Repọọt nke ndị Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ, 2024
Nye Otù Ndịisi Mbụ nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazu a
Ezi ụmụnne ndị Nwoke: Dị ka mkpughe siri dị, dị ka e dere niime nkeji nke 120 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, Kansụl maka Imefu Otu ụzọ n’ụzọ iri niile—nke ndị mejupụtara ya bụ Otù Ndịisi Mbụ, Kworum nke Ndị Ozi Iri Na Abụọ, na nke Ndị Bishọp Nduzi—bụ ndị na-enye ikike imefu ego Nzukọ nsọ niile. Ngalaba Nzụkọ nsọ niile na-emefu ego dị ka otu atụmatụ akwadoro maka mkpata na mmefu ego siri dị, dịkakwa otu iwu na usoro niile akwadoro siri dị.
Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ, nke ndị nọ niime ya bụ ndị ọkammụta ihe gbasara ego, ma ha enweghi ngalaba na akụrụngwa ndị ọzọ nke Nzukọ nsọ nke ha nọ na okpuru ya, nwere oke na ọrụ ime nnyocha maka ido onye ọbụla anya gbasara ụtụ ego niile e nwetara, mmefu niile e mere, nakwa nchekwa akụ na ụba niile nke Nzukọ nsọ.
N’ihi nnyocha niile e mere, Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ kwekọtara na, niime ihe niile siri dị, ụtụ niile a natara, mmefu niile e mere, na akụ na ụba niile nke Nzụkọ nsọ nke afọ 2024 ka edekọtaworo ma mezuo dị ka otu atụmatụ nke Nzukọ nsọ kwadoro maka mkpata na mmefu ego siri dị, dị ka kwa otu iwu na usoro niile akwadoro siri dị. Nzukọ nsọ ahụ na-esoro nkuzi niile nke ọ na-akuziri ndị otù ya maka ibi ndụ dị ka otu ego akpa ha ha, izere iji ụgwọ, na ịchekwa ego maka oge ọ ga-adị mkpa.
N’obi nsọpụrụ ka enyefere ndekọihe nke a,
Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ
Jared B. Larson
Onyeisi Nhazi