Dị ka Obere Nwa
A na m agba ama na ụmụ amụrụ ọhụrụ na ụmụaka na ndị ntorobịa bụ onyonyo niile nke alaeze nke Chineke nke na-amụba nʻụwa n’ịdị ike na ịma mma ya niile.
Jizọs malitere afọ ikpeazu nke ndụ anụ ahụ Ya site na-ịmụbawanye ọzụzụ nke Ndịozi Ya. Ọ bụrụ na ozi nke Ya na Nzukọ nsọ Ya gaara anyandụ mgbe Ọ nọghị ya, ekwesịrị ka etinyekwuo ihe buru ibu niime obi niile nke ụmụnwoke nkịtị ahụ dị 12, ndị maara Ya naanị ọnwa 24.
Otu ụbọchị Jizọs hụru otu arụmụka nʻetiti Ndị Iri na Abụọ ahụ ma emesịa jụọ, ”Kedụ ihe ọ bụ unu ji na-eseokwu nʻetiti unu?” Nihi nke a menyere ha ihere, “ha kpuchiri ọnụ ha,” ka ndekọihe ahụ kwuru. Mana onye nkuzi nke a kachasị ibe ya matara echiche niile nke obi ha ma nwee mmetụta mpako nkeonwe nʻebe ahụ. Ya mere Ọ “wee kpọọ otu nwatakiri bịakwute ya, …
“Ma na-asị, N’ezie asịm unu, Ọ bụrụ na unu echegharịghị, ma bịa dịka obere ụmụntakiri, ụnụ agaghị aba n’alaeze nke eluigwe.
“Onye ọbụla nke ga-eweda onwe ya dịka nwatakịrị a, onye ahụ dịkarịrị ukwuu n’alaeze eluigwe.”
Ekwesịrị ịhụba ama na ọbụna tupu amụọ Kraịst, ozi ije ọma nke Eze Benjamin gụnyere okwu nke a dị ukwuu banyere obi umeala nke nwata. Ọ na-ekwu sị: “Mmadụ nke ụdị okike bụ onye iro Chineke ma ọ ga-abụ, ruo mgbe niile na mgbe niile, ma ọbụghị ma … [ọ ghọrọ] onye nsọ site n’aja mgbaghara mmehie nke Kraịst Onyenwe, ma dịrị dịka nwata, na-adanye, … dị nwayọ, … juputa nʻịhụ nʻanya, … ọbụna dịka nwatakịrị [na-esi akpasa agwa] nye nna ya.”
Nʻeziokwu, enwere ụfọdụ agwa ụmụaka ndị anyị anaghị akwado. Afọ iri abụọ na ise gara aga, nwa nwam nke nwoke dị afọ atọ mgbe ahụ tara arụ nʻogweaka nwanne ya nwanyị dị afọ ise. Di nwa m nwanyị, onye na-elekọta ụmụaka ahụ nʻabalị ahụ kuziri nwa ya nwanyị nkuzi niile banyere mgbaghara o nwere ike ịcheta, wee na-ekwubi na nwanne ya nwoke nke ntakịri ahụ ma eleghị anya a maghị ihe ịta arụ nʻogweaka dị ka ya. Okwu onye nna ahụ nke a na-echeghị eche ọfụma rụrụ ọrụ ruo ihe ruru otu nkeji, ikekwe otu nkeji na ọkara, tutu ruo mgbe anụrụ akwa si na imeụlọ ebe nwanwa m nke nwanyị jiri olu dị jụụ tie mkpu sị, “Ọ mataziwo ugbua.”
Ya mere kedụ ihe anyị kwesịrị ịhụ niime omume ọma nke ndụ ụmụntakịrị? Kedụ ihe ọ bụ mere Kraịst Nʻonwe Ya ji bee anya mmiri niime ihe omume ahụ bụ nke kachasị dị nro nime Akwụkwọ nke Mọmọn niile? Kedụ ihe Jizọs na-akuzi mgbe Ọ kpọdatara ọkụ nke eluigwe na ndị mmụọ ozi nchekwa ịgba ụmụntakịrị ndị ahụ gburugburu, wee nye ndị okenye iwu ka ha “lee ụmụ ntakịrị [ha]”?
Anyị amaghị ihe kpaliri ihe niile ahụ, mana a ga m eche na ọ nwere otu o siri metụta ịdị ọcha na aka ịdịọcha ha, obi umeala nke dị ha niime, na ihe ọ nwere ike ịweta na ndụ ha ọbụrụ ma anyị jide ya.
Gịnị kpatara otuonye jiri kọwaa ụbọchị niile nke obi nkoropụ anyị dịka “ihe efu nke ihe efu niile”? Kedụ otu “echiche nke efu nile na mpako nke ụmụ nke mmadụ” jiri bụrụ okwu niile ejirimara nke nnukwu na obosara ụlọ ahụ nke nwụrụ anwụ niime mmụọ kpam kpam nʻọhụ nke Lehi? Ma Ndị Zoram, otù ahụ ndị kpere ekpere nke na-achọ naanị maka ọdịmma nke onwe? Maka ha Alma kwuru, “O Chineke, ha [na-ekpere] gị n’ọnụ ha niile, ebe ha na-afuli elu … site n’ihe efu nile nke ụwa.”
N’ụzọ dị iche, enwere ihe kacha dị ụtọ, kacha dị ọcha, ma ọbụ kacha dị umeala karịa ekpere nwata? Ọ dị nnọọ ka eluigwe ọ nọ niime ịmeụlọ ahụ. Chineke na Kraịst dị ezigbote irè, mana maka ndị ọzọ mgbe emesịrị, nhụmihe ahụ nwere ike bụrụ ha ihe elu elu.
Dịka Okenye Richard L. Evans n̄omiri ihe dị ka afọ 60 gara aga: “Ọtụtụ niime anyị na-ekwu nʻanyị bụ ndị Kristian, mana anyị … anaghị ejiri Ya kpọrọ ihe. … Anyị na-asọpụrụ Ya, mana anyị anaghị esoro Ya. … Anyị na-en̄omi okwu Ya niile, mana anyị anaghị etinye ha niime ndụ anyị.” “Anyị na-enwe mmasị maka Ya, mana anyị anaghị efe Ya ofufe.”
Lee otu ụwa naara isi a dị ma ọbụrụ na ụwa na-akwanye Jizọs ugwu karịa okwu ọjọọ nke ịdụisi jupụtara nʻụwa site n’oge ruo n’oge.
Mana ụmụ ntakịrị hụrụ Ya naanya nʻezie, ma ịhụnaanya ahụ nwere ike bata niime mmekọrịta ha na ndị ọzọ gburgburu ndụ ha. Dịka otu iwu sịrị dị, ọbụna n’afọ mgbe ha dịkasị nta, ụmụaka na-ahụnaanya n’ụzọ dị mfe, ha na-agbaghara ngwa ngwa, ha na-achị ọchị nʻobi ụtọ nke nwere ike gbazee obi ahụ kacha jụọ oyi, nke kacha sie ike.
Leenụ, ndepụta ahụ na-aga n’ihu. Ịdị ọcha? Ntụkwasi obi? Mgbam ume? Agwa?
Bịa soro m ka ị hụ obi umeala nʻiru Chineke nke otu obere nwa bụ ezigbote enyi m gosipụtara.
Na Jenuwarị 5, 2025—ụbọchị 91 gara aga—Easton Darrin ka enyekwasịrị Ọkwa nchụaja nke Erọn ma echie ya dikọn niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a.
Easton enweworịị mmasị ịkesa oriri nsọ nke Nri Anyansị nke Onyenwe anyị kemgbe ogologo oge o nwere ike icheta. Mana ohere nke a dị nsọ ka ezigbo ụjo so nʻazụ, ụjọ na ọ gaghị eme ya nke ọma, na ọ ga-ada nʻala, na a ga-akọ ya ọnụ ma ọ bụ menye onwe ya na ezinaụlọ ya ihere.
Lee anya, Easton nwere ọrịa nke a na-adịghị ahụkebe ma na-ebibi ebibi akpọrọ Ullrich congenital muscular dystrophy. Nke a emejupụtawo ndụ ya jiri ịma aka niile dị egwu ma kurie olileanya niile na ebumnuche niile nke ya maka ọdịniihu. Ọ gaghị ete aka ya abanye na oche nkwagharị apughị apụ. Ndị ezinaụlo ya anaghị ekwu okwu banyere ihe cheere ya niihu mgbe nke a gafere.
Na Sọnde mgbe emesịrị echichi ya, Easton ga-ekesa oriri nsọ nke mbụ ya. Ma ihe kpaliri niime obi ya bụ na ọ ga-enwe ike gosi onwe ya na ihe oriri nsọ ndị ahụ niihu Nna ya, onye bụ bishọp nke ngalaba ukwu ahụ. Iji kwado maka ọrụ nke a, ọ rịọwo arịrịọ, ma rịọ ma bee akwa ma rịọ arịrịọ, ma mee ka ekwee ya nkwa na enweghị, enweghị mmadụ, ga-agba mbọ ịnyere ya aka. Maka ọtụtụ ebumnuuche, nke naanị ya maara, ọ dịrị ya mkpa ime nke a nʻaka ya ma na-enweghị enyemaka.
Mgbe onye nchụaja gbajiri achịcha ahụ ma gozie ya—ihe nke na anọchite anụ ahụ Kraịst gbajiri agbaji—Easton, jiri ahụ ya gbajiri agbaji tere ụkwụ iji nata efere nkesa ya. Otu ọ dị, enwere nzọụkwụ atọ sara asa sitere na ala nke ụlọọgbakọ ahụ ruo ebe ahu gbagoro agbago. Ya mere, mgbe ọ natara efere nkesa ihe ya, ọ gbatịrị onwe ya elu otu ike ya ha ma dobe efere ya ahụ nʻelu ebe okporo njide aka. Ma emesịa, ọ nọdụrụ ala nʻelu step nke kacha elu, ma jiri aka ya abụọ dọlie ukwu aka nri ya debe na nzọụkwụ nke mbụ ahụ. Emesịa ọ dọliri ụkwụ aka ekpe ya debe ya nʻotu step ahụ kwa, ma megide otu ahu tutu ọ gbagoo nʻisi step atọ ahụ yiri ka Ugwu Everest nke ya.
Ọ wee nyafee onwe ya nʻelu ihe arụrụ nʻebe ahụ nke nyere ya aka o jiri rigote ma guzozie ọtọ. Ọ laghachiziri azụ ebe ọ debere efere nkesa ihe ahụ nọ. Ntakịri nzọụkwu ole ma ole ma o guzooro nʻihu bishọp, nna ya, onye anya mmiri juru na anya ma na-asọdata na nti ya, onye gbara mbọ jide onwe ya ka ọ ghara ịmakọ nwa ya nwoke nke a gosiri ike ma kwesị ntụkwasị obi. Ma Easton, jiri ihu ọchị sara mbara nʻihu ya, nwere ike ọ gaara ekwu, “Enyewo m [nna m] otito ma arụsiwo m ọrụ ahụ nke [ọ nyere] m ka m mee.”
Okwukwe, nkwudesike nʻihe, ịdị ọcha, nkwanye ugwu, ma, na ngwụcha, ịhụnaanya maka nna ahụ ọ nwere ezi mmasị ịme obi ụtọ. Ihe ndịa na ọtụtụ ejirimara ndị ọzọ na-eme anyị ekwuo kwa, “Onye ọ bụla … ga-eweda onwe ya dịka nwatakịrị a, onye ahụ dịkarịrị ukwuu n’alaeze eluigwe.”
Ụmụnne ndị nwanyị na nwoke na ndị enyi, nʻisi nke ndekọihe nke onyonyo ndị kachasị maa mma nke m mara, bụ ụmụ ọhụrụ na ụmụaka na ndị ntoroọbịa ndị na-enweghi ọnụ ahịa dị ka ndị ahụ anyị rụtụrụ aka taa. A na m agba ama na ha bụ onyonyo nke alaeze nke Chineke na-amụba nʻụwa n’ịdị ike na ịma mma ya niile.
Jiri otu ụdị mmụọ nke ịgba ama ahụ, A na m agba aka ebe na nʻoge ntorobịa ya, Joseph Smith hụrụ ihe o kwuru na ọ hụrụ ma kwuo okwu ya na ndị ahụ ọ sịrị na ya na ha kwuru okwu. A na m agba ama na Russell M. Nelson dị umeala ma na-enweghi ntupọ bụ onye amụma nwere onyinye na ọhụụ ụzọ nke Chineke chiri echichi. Site nʻogologo ndụ nke ọgụgụ ihe, A na m agba aka ebe na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ akwụkwọ kacha baa uru nke m gụworo ma bụrụ isi nkume nke ebe ntakịri ahụ m bi niime ya niime alaeze nke nwere ọtụtụ ụlọ. A na m agba aka ebe na ọkwa nchụaja na ekpere na-eweghachi ndụ m—ọkwa nchụaja nke Kraịst na ekpere unu niile. A ma m na ihe niile a bụ eziokwu, ma na-agba aka ebe ya nʻaha ahụ kacha kwesịa ntụkwasị obi na nwee obi umeala nʻetiti ụmụ ndị nwoke nke Chineke—Alpha na Omega, Nnukwu A bụ m ahụ, onye akpọgidere nʻobe, onye aka ebe kwesịrị ntụkwasị obi—ọbụna Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.