma willow ahụ dara nʻala. Ọ tọgbọọrọ nala ahụ ebe mgbọrọgwụ ya niile fopụtara ma bụ ihe na-adịghị mma ile anya.
Ejikerewo m iwepụta ihe m ji egbukwasị osisi ahụ iji mee nkụ mgbe onye agbata obi anyị gbarala bịa ịkwụsị m. Ọ baara m mba maka enweghị ntụkwasị obi nʻosisi ahụ, ma o jiri obi ọma gbaa anyị ume ịghara igbubisi ya. O mesịrị chọpụta otu mgbọrọgwụ ka dị niime ala ma kwuo na ọ bụrụ na anyị bulie osisi ahụ elu, gbubie alaka ya niile, ma zụọ ya, mgbọrọgwụ niile ga-esikwa ike ọzọ.
Obi esichaghị m ike ma enwere m obi abụọ otu osisi nke a hụrụ dara ada ma nwee nsogbu nwere ike nyaa ndụ ma lọghachi ndụ. Echere m echiche na ọbụna ọ bụrụ na ọ maliteghị ito ọzọ, ọgaghị nʻezie anya ndụ ifufe ọzọ. Mana ịmara na onye agbata obi anyị kwere na osisi ahụ ka nwere ọdịniihu, anyị garaniihu nʻatụmatụ.
Ma resọọtụ ya? Mgbe oge gatụrụ, anyị hụrụ ihe iriba ama niile nke ndụ dị ka osisi ahụ malitere inwe mgbọrọgwụ. Ugbua afọ 12 gasịrị, osisi ahụ dịịrị ndụ, ma juputa na ndụ, nwee mgbọrọgwụ siri ikr ma ọzọkwa na-enye aka na ịma mma nke ọdịda obodo.
Mgbe mụ na Ndị nsọ na-ezukọ gburugburu ụwa, echeteere m maka osisi willow nke a na otu e siri nwee olileanya ọbụna mgbe ihe niile yiri ka o fuwo. Ụfọdụ nwebuuru ama niile nke ozi ọma nke siri ike ma dị ike nʻọrụ dị ka willow ahụ. Emesịa, niihi ebumnuuche nke onwe niile pụrụ iche, ama ndị ahụ niile ghọziri ndị na-esighị ike, na-eduba na nfunarị okwukwe. Ndị ọzọ kooro na mgbọrọgwụ kachasị dị gịrị gịrị na-amịrị ndụ nʻaja nke ozi ọma.
Agbanyeghị ọzọkwa ọzọkwa, akpatewo mmụọ m site na akụkọ niile nke oke ọtụtụ ndị horoworo ịmegharị ọhụrụ ịbụ onye na-eso ụzọ ha ma lọghachi nʻebe obibi Nzukọ nsọ ha. Kama karịa ịtụfu okwukwe na nkwenye ha dị ka nkụ enweghị uru ọ bara, kama ha azaghachiwo nye mkpali ime mmụọ niile na ọkpụkpọ oku dị ịhụnaanya nke ịlaghachi.
A gara m ọgbakọ stek dị niime Korea ebe onye otu na-alọghachi kwuru: “Ekelewo m ụmụnne nwoke maka njikkere ha ịnabata enweghị okwukwe na adịghị ike m, maka ịkpọtụrụ, ma nye ndị otu na-adịrị m obi ọma mgbe niile. A ka nwere m ọtụtụ ndị enyi gbara m gburu gburu ndị na-adịghị ike nʻokwukwe. Ọ na-atọ ọchị, mana ha na-agwa ibe ha ịlaghachi na Nzukọ nsọ iji nweteghachi okwukwe ha ọzọ. E chere m ikekwe ha niile na-enwe agụụ maka okwukwe.”
Nye ndị niile na-enwe agụụ maka okwukwe, anyị na-akpọku gị ịlọghachite. Ana m ekwe nkwa na enwere ike ịgba okwukwe gị ume dị ka ị na-esoro Ndị Nsọ efe ofufe.
Otu onye bubuuru onye mgbasa ozi ọma sitere Afrịịka degaara otu ndu Nzukọ nsọ agadi, na-ehu ekpe ma na-achọ mgbaghara maka iwe iwe niihi nkuzi ya niile banyere otu ọdịnaala omenaala, nke dubara ya ịhapụ Nzukọ nsọ. Nʻobi umeala ekwuputara m: “Na mwute, eziokwu na were iwe afọ 15 gara aga emewo ka m kwụọ oke nnukwu ụgwọ. Ọtụtụ funaraara m—dị ukwuu karịa ka m chere. Nnukwu ihere mere m site na mmerụ ahụ m kpataworo nʻụzọ ahụ, mana karịa ihe niile ọzọ obi dị m ụtọ na m achọtawo ụzọ m ọzọ.”
Nye ndị niile mataworo ihe funaara gị, anyị na-akpọku gị ịlọghachi azụ ka gị ọzọkwa detụ mkpụrụ ọn̄ụ nke ozi ọma ọnụ.
Otu nwanne nwanyị niime United State pụrụ apụ site na Nzukọ nsọ ruo ọtụtụ afọ. Akụkọ ya nke ịlọghachi ọzọ gụnyere ihe mmụta niile dị ike maka ndị nne na nna na ndị otu ezi na ụlọ ndị na-ata ahụhụ maka onye a hụrụ naanya dapụworo adapụ. O dere:
“E nwere m ike idedata ọtụtụ ihe kpatara m jiri pụọ site na Nzukọ nsọ, ozi ọma, ma nʻotu ụzọ, ezi na ụlọ m. Mana ha adịghị mkpa n’ezie. Emeghị nnukwu mkpebi ịhapụ Nzukọ nsọ—e nwere ike e mere m puku kwuru puku nhọrọ. Mana otu ihe m maara mgbe niile bụ na ndị nne na nna m mere otu nnukwu mkpebi, ma ha nọgidere na ya. Ha kpebiri ịhụ m naanya.
“Ọ dịghịrị m mfe ịmata ụdị anya mmiri gbaworo, abalị ole ụra abịaghị, ma ọ bụ okwu arịrịọ niile eji obi rịọ nʻekpere nke enyeworo niihi m. Ha emebọghị m na mmehie m niile; kama, ha kpọrọ m oku ịpụta na mmehie m. Ha emeghị ka ọ dị m ka achọghị m nebe obibi na nʻọgbakọ ezi na ụlọ niile; mmetụta nke ọbụla niime ndị ahụ bụ nke m mere nʻonwe m. Kama, ha nọgidere na anabata m esepụghị aka. Enwere ike ha ahụworịị ka ìhè m na-ebelata na mmuke. Mana ha maara na onye m bụ mgbe ahụ bụ naanị onyunyo nke onye m ka ga-abụ.
“Dị nnọọ ka ụzọ m pụrụ site na Nzukọ nsọ rara ahụ, otu ahụ kwa ka ụzọ nlọghachi m dị. Mana otu ihe nke na-araghị ahụ banyere nlọghachi bụ mmetụta nke ịlọghachi nʻebe obibi ebe m sonyere.”
Ozi m taa bụ kachasị nye ndị niile nwetebuuru mmetụta nke Mmụọ mana na-achọ ịma ma enwere ụzọ nlọtaghachi ma ọ bụ ohere maka gị niime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst eweghachitere. Ọ bụkwa maka onye ọbụla ụkwụ eseghị ike ma ọ bụ ndị ọnwụnwa na-anwa ịpụ.
Ozi nke a abụghị ihe ịma aka, ma ọ bụghị ikpe ọmụma. Ọ bụ ọkpụkpọ oku, ejiri ịhụnaanya na ezi ọchịchọ esetịpụ iji natabaghachi gị nʻebe obibi ime mmụọ gị.
Ekpewo m ekpere na gị ga-enwete mmetụta akaebe nke Mmụọ Nsọ dị ka ugbua ị na-anụ ọkpụkpọ oku ịhụnaanya na nkwa dị ebube nke a sitere na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst.
“Ọ bụ na unu agaghị alọghachikwute m ugbu a, ma chegharịa na mmehie unu, ma nwee ntọghata, ka m nwee ike gwọọ unu?”
Izu ụka ọbụla ọtụtụ na-azaghachi ọkpụkpọ oku nke Onye Nzọpụta site nʻịlọghachi ịbụ onye na-eso ụzọ na ihe omume Nzukọ nsọ, jiri nwayọọ na nʻumeala na-achọ ọgwụgwọ nke Jizọs kwere nkwa ya. Ma megide nkọwa nke mgbe ụfọdụ na-aga gburugburu, ọnụọgụgụ dị mma nke ndị anyị dị nta na-ahọrọ ịnọgidesi ike na izulite okwukwe ha niime Jizọs Kraịst.
Mgbe ụfọdụ niime ndị nsiso nke Jizọs niime Capernaum chọpụtara nkuzi ihe siri ike ma họrọ ịpụ, Ọ tụgharịrị na NdịOzi Ya ma jụọ, “Unu gakwa apụ?”
Nke a bụ ajụjụ onye ọbụla niime anyị ahaghị aza dị ka anyị na-ezute oge mnwale niile nke onwe anyị nʻotu nʻotu. Azịza nke Pita nye Jizọs enweghị atụ ma dara nnukwu ụda: “Onye ka anyị ga-agakwuru? gị nwere okwu niile nke ndụ ebighị ebi.”
Ya mere dị ka ị na-atụle ọkpụkpọ oku nke Onye Nzọpụta ịlọghachikwuru Ya, kedụ ihe i nwere ike ịmụta site nʻakụkọ ne osisi willow?
-
Njem ahụ ịlọghachi anaghị adịkama mfe ma ọ bụ doo ahụ, mana o ruru ya. Mgbe ebulitere willow anyị elu, alaka ya niile ka egbupụrụ. Ọ maghị mma. Anyị onwe anyị kwa nwere ike adịghị ike dị a anyị na-ahapụ ụzọ ochie niile ma yipụ uwe mpako. Nʻilekwasị anya nʻokwukwe gị na Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya—ogwe na mgbọrọgwụ niile—ga-enye gị olileanya na mgbam ume nke ịlọghachi azụ.
-
O were ọtụtụ afọ ka willow anyị nweteghachi ume na mma ya mbụ. Ugbu a ọ ka sie ike karịa ma maa mma karịa na mbụ. Nwee ndidi dị ka okwukwe gị na ama gị ga-etolitekwa. Nke a gụnyere eweghị iwe nokwu niile echeghị eche dị ka “Olee ebe ị nọ nʻafọ ndị a niile?”
-
Willow ahụ agaraghị anya ndụ ma enweghị nlekọta na ọzụzụ na-adị mgbe niile. Unu ga-azụlite okwukwe na ama unu dị ka unu na-eri oriri nʻelu tebulu oriri nsọ izu ụka ọbụla na dị ka unu na-efe ofufe niime ụlọ nke Onyenwe anyị.
-
Dị nnọọ ka willow ahụ siri chọọ anyanwụ maka alaka ya na akwụkwọ ya niile iji tolite ọzọ, otu ahụ ka ama gị ga-esi etolite dị ka ị na-amatazi mmetụta niile na akaebe nke Mmụọ. Mụọ ihe site nʻaka Amulek, onye kọwara oge ya dị ka onye otu na-ekwesịghị ntụkwasị obi site nʻikwu, “akpọrọ m ọtụtụ oge ma anụghị m.”
-
Onye agbata obi m maara ihe willow ahụ nwere ike ịbụkwa ọzọ. Ya mekwara Onyenwe anyị maara ike mmepụta gị dị nsọ na ihe okwukwe gị na ama gị nwere ike ịbụ. O nweghị ike iwepụ aka na gị. Site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, ihe niile nke mebiri.
Ana m agba akaebe na enwere ịn̄ụrị ọn̄ụ nʻeluigwe maka ndị ahụ lọghachirinụ. A chọrọ gị, ma a hụrụ gị naanya. Ana m agba ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị ma na Ọ ga-agwọ ndị niile ga-alọghachikwuru Ya jiri udo dị ukwuu karịa na ọn̄ụ dị ukwuu. Ogweaka ebere Ya emechighị emechi mana ghe oghe ma esetịpụrụ gị ya. Oge agabeghị maka gị ịlọghachi azụ. Jiri ịhụnaanya dị anyị nʻobi, anyị anabata gị nʻebe obibi. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.