Afọ ọma—ihe Iriba ama nke Ezigbo Ịbụ Onye na-eso ụzọ
Ezigbo njedebe nke ịbụ onye na-eso ụzọ bụ nnọọ ịdịrịzi ka Jizọs Kraịst dị.
Onyeisi Russell M. Nelson na nso nso a kpọkuru anyị “ime ịbụ onye na-eso ụzọ anyị mkpa kachasị ibe ya.” Ọkpụkpọ oku ahụ dị ike akpalitewo m ịtụgharị uche ime ime banyere mụ onwe m ịbụ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst.
Ịbụ onye na-eso ụzọ Bụ Ihe Akpachaara anya
Onye na-eso ụzọ bụ onye nsiso ma ọ bụ nwa akwụkwọ nke onye ọzọ. Ndị na-eso ụzọ bụ ndị na-amụ ọrụ ndị na-etinye ndụ ha ịghọ dị ka onye nkuzi ha. Otu ọ dị, ịbụ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst na-egosikwu karịa ikwere nkuzi Ya niile na ozizi Ya. Ọbụna o gosikwuru karịa ịnakwere ịdị nsọ Ya na ịnabata Ya dị ka Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị, ka oke mkpa nke ahụ dị.
Onyeisi Dallin H. Oaks kọwara: “Ị na-esoro Kraịst abụghị omume nkịtị ma ọ bụ nke na-eme kwa mgbe kwa mgbe. Ọ bụ mkpebi esepụghị aka na ụzọ nke ndụ nke kwesịrị idu anyị mgbe niile ma nʻebe niile.” Ịbụ onye na-eso ụzọ bụ njem akpachaara anya nke anyị na-eme iji ghọọ ndị enwogharịrị site nʻaja mgbaghara mmehie nke Onyenwe anyị na ike Ya na-enye ike. Ezigbo ebe njedebe nke ịbụ onye na-eso ụzọ bụ naanị ịghọ dị ka Kraịst bụ—ọbụna ruo nʻogo ebe anyị na-anata “oyiyi ya na mbara ihu [anyị].”
Ịbụ onye na-eso ụzọ nke Onyenwe anyị, anyị ahaghị ịkpachara anya n̄ọmie echiche Ya niile na omume Ya niile ụbọchị niile—ịma atụ, nrube isi, umeala, na ndidi Ya. Dị ka anyị na-eji nwayọọ etinye mmaramagwa ndị a niime njirimara niile nke onwe anyị, anyị na-aghọ “ndị nketa nke ọdịdị [Ya] dị nsọ.” Nn̄ọmi nke agwa nke Onye Nzọpụta nke a dị nʻisi ife Ya ofufe. Dị ka Onyeisi Nelson kuziri, “Ọjịja mma anyị nke Jizọs ka a kacha egosipụta site na anyị in̄ọmi Jizọs.”
Iriba ama nke Ezigbo Ịbụ Onye na-eso ụzọ
Nʻọtụtụ njirimara niile dị nsọ nke Jizọs Kraịst ndị anyị kwesịrị ịn̄ọmi, otu guzosiri ike ma kpuchigidere ndị ọzọ niile. Njirimara ahụ bụ ịhụnaanya Ya na-enweghị ntụpọ, ma ọ bụ afọ ọma. Ma onye amụma Mọmọn ma Onye Ozi Pọl na-echetere anyị na ewezuga afọ ọma, “enweghị ihe [anyị] bụ.” Ma ọ bụ, dị ka ekpughere nye Onye amụma Joseph Smith, ewezuga “afọ ọma, [anyị] enweghị ike eme ihe ọbụla.”
Onye Nzọpụta Nonwe Ya chọpụtara ịhụnaanya dị ka ihe akara ma ọ bụ iriba ama nke a ga-esi amata ezi ndị na-eso ụzọ Ya mgbe Ọ mara ọkwa:
“Iwu nsọ ọhụụ ka M na-enye unu, Ka unu hụkọritara onwe unu naanya; dị ka m sịrị hụ unu naanya, ka unu hụrịtakwa onwe unu naanya.
“Site otua ka mmadụ niile si amata na unu bụ ndị na eso ụzọ m, ọbụrụ na unu nwee ịhụnaanya onye ọbụla nime unu.”
Afọ ọma bụ echiche bara ụba nke nwere ike ịra ahụ nkọwa mana bụ nke na-adị mfe nghọta site nʻaka ndị niile ọ metụtara. Kwusaa Ozi ọma M na-akuzi na “afọ ọma, dị ka okwukwe, na-eduba nʻime ihe.” Nʻezie, afọ ọma ka enwere ike ịkọwa dị ka “ịhụnaanya nọ nʻọrụ.” Nkọwa nke a na-ewete nghọta dị ukwuu niime nchịkọta nkọwa nke ndụ nke Onye Nzọpụta—Ọ “gara niihu na-eme ihe dị mma.”
Dị ka ndị nsiso nke Jizọs Kraịst, anyị kwesịrị ịchọ ịn̄ọmi ụzọ Nna anyị Ukwu si gosipụta ịhụnaanya Ya na-enweghị ntụpọ maka ndị ọzọ. Na-agbanyeghị na Onye Nzọpụta na-egosipụta afọ ọma nʻụzọ dị ọtụtụ, ọ ga-amasị m ịkpọlata uche nye nsoro atọ kpọm kwem nke afọ ọma Ya ndị a na-ahụ nke ọma nʻetiti ezi ndị na-eso ụzọ Ya.
Afọ ọma Bụ Igosi Ọmịiko
Nke mbụ, Onye Nzọpụta gosiri afọ ọma site nʻinwe ọmịiko. Nʻoge ije ozi Ya nʻetiti Ndị Nifaị, dị ka edekọrọ niime Akwụkwọ nke Mọmọn, Onyenwe anyị kpọkuru ndị ahụ ịlọghachi ebe obibi ma tụgharịa uche nʻihe niile Ọ kuziworo na kwa ịkwado maka nlọghachi Ya ụbọchị nke na-esote. Ndekọihe ahụ mesiri kwuo:
“Anya mmiri juru ha anya, ma ha elekwasị anya na ya dị ka ha ga-arịọ ya ịnọgidetukwuru ha.
“Ma ọ sịrị ha: Lee, afọ m jupụtara n’ọmịiko n’ebe unu nọ.”
Ọmịiko bụ akụkụ nke afọ ọma na-achọ ibelata ntaram ahụhụ. Nʻuju ọmịiko, Onyenwe anyị gwọrọ ndị ọrịa na ndị nwere nsọgbu nʻetiti ndị ahụ. Emesịa, Ọ gọziri ụmụ ha ebe ndị mmụọ ozi gbadatara site nʻeluigwe ma gbaa ha gburugburu. O rụrụ ọrụ ndị a dị nro, dị ịhụnaanya, na ọtụtụ ndị ọzọ, niihi na Ọ “juputara nʻọmịiko.”
Mgbe m naara eje ozi dị ka onye mgbasa ozi ọma nta niime South America, mụ onwe m kwa ritere uru site nʻọmịiko nke ezigbo enyi. Otu mgbede mgbe mụ na onye nsiso m na-anya ụgbọala gawa nʻebe obibi nke onyeisi mishọn anyị, otu nwaokoroọbịa nta nọ n’igwe na ntabi anya tụgharịrị niihu ụgbọala. O mere oke ọsọ ọsọ nke mere na m enweghị ike izere nkukọta ahụ. Nke kacha ọjọọ, nwaokoroọbịa nke a nwụrụ site na nkụkọta ahụ. Obi gbawara m maka nfunari nke ndụ ya. Nʻegwu ma na-ama jijiji dị ka nsiridị egwu ahụ nke ihe ka mere doro m anya kpam kpam, a tụbara m niime ụlọ mkpọrọ. Enwebeghị mgbe m tụrụ oke ụjọ ma owu amaa m otu a. Obi nkorupu na ụjọ juputara m na aga atụkpu m niime ụlọ mkpọrọ oge ndụ m fọdụrụ.
Onye mgbasa ozi ọma ibe m, Okenye Brian Kochevar, matara maka ihe mberede ahụ ma juputa nʻọmịiko. Ọ bịara nʻụlọ mkpọrọ ahụ ma rịọ ndị ụlọ ọrụ ikwe ka ọ nọnyere m niime ụlọ mkpọrọ ka m wee hapụ ịnọrọ naanị m. Nʻụzọ dị ebube, ha kwetere. Ruo taa, e nwere obi ekele dị omimi maka omume ịhụnaanya yiri Kraịst nke onye na-eso ụzọ nke a, nke kụjụrụ obi m, kasie m obi, ma gbaa m ume noge nsogbu kachasị niime ndụ m. Ọmịiko afọ ọma ya bụ ihe iriba ama gosipụtara ịbụ onye na-eso ụzọ ya. Dị ka Onyeisi Nelson hụtaworo, “Otu niime ụzọ ndị kachasị mfe iji chọpụta ezigbo onye nsiso nke Jizọs Kraịst bụ otu onye ahụ si na-eji ọmịiko emeso ndị ọzọ omume.”
Afọ ọma Bụ Ije ozi nlekọta nye Mkpa ndị Adịghị ekwu ekwu
Ọmụmaatụ ọzọ nke otu Onye Nzọpụta si egosipụta ịhụnaanya Ya bụ site na mmata nke na nlekọta Ya nye mkpa ndị ọzọ adịghị ekwupụta ekwupụta. Nye nwoke ahụ onye daworo ngwọrọ ruo afọ 38 na-enweghị onye ga-enyere ya aka, Onyenwe anyị mere ya ezuo oke ma gbaa ya ume ibi ndụ ezi omume. Nye nwanyị ahụ ejidere na akwam iko, O nyere olile anya na nkasi obi karịa amamiikpe. Maka nwoke ahụ nwere ahụ mkpọnwụ onye ebudatara site nʻelu ụlọ, Onyenwe anyị nyere mgbaghara mmehie, ọbụghị naanị ọgwụgwọ nke anụ ahụ.
Mgbe akpọrọ m oku ije ozi dị ka bishọp, ụmụ isii nta anyị mere nzukọ oriri nsọ abụrụ ihe aka mgba maka nwunye m, Cristin, onye bịara na-ejikwata ha naanị ya ebe m nọdụrụ nʻelu ebe ahụ. Dị ka i nwere ike chee, ụmụ anyị naara adịkarị enye nsogbu. Ịmata ọnọdụ ya, ndị otu ngalaba ukwu anyị abụọ, John na Debbie Benich, malitere ịnọdụ nʻakụkụ ya Sọnde ọbụla inye aka. Omume obi ọma ha garaniihu ọtụtụ afọ, ma ha ghọrọ nne na nna ukwu nnọchianya nye ezi na ụlọ anyị. Dị ka Onyenwe anyị, ndị na-eso ụzọ ndị a matara mkpa ekwughị ekwu ma mee ihe nʻịhụnaanya—iriba ama pụtara ìhè nke ịbụ onye na-eso ụzọ ha.
Afọ ọma Bụ Inyere Ndị Ọzọ aka Nʻogologo Ụzọ Ọgbụgba ndụ
Nke ikpeazụ, ịhụnaanya zuru oke nke Onye Nzọpụta lekwasịrị anya nʻinye ụmụ Chineke niile ike iji mejupụta ike mmetụta anyị dị nsọ ka anyị wee “keta nzọpụta ya, na ike nke mgbapụta ya.” Dị ka anyị na-aghọ karịa ka Nna Ukwu anyị, ọchịchọ anyị inyere ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwanyị aka nʻogologo ụzọ ọgbụgba ndụ ga-abawanye nʻonwe ya.
Iji maa atụ, anyị nwere ike bulie elu ma mere enyi ndị ọ dịịrị ka emejọrọ ma ọ bụ echefuru ha, nyere ndị ahụ dị ọhụrụ niime ọgbakọ aka nwee mmetụta nnabata, ma ọ bụ kpọkuo ndị enyi isoro anyị fee ofufe na nzukọ oriri nsọ—elemanya na Ista nke a na-abịa. E nwere imerime ụzọ eji agba ume ma nyere ndị ọzọ aka na uto ha ọ bụrụ ma anyị mara amara ma site nʻekpere chọọ enyem aka nke eluigwe inwe anya eji ahụ ụzọ na obi eji enwe mmetụta otu Jizọs Kraịst si ahụ ma nwee mmetụta maka ha.
Inyere ndị ọzọ aka nʻogologo ụzọ ọgbụgba ndụ ha nwere ike yie omume ije ozi na-ekwekọghị ekwekọ. Dị ka ọmụmaatụ, nʻoge ọrụ m ugbua na Filipaị, a matara m maka ezi na ụlọ Agamata. E mere ha baptizim na 2023, ma emesịa ha ejiri ọnụnụ ọkụ nʻobi họpụta ụbọchị maka nrachi dị ka ezi na ụlọ niime Tempụl Urdaneta Philippines dị nso. Kosiladị, tupu nnọọ ụbọchị nhọpụta nke ezi na ụlọ ha, typhoon dị iche iche kụrụ mpaghara obodo ahụ. Nwanne nwoke Agamata, onye ọrụ ugbo osikapa, enweghị ike akọ ubi ya nʻoge ebili mmiri ọjọọ ahụ niile. Mgbe ebili mmiri nʻikpeazụ gafechara, ọ dịịrị mkpa na ya kọrọ osikapa ahụ mgbe ala ka dị mmiri mmiri—ọnọdụ kacha mma maka ịkọ ihe. Na mwute, njem tempụl ahụ ka aga eyigharịrị.
Ndị na-eso ụzọ abụọ, Okenye na Nwanne nwanyị Cauilan, ha na ndị mgbasa ozi ọma ije ozi nta atọ, nụrụ maka ndọlị nke ezi na ụlọ Agamata ma kwere inye aka agbanyeghị enweghị ihe ha maara banyere ịkọ ugbo. Na-arụ ọrụ n’okpuru anyanwụ ọjọọ ahụ, ha nyere aka kọọ mkpụrụ niile ahụ, na-enye ezi na ụlọ Agamata ohere ruzuo ọrụ ha ma gaa nrachi tempụl dị ka ahọpụtararịị Okenye Cauilan chọpụtara na “mbara ihu [ezi na ụlọ Agamata] na-egbuke egbuke dị ka anyị hụrụ ha nʻuwe ọcha niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Ọn̄ụ anyị nwetere ije ozi nlekọta nye otu onye ahụ bụ ọn̄ụ gafere atụ!”
Ezi na ụlọ Agamata ugbua na-an̄ụrị na ngọzi niile bara ụba nke irachi dị ka ezi na ụlọ ebighị ebi niihi na ndị na-eso ụzọ ibe ha ole ma ole ndị juputara na afọ ọma—ihe iriba ama nke ịbụ onye na-eso ụzọ ha—kpebiri inyere ụmụnne ha ndị nwoke na ndị nwanyị aka gaaniihu nʻogologo ụzọ ọgbụgba ndụ ha.
Ụmụnne nwoke na ndị nwanyị, ịbụ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst bụ naanị ụzọ iji nwete obi ụtọ na-adịgide. Ọ bụ ụzọ juputara na omume niile nke ịhụnaanya akpachapụrụ anya na nke nwere ebumnuuche nʻebe ndị ọzọ nọ Ebe ụzọ nke ịbụ onye na-eso ụzọ nwere ike na-ara ahụ ma na-ama aka, ma ebe mgbe ụfọdụ anyị nwere ike na-adọga ma metazughị ihe niile, anyị nwere ike nwee nkasị obi na Chineke maara ihe niile banyere anyị ma na-enwe oke agụrụ inyere anyị aka oge ọbụla anyị nwara. Aịzaya na-echetere anyị na “Chineke ga-ejide aka [anyị], na-asị … , Atụla egwu; aga M enyere gị aka.”
Iburu nʻobi mmasi obi ike nke a sitere nʻaka Nna anyị bi N’eluigwe, ana m ekpesi ekpere ike na anyị ga-enwe ike soro ọkpụkpọ oku nke Onyeisi Nelson ime ịbụ onye na-eso ụzọ anyị isi ihe mbunobi. Ka anyị “kpeere Nna jiri ume niile nke obi” “ịjuputa nʻịhụnaanya nke a, nke o nyeworo nʻisi ndị niile bụ ezi ndị nsiso nke Ọkpara ya, Jizọs Kraịst; … nke ọ ga-abụ mgbe ọ ga-apụta ìhè anyị ga-adị ka ya” niihi na anyị buru ihe iriba ama nke ezi ịbụ onye na-eso ụzọ, nke bụ “afọ ọma … ịhụnaanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ.”
Ana m agba ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị, Onye Mgbapụta, Onye Ọmụmaatụ, na Enyi anyị dị ndụ, dị ebube. Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.