Ọgbakọ Zuru ọha
Nnukwu Onyinye niile nke Ebighị ebi: Aja mgbaghara mmehie, Mbilite n’ọnwụ, Mweghachite nke Jizọs Kraịst
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


13:56

Nnukwu Onyinye niile nke Ebighị ebi: Aja mgbaghara mmehie, Mbilite n’ọnwụ, Mweghachite nke Jizọs Kraịst

Anyị na-achọta nime Ista niime Jizọs Kraịst udo, ị bụ, i sonye—nke ahụ idigide ya dị irè nke nwere ọn̄ụ, obi ụtọ, na ebighi ebi.

Ọtụtụ afọ gara aga, klasị isi ụtụtụ nke ozi ọma anyị buru ọtụtụ amaokwu Baịbụl nʻisi. Ịhe na-akacha amasị m bụ ederede ndị dị nkenke. Nke a gụnyere Jọn 11:35—amaokwu nke akwụkwọ nsọ kachasị dị nkenke, naanị mkpụrụ okwu atọ—”Jizọs bere akwa.”

Maka mụ ugbua, na Jizọs bere akwa nʻobi mnwute na nʻọn̄ụ na-agba akaebe maka eziokwu dị ọrụ ebube: Ọkpara nke Chineke bịara nʻụwa nʻanụ ahụ ma mụta dị ka anụ ahụ siri dị otu esi mgbe niile a nọnyere ma gọzie anyị.

Mgbe anyị na-ebe akwa nʻobi mwute ma ọ bụ nʻọn̄ụ, Jizọs Kraịst na-aghọta nʻụzọ zuru oke. Ọ nwere ike ịnọ ya nʻoge niile ahụ mgbe anyị chọsịrị ike onyinye ukwu nke ebighị ebi: Aja mgbaghara mmehie, Mbilite n’ọnwụ, nweghachite nke Jizọs Kraịst.

Jizọs kwara akwa.

Meri na Mata bere akwa maka nwanne ha nwoke Lazarọs onye nwụworo Nihi mkpalite ọmịiko, Jizọs bere akwa. Ọ kpọlitere Lazarọs ka ọ dị ndụ.

Jizọs lere Jerusalem anya na mgbede ahụ bọrọ Emume ngabiga. Ọ bere akwa, nihi ọ kpọkọtaghị ndị Ya otu nnekwu ọkụkọ si akpọkọta ụmụ ọkụkọ ya. Taa Aja mgbaghara mmehie Ya na-enye anyị olile anya nʻoge anyị na-eri uju maka ịhe naara ịdị adị.

Onyenwe anyị nke ubi vaịn ahụ na-ebe akwa dịka Ọ na-ajụ ndị odibo Ya, nke nwere ike ịgụnyere anyị dịka ndị nwoke na ndi nwanyị ije ozi nlekọta, “Kedụ ịhe ọzọ m naara ịme maka ubi vaịn m?”.

Meri guzoro nihu ili ahụ nʻobi mgbawa. Jizọs jiri nwayọ jụọ, “Gịnị na-agba gị anya mmiri?” Ọ maara na “ịkwa akwa nwere ike idigide otu abalị, mana ọn̄ụ na-abịa n’ụtụtụ.” Mbilite n’ọnwụ na-akpọta chi ọbụbọ maka ihe niile.

Nʻala niile nke Akwụkwọ nke Mọmọn, dịka igwè mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi biliri bịakwute Ya, ọn̄ụ Jizọs juputara. Ọ kwara akwa.

“Ma o kuuru ụmụntakịrị ha, n’otu n’otu, ma gozie ha, ma kpeere Nna ekpere maka ha.

“Ma mgbe o meworo nke a ọ kwara akwa ọzọ.”

Nke a bụ Ista niime Jizọs Kraịst: Ọ na-aza ọchịchọ niile nke obi anyị na ajụjụ niile nke mkpụrụ obi anyị. Ọ na-ehichapụ anya mmiri anyị, ewezuga anya mmiri nke ọn̄ụ anyị.

Mgbe anya mmiri anyị na-asọpụta, anyi na-arịọ mgbaghara mgbe ụfọdụ, nihi ihere. Mana ịmata na Jizọs Kraịst na-aghọta mgbu na ọn̄ụ niile nke ndụ nwere ike ịnye anyị ume karịrị nke onwe anyị dịka anyị na-agabiga ihe na-akụ ilu na nke dị ụtọ.

Na South America, otu onye nna na-asụ ude. Obere nwa ya nwanyị, onye bụ kpakpando na ndụ ya, anwụwo. “A gam enyepụ ihe niile m nwere iji hụ ya ọzọ,” ka ọ na-ebe akwa niime ogweaka m. E bekwara m akwa.

Okenye Gong nʻebe nranranya nke Tempụl Puebla Mexico ahụ.

Na emume ido nsọ nke Puebla Mexico Tempụl, anya mmiri nke obi ụtọ dere ihu nke otu ezi nwanne nwanyị. Ezi ihu ya na-egbuke nʻokwukwe na ịchụ aja. O kwuru, “Todos mis hijos están aquí en el templo hoy”—“Ụmụ m niile nọ nʻebe a na tempụl taa.” Ndudugandu gbakọrọ n’ụlo nke Onyenwe anyị na-ewete anya mmiri nke ọn̄ụ na obi ekele.

Na agha mba abụọ jọgburu onwe ya, ezinaụlo na ndị agbataobi mekọrịtara onwe ha ihe ọnụ apụghị ikwu. Anya mmiri nke iwe na-eji nwayọọ na-apụ ka olile anya bata. Jiri olu na-ama jijiji, otu nwanyị nʻobodo nke na-emepebeghi kwuru, “Onye agbata obi m, tupu mụ aga nʻili m, a chọrọ m ka ị mata ebe ị ga-achọta ndị otù ezinaụlọ gị a na-achọ achọ.”

Otu nwanyị na nwoke mara mma ka a na-arachi niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Ọ gbara afọ 70, dị kwa ka nke nwoke. Nwanyị a na-alụ alụ mara mma, o cherewo maka ụbọchị nke a na ntozu okè. O jiri ihere na-atụgharị uwe ọlụlụ ya nʻụzọ nke a, ma nʻụzọ nke ọzọ. Anya mmiri ọn̄ụ gbara anyị. Nkwa niile nke Chineke emezuwo. Ọgbụgba ndụ Ya na-ewete ngọzị.

Nʻoge ọ na-eme nkuzi ebe obibi nye otu nwanne nwanyị isimkpe, Boyd K. Packer mgbe ọ dị nta mụtara otu nkuzi dị nro. Mgbe ya na di ya sesịrị okwu, nwanne nwanyị ahụ ekwuo okwu ikpeazụ nke na-ewute obi. Otu mberede a na-atụghị anya ya akpọrọ ndụ nke di ya nʻụbọchị ahụ. “Ruo afọ iri ise,” nwanyị isimkpe ahụ suru ude, “Ebiwom niime ọkụ mmụọ kemgbe ahụ na-amata na okwu ikpeazụ nke ọ nụrụ site nʻigbigbere ọnụ m bụ okwu mkparị na-agbawa obi.”

Ista niime Jizọs Kraịst na-enyere anyị aka mezie, mee udo, dozie mmekọrịta anyị, nʻofe abụọ nke akwa mgbochi ahụ. Jizọs pụrụ ịgwo iri uju; Ọ pụrụ ịme ka mgbaghara dị. Ọ pụrụ ịtọghapụ anyị na ndị ọzọ site nʻihe niile anyị ma ọ bụ ha kwuru ma ọbụ mee nke nwere ike ịdọkpuru anyị nʻagha.

Ista n’ime Jizọs Kraịst na-ekwe ka anyị nwete mmetụta nkwado nke Chineke. Ụwa nke a na-agwa anyị nʻanyị toro oke ogologo, dị oke mkpụmkpụ, saa oke asaa, taa oke ahụ—amachaghị ihe, maa oke mma, ma ọ bụ zuo ezuo niime mmụọ. Site na mgbanwe nke ime mmụọ na Jizọs Kraịst, anyị nwere ike ịgbanarị izu okè ahụ nke na-ebelata ume.

Jiri ọn̄ụ nke Ista, anyị na-abụ, “E meriwo ọnwụ; mmadụ e nwerewo onwe ya. Kraịst enwewo mmeri.” Mbilite n’ọnwụ nke Kraịst atọghapuwo anyị site nʻọnwụ, site na-adịghị ike nke oge na etozughi oke nke anụ arụ. Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst nakwa eweghachi anyị ruo nʻogo nke ime mmụọ. Ọ gbara ọbara site nʻoghere niile, na-agba ọbara dị ka ọ dịịrị, iji rọpụtara anyị mgbanarị site na mmehie na nkewa. Ọ na-ejikọta anƴị niile, nʻụzo zuru ezu ma dị nsọ, nʻetiti onye nʻibe ya na nʻetiti anyị na Chineke. Niime ihe niile dị mma, Jizọs Kraịst na-eweghachite ebe ọ dị ukwuu—na-abụghị naanị ịhe dị adị na mbụ makwa nke nwere ike ịdị nʻọdịnihu.

Ndụ na ihè nke Jizọs na-agba ama ịhụnaanya nke Chineke nwere n’ebe ụmụ Ya niile nọ. Nihi Chineke Nna anyị hụrụ ụmụ Ya niile nʻọgbo ma nʻala ọbụla naanya , anyị na-ahụ niime ọtụtụ omenala na ọdịnalạ, ọkpụkpọ oku ịhụnaanya Ya iji bịa chọta udo na ọn̄ụ niime Ya. Ebe ọbụla, oge ọbụla, onye ọbụla anyị bụ, anyị nwere otu ụdị ejirimara dịka ụmụ nke otu Onye Okike ahụ. Nʻotu aka ahụ, ndị na-eso Islam, Judaism, na ndị Krsitian nwere otu nketa okpukperechi niime Nna Ebreham na njikọ ọgbụgba ndụ site na ihe omume niile nke Ijipt mgbe ochie.

Nna Ebreham bịara Ijipt ma agọzie ya.

Josef, onye erere dịka ohu na Ijipt, matara na nrọ nke Fero pụtara afọ asaa nke ụba nke ihe ga esote ya bụ afọ asaa nke ụnwụ. Josef zọpụtara ndị ezinaụlọ ya na ndị ya. Josef bere akwa mgbe ọ hụrụ atụmatụ dị ukwuu nke Chineke, ebe ihe niile na-arụkọta ọrụ ọnụ maka ọdịmma maka ndị ahụ na-edebe ọgbụgba ndụ ha.

Mozis, azụlitere nʻIjipt nʻụlọ nke Fero, natara ma emesịa weghachite ọtụghe niile nke mkpọkọta ụmụ nke Chineke.

Josef, Meri, na Josef agbapụ ruo na Ijipt.

Iji mezuo amụma ahụ, Josef, Meri, na nwa ọhụrụ Kraịst chọrọ mgbaba na Ijipt. Na Cairo, otu Onye Muslim kwusiri ike nʻokwukwe ya kwuru: “Koran na-akuzi na Josef, Meri na nwa ọhụrụ Jizọs chọtara nchekwa nʻobodo m. Nʻobodo m, Jizọs dịka nwata riri ihe oriri anyị, gaa ije mbụ Ya, kwuo okwu mbụ Ya. Nʻebe a nʻobodo m, anyị kwere na osisi hụdatara ala iji nye Ya na ezinaụlọ Ya mkpụrụ osisi. Nnọnye Ọ nọnyere nʻobodo m gọziri ndị anyị ma ala anyị.”

Atumatụ ezi ohere nhọrọ nke Chineke na-ekwe anyị ịmụta ihe site na nhụmihe nke onwe anyị. Ufọdụ ihe ndị kachasị dị ukwuu anyị ga-amụta ndụ a na-abịa site ihe ndị anyị agaghị ahọrọ ma ọlị. Nʻihụnaanya, Jịzọs Kraịst gbadatara nʻokpuru ihe niile ma gbagoo elu karịa ihe niile. Ọ na-an̄ụrị niime ike anyị nwere dị nsọ maka ikepụta ihe na ịnwe obi ụtọ, obi ebere ma na-atụghị anya ihe nrite, okwukwe ruo na nchegharị na mgbaghara. Ma Ọ na-ebe akwa iri uju niihi ịdị ukwuu nke ntaram ahụhụ mmadụ, obi ọjọọ, ikpe na-ezighi ezi—nke na-abịakarị nihi nhọrọ nke mmadụ—dịka kwa otu eluigwe niile na Chineke nke igwe si ebe kwa.

Oge spring Ista ọbụla na-agba ama na usoro na ịbịakọta ọnụ nke ime mmụọ sonyere niime usoro dị nsọ nke aja mgbaghara mmehie, mbilite n’ọnwụ, na mweghachite site na Jizọs Kraịst. Ịbịakọta ọnụ nke a dị nsọ na nke bụ ihe atụ na-abịa na-abụghị na mberede ma ọ bụ na mmanye. Sọnde Igu nkwụ, Izu ụka Dị nsọ, na Ista na-eme mmemme ncheta Aja mgbaghara mmehie na Mbilite n’ọnwụ nke Kraịst. Dịka taa, Eprel 6 ọbụla anyị na-echeta nhiwe na nhazi nke Nzukọ Nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazu a. Mweghachite nke a bụ ihe kpatara anyị ji agbakọ na Sọnde nke mbụ na Eprel ọbụla na ọgbakọ zuru ọha.

Mweghachite bịakwara dịka Jizọs Kraịst, Mozis, Elias na Elijah ndị bilitere nʻọnwụ wetaghachiri ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja na ikikere nʻebe Tempụl Kirtland edoro nsọ ọhụru nʻụbọchị Sọnde, 1836. Nʻebe ahụ nʻụbọchị ahụ ka enyere Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst eweghachiri ikikere na ngọzi iji kpọkọta ụmụ Ya, kwado ụmụ Ya ịlaghachikwuru Ya, ma imezu ịdị n’otu nke ezi na ụlọ niiile ruo mgbe ebighị ebi. Mweghachite nke ụbọchị ahụ mezuru amụma site na-ịme nʻụbochị Ista ma nke Emume ngabiga.

Okenye Gong nʻebe Tempụl Kirtland ahụ.

Gụnyekwara Tempụl Kirtland, a gara m leta na nso nso a ụfọdụ ebe ndị dị nsọ na Ohio ebe Onye amụma Josef na ndị ọzọ hụru Chineke Nna anyị na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst nʻọhụ. Onye Amụma Josef hụrụ ihe eluigwe dị ka ya. Nʻeluigwe, Nna nke Eluigwe, site na Jizọs Kraịst, “na-azọpụta ọrụ nile nke aka ya” nime alaeze nke ebube. Naanị ndị agụpụrụ bụ ndị ahụ “na-agọnarị Ọkpara ahụ mgbe Nna kpughesiworo ya.”

Dịka ije ozi nke Ya nʻụwa bidoro, Jizọs kwuputara na ozi Ya bụ ịgọzi onye ọbụla niime anyị jiri ihe niile anyị dị njikere ịnata—nʻoge ọbụla, nʻala ọbụla, nʻọnọdụ ọbụla. Mgbe o busiworo ọnụ ụbọchi 40, Jizọs banyere niime synagogue ma gụọ, “Mmụọ nke Onyenwe anyị nọnyeere m, niihi na o tewo m mmanụ ikuziri ndị ogbenye oziọma; o zitewo m ịgwọ obi tiwara etiwa, ikwusa nnapụta nye ndị a dọkpụụrụ n’agha, na ime ka onye isi hụ ụzọ, na ime ka ndị a na-echi ọnụ n’ala nwere onwe ha.”

Ndị dara ogbenye, ndị obi gbawara, ndị adọkpuru nʻagha, ndị echiri ọnụ nʻala—nke a bụ onye ọbụla niime anyị.

Akwụkwọ nke Aịzaya gara niihu kwuputa nkwa Mezaya kwere nke olile anya, nnapụta, na mmesi obi ike: “Nye ndị ahụ na-eri uju na Zayọn, … nye ha ịma mma maka ntụ, mmanụ nke ọn̄ụ maka iru uju, uwe nke otito n’ihi mmụọ nke ịdị arụ.”

Yamere, anyị na-eti nʻoke mkpu, “A ga m an̄ụrị oke ọn̄ụ niime Onyenwe anyị, mkpụrụ obi m ga-enwe ọn̄ụ niime Chineke m; nihi o yiwewom uwe niile nke nzọpụta, o kpuchiwom anụ arụ m jiri uwe mwụda nke ezi omume.”

Nʻoge Ista ọbụla, anyị na-eme ncheta, nʻudị ihe atụ zuru ezu, nnukwu onyinye niile nke ebighị ebi site na Jizọs Kraịst: Aja mgbaghara mmehie Ya; Mbilite n’ọnwụ Ya dị irè (gụnyere nkwa e kwere maka nke anyị); Mweghachite nke Nzukọ nsọ Ya nke ụbọchị ikpeazụ ya na ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja na ikikere iji gọzie ụmụ niile nke Chineke. Anyị na-an̄ụrị ọn̄ụ niime uwe gament niile nke nzọpụta na uwe mwụda nke ezi omume. Anyị na-eti nʻoke olu, “Hosanna dịrị Chineke na Nwa Atụrụ ahụ!”

“N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”

Ka anyị niile nʻotu nʻotu chọta nime aja mgbaghara mmehie, mbilite n’ọnwụ, na mweghachite nke Jizọs Kraịst—udo, ị bụ, i sonye—nke ahụ idigide ya dị irè nke nwere ọn̄ụ, obi ụtọ, na ebighi ebi, A na m ekpe ekpere, nʻaha Ya dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Lee Alma 7:11–12. Hụbakwa ama nkwa ọgbụgba ndụ ahụ nọ niime emume nsọ nke oriri nsọ: Anyị na-ewekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst, “na-echeta ya mgbe niile, ma na-edebe iwu nsọ ya niile …; ka [anyị] wee na-enwe Mmụọ Ya ịnọnyere [anyị]” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77

  2. Lee Jọn 11:33–35, 39–44.

  3. Lee Luk 19:41–44; lee kwa Matiu 23:37; Luk 13:34.

  4. Jekọb 5:41.

  5. Jọn 20:15.

  6. Abụ ọma 30:5.

  7. 3 Nefi 17:21–22.

  8. Lee Abụ ọma 107:9; Jeremaya 33:3.

  9. Lee Aịzaịa 25:8.

  10. Lee Alma 26:12.

  11. Boyd K. Packer, “Ndị nsọ Bi Nʻezi Nchekwa,” Ensign, Jan. 1973.

  12. “O Bilitewo!,” Hymnsno. 199, na-ekwu maka ozi obi ụtọ ahụ nke 2 Nefi 9:10: Jizọs Kraịst “kwadoro anyị ụzọ maka mgbalaga site na njidesi ike nke ajọọ anụ ahụ di egwụ; e, ajọọ anụ ahụ, ọnwụ na ala mụọ, … ọnwụ nke arụ, na kwa ọnwụ nke mụọ.”

  13. Lee Jenesis 37–47. Josef na-akpọta nna ya, Jekọb, na ezinaụlọ ya na Ijipt na-anọchite njikọta-ọzọ na-eme nʻetiti nna na nwa nwoke ndị nwere ogologo nkewa nʻetiti ha. Ọ bụkwara ụzọ ahụ ejiri wee chekwaa ezinaụlọ Jekọb na ndị ụmụ ụmụ ọgbụgba ndụ, ndị ga-emesịa gụnye Lehi na ezinaụlọ ya. (Lee 1 Nefii 5:14–15; 6:2.)

  14. Lee Jenesis 45:1–8

  15. Lee Ndị Rom 8:28; lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 90:24; 98:3.

  16. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 110:11; lee kwa Mak 9:2-10; Luk 9:28–36.

  17. Lee Matiu 2:13–15.

  18. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niiile 88:6; 122:8.

  19. Lee Mozis 7:28.

  20. Anyị na-ekwu maka oge Ista n’oge spring, na-wee na-amata na Ista nwere ike ịbịa na Maachị ma ọ bụ Eprel nakwa na spring na northen hemisphere na-abịakarị na Maachị ma ọ bụ Eprel. N’agbanyeghị ụbọchị Ista a kapịrị ọnụ, oge Ista na-echetara anyị nnukwu onyinye ebighị ebi site n’aka Jizọs Kraịst.

  21. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niiile 21:3; 115:4.

  22. Emume ncheta dị nsọ nke na-eme n’oge Ista ọ bụla na-adakọ kpọmkwem mgbe ụfọdụ. Nʻọmụmaatụ, Ista na ọgbakọ zuru ọha na-eme n’otu ụbọchị Sọnde na 2026 na 2029. Sọnde Igu nkwụ na ọgbakọ izugbe na-eme n’otu ụbọchị Sọnde na 2031 na 2034. Emume ngabiga na-eme nso nso Ista ma n’oge ọgbakọ zuru ọha na 2026 na 2029. N’agbanyeghị ma emume ncheta niile ndị a ha kwekọrọ kpọmkwem, anyị na-aghọta na mbịakọta nso ha abụghị site na mmanye ma ọ bụ mberede; ọ dị nsọ ma bụrụ ihe atụ.

  23. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 110.

  24. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:43; lee kwa amaokwu 42.

  25. Onyeisi Dallin H. Oaks na-akụzi na: “Nzube nke Nzukọ nsọ eweghachitere bụ ịkwado ụmụ Chineke maka nzọpụta nime ebube nke selestịal ma, nke karịrị nke a, maka mbuli elu n’ebe ebube ya kachasị elu” (“Alaeze niile nke Ebube,” Liahona, Nov. 2023, 27).

  26. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:43.

  27. Luk 4:18; lee kwa Aịzaya 61–1.

  28. Aịzaịah 61:3.

  29. Aịzaịah 61:10.

  30. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 109:79.

  31. Jọn 3:16.