Ọgbakọ Zuru ọha
Ịhụ Ndụ Naanya
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


14:9

Ịhụ Ndụ Naanya

Ndụ bụ otu akụkụ kachasị oke ọnụ ahịa niime atụmatụ zuru oke nke Nna anyị, ma site nʻiwu Ọ nyere, anyị na-ahụ ndụ naanya ma na-echekwa ya.

Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst kuziri anyị, “Site otua ka ụmụ mmadụ niile si amata na unu bụ ndi na-eso ụzọ m, ọ bụrụ ma unu nwee ịhụnaanya onye ọbụla nye ibe ya.”

Otu bishọp na Utah na nso nso a kesaara m otu nnukwu ngosipụta ịhụnaanya nke mere na ngalaba ukwu ya maka otu nwa agbọghọ na ezinaụlọ ya. Site n’usoro ihe omume mara mma, nne na nna ahụ kpebiri ịlaghachikwute Onye Nzọpụta na Nzukọ nsọ Ya. N’oge ahụ ha anaghị abịa Nzukọ nsọ, nwa ha nwanyị na-etolite agbọghọbịa mekọrọ ihe ya na otu onyeikom nta. Na nlọghachi, nwaada ọma nke a nwetere oke mmetụta ịhụnaanya sitere na Nna ya nke Eluigwe n’oge ọgbakọ ọgbụgba ama nke Ndịiyom Nta. O kpebiri obi ibi ndụ nke iwu nsọ kpam kpam Ọ dere, “E bidoro m usoro nchegharị mụ na bishọp m.”

Ozugbo nke a mesịrị, ọ dara nʻọrịa. N’okwu ọnụ ya: “[Otu] nlele gosịrị … A dị m ime. A … malitere m ibe akwá. … Nna m makuru m n’ogweaka ya ma masie m obi ike na ihe niile [ga-adị] mma. … Enyi m nwoke … gwara m ka m wepụ nwa ahụ. … A jụrụ m ajụ.”

Nlekọta maka Ndị Ahụ nọ na Mkpa

Ọ gara niihu kwuo: “A natawo m nnukwu ịhụnaanya na nkwado site na ezinaụlọ ngalaba ukwu anyị. O juputara rie nne. Bishọp [m] na onyeisi Ndịiyom Nta agbagowo elu ma gbada ala iji gosi ịhụnaanya na nkwado ha. A hụwo m aka nke Onyenwe anyị … dịka ọ na-edu mụ na ezi na ụlọ m. Ụdị ngalaba ukwu dị ka nke m bụ ụdị ezinaụlọ nke onye ọbụla chọrọ, tụmadị onye inyom nta nọ nʻọnọdụ m.”

Ya na ezinaụlọ ya na ngalaba ukwu ezi na ụlọ ya jiri ịhụnaanya nabata nwa nwoke ọhụrụ ya na Febrụwarị nke a gara aga.

Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.

Onyeisi Russell M. Nelson ekwuwo: “Akara ngosi nke ezi Nzukọ nsọ dị ndụ nke Onyenwe anyị mgbe niile ga-abụ mgbalị ahaziri ahazi … iji jeere ụmụ Chineke ozi n’otu n’otu … [na-eje ozi nlekọta jiri ebere dị ịhụnaanya] nye onye ahụ, dịka O siri mee.”

Ịnyere Nhọrọ Ezi omume Aka

Mgbe otu nwanyị na-emebeghi ọlụlụ chọpụtara na ọ dị ịme nwa ọ na-atụghị anya, nchegbu ahụike, ọgba aghara ime mmụọ, ihere, nchegbu okwu ego, ajụjụ gbasara agụmakwụkwọ, alụmdị na nwunye a na-ejighị n’aka na mnwute nke ebumnuuche niile ndị na-agaghị abia na mmezu, nwere ike, n’oge mgbu na mgbagwojuanya ahụ, mee ka nwanyị nwere eziuche a aga ije nke ga-ewete mgbu dị omimi na ịkwa mmakwaara.

Maka onye ọbụla na-ege ntị nke gabigaworo mgbu dị omimi na ịkwa mmakwaara site na ime ma ọbụ isonye na ite ime, biko cheta: Agbanyeghi na anyị enweghi ike ịgbanwe ihe gara aga, Chineke pụrụ ịgwo ihe gara aga.” Mgbaghara nwere ike bịa site na ọrụ ebube nke amara aja mgbaghara mmehie Ya, dị ka i na-echigharị nʻebe Ọ nọ jiri obi dị umeala na nke dị nchegharị.

Okwu abụọ ka a na-agbakwụnyekarị na ịdị nsọ nke ọmụmụ nwa: ndụ na nhọrọ. Ndụ bụ otu akụkụ kachasị oke ọnụ ahịa niime atụmatụ zuru oke nke Nna anyị, ma site nʻiwu Ọ nyere, anyị na-ahụ ndụ naanya ma na-echekwa ya; ma anyị na-ahọrọ ka ndụ ga niihu ozugbo a tụrụla ime ya. Anyị jikwa onyinye nke nhọro ezi omume kpọrọ ihe—wee na-enye aka na-agba nhọrọ niile nke ezi omume ume nke Chineke kwadoro na-ewete obi ụtọ dị ebighị ebi.

Mgbe otu nwoke na nwanyị na-agabiga ụdị oge iyi egwu nke a, wee na-ezute ụdị nhọrọ nke a dị oke mkpa, okwuọnụ anyị niile, aka anyị, na obi anyị—nke ime mmụọ, nke mmetụta uche, na nke okwu ego—nwere ike gọzie ha ịnwete mmetụta ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta ma, dịka Onyeisi Henry B. Eyring kwuru, kpọta nhazigharị doro anya nye anya nke ime mmụọ ha site na “ihe ha chere ha na-ahụ” ruo na “ihe ha aka ahụbeghi ugbua.”

Ozizi nke Ndụ Anụ Arụ

Onyeisi Dallin H. Oaks kwuru “Omume anyị banyere ite ime adabereghị na ọmụma ihe ekpughere maka mgbe ndụ a pụrụ ịnwụ awụ malitere. … Ọ dabere na ọmụma ihe anyị na … ụmụ nke mmụọ niile nke Chineke ga-abịarịrị n’ụwa nke a maka ebumnuuche dị ebube, na ejirimara nke onye ọbụla malitere ogologo oge gara aga tupu atụrụ ime ya ma ọ ga aga niihu ruo ebighi ebi niile na-abịa abịa.”

Okwu Onyenwe anyị banyere nwa ebu nʻafọ, nke enyere site nʻaka Otù Ndịisi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na Abụọ, agbanwebeghị ma ọlị ma ha bụkwa okwu nke ndị amụma naehi ụda kemgbe ụwa, nke na-enye nghọta doro anya nye ihe ahụ Onyenwe anyị chọro nʻaka anyị.

“Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a kwere na ịdị nsọ nke ndụ mmadụ. Yamere, Nzukọ nsọ megidere ite ime maka idaba adaba nke onwe ma ọbụ nke obodo, ma na-enye ndị otù ya ndụmọdụ ka ha ghara ịdaba na, tee ime, kwadoo, kwụọ ugwọ maka ya, ma ọbụ hazie maka ụdị ite ime ndịa ahụ.

“[Onyenwe anyị] kwere ka enwee ụfọdụ ngụpụ… mgbe:

  • “Atụụrụ ime niihi nkwaso iko nʻike ma ọ bụ ndina ugwa ma ọbụ

  • “Onye ọkachamara ahụike kpebiri na ndụ ma ọbụ ahụike nke onye nne nọ nʻezigbo ịze ndụ, ma ọbụ

  • Onye ọkachamara ahụike kpebiri na nwa ahụ ebu nʻafọ nwere nkwarụ dị oke njọ nke na-agaghị ekwe ka nwa ọhụrụ ahụ nyaa ndụ mgbe a mụrụ ya.”

Otù Ndịisi Mbụ gara niihu kwuo: “Ite ime bụ okwu kachasị sie ike nke ukwuu. [Ọbụna na ọnọdụ ndịa anaghị ahụkebe] ekwesịri ilebara ya anya naanị mgbe ndị ahụ ọ nọ nʻaka nataworo nkwenye site na ekpere” na ndụmọdụ nʻaka ndị ọzo.

Afọ iri atọ gara aga, ndị amụma nke Onyenwe anyị mara ọkwa nye ụwa. Ọ gụnyere okwu ndị a:

“Anyi … na-ama ọkwa na Chineke enyewo iwu na ike niile dị nsọ nke ịmụta ụmụ ka a ga-etinye nʻọrụ naani n’etiti nwoke na nwanyi, ejikọtara n’okpụrụ iwu dịka di na nwunye.

“Anyị na-ama ọkwa sị na ụzọ esi na-ekepụta ndụ bụ ihe akwadoro n’ịdị nsọ. Anyị na-ekwusike adịmansọ nke ndụ na banyere ịdị mkpa ya n’atụmatụ ebighi ebi nke Chineke.”

Izulite na ịchekwa ndụ nke a ka bụ nʻafọ, abụghị okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ iwu eziomume nke Onyenwe anyị kwadoro site n’aka ndị amụma Ya.

Na-ekwu okwu Na-ezoghị ọnụ

Okwu sitere nʻaka Onyeisi J. Reuben Clark Jr., onye jeburu ozi niime Otù Ndịisi Mbụ kọwara ndị ntorobịa anyị taa nʻụzọ magburu onwe ya: “Ndị ntorobịa nke Nzukọ nsọ nwere agụụ maka ihe niile nke Mmụọ; ọ na-anụ ha ọkụ n’obi ịmụta ozi ọma, ma ha chọrọ ya n’ụzọ kwụ chịm, na-agwarụghị agwarụ. Ha chọrọ ịmata banyere … nkwenye niile anyị; ha chọrọ ịnwete ama niile banyere eziokwu [ahụ]. Ha bụ … ndị na-achọ ịmata ihe, ndị na-achọ eziokwu.” Ka anyị jiri okwukwe na ọmịiko na-ekwu okwu mgbe na mgbe nye ndị ntorobịa anyị n’ebe ezinaụlọ anyị, ma na-ekwukọrịtara onwe anyị okwu n’ime ọgbakọ niile nke Otù Enyem Aka na kworum nke ndị okenye anyị banyere iwu nke ịdị ọcha mmekọrịta nke Onyenwe anyị, ịdị nsọ nke ndụ, na nlekọta nke ụmụ ebu n’afọ na ndị nne ha.

Otu nwanne nwanyị detere m maka otu nhumihe ọ nwere ọtụtụ afọ iri gara aga: “Dịka onye dị afọ 17 … , a chọpụtara m na a dị ime ma na-enweghi nkwado ọbụla site nʻaka enyi m nwoke. Ihere mere m ma a nọrọ m naanị m [mana a] echeghi m echiche ite ime. … E [nwere] m ezinaụlọ m dị ihunaanya na bishọp m, onye m zutere mgbe na mgbe maka odudu. … Elekwasịrị m anya na Chineke. A mụrụ m akwụkwọ nsọ … ma kpee ekpere [ma] chọta ume site na Onye Nzọpụta na usoro nke nchegharị. … A natara m azịza [nye ekpere m niile] nke m na-agaghị agọnarị ma ọlị. … Ọ bụụrụ ihe obi mgbawa, mana a maara m na-aga m edebe nwa m nwanyị maka nkuchi. … E kpere m ekpere maka ume [ma] nwete mmetụta ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta nʻụzọ doro anya site na nchegharị, A mara m na Chineke … na-aza ekpere ma na-agba anyị ume.”

Otu di na nwunye dị ịhụnaanya kuchiri nwa ọhụrụ nke nwanyị a ma kuziere ya ozi ọma. Ọ luwo di ugbua ma nwee ọmarịcha ezinaụlọ nke onwe ya.

Mgbe ụfọdụ, ihe siri ike nke ukwuu na ejighị nʻaka na-egbu mgbu nwere ike iso nchekwa nke ndụ.

Na nso nso a otu di na nwunye ndị Kathy na mụ hụrụ naanya deterem banyere otu nwa ọhụrụ pụrụiche ha na-atụanya ya.

Nna ya dere: “[Mgbe nwunye m] dị ime izuụka 10, anyị chọpụtara na nwa ọhụrụ anyị ahụ nke ọrụ ebube nwere ọrịa agbụrụ nke trisomy 21, a maara nke ọma dị ka Down syndrome. Anyị nwetere ncham ọku … site nʻaka ndị ahụike ịtule ite ime ahụ. Ka izuụka ole nʻole gasịrị anyị chọpụtara na … nwa anyị ahụ ebu nʻafọ … ga-enwe mkpa ọtụtụ awam obi nʻafọ mbụ nke ndụ ya. Ka ihe ndịa na-eme, anyị kpesiri ekpere ike maka enyemaka nke igwe, … anyị nwetere mmetụta nke Mmụọ ahụ na-enye anyị nkasị obi. Anyị natara mkpughe na nghọta na nwa anyị nwanyị bụ nwa nwere ugwu nke Nna nke Eluigwe ma ọ nwere mmasị dị ukwuu isonye niime ezinaụlọ anyị ma bịa nʻụwa.”

Nne nke nwa ọhụrụ ahụ dere: “Akpata oyi wuzuru [anyị] ahụ, nwee mgbagwoju anya, ma nʻezie obi gbarụrụ anyị nihi ozi ahụ. … Mgbe m dị ime izuụka 14, anyị chọpụtara na nwa ọhụrụ anyị nwere ọtụtụ ọrịa eburu pụta ụwa nke obi, nke nwere ike ịmecha gbuo ya. Anyị hụrụ ọtụtụ ndị dọkịnta na ndị ọkachamara bido mgbe ịme ahụ dị ịzuụka 10 ruo nke 18. … Nʻoge nzute anyị nke ọbụla, a jụrụ anyị ma anyị chọrọ ị ga niihu buo afọ ime ahụ ka ọbụ ma anyị ọ chọrọ ite ya. … Onye Nzọpụta gwọrọ obi m ma nye m mmetụta nke udo na obi an̄ụrị maka nwa ọhụrụ anyị nke nwanyị. … [Nna nke Eluigwe] egosiwo m mgbe na mgbe na Ọ nwere atụmatụ zuru oke maka mụ [ma] atụkwasịrị m Ya obi.”

Ha jiri obi ụtọ nabata nwa ọhụrụ nke nwanyị naanị otu izuụka gara aga taa. Ọ bụ nke ha ma ha bụ nke ya ruo mgbe ebighị ebi.

Okwukwe na-adịghị atu egwu na obisike dị ịrịba ama bụ ihe e ji mara ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.

Ọmụmatụ dị ịrịba ama nke Okwukwe

N’ime afọ ndị gafeworonụ, enwewo m ihe ùgwù nke izute ndị nwoke na ndị nwanyị ndị ji obi umeala chọọ ịlọghachi n’ụzọ ọgbụgba ndụ na n’ọkwa nchụaja na ngọzi niile nke tempụl ha, ọtụtụ afọ mgbe ha tufuru ịbụ ndị otù ha.

N’otu oge, ekwesịrị m ị ga gbaa otu nwoke ajụjụ ọnụ n’aha Otù Ndịisi nke Mbụ maka mweghachi nke ọkwa nchụaja na ngọzi niile nke tempụl ya.

Mgbe ọ lụsịrị alụmdi na nwunye n’ime tempụl dị nsọ, na mgbe ọ mụsịrị ụmụ atọ dị ịtụ naanya, nwoke ahụ ekwesịghị ntụkwasị obi nye nwunye ya na ọgbụgba ndụ ya dị nsọ. Otu nwanyị na-emebeghi ọlụlụ bịara dị ime ma chọọ ịte ime ahụ.

Nwunye ọma nwoke ahụ rịọrọ nwanyị ahụ ka ọ mụọ nwa ahụ ma kwe nkwa na ọ ga-azulite nwa ahụ ozugbo a mụrụ ya nʻetiti ụmụ ndị nke ya.

Nwanyị ahụ na-emebeghi ọlụlụ kwere na ọ gaghị ete ime ahụ.

O ruwo afọ 10 kemgbe ahụ. Nwanne nwanyị ahụ dị umeala nọdụrụ ọdụ nihu m hụrụ nwa nwoke ahụ naanya dị ka nke ya ma gwa m maka mbọ niile nke di ya na-agba iji mee nkwụghachi ma iji hụ ezinaụlo ya naanya ma lekọta ya na ha. Nna ahụ bere akwa dịka nwunye ya na-ekwu okwu.

Kedụ otu nwanyị a nwere ugwu nke Chineke ga-esi kpọrọ nwa ọzọ dịka nke ya, onye ga na-echetara ya kwa ụbọchị maka ịgba na-ama nke di ya? Kedụ otu nke a si mee? Niihi na ọ chọtara ume site na Jizọs Kraịst ma ọ kwenyere na ịdị nsọ nke ndụ, na ndụ dị nsọ. Ọ maara na nwa ahụ a ka bụ nʻafọ bụ nwa nke Chineke, aka ya dị ọcha ma ọ nweghi ntụpọ.

Nchịkọta foto niile nke nwa ọhụrụ.

Ezi ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, ọ bụ nnukwu nchegbu na o zuru ụwa niile, na ịhụnaanya nʻebe ụmụaka ebu nʻafọ nọ na-ebelata ebelata. Chineke hụrụ ndụ naanya. Ọ bụ ọrụ Ya na ebube nke Ya iweta anwụghị anwụ na ndụ ebighi ebi nye ụmụ Ya. Dika ndị na-eso ụzọ nke Jịzọs Karịst, anyị hụrụ ndụ naanya. “Site otua ka ụmụ mmadụ niile si amata na unu bụ ndi na-eso ụzọ m, ọbụrụ na unu nwee ịhụnaanya onye ọbụla na ibe ya.” Ka anyị kesaa ịhụnaanya anyị ọbụnadị karịa nye ndị ahụ chọsịrị anyị ike. Ana m ekwupụta ịhụnaanya m maka unu na ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe maka ụmụ Ya na-abịa nʻụwa. Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Jọn 13:35; lee kwa Matiu 22:36–40.

  2. Nzikọrịta-ozi nke onwe, Feb. 6, 2025; ojiji ya nwere ikikere.

  3. Nzikọrịta-ozi nke onwe, Feb. 6, 2025; ojiji ya nwere ikikere.

  4. Onyeisi Russell M. Nelson, “Ije ozi nlekọta site n’Ike na Ikikere nke Chineke,” Liahona, Mee 2018, 69.

  5. Otu ọmụmatụ nke nwanyị eziomume na France; lee Lee Neil L. Andersen, Onyinye Sinachi Ahụ nke Mgbaghara (2019), 154–56.

  6. Lee Neil L. Andersen, Onyinye Sinachi nke Mgbaghara,, 219; lee kwa Neil L. Andersen, Jizọs Bụ Kraịst Ahụ (2023), 5.

  7. Lee nkwupụta iwu kwadoro gbasara ite ime: “Ite ime,” newsroom.ChurchofJesusChrist.org. Akwụkwọ Ntụziaka Izugbe kwuru, “Mmadụ nwere ike ịchegharị ma nata mgbaghara maka njó nke ite ime” (Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazu a, 38.6.1, Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma). Onyeisi Ezra Taft Benson kwuru: “Nwute nke si na chi bụ onyinye nke Mmụọ Ọ bụ nghọta miri emi na omume anyị akpasuwo Nna anyị na Chineke anyị iwe. Ọ bụ nghọta dị nkọ na nke miri emi na nihi omume anyị mere ka Onye Nzọpụta, Onye na-amaghị mmehie, ọbụna nke kachasị ukwuu, na-atachi obi n’ahụhụ na ahụhụ. Mmehie anyị mere Ya agba ọbara site n’ọghere ọbụla. Nke a bụ nnọọ oke nhụjuanya nke uche na nke ime mmụọ bụ ihe akwụkwọ Nsọ na-akpọ dị ka inwe ‘obi tiwara etiwa na mmụọ niile nke nchegharị’ [lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37 Mmụọ dị otú ahụ bụ ihe dị nnọọ mkpa maka ezi nchegharị” (Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Ezra Taft Benson [2014], 83; lee kwa 2 Ndị Kọrịnt 7:10; 3 Nefi 9:20; 18:32).

  8. “Onye-nwe wee sị Inọk: Lee ụmụ nne gị ndị a, ha bụ ọrụ-aka nke aka m nile, na enyere ha ọmụma ihe ha, n’ụbọchị ahụ m keworo ha; na n’ime Ubi Iden ahụ, ka m nyeworo mmadụ ohere nhọrọ ya;

    “Na nye ụmụnne gị ka m sịworo, na nyewokwa iwu-nsọ, na ha ga-ahụrịta onye ọbụla n’ibe ya n’anya, na na ha kwesịrị ịhọrọ m, bụ Nna ha” (Mozis 7:32–33).

  9. Henry B. Eyring, Ịbịarute Chineke Nsọ Karịa (1997), 143.

  10. Dallin H. Oaks, “Atụmatụ Ukwuu nke An̄ụrị,” Ensign, Nov. 1993, 74. Onyeisi Nelson ekwuwo: “Ọ bụghị ajụjụ maka mgbe ‘ndụ nwere nzube’ malitere ma ọ bụ mgbe mmụọ ahụ ‘kpaliri’ anụ arụ ahụ. Na sayensị nke biology, a maara na ndụ na-amalite mgbe mkpụrụ ndụ germ abụọ jikọtara ọnụ ghọọ otu cell, na-ejikọta chromosomes iri abụọ na atọ sitere na nna na nne. … Mmalite nke ndụ abụghị ihe a na-arụ ụka, kama ọ bụ eziokwu nke sayensị” (“Ịnwe Nsọpụrụ maka Ndụ,” Ensign, Mee 1985, 13).

  11. Onyeisi John Taylor kwuru nʻafọ 1879, “Anyị ga-emerịrị [mkpesa megide] igbu nwa ebu nʻafọ, igbu ụmụaka, na omume ndị ọzọ jọgburu onwe ya … ma ọbụ site na-ime iwu kwadoro ya, site na mkpebi ikpe nke ndị ọkaikpe, ma ọ bụ mgbakwunye ọ bụla ọzọ nke mmepeanya.” (“Discourse,” Deseret NewsDec. 31, 1879, 755; mere ka nsụpịa niile dị ọhụrụ)

  12. Nkwupụta iwu kwadoro gbasara ite ime: “Ite ime,” newsroom.ChurchofJesusChrist.org.

  13. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa amara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  14. J. Reuben Clark Jr., Ụzọ Amapụtaworo nye Nzukọ nsọ maka Agụm akwụkwọ, rev. ed (1994; okwu nye ndị nkụzi okpukperechi nke Church Educational System, Aug. 8, 1938), 3, Ọba Akwụkwọ Ozi ọma.

  15. Lee Isiokwu niile na Ajụjụ niile, ““Ite ime,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  16. Nzikọrịta-ozi nke onwe, Feb. 13, 2025; ojiji ya nwere ikikere.

  17. Ihe ọmụmatụ ọzọ banyere ngọzi nke nkuchi nwa bụ akụkọ Sherilyn Stinson na nwa ya nwanyị, Allison, tinyere nne mụrụ Allison, Jill Morgensen. (lee Mary Richards, “Navigating the Journey of Adoption Reunification,” Church News, Nov. 18, 2024, thechurchnews.com).

  18. Site n’enyemaka nke Onyenwe anyị, ya na ogweaka anyị esetịpụtara, ọtụtụ ka a ga-agọzi ịji chọta ụzọ ha. Lee Amanda Becker, “Ịchọta Olileanya Dị ka Nne Na-alụbeghị di ma Na-atụ Anya Ọmụmụ,” Liahona, Julaị 2022; “Mkpebi obi Ahụ banyere Nkuchi,” New Era, Mar. 2006, 28–33.

  19. Nzikọrịta-ozi nke onwe, Feb. 17, 2025; ojiji ya nwere ikikere.

  20. Nhụmihe nke onwe; lee Neil L. Andersen, Onyinye Sinachi nke Mgbaghara, 246–47.

  21. Lee Mozis 1:39

  22. Jọn 13:35; lee kwa Matiu 22:36–40.

  23. Akụrụngwa ndị ọzọ nwere ike ịnye aka: Isiokwu niile nke Ozi ọma, “Ime Atụtara ma Alụghị alụ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; “Ndị nne na nna Na-atụanaya Ọmụmụ,” Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 38.6.19; Akụrụngwa niile nke Ndụmọdụ, “Ndị nne na nna Na-atụanaya Ọmụmụ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.