Ọgbakọ Zuru ọha
Oge niile nke Nkwụghachi nke Ihe niile
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


15:21

Oge niile nke Nkwụghachi nke Ihe niile

(Ọlụ 3:21)

“Ozi ọma” kacha mkpa ma dị ebube bụ ozi ahụ na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst eweghachiwo ozi ọma na Nzukọ nsọ Ya nʻụbọchị ikpeazụ.

Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a ka ahaziri afọ 195 gara aga taa, na Epril 6, 1830.

Obere ọgbakọ nke ndị kwere ekwe na ndị enyi gbakọtara maka emume a dị mkpa na nke ọn̄ụ. Nnukwu mwụpụ nke mmụọ gọziri ndị niile bịaranụ dịka e mere emume nsọ nke oriri nsọ, e nyere onyinye nke Mmụọ Nsọ, e mere emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja, ma kwusaa eziokwu niile nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst.

Nime iwughachite Nzukọ nsọ Ya, Onyenwe anyị họpụtara site na mkpughe Josef Smith dị afọ 24 dịka onye ndu nke ụwa: “onye ọhụ-ụzọ, onye ntụgharị asụsụ, onye-amụma, onye ozi nke Jisus Kraịst, okenye nke Nzukọ-nsọ site n’uche nke Chineke Nna, na amara nke Onyenwe anyị Jisus Kraịst.”

Ana m ekpesị ekpere ike maka enyemaka nke Mmụọ Nsọ ka anyị na-atụle mkpa na mmetụta na-aga nihu nke otu ihe omume a nʻagụgụala nke ụwa.

Ọhụ nke Mbụ ahụ

Nhazi doro anya nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a bụrụụ njedebe nke usoro nke ahụmihe niile dị ebube. Ahụmihe nke mbụ nime ahụmihe niile ndị a mere afọ 10 tupu mgbe ahụ na stet elu New York.

N’oge spring nke 1820, otu nwata nwoke aha ya bụ Josef Smith gara nime ọhịa dị nso nʻebe obibi ya ikpe ekpere. O nwere ajụjụ niile gbasara nzọpụta nke mkpụrụ obi ya, ma ọ gụsiri ya agụụ ike “ịmata nke n’ime [nzukọ nsọ] niile ahụ nke bụ nke ziri ezi, ka [o] wee mara nke o ga-esonye.” Josef tụkwasịrị obi na Chineke ga-aza ekpere ya ma duzie ya.

Biko mara na Josef ekpeghị ekpere naanị ka omara ihe ziri ezi. Kama, o kpere ekpere ka o mara ihe ziri ezi ka o wee nwee ike ime ihe ziri ezi. Josef ji okwukwe jụọ ya ma kpebisie ike ime ihe kwekọrọ nʻọzịza ọ natara.

“Na [azịza] nye ekpere sitere nʻobi ya, Chineke Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, pụtakwutere Josef ma bido ‘nkwụghachi nke ihe niile’ (Olu 3:21) dịka ekwuru na mbụ n’ime Baịbụl. N’ime ọhụ nke a, ọ mụtara na mgbe Ndị Ozi isimbụ ahụ nwụworo, Nzukọ nsọ Agba Ọhụụ nke Kraịst furu efu site n’ụwa.” Josef Smith ga-enye aka na-iweghachite ọzọ ozizi, ikikere, na ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ niile nke Nzukọ nsọ ochie nke Onye Nzọpụta.

Ọhụ nke Mbụ ahụ.

Josef kwusiri ike sị: “A hụrụ m Ndị abụọ, ndị mmụke ha na ebube ha karịrị nkọwa nile, na-eguzo n’elu m n’ime ikuku. Otu n’ime ha gwara m okwu, na-akpọ m n’aha ma sị, na-atụ onye nke ọzọ aka—Nke a bụ Nwam nwoke M Hụrụ n’anya. Nụrụ Okwu Ya!

Site nʻọhụụ a na ahụmihe niile ndị sochirinụ, Josef Smith bịara ghọta na Chineke na Jizọs Kraịst maara ya ka otu mmadụ, na-eche banyere nzọpụta ebighị ebi ya, ma nwee ozi ọ ga-arụ. Ọ mụtakwara ihe ndị dị mkpa gbasara ọnọdụ niile, agwa, na izu oke nke Chineke—ma na Nna ahụ na Ọkpara ahụ dị iche iche. Jizọs Kraịst bụ Ọkpara nke Chineke nʻezie nime mmụọ na nʻanụ ahụ.

Josef Smith kwupụtara na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst bụ ndị dị ndụ. O kwuru, “Nna ahụ nwere arụ nke anụ arụ na ọkpụkpụ niile nwere ojiji-aka dịka nke mmadụ; Ọkpara ahụ kwa; mana Mụọ Nsọ enweghị arụ nke anụ arụ na ọkpụkpụ niile, mana ọ bụ onye nke Mụọ.”

A na m agba ama nleta ahụ nke Nna na Ọkpara ahụ nye Josef Smith bụ emume mmalite na nnukwu “mweghachite nke ihe nile dịka e kwuru site n’ọnụ niile nke ndị amụma nsọ niile site na mmalite nke ụwa.”

Akwụkwọ nke Mọmọn

Nke abụọ nʻusoro nke ahụmihe niile nke ọrụ ebube nke dugara nʻusoro nhazi nke Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta eweghachiri bụ ntụgharị asụsụ na ọbịbịa nke Akwụkwọ nke Mọmọn.

Akwụkwọ nke Mọmọn: Ama Ọzọ nke Jizọs Kraist.

E enyere Josef Smit onyinye na ike nke Chineke ịtụgharị asụsụ ihe mere mgbe gboo: Akwụkwọ nke Mọmọn—Ama Ọzọ nke Jizọs Kraịst. Ederede a dị nsọ tinyekọtara akụkọ nke mgbasa ozi nke onwe nke Jizọs Kraịst n’etiti ndị mmadụ n’ime Western Hemisphere ngwa ngwa Mbilite n’ọnwụ Ya gafere. Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ na-akuzi maka ebumnuche nke ndụ ma na-akọwa ozizi nke Kraịst, nke bụ isi ebumnuche ahụ. Dịka akwụkwọ nsọ nsiso nye Baịbụlụ, Akwụkwọ nke Mọmọn na-agba ama na mmadụ niile bụ ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwanyị nke Nna nke Eluigwe dị ịhụnanya, na O nwere atụmatụ dị nsọ maka ndụ anyị, ma na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, na-ekwu okwu taa dịkwa ka otu ọ dị n’ụbọchi niile nke mgbe ochie.”

Dịka ndị otù nke Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta eweghachiworo, “Anyị kwere na Baịbụl bụ okwu nke Chineke ọbụrụ raa na atụgharịrị asụsụ ya nke ọma; anyị kwekwara Akwụkwọ nke Mọmọn ịbụ okwu nke Chineke.” Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ihe aka ebe ọzọ nke JIzọs Kraịst, ma na-akwado eziokwu nke Baịbụl, ma na-eweghchite eziokwu niile dị mfe nghọta ma dị oke ọnụ ahịa sitere na Baịbụl.

Ọkwa nchụaja Eweghachitere

Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a na-akuzi na Nzukọ nsọ mbụ ahụ nke Onye Nzọpụta hiwere, nke nwere ikikere dị nsọ, ozizi,, na ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ niile, furu efu nʻụwa. Dịka akụkụ nke mweghachite nke ihe niile e buru nʻamụma nʻụbọchị ikpeazụ, ndị amụma oge ochie na ndị ozi nʻonwe ha nyefere Josef Smith ikike ọkwa nchụaja ma nyefee ya ọtụghe ụzọ niile nke ọkwa nchụaja. Nke a bụ nke atọ nʻusoro nke ahụmihe niile ọrụ ebube nke dugara nʻusoro nhazi nke Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta eweghachitere.

Ikike Ọkwa nchụaja na-enye ndị odibo nke Chineke ohere “ịnọchite anya [Ya] ma mee ihe n’aha Ya.” “Ntụghe niile nke ọkwa nchụaja bụ ikike nke iji duzie otu esi etinye ọkwa nchụaja n’ọrụ n’aha ụmụ nke Chineke.”

Mweghachite nke Ọkwa nchụ aja ahụ.

Nokpuru ntụziaka nke Nna na Ọkpara ahụ, Jọn Omee Baptizm bilitere n’ọnwụ weghachitere, nime afọ 1829 ikike nke ime baptizm site na mmikpu niime mmiri maka mgbaghara nke mmehie niile. Nime otu afọ ahụ, atọ niime Ndịozi Iri na Abụọ isimbụ—Pita, Jemis, na Jọn—weghachitere ịbụ onyeozi na ntụghe niile nke ikike ọkwa nchụaja.

Afọ isii ka e nwesịrị nhazi doro anya nke Nzukọ nsọ, nime Tempụl Kirtland, Mozis, Elias na Elijah nyefere nʻaka Josef ikikere ọzọ dị mkpa iji ruzuo ọrụ Chineke nʻụbọchị niile ikpeazụ.

Mozis mere nkesa ọtụghe ụzọ niile nke mkpọkọta nke ịkpọta nke Izrel.

Elias mere nkesa ozi ọma nke Ebreham, gụnyere mweghachite nke ọgbụgba ndụ Ebreham.

Elijah mere nkesa ọtụghe ụzọ niile nke ike nrachị, na-enye ikikere nke na-enye ohere ka emume nsọ niile nke e mere nʻụwa na-ejigide ruo mgbe ebighị ebi dị ka ijikọ ezinaụlọ niile ọnụ na mmekọrịta ebighị ebi nke gafere ọnwụ.

Ahaziri Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst

Dịka Josef Smith tụgharịrị asụsu Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ, ọ natara mkpughe niile na-egosi na a ga-ehiwe Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst. Mana Onyenwe anyị nyere Josef ntụziaka ka ọ ghara ịhazi Nzukọ nsọ Ya ozugbo. Kama, “site na mmụọ nke ibu amụma na mkpughe” Onyenwe anyị kpughere Josef “kpọmkwem ụbọchị … [ọ] ga-aga nihu ịhazi Nzukọ nsọ Ya [ọzọ] nʻelu ụwa.”

A haziri Nzukọ nsọ ahụ nʻusoro kwesịrị ekwesị naanị mgbe emesiworo mweghachite nke ọkwa nchụaja na mbipụta nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Mpempe akwụkwọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn mbụ ahụ pụtara na Maach 26, 1830 ma a haziri Nzukọ nsọ nʻusoro na Epril 6.

Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.

“Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a … bụ Nzukọ nsọ Agba Ọhụrụ nke Kraịst eweghachitere. Nzukọ nsọ a dabeere na ndụ zuru oke nke isi nkume-njikọ ya, Jizọs Kraịst, na Aja mgbaghara mmehie Ya n’enweghị oké na Mbilite n’ọnwụ Ya mere eme. Jizọs Kraịst ọzọkwa akpọwo Ndị Ozi ma nyewo ha ikike nke ọkwa nchụaja. Ọ na-akpọku anyị niile ịbịakwute Ya na Nzukọ nsọ Ya, ịnata Mmụọ Nsọ, emume nsọ nke nzọpụta, na irite ọńụ na anọgide.”

Ọgbọ nke Uju nke Oge niile

Mpụta nke Nna na Ọkpara ahụ nye Josef Smith, ntụgharị asụsụ na mpụta nke Akwụkwọ nke Mọmọn, na mweghachite nke ikikere Ọkwa nchụaja na ọtụghe ụzọ niile dị mkpa maka nhazi nke Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị eweghachitere afọ 195 gara aga taa.

Nime Agba Ochie, onye amụma ahụ Daniel kọwara nrọ banyere otu nkume nke a ga-esi nʻugwu na-enweghị aka wapụta ma jupụta ụwa dum. Otu afọ emesiworo nhazi nke Nzukọ nsọ ahụ, Onyenwe anyị nyere Josef Smith ntuziaka na ọtụghe niile nke alaeze nke Chineke ka “enyefere mmadụ nʻụwa” ma “ozi ọma ahụ [nke Jịzọs Kraịst ga] apụ ruo nsọtụ niile nke ụwa, dịka okwute ahụ awapụtara nʻelu ugwu nʻejighị aka niile.”

A nam agba ama: Onyenwe anyị na-emejupụta nkwa Ya. A na-ehiwe Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta eweghachitere nʻụwa niile ma bụrụ ngwa ọrụ nke Chineke ga-eji chịkọta nʻotu ihe niile nime Kraịst, ma nke dị nʻelu-igwe, na nke dị nʻelu ụwa, ọbụna nime ya.”

Ọrụ ụbọchị ikpeazụ nke Onyenwe anyị “bụ ọrụ nke masịworo ndị mmadụ nke Chineke n’oge niile; ọ bụ isiokwu nke ndị amụma, ndị nchụaja na ndị eze jiworo mmasị dị iche mee ihe; ha ejiwo ọchịchọ jupụtara n’ọńụ lee anya ruo n’ụbọchị nke anyị bi na ya; ma nke ejiri ọchịchọ si n’eluigwe jupụtara n’ọńụ kpalie ha agụwọ ma dee ma buo amụma maka ụbọchị anyị a.”

Na nke a kacha ukwuu na nke ikpeazụ nke ozi ọma niile, “njikọta zuru oke na nke zuru oke na ịgbakọ ọnụ nke oge niile, na ọtụghe-ụzọ niile, na ike niile, na ebube niile kwesịrị ịdị, ma e kpughere site n’ụbọchị nke Adam ọbụna rụọ n’oge ugbua. Ma ọbụghị naani nke a, mana ihe ndị ahụ nile n’ekpugheghị site na ntọ-ala nke ụwa … ka a ga-ekpughe … nime nke a, ọgbọ ozuzu oge niile akara-aka.”

Onye amụma Josef gara nihu kọwaa, “Emume nsọ na ọrụ niile nke Ọkwa nchụaja chọrọ, nʻokpuru ntụziaka na iwu nsọ niile nke Onye pụrụ ime ihe niile nʻọgbọ ọbụla niile, ka a ga-enwe nʻọgbọ ikpeazụ … nke na-eweta na mmezu mweghachite nke ndị Amụma niile dị Nsọ kwuru.”

Nkwa niile na Ọgbụgba Ama

A gbalịwo m ichikọta ihe ndị bụ isi nke “ozi ọma” kacha mkpa na dị ebube onye ọbụla nʻebe ọ bụla nʻụwa nwere ike ịnata—ozi ahụ na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst eweghachiwo ozi ọma na Nzukọ nsọ Ya nʻụbọchị ikpeazụ.

A na m akpọ mmadụ niile ka ha mụta ma gosipụta ozi a. A na m ekwe nkwa na ndị mmadụ “ndị ahụ jupụtara n’ekpere ịmụ ozi nke Mweghachi ma mee ihe n’okwukwe ka aga agọzi [site na ike nke Mmụọ Nsọ] irite akaebe nke onwe ha maka ịdị nsọ ya na nzube ya iji kwado ụwa maka Ọbịbịa nke Abụọ ekwere nkwa nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst.” Ka ị na-ekpesi ekpere ike na-atụ anya ịnata ma mee ihe nʻọzịza sitere nʻaka Chineke, dị ka nwa Josef Smith, ikike gị ịmata na ịzaghachi ịgba ama nke dị nsọ ga-abawanye.

A na m agba akaebe na Chineke, Nna nke Ebighị ebi, bụ Nna anyị. A na m agba ama na akaebe na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara nke Nna anyị hụrụ naanya ma mụọ Naanị Ya n’anụ ahụ. Ọ bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị.

Ana m eji ọn̄ụ agba ama na Nna na Ọkpara ahụ pụtakwutere nwantakịrị nwoke Josef Smith, site otu ahụ bido Mweghachite nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst n’ụbọchị ikpeazụ a niile. Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ihe aka ebe ọzọ nke JIzọs Kraịst ma nwere okwu Chineke. Ikikere ọkwa nchụaja ịnọchite anya Onye Nzọpụta na ime ihe nʻaha Ya ọzọ nọ nʻụwa. Na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazụ a, bụ Nzukọ nsọ Agba Ọhụrụ nke Kraịst eweghachitere. A na m agba akaebe na ihe ndị a nile bụ eziokwu n’aha dị nsọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.